Lesson 305 - Senior
Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISI: “Ugwọ-ọlu nke nmehie bu ọnwu: ma onyinye-amara nke Chineke bu ndu ebigh-ebi nime Kraist Jisus Onye-nwe ayi” (Ndi Rom 6:23).Cross References
I Nleta Jehoshafat Letara Ehab
1. Jehoshafat kekọtara onwe ya n’arụ Ehab, I Ndi Eze 22:1, 2; 2 Ihe Emere 18:1, 2; 19:2; Abù Ọma 1:1
2. Ehab gwara Jehoshafat ka o soro ya jee buso Remot gilead agha, I Ndi Eze 22:3, 4; 2 Ihe Emere 18:2, 3
3. Jehoshafat wee chọọ ibu ụzọ jụọ Jehova ase, I Ndi Eze 22:5; 2 Ihe Emere 19:3; Abù Ọma 27:8
II Ezi Ndị amụma na Ndị amụma Ụgha
1. Ehab chịkọtara narị ndị amụma ụgha anọ, I Ndi Eze 22:16; Jeremaia 23:13-40
2. Jehoshafat na-achọ ezi onye amụma, I Ndi Eze 22:7-10; Emos 8:11, 12
3. Ndi amụma ụgha ahụ sịrị “Rigorue … ka ihe ga-kwa-ra gi nke-ọma,” I Ndi Eze 22:11, 12; Aisaia 30:10; Jeremaia 28:1-11
4. Maikaia wee kwuo eziokwu, I Ndi Eze 22:13-25; Jeremaia 28:12-17
III Agha ahụ Eburu na Remot-gilead
1. Ehab nwogharịrị onwe ya, I Ndi Eze 22:29-33, Matiu 10:26; I Ndi Kọrint 4:5
2. Emerụrụ Ehab arụ, o wee nwụọ, I Ndi Eze 22:34-37
3. Amụma Elaija mezuru, I Ndi Eze 22:38-40; 21:17-24
Notes
NKỌWA DỊ ICHE ICHEỊbụ Enyi nke Ụwa
“Dika m’di, otú a ka i di.” (ma-ọbụ, “Adịm otú ị dị”). Okwu ndịa nke Jehoshafat gwara Ehab jọrọ njọ ma ị tụlee ya n’obi gị na ọ dịghị onye dị ka Ehab n’ime ajọ omume. N’akụkụ ọzọ Jehoshafat chọrọrịị iru Chineke wee jee ijè n’ụzọ Ya niile. Mgbe Jehoshafat dị ka Ehab, o meghị ka Ehab bịaruo ọnọdụ nke ya onwe ya kama o wedatara onwe ya ruo ọnọdụ nke Ehab. O mere Ehab enyi ya, ma tụfuo ịbụ enyi nke Chineke. “Ùnu amatagh na ibu eyi nke uwa bu ibu onye-iro nke Chineke? Ya mere onye ọ bula nke zubere ibu eyi nke uwa nēdo onwe-ya onye-iro nke Chineke” (Jemes 4:4). Ònye bụ enyi gị? Ònye bụ kwa onyeiro gị?
Ndịamụma Ire ụtọ nke Sameria
Apụrụ ikwu na Jehoshafat mere nke ọma n’ihi na ọ chọrọ ịjụ ase n’aka Chineke tutu o soro Ehab jee Remot-gilead. Ọ ga-emeworị nkeọma karị ma ọ bụrụ na o chetararị ịjụ Chineke ase tutu ya na Ehab ekekọọ onweha, tutu o jee Sameria. N’uche nke Ehab, ịjụ Jehova ase bụ ịkpọkọta narị ndị amụma ụgha anọ ahụ, bụ “ndikom ná-asị ‘e’” n’okwu ya niile. Jezebel egbuwo ọtụtụ ezi ndị amụma Chineke, chụpụ kwa ọtụtụ n’ala ahụ, o wee dị ka a ga-asị na ezi onye amụma ọzọ afọdụghị ma ọ bụghị náánị ìgwè ndị amụma ochie ahụ bụ ndị amụma ụgha -- ndị iru-abụọ -- ndị jikeere ịnabata mmehie, ụwa na ekwensu ebe ọ bụla o si dapụta. Ha wee mee dịka agwara ha, “Unu agagh-ahuru ayi ihe ziri ezi n’ọhù-unu, gwanu ayi okwu ire-utọ nile” (Aisaia 30:10).
Mgbe Elaija nọ n’elu ugwu Kamel, ha dị narị ndị amụma Beal anọ na iri ise bụ ndị na-eguzogide otù onye amụma Chineke. Na Sameria ha dị narị ndị amụma anọ na-eguzogide otù onye a na-akpọ Maikaia bụ onye na-ekwu eziokwu. Ọnụ ọgụgụ nke ụmụ mmadụ taa bụ ndị na-ejigide eziokwu niile nke Okwu Chineke di ntà ma atụnyere ha ụwa niile. Mmadụ ndị dị ka Jọn Onye ọwụmmiri, onye nwere ike iguzo n’iru eze gwa ya na ndụ akwam iko nke ọ na-ebi nime ya site n’iwere nwunye nwanne ya bụ Filip jọrọ njọ, bụ ihe dị ụkọ n’ọgbọ a ná-akwa iko. Ndị mkwusa bụ ndị kwere na Chineke nke òkìkè, wee ná-eguzogide òzìzì nke mnwoghapụta (evolution), dị ole na ole taa. Ole na ole bụ ndị nwere ike ikụzi na onye nke Kraist kwesịrị ibi ndụ karịa mmehie, n’ihi na ụdị ndị na-ekwusa abụghị ndị amaara aha ha na ndị ana-anaraghị nkeọma n’ọgbọ a jupụtara ná mmehie. Ole na ole kwa karịa bụ ndị ná ekwusa na náánị ndị dị ọcha n’obi ga-ahụ Chineke anya. N’etiti ndị ahụ na-akuzi banyere odudonsọ, ọ bụ mmadụ ole taa kweere na mmadụ ga-anata ike nke Mmụọ Nsọ, nke ihe ịrịba àmà nke Baịbụl nke bụ ikwu okwu ná-asusụ dị iche na-eso, tutu onye ahụ abụrụ onye ná-emeri emeri n’ezie? A na-achọsi ike nime ụwa taa mmadụ ndị ahụ na-ahụ eziokwu n’anya, ndị bụ dike dịka Elaija, Maikaia na Jọn Onye ọwụmmiri.
Ndịozi nke Setan
Na-ágbanyeghị ụzọ aghụghọ ha, Jehoshafat matara n’eziokwu na narị ndikom anọ ahụ abụghị ezi ndị amụma Chineke. “Ọ bugh kwa ihe iju anya; n’ihi na Setan onwe-ya nēme onwe- ya ka o yie mọ-ozi nke ìhè. Ya mere ọ bugh ihe uku ma si na ndi nējere ya ozi nēme kwa onwe-ha ka ha yie ndi nēje ozi ezi-omume” (2 Ndi Kọrint 11:14, 15). Anyị abụghị ndị ihe banyere narị ndị amụma ụgha anọ ahụ nke oge Ehab na-emetụta, kama nke na-emetụta anyị bụ ndị ahu siworo na ha pụta bụ ndị bawokwara óké ụba n’ọnụ ọgụgụ. Pita kwusiri ike n’okwu ịdọ aka-ná-ntị sị “Ma ndi-amuma ugha puta-kwa-ra ìhè n’etiti ndi Israel, dika ndi ozìzì ugha gādi kwa n’etiti unu, bú madu ndi gēwere nzuzo webata irọ-òtù di iche iche nke ila-n’iyi, nāgọnari ọbuná Onye-nwe-ha Onye gbara ha … Ọtụtụ madu gēso kwa ụzọ agu-ikwa-iko ha; ndi agēkwulu uzọ nke ezi-okwu n’ihi ha” (2 Pita 2:1, 2). Jisọs na-ekwu banyere ụbọchị anyị ndịa mgbe O kwuru, “Ọtutu ndi-amuma ugha gēbili kwa duhie kwa ọtutu madu” (Matiu 24:11). Ọ bụ na ị dịghị anụ ihe otù nime ndi amụma ụgha ahụ na-ekwu, “ugbu a, nwa-nne-ayi nwoke Ehab, rigoruo Remot-gilead. O kwesịghị ka I chègbuo onwe-gị banyere ịtụfu ndụ gị; ị bụ otù onye nime ndị eburu ụzọ kaa àkà na aga azọpụta ha; Jehova ga-aechebe kwa gị, n’agbanyeghị ihe ọ bụla ị na-eme.”
Enweghị Ịhụn’anya N’ebe Eziokwu Dị
“Ọ digh onye-amuma JEHOVA nọ n’ebe a tineyre ndia, ka ayi we jua ase n’aka-ya?” “Otù nwoke ọzọ di … ma mu onwem kpọrọ ya asì.” Ọtụtụ ụzọ ọjọọ na ịhụ ọtụtụ mmehie n’anya nke dị ná ndụ Ehab mere ka ọ rapụ ịchọ eziokwu. Baịbụl Nsọ kwuru sị, “Oge gādi mgbe ha agagh-anagide ozízí ahu nke nēnye ezi ndu; kama, ebe ha nwere nti nākọ ọkọ, ha gēkpokwasi ndi-ozízí nye onwe-ha dika agu ihe ọjọ nke aka ha si di; ha gēchighari kwa nti-ha ka ha ghara inu eziokwu, ma ha gejehie ña nti akukọ-irò” (2 Timọti 4:3, 4).
Okwu ahụ, “Ha gēchighari kwa nti-ha ka ha ghara inu ezi-okwu,” na-egosi ihe onye ahụ mere site n’ọchịchọ nke onwe ya; ma okwu ndịa nke na-eso ya, “Gējehie ña nti akukọ-irò” na-egosi ime ihe ná-esiteghi n’ọchịchọ onye ahu ma ọ bụ ịmanye onye ahụ ime ihe ahụ ọ na-achọghị. N’akụkụ ọzọ nke Akwụkwọ nsọ ekwuru sị, “Chineke nēzite-kwa-ra ha ilusi-ọlu-ike nke njehie, ka ha kwere ugha ahu: ka ewe kpe ha nile ikpé, bu ndi nēkwegh ezi-okwu, kama ajọ omume diri ha ezi nma” (2 Ndi Tesalọnaika 2:11, 12). Ọ bụrụ na mmadụ ejeruo ọnọdụ enweghị ịhụn’anya n’ebe eziokwu dị, dịka Ehab, o wee kpọọ eziokwu na ndị ná-ekwu ya asị, onye ahụ na eje ijé n’ụzọ dị óké egwù. Ọ pụrụ ịchọta onwe-ya n’ọnọdụ ahụ n’ebe Chineke ga-eme ka Okwu Ya mezuo, “Mu onwem gārọputa kwa ichi ọchi nile ha” (Aisaia 66:4). Òlee olileanya gadịrị mmadụ mgbe Chineke, Onye kachasi ihe niile elu ga-arọpụta ịchị ọchị niile ha, Mmụọ Ya ewee kwusị ịchị ọchị nime mmadụ. Ịhụ eziokwu n’anya dị mkpà nime ndụ onye ọ bụla.
Ịtụgharị uche banyere eziokwu adịghị atọ onye ajọomume ụtọ mgbe niile. Eziokwu na-egosị ya na ọkụ ala mụọ mgbe ebighịebi na-echere ya ma ọ bụrụ na o chègharịghị. Eziokwu ahụ gosịrị na a ga-egbu Ehab na Remot-gilead. Ma ọbụná ná mkpughe dị otú a, Ehab chigharịkwara ntị ya ka ọ ghara ịnụ eziokwu, o wee jehie ñaa ntị akụkọ irò. Akụkọ irò ahụ yiri ihe dị mma. Akụkọ irò ahụ niile kwere mkwà mmeri na udo. Ma eziokwu ahụ mezuru. Ehab nyere iwu sị, “tiyenu onye a n’ulo-mkpọrọ, me ka o rie nri nmegbu, ñu kwa miri nmegbu, rue mgbe m’gābia n’udo.” Maikaia wee baa n’ụlọ mkpọrọ ma Ehab alaghachighi n’udo – ebughachiri ozù ya. O kweere n’okwu nke narị ndị amụma ire ụtọ anọ – ma eziokwu ahụ nke Maikaia onye akpọrọ asị kwuru mezuru.
Onye Ná-adịghị Ike
Mmadụ nwere ike ịjụ ajụjụ sị, “Ọ bụ gịnị na-enye gị nsogbu Jehoshafat? Ị jụrụ ase ka ị nụ okwu Jehova. Ị nụrụ ya, ma I debeghi ya, i wee jee Remot-gilead ọ bụ ezie na aga-emeri gi n’ebe ahụ. Gị onwe-gị kwa, èbupụwo kwa amamihe gị site n’ire ụtọ nke ndị amụma ụgha ahụ? Ma ọ bụ, ị dara oké mbà na i nweghị ike ịgwa enyi gị É-è? Ọ bụrụ na i guzosiwororị ike n’akụkụ Onye amụma Jehova, ma eleghịanya ị ga-emeworị ka azọpụta ndụ Ehab; ma kama nke a; i soro Ehab rigoruo Remot-gilead náánị ijeru ịlan’iyì ya. Ọ nụrụ eziokwu ahụ, eziokwu ahụ wee mezuo. Ọ bụrụ na I guzooro eziokwu ahụ ị gaara eme ka Ehab chigharịkuta eziokwu ahụ – eziokwu ahụ ga azọpụtaworị mkpụrụ obi ya n’ọkụ ala-mmụọ ebighịebi.
Nwogharị na Iru abụọ
Ọ dị ka egwù ntà dị nime obi Ehab na okwu Maikaia kwuru ga-emezu, n’ihi na Ehab nwogharịrị onweya tutu ọ baa n’agha ahụ. Ma mnwogharị apụghị igbochi mmezu nke okwu Chineke. Ndị iru abụọ enwogharịwo onweha n’iru ụwa dịka ndị ná-efé Chineke, ma obi ha jupụtara n’ihe ure. Jisọs tiri mkpu sị, “Ahuhu gādiri unu, ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi, ndi-iru-abua; n’ihi na unu yiri ílì eteworo nzu. nke nēgosi onwe-ha dika ihe ọma n’ìhè ma n’ime ha juputara n’okpukpu nke ndi nwuru anwu, na adigh-ọcha nile. Otú a unu onwe-unu nēgosi kwa onwe-unu nye madu n’ìhè dika ndi ezi omume, ma n’ime unu juputara n’iru-abua na ihe nēmebi iwu” (Matiu 23:27, 28). Ọ bụ gịnị bụ urù nke aghụghọ ma ọ bu mnwogharị bara ma ọ bụrụ na nsọtụ ya bụ ọnwụ na ịlan’iyì?
Ehab tiwara obi ya mgbe ọ nụrụ okwu Elaija ma jụ ige ntị okwu Maikaia gwara ya. Elaija buru amụma banyere mbibi nke Ehab, ma mgbe o wedara onwe-ya n’ala Chineke wee nye ya ohere ọzọ. Ehab jụrụ ohere ahụ, okwu Chineke nke Maikaia na Elaija kwuru wee mezuo. “Unu ekwela ka eduhie unu; Chineke abugh Onye anēlelì: n’ihi na nkpuru ọ bula madu nāgha, nke ahu ka ọ gēweta kwa n’ubi” (Ndi Galetia 6:7).
Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE- Ọ bụ gịnị bụ ihe jọrọ njọ n’inyeaka Jehoshafat nyeere Ehab ibu agha?
- Ọ bụ gịnị mere Jehoshafat ji chọọ onye amụma ọzọ tinyere narị anọ nke Ehab kpọrọ?
- Ọ bụ gịnị mere Ehab ji kpọọ Maikaia asị?
- Ọ bụ gịnị bụ ọzịzá nke narị ndị amụma anọ ahụ banyere nrigo nke eze nime Remot-gilead?
- Chọpụta ọtụtụ ebe nime Akwụkwọnsọ banyere ndị amụma ụgha.
- Ọ bụ gịnị mere eji tinye Maikaia n’ụlọ mkpọrọ?
- Òlee ụzọ eji tigbuo Ehab?
- Ọ bụ gịnị bụ amụma Elaija buru banyere ọnwụ Ehab?
- Chọpụta ọtụtụ ihe nime akwụkwọ a nke na-egosi na Ehab adịghị efé Chineke.
- Tụlee amụma Maikaia na ihe niile mere.