Ọlu Ndi-ozi 9:1-31; Ndi Galetia 1:11-19

Lesson 301 - Senior

Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISI: “Mọ Nsọ onwe-ya soro mọ-ayi nāgba àmà, na ayi bu umu Chineke” (Ndi Rom 8:16).
Cross References

I Mpụta ìhè nke Kraist nye Sọl n’ụzọ Damaskọs

1. Enyere Sọl ike ka o jee Damaskọs ijide ndị ná-eso ụzọ nke Kraist, Ọlu Ndi-ozi 9:1, 2; 8:3; I Timọti 1:13

2. Ìhè si n’elu gburu ya àmụmà gburugburu na mberede, otù olu wee site kwa n’Eluigwe daara ya, Ọlu Ndi-ozi 9:3, 4

3. Ekpughere Jisọs, ewee ná-egosi Sọl bụ onye nọ ná mgbagwoju anya ugbu a ihe ọ ga-eme, Ọlu Ndi-ozi 9:5-7; Ndi Galetia 1:11-19; I Ndi Kọrint 15:8; Ndi Efesọs 3:3

4. Sọl kpere ekpere ụbọchị atọ ná-ahụghị ụzọ ná-erighị kwa ihe ọ bụla na Damaskọs, Ọlu Ndi-ozi 9:8, 9

II Sọl, Ngwa-ọlụ Arọpụtara maka NdịMba ọzọ

1. Ezigara Ananaias nke nọ n’egwù, ijékwuru Sọl, Ọlu Ndi-ozi 9:10-14

2. Ọkpụkpọ Sọl na ihe niile nke ọ ná-aghaghị ịhụju-anya nime ha ka ebu ụzọ kwuo, Ọlu Ndi-ozi 9:15, 16; I Ndi Kọrint 15:10; 2 Ndi Kọrint 11:23

3. Emejupụtara Sọl na Mmụọ Nsọ ewee nyeghachị kwa ya ọhụhụ ụzọ na ume ya, Ọlu Ndi-ozi 9:17-19

4. Sọl malitere ikwusa Kraist nime Damaskọs site n’ike dị ukwuu, Ọlu Ndi-ozi 9:20-22

III Mgbapụ nke Sọl site N’aka Ndị Ju

1. Sọl na-agbanarị Ndị Ju ndị ná-achọ iwepụ ndụ ya na Damaskọs, Ọlu Ndi-ozi 9:23-25

2. Banabas na-ekwuchitara ya ọnụ n’etiti ndị nsọ ná-atụ egwù nọ na Jerusalem, Ọlu Ndi-ozi 9:26, 27; Ndi Galetia 1:17, 18

3. Sọl ji mkwuwa okwu ná-ekwusa Okwu Chineke, wee laghachị na Tasọs ịnọ nwa oge, Ọlu Ndi-ozi 9:28-30

4. Mgbe ọtụtụ óké mkpagbu gasịrị, udo bịaghachịrị ná Nzukọ Kraist, Ọlu Ndi-ozi 9:31

Notes
NKỌWA DỊ ICHE ICHE

Mmalite Ndụ Sọl

Ihe ọmụmụ anyị a malitere site n’okwu banyere Sọl, onye ná-akpagbu Nzukọ Kraist nke ná-ewere ịbá mbà na ogbugbu kuo ume megide ndị ná-eso ụzọ Onyenwe anyị. Sọl bụrịị nwa okorọbịa. Eleghịanya ọ bụ onye amụrụ n’oge ahụ amụrụ Kraist. Amụrụ ya na Tasọs nke dị na Silisia, nke dị n’ebe ugwu nke Siria, nime Esia Mainọ. Tasọs bụ obodo dị ukwuu ebe a na-amụ ihe rii-nne, nke yiri obodo Aleksandria na Atens.

Eleghịanya mgbe Sọl gbara arọ iri na atọ, ezigara ya Jerusalem ebe echèrerị na ọ ga-abụ otù onye ga-asọ mpi inwe ọnọdụ n’òtù Nnọkọ ikpé nke a na-akpọ Sanhedrin. Ọ bụ onye azụlitere na Jerusalem n’ụkwụ Gamaliel, onye bụ onye òzízí ukwu n’etiti ndị Sanhedrin. Ọ bụ ohere a na-adịghị enye mmadụ mgbe niile bụ ịnọdụ n’ụkwụ onye òzízí dị otú a, maka inweta ọzụzụ banyere Akwụkwọnsọ na ụkpụrụ nke òzízí Ndị Ju.

Sọl nwere ọtụtụ ihe baara ya urù n’ihe banyere mwekọrịta èzínaụlọ. Ọ bụ onye azụlitere n’èzínaụlọ ezi ndị Jụ. O sitere n’ebo Benjamin, onye Hibru nke Ndị Hibru na onye Farisii nke òtù ahụ nwere aka ike karịsịa. N’ebe ọ nọ, Kraist bụ onye iro nke ndị ná-eso ụzọ Ndị Farisii. Iropụ na ikpochapụ òzízí ọhụụ a nke ndị òtù Kraist nke o chère na ọ bụrịị ihe egwù megide òzìzì Ndị Jụ ghọọrọ ya ihe ná-ere ọkụ n’obi ya. O zubesịrị ike ibibi nzukọ Kraist ahụ nke ná amalite dịka nwa ọhụụ. Mgbe ọtụtụ arọ gasịrị, mgbe ọ na-edegara Ndị Galetia akwụkwọozi, ọ sịrị, “N’ihi na unu nuru ihe banyere ibi-obim n’oge gara aga n’uzọ ndi-ju, na anamesogbu nzukọ Chineke nke uku ri nne, mebi kwa ya: anamaga-kwa-ri n’iru n’uzọ ndi-Ju kari ọtutu ndi-ọgbọm n’etiti mba nkem, ebe obim nānubigara òzízí ahu ọku ókè kari, bú nke nnam-hà nyere ayi n’aka idebe” (Ndi Galetia 1:13, 14).

Obodo Damaskọs

Mkpagbu ahụ nke malitere na Jerusalem mere ka ọtụtụ ndị nsọ gbalaga na Damaskọs. Eleghịanya Sọl chèrèrị na ekpochapụsiwo ndị ná-eso ụzọ Kraist niile nọ na Jerusalem. Ọ ga-anyaworị isi na ọlụzuwo ọlụ ahụ nke ọma. Ugbu a, ọ natawo akwụkwọ inye ike site n’ebe ndị isi nchụàjà nọ, o wee malite ijè ya ịgaru Damaskọs ka o wee dọkpụrụ onye ọ bụla ọ ga-ahụ n’okwukwe a, nwoke ma ọ bụ nwanyị, n’agbụ bịa na Jerusalem.

A na-asị na Damaskos bụ obodo kachasị ochie n’ụwa. Moses kwuru okwu banyere ya (Jenesis 14:15). Ọ dị ihe ra ka maịlị 120 (otù narị na iri abụọ) n’ijé ugwu nke ọwụwa anyawụ Jerusalem, ọ bụ kwa obodo mara mma, nke nọ dịka ihe achọworo mma n’etiti ezi ala dị larịị nke Siria. Osimiri Abana ahụ nke Neaman jiri nyaa isi n’ihi ịdị mma ya, ná-eji mmiri ya nke ná-egbu màrà màrà gabiga n’etiti obodo ahụ.

Amamikpé nke Obi

Sọl na-anụbiga ọkụ ókè n’obi n’ebe Iwu dị, n’isogbu ndị nke Kraist o chèrè na ọ na-eme uche Chineke. O kwuru n’onwe ya na Chineke meere ya ebere n’ihi na o mere ya ná-amaghị ama. Ma anyị kweere na site n’oge ahụ atụgburu Stifen na nkume, na aka amamikpé nke Chineke dakwasịrị Sọl nke ukwuu Onyenwe anyị sịrị ya, “Ọ di ike ka i gba ndudu eji achu ehi ukwu.”

Ọtụtụ oge, mgbe amamikpé nwudere obi nke onye a na-amụbeghị ọzọ, mmehie niile nke o mehieworo ná-abịa n’usoro n’iru ya dịka ihe ngosi. Eleghịanya Sọl hụrụ onwunwu iru nke Stifen na nke ọtụtụ ndị nsọ ndị ọ tụbara n’ụlọ mkporọ. Ikpé mara ya! Ọ bụ kwa onye amara ikpé! Ọ pụrụ ịchọta mgbaghara? Akwụkwọ Testament Ochie, bụ nke ọ matara nkeọma sịrị, “Ọ buru na nmehie-unu adi ka uwe uhie, ọ bu dika snow ka ha gādi ọcha; ọ buru na ha acha uhie uhie dika ogho uhie, ọ bu dika aji ọcha ka ha gādi” (Aisaia 1:18). Sọl bụ onye Farisii, onye ná-emeri eziomume nke aka ya ma mgbe Onyenwe anyị gosiri ya obi ya, ọ hụrụ onwe ya dịka onye isi nke ndị mmehie.

Ụfọdụ mmadụ na-eji eziomume nke aka ha kpuchie onwe ha, nke mere na ha adịghị echè échìchè na ha jọrọ njọ, ma Jisọs sịrị ndị niile nọ ọnọdụ dị otú ahụ, “Ndi-ọna-útú na ndiyom nke nākwa iko nēbu unu uzọ abà n’ala-eze Chineke” (Matiu 21:31). Mgbe ọ bụla mmehie dị n’obi mmadụ, obi ahụ aghọwo nke emebiworo, nke emerụrụ emerụ na nke ná-adịghị ọcha. Náánị otù ụzọ dị a ga-eji gwọọ mmehie -- Ọbara nke Jisọs. “Onye ayi sitere n’Ọbara Ya nwe ngbaputa ayi nime Ya bù ngbaghara nke ndahie nile ayi” (Ndi Efesọs 1:7).

Jisọs Mmezu nke Iwu ahụ

Ìhè ahụ nke sitere n’Eluigwe na olu nke Jisọs jidere Sọl na ndị òtù ya na mberede mgbe ha ná-abịaru obodo Damaskọs nso. Sọl na ndịkom ahụ so ya n’ijè chọpụtara na óké ihe ebube na-eme. Sọl dara n’ala; mgbe olu ahụ sịkwara, “Mu onwem bu Jisus, Onye gi onwe-gi nēsogbu,” ọ raara onwe ya nye Chineke wee tie mkpu sị, “Onye-nwe-ayi, gini ka I nāchọ ka m’me?”

Lee ka ọ ga-ejupụtaworị ná échìchè ọsọsọ. O mere ihe ná-ekwesịghị ekwesị! Ihe ọ na-eme n’oge gara aga ezighị ezi ma ọlị! Jisọs Onye Nazaret bụ Kraist ahụ! Ọ bụ Ọkpara Chineke! Sọl hụrụ na Iwu ahụ nke ọ ná-anụbigara ọkụ ókè mezuru nime Kraist, Onye ya onwe ya sogburu ndị ná-eso ụzọ Ya nke ukwuu riinne.

Ekpere na Ibu Ọnụ

Sọl jiri ụbọchị atọ ná-esote kpee kpere ma bukwa ọnụ. Òlee ụdị ahụhụ, ụdị ịnwụ ọnwụ nke onwe onye dị añaa ga-ewereworị ọnọdụ nime ụbọchị atọ ndịa, ya na óké ọñụ nke ọ ga-enweworị mgbe ọ ga-echeta ebere nke Chineke nwere n’arụ ya, wee kpọọ ya ma rọpụta kwa ya iburu aha Ya! Náánị ezi onye nke Kraist pụrụ ịmata ụdị ọñụ nke ga-adị n’obi onye a nke bụrị onye iro nke Kraist. N’ihi na agbaghaworo ya ọtụtụ ihe, ọ na-ahụ Kraist n’anya ugbu a site n’obi ya niile. O nyefechawo Chineke onwe ya ná okporo ụzọ Damaskọs, bụ ebe, emere ka o nwee ezi nchègharị ná-arụghị ụka. O gosịrị nnukwu nrube isi nye uche Chineke n’ebe ahụ, o mekwara ọtụtụ omume ọzọ nke gosịrị otù ihe ahụ.

Mgbe Ananaias bịara n’ụlọ ahụ ebe Sọl na-ekpe ekpere, ọ sịrị Sọl, “Nwa-nnam, Onye-nwe-ayi, bú Jisus, Onye mere ka ihu Ya anya n’uzọ i si bia, ezitewom, ka ewe me ka i hu uzọ, ka i we juputa kwa na Mọ Nsọ.” Ọ dịghị onye nke a na-edobeghị nsọ nke ga-enwe ike ịnata Mmụọ Nsọ, ọ dịghị kwa onye ná-enwebeghị nzọpụta nke apụrụ ido nsọ. Sọl egosiworị mkpụrụ nke ndụ onye edoro nsọ, ya mere, ọ bụ kwa onye edoziworo tupu ọbịbịa nke Ananaias. Chineke kpọrọ ya ihe ọlụ arọpụtara. O kpeworị ekpere wee rịọ Chineke, hụkwa nime ọhụ ahụ nke Chineke gosịrị ya na Ananaias na-abịa ikpere ya ekpere ka ewee gwọọ ìsì ahụ nke bịakwasịrị ya.

Ìsì nke Sọl bụ ìsì nke anụ-arụ, n’ihi na ọ malitere n’ụzọ nke Damaskọs mgbe Onyenwe anyị mere ka ọ hụ Ya anya. Ọ bụrụ na ọ bụ ìsì nke ime mmụọ, ọ bụghị n’ebe ahụ ka ọ ga-amalite, n’ihi na Sọl bụrị onye kpuru ìsì nke ime mmụọ tupu oge ahụ. Mgbe Ananaias kpeere Sọl ekpere, “ihe dika akpirikpa we si n’anya ya dapu, eme-kwa-ra ka ọ hu uzọ.” Agwọkwara ya! O nwekwara njikere ka awụọ ya mmiri. Ihe ọmụmụ a na-ezi anyị ịdị mkpà nke ọwụwụ mmiri dị mgbe amụsịrị mmadụ ọzọ. Ndị ná-eso ụzọ nke Kraist mgbe ochie leziri anya, ka ha ghara ilelì ndebezu nke ụkpụrụ a dị óké mkpà anya.

Agbanwere Ya

Emere ka Sọl nwee ụdị mgbanwe nke onye ọ bụla ná-enwebeghị rue ebe emere ka aha ya gbanwee ghọọ Pọl. Agbanwere ya site “n’ike dị nsọ,” agbanwere ya “baa ná ndu ọhu di ebube.”

Oge anaghị agbanwe mmadụ. Ike nke uche onwe onye enweghị ike ịgbanwe mmadụ. Ma Kraist nwere ike ime ya, Ọ na-agbanwe kwa obi na omume ndị niile ná-abịakwute Ya n’ezi obi ntiwa. Náánị ike nke Chineke pụrụ iweta ụdị mgbanwe dị otú a nke mere nime ndụ Sọl n’otù ntabi anya. Onye Etiopia enweghị ike ịgbanwe akpụkpọ arụ ya, ma ọ bụ agụ, ịgbanwe àgwà ya. Ọ bụrụ na ha nwere ike, “unu onwe-unu puru kwa ime ezi ihe, bú ndi emere ka unu muta ime ihe ọjọ” (Jeremaia 13:23). Ọlụ amara dị mkpà n’ịlụpụta mgbanwe dị otú a n’obi nke onye a na-amụbeghị ọzọ; otú ọdị, “n’ebe madu nọ nka bu ihe anāpugh ime; ma apuru ime ihe nile n’ebe Chineke nọ” (Matiu 19:26).

Ọ bụ Chineke kèrè obi. Náánị Ya onwe Ya nwere ike ịgbanwe ya. Ọ bụ ọmụmụ ọhụụ na-eweta ụdị mgbanwe nke a. Jisọs gwara Nikọdimọs okwu banyere ya. Nikọdimọs aghọtaghị otú a ga-esi mụọ mmadụ ọzọ mgbe ọ kasịworo nká. Jisọs kọwara ọmụmụ ọhụụ nke a site n’iwere ifufe wee tụnyere ya. Anyị enweghị ike ịhụ ifufe anya, ma anyị pụrụ ịmata mgbe ọ na-efesa anyị n’arụ ma ọ bụ ịhụ ihe ọ na-eme n’akwụkwọ osisi mgbe ọ na-efesa ha. Mgbe Mmụọ Nsọ nke Chineke na-enye obi ndụ ọhụụ, anyị enweghị ike ịhụ mgbe Mmụọ Nsọ na-eme ya, ma anyị pụrụ inwe mmetụta nke mgbanwe ahụ nime obi anyị. Ndị ọzọ ga-ahụ kwa ọlụ Ya nime ndụ anyị. Jisọs sịrị, “Ọ buru na amugh madu ọzọ, ọ pugh ihu ala-eze Chineke anya” (Jọn 3:3).

N’oge ugbu a, ụmụ mmadụ na-anwa iji eziomume nke aka ha dochie n’ọnọdụ ọmụmụ ọhụụ. Ma ọ dịghị ezi ihe ndochi dị. Oziọma nke mgbe ochie bụ náánị ụzọ esi eje Eluigwe. Ekwela ka aghọgbuo gị site n’ịgwa gị na ọ bụ náánị ịnabata Kraist. “Aghagh imu unu ọzọ” Onye ọ bula nke amụrụ ọzọ bụ onye ekèrè ọhụụ. Sọl ghọrọ onye èkèrè ọhụụ nime Kraist Jisọs. Etinyere ịnụ ọkụ dị ichè nime ya -- ịmara náánị Jisọs Kraist na akpọgidere Ya n’obe.

Ọlụ ebube kachasị ọlụ ebube! Sọl onye Tasọs ka emere ka o chigharịa, bụrụ kwa onye agbanwere site n’ịbụ Sọl onye mkpagbu bàà n’ịbụ Pọl Onyeozi!

Ịgba-àmà ya dị óké ịtụn’anya nke mere na ọ bụ ugbò atọ ka edere ya n’Akwụkwọnsọ. Pọl Onyeozi bụ otù nime ndị kachasị ukwu, ọ bụ ezie na ha bụ náánị mmadụ nwere mkpụrụ obi, ndị jègharịworo n’etiti ụmụ mmadụ. Emere ndụ ya ka o jupụta n’ebube site na amara nzọpụta, o ji kwa ya nye n’ijéozi nke Onyenwe ya na Onye nzọpụta ya, Jisọs Kraist site n’ike nke enyere ya, ọ ghọrọ nnukwu onye mkwusa, onye mụtara Okwu Chineke nkeọma, onye mkwusa njègharị na onye ode akụkọ niile banyere ndị nke Kraist.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Gịnị bụ omume ahụ nke Sọl mesoro Ndị Kraist?
  2. Gịnị mere o jiri chèè na ọ naalụọlụ nke Chineke?
  3. Gịnị wetara mgbanwe ahụ nime ndụ ya?
  4. Kọwaa ọmụmụ ọhụụ.
  5. Gịnị mere o ji chèè na ọwụwụmmiri dị mkpà?
  6. Gịnị mere o ji dị mkpà na Sọl ga-agbapụ na Damaskọs?
  7. Òlee otú o siri rapụ obodo ahụ?
  8. Ọ bụrụ na i chèrè na akwụkwọ nke Sọl mụrụ nyeere ya aka ịghọta iwu karịa, kọwaa ụzọ o si bụrụ otú a?