I Ndi Eze 21:1-29

Lesson 300 - Junior

Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISI: “Lezienu anya, debe-kwa-nu onwe-unu ka unu ghara inwe anya-uku ọ bula: n’ihi na ọ bugh n’ihe ọ nwebigara ókè ka ndu madu di, o sigh n’ihe ọ nwere puta” (Luk 12:15).
Notes

Ntụpụta Ọhụụ

Chineke ekwuwo okwu ikpé megide Ehab n’ihi ajọomume ya. Ma karịa ichègharị site ná mmehie ya mgbe o matara na ọgwụgwụ ya dị nso, ọ tụrụ àtụmàtụ ime iheọjọọ karịa.

Otù nime ndị agbataobi Ehab nwere ubi vine nke Ehab chọrọ iwere. O jikeere ịkwụ ụgwọ ya. Ọ gbalịkwara ịrụ ọnụ-ahịa ya. Ma Chineke enyewo ndị Israel iwu ka ha ghara iré ala ha; Nebot kwa, onye nwe ubi vine ahụ, nwere nsọpụrụ nye Iwu nke Chineke karịa ka eze nwere. Nebot zara sị: “Ya burum ihe árú sitere na JEHOVA, bú inye gi ihe-nketa nnam-ha.” Nebot gara emere onwe ya ihe ngọpụ sị na ebe ọ bu eze nyere iwu, na ya ga-eré ya ná-agbanyeghị ihe Iwu Chineke kwuru. Ụfọdụ mmadụ na-eme ngwà ịchọtara onwe ha ihe ngọpụ mere ha ji kwenyere ihe ha matara na ọ bụghị uche Chineke. Otú ọ dị, Nebot nwere obiike ijigide eziokwu, ọbụná ọ bụrụ na o meghị eze obiụtọ.

Àtụmààtụ Jezebel

N’ezie Ehab enweghị obiụtọ mgbe ọ nụrụ na Nebot agaghị érési ya ala ahụ. Ehab wee mee dịka nwa azụjọrọ azụjọ, wee gaa n’ihe ndina ya na-ewe iwe. Ma Jezebel, ajọ nwunye ya, ga-elezi anya ịhụ na Ehab nwetara ihe ọ chọrọ. Ọ bụ onye aghụghọ, o wee malite ịtụpụta otú ọ pụrụ isi nápụta Nebot ubi vine ahụ nye di ya iwe ji. Ọ bụghị ya bụ Eze Israel? Ọ bụ na o kwesịghị inweta ihe ọ bụla ọ chọrọ?

Na mbụ Jezebel dere akwụkwọozi, kaa ya akàrà n’aha eze, wee zigara ha ndịokenye nọ n’obodo ebe Nebot bi. Nime akwụkwọozi ahụ enyere iwu ka akpọsaa obubu ọnụ, na idebe Nebot n’iru ndị ahụ niile. Eleghịanya ha ga-eme ka o chee na achọrọ ibuli ya elu. Ma ha ga-achọta ndịkom abụọ jọgburu onweha ịgba-àmà mkwulu megide ya. Ha ga-abụ ndị-àmà ụgha, n’ihi na Nebot emeghị iheọjọọ ọ bụla.

Iwu Chineke kwuru na apụghị ịma mmadụ ikpé n’ọnụ ndị-àmà ná-erughị abụọ. “N’ọnu ndi-àmà abụa, ma-ọbu ndi-àmà atọ, ka agēme ka ọ nwua, bú onye gānwu anwu; agagh-eme ka ọ nwua n’ọnu otù onye-àmà” (Deuteronomi 17:6). O sighị ike inweta ndị-àmà ụgha abụọ ọ bụrụ na akwụrụ ha ụgwọ maka ya. Ọtụtụ ndị ná-ekwesịghị ntụkwasịobi dị ndị ga-arara ọbụná ndị-enyi ha nye n’ihi ego.

Ndị Egburu N’ihi Okwukwe ha

Ọtụtụ mmadụ ka amaworo ikpé ịnwụ dịka ndị egburu n’ihi okwukwe ha site n’ọnụ ndị-àmà ụgha. Ha kpọtara ndị-àmà ụgha ikwugide Jisọs n’Onweya. Jisọs wee sị: “Orù adigh-aka onye-nwe-ya uku. Ọ buru na ha sogburum, ha gēsogbu kwa unu” (Jọn 15:20). Ndị ná-eso ụzọ Jisọs Kraist ekwesịghị ịdámbà ma ọbụ tụọ egwù n’ihi ahụhụ nwere ike ịdakwasị ha n’ihi Ya. Ọ sịrị, “Nwenu obi-ike; Mu onwe emeriwo uwa” (Jọn 16:33), ọbụná ọ bụ ezie na ọ dị ka ndịiro ya emeriwo Ya.

Mgbe anyị bụ ụmụ Chineke, anyị bụ “ndi ha na Kraist nēkekọ.” Ọ bụrụ na anyị soro Ya hukọ ahuhu, aga-enyekọ kwa anyị otuto (Ndi Rom 8:17).

Atụrụ Nebot Nkume

Nebot hụrụ ahụhụ nye kwa ndụ ya n’ihi na o kpebiri idebe Iwu Chineke. Akpọpụrụ ya n’azụ obodo tụọ ya nkume rue mgbe ọ nwụrụ. Lee óké ebube ọ ná-aghaghị inwe mgbe o guzoro n’iru Onye kère ya, ebe o nyeworo ndụ ya n’ihi Chineke ya! Nebot abàwo ná ndụ ebighị ebi, isoro Chineke ya ná ebi mgbe niile.

Nkume ahụ atụrụ Nebot na-echètara anyị banyere nke Stifen, onye Kraist mbụ egburu n’ihi okwukwe ya. Stifen atụghị egwù ịnwụ n’ihi Jisọs, mgbe ọ rapụkwara ụwa nke a anabatara ya dịka nwaeze n’Ala-eze Eluigwe.

Achọpụtara Aghụghọ Ahụ

Ugbu a ubi vine ahụ bụ nke Ehab, Ọ ga-enwe ọñu na ya? Anyaukwu ya akpatawo ọnwụ nke nwoke ná-emeghị iheọjọọ ọ bụla. Ehab ọ pụrụ inwe obiụtọ?

Ana agwa ụmụntakịrị ọtụtụ mgbe na Chineke na-ele ihe niile ha na-eme. Ọ bụghị náánị ụmụ ntà ka Chineke na-ele. Ọ hụwo iwe Ehab, na aghụghọ nke Jezebel. Chineke ahụwo orù Ya bụ Nebot ka ọ na anwụ; edewo kwa ya sị, “Mu nwe ọbọ; Mu onwem gēnyeghachi, ka Onye-nwe-ayi kwuru” (Ndi Rom 12:19). Ọ bụghị ihe dịrị anyị ịgbalị imegwara onye mejọworo anyị. Oge mkpịakọta ga-abịa mgbe Chineke ga-enyeghachị onye ọ bụla. “Mara-kwa-nu mmehie-unu, na ọ gāchọputa unu” (Ọnu-ọgugu 32:23).

Ikpé ịpụnara mmadụ ihe na igbu ọchụ mara Ehab, Chineke gaje kwa ịta ya ahụhụ. Ọ bụ eze Israel, ma ebube nke oche-eze ahu agaghị adịgide n’èzínaụlọ ya. Ọ dịghị nwa ya nwoke ga-abụ eze n’ọnọdụ ya, n’ihi na Chineke sịrị na ụmụ ya ndịkom niile ga-anwụ -- agaghị enye ha ọbụná ezi òlìlì. Aga-enye nwunye ya ahụhụ nke ọnwụ ihere n’ihi mmehie ya. Ihe a niile bụ ụgwọ-ọlụ nye mmehie niile nke Ehab. Ọ bụghị mmadụ niile ka anaebu ụzọ gwa ihe ga-abụ ahụhụ ya; mgbe ụfọdụ ndị ajọomume agaghị anata ahụhụ n’ihi mmehie ha. Ma Baịbụl na-asị, “Ugwọ-ọlu nke nmehie bu ọnwu” -- ọnwụ ebighị ebi. Chineke na-ahụ mmehie, mmehie ahụ ga-eweta kwa ahụhụ ọ bụrụ na echègharịghị site na ya.

Ebere

Chineke n’ebere Ya na-agbaghara mgbe anyị chègharịrị. Ekwuru banyere Ehab na ọ kpasuru Jehova bụ Chineke iwe karịa ndị eze niile ọzọ nke Israel, ndị buworo ya ụzọ chịa; ma, mgbe Elaija, Onye amụma nke Chineke, bịara gwa ya banyere ikpé nke ọ ga-anata n’ihi mmehie ya, Ehab wedara onwe ya, yiri ákwà mkpè, kpee kwa ekpere. Chineke hụkwara nke ahụ. O wee ziga Elaija ka o jee gwa Ehab na n’ihi na o wedara onweya n’ala, ikpé niile ahụ agaghị abịakwasị ụlọ Ehab rue mgbe ọ nwụrụ.

“O sitere n’ebere nile nke JEHOVA na emegh ayi ka ayi gwusia, n’ihi na obi-ebere-Ya nile agwugh” (Abù Ákwà 3:22). Mmadụ niile emehiewo, ọ dị kwa mkpà na aga-echègharị ka ewee nweta kwa nzọpụta, ọ bụ ezie na mmehie ahụ nwere ike dị ka ọ dị ntà. Eleghịanya mmadụ agaghị echè échìchè igbu mmadụ ka o wee nweta ihe ọ chọrọ; ma ọ bụrụ náánị na o ledara òfùfè ya nye Onye-nwe-anyị ka o wee nweta urù na ihe onwunwe ná-adịghị mkpà, ọ ga-abụ mmehie, ọ ga-adị kwa mkpà ichègharị site na ya.

Anyaukwu

Mmehie nke anyaukwu pụrụ ịmalite n’ụzọ dị ntà. Anyị nwere ike jáá ihe onyeọzọ nwere mma. Ọ dịghị ihe dị njọ dị na nke ahụ ọ bụrụ na anyị nwere ọñụ na onye ahụ nwere ya, anyị achọghị kwa ka ọ bụrụ anyị nwe ya. Ma mgbe anyị malitere ịchọ inwe ihe anyị ná-apụghị inweta ma zọpụ nzọụkwụ ịchọ inweta ya, dịka Ehab mere, mgbe ahụ ọ ghọọ mmehie. Baịbụl na-agwa anyi na anyaukwu bụ ikpere arụsị. Ihe ọzọ dị iche iche adịwo onye ahụ nwere anyaukwu mkpà karịa ihe bụ uche Chineke. “Ka ọchichọ-obi-unu ghara idi n’ihun’anya ego.” Anọla mgbe niile na-ekwu banyere ihe ị ga-enwetara onwe-gi, ma ọbụ otú ị pụrụ isi dị mma karị. Ị ga-enweta ngọzi dị ukwu karị site n’ikwu banyere ihe nke Chineke, na otú ị pụrụ isi nyere ndịọzọ aka: “Ka afọ ju unu n’ihe unu nwere ugbu a: n’ihi na Ya onwe-ya ekwuwo, si, M’gagh-ara gi aka ma-ọli, M’gagh-arapu kwa gi ma-ọli” (Ndi Hibru 13:5).

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Gịnị ka Ehab chọrọ?
  2. Gịnị mere Nebot achọghị inye ya ihe ahụ?
  3. Òlee otú Ehab si mee omume mgbe ọ ná-apụghị inweta ya?
  4. Òlee otú Jezebel si nyere Ehab aka inweta ihe ahụ ọ chọrọ?
  5. Ụdị mmadụ dị añaa ka Nebot bụ?
  6. Òlee ihe Nebot na Stifen ji yie?
  7. Gịnị bụ anyaukwu?
  8. Gịnị bụ mkwà Chineke kwere ndị nwere afọ ojuju n’ihe ha nwere?