Abù Ọma 92:1-15

Lesson 307 - Senior

Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISI: “Ndi akuworo n’ulo JEHOVA dika osisi gāma akwukwọ n’ogige nile nke Chineke-ayi” (Abù Ọma 92:13)
Cross References

I Ọlụ na Urù dị iche iche dị n’Itò Chineke

1. Ọ bụ ezi ihe itò Chineke, Abù Ọma 92:1-3; 33:2; 89:1; 147:1; I Ihe Emere 23:5.

2. Egosiri ịma mma na ịdị ukwu nke ọlụ niile nke Chineke, Abù Ọma 92:4, 5; 139:17; Aisaia 28:29; Ndi Rom 11:33, 34

3. Mmadụ nke yiri anụ-ọhịa na onye nzuzu adịghị aghọta ahụhụ ikpeazụ nke dịrị ndị ná-emebi iwu, Abù Ọma 92:6-9; 94:8; 68:1; Jeremaia 12:1-3; Malakai 3:15

4. Egosiri ngọzi dị iche iche nke dịrị onye eziomume, Abù Ọma 92:10-14; 23:5; 89:24; 135:1-3; Aisaia 65:22; Hosea 14:5, 6

5. Ọlụ ebere niile nke Chineke na ikpé Ya na-eguzosi ike ná-enwe kwa mkwà nke mmezu ha n’izu òkè Ya dị nsọ, Abù Ọma 92:15; Deuteronomi 32:4; Ndi Rom 9:14.

Notes
NKỌWA DỊ ICHE ICHE

Otù Ụbọchị nke Inye ekele

Obi anyị jupụtara n’ekele na ndị isi ọchịchị nke mbà ụfọdụ dị iche iche na-arọpụta otù ụbọchị kwa arọ dịka ụbọchị nke inye ekele. N’ụbọchị ahụ, a na-agwasị ndị niile bi n’obodo ahụ ike ka ha nye ekele too kwa Chineke n’ihi ebere na ngọzi Ya niile n’arọ gara aga. Dịka mbà, anyị nwere ọtụtụ ihe anyị ga-eji n’ihi ha kele Chineke. Dịka mmadụ n’otù n’otù, anyị nwere ihe anyị ga-eji n’ihi ha nye kwa Chineke ekele. Chineke dị ka O mere ka mbà dịka Amerika guzo mgbe mkpà inwe ebe mgbabà dị n’ụwa nye ụmụ Chineke ndị ná-enweghị ike ifè Chineke dịka o si dị ha mma ná mbà nke aka ha.

Dịka iwu mbù Amerika si dị, enyere onye ọ bụla ike ifè Chineke dịka akọn’uche ya si chọọ. Ọ dịbeghị mbà ọzọ nweere onwe ha n’okpukpe Chineke n’ụzọ dị otú a dịka nke ha nwere. Apụrụ ịsị kwa na ọ dịghị ndị ọ bụla ọzọ bi n’elu ụwa nwere ohere itó Chineke karịa ndị Amerika.

Ọtụtụ enweghị obi ekele n’ihi ohere ọma dị otú a nke iwu obodo anyị mere ka ọ bụrụ nke ha n’ụbọchị taa; ma kama itó Chineke na ifè Ya òfùfè, ha na-eme Ụbọchị Inye Ekele ka ọ bụrụ ụbọchị oriri na ite egwu, ịñụbiga mmanya ókè na ndụ ịlan’iyi. Ihere mee kwa mbà ahụ nke Chineke gọziworo n’ụzọ dị ebube ma ya bụrụ ebe ana-azọkwasị ebere Ya niile ụkwụ! Mbibi na-echere ndị dị otú a, bụ ndị ná-enweghị obi ekele, náánị ma ha chègharịrị.

Ubi Ọka

Mgbe anyị na-elepụ anya na-ahụ ubi sara mbara nke jupụtara ná mkpụrụ charaacha, anyị pụrụ isoro Devid kwue sị “I (Chineke) bu Onye nēsi n’ime-ulo-elu-Ya nile dè ugwu nile miri: afọ nēju uwa site ná nkpuru nke ọlu-Gi nile. I bu Onye nēme kwa ka ahihia puere anu-ulo, nēme kwa ka ihe akuru n’ala puere ọlu-ubi madu; ime ka nri si n’ala puta” (Abù-Ọma 104:13, 14).

Obi ahụ nke nwere ọñụ adịghị etó Chineke náánị otù ugbò n’arọ, bụ n’Ụbọchị Inye Ekele; kama, ọ na-eso Onye ahụ dere Abù ọma, na-egosi ebere Chineke kwa ụtụtụ na ikwesị ntụkwasị-obi Ya kwa abalị. N’ezie, otuto na-esi n’obi nwa Chineke ebili dịka ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ mgbe niile. Ito Chineke na-enye mmadụ obiụtọ. A na-enweta ọtụtụ ngọzi nke mmụọ, a na-emeri kwa ọtụtụ agha nke ime mmụọ site n’inye Chineke otuto.

Ma eleghịanya, Onye ahụ dere Abù Ọma na-etorị Onyenwe anyị n’ekpere. Obi dị ya ụtọ nke ukwu nke mere na o weliri ụbọ nke akwara iri ya, ọzọ mgbe ọ malitere ịkpọ ya, óké ọñụ jupụtara mkpụrụobi ya nke mere na ọ chọrọ ụbọ karịrị nke ahụ iji gosipụta ihe niile dị ya n’obi. N’ihi nke a, o wezugara ụbọ nke akwàrà iri ahụ wee jee n’ebe ụbọ akwara nke ukwu ya dị, mgbe ọ na-akpọ ya, mkpụrụobi ya wee jubiga n’ọñụ bụrụ kwa ihe a na-ewuli elu nime mmụọ, ruo mgbe olu ya naara ụtọ nke ụbọ ahụ wee bụọ otuto nye aha ahụ nke Onye Kachasị ihe niile elu.

Óké Ọlụ Dị Iche iche

“Le ka ọlu-Gi nile si di uku, JEHOVA!” Ọlụ aka Chineke na-eju David, bụ otù nime ndị dere Abù Ọma anya mgbe dum, ọzọ, ọtụtụ mgbe ka ọ na-ede kwa ihe banyere ha. Ọ sịrị na Eluigwe na-akọ nsọpụrụ Chineke; anyanwụ, ọnwa na kpakpando niile na-egosipụta ike Ya. David chetara ịdị mma Chineke n’ebe Israel nọ: na óké Osimiri Uhie gbapụrụ n’iru Ya, na ebipụrụ Osimiri Jọdan n’iru Ụmụ Israel. Chineke ha nwere ike ime ọtụtụ ihe ebube.

Anyị na-efè otù Chineke ahụ nke ndị Israel féré. Ọ bụ Chineke nke ike. Chineke anyị pụrụ ịgbanwe ndụ dị iche iche. O nwere ike ịgbaghara onye mmehie njehie ya, sacha kwa ndụ ya, wepụta ya n’alaeze setan wee tinye ya n’alaeze nke Kraist anyị. Ọ na-ewe ike dị nsọ nke Chineke ịgbanwe obi nke onye mmehie wee mee ya onye nke Kraist. Ọ dịghị ike ọzọ pụrụ ime nke a.

Ekwela ka Ụbọchị Inye Ekele nke arọ a gafenarị gị ná-ewelighi olu gị n’itò Chineke a na Onye nzọpụta a dị ebube, bụ Jisọs Kraist n’ihi ọtụtụ ihe ọ gọziworo gị nime ha site n’arọ gara aga. O kpuchiwo gị n’ọtụtụ ihe ọjọọ dị iche iche, nke ana adịghị ahụ anya, bụ nke bịaworo n’ụzọ gị. O nyewo gị arụ-ike, nri na uwe. Ume ndụ ka O nyeworo gị, O werewo kwa ọbụ aka Ya jide gị. O nwere ike iwepụ ndụ gị n’otù ntabìanya dịka esi afụnyụ oriọna, n’oge ọ bụla. Kama O nyewo gị ọtụtụ ngọzi ana-apụghị ịgụta ọnụ n’ọnọdụ ya. “Ka ha kele JEHOVA ekele banyere ebere Ya, na oké ọlu Ya nile nke ọ nāluru umu madu!”

Échìchè Miri èmì

“Échìchè-Gi miri emi nke uku.” Échìchè mmadụ adịghị omimi. Ndị ụfọdụ na-echè na ebe ọ bụ na mmadụ enwewo ike iwere ike ụfọdụ site n’ihe nke dị n’ụwa wee lụpụta ogbun’igwe nke a na-akpọ atọmik bọmb, na échìchè ya miri emi nke ukwu. Ma ihe nchọpụta ndị a mmadụ chọpụtaworo bụ náánị iwepụta ihe na nwantịị nke ihe omimi niile ezoro ezo nke Chineke. Ọ bụ Chineke kère ihe niile. Mmadụ na-achọpụta náánị ihe ahụ Chineke kèwororị.

Pọl, bụ Onyeozi, mgbe ọ kọwasịrị ihe omimi nke amara Chineke, tiri mkpu sị: “A! omimi nke àkù nke amamihe na nke ihe ọmụma kwa nke Chineke! Le otú anēnwegh ike ichọputa ikpé-Ya nile, otú anēnwegh kwa ike ituputa uzọ-Ya nile!” (Ndi Rom 11:33). Pọl kọwara na ebipụrụ Israel site n’ekweghi ekwe ha, ma ugbu a site n’okwukwe anyakudoro Ndị Mbaọzọ. Mgbe ọ na-atụle okwu a bụ ịdị omimi nke échìchè Chineke, o juru ya anya.

Omimi nke amamihe nke Chineke metụkwara onye ahụ dere Abù Ọma n’arụ. Ọ hụrụ na mmadụ nke yiri anụ-ọhịa na onye nzùzù aghọtaghị ebere Chineke n’ebe mmadụ nọ; ha aghọtaghị na adịghị eji náánị ihe ịga nkeọma nke a na-ahụ anya atụ ebere Chineke. Onye ná-emebi iwu nwere ike ịwasa akwụkwọ ndụ dịka osisi, ma ọ bụrụ na ọ rapụ Chineke ná nzube ya niile, ụbọchị ga-abịa mgbe ọ ga-ala n’iyì ebighịebi. Ị na-arapụ Chineke ná nzube gị niile taa?

Ịbá Ụbá Dịka Okoko Osisi

“Onye eziomume gāwa igù dịka nkwu.” Site n’okwu a, ọ dịrị anyị nfé ịchọpụta na olileanya nke onye eziomume dị ichè nke ukwu n’ebe nke ndị ná-emebi iwu dị bụ ndị eji atụnyere ahịhịa nke ná-akpọnwụ ngwa ngwa ebipụrụ ya. Nkwụ na-egosi ịdị ukwu na ịmị mkpụrụ ruo ebighịebi. Ọ na-alụ óké ọlụ, bụ inye mkpụrụ ya nri nkeọma. Ọ dịghị mgbe ọ bụla arọ niile mgbe mkpụrụ ya niile na-adapụchasị, ma ọ bụ mgbe ọ pụrụ inwe izu ike n’ebe ọlụ niile nke oge ịmị mkpụrụ dị. Ọ na-amị mkpụrụ mgbe niile. Nke a yiri ndụ Onye Kraist rii nne. Ọ na-amị mkpụrụ oge niile. Ọ dịghị mgbe ọ bụla a ga-asị na ọ na-enwe ozuzu ike site n’ọlụ ahụ ọ chọtaworo amara ịlụ. Ka ozi o nwere ijéré Chineke na mmadụ na-aba ụba karị, otú a ka ọ na-awasa kwa n’ihe mmụọ karị.

“Dika osisi cedar nime Lebanon ka ọ gēbù ibu.” Osisi cedar na-egosipụta ịma mma, iguzosi ike, na ịdị ebighịebi. Ikpuru adịghị ebibi osisi cedar, kama ọ na-adịgide ọtụtụ arọ. Esitewo n’okwukwe kụọ ndị eziomume dịka mkpụrụ n’me Alaeze Chineke. Okwu Chineke ka eji akwọsa ha mmiri ná-azụ kwa ha. Ha bụ ndị gbagideworo mkpọrọgwụ n’ime ịhụn’anya bụrụ kwa ndị atọworo ntọala nime ya. Ha bụ dike na dimkpà, dịka nkwụ na osisi cedar. Ha na-amị mkpụrụ mgbe niile, na-aba kwa urù n’ụzọ dị iche iche. Tinyekwara ihe niile ndịa, “ha gānọ nāmi nkpuru n’isi-awọ.” Lee ka o si bụụrụ anyị niile ihe nkasiobi!

Simeon na Ana, ọ bụ ezie na ha emewo agadi, nọ ná-efè Chineke òfùfè nime ogige nke Ụlọ ukwu Ya mgbe ndị mụrụ nwata ahụ, bụ Jisọs kutara Ya n’ebe ahụ. Simeon adịworị ndụ eziomume bụrụ kwa onye ná-atụ egwù Chineke. Ya na Chineke ayịkọwo ná-ejégharị ogologo oge nke ndụ ya niile. Ọ bụworị alaka na-amị mkpụrụ nke ezi Osisi Vine ahu ọtụtụ arọ, ma ugbu a anya ya ahụwo Mesaia ahụ, o jikeere ịla n’udo. Ana, kwa, weere obubuọnụ na arịrịọ na-ekpere Chineke abalị na ehihie. Mgbe ọ hụrụ Kraist, ọ gbara àmà nye ndị niile ahụ na-echere mgbapụta n’Israel. Simeon na Ana dị ka nkwụ na osisi cedar nime Lebanon; ha mịrị mkpurụ n’isi awọ, dịka ha si mịa mkpụrụ n’okorọbịa ha. Anyị onweanyị maara ọtụtụ ndịkom na ndịnyom, bụ ndị ná-atụ egwù Chineke, ndị mịworo mkpụrụ ná ndụ ha nye Chineke, bụ kwa ndị jewooro Ya ozi ruo oge hour nke ọnwụ. Ụfọdụ bụ ndị ebubigara rue Eluigwe ngwa ngwa ha kpesiri ekpere banyere ụwa nke furu efu, nime mmehie. Ànyị na-achọ ịdị ka ndịa? Anyị pụrụ ma ọ bụrụ na anyị achọọ!

Ala Ngọzi

N’oge a bụ oge Inye Ekele, ka anyị cheta aka ngọzi Chineke nke setiworo n’ebe anyị nọ n’arọ nke gara aga, wee bụkue aha Ya abụ otuto. N’ihi na anyị pụrụ iso David kwuo, sị: “I letawo ala, we me ka o juputa n’ihe, I nēme ka o nwe àkù ri nne; miri-iyi Chineke juputara na miri: I nēdozi ọka-ha, mgbe I si otú a dozie ala onwe-ya. I nēdè ọbà-ala-ubi-ya miri: I nēme ka ebe elu ya nile di lari: I nēji oké miri-ozuzo gbaze ya; I nāgọzi ihe-opupú-ya. I kpubewo arọ nke ezi ihe-Gi okpu-eze; uzọ-Gi nile nātasasi kwa abuba. Ha nātasa n’ebe-ita-nri nile nke ọzara: anēji kwa otite-egwú-ọñụ ke ugwu ntà nile n’úkwù. Ewerewo ìgwè ewu na aturu yikwasi ebe-ita-nri nile dika uwe; anēwere ọka kpuchie ndagwurugwu nile; ha na-eti mkpu ọñụ, e, ha nābù abù” (Abú Ọma 65:9-13).

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Gịnị mere anyị ji eme ememe Inye Ekele?
  2. Òlee ụzọ kwesịrị ka anyi were mee ya? Gịnị kpatara nke a?
  3. Òlee otú mmadụ nke yiri anụ-ọhịa na onye nzuzu si ahụ ihe ịga nkeọma nke ndị ná emebi iwu?
  4. Òlee ụzọ Chineke si ele ihe ịga nkeọma nke ndị ná-emebi iwu anya?
  5. Òlee osisi eji tụnyere ndị eziomume?
  6. Kwuo ihe mara mma ụfọdụ nke osisi ndịa nwere.
  7. Gịnị ka o kwuru na onye eziomume ga-eme n’isi awọ?
  8. Kpọọ aha ndị eziomume ụfọdu ndị mịworo mkpụrụ n’isi awọ.