2 Ihe Emere 19:1-11; 20:1-37

Lesson 306 - Senior

Memory Verse
AMAOKWU IBU N’ISI: “Ka oké egwu JEHOVA dikwasi unu; lezienu anya, me ya: n’ihi na ọ digh ajọ omume, ma-ọbụ ihu-madu-iru-ọma, ma-ọbu inara-ihe-iri-ngo, di nime JEHOVA, bú Chineke-ayi” (2 Ihe Emere 19:7).
Cross References

I Mbá Abaara Jehoshafat Na Ịlaghachikuru Chineke

1. Abaara Jehoshafet mbá n’ihi nkekọ ya na Ehab, 2 Ihe Emere 19:1-3; 2 Ndi Kọrint 6:14-18; Emos 3:3; Matiu 6:24

2. Jehoshafat rọpụtara ndị ikpe wee nye ha iwu ka ha na-atụ egwù Jehova, 2 Ihe Emere 19:4-11

II Mmeri Emeriri Moab

1. Maob bakuuru Juda imegide ha n’agha, 2 Ihe Emere 20:1, 2

2. Jehoshafat wee kpọsaa obubu-ọnụ, 2 Ihe Emere 20:3, 4

3. Jehoshafat na Juda wee kpeeekpere, 2 Ihe Emere 20:5-13

4. Chineke wee zaa Jehoshafat, 2 Ihe Emere 20:14-19

5. Jehoshafat gbara ha ume ka ha nwee okwukwe ma jupụta kwa n’otuto, 2 Ihe Emere 20:20, 21

6. Chineke na-alụrụ Juda ọgụ, 2 Ihe Emere 20:22-24

7. Juda ji ọñụ lata, Chineke wetakwara udo, 2 Ihe Emere 20:25-34

III Ajọ Nkekọta Ọzọ

1. Jehoshafat na-esonye Ehazaia n’iwú ọtụtụ ụgbọ, 2 Ihe Emere 20:35, 36

2. Chineke baara ya mbá wee tiwasịa ụgbọ ahu niile, 2 Ihe Emere 20:37.

Notes
NKỌWA DỊ ICHE ICHE

Òtù Ndị Dị Ichè

“Ọ kwesiri gi inyere onye nēmebi iwu aka? Ọ bu kwa ndi nākpọ JEHOVA asì ka i nāhu n’anya? ma n’ihi ihe a iwu dikwasi gi site n’iru JEHOVA.” Chineke, Onye kpọworo Abraham ka o si n’ụmụ nna ya na ụlọ nna ya wee jee rue ala ahụ nke Ọ ga-eme ka Abraham hụ ya anya bụrị Onye chọworo mgbe niile ka ndị Ya bụrụ ndị kewapụrụ onweha n’etiti ndị mmehie. Onyenwe anyị si n’ọnụ Moses wee gwa Israel okwu sị, “Ma ugbu a, ọ buru na unu ege nti n’olum n’ezie, ọ buru kwa na unu edebe ọgbụgba ndụm, unu gābu-kwa-ram ihe nke akam kari ndi nile: n’ihi na ọ bu Mu nwe uwa nile: unu onwe-unu gābu-kwa-ram ala-eze ndi-nchu-aja, na mba di nsọ” (Ọpupu 19:5, 6). Ehab bụrị eze Israel, o sitekwara ná mkpụrụ Abraham, ma ọ bụ onye na ekpere arụsị na ogbu mmadụ. Ọ tụbàwo ndị amụma Chineke n’ụlọ mkpọrọ, wee gbuo kwa ha. Ma, n’aka nke ọzọ, Jehoshafat, bụ eze Juda, achọworị iru Chineke ma jégharị kwa n’ụkpụrụ Ya niile. Dịka esi mụ ha, ha bụ ụmụ nne, ma n’ihe nke mmụọ, ha dị iche rii nne.

Nime Ụwa Ma Esiteghị N’Ụwa

Ịhụ Chineke n’anya aghaghị ịdị omimi karị nke anụ-arụ na ọbara. Iwu ahụ na-ekwu sị: “Mgbe nwa-nne-gi nwoke, bú nwa nke nne-gi, ma-ọbu nwa-gi nwoke, ma-ọbu nwa-gi nwayi, ma-ọbu nwunye nke obi-gi, ma-ọbu eyi-gi, nke di ka nkpuru-obi-gi, gārafu gi na nzuzo, si, Ka ayi je fe chi ọzọ,(nke ọ nādigh mgbe I mara ha, gi onwe-gi, ma-ọbu nna-gi ha; ndi sitere na chi nile nke ndi nile no unu gburugburu, ndi nọ nso gi, ma-ọbu ndi nọpuru gi n’ebe di anya, site n’otù nsọtu ụwa we rue nsọtu ọzọ nke ụwa); ekwela ya, ege-kwa-la ya nti; anya-gi agagh emere ya ebere, enwe-kwa-la ọmiko n’aru ya, ekpuchi kwa-la ya: kama i ghagh igbu ya; aka-gi gēbu uzọ dikwasi ya ime ka ọ nwua” (Deuteronomi 13:6-9). Ịnọdụrụ Chineke ichè mgbe ụfọdụ na-apụta ikewapụta onwe anyị n’etiti èzínaụlọ anyị na ndị ikwu anyị; dịka Ndị Kraist, anyị nọ n’ụwa ma anyị esisteghị n’ụwa. Anyị apụghị ịnọdụrụ onwe anyị ná-abịaghị nso ndị mmehie, dịka Pọl na-akọwa: “Edegaram unu n’akwukwọ-ozim ka unu na ndi nākwa iko ghara imekọ ihe; ọ bugh ndi nke uwa nka ndi nākwa iko ma-ọli, ma-ọbu ndi-anya-uku-ya na ndi nāpunara madu ihe, ma-ọbu ndi nēkpere arusi: ebe ọ gādi unu mkpà isi n’uwa pua ma asi na unu eme otú a” (I Ndi Kọrint 5:9, 10). Jisọs na ndị mmehie mekọrọ ka O wee gwa ha ụzọ nke nzọpụta. Jisọs zara oku oriri ndị mmehie kpọrọ Ya ewee boo Ya ebubo na Ọ bụ onye-óké-ọñụ mmanya na onye-ori-nke-ukwu, enyi ndị ọna-ụtụ na ndị mmehie …(Matiu 11:19).

Anyị onwe anyị na ndị mmehie aghaghị imekọ kwa, ka anyị wee mee ka ha mara Kraist, ma anyị agaghị eso ha nwekọọ ajọ omume niile ha. Anyị nwere ike na-alụrụ ndị mmehie ọlụ, ma ọ bụ were ha n’ọlụ, ma anyị na ha agaghị ejikọta onwe anyị n’izụkọ ahịa ma ọ bụ inwekọ ihe ọ bụla dịka otù ndị. “Unu na ndi nēkwegh ekwe ekekọtala onwe-unu, n’ihi na unu na ha di iche: n’ihi na òle nkekọ ezi omume na imebi-iwu nēkekọ? ma-ọbu òle nnwekọ ìhè na ọchichiri nēnwekọ? Ọzọ, òle nnwekọ-ótù-ọlu Kraist na Belial nēnweko? Ma-ọbu òle òkè onye kwere ekwe na onye nēkwegh ekwe nēkerita? … N’ihi nka sinu n’etiti ha puta, guzo-kwa-nu iche, ka Onye-nwe-ayi kwuru, unu emetu-kwa-la ihe nādigh ọcha aka” (2 Ndi Kọrint 6:14-17).

Anyị onwe anyị, dịka Ndị Kraist, ka akpọworo iguzo ichè n’ihi nke a anyị adịghị eso n’òtù a na-akpọ “lodge” ma ọ bụ òtù nzuzo dị iche iche. Onye kwere ekwe agaghị ekekọta kwa onwe ya n’onye na-ekweghị ekwe n’ọlụlụ di na nwunye; otú ọ dị, adịghị ezube na onye lụwororị di ma ọ bụ nwunye ga-ekewapụ onwe-ya n’ebe di ya ahụ ma ọ bu nwunye ya ahụ ná-ekweghị ekwe nọ. (Lee I Ndi Kọrint 7:12, 13). Ọ dị mkpà ka Onye Kraist ọ bụla rọro enyi nke obi ya na ndị ha na ya na-akpakọ site n’etiti ndị ná-atụ egwù Chineke. “Unu ekwela ka eduhie unu: Nkparita nile ọjọ nēmebi omume ọma” (I Ndi Kọrint 15:33). “Nējeso ndi mara ihe, i gāma kwa ihe: ma eyi ndi-nzuzu ka agēmejọ” (Ilu 13:20). Jehoshafat mere omume nzuzu mgbe ọ rọọrọ Ehab dịka enyi, o wee me ka iwe Chineke dịkwasị ya. “Ibu eyi nke uwa bu ibu onye-iro nke Chineke” (Jemes 4:4).

Ntute Ahụ

Mgbe Maikaia bụ onye amụma dụrụ Ehab ọdụ, o mere ka etinye onye amụma ahụ n’ụlọ mkpọrọ: ma anyị na-ahụ mmụọ dị ichè nime ndụ Jehoshafat. Okwu Chineke ekwughị ụdị omume o mere ngwa ngwa Jihu bụ onye amụma basịrị ya mbá, kama ihe ọzọ anyị chọpụtara Jehoshafat na-eme bụ ijégharị Juda niile ná-eme ka obi ndị ahụ laghachịkute Chineke. O wee guzo ndị ikpé, nye ha iwu otú a: “Lenu ihe unu onwe-unu nēme: n’ihi na ọ bugh madu ka unu nēkpere ikpe, kama ọ bu JEHOVA; Ọ nọye-kwa-ra unu; n’okwu ikpe-unu. Ma ugbu a ka óké egwù JEHOVA dikwasi unu; lezienu anya, me ya: n’ihi na ọ digh ajọ-omume, ma-ọbu ihu-madu-iru-ọma, ma-ọbu inara-ihe-iri-ngo, di nime JEHOVA, bú Chineke-ayi.”

Ihe Ndapụta Mberede

N’ezie ọnọdụ ndị Juda n’ihe nke mmụọ dị mma mgbe ozi ruru Jehoshafat ntị na óké igwè mmadụ na-abịa imegide ya. Ọ na-abụ ihe óké ọñụ ịmara na anyị na Chineke dị n’udo mgbe ihe ndapụta mberede na-abịakwasị anyị. Ọ bụ eziokwu na egwù turụ Jehoshafat, kama ọ bụ náánị n’ọnọdụ ime ka ọ daberesie ike na Chineke karị. O “che iru-ya ichọ JEHOVA; ọ we kposa obubu-ọnu na Juda nile.” Nke a bụ obubu-ọnụ Chineke sọpụụrụ; ha emeghị ya ka mmadụ wee hụ ha, kama ha ji obi ha dum na eziokwu niile mee ya.

N’ihe ndapụta mberede a metụtara obodo ahụ niile, ndị Juda chịkọtara onwe ha imezu mkwusa Jehoshafat “Juda we chikọta onwe-ha ichọ inye-aka JEHOVA: ọbuná site n’obodo nile nke Juda ka ha biara ichọsi JEHOVA ike Juda nile nēguzo kwa n’iru JEHOVA, ha na umu-ntakiri-ha, na ndinyom-ha, na umu-ha.” Lee ka ọ ga-esi dị mma n’anya Chineke ịhụ ka ndị Ya niile jikọrọ n’otù ịchọ iru Ya! Jehoshafat wee guzo n’iru ha n’ụbọchị ahụ malite ikwupụta ike nke Chineke; ka ọ na-echetara Chineke mkwà Ya niile, o mere ka amara arịrịọ ya. O kwupụtara adighị ike ya, ná mkwubi okwu, o ji olileanya na okwukwe, sị “Kama ọ bu Gi ka anya-ayi nādikwasi.”

Ọzịzá Ahụ

Ngwa ngwa Jehoshafat kwubiri okwu ndịa, Mmụọ nke Chineke zitere ọzịzá, “Unu onwe-unu atula egwù, unu atu-kwa-la ujọ n’iru igwè madu a bara uba: n’ihi na ọ bugh unu nwe agha nka, kama ọ bu Chineke nwe.” Egwù anyị niile na-agbapụ mgbe anyị na-ebutara Chineke mkpà anyị n’ekpere. Ọ dịghị mkpà ka anyị ná-echegbu onwe anyị mgbe anyị na-atụkwasị obi na Chineke “JEHOVA bu ihèm na nzọputam; ònye ka m’gātu egwù JEHOVA bu ebe siri ike nke ndum; Ònye ka m’gātu óké egwù” (Abù Ọma 27:1). “Jehoshafat wee rube isi kpuchie iru ya n’ala: Juda niile na ndị bi na Jerusalem dakwara n’ala n’iru JEHOVA ikpọ isi ala nye JEHOVA.” Jehoshafat ji obi ya niile kwere ọzịzá ahụ nke si n’ebe Chineke nọ bịa. Ọtụtụ mgbe ekweghị ekwe na-anapụ ụmụ mmadụ óké mmeri ha ga-enweworị -- site n’ekwereghị ná mkwá niile nke Chineke. “Ihe nile, ka ha ra, bú nke unu nēkpe n’ekpere riọ kwa, kwenu na unu anatawo ha, ha gādiri unu” (Mak 11:24).

Okwukwe Etinyere n’ọlu

Ọ bụghị náánị na Jehoshafat kwere na Chineke kama ọ gwara Juda niile sị, “Kwerenu na JEHOVA, bú Chineke-unu, unu gēkwesi kwa ntukwasi-obi; kwerenu ná ndi-amuma-Ya, ihe gāga-kwa-ra unu nke-ọma.” Mgbe ọ gwasịrị Juda otú a, Jehoshafat tụpụtara otù àtụmààtụ ukwu, na-egosipụta okwukwe n’ụzọ pụtara ìhè karị akụkọ okwukwe dum edeworo n’akwụkwọ. Kama izipụ ndị agha ya bụ ndị dike n’iru agha, “ọ we guzo ndi nābuku JEHOVA abù, ndi nēto kwa ịma-mma nke idi-nsọ, mgbe ha nāpu n’obodo n’iru ndi ejikere agha, si, Kelenu JEHOVA; n’ihi na rue mgbe ebigh-ebi ka ebere Ya di.” “Ma na mgbe ha malitere iti nkpu na itò otuto,” Jehova wee malite ịlụrụ ha agha, ewee tigbuo ndịiro ha. Ngwa ngwa okwukwe na-ejide mkwà niile nke Chineke aka, mgbe otuto malitekwara isi n’ọnụ nwa Chineke ọ bụla ná-apụta ị ga-amata n’ezie na Chineke ga-emezu ihe ahụ O kwererị ná mkwà. Chee échìchè banyere nke a! Ọ dịghị otù mma agha amịpụtara n’ọbọ ya, ọ dịghị otù ubè eweliri ma ọ bụ ụta adọtịrị -- é-è, ọ dịghị ọbụná otù nkume sitere n’èbè onye ọzụzụatụrụ -- kama Chinke nyere ha mmeri ahụ. Náánị ihe dịrị Juda ime bụ ịbụ abụ ná-aga n’iru, ịchịkọta ihe mkwata n’agha na ịlaghachị n’ụlọ ha ná-eto Chineke. Ihe agha ha bụ ọta nke bụ okwukwe; mma agha ha, bụ Okwu nke Chineke. Ihe agha ha siri ike, mmeri ha dị kwa ukwu. “Oké egwù Chineke we dikwasi ala-eze nile nke ala nile ọzọ, mgbe ha nuru na JEHOVA busoro ndi-iro Israel agha.”

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Gịnị mere o ji dị njọ ka Jehoshafat nyere Ehab aka?
  2. Gịnị bụ omume Jehoshafat mere mgbe Jihu, bụ onye amụma baara ya mbá?
  3. Gịnị ka Jehoshafat mere ka o wee dịrị obodo ya mma?
  4. Gịnị ka Jehoshafat mere mgbe onye iro dị ike bịara imegide ya?
  5. Òlee ụzọ anyị ga-esi kewapụta onweanyị site n’ụwa?
  6. Òlee ụzọ Jehoshafat ji gosi okwukwe o nwere na Chineke?
  7. Òlee otú Chineke ji merie ndịiro Juda?
  8. Mụọọ ekpere ahụ Jehoshafat kpere, ihe mere o ji bụrụ ezi usoro ekpere
  9. Òlee ihe Juda mere n’agha ahụ megide ndịiro ya?
  10. Gịnị mere nzube Jehoshafat banyere ụgbọ ahụ niile ji daa?