I Ndi Eze 19:1-18

Lesson 298 - Junior

Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISI: “JEHOVA, bú Chinekem, na Gi ka m’gbabàworo: zọputam n’aka ndi nile nēsogbum, naputakwam n’aka-ha” (Abù Ọma 7:1).
Notes

Akụkọ

Ehab gwara Jezebel ihe niile meworo n’Ugwu Kamel. Anyị agụtaghị na Ehab kwuru ihe Chineke meworo kama o gwara ya ihe Elaija meworo. Ehab kọrọ na Elaija weere “mma-agha gbue ndi-amuma nile.” Ehab kpọrọ ha “ndi-amuma nile” dịka aga-asị na ọ bụ náánị ha bụ ndị amụma, na dịka aga-asị na ha kwesịrị ịnara nsọpụrụ dịrị ezi ndị amụma. Narị ndị amụma anọ na iri ise (450) nke Beal bụ ndị amụma ụgha. Ha emewo ka ndị ahụ rapụ ezi òfùfè. Ekwesịrị igbu ha, dịka Iwu si dị: “Ma agēme ka onye-amụma ahu, … nwua; n’ihi na o kwuworo okwu nwezuga megide JEHOVA, bú Chineke-unu, … ka o we nufue gi n’uzọ ahu nke JEHOVA, bú Chineke-gi, nyere gi n’iwu ije ije nime ya” (Deuteronomi 13:5).

Ehab emeghị Elaija ihe ọ bụla ma ọ gwara Jezebel, nwanyị ọjọọ, onye ọ matara na ọ ga-agbalị imekpa Elaija arọ. Ọ bụ na agaghị ata ya ụta n’ihi na ọ kpalitere Jezebel iwe isogbu Elaija? Ụfọdụ ụmụntakịrị agaghị ezu ori ma ha na-agbà ndịọzọ ume izu ori; ụfọdụ ụmụntakịrị nwere ike ghara ikwu okwu ụgha ma ha na-agwa ndịọzọ ka ha kwue okwu ụgha; ya mere, ha aghaghị kwa iketa òkè n’amam-ikpé ha. Akụkọ nke Ehab kpaliri nwanyị obi ọjọọ a imegide Chineke na Onyeamụma nke Chineke dịka ụfọdụ akụkọ taa pụrụ ime ka mmadụ lụso Chineke ọgụ mee kwa ihe jọrọ njọ. Ka anyị ghọta na akụkọ anyị na-akọrọ ndịọzọ banyere Onyenwe anyị nwere ike kpalie ha ịchọ Chineke ma ọbụ inwe obiabụọ banyere Ya! Devid kpere ekpere ka okwu ọnụ ya bụrụ ihe ná-atọ ụtọ n’iru Jehova (Abù Ọma 19:14).

Ịbámbà

Obi ezughị Jezebel ike, o wee ñụọ íyì na ya ga-emegwara. Ọ ghaghị ịmataworị na emeriwo chi ya bụ Beal. Ma ọ ghaghị ekwenye na ya mere ihe jọrọ njọ n’òfùfè ya; ọ gaghị akwụsị kwa isogbu ndị amụma nke Chineke. Jezebel zigara Elaija ozi, ná-abá mbà iwepụ ndụ ya nime iri hour abụọ na anọ dịka ya onweya, bụ Elaija, wepụworo ndụ nke ndị amụma ụgha ya. Mbà a nke Jezebel bara bụ ọnwụnwa nye Elaija. O nwewo óké mmeri n’elu Ugwu Kamel site n’inyeaka nke Onyenwe anyị. Ọtụtụ mgbe, mgbe enwetasịworo mmeri dị otú a, óké ọnwụnwa na-eso.

Mmadụ ga-echè na Elaija kwesịrị igosipụta kwa okwukwe ya nime Chineke ebe Chineke zaworo ekpere ya izidata ọkụ na mmiri òzùzò. Mmadụ ga-eleanya na Elaija ga-echeta na Chineke anọnyeworo ndịọzọ mgbe abaara ha mbá iwepụ ndụ ha. Onyeiro nke Moses na Ụmụ Israel sịrị na ya ga-ebibi ha (Ọpupu 15:9), ma Chineke napụtara ha mee kwara ha ụzọ mgbapụ. Sọl gbalịrị igbu Devid n’ihi ekworo (I Samuel 18:10, 11). Chineke nyeere Devid aka izere Sọl, ewee nápụta ndụ Devid.

Ekpere

Eleghịanya Elaija chetara na Chineke sịrị ya wezuga onwe ya mgbe Ehab na-achọ ya (I Ndi Eze 17:3). Ịbámbà nke ajọ Jezebel tinyere egwù nime obi Elaija, o wee “je n’ihi ndu-ya.” Ọ bụ ihe pụtara ìhè na o kpeghị ekpere, Elaija wee gbaa ọsọ jee zoo onweya.

O kwesịrị ka Elaija kpee ekpere jụọ kwa Chineke ihe ọ ga-eme. Ka anyị na-aga n’iru ịmụ ihe ọmụmụ a, anyị ga-amụta na ọ bụghị uche Chineke nye Elaija ịgbapụ. Onyenwe anyị nwere ọlụ nye Elaija ịlụ, ọlụ ahụ adịghị kwa n’ọgba dị n’elu ugwu. Ọ bụrụ na Elaija kpere ekpere, Chineke ga-egosiwo ya rịị ihe ọ ga-eme. Chineke pụrụ iwepụ ịdámbà ọ bụrụ na anyi tụkwasị Ya obi. Ka anyị mụta ihe site ná ndụ Elaija – ikpe ekpere mgbe niile. Oge ụfọdụ Chineke na-achọ ka ndị ya kwuo okwu. N’oge ọzọ Ọ chọọ ka ha nọdụ duu ná-ekwughị okwu. Ka anyị wee mata ihe bụ uche Chineke, ka anyị cheta ikpe ekpere. Mgbe ị nọ n’obiabụọ, kpee ekpere rịọ kwa Chineke ka O duzie gị. Onye dere Abù Ọma sịrị, “Nka bu Chineke, bú Chineke-ayi, rue mgbe niile ebigh-ebi; Ya onwe-ya ganēdu ayi rue n’inwu-ọnwu” (Abù Ọma 48:14).

Nime Ọzara

Elaija jere ijé dị anya site na Jezereel ebe Jezebel bi. Ọ gbara ọsọ jee Bia-sheba, ọtụtụ maịlị n’akụkụ ebe ndịda, n’ala Juda. Site n’ebe ahụ, o jee ijé otù ụbọchị n’ọzara. Ka Elaija nọdụrụ n’okpuru otù osisi broom, obi adịghị ya ụtọ, n’ihi na ọ nọghị ebe Chineke chọrọ ka ọ nọdụ. O kpebìri na ya chọrọ ịnwụ. Ọ gbapụrụ ka Jezebel ghara iwepụ ndụ ya, ma ugbu a ọ chọrọ ịnwụ.

Ndị Mmụo ozi Ná-eje Ozi

Onyenwe anyị matara ebe Elaija nọ na ọ chọkwara inyeaka. Jehova wee zipụ mmụọ ozi nke ji kwa nri ọ ga-enye Elaija. O rie achịcha ahụ esiri n’elu nkume dị ọkụ. Ñụọ kwa mmiri sitere n’ite ahụ. Elaija wee jee ijè iri ụbọchị anọ n’ọzara n’ike nke nri ahụ, Ị pụrụ ikwu ụzọ abụọ ọzọ dị iche iche nke Onyenwe anyị siteworo zigara Elaija nri? (Lee I Ndi Eze 17:6, 13-16).

Ọtụtụ mgbe Chineke na-eziga ndị mmụọ ozi Ya inyere ndị Ya aka. Onyenwe anyị zigara mmụọ ozi inyere Moses na Ụmụ Israel aka mgbe ha na-apụ site n’ala Ijipt (Ọpupu 14:19; 23:20). Jehova zigara mmụọ ozi imechi ọnụ ọdụm mgbe atụbàra Daniel n’òlùlù ọdụm (Daniel 6:22). Otù mmụọ ozi kpọpụtara Pita na ndịọzọ ná-eso ụzọ Jisọs site n’ụlọ mkpọrọ (Ọlu Ndi 12:7; 5:19). Ndị mmụọ ozi jeere Jisọs ozi mgbe Ọ nọ n’ọzara (Mak 1:13). Mgbe onye arịrịọ ahụ bụ Lazarọs nwụrụ, ọ bụ ndị mmụọ ozi bugaara ya n’obi Abraham (Luk 16:22). O nwere ike anyị agaghị ahụ ndị mmụọ ozi ahụ mgbe niile, ma Chineke na-ezite ha inyere ndị Ya aka (Ndi Hibru 1:14). Nime Abù Ọma anyi ná-agụ, “Ndi-mọ-ozi-Ya ka Ọ gēnye iwu banyere gi, idebe gi n’uzọ-gi nile. N’elu ọbu-aka-ha ka ha gēburu gi, ka i ghara ikpọbi ukwu-gi na nkume” (Abù Ọma 91:11, 12).

Nime Ọgbà

Elaija wee gbaruo Horeb, ma ọbụ Sainai, “ugwu Chineke.” Ebe ahụ ka ọ gbabàra nime ọgbà. Elaija nọ náánị ya; o nweghi ihe ọ na-eme, ọ pụghị kwa inwe obiụtọ. Jezebel emewo ka ọ daa mbà. Ozi Jezebel mere ka egwù tụọ ya o wee gbapụ. Egbochiwo ọlụ ọ na-alụrụ Onyenwe anyị, o wee ná-emere onwe ya ebere. Ka Elaija zoro nime ọgbà ahu, óké ifufe wee malite. Óké ifufe dị ike nke ukwu na ọ pụrụ itipịa nkume. Emesịa ala-ọma jijiji wee maa n’ebe ahu Elaija zoro. Ọzọ, ọkụ wee dị. Emesịa, Olu ntà dị nwayọ wee bịa, Elaija wee mata na Jehova na-ekwu.

Moses

Moses na Ụmụ Israel nwekwara ụdị mnwapụta a mgbe Jehova nyere ha Iwu Iri ahụ. Ndị ahụ siri n’ụlọikwu ha pụọ izute Chineke. Anwụrụ wee kpuchie ugwu ahụ niile “n’ihi na JEHOVA ridakwasiri ya n’ọku” (Ọpupu 19:18). Ala mara jijiji nke ukwu na ugwu ahụ niile magharịrị. Olu opiike wee dasie uda ike rue kwa ogologo oge. Moses wee kpanyere Chineke ụkà, Olu nke Chineke wee kpọọ Moses ka ọ rịgota n’elu ugwu ahụ izute Ya. Mgbe Ụmụ Israel hụrụ àmụmà na anwụrụ ná-ekpuchi ugwu ahụ, mgbe ha nụrụ uda égbè eluigwe na opi ike, ha tụrụ egwù wee laa azụ. Ma “Moses biaruru óké ọchichiri ahu nso, ebe Chineke nọ” (Ọpupu 20:21). Ka Chineke na-agwa Moses okwu ná-enye kwa ya Iwu iri ahụ, “ebube JEHOVA biri n’elu ugwu Sainai” (Ọpupu 24:16). Ụmụ Israel naele site n’ebe dị anya, ma Moses na Chineke nọ.

Olu Ntà Dị Ezi Nwayọ

Ọ bụ ezie na Elaija zopụrụ onweya n’ebe Jezebel nọ, o zoghị ezo n’ebe Chineke nọ. Onyenwe anyị matara ebe Elaija nọ, dịka Ọ na-amata ebe ụmụ Ya niile n’otù n’otù nọ. N’oge ọzọ, Onyenwe anyị sịrị: “Ọ di onye ọ bula gēzobe onwe-ya n’ebe ọ bula di nzuzo, Mu onwem we ghara ihu ya anya? … Ọ bugh elu-igwe na uwa ka M’juputara?” (Jeremaia 23:24). David sịrị na ebe ọ bụla ya jere, Jehova nọ n’ebe ahụ: “Ọ buru na achirim nkù nke ututu, biri n’akuku dikarisiri anya nke óké osimiri; ọbuná n’ebe ahu ka aka-Gi gēdurum, aka-nri-gi gējidekwam” (Abù Ọma 139:9, 10). Ebe ọ bụla anyị jere, Onyenwe anyị ná-anọ ebe ahụ ịgwa anyị okwu, inyere anyị aka, na ịgba anyị ume.

Mgbe mkpatu nke óké ifufe, ọgba aghara nke ọma jijiji, na ụzụ nke ọkụ gasịrị, Elaija wee nụ Olu ntà dị ezi nwayọ nke Chineke. Elaija matara na Olu ahụ bụ nke Chineke. O wee guzo ná mkwanye ugwu n’iru Onyenwe anyị, ige ntị.

Ndịọzọ anụwo kwa Olu ntà ahụ dị ezi nwayọ nke Chineke, ma ụfọdụ achọpụtaghị na ọ bụ Onyenwe anyị na-ekwu. Mgbe Jehova kpọrọ Samuel n’aha ya ọ mataghị na ọ bụ Onyenwe anyị na-akpọ ya rue mgbe Ilai gwara ya na Chineke na-akpọ ya. (Lee Ihe ọmụmụ 200). Onyenwe anyị gwara Sọl okwu mgbe ọ na-aga n’ụzọ Damaskọs. Sọl nụrụ ka Onyenwe anyị na-asị, “Sọl, Sọl, gini mere i nēsogbum?” (Ọlu Ndi-ozi 9:4). Ndịkom ha na Sọl so apụghị ikwu okwu mgbe ha nụrụ Olu ahụ ma ha ahụghị mmadụ ọ bụla, ma Sọl chọpụtara na Chineke na-agwa ya okwu. Florence L. Crawford, onye malitere ọlụ nke Oziọma Apostolic Faith, nụrụ Olu ntà ahu nke dị ezi nwayọ nke Chineke ka ọ na-asị, “Nwam, Nyem obi-gị” mgbe ọ na-ete egwú n’ụlọ ite egwú. Chineke agwawo ndịọzọ okwu site n’ịgụrụ ha ụfọdụ amaokwu nime Akwụkwọnsọ. Olu nke Chineke adọwo ndịọzọ akanántị site n’akọnauche ha. Eleghịanya Onyenwe anyị agwawo gị okwu n’Olu ntà ahu dị ezi nwayọ. O nwere ike bụrụ na ị na-alụsị ọlụ ike na i geghị ntị ma ọbụ na ị mataghị ọbụná na ọ bụ Onyenwe anyị na-agwa gị okwu.

Enyere Ọlụ Aga-alụ

Elaija matara na ọ bụ Chineke na-ekwu. O guzoro n’iru Onyenwe anyị ịnụ ozi Ya ọbụná dịka Moses guzoro n’iru Jehova mgbe akpọrọ ya ijé nápụta Ụmụ Israel site n’ịbụ orù n’Ijipt. Moses abịawo kwa n’otù ebe a, “biarue ugwu nke Chineke, rue Horeb,” mgbe o wezugara onweya ile osisi ntà ahụ ná-ere ọku na ịnụ Olu nke Chineke (Ọpupu 3:1-4).

Elaija nụrụ ka Chineke na-asị, “Gini ka i nēme n’ebe a, Elaija?” N’ọzịzá ya, Elaija malitere inye ihe ngọpụ dị iche iche na ịkọwa ihe kpatara o ji zoo n’ọgbà. Ọ sịrị na Ụmụ Israel ekwenyewo ka egbuo ezi ndị amụma niile ọzọ nke Jehova, na Jezebel abàwo kwa mbá iwepụ ndụ ya, nke a mere o ji gbapụ. Jehova gwara Elaija na ọ ka dị ndị Israel ruru puku asaa (7000) kwesịrị ntụkwasịobi nye Chineke ndị ná-adịghị efè Beal òfùfè.

Onyenwe anyị ka nwere ọlụ Elaija ga-alụ. Enyere Elaija iwu ka o jee lụọ ọlụ karịa izó onweya. Ihe atọ ka Chineke gwara Elaija ka o mee: ité Hazael mmanụ ịbụ eze Siria, ité Jihu mmanụ ịbụ eze Israel, na ité Elaisha mmanụ ịbụ Onye amụma ga-anọchi ọnọdụ Elaija. Elaija apụghị ime nke a nime ọgbà ebe ahụ ọ nọ. Mgbe ya na Jehova kparịtasịrị ụkà, ọ daghị kwa mbà ọzọ. Mgbe Elaija na-alụ ọlụ ebe ọ pụrụ ịlụrụ Chineke ọlụ, ịdambà wee laa.

Onyenwe anyị nwere ọlụ nye ndị Ya taa. Ọ dịghị atọ Ya ụtọ ka ha ná-ezo ezo ma ọbu ọbụná ịnọdụ ná-emeghị ihe ọ bụla. Ọ dịghị atọ Ya ụtọ ka ha daa mbà. Cheta, mgbe Ụmụ Israel dara mbà n’ụzọ, ha tamurù ntamù, mehie kwa site n’ikwu okwu megide Chineke megide kwa Moses (Ọnu-ọgugu 21:4-7). N’inye ha ahụhụ, ezitere agwọ ahụ yiri ọku n’etiti ha, ọtụtụ Ụmụ Israel wee nwụọ (Lee Ihe ọmụmụ 108).

Ọ na-atọ Chineke ụtọ mgbe ndị Ya ná-alụrụ Ya ọlụ. Ọ ná-atọ Ya ụtọ ka ndị Ya kpeere Ya maka nduzi n’ihe niile na n’oge niile. Jisọs bụ ihenlereanya anyị. Mgbe Jisọs bụ nwata, Ọ sịrị, “Aghaghm idi n’ihe nke Nnam” (Luk 2:49). Mgbe Jisọs bụ okorọbịa, Ọ sịrị: “Ayi aghagh ilu ọlu nke Onye ziterem, mgbe ubọchi fọduru: abali nābia, mgbe ọ digh onye ọ bula puru ilu ọlu” (Jọn 9:4). Ndị nke Chineke nwere ohere ugbu a ịlụrụ ya ọlụ, na ịbụ ezi ndị ná-eso ụzọ Onyenwe anyị. Ọ sịwo, “Ihe ọ bula aka-gi nāhu ime, were ike-gi me ya” (Eklisiastis 9:10).

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Gịnị bụ akụkọ Ehab wegaara Jezebel?
  2. Gịnị ka Jezebel bara mbà na ya ga-eme Elaija?
  3. Gịnị mere Elaija ji gbapụ jee n’ọzara?
  4. Òlee otú mmụọ ozi Jehova ji nyere Elaija aka?
  5. Òlee ebe Elaija chọtara ebe mgbabà?
  6. Òlee otú Chineke si gwa Elaija okwu?
  7. Ònye bụ onye ọzọ nụworo Olu Chineke n’ụdị ahụ?
  8. Gịnị ka Chineke gwara Elaija?
  9. Gịnị mere Elaija ji da mbà?
  10. Gịnị bụ ọlụ Onyenwe anyị nwere nye Elaija ịlụ?