Ọlu Ndi-ozi 9:32-43; 10:1-23

Lesson 302 - Senior

Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISI: “Ọ digh ihe di iche n’etiti onye-Ju na onye-Grik: n’ihi na otù Onye-nwe-ayi ahu bu Onye-nwe ọra madu, buru kwa Onye nwere àkù ri nne inye ndi nile nākpọkụ Ya” (Ndi Rom 10:12).
Cross References

I Njègharị nleta Nke Pita N’etiti Ndị Ná-eso ụzọ Kraist

1. Na Lida, Chineke jiri Pita lụọ ọlụ nke ukwu, Ọlu Ndi-ozi 9:32-35; 4:7-12; 1:8; I Pita 2:9.

2. Na Jọpa, Pita na ndịnsọ hụrụ ike nke Chineke emere ka ọ pụta ìhè, Ọlu Ndi-ozi 9:36-43; Jọn 14:12-14; 15:16.

II Ọkpụkpọ akpọrọ Pita ijé Jọpa

1. Kọniliọs, nwoke ahụ dị nsọ, natara otù ozi doro anya nke sitere n’ebe Chineke nọ, Ọlu Ndi-ozi 10:1-8; I Ndi Tesalọnaika 5:17; I Jọn 3:14, 17; Eklisiastis 12:13; Matiu 19:21; 22:36-40; Abù Ọma 18:6; 34:17; Maika 7:7; Daniel 10:1-12; Luk 1:13.

2. Chineke kpaliri Pita, n’oge kwesịrị ekwesị ka o kpee ekpere, Ọlụ Ndi-ozi 10:9; Ndi Rom 8:26, 27.

3. Pita hụrụ otù ọhụ nke dị ókè mkpà, nke a na-enyeghị ka o were ọnọdụ Okwu Chineke, kama ka o kpughee ozi ya, Ọlu Ndi-ozi 10:10-16; Ndi Efesọs 1:9, 10; Jenesis 1:1-6; 46:1-4; Ezikiel 37:1-14; Ọlu Ndi-ozi 9:10; Ndi Hibru 1:1, 2; Ndi Galetia 1:8, 9.

4. Pita rubere isi ọsọsọ n’ozi ahụ nke sitere n’ebe Chineke nọ bịa mgbe emere ka ọ ghọta isi ọhụ ahụ n’ụzọ niile, Ọlu Ndi-ozi 10:17-23; Jọn 16:13; I Jọn 4:1; I Ndi Tesalọnaika 5:21; Ndi Efesọs 1:10.

Notes
NKỌWA DỊ ICHE ICHE

N’akwụkwọozi mbụ nke Pita degaara Nzukọ Kraist niile dị ná Esia Mainọ -- ọtụtụ nzukọ nke Pọl Onyeozi tọrọ ntọ-ala ha -- ọ dọrọ ndị okenye nọ n’etiti ha aka-ná-ntị ka ha “Nāzunu ìgwè aturu ntà Chineke” ná-elekọta kwa ha anya, “ọ bugh n’ihi na nkpà nākpa unu, kama site n’ọchịchọ obi, dika Chineke chọrọ; ọ bugh kwa n’ihi urù nēweta ihere, kama n’ihi na unu di ọku n’obi, ọ bugh kwa dika agāsi na unu nēme ndi bú ihe-nketa dika unu bu ndi-nwe-ha, kama nēme onwe-unu ihe-atù ìgwè aturu ntà ahu gēñomi” (I Pita 5:2, 3). Ma nime isi okwu nke ihe ọmụmụ anyị, anyị na-ahụ Pita, ná mmalite nke Nzukọ Kraist n’oge ahụ, ka ya onwe ya na-eme ihe ahụ niile nke o mesịrị ná-ede n’akwụkwọ dịka ndụm-ọdụ nye ndị ọzọ.

Kraist akpọworị Pita na mbụ ịbụ onye ná-eso ụzọ Ya, emere ya Onyeozi, enyekwara ya nnukwu ohere inwe nlebà anya dị ukwu nime ihe niile nke na-eme n’oge ịtọ ntọ-ala nke Oziọma mgbe Kraist nọ n’elu ụwa. Pita hụrụ Kraist n’ebube Ya n’Ugwu Mnwogha ahụ. Ọ hụkwara ọtụtụ ọlụ ebube nke alụrụ n’èzínaụlọ ya, na nke alụrụ n’arụ ọtụtụ ndị bịakwutere Jisọs maka ọgwụgwọ na nzọpụta. N’Ụbọchị Pentikọst, ahụrụ Pita ka o jupụtara na Mmụọ Nsọ, n’etiti ndị ná-eso ụzọ Kraist, ka ọ na-erube kwa isi n’ozi ahụ nke Jisọs nyere ya. Pita ji ike ọhụụ ahụ nke batara ná ndụ nke ime mmụọ ya pụta n’Ụlọ elu ahụ, eji kwa ya ná-alụ ọlụ iwetara ọtụtụ ndị ọzọ ozi nke nzọpụta ahụ.

Arọ asatọ agasịwo site n’Ụbọchị Pentikọst. Pita nọ ná-ejègharị, ná-eleta ọtụtụ Nzukọ Kraist na ọgbakọ dị iche iche nke ndị kwere ekwe, ná-agba ha ume, ná-akasị ha obi, ná-eji kwa nri nke mmụọ ná-azụ ha, ná-elekọta kwa ha anya nke ọma. Ebe ọ bụ na “onye-ọlu-ubi nke nādọgbu onwe ya n’ọlụ aghagh ibu uzọ kere òkè ná nkpuru ya” (2 Timọti 2:6), Pita mere ihe ndịa n’ụdị mmụọ na omume ahụ nke ọ gwara ndị okenye ahụ nọ n’Esia na ọ bụ ihe kwesịrị ka ha mee. Ọ lụghị ọlụ nye Chineke dịka onyenwe “ndi bú ihe-nketa nke Chineke.” Ọ bụghị kwa n’ihi “urù nēweta ihere” ka ọ na-achọ dịka ụgwọ ọlụ ya. Ọ “dị ọku n’obi” wee jee ileta ndịa nile, ọ bụghị n’ihi na “nkpa nākpa ya, kama site n’ọchịchọ obi, dika Chineke chọrọ.” Ọ bụ ihe-àtụ nke ìgwè-atụrụ ntà ahụ ga-eñomi, ọ matakwara na aga-akwụghachị ya ụgwọ ọlụ mgbe a ga-eme ka Onyeisi ọzụzụ atụrụ pụta ìhè. Mgbe ahụ “ọ gānata okpu-eze nke ebube ahu nke nādigh-atalata.”

Nsọpụrụ Enyere Kraist na Lida

N’obodo Lida, ka ụfọdụ ndị ná-eso ụzọ Kraist biri. Pita wee jee ileta ha. Anyị amataghị ọtụtụ ihe banyere ọgbakọ ntà nke a, n’ihi na edere náánị ihe ntakịrị banyere ha n’Akwụkwọnsọ. Ma akpọrọ ha ndị nsọ. Anyị matakwara na emere ka okwukwe ha na okwukwe ahụ nke na-asụgharị nime obi Pita Onyeozi bụrụ ihe agbara ume site ná mmekọ dị nsọ nke ọbịbịa Pita lụpụtara.

Lida bụ obodo nke dị n’ọnụmmiri osimiri ebe a na-akpọ Seron ma ọ bụ Sheron, o were anya na ọ dị otù mmetụta nke metụworo ndị ahụ bị n’ebe ahụ site ná ndị nsọ bi na Lida, n’ihi na akụkọ banyere ọlụ ebube ahụ alụrụ n’ebe ahụ gbasara ọbụná rue Jọpa. Mmetụta nke ịkpaụñara Mmụọ Nsọ a kpọtụrụ ruo ọbụná Sisaria, ihe ra ka maịlị iri atọ site na Jopa enwere ike ọ bụrụ ihe dika maịlị iri anọ site na Lida, n’ihi na Mmụọ Nsọ nke Chineke Onwe Ya nke kwesịrị ntụkwasị obi jiri ozi ahụ jee n’ebe ahụ ndịkom nke Chineke ndịa ná-ejébeghị.

Pita hụrụ otù nwoke nime Lida, onye tọgbọworo n’ute ọrịa arọ asatọ, n’ihi na akụkụ arụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ. O nwere ihe dị n’obi nwoke a bụ Ineas, nke ahụ bụ agụ nke ime mụọ, ọchịchọ ahụ nke mere ka Onyeozi ahụ nke Mmụọ Nsọ na-edu bịakute ya n’ute ọrịa ya. Ọ dị kwa okwukwe ahụ nke dị mkpà dị n’obi Ineas nke mere ka o kwere n’Okwu ahụ mgbe Onyeozi gwara ya ka o bilie n’ute ọrịa ya.

Ọ na-esite n’ọchịchọ na agụụ nke ime mmụọ nke dị n’obi onye ọ bụla ime ka Mmụọ Nsọ were ozi na ngọzi niile nke Oziọma nke a baa n’obi ahụ. Ụdị agụụ dị otú a ka a na-ahụ n’obi ndị na-amaghị Chineke dịka otù agụụ ahụ nke na-achọsi ike ihe ahụ nke ha ná-enweghị ike ịkọwa, ihe nke ha ná-enweghị kwa ike ịchọta site n’ikpere arụsị ahụ nke ha ketara n’aka nna ha ochie, ma ọ bụ ná ndụ ha ahụ nke jupụtara n’ikpere ihe efu na iruuju.

Ọchịchọ nke ime mmụọ ahụ nke dị n’obi Abraham mere ka o gee ntị n’ọkpụkpọ òkù nke Chineke. Ndịọzọ nke bi n’ala Ua enweghị ike ịnụ olu nke Mmụọ Nsọ ahụ, ma Abraham nụrụ ya wee rubeisi. Otú ahụ ka ọ dịwokwara n’ọgbọ niile nke akụkọ nke ụwa nke a, otú ahụ ka ọ dị kwa ọbụná n’ụbọchị nke taa. A na-edú ndị agụụ nke ihe ime mmụọ na-agụ garuo n’Isiiyi nke ngọzi niile. Ndị niile na-ele anya “obodo ahu nke nwere ntọ-ala ahu, nke Chineke bu onye-ọkà ya na onye luru ya” (Ndi Hibru 11:10), ka Chineke, Onye ahụ nke ná-adịghị ele mmadụ anya n’iru ga-akpọbata n’obodo ahụ.

Ndị niile bi na Lida na ndị bi n’obosara ala Sheron hụrụ ọlụ ebube alụrụ n’ihi okwukwe nke Ineas na n’ihi ikwesị ntụkwasị obi nke Pita. Pita mere ka amara náánị Kraist, ọ chọghị ka ha too ya onweya. “Jisus Kraist nēme gi ka aru di gi ike,” ka ọ gwara onye ahụ arụ ya ná-adịghị ike; site ná nsọpụrụ ahụ nke Pita nwere n’ebe Kraist nọ n’ihe ọ bụla ọ na-eme, obodo ahụ niile ka akpaliri, ha “we chigharikute Onye-nwe-ayi.” Ọ bụghị Pita ka ndị obodo ahụ chigharịkutere. Ha ahụghị ya dịka otù onye ukwu nke nwere ike niile karịa ibe ya ma ọ bụ onyinye dị iche iche. Ha chigharịkwutere Onyenwe anyị, ọ bụ kwa nime Ya ka ha chọtara nzọpụta; n’ihi na ọ bụ site n’Aha Ya, na site n’okwukwe ekwere n’Aha Ya ka a na-enye nzọpụta, gwọọ kwa ọrịa.

Ọ dịghị ebe ọ bụla nime akwụkwọnsọ nke anyị hụrụ na ezi onye nke Chineke na-eme ka obi ndị nke nọ n’okpuru ya si n’ebe Chineke nọ, ma ọbụ n’ebe Ọkpara Ya Jisọs Kraist nọ, ma ọbụ n’ebe Mmụọ Nsọ nke kwesịrị ntụkwasị obi nọ wezuga onweha. Ndị Chineke niile na-ahụ onweha dịka ihe efù karị kwa na ha bụ ngwa ọlụ nke Chineke ji ná-alụ ọlụ. Ha na-ahụ Chineke dịka Onye na-alụ ọlụ ebube ahụ, Onye na-azọpụta mkpụrụ obi na Onye na-enye mmụọ nke mmadụ ike. Mgbe mmadụ na-ewere otuto ahụ n’onweya ghara inye ya Chineke, Mmụọ Nsọ adịghị alụ kwa ọlụ site n’onye ahụ. Mpako dị nime obi mmadụ ga-akwụsị Chineke nke Eluigwe ịlụ ọlụ otú Ọ ga-alụworị ọ bụrụ na eweere nsọpụrụ na otuto n’ihi ọlụ niile nke Ọ na-alụ nye Ya. Nke a bụ ụzọ nke Chineke. Ọ dịghị kwa ụzọ ọzọ. Lee kwa ka ụzọ ahụ si nnọọ dị ebube!

Nsọpụrụ Enyere Kraist na Jọpa

Akụkọ banyere ọlụ ebube ahụ na óké ntute nke so ya na Lida gbasara ruo ọbụná Jọpa, ihe ra ka maịlị iri na abụọ (ma ọ bụ kilomita 19) site na Lida. Jọpa bụrị obodo nke dị n’akụkụ mmiri, dịka ọ dị kwa n’ụbọchị nke taa, ebe ndị ogbenye na ndị ọgaranya na ọtụtụ ndị si n’obodo dị iche iche bịa bi. Ma n’obodo a nke jupụtara na mmadụ ka ahụrụ otù ọgbakọ nke ndị kwere ekwe.

Otù onye nime ndị ná-eso ụzọ Jisọs dị na Jọpa nwere ajọ ọrịa; ma nime mgbalị ha niile iji wee nyere ya aka, ọ nwụrụ. Dọkas anọchịworị ọnọdụ dị óké mkpà n’etiti mmekọrịta nke ndị ná-esọ ụzọ Jisọs. O jupụtara n’ezi ọlụ jupụta kwa n’ezi àmàrà. Ọ bụ onye ná-eso ụzọ Jisọs, bụrụ kwa onye matara ọlụ kwesịrị ka ọ lụọ n’ebe Chineke na mmadụ nọ. O ji mkpịsị aka ya ná-alụ ọlụ inyere ndị ọzọ aka bụ ndị ọnọdụ ha dị njọ karịa nke ya. Ndịnyom di ha nwụrụ anwụ, bụ ndị mkpà ná-akpá so nime ndị ahụ ketara òkè n’ọlụ ọma ya. O gosịrị na o nwere ezi mmụọ nke ndị Chineke, ndị nwere ịhụn’anya nke Chineke nime ha, ndị ná-adịghi kwa echéfu mkpà nke ụmụnna ha n’ihe banyere mkpà nke ihe ná-adị nwa oge (Gụọ I Jọn 3:16-18). Ma ugbu a Dọkas agabigawo pụọ kwa n’etiti ha site n’ọnwụ, ha ahụwo kwa na ijé ozi ya n’etiti ha bụ óké ihe nke gaje ifunarị ha. Ha zigara ozi ịkpọta Pita, ebe ha maara na Chineke nọnyeere ya, ha nwekwara olileanya na ọ ga-ekpere ha ekpere nke ga-eme ka Chineke meere ha ebere n’oge ahụ ha nọ n’óké ihe mgbu.

Mgbe niile Chineke na-echeta ndị onye ha nwụrụ anwụ. Ọ na-eledata anya n’ebere na ọmiko ịkasị ndị ya niile obi, ná-akasị kwa ndị na-eru uju obi, Ọ na-akwalite kwa ha n’oge mkpà. Jisọs hụrụ anya mmiri nke nwanyị Nain ahụ nke di ya nwụrụ anwụ wee mee ka nwa ya nwoke dị ndụ ọzọ. Ọ kasiri Meri na Mata obi mgbe ahụ o wee mee ka nwanne ha nwoke si n’ílì bilie ọzọ. Elaija bụ Onye amụma nke Chineke hụrụ iru uju n’iru nwanyị ahụ nwe ụlọ ebe ọ na anọ, o wee kpeere Chineke ka O nyeghachị nwa ya nwoke ndụ. Elaisha hụkwara ọnụma na okwukwe, nke dị nime nwanyị Shunem; site kwa n’ekpere nke okwukwe, emere ka nwa nwanyị ahụ dị ndụ ọzọ.

Chineke nwere àtụmààtụ na nzube nime ihe ndịa niile nke na-eme. Nke kachasị nime nkasiobi na ịgbaume ahụ enyere ndịa nọ n’iru uju, site n’ime ka ndị ha nke ha hụrụ n’anya si n’ọnwụ bilie, ọ dị otù ihe nke Chineke mezuru maka ụzọ nke Ya onwe Ya site ná ngọzi niile ọ bụla nke ike Ya. Emere ka ụdị Chineke nime Kraist pụta ìhè, egosikwara na ike Ya na-emeri ọnwụ, site n’ọlụ ebube ahụ ahụrụ mgbe O mere ka ndị nwụrụ anwụ dị ndụ ọzọ. Elaija na Elaisha bụ ndịkom nke Chineke ná mba ndị ná-ekpere arụsị na ndị ná-ajụ Chineke. Chineke nọ ná-emeso Israel ná-agba mbọ ịdọrọ ha nye onwe Ya, O wee rọrọ isite n’ụzọ niile a gosi ike Ya na igosi kwa onye nke bụ ezi Onye amụma Ya, ka ndị Israel wee nara ozi Ya. Emere ka Dọkas si n’ọnwụ bilie n’ihi otù ihe dị mkpà, nke esitekwara na ya lụzuere Chineke ọlu nke ná-agaghị adị otú ahụ mgbe niile ọbụná asị na emere ka ndị ọzọ si n’ọnwụ bilie ọzọ. Agwara anyị sị, “ewe mara ya na Jọpa dum: ọtutu madu we kwere n’Onye-nwe-ayi”. N’ebe a, Chineke mere ka orù Ya bilie, ka O wee nara nsọpụrụ na otuto ka ewee zọpụta ndịkom na ndịnyom.

Ma, ọ bụ ihe mwute na mgbe niile ọtụtụ mkpụrụobi emerụrụ emerụ nke ụmụ mmadụ agaghị ekwe ha hụ ọtụtụ ọlụ nke Mmụọ Nsọ nke Chineke na-alụ, ọbụná n’ọlụ ebube, nke kachasị nke dị otú a. Agwara nwoke ọgaranya ahụ nke nọ nime ọkụ ala mmụọ okwu banyere ụmụnne ya: “Ọ bụrụ na ha anugh olu Moses na ndi-amuma, agagh-eme kwa ka ha kwenye, asi na otù onye esi na ndi nwuru anwu bilie” (Luk 16:31). Chineke na-alụ ọlụ ebube n’ebe Ọ ga-eme ka ọlụ Ya ná-aga n’iru, Ọ pụrụ ime otù ihe ahụ n’ụbọchị taa, Ọ ga-eme kwa otú ahụ n’oge na n’ebe ọ ga-ewetara Ya ihe nlụpụta ahụ nke Ọ chọrọ.

Ọkpụkpọ nke Pita Ijéru Jọpa

Egosikwara ọkpụkpọ òkù nke Chineke n’ebe ụwa dum nọ, ọzọ, site n’okwu banyere Kọniliọs, ọchịagha ná-achị narị ndị agha na Sisaria. Filip, bụ onye mkwusa njègharị, biri n’obodo a ọtụtụ arọ mgbe ya na otù nwoke onye Etiopia, bụ onozi zutesịrị n’akụkụ ndịda nke ọwụwa anyanwụ Jerusalem. Filip bụ otù nime ndịkom asaa ahụ arọpụtara ka ha nyere Ndịozi aka n’ọlụ nke izisa Oziọma (Ọlu Ndi-ozi 6:5; 8:40; 21:8). Ọ bụ ezie na nsọpụrụ ya n’ebe Chineke nọ kwa metụtara ndị obodo ahụ, ọbụná asị na mmadụ niile bi n’obodo ahụ amaghị ya onwe ya iru na iru, anyị matakwara na Mmụọ Nsọ amaliteworị ọlụ Ya ọbụná n’obi nke onye agha nke Ndị mba ọzọ a.

Kọniliọs na-atụ egwù Chineke, ná-ekpekwara Chineke mgbe niile. Mgbe niile ka ọ na anọ na mmụọ nke ekpere, mgbe niile ka ọ na-ekpe kwa ekpere. Ọ bụ onye ná-asọpụrụ Chineke, bụrụ kwa “onye mba Ndi Ju dum nāgbara ezi àmà.” Ọ na-alụ ọlụ ebere ya niile n’ụzọ kwesịrị ekwesị, dịka ekpere ya dị kwa, n’ihi na ha niile rigoro “ibu ihe ncheta n’iru Chineke.” Chineke adịghị edebe ihe ncheta nye iru abụọ ma ọ bụ ezighi ezi. Ya mere, anyị matara na nwoke a bụ onye nke Chineke. Anyị ga-ahụ nime ihe ọmụmụ anyị nke ná-abịa otú esi were Mmụọ Nsọ wụọ ya mmiri; nime amaokwu ole na ole nke dị n’iru, anyị ga-ahụ na onye nke Chineke a bụ onye azọpụtaworo na onye edoworo nsọ tupu oge ahụ Pita jiri bịa n’ụlọ ya. (Gụọ Ọlu Ndi-ozi 15:7-9).

Ụzọ Chineke jiri kpọbata Pita n’ụlọ onye agha a nke bụ onye ná-asọpụrụ Chineke na ezí anyị niile ihe. Chineke na-edozi obi nke agụụ na-agụ maka ịnabata Okwu Ya; Ọ na-edozi kwa mmadụ ahụ onye ga-ewere Okwu ahụ jee gwa mmadụ ahụ. N’otù mgbe ahụ, Chineke ga-anọ ná-edozi ụzọ ahụ; Ọ ga ná-eme kwa ya n’ụzọ nke ọ ga-abụ na mgbe oge Ya bịara, Ọ ga-enyezu ihe niile, ihe niile ga-adị kwa n’usoro iji mee uche Ya. Ọ bụrụ na ndịkom na ndịnyom ga-amụta náánị iweda onweha n’okpuru uche Chineke nke zuru òkè wee chere oge nke Chineke n’ihe niile, ha ga ahụ mmezù nke agụụ nke ime mmụọ ha n’oge ná-adịghị anya.

Ọtụtụ mmadụ ekpewo ekpere siike maka nzọpụta nke ndị ha hụrụ n’anya, ma ọ bụ banyere ndị mmehie nke nọ n’okpuru ha, ha wee bụrụ ndị mebiri ihe ahụ nke ha chọrọ ịhụ mmezù ya site n’ịbụ ndị ná-eme ọsọsọ karị Chineke, na-egbochi kwa ihe niile nke Ọ na-eme maka ọdị mma nke ndị ahụ nọ ezi nso nzọpụta. Ọtụtụ ihe ka a ga-emezu ma ọ bụrụ na anyị ga-ekwe ka O were ụzọ nke Ya, ka Ya Onweya lụ kwa, nime amamihe Ya ná-enweghị àtù, otú ahụ O si hụ ihe ahụ na ọ kachasịrị anyị mma.

Chineke doziri Kọniliọs n’ụzọ niile ọ bụla n’ihi ìhè ahụ nke Ọ gaje inye ya n’oge dị nso. Kọniliọs nwere agụụ nke ihe ime mmụọ ná-ekpesi kwa ekpere ike banyere inweta karị nnukwu ịhụn’anya na àmàrà nke Chineke. Anyị amataghị otú o si mara ihe site n’ilezianya, ma anyị matara na ọ bụ onye edoro nsọ na onye anya nke ime mmụọ ya nwudeworo onyinyo nke ọtụtụ ngọzi nke akwadobere nye ya, nke karịrị nzọpụta na odudo nsọ zuru òkè. N’ezie, agụụ nke Nkwà Nna, Onye nkasịobi ahụ, na-agụsi ya ike, Chineke nọ ná-edozikwara ya ụzọ nke ọ ga-esi wee nata nnukwu ngọzi ahụ.

Ma Chineke aghaghị ijikere ngwaọlụ Ya maka ijéozi a dị mkpà, otú a kwa, Ọ ghaghị ijikere nwoke ahụ, bụ Kọniliọs. Ọ bụghị ihe itụn’anya na ọ bụ nime Pita ka Chineke nwere otù ngwaọlụ onye Ọ ga-ejikere maka ozi nke ime mmụọ ahụ dị mkpà. Ọ bụ mmadụ òle bụ ndị nwere onyinye ụfọdụ, ndị ná-achọghị ka Chineke jikere ha site n’ịkpalite ike ahụ dị mkpà nime ha iji mezuo uche Chineke banyere ha. Pita abụkwaghị onye ahụ na-emekarị ọsọsọ ibutere Chineke ụzọ ọzọ igbochi Chineke site n’ịlụpụta nzube Ya nime ya. Ugbu a ọ bụ onye enwere ike izí ihe, bụrụkwa onye jikeere iso iwu nke Onye nweanyị.

Chineke gwara Pita okwu n’ụzọ ihe iriba àmà, site n’igosi ya ọhụ ahụ emere ka ọ mata isi ya nkeọma mgbe ndịkom ahụ si n’ebe Kọniliọs nọ bịa. Site n’ọhụ ahụ, Pita hụrụ ọkpụkpọ òkù nke Chineke nye ụwa dum. Pita hụrụ nkeọma, nke mbụ nime ndụ ya nzọpụta abụghị náánị nke mbà ahụ arọpụtara, kama na “Chineke abugh onye nēle madu anya n’iru” na ọ bụ kwa “nime mbà ọ bula onye nātu egwù Ya (Chineke), onye nālu kwa ọlu ezi omume, bu onye Ọ nānara nke ọma” (Ọlu Ndi-ozi 10:34, 35).

Pita alaghị azụ n’irubere Chineke isi; n’ihi na ọ matara na ebe Chineke malitere ọlụ, nsọtụ ya aghaghị ịga nkeọma; ebe Chineke meghere ụzọ, a ga-eru ọgwụgwụ ya; ebe Chineke na-akpọ òkù, aga-achọta n’ebe ahụ otù mkpụrụ obi agụụ na-agụ nke ga-abịa nụrụ ozi nke Oziọma. N’otù nime ihe ọmụmụ anyị nke dị n’iru, anyị ga-amụ otú Chineke si mezuo atụmààtụ Ya ka O wee kpọọ Ndị Mbaọzọ nye Onwe Ya, nke O sitekwara na ya mee ka Oziọma jezuo n’ụwa niile site n’ijéozi nke ndị Nzukọ Kraist mbụ n’arọ ahụ niile ná-esoni ngwa ngwa mgbe ahụ awụsara Mmụọ Nsọ.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Kọwa akụkụ ebe Lida, Jọpa na Sisaria dị.
  2. Òlee ụzọ esiri sọpụrụ aha nke Jisọs Kraist na Lida?
  3. Òlee otú esiri sọpụrụ aha nke Jisọs Kraist n’etiti ndị ná-eso ụzọ Jisọs na Jọpa?
  4. Òlee otú anyị si mata na Dọkas bụ onye nke Kraist?
  5. Ònye ka Pita sịrị na Ọ bụ Ya lụrụ ọlụ ebube ahụ?
  6. Gịnị mere nime Lida na Jọpa n’ihi ọlụ ebube ndịa?
  7. Ònye bụ nnukwu onye mkwusa njègharị ahụ nke biworo na Sisaria? Kpọọ aha ihe ụfọdụ mere ná ndụ onye mkwusa njègharị a.
  8. Kwuo otú anyị si mata na Kọniliọs bụ onye nke Chineke.
  9. Kwuo otú Chineke siri jikere Pita maka ọlụ ahụ nke Ọ ga-enye ya na Sisaria.
  10. Mgbe Kọniliọs zipụrụ ndịozi ahụ ijéru Jọpa, o tinyekwara otù onye agha nke na-atụ egwù Chineke onye soro ha jee. Gịnị ka nke a na-egosi banyere omume na ndụ nke Kọniliọs?