2 Ndi Eze 2:19-25; 3:1-27

Lesson 309 - Senior

Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISI: “M’gāwukwasi miri n’aru onye akpiri nākpọ nku, na ọtutu miri-iyi n’ala-akọrọ: M’gāwukwasi Mọm n’aru nkpuru-gi, na ngọzim n’aru umu i muru” (Aisaia 44:3).
Cross References

I Ime Ebere dị Iche iche na Ikpé

1. Emere ka ebere nke Chineke rue ka ha ra bụ ndị chọrọ ya arụ, 2 Ndi Eze 2:19-22; Ọpupu 34:6, 7; 2 Ihe Emere 30:9; Abù Ọma 103:17; 106:1

2. Emere ka ikpé nke Chineke dakwasị ka ha ra bụ ndị kwuluru Chineke, ndị jụkwara ịsọpụrụ Ya, 2 Ndi Eze 2:23-25; Levitikọs 26:21-39; Abù Ọma 9:16; Zefanaia 3:5; Ndi Rom 2:2

II Elaisha na Ndịeze nke Israel, na nke Juda

1. Jehoram, bụ eze Israel, mere otù ihe ziri ezi ma o mezughị ya, 2 Ndi Eze 3:1-3

2. Ọnọdụ nke ndị Israel enweghị ọgan’iru, ọ dịghị kwa udo dị,2 Ndi Eze 3:4, 5; Joshua 1:1-9; Levitikọs 20:22-24; Deuteronomi 6:10-15; 31:20, 21; Ndi Ikpe 2:1-3, 11-15

3. Jehoshafat, bụ eze Juda, kwenyeere Jehoram, ha niile wee daba ná nsogbu, 2 Ndi Eze 3:6-10; I Ndi Eze 15:16-20; 2 Ihere Emere 18:1-34; 19:1, 2; Aisaia 30:1, 2; 31:1

4. Jehoshafat chigharịkutere Chineke mgbe ọ nọ ná nsogbu, 2 Ndi-eze 3:11, 12

5. Elaisha kwupụtara na ya agaghị ekwenyere Jehoram, 2 Ndi Eze 3:13, 14

6. A na-eji ịkpọ ụbọ (ma ọ bụ Abù une) lụọ ọlụ nkeọma mgbe mmadụ na-achọ ma na-eme kwa uche Chineke, 2 Ndi Eze 3:15; Ndi Ikpe 5:1; I Samuel 16:23; 2 Ihe Emere 20:20-22

7. Chineke nyere (nnapụta) mgbapụta n’ụzọ ná-enweghị mgbagwoju anya na ọ bụ Ya zitere ya, 2 Ndi Eze 3:16-20; Ndi Ikpe 7:2

8. Mgbapụta nke Chineke nye ndị Ya ghọọrọ ndị na-emebi iwu ọnyà, 2 Ndi Eze 3:21-27; 2 Ndi Kọrint 2:16; Ọpupu 14:19, 20

Notes
NKỌWA DỊ ICHE ICHE

Ebere Chineke na Ịdịmma Ya Ihe Nlere-anya Anyị

Elaisha anataworị òkè abụọ nke ike ahụ dịkwasịworo Elaija, wee laghachị na Jeriko. Na Jeriko ka o zutere ndị ahụ hụworo mkpebi siri ike o nwere nke ná-ekweghị ka ihe ọ bụla gbochie ya ịnata ike nke Chineke; ma n’ebe ahụ ka Elaisha nụworo arịrịọ ha ka ha jee chọọ Elaija. Ndịa ná-ekweghị ekwe kwesịrị ịmata na Elaija na Chineke nọ n’Eluigwe na Ọ rapụghị ya n’otù ugwu ma ọ bụ n’otù ndagwurugwu. Ha biri n’obodo ebe ọnọdụ ya dị mma, ma ha rapụrụ ịbịaru ná mmazu n’ihe nke mmụọ nke emeghere ụzọ nye ha. Elereanya na ha ga-abụ ndị ná-asọpụrụ Chineke, ma ha jupụtara n’obi abụọ ma nwee kwa mmụọ nke ná-adịghị achọ ngọzi kasị mma nke Chineke. Elaisha kwere wee nata; ọ chọsiri ike nke Chineke ike wee were ya lata. Ọ bụrị ezie na ọkpụkpọ akpọrọ ụmụ ndị amụma a na nke Elaisha abụghị otù, ma otú ọ dị, ha akaenweworị nsọpụrụ Chineke nime ha karịa, ma ọ bụrụ na ha chọsiri ya ike. Ugbu a, n’otù nime ule mbụ nke eji nwapụta ike Elaisha, Chineke gosiri site n’onye amụma Ya, na ọdịmma nke mmadụ na-emetụ Ya n’obi nke ukwuu.

Mgbe Jisọs kwuru okwu Chineke n’elu ugwu ahụ, O ziri ìgwè mmadụ ahụ ka ha ná-ahụ ndịiro ha n’anya, ná-eme iheọma nye ndị ná-akpọ ha asị, ná-agọzi ndị ná-abụ ha ọnụ, ná-ekpe kwa ekpere n’ihi ndị ná-akpagbu ha ná-akọcha kwa ha. Nke a ka ha ná-aghaghị ime ma ọ bụrụ na ha ga-abụ ụmụ nke Nna ha nke bi n’Eluigwe, n’ihi na Chineke Nna bụ Chineke nke ebere, ịhụn’anya, na ịdịmma. Chineke na-awụkwasị ụdị ịdị mma a dị nime Ya n’arụ anụ-arụ niile bụ mmadụ n’otù ụzọ ma ọ bu n’ụzọ ọzọ. Ndị niile nwere onyinyo nke Nna ha nke Eluigwe aghaghị ịdị ka Ya, site kwa n’amara Ya na ike nke ọmụmụ ọhụụ, n’inwe ụdị omume ndịa nke ga-emetụta ma gbanwee kwa ndị ha na ha na-emekọrịta.

Mgbe Elaisha bịaruru Jeriko, o wee hụ na ọnọdụ nke obodo ahụ dị mma, ma mmiri ya jọrọ njọ, na ala ya adịghị ekwe ka ihe kááká. Ọtụtụ mmadụ dị n’ụwa taa, ndị ejiworo onyinye dị iche iche na amamihe gọzie, ndị apụkwara isite na ha gọzie ndị ọnọdụ ha dị ala n’ụwa, ma ha erughị iji lụọ ọlụ ọma a n’ihi na ha enweghị udị ịdịmma ahụ nke ga-eme ka ha lụọ ọlụ ahụ nkeọma. Anyị niile aghaghị inwe ụdị nke Chineke ndịa, nke bụ ebere, ịhụn’anya na ịdịmma ka anyị wee lụọ ọlụ nkeọma nye Chineke na ebighịebi. Ọ bụrụ na mmadụ ga-ejigidesi nzọpụta Chineke ike, ọ ghaghị ịmị mkpụrụ nke Mmụọ Nsọ. Ma asị na otù onye nime ụmụ Chineke adahie, ọ ghaghị ijé n’ebe nsogbu ya si malite ka eweghachị ya n’ọnọdụ ahụ nke bụ uche Chineke n’ebe ọ nọ. N’ime nke a ọ ga-eleba anya nime ime obi nke ya; mgbe o nyochaworo onweya nkeọma n’ekpere, ọ ga-aga n’iru ịtụpụ “nkpọrọgwu ilu” ọ bụla, mkpụrụ nke ịkpọ-asi, mmehie nke na-arapara n’arụ, ma ọ bụ obi nkume nke ná-enweghị ebere niile nke onyeiro nke mkpụrụobi ya kụworo ọhụụ ná ndụ ya.

Ịdọ Aka-ná-ntị Banyere Ikpé Chineke nke Ná-aghaghịịdị

Ma dịka ebere Chineke, ịhụn’anya na ịdịmma ya si dịkwasị n’ezie n’arụ ndị niile Ọ ga-emere ebere, otù aka ahụ kwa, ka ikpé Ya ná-aghaghị ịbịakwasị ndị jụrụ ebere ahụ. Ọ dịghị mgbe ekwere anyị mkwà na aga-eme ka ikpé Chineke nọọ ọdụ ma ọ bụ ghara ịdị mgbe oge ya ruru, inye anyị ohere ịnọgide nime mmehie anyị na nnupuisi anyị rue mgbe anyị mere okenye. Imebi otù nime iwu ebighịebi ahụ kwesịrị ịnata ahụhụ ebighịebi. Chineke bụ Onye eziomume, ọzọ, ụzọ Ya niile bụ ụzọ atuliri atuli, nke zikwara ezi; ọchịchọ Ya karịsịa bụ kwa ka ndị ná-emebi iwu bịakwute Ya ka O wee nye ha ebere Ya, ịhụn’anya na ịdịmma Ya n’ụba.

Ma ọ bụrụ na ndị ná-emebi iwu anọgidesie ike ná mmebi iwu ha, ọ dịghị ihe ọzọ dịrị ha ma ọ bụghị ikpé Chineke -- ahụhụ ziri ezi n’ihi mmehie na nnupuisi ha. Ọzọ, ọ bụrụ na Chineke, Onye mazuru ihe niile, Onye hụwokwara ọgwụgwụ mmadụ siteriị ná mmalite, ebipu ndụ onye mmehie ná mmalite nke ndụ mmehie ya, ikpé ahụ ziri ezi. Chineke maara ma mmadụ ọ bụla n’otù n’otú ọ ga-echègharị ná mmehie ya ma ọ bụ na ọ gaghị echègharị ma banyere ụmụ okorọbịa ahụ ndị ná-akwa Ya emò ná-akọcha kwa Ya site n’ime Onye ná-anọchite anya Ya ihe dị otú a, O tụfughị oge izite ikpé Ya na mberede megide ha. (Gụọ Eklisiastis 8:11-13).

Nzuzu nke Mmadụ Ikwenyere Ndị mmehie na Iso Ha Mekọrịta Ihe

Ebe ọzọ nke ihe ọmụmụ anyị na-ezi banyere ndị eze atọ na omume ha, nke jupụtara n’akụkụ ya niile ná nzuzu. Jeroboam bụ eze Israel, bụ mba ná-ekpere arụsị nke daghachịworo àzụ. Ezi ihe apụrụ ikwu banyere ya bụ na “o me ihe jọrọ njọ n’anya JEHOVA; nání na o megh dika nna ya na dika nne ya: ọ wezuga ogidi Beal nke nna-ya mere.” O wezugaara ikpere arụsị nke ndị buru ya ụzọ, kama ọ rapụrụ mmehie nke ikpere arụsị ahụ wetara. Ya onwe ya iwezuga arụsị niile ahụ dị mma ma o zughị.

Ụfọdụ ndị ná-anụ òkù nke Chineke na-echè na iwezuga arụsị dị iche iche ha fererị òfùfè na mbụ wee zaa Onye Kraist bụ náánị ihe kwesịrị ka ha mee. Ha na-echè na mgbe ha na-eme nke a, na ha na-ejikere onwe ha ijé Eluigwe. Ma nke a ezughị. Ikpere arụsị bụ ifè ihe ọ bụla ná-abụghị Chineke òfùfè, ọ dị kwa ọtụtụ mmadụ n’ụwa ndị bụ ndị ná-ekpere arụsị n’ihi na ha na efè ọlụ nke aka ha dị iche iche, amamihe ma ọ bụ ihe ọmụma òfùfè. Ọ bụrụ na ha na-ahụ ihe ọ bụla n’anya karịa Chineke, ihe ahụ abụrụwo arụsị. Inwere onwe site n’ikpere arụsị, na-apụta n’ezie na anyị aghaghị ịhụ Onyenwe anyị n’anya karịa ihe ọ bụla.

Ọ bụghị ihe ntakịrị na onye na ekpere arụsị n’ezie, ga-akwatu ogidi ya niile, wezuga mkwupụta na okwukwe mbụ ya dị iche iche, wee soro ndị nke Kraist. Ọtụtụ mgbe ndị dị otú a ezutewo ọnụma nke ndị ná-akpagbu ha n’ihi ihe ha kwere. Ọtụtụ mgbe ha na-emeri egwù na ịgbá mgbà ná-amali nime obi ha site ná mkpebi na nnọgidesi ike nke onwe ha. Ihe ha na-eme n’ịjụ ikpere arụsị, mgbe ọ ná-adịbeghị ihe ha mataworo ma ọ bụghị náánị ụdị okpukpé ahụ nke ha mataworo ná ndụ ha niile, karịrị ihe ọtụtụ mmadụ na-eme, bụ ndị na-anara Kraist dịka Onye nzọpụta ha ná enweghị mgbanwe ọ bụla pụtara ìhè nime ndụ ha ma ọ bụ na ụdị ndụ ha na-adị.

Ma na-ágbanyeghị otú apụrụ isi kwuo na o kwesịrị bụ ụzọ ha ji jụ nsọpụrụ na ịtụ egwù nye chi ndị ọzọ, o zubeghị. Mmadụ niile emehiewo, n’ihi nke a onye ọ bụla aghaghị ịchọ mgbaghara nye mmehie ya niile na ike imeri mmehie, nke Chineke ga-enye onye ọ bụla ná-achọ eziomume Ya n’eziokwu. Ma ọ bụghị na enwetara mgbaghara ahụ, ewee mmụọ mmadụ ahụ ọzọ n’ezie, mgbalị ya niile bụ n’efù. Ọ ka nọ kwa ná mmehie ya niile, ikpé Chineke ga-abịakwasị kwa ya n’ihi mmehie niile ahụ. Jeroboam wezugara arụsị ahụ niile, ma ọ nọgidere ná mmehie ya niile.

Ekwughị ọtụtụ ihe n’ebe a banyere eze Edom ma anyị pụrụ iwere na omume ya n’iru Chineke adịghị mma, o nweghị okwukwe nime Chineke kama ọ tụkwasịrị obi n’ụsụ ndị agha dị ukwu na n’amamihe nke mmadụ. Na o kwenyere ka ya na eze bụ onye ajọ omume jikọta ezuwo ime ka anyị mara ihe banyere ọnọdụ ya n’ebe mmehie dị.

Ma apụrụ ịma Jehoshafat ikpé n’ebe ọ dị ukwu. Ọ dị ka Jehoshafat enweghị ike iguzogide mmmekọ ya na ndị ná-emebi iwu, n’ihi na n’oge abụọ gara aga, ya na ndịiro nke Chineke emekọwo, ikpé Chineke bịakwasịkwara ya n’ihi omume ya n’oge abụọ ahụ (2 Ihe Emere 18:1-34; 20:35-37). Ma n’ágbanyeghị ihe niile ahụ ọ mataworo na nke ọ nwapụtawo kwara, ọ zara òkù ahụ eze Israel kpọrọ ya, bụ ijikọta n’otù ka ha wee kwụsị nnụpụisi nke Moab megide Israel.

Ọ dịghị ihe pụtara ìhè nke kwesịrị ime ka Juda nwee mmasị nime nsogbu nke metụtaara ọdịmma nke ọnọdụ àkụn’ụba Israel. Juda enwetaghị òkè ọ bụla sitere n’ụtụ isi niile nke Moab tụworo nye Israel n’oge gara aga. Ọ dịghị ihe anapụrụ Juda site n’ọjụjụ ndị Moab jụrụ ịtụrụ Israel ụtụ isi. Ọ bụ ihe siri ike ịchọta ihe mere Juda ji kwenye ná njikọta ahụ, ma hụkwa Jehoshafat dịka nwoke ná-atụ egwù Chineke n’ọnọdụ dị otú a. Ọ bụ eziokwu na ọ bụrị onye ná-atụ egwù Chineke; bụrụ kwa onye ná-asọpụrụ Chineke, o nwekwara agụụ banyere nchebe nke Chineke. Ọ nabatara ihe ụfọdụ banyere ndị amụma nke Chineke (I Ndi Eze 22:7), kama ọ dịghị eme okwu ahụ nke Chineke na-ezite site n’ọnụ onye amụma Ya, nke ka nke ọ bụrụ na okwu ahụ megidere nzube nke aka ya.

Nime okwu nke a Jehoshafat ajụghị Jehova àsè banyere nzube ahụ nke ha zubeworo, o meghị kwa ihe ahụ nke ga-egosi ya na ọ bụ ihe kwesịrị ya ime, ma ọ bụrụ na ihe mmadụ nwapụtaworo n’oge gara aga na abara ya urù. Ọ gara n’iru ná njikọta nke ya na ndịeze ná-emebi iwu ahụ wee kaa okwu ya akàrà otú a “Dika m’di, otú a ka i di; dika ndim di, otú a ka ndi-gi di; dika inyinyam di otú a ka inyinya-gi di.” Ọ bụrụ na okwu a bụ eziokwu, ọ dịghị ezi ihe riri nne apụrụ ikwu banyere ndị Juda. Ma ọ bụrụ na ọ bụ náánị okwu nrafu nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị ọ pụtara na ihe ahụ nke eze ndi Juda bụ dị anya site n’ihe o kwesịrị ịbụ n’ihi okwu dị otú a nke o kwuru.

Ma ihe dị mwuta ná mkwekọrịa niile ahụ bụ na mgbe ha kpebisiworo n’onwe ha, gakwarị n’ụzọ nke ha, ná-ajụghị Chineke nke ndị bụ nna ha àsè, ha mere ngwa ịta Chineke ahụ ụta mgbe ijè ha ná agaghị nkeọma. Mgbe nsogbu nke mbụ bịara -- tupu ha amalite ịhụta onyeiro -- ha boro Chineke ebubo na O dubara ha n’ịma n’ọnyà. Ụzọ ahụ bụ nke ha, ọ bụghị nke Chineke. Àtụmààtụ ahụ bụ nke ha, ọ bụghị nke Chineke. Njikọta ahụ bụ nke ha, ọ bụghị nke Chineke. Kama dịka ha kwuru, ịta-uta ahụ na ihe kpatara ọdịda ahụ bụ nke Ya!

Ọ dịghị mkpà mmadụ ịlaghachị n’ọgbọ iteghete gara aga tupu amụọ Kraist dịka Nwa ọhụụ nke Betlehem ịhụ ngosipụta dị iche iche nke agazighị agazi dị otú a. Ọ dị ọtụtụ ndị ná-eme otù ụdị ihe ahụ taa. Ọtụtụ mmadụ na-arọrọ ụzọ nke ajọomume, mgbe ahụ ha ataa Chineke ụtá n’ihi ihe dị iche iche nke ụzọ ahụ wetaara ha. Ha na-akụ mkpụrụ dị iche iche nke ajọọmume, ma ha naata Chineke ụta mgbe ha na-aghọrọ mkpụrụ ha dịka ihe ubi. Ha na-arapụ Chineke n’àtụmààtụ ha, n’otù mgbe ahụ taá kwa Ya ụta n’ihi na O meghị ka àtụmààtụ ha gaa nkeọma. Ha na arapụ ịchọ odudu nke Chineke, ma n’otù mgbe ahụ ha nata Ya ụta ma ha chọpụta na ụzọ ahụ ekwesịghị.

Orù Chineke Ahụ Dị Ume-ala N’obi na Ọkpọ ụbọ ahụ

Ma ọ dị ebe ịgbaume ụfọdụ dị n’akụkọ ahụ, na ihe ụfọdụ na mmadụ ụfọdụ dị iche iche nke anyị pụrụ iwere dịka ihe nlereanya. Otù nime ndịorù eze maara Elaisha dịka orù dị ume-ala; n’obi nye Elaija, bụ onye nke Chineke n’oge gara aga; Jehoshafat nwapụtara ná-enweghị obi abụọ nlefuru anya na ikpe ọmụma ya n’ihi ajụghị àsè site n’aka Elaisha ihe bụ uche Chineke site n’ikwenye na Okwu Chineke dị nime Elaisha. Ọ dị omume dị mma ụfọdụ dị ná ndụ Jehoshafat n’oge gara aga, onye nke Chineke ahụ chetakwara ya; ya mere ọ rịọrọ ndịkom ahụ arịrịọ n’ihi nsọpụrụ o nwere n’ebe eze Juda nọ. Ọ rịọrọ ka ekutere ya onye ọkpọ ụbọ; ma mgbe amalitere ịnụ ụdà nke abụ une, Mmụọ nke Chineke bịkwasịrị onye nke Chineke ahụ.

Chineke na-eji ụzọ dị iche iche agwa obi mmadụ okwu. Ma otù nime ụzọ ndị ahụ O jiworo, tụkwasị ikwu okwu Chineke nke na-abụkarị ụzọ dị mkpà iji gbasaa Oziọma ahụ, bụ iji ụbọ na abụune dị mma. Emeriwo n’agha dị iche iche site n’ịbụ abụ -- ọ bụghị náánị agha nke ime mmụọ kama agha nke ana-ahụ anya. Ịkpọ ụbọ emewo ka ndị setan na-emekpa arụ nwere onwe ha wee nwee ike ịnụ olu ntà ahụ dị ezinwayọ, nke sitere na Chineke. Ọtụtụ ugbò ịkpọ ụbọ na abụ edoziwo ụzọ maka ikwusa Oziọma, mgbe esitere ná mkpali na otitemmanu nke Mmụọ Chineke mee ya. Chineke ejiwo kwa ịkpọụbọ na abụ, n’ọgbọ a na n’ọgbọ niile gara aga kwuo okwu n’ọnọdụ ezi Okwu Chineke nke sitere n’Akwụkwọnsọ wee tụọ ụmụ mmadụ mmehie ha n’anya, gosi kwa ha nnọọ ọnọdụ ha n’iru Chineke.

Mgbalị Achọrọ maka Nnapụta nke Chineke

Ntụziaka ahụ niile nke Onye nke Chineke nyere maka nnapụta nke ụsụ ndị agha Israel, Juda, na Edom, dị iche site n’ihe nke ụmụ mmadụ maara. Mmadụ pụrụ ịjụworị ihe mere aga-eji gwuo ọdọ mmiri dị iche iche n’ọzara. Gịnị mere egwughị òlùlù, ma ọ bụrụ na igwupụta mmiri dị mkpà? Ma mgbe Chineke nyere iwu, ọ kadị mma ka anyi rubeisi n’iwu Ya niile.

Ọ dịghị mmeri aga-enweta site n’ịnọgidesi ike n’ụzọ nke aka anyị mgbe ha dubaworo anyị n’ihe ọjọọ. Náánị mmeri aga-enweta bụ n’iso ụzọ nke Onyendú anyị na irubeisi n’iwu Ya niile. Igwu ihe ga-adị mkpà. Aga-enwe ezi mgbalị nke aga-egosipụta. Onyeìsì ahụ n’oge nke Jisọs sachapụrụ ájá ahụ n’anya ya abụọ; nwoke ahụ arụ ná-adịghị ike chiliri ute ya jégharịa; nwanyị ahụ bịara isere mmiri n’olùlùmmiri ahụ wee nye Onye ahụ nke bụ Onye Ju. Ọ bụghị n’ihi ihe ndịa rubereisi nye Jisọs mere bụ ihe wetaara ha ọgwụgwọ ma ọ bụ nzọpụta; ọ bụ eziokwu ahụ na ha rubereisi n’ihe O kwuru mere ka ha nweta ihe niile ahụ ha natara. •sụ ndị agha ahụ gwuru ọtụtụ ọdọ mmiri, ma Onyenwe anyị lụzuru ihe fọdụrụ. Ma ihe ebube nke dị na ya bụ na mmiri ahụ maka nnapụta sitere n’ebe ana-atụghị anya ya. O sitere n’ọzara ọkpọ nkụ pụta.

Lee otú ụzọ niile nke Chineke si dị iche site n’ụzọ nke anyị! Nsogbu anyị ga-egbochiri onwe anyị ga-adị ukwu riinne ma ọ bụrụ na anyị ga-emeghepụ ntị anyị mgbe dum ịnụ iwu niile nke Chineke, mgbe ahụ, anyị nụsịa ha, anyị emee ngwa imezu ha. Ọ dịghị mkpà na anyi ga-aghọta otú Chineke ga-esi napụta anyị. Ọ dịghị anyị mkpà bụ ichepụta otú O nwere ike isi wepụta mmiri site n’ọzara imejụ akpịrị ịkpọ nkụ anyị. Náánị ihe dịrị anyị bụ ime ihe O nyere anyi n’iwu. Na inye Ya ohere ka O mee uche Ya ná ndụ anyị. N’ebe Ọ na-achị achị ka udo ga-adị. Ọzọ, n’ebe Ọ na-edú ka mmeri ga-adị.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Gịnị ka ị mụtara site n’ihe ahụ nke mere bụ ọgwụgwọ nke Elaisha gwọrọ mmiri ahụ?
  2. Òlee ihe anyị ji pụ ikwu na ikpé Chineke ziri ezi, mgbe O mere ka ọ dakwasị ụmụ okorọbịa ahụ ndị kwara Elaisha emò?
  3. Gịnị bụ ezi ihe kachasị nke Baịbụl kwuru banyere Jehoram, eze Israel?
  4. Òlee oge ọzọ dị iche nke Jehoshafat meworo njikọ yiri nke a?
  5. Gịnị ka Jehoshafat mere, gịnị kwa ka o kwuru, mgbe ya na Jehoram jikọtara?
  6. Gịnị mere Jehoram ji kwe ka ya na Jehoshafat jikọ? Gịnị bụ kwa urù njikọ a ga-ewetara Jehoshafat na Juda?
  7. Gịnị bụ nguzo nke Elaisha weere mgbe ezigara ka akpọọ ya?
  8. Gịnị ka Jehoshafat kwuru, mgbe akpọrọ Elaisha, nke bụ ikpe ọmụma n’ihi nlefuru anya ya n’ihi na ọ kpọghị onye amụma ahụ na mbụ?
  9. Gịnị bụ ọlụ ịkpọ ụbọ lụrụ n’ihe niile a mere?
  10. Kwuo ihe mere abụ ahụ nke amaara nkeọma “Rube isi” ji kwesị ihe ọmụmụ a nkeọma.