I Ndi Eze 19:19-21; 2 Ndi Eze 2:1-18

Lesson 308 - Senior

Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISI: “Ngọzi nādiri ndi agu ezi omume nāgu, ndi akpiri nākpọ kwa nku na ya: n’ihi na ndi ahu ka afọ gēju” (Matiu 5:6).
Cross References

I Ọkpụkpọ òkù Nke Chineke

1. Elaija wụkwasịrị Elaisha uwe nwuda ya; omume a na-egosi ọkpụkpọ òkù nke Chineke, I Ndi Eze 19:16, 19; Ọpupu 3:1, 2; Ndi Ikpé 6:11, 12; Abù Ọma 78:70-72; Emos 7:14, 15; Matiu 4:18, 19

2. Elaisha ji ihe niile o nwere na èzínaụlọ ya chụọ àjà wee za òkù ahụ Chineke kpọrọ ya, I Ndi Eze 19:20; Matiu 8:21, 22 Luk 9:61, 62; Jenesis 24:55-58

3. Elaisha jiri ehi ya chụọ àjà wee jeso Elaija ijere ya ozi, I Ndi Eze 19:21; 2 Ndi Eze 3:11, 12; Jọn 13:13-16; Luk 22;25-27; Matiu 20:28; Ndi Filipai 2:17

II Uwe nwụda nke Chineke

1. Elaisha soro Elaija ná-agbanyeghị ihe mgbochị na mkwugide dị iche iche, 2 Ndi Eze 2:1-8; Rut 1:15-18; 2 Samuel 15:21; Jọn 11:16; 13;1; Ndi Rom 16:4; 2 Timọti 1:16; Ọlu Ndi-ozi 2:42

2. Nnọgidesi ike nke Elaisha, na ikwesi ntụkwasịobi ya mere ka Elaija jụọ Elaisha ihe a ga-emere ya, 2 Ndi Eze 2:9, 10; 2 Ihe Emere 15:12-15; Abù Ọma 73: 25; Mak 5:27-34; 10:51, 52; 7:25-29

3. Ebupụrụ Elaija ruo eluigwe n’óké ifufe, 2 Ndi Eze 2:11; Jenesis 5:24; Ndi Hibru 11:5; I Ndi Kọrint 15:51, 52; Matiu 24:27, 28, 40; 41; Luk 9:30, 31; I Ndi Tesalọnaika 4:14-18

4. Elaisha nwetara uwe nwụda ahụ nke danarịrị Elaija -- ụdị ịnata ike nke Mmụọ Nsọ, 2 Ndi Eze 2:12-18; Luk 24:49; Jọn 14:12-14; Ọlu Ndi-ozi 2:1-4, 16-18; Abù Ọma 45:1, 7

Notes
NKỌWA DỊ ICHE ICHE

Ndịakpọworo nke Arọpụtakwara

Ọ dịghị ebe ọzọ n’Okwu Chineke enwere usoro ka mma eji akpọ mmadụ n’ijeozi Chineke dịka Elaija ịwụkwasị Elaisha uwe nwụda ya. Elaija dịka Onye amụma nye Israel nke daghachịworo àzụ, na-abịaru nso ọgwụgwụ ijéozi ya nke jupụtara ná nsogbu. A ga-arọpụta onye nnọchị bụ onye ga-eme ka ọlụ Chineke gaa n’iru, ma onye nnọchị ahụ bụ Elaisha -- nwoke, ma ná-eleghị anya, Elaija amaghị onye ọ bụ, ma Chineke maara ya.

Ndiozi Chineke na ndị ọlụ Ya bụ ndị Chineke n’Onwe Ya debere n’ọnọdụ nke ebe ọlụ ahụ pụrụ ichè. Anyị matara nke a site n’okwu Jisọs n’onwe Ya kwuru: “Ọ bugh unu onwe-unu rọputaram, kama ọ bu Mu onwem rọputara unu, weputa kwa unu ichè, ka unu onwe-unu je mia nkpuru, ka nkpuru-unu we nọgide kwa” (Jọn 15:16). Pọl kwuru nke a banyere ijéozi ya, “N’ihi na asi na anamezisa ozi-ọma, enweghm ihe inya isi; n’ihi na nkpà nākpam; n’ihi na ahuhu dirim, asi na ezisaghm ozi ọma. N’ihi na asi na emem ihe a ebe m’nāchọ ime ya, enwerem ugwọ-ọlu: ma ọ buru na emem ya mgbe m’nāchọgh ime ya, ewerewo ntukwasi-obi nye ọchichi-èzí-na-ulo n’akam” (I Ndi Kọrint 9:16, 17). (Gụọ Ndi Hibru 5:1-4). Chineke gwara Elaija sị, “I gēte kwa Elaisha bú nwa Shefat, nke Ebel-mehola, ibu onye amuma n’ọnọdu gi” (I Ndi Eze 19:16). Enyeghị Elaija ohere ịrọrọ onye ga -anochị ya, kama Chineke maara obi mmadụ niile.

N’ezie, Chineke ịrọpụta mmadụ ọ bụla n’ihi ijéozi Ya nesite ná njikere onye ahụ jikereworo onwe ya, ya na nke ọ na-ejikere kwa n’ihi ijéozi ahụ. Chineke adịghị eziga onye na-amabeghị ịlụ ọlụ Ya (Gụọ I Timọti 3:6). Ọtụtụ oge ndị Ọ na-akpọ n’ọlụ Ya bụ mmadụ ndị omume ha na ndụ ha na mgbe gara aga na-egosi ikwesị ntụkwasịobi na nchekwube nke ga-abara ọlụ Chineke urù n’ọdịn’iru. Nwoke dị otú a ka Devid bụ. “Ọ rọputa-kwa-ra Devid, bú orù-Ya, Ọ we si n’ogige igwè ewu na aturu kuru ya: Ọ mere ka o si n’iso nne-aturu nke nēnye ha ara bia, izù Jekob, bu ndi-Ya, na Israel, bú ihe-nketa-Ya dika aturu. Ọ we nāzu ha dika izu-òkè nke obi-ya si di; were kwa ihe-nghọta nile nke ọbu-aka-ya abua nēdu ha” (Abù Ọma 78:70-72). Otùaka ahụ kwa Chineke rọpụtakwara Josef, ọ bụ ezie na ọ bụ nwa okorọbịa, imere Ya otụtụ óké ihe (Lee Abù Ọma 105:17-22).

Mkpụrụobi ahụ ọ na-agụ agụ ịlụ ọlụ Chineke ga-eme ihe ọ bụla ọ pụrụ ime ka o wee kwesị ijéozi. Mgbe òkù ahụ ga-abịa ọ ga-adị njikere. Devid, bụ nwa okoro ahụ ná-azụ atụrụ, atụfughị oge iguzogide Gọlaiat, bụ onyeiro nke Israel, n’aha Jehova, n’ihi na, ya onwe ya bụ Devid, etigbuworị bear na ọdụm n’oge ọ dị na nwantà site n’inyeaka nke Chineke. Mgbe achọrọ otù onye ga-eweli mma agha nke Onyenwe anyị, okwukwe Devid nwererị na Chineke na mgbe gara aga mere ka ọ dị ike, o wee za òkù ahụ. Chineke ji ya lụọ ọlụ n’ihi na ọ dị njikere. Ọ dịghị onye ọzọ nọ n’Israel nwere anya ike ibu agha nke Jehova megide Golaiat.

Mgbe ọ nọ na alụ ọlụ ya dịka ọ na-eme kwa ụbọchị, na mberede o nwere mmetụta banyere uwe nwụda nke Elaija nke awụkwasirị ya gburugburu. Karịa ịdị arọ nke uwe nwụda, o nwere óké mkpali n’obi ya nke ukwu ijéozi nke Chineke; o wee nụ, nime obi ya, olu Chineke nke na-ekwu okwu ahụ dị óké mkpà nke ọtụtụ mmadụ nụworo, na mgbe ochie: “Som.”

Iji-obi-chụọ-àjà

Náánị ichè na Chineke na-achọ ka onye ọ bụla bata n’ijéozi ya n’otù ụzọ ma ọ bụ n’ụzọ ọzọ, agaghị egbochi onye ọ bụla iji obi ya chụọ àjà ịlụ ọlụ ahụ nkeọma. N’ụzọ ọzọ, ịzá ọkpụkpọ òkù nke Chineke pụtaara onye ahụ iji obi chụbiga àjà ókè ebe ọ dị ụkwu ka o wee pụ ijéozi ahụ nkeọma, bụ nke akpọworo ya ijé. Elaisha adịghị ichè n’ebe ndịkom ndị ọzọ nọ. Ọ ghọtara ọlụ ukwu dị n’òkù ahụ akpọrọ ya, wee mara kwa na ọ ga-achọ inye ndụ ya dum, ọzọ na ọ ga-ebute ụzọ n’ebe ọchịchọ ọ bụla ọzọ na ọlụ ọzọ ná ndụ ya dị. Ijéozi nke Chineke bụ ijéozi nke kachasị ukwu ná ndụ, ụgwọ-ọlụ ya bụ kwa ihe ana-apụghị igụta ọnụ; kama ọ bụ náánị site na mmadụ iwere obi ya dum nyebiga n’ijéozi nke Chineke ka ụmụ mmadụ pụrụ iji mezuo uche Ya. Anyị na-enwe mmetụta banyere ịgbasi mgbá ike nke mkpụrụobi Elaisha na Chineke nwere mgbe o tikuru Elaija mkpu, “Biko, kam sutu nnam na nnem ọnu, m’gējeso kwa gi.” Ọzịzá nke Elaija, “Laghachi n’ihi na ọ bu gini ka m’meworo gi?” pụtara ná mkpirikpi, “I ghaghị ịzá Chineke; ọ bụ Ya kpọrọ gị, ọ bụghịm; ya mere ị ghaghị ịzá Ya.”

Were okwu ndịa tụlee okwu ahụ Jisọs gwara nwoke ahụ ná-achọ ịbụ onye ná-eso ụzọ Ya onye chọrọ ka arapụ ya ka ya buru ụzọ jee lie nna ya, “Som, rapu kwa ndi nwuru anwu ka ha lie ndi nke ha nwuru anwu” (Matiu 8:22).

Ijéozi

Elaisha, mgbe ọ chụsịrị àjà ọ rapụrụ èzínaụlọ ya iso Elaija. Baịbụl na-akọwa na ọ “wukwasiri miri n’aka Elaija” (2 Ndi Eze 3:11), nke na-apụta na ọ na-ejere Elaija ozi n’ụzọ ọ bụla ọ pụrụ ịbara Onye amụma nke Chineke ahụ urù. Ịkpọ òkù nke Chineke nye mkpụrụobi mmadụ bụ òkù maka ijere ndị ọzọ ozi -- dịka ana-ejere Kraist. (Lee 2 Ndi Kọrint 5:20.) Jisọs sịrị, “Mu onwem di n’etiti unu ka onye nēje ozi” (Luk 22:27). Jisọs gwara ndị ná-eso ụzọ Ya; “Onye ka ibe-ya uku n’etiti unu, ya di ka onye bu nwata; onye bu kwa onye-isi, ya di ka onye nēje ozi” (Luk 22:26). Ọzọ kwa Jisọs sịrị “Nwa nke madu abiagh ka ejere Ya ozi, kama ka Ọ je ozi, ka Ọ were kwa ndu Ya nye ka ọ buru ihe-ngbaputa n’ọnọdu ọtutu madu” (Matiu 20:28).

Ndị enyere Chineke ga-abụ ndị etinyere n’ịlụ ọlụ Chineke nye ụmụ Chineke n’ebe ọ bụla Chineke ga-achọ ya. Anyị aghaghị ịtụfu ndụ anyị ka anyị wee nweta ya ọzọ ruo ndụ ebighịebi. Onye Kraist ọ bụla aghaghị ịmụta nke a n’ọtụtụ mgbe ọ na-efè Chineke, ka o wee keta ndụ ebighịebi.

Iso iwu Kraist ọtụtụ mgbe na-edu mmadụ aga ebe dị anya dị iche iche n’ụwa, baa n’ala ndị ná-amaghị Chineke, ebe ha ná-aghaghị izute ọtụtụ ihe na-eweta mmekpa-arụ nime ndụ, ma mgbe ụfọdụ kwa tụfuo ndụ ha n’ikwusa Oziọma, ka ewee zọpụ ụmụ mmadụ site ná mmehie niile ha. Nke a bụ ijéozi nke mmadụ na-eji ndụ nke onweya chụọ àjà nye Chineke, n’ihi na orù adịghị aka onye nwe ya ukwu. Dịka Jisọs nyere ihe niile, otù aka ahụ kwa, apụrụ ịkpọ Onye Kraist ka o nye ihe niile o nwere, ka otuto wee bụrụ nke Chineke n’ihi na Onyenwe anyị na-achọ ya n’aka ya.

Elaisha bụ ezi onye ná-eso Chineke n’ihi na o jikeere ijere Onye amụma nke Chineke ozi n’ebe ọ bụla ọ ga-abụ. Ọ dị ndị na-eleda ọlụ ụfọdụ nke ha nwere ike ịkpọ ọlụ nweda n’ala (ma ọ bụ ọlụ nke ịbụ orù) nime Oziọma anya, na-echè na ihe ha bụ ma ọ bụ ọnọdụ ha ná ndụ karịrị ọlụ dị otú a. Ọ dịghị ọlụ na adịghị mkpà nye Chineke; ma ọ dịbeghị onye akpọrọ ka o weda onweya ruo ọnọdụ ahụ nke Jisọs wedaruru onweYa mgbe ọ rapụrụ ụmụ mmadụ ka ha kwaa Ya emò site n’ime Ya ihe ọchị na ihe ihere dị iche iche, merụsịa Ya arụ n’ụzọ nke ime ka arụ Ya nwee óké ihe mgbu, ma n’ikpeazụ, ha wepụ ndụ Ya. O “mere Onwe-ya ihe-efu, n’inara udi nke orù, ewe me Ya n’oyiyi nke madu; ebe ahuru Ya ka Ọ di ka madu n’oyiyi-Ya, O weda-kwa-ra Onwe-ya, we buru Onye nāña nti rue ọnwu, bú ọnwu nke obe” (Ndi Filipai 2:7, 8). “Ọ bu ọgaranya, ma Ọ ghọrọ ogbenye n’ihi unu, ka unu onwe-unu we were ogbenye-Ya ghọ ndi-ọgaranya” (2 Ndi Kọrint 8:9). Nke a bụ ihe nlere-anya Jisọs rapụrụ, Onye nyere Chineke, bụ Nna Ya Onweya na ihe niile O nwere, n’ihi nzọpụta nke mkpụrụobi ụmụ mmadụ; anyị apụghị kwa ime ihe ọ bụla dị ala karịa ihe Onyenwe anyị na-achọ.

Ike nke Chineke

Mgbe Jehova gaje iweli Elaija elu n’óké ifufe rue Eluigwe, Elaija wee gwa Elaisha, “Biko, nọdu n’ebe a.” Ma Elaisha ekweghị ịrapụ Elaija. Ọlụ Elaisha bụrị ijere Elaija ozi; Elaisha matakwara na mgbe ná-adịghị anya aga ewepụ nna ya ukwu. Obi Elaisha na-anụ ọkụ nime ya, n’ihi na ọ chọrọ karịa ihe ọ bụla ọzọ inweta Mmụọ ahụ na ike ahụ nke Elaija nwere. Ọ dịghị ọlụ ọ bụla aga alụrụ Chineke ga-aga nkeọma ma ọ bụrụ na alụghị ya site n’ike nke Mmụọ nke Chineke. Elaisha maara nke a, ya mere ọ jụrụ ịrapụ Elaija ọbụná nwa oge tutu ruo mgbe ọ natara ike ahụ Elaija nwererị.

Ụmụ ndị amụma chetaara Elaisha banyere nrapụ Elaija ga-arapụ na mgbe ná-adịghị anya, wee nwaa kwa igbochi ya site n’iso Elaija. Apụghị ime ka anya Elaisha pụọ n’arụ nna ya ukwu. N’ikpeazụ Elaija wee jụọ ya ihe ọ chọrọ. Ọzịzá Elaisha bụ, “Òkè abua nke mọ gi,” bụ ụdị ọzịzá nke mkpụrụobi ahụ nke ná-achọ ike ukwu ahụ nke Ọwụwụ mmiri nke Mmụọ Nsọ na-enye. N’iji “nkwuwa-okwu biarue oche-eze amara,” anyị na-arịọ, ná-anata kwa n’aka Chineke Mmụọ nke Chineke, Onye Jisọs kweworo mkwà izite.

Elaija gwara Elaisha ụkpụrụ ọ ga-eso wee nata ihe ọ rịọrọ. N’otù aka ahụ ọ dị ụkpụrụ Chineke rọpụtaworo nke Onye Kraist aghaghị iso ma ọ bụrụ na ọ ga-anata Ọwụwụmmiri nke Mmụọ Nsọ. Aghaghị ịzọpụta ya, ya ewee bụrụ onye agbaghaworo mmehie ya niile site n’ike dị n’Ọbara Jisọs Kraist, o wee bụrụ onye ekere ọhụụ nime Kraist Jisọs. Mgbe nke a gasịrị aghaghị ido ya nsọ, bụ ọlụ àmàrà nke abụọ. Mgbe ahụ ka ọ ga-enwe kwa ike chọọ iru Chineke ka ewee mejupụta ya n’ike nke Mmụọ Nsọ.

Elaisha ewezugaghị anya ya n’arụ Elaija. Kama o sogidere ya n’ikwesị ntụkwasịobi, site n’otù ebe ruo ebe nke ọzọ. Mgbe ahụ, na mberede, dịka ụgbọ-ala ọkụ ahụ kewara ha, ebupụrụ Elaija rue Eluigwe n’óké ifufe. Elaisha hụrụ ka ọ na-ala, o wee dọwa uwe nke aka ya, wee were uwe nwụda Elaija nke danarịrị yarii. Mgbe Elaisha weere uwe nwụda ahụ Elaija tie miri Jọdan, wee tie mkpu, sị “Òle ebe JEHOVA nọ bú Chineke Elaija?” Chineke gosiri Onweya ma kewaa kwa mmiri Jọdan ka Elaisha wee gabiga. Anyị onweanyị kwa pụrụ ịnwapụta eziokwu na ọdịdị nke Chineke. Site n’irubeisi n’ihe niile O nyere n’iwu na ịchọ iru Chineke n’ụzọ ziri ezi, anyị pụrụ ịnata ihe omimi dị iche iche nke Chineke, dịka Elaisha mere.

Mmadụ 120, bụ ndị ná-eso ụzọ Jisọs, nọkọrọ n’otù obi wee kpee ekpere ụbọchị iri n’ihi Mmụọ nke Chineke ekwere ná mkwà; mgbe ụbọchị Pentikọst na-ezu, Chineke wụsara ha niile Mmụọ Ya.

Ọ dị ka agwaworị ụmụ ndị amụma banyere nrapụ nke Elaija dịka esi gwa Elaisha, ma ọ bụ náánị Elaisha ka agụụ inweta Mmụọ nke Chineke ahụ dị nime Elaija gụrụ, ọ bụ kwa náánị ya bụ onye natara Mmụọ ahụ. Dịka ọtụtụ maararị nkwà ahụ Jisọs kwere na Ya ga-ezite Onye nkasiobi ahụ, bụ Mmụọ Nsọ, ihe ra ka mmadụ 500 hụrụ Jisọs mgbe O si n’ọnwụ bilie, ma ọ bụ náánị mmadụ 120 ka ọ gụrụ agụụ riinne ịnọdụ n’otù ebe ichere rue mgbe Mmụọ ahụ bịara. Otú a ka ọ dị kwa taa. Ndị agụụ ihe nke Chineke na-agụ na-achọ ha, na-edebezu iwu niile nke Chineke ka ha wee nata ha; ha nọ kwa n’ebe kwesịrị ka ha nọdụ, nwee kwa ezi ọnọdụ ime mmụọ nke bụ na Chineke pụrụ inye ha agụụ niile nke obi ha.

Ike nke Chineke ka ga-adakwasị kwa ndị niile ahụ ga-arapụ ihe dum wee zaa òkù ahụ Jisọs Kraist na-akpọ. Nkwà nke Chineke bụ eziokwu, dịka Pita kwusiri ya ike n’ụbọchi Pentikọst mgbe ọ sịrị. “Nka bu nke ekwuworo n’ọnu Joel onye-amuma, si ọ gēru kwa na mgbe ikpeazu, ka Chineke kwuru, M’gāwusa ufọdu nime Mọm n’aru anu-aru nile, bú madu: umu-unu ndikom na umu-unu ndinyom gēbu kwa amuma, umu-okorọbia-unu gāhu kwa ọhù, Ndi-okenye-unu gārọ kwa nrọ: E, n’aru ndi-orùm ndikom na n’aru ndi-orùm ndinyom ka M’gāwusa ufọdu nime Mọ nkem na mgbe ahu; ha gēbu kwa amuma”. “Unu ka nkwa nka diri, na umu-unu, na ndi nile nọ n’ebe di anya, ka ha ra, bú ndi Onye-nwe-anyị Chineke gākpọtara Onwe-ya” (Ọlu Ndi ozi 2:16-18, 39).

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Ònye rọpụtara Elaisha ịbụ onye ga-anọchị Elaija?
  2. Ònye na-arọpụta ndịozi nke Chineke n’ụbọchị taa?
  3. Gịnị mere Elaija ji gwa Elaisha ka ọ laghachi mgbe Elaisha malitere iso ya?
  4. Gịnị mere o ji dị mkpà bụ mmadụ iji ndụ ya chụọ àjà maka ịlụ ọlụ Chineke?
  5. Òlee otú Elaisha si nweta Mmụọ nke Chineke ahụ nke dịkwasịworo Elaija?
  6. Òlee ụzọ apụrụ isi nweta Mmụọ nke Chineke n’ụbọchị taa?
  7. Ònye pụrụ inweta Mmụọ nke Chineke n’ụbọchị taa? Kpọọ ebe aga agụ n’Akwụkwọnsọ iji kwagide ọzịzá gị.