Ọlu Ndi-ozi 11:1-26

Lesson 304 - Senior

Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISI: “M’gākpọ ndi ahu ndim, nke nābugh ndim; M’gākpọ kwa nwayi ahu onye ahuru n’anya, nke anāhugh n’anya” (Ndi Rom 9:25).
Cross References

I Ịgbasị Mgbá Ike N’ihi Eziokwu Ahụ

1. Ụmụnna nime Kraist ndị nọ na Judia, ndị na-anụ kwa ọkụ n’obi kwugidere Pita n’ihi na o soro Ndị Mbaọzọ rie ihe, Ọlu Ndi-ozi 11:1-3

2. Pita kọọrọ ha n’usoro ihe niile banyere nleta o letara ụlọ Kọniliọs, Ọlu Ndi-ozi 11:4-10

3. Mmụọ Nsọ nke Chineke rugidere Pita ka o soro ndịozi Kọniliọs jee, Ọlu Ndi-ozi 11:11, 12

4. Chineke lụrụ ọlụ site n’okwu Chineke Pita kwuru, n’ihi na Mmụọ Nsọ dakwasịrị Ndị Mbaọzọ ahụ, Ọlu Ndiozi 11:13-16

5. Ụmụnna ahụ bụ ndị Ju kpuchiri ọnụ ha, wee nye Chineke otuto mgbe Pita kwubiri okwu ngọpụ ya, Ọlu Ndi-ozi 11:17, 18

II Nzukọ ahụ nke Ná-aba Ụba

1. Mkpagbu mere ka ụmụnna gbasaa n’ọtụtụ ebe n’ala ọzọ, Ọlu Ndi-ozi 11:19

2. Akụkọ banyere Onyenwe anyị Jisọs na-enwu ọkụ nime obi Ndịozi Ya, ewee kọọ ya nime obodo ọ bụla ha bàra, Ọlu Ndi-ozi 11:20, 21

III Ntute ahụ nime Antiọk

1. Okwu nke Onyenwe anyị metụrụ Ndị Antiọk n’arụ n’ụzọ pụrụ ichè, ya mere nzukọ dị na Jerusalem zigara Banabas inyere ha aka, Ọlu Ndi-ozi 11:22

2. Banabas hụrụ na ọlụ niile ahụ sitere na Chineke o wee gbaa ha ume ka ha rapara n’arụ Onyenwe anyị, Ọlu Ndi-ozi 11:23, 24

3. Onyenwe anyị mere ka ọlụ Banabas gaa nkeọma, Banabas wee jee Tasọs ịchọ Sọl, Ọlu Ndi-ozi 11:25, 26.

4. Na Antiọk ka eburu ụzọ kpọọ ndị ná-eso ụzọ Jisọs Ndị Kraist Ọlu Ndi-ozi 11:26.

Notes
NKỌWA DỊ ICHE ICHE

Ụzọ Here Oghe

Pita malitere Okwu Chineke o kwuru n’ụlọ Kọniliọs site n’ikwupụta eziokwu ahụ a na-apụghị ihichapụ n’obi ya: “N’ezie anam aghọta na Chineke abugh Onye nēle madụ anya n’iru” (Ọlu Ndi-ozi 10:34). Okwu a na-abụ nnọọ eziokwu mgbe niile, n’ihi na site ná mmalite, Chineke kwururị “Ọ buru na i nēme nke-ọma, ọ bugh ngbasa-iru ka ị gēnwe?” (Jenesis 4:7). Otú ọ dị, n’ihi òzízí ndị okenye nyere ha idebe, na nlelì, Pita amataghị na eziokwu a dịrị mmadụ niile na mbụ.

Ná mmalite ya, Nzukọ Kraist ahụ dị ka ọ bụ náánị nke Ndị Ju; ma site n’ọkpụkpọ Kọniliọs na èzínaụlọ ya, Chineke wetara óké mgbanwe, wee gosi na Ndị Mbaọzọ nwere òkè n’àtụmààtụ nke nzọpụta Ya. Ndịozi ahụ na ndị ná-eso ụzọ Ya chererị na ọ bụ náánị Ndị Israel na Ndị Mbaọzọ ahụ ndị kwere n’iwu Moses bụ ndị kwesịrị ifè Chineke òfùfè; ma ugbu a ụzọ nke okwukwe here oghe nye onye ọ bụla chọrọ ịbànye. Ihe mgbochi dị iche iche nke dị n’iwu Moses abịaruwo ọgwụgwụ, n’ihi na nime Kraist Jisọs enweghị “onye-Grik na onye-Ju, obibì úgwù na ebigh-úgwù, onye nāsu asusu ọzọ, onye Sitia, orù, ma-ọbu onye nwere onwe-ya” (Ndi Kọlọsi 3:11).

N’ịtule ịdị ukwu nke mgbanwe ahụ na nsogbu niile nke omen’ala dị site na mgbe ochie na ọzụzụ nke a ga-ewepụ nime Nzukọ ahụ n’onwe-ya, aga aghọta nkeọma ihe mere Chineke ji meghepụ ụzọ ahụ site n’ọtụtụ ọlụ ịrịba-àmà nke mere. Ọbịbịa nke Mmụọ ozi ahụ bịakutere Kọniliọs, wee nye ya iwu ịkpọ Pita; tinyekwara ọhụụ nke Chineke na ndụm-ọdụ enyere Pita n’ụlọ elu nke ekwubiri site n’okwu ndịa: “so ha ga, enwegh uche abua” (ma-ọ bụ, “so ha ga, enwela obi abua”); tụkwasị kwa Mmụọ Nsọ nke dakwasịrị ndị niile zukọrọ n’ụlọ Kọniliọs mere ka Pita na ndị soro ya jee Sisaria mara na ọ bụ ọlụ aka Chineke. Ha wee soro ndị ahụ ñurịa ọñụ n’ihi na Chineke emeghewo ọnụ-ụzọ nke Nzukọ Ya nye Ndị Mbaọzọ dịka O nyere Ndị Ju.

Oziọma nke na-aga N’iru

Mgbe Pita sitere na Sisaria bịarue Jerusalem, ọ hụrụ n’ebe ahụ ọtụtụ ndịozi ndị náanụ ọkụ n’obi bụ ndị kwugidere ya n’ihi na ọ jere n’ụlọ Kọniliọs, wee soro Ndị Mbaọzọ rie ihe. N’ebe Ndị Kraist dị na Jerusalem nọ, ụdị omume a abụghị ihe kwesịrị ime, n’ihi na o megidere usoro omen’ala ha; ma Pita malitere n’isi kọwaara ha ihe niile. Pita mechiri ngọpụ ya site n’okwu ndịa, “Mù onwem bu onye ipu igbochi Chineke?” Mgbe ndịozi ahụ nụrụ okwu ndịa, ha ajụghị kwa ajụjụ ọzọ. Ha kpuchiri ọnụ ha, wee nye Chineke otuto sị, “Ya mere ọ bu kwa Ndị Mbaọzọ ka Chineke nyere nchèghari nke nēdubà ná ndu”. Ndịa bụ ezi ndị ná-eso ụzọ Kraist, n’ihi na ha rapụrụ okwu mmegide ahụ mgbe egosiri ha uche Chineke.

Mmadụ ụfọdụ adịghị achọ ọgan’iru, nke kachasị nke, ọgan’iru nke okpukpé. Mgbe nzukọ na-aga n’ụdị ochie ahu nke ọ dị site na mbụ, udo na-adị; ma mgbe ewepụtara ụkpụrụ ọma ime ka Oziọma ahụ gaa n’iru, ewee tinye kwa ya n’ọlụ, ngwa ngwa ụdị mmadụ ndịa na-ekwugide ụzọ ndịa nke ana-ewebata. Ụfọdụ ga-asị “Nzukọ a adighị kwa ka ọ na-adị na mbụ”; ndịọzọ ga-asị “Anaeme ndahie jọgburu onwe-ya”; ma ọ bụ “Emebeghị ihe dị otú a na mbụ.” Chineke bụ Onye tọrọ ntọ-ala Nzukọ Kraist. Ya mee ihe mgbanwe dị iche iche nke dị mkpà. Òkè na ọlụ anyị bụ, ịbụ Ndị Kraist dị ike n’ụzọ niile Chineke doworo.

Chineke adịghị agbanwe, ma ọ bụ ntọ-ala nke nzọpụta Ya; kama ụzọ na àtụmààtụ Chineke ji abịaru obi ndị mmehie na-agbanwe mgbe ụfọdụ. Nwoke ma ọ bụ nwanyị nke ná-eme ka obi ya guzogide mgbanwe niile nke Chineke na-edo ga-ahụta onweya n’ọnọdụ nke enweghị udo n’ebe mbụ ahụ o nweworo mnwekọ nke ime mmụọ dịkarịsịrị ụtọ. Ọ dịghị onye ọ bụla nke ga-akwụsị itó étó n’àmàrà na n’amamihe nke Onyenwe anyị na Onye nzọpụta anyị bụ Jisọs Kraist, n’otù mgbe ahụ, wee pụ isonye na nzọ ụkwụ niile nke Nzukọ Kraist ahụ na-aga n’iru. Nzukọ ná-adịghị aga n’iru abụghị Nzukọ Kraist.

Ụdị Mbụ

Dịka ndị ụfọdụ na-achọghị àtụmààtụ ọhụụ nke na-eweta ọgan’iru ná Nzukọ, ndịọzọ na-achọsi ike ịnọgide n’ụzọ ochie mbụ mgbe niile -- ha adịghị achọ mgbe ọ bụla ịgbaso nzọ ụkwụ onye ọzọ. Ihe dị óké egwù dị n’ịgbasosi otù nime ụzọ abụọ ndịa ike. Otú ọ dị, nwoke ahụ ga-adị ka onye na-ejidesi ụdị mbụ ike, bụ onye ahụ nke ji ikwesị ntụkwasịobi ná-emezu uche Chineke. Chineke ga-etinye n’obi ụmụ Ya échìchè na ọlụ dị iche iche nke ná-abụghị ntụpụta nke onweha; kama Onye Kraist ahụ ga-elezi anya nkeọma n’okwu a ịnwapụta na ihe ndịa sitere na Chineke. Ihe niile nke sitere na Chineke na n’okwu Chineke na-ekwekọrịta. Pita emeghị ihe ọ bụla site n’échìchè nke onweya. Chineke mere ka uche Ya pụta ìhè site n’ọtụtụ ihe ngosi dị iche iche na mkpali niile nke ime mmụọ rue mgbe Pita matara n’ezie ihe bụ ihe Chineke chọrọ. Ọbụná ndị kwuru megide Pita kweere mgbe ha nụrụ nkọwa ya.

Mgbe ọ bụla Chineke na-enye onye ọ bụla ọlụ ọhụụ ma ọ bu malite ihe ọhụụ, Ọ na-eme ka okwu ahụ pụta ìhè nkeọma mgbe niile. Mkpụrụobi ọ bụla ga-echere Chineke, n’ikpesi ekpere ike, wee mata ihe ahụ bụ ọkpụkpọ Chineke n’ezie, banyere ọlụ ahụ dị ichè. Emebiwo ọtụtụ ihe n’ụzọ Oziọma Kraist site n’aka ndị ahụ nwaworo ibutere uche na iwu Chineke ụzọ, site n’isoro échìchè nke obi ha karị ijé n’okporo ụzọ nke ezi àtụmààtụ Chineke. Chineke ga-akpọ òkù karị otù ugbò, ma ọ bụrụ na ọ dị mkpà, dịka O mesoworo Samuel. Nke ka nke, ndị nke Chineke ga-amata ezi ọkpụkpọ nke Chineke. Agaghị enwe ntụkwasịobi dị ukwu n’ọkpụkpọ òkù ahụ nke ndịọzọ ná-apụghị ịmata ma ọ bụghị náánị onye nke natara ya; ma mgbe ọkpụkpọ ahụ pụtara ìhè, ná-enweghị ihe mgbagwoju anya, bụrụ kwa nke ekpughere nye ndị nwere Mmụọ nke Chineke, ka agbaso ya n’ujú ya ná-agbanyeghị mkpagbu ma ọ bụ mgbochi nke ga-adị.

Ná Antiọk

Mgbe Ndịozi na ndị ná-eso ụzọ Jisọs matara na emegheworo Ndị Mbaọzọ ụzọ nke Oziọma, emere ka ozi ahụ ruo ha dịka emere ka o ruo Ndị Ju. Ọ pụtara ìhè na mmadụ niile nọ n’ụwa nwere ohere ọma dịka ndị kwesịrị ịnara nzọpụta. Mkpagbu emeworị ka ndị ná-eso ụzọ Ya gbasasịa n’akụkụ niile, ma o nweghị ike iwepụ ịhụn’anya Jisọs na olileanya nke mbiliten’ọnwụ n’obi ha. Akụkọ banyere Oziọma ahụ ná-ere ọkụ n’ọnụ ha ebe ọ bụla ha bàra. Mkpọbata nke Ndị Mbaọzọ nime Nzukọ Onyenwe anyị mere ka ọlụ ha dị mfé, mee kwa ka ijéozi ha gbasaa karị. Ọtụtụ mgbe Ndị Mbaọzọ na-eji ọñụ anara Oziọma ahụ.

Nnabata a nke Oziọma ahụ nke ndị Antiọk nabatara bụ otù nime ihe ịma-àtụ. Ọtụtụ ndị ná-eso ụzọ Ya sitere na Saiprọs na Sairini bàra n’obodo ahụ wee malite ịgwa ndị Grik okwu banyere Jisọs. Ọtụtụ kwere wee chigharịkwute Onyenwe anyị, akụkọ banyere ntute a wee ruo Nzukọ Kraist dị na Jerusalem ntị. Ndịozi ahụ wee zipụ Banabas ka ọ gaa nye aka n’ọlụ ahụ. Enwereike bụrụna Ndịozi ahụ nwere obi abụọ banyere nzukọ ahụ dị ná Antiọk n’ihi na ndị ahụ ná-eso ụzọ Ya, bụ ndị ziri Oziọma n’ebe ahụ dị ka ndị ana amataghị nkeọma. Edeghị aha ha n’akwụkwọ nke akụkọ a ma Banabas hụrụ na ha bụ ezi ndị ná-eso ụzọ Kraist hụkwa na ntute ahụ bụ kwa n’eziokwu. Amara Chineke pụtara ìhè n’etiti ndị ahụ, obi wee tọọ Banabas ụtọ. Okwu Chineke o kwuru bụ nke jupụtara n’otite mmanụ nke Mmụọ Nsọ kpaliri obi Ndị Antiọk ahụ, nke mere na atụkwasịrị óké igwe mmadụ nye Onyenwe anyị.

Mgbe ụfọdụ ana akpọ ezi ndị nke Chineke ndị obi ha dị warara na ndị ná-adịghị anagide ndị ọzọ n’ihi na ha adịghị ekwe ka ha na “ifufe nile ọ bula nke òzìzí” nwee mmekọ. Enwere otù òtù jupụtara n’ụwa nke ná-achọ kwa ijikọta Nzukọ Kraist niile ka ha bụrụ otù; ma Okwu Chineke dọrọ anyị akanántị sị: “Unu ekwela okwu mọ nile, kama nwaputanu ndi-mọ ahu, ma ha bu ndi siri na Chineke puta: n’ihi na ọtutu ndi-amuma ugha apuwo ba n’uwa” (I Jọn 4:1). Ezi okpukpé nke Ndị Kraist achọghị òtù ma ọ bụ iwu ime ka abụrụ otù, n’ihi na ezi Ndị Kraist niile na enwe ịdị n’otù na nmwekọ ahụ zuru òkè mgbe ọ bụla ha zukọrọ n’ebe ọ bụla na n’oge ọ bụla. Ihe dị Banabas mkpà bụ náánị ịhụ mwụsa nke amara Chineke n’obi Ndị Antiọk ka o wee nwee obi ụtọ. Ọ dịghị okwu ụtọ, ma ọ bụ okwu banyere ntute, ma ọ bụ àtụmààtụ nke ememe ọ bụla dị iche iche nke ụlọ nzukọ jikọtara onwe ha ọnụ nime ma ọ bụ na gburugburu Antiọk ga-enyeworị onye mkwusa ahụ si na Jerusalem obi ụtọ dịka ịhụ na amara Chineke nwupụtara n’obi ha. N’ihi ịdị ukwu nke ntute ahụ, Banabas jere Tasọs ịchọ Sọl, o wee kpọta ya na Antiọk. Ha wee lụkọọ ọlụ n’ubi nke Chineke ogologo otù arọ mgbe ha hụrụ ọtụtụ mkpụrụobi eritaara Chineke n’urù.

Ndị Kraist

Enwere “ihe ọhu n’okpuru anyanwu” nime Antiọk. O juru ndị obodo ahụ anya ịhụ Ndị Ju ole na ole si na Jerusalem gbapụta bụ ndị nwere akụkọ nke ná-ajụrụ obi ịkọ. Ndị Grik nke obodo ahụ bụ ndị ná-amaghị Chineke nụrụ nke mbụ ná ndụ ha akụkọ banyere Jisọs Kraist, Ọkpara Chineke, Onye biri n’ụwa nke a, wee nwụọ, wee bilie kwa ọzọ. Ọtụtụ nime ndị Grik ahụ wee kwere akụkọ ahụ, wee nwapụta kwa ya nime ndụ ha onwe ha. Ha kpọkuru Onyenwe anyị n’ekpere, wee rịọ Ya ka O nwee obi ebere n’ebe ha nọ, ha wee chègharịa ná mmehie niile ha, wee rapụ kwa ụzọ ha jesoro na mbụ. Onyenwe anyị wee nụ ekpere ha, were Ọbara Ya sachaa obi ha, wee nye ha ike ibi ndụ karị mmehie: “ihe ochie agabigawo; le, ha aghọwo ihe ọhu” (2 Ndi Kọrint 5:17).

Ndị Antiọk amaghị ihe ha ga-echè banyere òtù nke ndị ọhụụ a. Ndị Ju wee kpọọ ndị ná-eso ụzọ Jisọs n’ụzọ ịkwa emò, “Ndi Nazaret” ma ọ bụ “Ndi Galili” n’olu niile nke ná-egosi nleli: ma ndịa bụ kwa ndị bi ebe dị anya site n’ebe Jisọs lụrụ ọlụ Ya. A ga-achọpụta aha ọhụụ, ma ndị Antiọk pụrụ ịlụ ọlụ a, n’ihi na amaara ha nkeọma n’ihi amamihe ha na omume ha n’inye mmadụ aha ozọ site n’ihe onye ahụ yiri. Òtù ọhụụ nke a bụ ndị ná-eso ụzọ Jisọs Kraist -- ndịkom Kraist -- n’ihi nke a NdịKraist wee ghọọ aha ha. Ma eleghịanya ndịa nke ná-akwa emò nyere ha aha a n’ụzọ ịkwa emò, ma aha a Ndị Kraist aghọwo ihe ndị ná-eso ụzọ Kraist n’ụwa niile na-eji ọñụ akpọ onwe ha.

Ntute N’Ọnụ-ahịa Ọ bụla

Ọtụtụ ebe ndịa sitere n’Okwu Chineke nke na-agwa anyị banyere ọkpụkpọ okù nke ịhụn’anya Chineke nye mkpụrụobi mmadụ niile, kwesịrị ịkpali mmụọ nke Onye Kraist ọ bụla ka o kpee ekpere banyere mgbasa nke óké ntute n’ụwa niile. “Okwukwe nsọ nke enyere ndi nsọ n’aka nání otù mgbe idebe” zigara ndị nsọ ahụ n’akụkụ niile nke ụwa nke amatara n’oge ahụ, ha na-ekpesi kwa ekpere ike nime obi ha banyere mmadụ niile, ná-akọ kwa akụkọ nke mgbapụta ahụ na-enwu enwu. Ha ji ike na mkwuwa okwu ná-ezisa ozi ha, nke mere na óké ntute mmụọ malitere.

Kọniliọs nwapụtara ntute mmụọ. N’ihi gịnị? Mmụọ ozi Chineke sịrị, “Ekpere-gi nile na ọlu ebere gi nile rigoro ibu ihe ncheta n’iru Chineke” (Ọlu Ndi-ozi 10:4). Ahụrụ Kọniliọs ka ọ na-ekpe ekpere, na-ebu kwa ọnụ n’ihe dị ka oge hour nke iteghete nke ụbọchị -- elekere atọ nke ehihie. Ọtụtụ mmadụ ga na ejeozi ha ma ọ bụ na-achọ ihe ụtọ ha, ná-elegide ọlụ ha anya ma ọ bụ ihe igwuri egwu ha, na-eri nri ma ọ bụ ná ezu-ike – ha ga-eme ihe niile ọ bụla ma ọ bụghị ịnọ ná-ekpere Chineke n’elekere atọ nke ehihie. Ozi nke Kraist kwesịrị iwere ọnọdụ mbụ nime ndụ onye ọ bụla ná-akpọ onwe ya Onye Kraist; ma ọtụtụ nime anyị erughị ọtụtụ Chineke chọrọ ka anyị ruo. Tụlee ọtụtụ oge na àkụ nke ọtụtụ mmadụ na-eji ọñụ mefuo n’isi onwe ha na ihe ntà ha na-enye Chineke. Tụlee ọtụtụ mkpụrụobi na-abà n’ebighị ebi nke ịla n’iyi n’ihi na ọ dị onye jụrụ iwepụta onwe ya na ịgbara Kraist àmà. Nzukọ Kraist agaghị ahụ óké ntute ma ọbụghị ma o jikeere inye ihe ọ bụla ọ ga-ewe ya.

Chineke na-achọ iduzi na ịchị isi n’obi ụmụ mmadụ. Oge hour nke ikpeazụ ụwa nke a chọrọ ka mmadụ ná-ekpe ekpere mgbe niile dịka Kọniliọs -- ná-agbanyeghị ihe ọ ga-ewe ya -- inweta óké mmekọ na ọmụma nke Chineke ka ewee gwa ụwa banyere Ya. Onye agha nke Chineke nke ná-emeri emeri n’ekpere na-ejesi ijè ike ịbà n’Eluigwe site n’okporo ụzọ eze ahụ atụliri atụli dị nsọ nke Chineke. Ọ gaghị ejé ijè a náánị ya; kama mgbe ndị ọzọ ga-ahụ ijè mmeri ya, ha ga-eso nzọ ụkwụ ya, wee so ya gaa.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Gịnị mere ndị ná-eso ụzọ Ya dị na Jerusalem ji kwugide Pita?
  2. Òlee ụzọ Pita ji zaghachị okwu mkwugide ha?
  3. Òlee ihe anọ mere Pita ji mara na Ọ bụ Chineke zigara ya n’ebe Kọniliọs?
  4. Gịnị ka Mmụọ Nsọ ịdakwasị Ndị Mbaọzọ lụpụtara ná Nzukọ Kraist?
  5. Òlee ihe ukwu chụsasịrị ndị ná-eso ụzọ Ya gaa n’ụwa niile nke amatara n’oge ahụ?
  6. Ndị ole gwara ndị Antiọk Okwu Chineke?
  7. Òlee ụzọ òzízí ha si dị iche n’òzízí ndị ọzọ ahụ ná-eso ụzọ Jisọs ọzọ?
  8. Ònye ka ezipụrụ site na Jerusalem inyeaka ná ntute ahụ n’Antiọk?
  9. Gịnị bụ aha ahụ ndị Antiọk kpọrọ ndị ná-eso ụzọ Jisọs?