I Ndi Eze 18:1-46.

Lesson 297 - Junior

Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISU: “Rùe ole mgbe ka unu onwe-unu ganārughari n’etiti uzọ abua ndia? ọ buru na JEHOVA bu Chineke, jesonu Ya: ọ buru Beal, jesonu ya” (I Ndi Eze 18:21).
Notes

Ụnwụ

N’oge ọchịchị nke Ehab bụ eze Israel, ụnwụ dara n’ihi na Chineke eziteghị mmiri òzùzò O nyeghị kwa igirigi rue ihe ra ka arọ atọ na ọnwa isi. Nke a bụ ikpé nke Chineke. Ihe ọjọọ nke Ehab karịrị nke ndị eze niile ọzọ buru ya ụzọ. Ehab lụrụ nwanyị ná-amaghị Chineke, aha ya bụ Jezebel, nye kwa ya ohere ka ọ gaa n’iru n’ikpere arụsị. Mgbe ná-adịghị anya Ehab na Ụmụ Israel niile wee sonye kwa n’ikpere arụsị. Ehab wee wuere Beal ebe ịchụàjà, mee kwa ebe dị elu nye ikpere arụsị. Ọ kpasuru Chineke iwe karịa ndị eze Israel niile buru ya ụzọ.

Elaija bụ onye nke Chineke wetara ozi ahụ na mmiri òzùzò agaghị adị. Mgbe okwu ndịa mezuru, isiiyi niile wee takọrọ, ahịhịa wee kpọnwụọ, náánị ihe oriri ntà dị kwa n’obodo, Ehab wee malite ịchọ Elaija. Ehab chọgharịrị ya gburugburu ala ahụ. Ọ dịghị obodo ma ọbụ ala-eze ebe aná-achọghị Elaija. Ọ bụrụ na Ehab chọrọ Chineke otú o si chọọ Elaija, chègharịa kwa eleghịanya Chineke ga-eziteworị mmiri òzùzò ọsọsọ karịa.

Obadaia

N’ụlọ Ehab ka otù nwoke aha ya bụ Obadaia nọ, onye ana-akpọ onye nlekọta nke èzínaụlọ Ehab. Obadaia atụwo egwù Jehova site na mgbe ọ dị na nwata. O tinyere onweya n’ihe izendụ site n’izó na ịzụ narị ndị amụma nke Jehova nri mgbe Jezebel bibiri ọtụtụ ndị amụma nke Chineke. Otù ụbọchị Obadaia na-achọgharị ahịhịa aga-enye ịnyịnya na ịnyịnya mule. Elaija wee mee ka ọ hụ ya anya wee zie ya ka ọ gwa Ehab na ya, bụ Elaija nọ ebe ahụ. Na mbụ Obadaia tụrụ egwù ịgwa Ehab. Ma mgbe emere ka o doo ya anya na Elaija ga-ezute Ehab, Obadaia jere zie eze ozi ahụ.

Ekwere Mkwà Mmiri Òzùzò

Elaija na-emezu iwu nke Chineke. Ehab achọtaghị Elaija na mbụ n’ihi na Chineke zoro Elaija. Chineke gwara Elaija ebe ọ ga-eje na ebe ọ ga-enweta nri na mmiri n’oge ụnwụ. Ugbu a, Chineke mere ka Elaija hụ Ya anya wee kwee mkwà na aga-ezite mmiri òzùzò. Ma Jehova gwara Elaija ka o jee hụ Ehab. O nwere ike bụrụ na Elaija tụrụ egwù ikwé ka Ehab hụ ya ma ọ bụ náánị site nime nke a ka Chineke ga-ezite mmiri òzùzò.

Mkwà Dị iche iche nke Chineke

Enwere ọtụtụ mkwà nke Chineke nime Baịbụl. Enyere anyị mkwà ndịa niile na ụzọ anyị ga-eso, ka anyị wee nweta ha. Mgbe anyị mezuru ihe Chineke kwuworo, Chineke ga-emezu kwa mkwà Ya. Dịka iheatụ, ọ dị mkwà ekwere ndị ná-ekpe ekpere n’okwukwe: “Ihe nile, ka ha ra, bú nke unu nēkpe n’ekpere riọ kwa, kwenu na unu anatawo ha, ha gādiri unu” (Mak 11:24). N’Ilu anyị na-agụ ihe anyị ga-eme ka anyị wee nata ebere: “Onye nēkpuchi njehie ya nile, ọ gagh-agara ya: ma onye nēkwuputa ha, nke nārapu kwa ha, agēnwe obi-ebere n’aru ya” (Ilu 28:13). Lee amaokwu niile ọzọ dị iche iche nke Akwụkwọnsọ na-agwa anyị ihe anyị ga-eme ka anyi wee nata mkwà ahụ: “Onye nātukwasi JEHOVA obi, agēme ka ọ nọ n’elu” (Ilu 29:25). “Wedanu onwe-unu n’iru Onye-nwe-ayi, Ọ gēweli kwa unu elu” (Jemes 4:10); na “Riọnu, agēnye kwa unu; chọnu, unu gāchọta kwa; kuanu, agēmeghe-kwa-ra unu” (Matiu 7:7). Ọ bụrụ na ọ dị ihe ọ bụla Chineke kwere ná mkwà nke ị ná-enweghị, ị pụrụ inweta ya site n’ikwere na irubere Chineke isi. Ihe ọ bụla Chineke kwere ná mkwà, O nwere ike ime ya mgbe anyị mere akụkụ nke anyị, mezue kwa ihe niile Ọ chọrọ.

Ịta Chineke na Ndị Ya Ụtà

Mgbe Ehab natara ozi Obadaia, o wee pụọ izute Elaija. Ehab jiri okwu ndịa kelee Elaija: “Ọ bu gi bu nka, gi onye nēmekpa Israel aru?” Ehab na-agbalị ịta onye amụma nke Chineke ụtà n’ihi ụnwụ ahụ. Ma Elaija gwara Ehab ihe wetara nsogbu ahụ: Ehab na ndị ahụ niile arapụwo iwu niile nke Chineke, wee ná-efè arụsị, Beal, òfùfè. N’ihi nke a, ezidakwasịrị ha ahụhụ. Mgbe ha nupụụrụ Chineke isi, ha hụjuru anya n’ihi ya.

Oge ụfọdụ n’ụbọchị ndịa, ụmụ mmadụ na-agbalị ịtà Chineke ụtà mgbe ikpé bịakwasịrị ha n’ihi mmehie na nnupụisi ha. Ma ọbụ ha agbalịa ịtụkwasị ịtaụta ahụ n’isi ndị nke Chineke -- n’ihe ekwuworo ma ọbụ nke emere. Baịbụl na-asị, “Ikpé niile nke JEHOVA bu ezi-okwu, ha nile ziri ezi n’otù” (Abù Ọma 19:9). Mgbe ọ bụla Chineke wezugara iru-ọchị nke nnabata Ya n’ebe anyị nọ, ọ dị ihe kpatara ya. Ka onye ahụ bu ụzọ nyochaa onweya; ọ bụrụ kwa na ụzọ ya ziriezi n’iru Chineke, ka ọ mata na Chineke na-alụpụta ezi ihe ụfọdụ ná ndụ ya, n’ihi na ọ matara na “ihe nile nālukọ ọlu iwetara ndi huru Chineke n’anya ezi ihe, bú ndi akpọrọ dika ihe O nēzube si di” (Ndi Rom 8:28). Ma ọ bụrụ na mgbe mmadụ nyọchara onweya n’iru Chineke, o wee nwee amam-ikpé n’obi ya, ọ chọpụta kwa na ya mere ihe jọrọ njọ, ọ ghaghị ịbụ onye kwesịrị ntụkwasịobi, nabata kwa na ya emewo ihe jọrọ njọ, wee rịọ Chineke mgbaghara. Ọbụná ọ bụrụ na onye ọzọ ekwuwo okwu ma ọbu mee ihe nke ana-apụghị ịghọta, onye ahụ ihe ahụ mere ka aga-ataụta mgbe o mejọworo Chineke.

Otù Nrọrọ

Elaija matara na ndị ahụ apụghị ịga n’iru n’ifè arụsị òfùfè, nọgide kwa n’ụzọ mmehie ha ma nata kwa ngọzi nke Chineke. Elaija matara na ha ga-ebibi mmehie ahụ nke wetara ikpé Chineke. Elaija jikekwara inyere Ụmụ Israel aka. Ọ gwaghị ha ka ha bịa kpeere ezi Chineke nke dị kwa ndụ ma ha chọrọ ma ha achọghị, kama Elaija tinyere nrọrọ ahụ n’aka ndị ahụ. Elaija guzoro n’iru ndị ahụ niile we sị, “Rùe ole mgbe ka unu onwe-unu ganārughari n’etiti uzọ abua ndia? ọ buru na JEHOVA bu Chineke, jesonu Ya: ọ buru Beal, jesonu ya.”

Okwu ndịa Elaija kwuru kwesịrị ịbụ ihe akamgbá nye mmadụ ọ bụla n’ụbọchị taa. Ụfọdụ mmadụ na-agbalị inwe ọñụ n’ụzọ nke ndị ụwa na ịhụn’anya n’ebe Chineke nọ; ha na-agbalị inwekọta ngọzi nke Chineke na iheụtọ nke mmehie, ma ha abụọ adịghị agakọta apụghị kwa ịchịkọta ha n’otù. Ọ ga-ahụ otù onye n’anya, kpọ kwa ibe ya asị ma ọbụ na ọ ga-ejide otù onye, lelịa ibe-ya anya (Matiu 6:24). Ndị niile azọpụtaworo na-efè Chineke n’ihi na ha hụrụ Chineke n’anya, ha arọrọwo kwa isoro Ya. Ndị ná-abụghị ndị nke Chineke arọrọwo ịbụ ụmụ nke ekwensu. Gịnị ka gị onwe gị rọrọworo?

Otù Ule

Elaija chọrọ ka Ụmụ Israel nwapụta n’onweha, mata kwa n’onweha na Jehova náánị Ya bụ ezi Chineke nke dị kwa ndụ. E wee kwekọrịta na ndị amụma Beal dị narị anọ na iriise (450) ga-achụrụ chi ha àjà, na Elaija kwa -- bụ otù onye amụma Jehova – ga-achụrụ Chineke àjà. Ekwekọrịta kwara na Chineke ahụ nke ga-eji ọkụ zaa ka aga-amata dịka ezi Chineke.

Ndị amụma Beal wee dozie ihe ịchụàjà ha, wee kpọkuo Beal site n’ụtụtụ rue etiti ehihie. “Ma ọ digh olu di, ọ digh kwa onye nāza.” Ndị amụma Beal jisịrị ike. Ha wụkwasịrị n’elu ebe ịchụàjà ahụ, ka ha wee chọta iru Beal. Ma ọ dịghị kwa onye na-aza ha. N’etiti ehihie, ha weere óké olu kpọọ chi ha. Elaija atụworo ha arò na o nwere ike bụrụ na Beal nọ n’ijè, ma ọbu eleghịanya ọ na-ararụ ụra, o wee dị mkpà na aga-akpọte ya. Site n’ịnụ ọkụ n’obi ha, ha tisiri mkpu ike. Nime enweghị inyeaka ha, ha weere mma-agha bie arụ ha, ọbara wee wụkwasị ha. Ma ọ dịghị kwa ọzịzá dị, n’ihi na Beal bụ arụsị, ọ pụghị kwa inyere ha aka ọbụná ma asị na ọ nụrụ ma hụkwa ha. Ndị amụma Beal achọsiwo ike ma ha akpọkughị aha nke ezi Chineke dị ndụ onye ná-abụghị náánị na Ọ na-anụ ná-ahụ kwa, kama Ọ na-aza na-enye kwara ndị na-akpọku Ya aka.

Ọkụ Sitere N’Eluigwe

N’oge ịchụàjà anyasị o wee bụrụ ohere Elaija ịkpọku Chineke ya ka O zite ọkụ. Elaija leziri anya iwugharị ebeịchụàjà Jehova akụdaworo. O were nkume iri na abụọ, nke ná-anọchita anya ebo iri na abụọ nke Ụmụ Israel, iwu ebe ịchụàjà ahụ nye aha Jehova. Edoziri nkụ, na óké ehi nke abọworo n’ọbụbọ ya tụkwasị n’elu nkụ ahụ. Egwuwa kwara ebe mmiri na-adọ gburugburu ebe ịchụàjà ahụ. Awụkwasịrị mmiri n’elu ihe ịchụàjà ahụ, nkụ, na ebe ịchụàjà nke mere ka mmiri gbajuo òlùlù ahụ egwuru. Mgbe edoworo ihe niile n’usoro, dozie kwa ha dịka iwu Jehova si dị, Elaija wee kpee ekpere. Ọ gwara Chineke ka Ọ zaa ekpere ya, ka ndị ahụ wee mara na Jehova bụ Chineke.

Ná-arụghị ụkà, ndị ahụ guzo ná-ele anya site n’obi ha niile. Chineke Elaija Ọ ga-aza? Chineke Ọ ga-aza ekpere nke otù onye ebe Beal ná-azaghị narị ndị amụma na iri ise? Chineke Elaija Ọ pụrụ izite ọkụ site n’Eluigwe n’ezie? Àjà ahụ ọ pụrụ iré ọkụ mgbe emesịworo ka mmiri dee ya nkeọma? Eleghịanya ha ga na-echè otú oge Elaija ga-eji kpọkuo Chineke ya gaara.

Ka ndị ahụ guzo n’ebe ahụ, ha hụrụ “ọkụ JEHOVA” ka ọ dara. Àjà nsureọkụ ahụ na nkụ ya ka ọkụ ahụ ripịara, ma ọkụ ahụ akwụsịghị. Ọ gara n’iru ripịa ọbụná nkume na ájà, rachapụ kwa mmiri dị n’òlùlù. Ihe ịrịba-àmà ebube a mere n’anya ha. Chineke Elaija dị ike na Ọ pụrụ izidata ọkụ! Chineke Elaija zara ekpere ya! Ndị ahụ wee fèe Jehova òfùfè sị, “JEHOVA, Ya onwe-ya bu Chineke; JEHOVA, Ya onwe-ya bu Chineke.”

Aga-egbu ndị amụma niile nke Beal n’ihi na ha gbara ndị ahụ ume nyekwara ha aka ifè chi ụgha òfùfè. Ọ bụrụ na arapụrụ ndị amụma Beal ndụ, eleghịanya ha ga-akwagide ndị ahụ ọzọ ịrapụ Chineke wee fèe arụsị òfùfè.

Mmiri Òzùzò

Gịnị kpatara Elaija jiri mee ihe niile a? Iwepụ mmehie ahụ nke kpọdataworo ikpé nke Chineke. Mgbe emesịrị nke a, ndị ahụ pụrụ ile-anya mmiri òzùzò ahụ ekwere mkwà ya. Elaija gwara ha na óké mmiri òzùzò na-abịa. Ha kwenyere n’ihe Elaija kwuru, rube kwara ya isi.

Mgbe Ehab jere ná-eri ihe, ná-añụ kwa ihe ọñụñụ, Elaija nọ ná-ekpe ekpere. Chineke ekwewo mkwà izite mmiri òzùzò, ma ọ ka bụ kwa òkè nke Elaija ikpe ekpere. Ka ewee nweta mkwà niile nke Chineke taa, ndị Ya aghaghị ịnọgide n’ikpe ekpere. Mgbe azọpụtasịrị ha, ha na-ekpe ekpere ka edoo ha nsọ. Jisọs kpere ekpere ka edoo ndị Ya nsọ (Jọn 17:17-20); anyị na-agụ kwa, “Nka bu ihe Chineke nāchọ, bú ka edo unu nsọ” (I Ndi Tesalọnaika 4:3). Ma ndị nke Chineke aghaghị ikpe ekpere were kwa ndụ ha chụọ àjà ka ha wee nata ya. Mgbe edosịrị ha nsọ, ha aghaghị ịchọ Chineke ka ewee nye ha ọwụwụ mmiri nke Mmụọ Nsọ (Ọlu Ndi-ozi 1:5). Ihe nwapụta nke a ka ekwewokwara ná mkwà (Ọlu Ndi-ozi 1:8; Jọn 14:16, 26; 15:26; 16:7), ma ndị nataworo ya natara ya náánị mgbe ha kpesiri ekpere ike kwere kwa Chineke.

Ikpe Ekpere

N’elu Ugwu Kamel ebe ahụ ka Elaija tụdara onweya n’iru Jehova, wee kpee ekpere. O wee ziga orù ya ka o lee ma ọ dị ihe-àmà ná-egosi na mmiri gaje izò. Ọ dịghị iheàmà dị, ya mere na Elaija kpere gaa n’iru n’iru. Mgbe Elaija kpesịrị nke ugbò asaa, orù ya wee sị na ọ dị igweoji ntà dịka ọbụ aka mmadụ. Ihe-àmà ahụ ezuworo Elaija ikwere na Chineke na-ezite mmiri òzùzò. O wee zigara Ehab ozi, “Dozie ugbọala gị, rida, ka mmiri-ozuzo wee ghara igbochi gi.”

Elaija ekpewo ekpere n’elu Ugwu Kamel ahụ na mbụ Chineke wee zidata ọkụ site n’Eluigwe. Nke a bụ nnọọ ihe dịkarịsịrị ebube, ma Onyenwe anyị zara ekpere Elaija ka ndị ahụ wee kwere na Jehova, Ya onwe ya bụ Chineke. O were Elaija ikpe ekpere ugbò asaa tupu Chineke ezidata mmiri òzùzò. Elaija bụ nnọọ ezi iheatụ nye anyị. O kpere ekpere rue mgbe ọ natara ihe ahụ Chineke kweworo ná mkwà. Igweoji ahụ dị ntà, mmiri ezobeghị kwa n’ala ihe ra ka arọ atọ na nkera, ma Elaija kweere Chineke, ya mere, azara ekpere ya.

Elaija Kwesịrị Ntụkwasịobi

Tupu ha erue nime obodo, Eluigwe wee jienji n’igweoji na ifufe. Óké mmiri òzùzò nke dị ala ahụ na ndị ahụ mkpà wee dị. Agọziri ndị ahụ nime mmụọ na n’anụ-arụ n’ihi na Elaija jikeere irubere Chineke isi -- o ji obi ike guzo n’iru ajọ Ehab, nwee kwa agbam-ume igbu ndị amụma niile nke Beal. Asọpụụrụ Chineke kpọghachị kwa ndị ahụ n’okwukwe ha n’ihi na Elaija guzooro Jehova na ezi ihe -- otù onye megide narị ndị amụma anọ na iri ise nke Beal.

Ònye matara ihe aga-emere Onyenwe anyị na ndịọzọ ọ bụrụ na nwaokoro na nwa-agbọghọ ọ bụla na-abịa n’Ụlọ akwụkwọ Ụbọchị ụkọ anyị ga-erubere Chineke isi guzo kwara ihe bụ ezi ihe?

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Òlee ụdị onye ọchịchị Ehab bụ?
  2. Gịnị kpatara na enweghị mmiri òzùzò?
  3. Ònye bụ Elaija?
  4. Òlee otú ndị amụma Beal si kpọkuo chi ha?
  5. Gịnị mere na Beal azaghị?
  6. Kwue banyere ekpere nke Elaija.
  7. Gịnị ka ndị ahụ rọọrọ?
  8. Gịnị mere o ji dị mkpà na aga egbu ndị amụma Beal?
  9. Gịnị mere Elaija ji kpee ekpere mgbe Chineke kweworo mkwà inye mmiri òzùzò?
  10. Gịnị bụ ihe-àmà gosiri na mmiri òzùzò ga-adị?