Ọlu Ndi-ozi 10:24-48

Lesson 303 - Senior

Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISI: “Ọ gēru kwa na mgbe ikpe-azu, ka Chineke kwuru, M’gāwusa ufọdu nime Mọm n’aru anu-aru nile, bú madu: umu unu ndikom na umu-unu ndinyom gēbu kwa amuma, umu-okorọbia-unu gāhu kwa ọhù, ndi-okenye-unu gārọ kwa nrọ” (Ọlu Ndi-ozi 2:17).
Cross References

I Pita na Sisaria

1. Pita hụrụ Kọniliọs ka ọ nọ ná-echere ya, Ọlu Ndi-ozi 10:24

2. Kọniliọs chọrọ ịkpọ isi-ala nye Pita, ma Pita ekweghị ya, Ọlu Ndi-ozi 10:25, 26; 14:11-18; Nkpughe 19:10

3. Ọtụtụ ndị ikwu ya na ndị enyì ya agbakọwo n’ụlọ Kọniliọs ịnụrụ okwu Pita, Ọlu Ndi-ozi 10:27

4. Pita jụrụ ajụjụ wee nata kwa nzaghachi ihe mere Kọniliọs jiri zie ozi ka akpọọ ya, Ọlu Ndi-ozi 10:28-33

II Okwu Chineke nke Pita Kwuru

1. Eziokwu ahụ n’ụzọ niile gosiri na Chineke abụghị onye na-ele mmadụ anya n’iru, Ọlu Ndi-ozi 10:34, 35; Matiu 5:45; Ndi Rom 10:12

2. Ihe banyere Jisọs ka ekpugheworo ná mkpirikpi nye ndịa, Ọlu Ndi-ozi 10:36-38

3. Okwu Chineke nke Pita kwuru kọwara na Oziọma ahụ bụ eziokwu ma zukwa òkè, Ọlu Ndi-ozi 10:39-43; I Timọti 3:16

III Mmụọ Nsọ ahụ nke Ekwere ná Mkwà

1. Mmụọ Nsọ dakwasịrị ndị niile nụrụ okwu ahụ, Ọlu Ndi-ozi 10:44; 2:1-4; 19:1-7

2. Ibobo nwụrụ Pita na ndị soro ya jee n’arụ, Ọlu Ndi-ozi 10:45, 46

3. Pita nyere ndụm-ọdụ, nye kwa iwu ka awụọ ndị ọhụụ ahụ ná-eso ụzọ Jisọs mmiri, Ọlu Ndi-ozi 10:47, 48; Matiu 28:19

Notes
NKỌWA DỊ ICHE ICHE

“So ha ga, enwegh uche abua, n’ihi na Mu onwem ezitewo ha.” (Maọbụ “Soro ha gaa, enwela obi-abụa banyere ihe ọ bula.”) Ndị ozi ahụ nke sitere n’ebe Kọniliọs nọ abịaruwo n’ọnụ ụzọ ama nke ụlọ Saimọn, onye na-edozi akpụkpọ anụ; Chineke na-edozi obi Pita ka o wee nabata Ndị Mba ọzọ a, na iso ha laghachi n’obodo ha bụ Sisaria. Pita kpọbatara ndịkom ahụ n’ụlọ, n’echi ya o biliri soro ha n’ijè ahụ ịlaghachịkuru ọchị agha ahụ ná-achị narị ndị agha nke ndị Rom. Onye ozi ukwu ahụ mụtara ihe ọmụmụ a nkeọma: ịmata na mgbe ọ bụla emere uche Chineke ọsọsọ, mgbe ahụ ka ọ na-adị mfé karị. Mgbe ọhụ ahụ ka dị ọhụụ n’obi ya na mmụọ ya, Pita soro ha jee; ma asị na ọ nọrị na-atụgharị uche na ya, ọlụ ahụ nke dịrị ya ịlụ ga-abụworị ihe siiri ya ike nke ukwu.

Pita na ụmụnna ndị ya na ha nọrọ na Jọpa matara omume nke ndị Ju n’obodo Jerusalem banyere ndị Israel na Ndị Mbaọzọ imekọrịta ihe. Ọ bụ ihe a na-echè na o zighi ezi n’iwu na onye Ju na onye Mbaọzọ ga-erikọ ihe -- ọ bụghị na Chineke nyere iwu dị otú a mgbe ọ bụla, kama ọ bụ n’ihi na ha ewerewo ome-na-ala dị otú a ná-enyefe site n’aka otù ọgbọ ruo n’ọgbọ ọzọ. Chineke nyeere Pita aka imerị ụdị ndụ dị otú a n’otù ntabi anya, ma Pita mere nkeọma mgbe o mere ihe Chineke chọrọ ọsọsọ. Onye Kraist ọ bụla nke chọrọ inwe mmeri zuru òkè ga-agbaso ụzọ a Pita soro.

Ịrà otù

Mgbe Pita na ndị soro ya n’ijè batara n’ụlọ, Kọniliọs ji óké ọñụ zute ha nke mere na ọ dara n’ala n’ụkwụ Pita ikpọ isi-ala nye ya. Ọtụtụ mgbe, ndị mba nke Ọwụwa anyanwụ na-adara ndị ka ha ukwu n’ala; ma ọ bụ Kọniliọs na-echè na Pita bụ onye ozi pụrụ ichè nke si n’ebe Chineke nọ bịa, ebe ọ bụ mmụọ ozi zitere ya. Otú ọ dị, Pita mere ka aghọta okwu ahụ ọsọsọ, n’ihi na o weliri ya elu sị, “Bilie; mu onwem bu kwa madu.” Ọhụ ahụ nke Chineke gosiri Pita na-akụzi kwa ihe mmụta ọzọ dị mkpà. Ndị Ju bụrị ndị na-eme ngwa ngwa ikwu okwu banyere Ndị Mbaọzọ dịka ha bụ nkịta, ọ na-esi kwa ike ka ha bụrụ ndị jikeere ikwenye na ha na Ndị Mbaọzọ bụ ndị agbata-obi ha rà otù; ma Pita gwara Kọniliọs okwu dịka ọ na-agwa mmadụ ibe ya -- onye ya na ya rà otù.

Ịmata na mmadụ niile rà otù bụ otù nime ihe kachasị nke eji mara okpukpé Ndị Kraist. Ọtụtụ mba agbalịwo ka ha tinye iwu nke iso ụkpụrụ a n’etiti ndị obodo nke ha; ndị nnọkọ ikpé dị iche iche, na nzukọ mkwekọrịta (conventions) dị iche iche anọwo ọtụtụ oge nke ana-apụghị ịgụta ọnụ ịchọ ụzọ a ga-esi wepụ nsogbu nke aràghị otù n’etiti ụmụ mmadụ; ma náánị nime okpukpé nke Ndị Kraist ka a na-achọta ọzịzá nye nsogbu a. Ịbụ onye amụbatara n’èzínaụlọ nke Chineke na-eweta ezigbo ịbụ ụmụnna n’etiti ndị nzukọ, ná-agụghị ọnọdụ, ọcha, ma ọ bụ okpukpé nke òfùfè ya n’oge gara aga. Ọtụtụ òtù dị iche iche na-anya isi nke ukwu banyere ịbụ ụmụnna ha n’egbugbere ọnụ, ma n’omume óké àtụmààtụ ha adịghị abịaru nso ebumn’obi ha. Ezi okpukpé Ndị Kraist enweghị ike ịdapụ wee dị ala karịa nzube a.

Mgbe Pita batara n’ụlọ Kọniliọs, ọ hụrụ ọtụtụ mmadụ n’ebe ahụ ka ha na-echéré ya. Ọ jụrụ ha ihe mere ha jiri zie ka akpọta ya, n’otù oge ahụ kwa ka ọ na-agwa ha n’ezie na onye Ju na-ewetara onweya nleli, nkọcha na mkpagbu site n’ịbịakwute Onye Mbaọzọ. Kọniliọs enweworị ọzịzá. O zigawo ozi ịkpọ Pita n’ihi na mmụọ ozi nke sitere n’ebe Chineke nọ agwawo yarị ka o mee otú ahụ, Kọniliọs wee sị, “Gi onwe-gi me-kwa-ra nke-ọma na i biawo.” Dịka onye na-ekwuchitara ìgwè mmadụ ahụ niile nke nọ ná-echere ịnụ okwu Pita ga-ekwu, Kọniliọs sịkwara, “ya mere ugbu a ayi onwe ayi nile nọ n’ebe a n’iru Chineke, inu ihe nile nke Onye-nwe-ayi nyeworo gi n’iwu.” Ndị a bụ mkpụrụobi ndị agụụ na-agụ n’ezie! “Ngọzi nādiri ndi agu ezi omume nāgu, ndi akpiri nākpọ kwa nku na ya: n’ihi na ndi ahu ka afọ gēju” (Matiu 5:6).

Ntute

“Ọ gāgwa gi ihe i nāghagh ime”, bụ okwu nke mmụọ ozi ahụ nke kpatara Kọniliọs ji zigaa ozi ịkpọ Pita, kama ọ bụghị uche Kọniliọs ka náánị ya nụ okwu ebube nke ndụ ahụ. Ọtụtụ mmadụ nọ kwa na Sisaria ndị Kọniliọs matara, ndị ikwu ya na ndị enyi ya, bụ ndị ọ na-agụ agụụ ikpere Chineke nime mmụọ na eziokwu dịka Kọniliọs. Ná-arụghị ụkà Kọniliọs akọworo ndịa ọtụtụ ùgbò ihe banyere okpukpé n’otù n’otù ma ọ bụ n’ìgwè. Otù ihe pụtara ìhè: Kọniliọs chọrọ ka ọbịbịa nke Pita na Sisaria mịa mkpụrụ rinne. Onye nke Chineke naabịa! Óké ntute ga-adị ma ọ bụrụ na onye ọ bụla ejee ozi dịrị ya. N’oge a, ọlụ ahụ dị náánị n’isi Kọniliọs, n’ihi na ọ bụ náánị ya matara na Pita na-abịa. Kọniliọs lụrụ olụ ya nkeọma n’ụzọ dị ebube, n’ihi na óké ìgwè mmadụ gbakọrọ ịnụ ihe Pita ga-ekwu, ma Chineke zosakwara ha ngọzi Ya kachasị mma.

Nke a bụ ụzọ kachasị mma iji mee ntute mmụọ nime nzukọ ọ bụla: ikpe ekpere na ịnọgidesi ike rue mgbe Chineke ga-eme ka ndị ahụ mata na Ọ ga-ezite inyeaka; site kwa n’idega akwụkwọ n’ebe dị iche iche ịgwa ụmụ mmadụ na onye nke Chineke na-abịa ikwusa Oziọma nke nzọpụta. Ìgwè mmadụ niile ndị na-abata n’ọnụ-ụzọ nke ụlọ nsọ Chineke na-eme ya site n’otù obi, “inu ihe niile nke Onyenwe-ayị nyeworo … n’iwu.”

Ntute dị otú a, ọ pụrụ ịda? O nweghị ike! Àpụrụ inwe ntute dị otú a n’ụbọchị ndịa jupụtara ná mmehie, ihe ọjọọ, na ịhụ ihe ụtọ nke ụwa n’anya karịa ịsọpụrụ Chineke? Ọ bụ ihe apụrụ inwe ma ọ bụrụ na ndị nsọ nke Chineke ga-adị ike n’ekpere n’ihi ntute dị otú ahụ, bụrụ kwa ndị ga-adị ike ịkpọbata ndị ikwu ha na ndị enyi ha n’Ụlọukwu nke Chineke.

Ndị Azọpụtara Doo kwa Nsọ

Eziokwu nke ekwusiri ike nime akụkụ mbụ n’akwụkwọ nke Ọlụ Ndịozi bụ ọwụwụ mmiri ahụ dị ebube nke Mmụọ Nsọ, ma otú ọ dị, ndị niile natara onyinye a aghaghị ịbụ ndị buru ụzọ nata onyinye ahụ nke ndị mgbe ochie natara -- ọmụmụ ọhụụ (ịgụ mmadụ n’onye eziomume) na odudonsọ zuru òkè -- ka ha wee bụrụ ndị ejikeere ịnata ọwụwụ mmiri nke Mmụọ Nsọ. Chineke adịghị akagbu eziokwu na ìhè nke mbụ ma ọ bụ megide ya n’ụzọ ọ bụla; kama mkpughe ọhụụ ọ bụla na-eme náánị ka nke mbụ ná-enwupụta ìhè karịa. Nke a bụ usoro nke mkpughe nke Chineke. Ka Chineke na-awụkwasị anụ-arụ niile bụ mmadụ ọwụwụ mmiri nke Mmụọ Nsọ, ọ dịghị ewepụ ịgụ mmadụ n’onye eziomume dịka ekpughere ya nye Abram onye kwesịrị ntụkwasị obi, kama ọ na-enyere anyị aka ịghọta ya nkeọma karịa. Ọ dịghị ewezuga kwa onyinye àmàrà nke abụọ bụ odudonsọ zuru òkè, kama Ọ na-eme ka ịdị mkpà ya pụta ìhè karịa nime Oziọma nke Àmàrà ọhụụ nke a.

Èzínaụlọ nke Kọniliọs abụworị ndị agụrụ ná ndị eziomume na ndị edoro nsọ tutu ọwụwụ mmiri nke Mmụọ Nsọ ewee dakwasị ha. Kọniliọs bụ onye ná-asọpụrụ Chineke na onye “ya na èzínaulo ya nile nātu egwù Chineke” (Ọlu Ndi-ozi 10:2). Ndị ná-asọpụrụ Chineke aghaghị ịbụ ndị na-ejé ijè n’ìhè ahụ niile nke ha nwere. Ha anụwo “okwu nke O zitere umu Israel, nēzisa ozi ọma nke udo site n’ọnu Jisus Kraist.” Pita sịrị, “Akukọ ahu unu matara, nke putara ìhè na Judia dum” (Ọlu Ndi-ozi 10:36, 37). Ọzọ kwa, Chineke gwara Pita n’ọhụ ahụ si, “Ihe Chineke mere ka ha di ọcha, gi onwe-gi emela ha ihe ruru árú” (Ọlu Ndi-ozi 10:15). Pọl, kwuru okwu site n’odudu nke Mmụọ Nsọ, sị, “Kraist-ayi hu-kwa-ra nzukọ-Ya n’anya, rara kwa Onwe-ya nye n’ihi ya; ka Ọ we do ya nsọ, mgbe Ọ mesiri ka ọ di ọcha site n’ọsisa miri n’okwu Chineke, ka Ya onwe-ya we che nzukọ ahu n’iru Onwe-ya dika ihe di ebube, nēnwegh ntupọ ma-ọbu iru-ndọli ma-ọbu ihe ọ bula n’ihe di otú a; kama ka o we di nsọ buru kwa ihe anāpugh ita uta” (Ndi Efesọs 5:25-27).

Pita na-agwa anyị sị, “Chineke, Onye mara obi madu, we gbara ha àmà, ebe Ọ nyere ha Mọ Nsọ, dika Ọ nye-kwa-ra ayi onwe-ayi; ọ digh kwa ókè Ọ kpara n’agbata ayi na ha, ebe Ọ mere ka obi-ha di ọcha (ma ọ bu asachara obi-ha) site n’okwukwe” (Ọlu Ndi-ozi 15:8, 9). N’asụsụ mbụ nke ndị Grik, nke a na-egosi ọlụ doro anya nke alụsịwo kwara n’oge gara aga. Ọ bụ ihe pụtara ìhè nkeọma, na ndịa bụ ndị agụworo ná ndị eziomume na ndị edoro nsọ tupu ha ewee bụrụ ndị eji Mmụọ Nsọ wụọ mmiri.

Ụfọdụ na-ezí na ndịa bụ ndị ákà azọpụtaghị, n’ihi na mmụọ ozi sịrị Kọniliọs, “Pita … gāgwa gi okwu ụfọdụ, nke agēji zọpụta gi¸ gi onwe-gi na èzí-na-ulo-gi nile” (Ọlu Ndi-ozi 11:13, 14). Okwu a adịghị egosi na ákà azọpụtaghị ha dịka a ga-asị na azọpụtabeghị Ndịozi ahụ mgbe ha sịrị: “Kama ayi kwere na agāzoputa ayi site n’amara Onye-nwe-ayi Jisus, n’otù aka ahu dika ha onwe-ha” (Ọlu Ndi-ozi 15:11). Okwu ndịa niile nke sitere n’Akwụkwọ nsọ nwere otù nkọwa n’okwu ahụ nke Jisọs kwuru sị: “Onye were ntachi-obi nọgide rue ọgwugwu ihe nile, onye ahu ka agāzọputa” (Mak 13:13).

Ọ dịghị onye ọ bụla nke nataworo àmàrà niile na onyinye niile nke Chineke n’otù mgbe. Akwụkwọ nsọ ekwughị na Ndịozi, Ndi Efesọs, ndị Sameria, èzínaụlọ nke Kọniliọs, ma ọ bụ onye ọ bụla ọzọ natara ọmụmụ ọhụụ na odudonsọ n’otù oge na n’otù ntabi anya. Anyị amataghị mgbe Ndịozi na ndịnsọ nke oge Pentikọst n’otù n’otù natara ọlụ àmàrà nke abụọ ma ọ bụ ọlụ àmàrà nke mbụ, kama o doro anya na ha natazuru ha tutu Pentikọst abịa.

Anyị agụtaghị banyere onye amụma, Onyeozi, onye egburu n’ihi okwukwe ya, maọbụ onye na-eweghachi ezi òzízị ọ bụla nime okwu Chineke ma ọ bụ n’akụkọ ụwa, onye emere ka o chègharịa, wee bụrụ kwa onye asachapụrụ mmehie ahụ nke amụrụ ya nime ya n’otù oge ahụ; kama ịgba-àmà nke ọtụtụ puku mmadụ bụ ndị nke Chineke, na-egosi na ha natara ọlụ àmàrà nke abụọ pụtara ìhè ichè. N’etiti ha ka ndị kachasị n’inwe amamihe, ndị kachasị n’ihe nke mmụọ na ndịnsọ ndị kachasị n’ịsọpụrụ Chineke dị, siterị n’oge nke Ndịozi.

Ọwụwụ mmiri nke Mmụọ Nsọ

Mgbe Pita n’agwa ìgwè Ndị Mbaọzọ ahụ okwu Chineke n’ụlọ Kọniliọs, Mmụọ Nsọ dakwasịrị ndị niile na-ege ntị n’okwu ahụ. Ibobo nwụrụ Pita na ụmụnna ndị sitere na Jọpa bịa n’arụ, mgbe ha hụrụ na Chineke enyewo Ndị Mbaọzọ ụdị onyinye ahụ nke O nyekwararị Ndị Ju n’Ụbọchị Pentikọst. N’ebe a kwa, Ndị Ju chère na Mmụọ Nsọ nke Chineke -- Shekina nke Ụlọukwu na Ụlọ nsọ -- bụ ihe dịrị náánị ụlọ Israel na àgbụrụ nke Abraham; ma ndị bụ ndị ná-eso ụzọ Jisọs chọpụtara na Chineke abụghị náánị Chineke nke ụfọdụ ebe ma ọ bụ ụfọdụ mmadụ. Mgbe Pita hụrụ na Chineke anabatawo ndịa nkeọma o nyere iwu ka awụọ ha mmiri ma nabata kwa ha nime Nzukọ nke Kraist, nke na-egosi onye ọ bụla na iwu niile nke Chineke nke Eluigwe, ka ndị ụkọ Ya n’ụwa rubeworo isi ime ọsọsọ.

Onyinye a dị ebube nke bụ Mmụọ Nsọ enyere Kọniliọs na ndị enyi ya lụrụ óké ọlụ. O gosiri Ndị Mbaọzọ eziokwu nke okwu ahụ Pita kwuru – ozi nke Oziọma ahụ banyere ndụ, ọnwụ na mbiliten’ọnwụ nke Jisọs. O meghere ụzọ nke àmàrà na okwukwe nye Ndị Mbaọzọ, nye kwa ha ọnọdụ nke mere ha na Ndị Ju ịrà otù n’anya Ndịozi ahụ. O mere ka Ubi Vine nke Chineke saa mbara site n’ókèala nke Palestain ruo n’akụkụ ụwa niile. Ihe rà ka puku arọ abụọ agasịwo site n’oge ahụ, ma ọlụ a ka dị kwa ukwu dịka n’oge mbụ. Achọrọ ọtụtụ ndị ọlụ n’ubi vine nke Onyenwe anyị. Ọtụtụ ọlụ dị nke a ga-alụ; ma lee! gịnị ka Onye nwe Owuwe ihe ubi ga-asị anyi mgbe anyị ga-eguzo n’iru Ya? Ihe anyị mere, ọ ga-eme ka Ọ sị, “Gini mere unu guzoro n’ebe a ubọchi dum nālugh ọlu?” Ma ọ bụ Ọ ga-enwe ike si, “I mere nke-ọma, ezi orù nke kwesiri ka atukwasị gi obi?”

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Gịnị mere Pita na ndị enyi ya jiri jeruo Sisaria?
  2. Ònye nọ na Sisaria izute Pita?
  3. Òlee ndị Pita gwara okwu Chineke?
  4. Kwuo ihe atọ Pita kwuru okwu banyere ha nime Okwu Chineke ahụ o kwuru
  5. Gịnị bụ ihe dị mkpà nke mere mgbe Pita kwubiri okwu?
  6. Gịnị mere ibobo jiri nwụọ ndị ná-eso ụzọ ahụ na Pita n’arụ?
  7. Gịnị bụ ndụm-ọdụ nke Pita mgbe ọ hụrụ na Ndị Mbaọzọ anatawo Mmụọ Nsọ?