I Ndi Eze 20:1-43

Lesson 299 - Junior

Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISI: “Ka onye nēke ekike-agha-ya ghara ito onwe-ya dika onye nēkepu ya” (I Ndi Eze 20:11)
Notes

Okwukwe Ná-énweghị Nchègharị

N’ule nke elere Elaija n’elu Ugwu Kamel, Chineke gosipụtara Onweya na Ya bụ ezi Chineke nke Eluigwe na ụwa site n’izidata ọkụ site n’Eluigwe irechapụ àjà ahụ nke Elaija chụrụ. Mgbe Israel niile náasị, “JEHOVA, Ya onwe-ya, bụ Chineke,” ná-arụghị ụkà, Ehab sokwara ha kwuo otù ihe ahụ. Ma Ehab échègharịghị.

Ọtụtụ mmadụ kwere na Chineke dị, ọbụná ụfọdụ ga-ekpere Ya mgbe ha nọ ná nsogbu. Ma ebe ọ bụ na ha échègharịghị site ná mmehie ha niile, ha abụghị ndị Kraist. Ọbụná ụfọdụ na-asị na ha kwere na Jisọs bụ Ọkpara Chineke, ma ha na-anọgide n’ime otú dị ha mma, ha adịghị arịọ kwa onye ọ bụla ka ọ gbaghara ha. Ezi nwa Chineke bụ onye ná-abụghị náánị na o kweere na Chineke ebighị ebi na Ọkpara Ya dị nsọ, kama onye matara na ya emehiewo megide Chineke ahụ dị nsọ na ya kwesịkwara ichègharị ka ewee zọpụta kwa ya site ná mmehie niile ya.

Ohere Ọzọ

Chineke nyere Ehab ohere ọzọ. Otù ugbò ọzọ Chineke gaje igosi Ehab na Ya nwe ike niile dị n’Eluigwe na n’ụwa.

Ben-hedad, bụ Eze Siria, chịkọtara óké ụsụ ndị-agha ya na ọtụtụ ịnyịnya na ụgbọala, wee nọchigide obodo Sameia. Ndị-eze iri atọ na abụọ sokwa ndị-agha ahụ, ha niile jikeere ịlụso Israel ọgụ. N’oge a, Sameria bụ isi obodo nke ebo iri nke Israel ndị Ehab na Jezebel na-achị.

Egwù Chineke na-eme ka mmadụ bụrụ diike, ma egwù mmadụ na-eme ka ọ bụrụ onye ụjọ. Ehab bụ onye ụjọ; mgbe Ben-hedad chọkwara ka enye ya ụtụ nke ego, ọbụná kwa èzínaụlọ nke Ehab, ná-enweghị inyeaka Ehab sịrị, “Dịka okwu-gi si di, Onye-nwem, eze; nke gi ka mu onwem na ihe nile m’nwere bu.”

Ehab bụ onye elereanya na ọ bụ onye ọchịchị nke ndị nke Chineke arọpụtara, ma ọ rịọghị Chineke mgbe ọ bụla ka O nyere ya aka. Lee otú ọchịchị ya ga-adịworị iche ọ bụrụ na o kpere ekpere dịka Solomon kpere: “Ma nye orù-Gi obi nānu ihe ikpe ndi-Gi ikpe, ighọta ihe di iche n’etiti ezi ihe na ihe ọjọ; n’ihi na ònye puru ikpé ndi-Gi nka di arọ ikpé?” (I Ndi Eze 3:9).

Mgbe Ben-hedad hụrụ na Ehab kwenyere ọsọsọ n’ihe ya kwuru, o wee chọ ihe karịrị. Ma n’oge a ọ chọrọ karịa ihe Ehab pụrụ inye. Gịnị ka Ehab pụrụ ime? N’azụ mgbidi nke obodo ahụ ka ụsụ ndị-agha nke Siria nọ, nime obodo ka Eze Israel na ndị ya egwù jideworo nọ.

Nlekọta nke Chineke nye Ndị Ya

Ehab kpọkọtara ndịokenye niile nke Israel maka ndụm-ọdụ. Ha aghaghị inweworị okwukwe ntà nime Chineke, n’ihi na ha jiri mkwuwaokwu gwa Ehab ka ọ ghara ikwenyere Ben-hedad: pụọ jee lụsoo eze ahụ ná-amaghị Chineke ọgụ. Ewezuga inyeaka Chineke ime ihe dị otú ahụ ga-abụ mmadụ igbu onwe ya, ma Chineke ka na-elegide anya n’ebe ndị Ya nọ ná-agbanyeghị eze ọjọọ ha nwere.

Mgbe Ehab zigaara Ben-hedad ozi na ya ekwenyeghị n’ihe o kwuru, iwe were Ben-hedad nke ukwu. Ma na nganga ya ọ ka chère na ya gaapụ imeri ndị Israel olenaole bi na Sameria. Ọ bụ na o nweghị óké ụsụ ndị-agha ji ịnyịnya na ụgbọala, ọ bụ kwa na iri ndị-eze atọ na abụọ anọnyereghị ya? Eleghịanya ọ ga-achị ọchị n’échìchè Ehab chère na ọ pụrụ iguzo imegide ya. Ben-hedad jiri obi ọjọọ gwa Ehab na ụsụ ndị-agha nke Israel ga-esoro ya ọ bụrụ na enye ha ohere ịrọrọ.

Ọzịzà nke Ehab abụrụwo ilu: “Ka onye nēke ekike agha ya ghara itó onwe-ya dika onye nēkepu ya.” Ya na ilu nke yiri, “Agụkọla ụmụ-ọkụkọ gị mgbe ha ka nọ n’àkwá.” Ọ ga-akara Ben-hedad mma ichere hụ ọ bụrụ na ndị ahụ gaesoro ya. Chineke aghaghị ekwe ka eze ná-amaghị Chineke merie ndị Ya, o zigaa onye amụma ka ọ gwa Ehab ijikere maka agha; O kwe kwara nkwà na Ehab ga-enwe mmeri. Ọ gaghị abụ site n’ike Ehab na ndị-agha ya, kama Chineke ga-egosi ike Ya otù ugbò ọzọ dịka Jehova Chineke.

Ịñụbiga Mmanya Ókè

Ndị-agha Ben-hedad riri nne, ọ tụkwasị kwara obi na ndị-eze na ndị-agha ahụ ga-enwetara ya mmeri n’agha ahụ. Nime óké ntụkwasịobi ahụ, ya na ndị isi ya wee nwee nnọkọta nke ịñụ manya, ha nọgidere n’ịñụ mmanya ruo mgbe ha ñụbigara ya ókè. Ọtụtụ agha ka ndịagha náalụ ya daworo n’ihi na ndị isi agha abụrụwo ndị ná-adịghị ike n’ihi ịñụ mmanya. Ọbụná mba na-ada n’ihi ịñụbiga mmanya ókè nke ndị isi ha. Nwoke ahụ nwere amamihe adọwo anyị akanántị sị: “Elekwasila manya vine anya mgbe ọ nācha ọbara-ọbara, mgbe ọ nēnye ụdị-ya n’iko, … N’ikpe-azu-ya ọ bu dika agwọ ka ọ nāta, ọ bu kwa dika aju-ala ka ọ nātu” (Ilu 23:31, 32).

Mgbe ndị-agha Israel dakwasịrị óké ụsụ ndị-agha nke Siria, ha apụghị ịlụ agha ma ọlị. Onye ọ bụla n’etiti ndị-agha Israel gbukwara otù onyegha nke Siria, Ben-hedad na ndị-agha fọdụrụ wee gbalaga n’ihi ndụ-ha.

Chineke nke Ndagwurugwu Niile na Ugwu Niile

Chineke enyewo Israel mmeri; ma nke a aghaghị abụ ọnwụnwa ikpe-azụ aga anwa Israel. Onye amụma wee bịakute Ehab ịgwa ya na n’ọgwụgwụ arọ, ndịagha Siria ga-ejikere kwa imegide Israel ọzọ.

Anyị na-añụrị ọñụ mgbe anyị meriworo n’agha ọ bụla megide onyeiro nke mkpụrụobi anyị, ma mgbe ahu abụghị mgbe anyị ga-arapụ ịnọ na nche. Ka oge ra anyị na-adị ndụ n’ụwa, ekwensu ga-agbalị ime ka anyị chigharịa site n’ijé anyị dịka ndị Kraist. Anyị aghaghị ịnọ na nche mgbe niile ka anyi wee nwee ike iguzogide mmegide aghụghọ ya. Ọ bụrụ na ọ pụghị imeri anyị n’otù ụzọ, ọ ga-anwa ụzọ ọzọ. Ben-hedad mere ngọpụ n’ọdịda ya nke mbụ site n’ikwu na Chineke Israel bụ Chineke nke ugwu, na ọ bụrụ kwa na Ndị Israel ga-alụ agha na ndagwurugwu, na Chineke ha agaghị enwe ike inyere ha aka. Chineke na-ege ntị, Ọ nụkwara ịnya-isi nke Ben-hedad.

Ndị agha Siria dị ka ha jupụtara ala ahụ niile. Anya mmadụ apụghị ịhụzu ndịagha na ịnyịnya na ụgbọala n’ihi ọtụtụ ha dị. Ndịagha Israel nọ kwa na ndagwurugwu ahụ dịka “ìgwè ewu ntà abua.” Gịnị bụ ohere ndịagha Israel nwere ugbu a imeri?

Nime ndagwurugwu ahụ, Chineke gosipụtara na Ya bụ kwa Chineke nke ndagwurugwu niile. Chineke nke Israel jikeere inyere ndị niile ná-akpọku Ya aka, ma ha nọ n’elu ugwu ma-ọbụ nime ndagwurugwu. Ruo abalị asaa ụsụ ndị agha abụọ ahụ nọ ná ncherịta iru ná-eche nche ná-ele kwa onweha. Emesịa agha ahụ wee malite. Lee kwa óké mmeri Israel nwere! Ndị-agha ahụ dịka “ìgwè ewu nta abua” tigburu narị puku (100,000) ndị ji ụkwụ eje n’etiti ndị-agha nke Ben-hedad; mgbidi wee dakwasị puku mmadụ iri abụọ na asaa (27,000) mgbe ha na-anwa ịgbalaga wee zoo.

Erughị Eru

Nke a bụ ohere Ehab nwere ibibi ndị niile ná-amaghị Chineke nọ n’ala ahụ. Mmeri ebube niile a kwesịrị ime ka o nwee ume ịlụ agha nke Jehova wee bibie mmehie. Ma o mere ihe eze ọzọ nke Israel mere -- ọ rapụrụ eze ahụ na mgbe Chineke sịrị ya bibie ihe niile. Ndịa bụrị ndị na-eme mmehie nke ukwu, ugbu a bụ kwa oge nke Chineke izidakwasị ha ikpé. Arọpụta kwara Ehab dịka ihe ọlụ aga-eji lụọọlụ a nye Jehova -- o wee daa; ọ lụghị ọlụ ahụ enyeworo ya ịlụ.

Nke a bụ kwa otú o si kwenyere ndịiro ya: Ndị orù nke Ben-hedad jekwuuru Ehab na-eké ákwá mkpé n’úkwù ha igosi mweda n’ala ha, ịrịọ ndụ nke eze ha. Ehab kwa, karịa ọ ga-eguzoro ezi ihe, wee kpọọ eze ahụ ná-amaghị Chineke nwanne ya. Ọnọdụ ya nime ụwa mere ka anya Ehab kpue ìsì n’ebe mmehie ya dị.

Baịbụl na-agwa anyị na ọ bụrụ na otù onye yiri uwe mara mma, ma ọbụ onye dị mkpà n’ụwa, anyị wee lezie ya anya nye kwa ya ọnọdụ kachasị mma ebe anyị na-eleda ogbenye anya, anyị na-egosi ile mmadụ anya n’iru. “Ùnu enwegh obi abua nime onwe-unu, ùnu aghọgh kwa ndi-ikpé nēchè échìchè ọjọ?” Ọtụtụ mgbe ọnọdụ na udé-aha nke mmadụ n’ụwa na-emechi anya ụmụ mmadụ n’ebe mmehie nke dị na ndụ onye ahụ dị.

N’ihi na Ben-hedad bụ eze, Ehab gosiri ya amara wee kpọọ ya nwanne. Ndị-orù ahụ rịbara ama otù ugbò ahụ, ha wee mee ngwa kwue ihe ahụ o kwuworo sị, “Nwa-nne-gi, bú Ben-hedad.” Ehab bụ otù onye nime mbà nke Chineke rọpụtara o kwesị kwara idebe onweya ọcha pụọ ná mkparịta ọjọọ. Kama nke a, Ehab kpọrọ Ben-hedad ka ọ bịakute ya, ka ha ná-agbagharị kwa nime ụgbọ-ala ha mere otù ọgbụgba ndụ nke baara Ben-hedad urù, Israel wee tụfue kwa ọzọ.

Abaara Ehab Mbá

Chineke zigara onye amụma ịgwa Ehab na o mewo ihe ná-ezighị ezi. Onye amụma ahụ jiri otù ihe mere eme mee ka ọ ghọta mkpà ọ dị ya ilekọta ọlụ nke Onyenwe anyị. Ọ sịrị na otù onye kpọnyere ya otù onye mkpọrọ ilekọta ma ebe ọ na-eme nke a na nke ọzọ, onye mkpọrọ ahụ wee funarị ya. Nke a bụ ihe siri ike nke ukwu; n’ihi na ọ bụrụ na achọtaghị onye mkpọrọ ahụ, ndụ onye ahụ enyere ya ilekọta ya ga-ala kwara ndụ ya. Ehab chère na onye nché ahụ kọrọ akụkọ a elezighị anya, na o kwesị kwara ịnwụ. O kwesịrị ịmata na mgbe ọ ná-alụghị ọlụ ya, ọ ga-akwụ ụgwọ ya.

Onye amụma ahụ wee wezuga ihe o ji nwoghaa onweya, Ehab wee mata ya. Ewo Ehab! Ọ bụ ya bụ onye enyeworo ọlụ ịlụrụ Onyenwe anyị, o wee kwee ka onye mkpọrọ ahụ gbalaga. Chineke chọrọ ka Ehab bibie Ben-hedad, ma ya na Ehab emewo ọgbụgbandụ nke ịbụ enyi, Ehab wee kwee kwa ka ọ dị ndụ. Ahụhụ ya bụ na ya na ndị ya ga-enye ndụ ha n’ihi na ha emezughị ihe Onyenwe anyị chọrọ ka ha mee.

Ọlụ Anyị

Chineke enyewo anyị otù ihe ilekọta. Anyị nwere ọlụ anyị ga-alụrụ Ya -- ọlụ dị mkpà nke irita mkpụrụobi n’urù nye Ala-eze Ya. Ma ànyị na-alụsị ọlụ ike n’ebe a na n’ebe ọzọ, ná-eme nke a na nke ọzọ, na anyị adịghị enwe ohere iritara Jisọs mkpụrụobi n’urù? Ka anyị tụgharịa uche banyere ihe anyi naeme. Ànyị nwere Mmụọ Chineke n’ihe anyị na-eme na ana-azọpụta mkpurụobi? Ọ bụ mmụọ ahụ na-akpọ ụmụ mmadụ bịaruo nchègharị, ọ dịghị kwa ihe ọ bụla anyị onweanyị naeme pụrụ ịlupụta ezi ihe ọ bụla ọ bụrụ na Mmụọ Chineke anọghị ya. Ihe anyị na-eme kwa aghaghị ịbụ n’ihi otuto nke Chineke ọ bụrụ na anyị na-ele anya ịnata ụgwọọlụ site n’aka Ya.

Ọlụ anyị bụ iritara Jisọs mkpụrụobi n’urù. Ọ bụrụ na anyị emeghị ya, gịnị ka anyị ga-ekwu mgbe anyị ga-eguzo n’iru Onye-ikpé ukwu ahụ? Jisọs n’Onweya sịrị: “Ọ bugh onye ọ bula nke na nāsim, Onye-nwe-ayi, Onye-nwe-ayi, gābà n’ala eze elu-igwe; kama ọ bu onye nēme ihe Nnam Nke bi n’elu-igwe nāchọ” (Matiu 7:21).

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Ònye bụ Ben-hedad?
  2. Òlee ebe ọ bịara ibuso Israel agha?
  3. Gịnị bụ ọzịzá Ehab nye ịnya-isi nke Ben-hedad mgbe ọ sịrị na Israel niile ga-esoro ya?
  4. Gịnị kpatara mmeri emeriri Ben-hedad?
  5. Oge ra añaa ka o ruru tutu ndị-agha Siria abịa imegide Israel ọzọ?
  6. Òlee otú ndị-agha Israel ra ma ewere ha tụnyere ndị-agha Siria?
  7. Ndị Siria ole ka egburu n’agha ahụ?
  8. Gịnị bụ ọlụ Chineke nwere nye Ehab n’oge a? Ehab ọ lụrụ ya?
  9. Gịnị bụ ọlụ anyị n’ifè Chineke?
  10. Gịnị na-eme ka ọlụ anyị nye Jisọs dị ìrè?