2 Ndi Eze 4:1-44

Lesson 310 - Senior

Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISI: “Chinekem gēnyezu unu ihe nile ọ bula nākpa unu dika àkù-Ya n’ebube si di, nime Kraist Jisus” (Ndi Filipai 4:19).
Cross References

I Mmanụ Nke Nwanyị Ahụ Di Ya Nwụrụ

1. Onyenwe anyị na-anụ olu nwanyị di ya nwụrụ na nwa-mgbei, 2 Ndi Eze 4:1; Ọpupu 22:22-24; Deuteronomi 10:17, 18; 24:17-22; Abù Ọma 68:5; Jemes 1:27

2. Elaisha nyere ihe inyeaka, 2 Ndi Eze 4:2

3. A na-achọ ọtụtụ arịa nke ihe ná-adịghị nime ha, 2 Ndi Eze 4:3; Matiu 5:6; Aisaia 26:9

4. Emechibidoro ụwa n’èzí, 2 Ndi Eze 4:4-7; I Ndi Eze 17:19; Mak 5:40; 7:33; 8:23; Ọlu Ndi-ozi 9:40; Matiu 6:6

II Onye Shunem

1. O nwere nsọpụrụ n’ebe Elaisha, onye nke Chineke nọ, 2 Ndi Eze 4:8-11; Ndi Rom 12:13; Matiu 10:40-42; 25:35; Ndi Hibru 13:2

2. “Gini ka agēmere gi?” 2 Ndi Eze 4:12-17; 2:9; I Ndi Eze 3:5; Jọn 15:7

3. O nwere okwukwe, 2 Ndi Eze 4:18-26; Jenesis 22:5-8

4. O nwere mkpebi, 2 Ndi Eze 4:27-30; Jenesis 32:26; Luk 18:1-8

5. Akwụghachịrị ya ụgwọọlụ site n’inyeghachị nwa ya ndụ, 2 Ndi Eze 4:31-37

III Inyeaka N’oge Mkpà

1. Ewepụrụ ihe ahụ ná-ebute ọnwụ dị n’ofe ahụ, 2 Ndi Eze 4:38-41; Mak 16:18

2. Agọziri otù onyinye mee kwa ka ọ baa ụba, 2 Ndi Eze 4:42-44; Ilu 3:9, 10; Luk 9:13-17; Matiu 15:32-38

Notes
NKỌWA DỊ ICHE ICHE

Nwanyị Ahụ Di Ya Nwụrụ Anwụ

Chineke ekwewo mkwà na Ya ga-echebe ndịnyom di ha nwụrụ anwụ na ụmụmgbei. O mewo kwa ya ka ọ bụrụ otù akụkụ nke ezi okpukpé “ileta umu-mgbei na ndinyom di-ha nwuru nime nkpagbu ha” (Jemes 1:27). Dịka ụfọdụ n’ihe odide nke mgbe ochie, nwanyị a nke di ya nwụrụ onye rịọrọ Elaisha maka inyeaka bụ nwunye Obadaia, nwoke ahụ onye zoro ndị amụma nke Chineke mgbe Jezebel chọrọ igbu ha. Ma nke a ọ bụ eziokwu ma ọ bụ na ọ bụghị, Elaisha jikere inyeaka. O bu ụzọ jụọ sị, “Gini ka m’gēmere gi?” Mgbe ahụ, ná-echéréghị nzaghachị, ọ ju-kwa-ra, “gosim, gini ka i nwere n’ulo?” Ọ wee zaghachị, “Ọ digh ihe ọ bula orù-gi nwayi nwere n’ulo, ọ bu nání ite manu.”

Iji Ihe Anyị Nwere Mee Ihe

Ọ bụrụ na anyị enyocha ihe ebube niile na óké ọlụ niile nke Chineke lụrụ site ná ndị orù Ya, anyị ga achọpụta ọtụtụ mgbe na alụzuru ha site na mmadụ ahụ iji ihe ahụ nke dị n’aka ya n’oge ahụ, mee ihe. Chineke sịrị Moses, “Gini bu ihe ahụ di n’aka gi?” (Ọpupu 4:2). Ọ bụ náánị mkpàn’aka, ma ọ ghọrọ ngwaọlụ nke Chineke sitere na ya lụọ óké ihe ịrịba-àmà na ọtụtụ ọlụ ebube. Moses jiri mkpàn’aka ya tie osimiri ahụ, o wee ghọọ ọbara. Atọgbọrọ mkpàn’aka ahụ n’ala o wee ghọ agwọ; ọzọ kwa o wee welite ya n’aka ya ọ ghọọ kwa mkpàn’aka, ma mgbe esetipụrụ ya n’elu óké osimiri ahụ ekewaa mmiri ahụ, ụzọ wee dịrị Ndị Israel iji gabiga. Ndụdụ eji achụ ehi bụ ngwaagha nke Shamga ji tigbue narị ndịkom isii, ọkpụkpụ àgbà ịnyịnya ibu bụ kwa ngwa-agha nke Samson ji tigbuo puku ndịkom. Ndịkom nke okwukwe adịghị echere óké ngwa-agha ma ọ bụ ichere rue mgbe ha ga-eme óké ihe; kama ha na-eji ihe ahụ nke dị ha n’aka ná-alụ ọlụ ahụ nke na-eguzo n’iru ha. Otù nwanyị onye Zarefat nke di ya nwụrụ nwere náánị otù nju aka ụtụ ọka na nwantịị mmanụ, ma Chineke jiri ya zụọ èzínaụlọ ya na Elaija ọtụtụ ụbọchị.

Otù ite mmanụ ahụ dị ka ihe dị nnọọ óké ntà, bụ nke nwanyị ahụ di ya nwụrụ, onye agwara anyị ihe banyere ya n’ihe ọmụmụ anyị nwere ike iji chere ọdịn’iru mgbe ndị o ji ụgwọ ná-ezube ịkpọrọ ụmụ ya ndịkom dịka ndịorù. Ma ike nke Chineke enweghị ọtụtụ ma ọ bụ nsọtụ; ntị Ya adịghị kwa arọ ịnụ ákwá nke ndị nọ ná mkpà.

Arịa Ihe Ná-adịghị Nime Ha

“Je, riọtara onwe-gi … ihe ihe-na-adigh nime ha.” Chineke nwere ike ịgbaju arịa ihe ná-adịghị nime ha. Mmanụ bụ ihe eji atụnyere Mmụọ Nsọ nke Chineke, ma arịa ihe ná-adịghị nime yiri mkpụrụobi niile ahụ agụụ na-agụ. Nwanyị ahụ gbanyere mmanụ ma mmanụ ahụ agwụghị ruo mgbe arịa niile ahụ nke ihe ná-adịghị nime ha juru. Taa Chineke na-agbaju arịa niile nke ihe ná-adịghị nime ha; náánị ka mkpụrụobi ahụ agụụ na-agụ bịakute Ya ọ ga-ahụ otú Ọ ga-esi gbajuo ya ọsọsọ. Ihe bụ nsogbu bụ na ụfọdụ arịa jupụtara na nganga na onweonye nke na-egosi na aghaghị ibu ụzọ kpochapụ ma sachapụ kwa ihe niile ahụ nime ha tupu enwee ike iji ha lụọ ọlụ. Ọ dịghị otù arịa ọ bụla nke ihe ná-adịghị nime ya -- ọ dịghị otù mkpụrụobi agụụ na-agụ -- nke ga-agba aka laa ná-abụghị onye emejuru.

Na Nzuzo

“I gāba kwa n’ulo, mechibido onwe-gi.” Mgbe anyị nọ n’ahụhụ maọbụ ná mkpà, o kwesịrị ka anyị mechibido onwe anyị pụọ n’ebe ụwa dị, anyị na Chineke anọdụ. Jisọs sịrị: “ Mgbe ọ bula i nēkpe ekpere, ba n’ime-ulo ntà gi, mgbe i mechisi-kwa-ra uzọ-gi, kpere nna-gi Nke di na nzuzo, nna-gi Nke nāhu ihe na nzuzo, gēnyeghachi kwa gi” (Matiu 6:6).

Ọ dị nnọọ ka ọ dị mfé Elaisha ịgwa ha ka ha jee rịọta arịa ihe ná-adịghị nime ha ma mechisie ụzọ wee malite ịgbanye mmanụ ahụ. Ma gị onwe gị, ị nwawo ụdị ihe a? Agwaghị anyị na Elaisha kpere ekpere banyere ya, ma ọ bụ na ị chèghị na Elaisha onwe ya bàkwara nime ụlọ ntà ya mechie ụzọ malite ịrọsi Chineke ike ka O mee mmanụ ahụ ka ọ baa ụba? Anyị gụkwara na Elaija guzoro n’iru Ehab wee kwuo na igirigi ma ọ bụ mmiri òzùzò agaghị adị ọtụtụ arọ. Ma ebe akụkọ ahụ siri pụta agwaghị anyị na o kpere ekpere, ma Jemes kọọrọ anyị na Testament ọhụụ na o kpesiri ekpere ike ka mmiri òzùzò ghara ịdị. Chineke anyị bụ Chineke na-alụ ọlụ ebube, ma ndị orù Ya aghaghị ịdị ike n’ekpere.

Akpọlitere Onye ahụ Nwụrụ anwụ

Elaisha kpere ekpere n’oge ọzọ, ọ bụ ezie na agwaghị anyị okwu nke o kwuru n’ekpere ya. N’oge nke a nwatà nwụrụ anwụ na-edina n’elu ihe ndịna ya. “O we ba, mechibido ha abua uzọ, kpere JEHOVA.” O wee setịa onwe ya n’elu nwata ahụ, ma ebe ọ na-egbu ya mgbu n’obi rinne o bilie kwa jègharịa iru na azụ nime ụlọ ahụ. Ná-arụghị ụka, Mmụọ Nsọ rịọkwara arịrịọ dịka Pọl Onyeozi sịrị, “were isu-udè anāpugh ikwu nāriọrọ ayi aririọ” (Ndi Rom 8:26). Ị ghaghị ịmara na ọ bụ ịgbasi mgbà ike n’ekpere ka eji mee onye ahụ nwụrụ anwụ ka ọ dị ndụ ọzọ n’ụbọchị ahụ.

Nwatà nke a bụ náánị otù nwa nke nwanyị ukwu ahụ onye doziiri Elaisha otù ime ụlọ na-enye kwa ya nri mgbe ọ bụla ọ na-agafe n’ụzọ ahụ. Mgbe nwa ahụ nwụrụ o ji okwukwe debe ya n’elu ihe ndịna Elaisha. Mgbe ọ rịọrọ ka ezitere ya otù nne ịnyịnya ibu ijékwuru onye nke Chineke, ọ gwaghị di ya na nwa ahụ anwụwo. Site n’ajụjụ ya na ihe mere o ji chọọ ijékwuru onye nke Chineke o jiri okwukwe zaghachị sị, “Udo” (Ọ ga-adị mma”).

Mgbe Gihezi, orù Elaisha jere izute ya jụọ kwa ya, “nwa-gi ọ nọ n’udo?” Ọ zaghachịrị ọzọ sị, “Ayi nọ n’udo.” Otú ọ dị mgbe Elaisha ziri Gihezi ka o were mkpàn’aka ya tụkwasị n’iru nwaokoro ahụ, nwanyị ahụ sịrị Elaisha, JEHOVA nādi ndu, nkpuru-obi-gi nādi kwa ndu, m’gāgh-arapu gi ma-ọli.” N’oge áwàà nke ihe mgbu a, o lekwasịrị nwoke ahụ anya bụ onye nwere ike ịgbaju ite niile ahụ nke ihe ná-adịghị mmanụ. Ọ chọrọ onyensọ nke Chineke ka o nyere ya aka n’ekpere gafee óké ọnwụnwa nke a. Ịnọgidesi ike n’okwukwe nke nwanyị a, tinyekwara nke Elaisha, weghachịrị ndụ site ná ndị nwụrụ anwụ. Ọ bụ otù nime ndịnyom agwara anyị n’akwụkwọ ndị Hibru isi nke iri na otù, na ha sitere n’okwukwe nata ndị ha nwụrụ anwụ ndị emere ka ha dị ndụ ọzọ. Okwukwe na-emezu ihe ahụ nke dị ka apụghị ime ya.

Igbò Mkpà

Dịka ọ dị n’ọlụ ebube nke Kraist, otú a kwa ka alụrụ ọlụ ebube nke Elaisha n’ihi obi ọmịko iji gboò mkpà. Emeghị ka mmanụ nwanyị ahụ di ya nwụrụ baa ụba ịbụ ihe ngosi nye ndị chọrọ ihụ ihe ngosi, emeghị kwa ka nwa nwanyị Shunem dị ndụ ka ewee gbasaa akụkọ, n’ihi na alụrụ ọlụ ebube ndịa nime ụlọ nke emechịsịrị ụzọ ha emechị. Mgbe Elaisha gwara orù ya nwoke ka o siere ụmụ ndịamụma ofe, ọ bụ n’oge ụnwụ. Site n’ụzọ ihe ndịa siri mee ọ pụtara ìhè na Elaisha gwọrọ ofe ahụ n’ihi ụkọnri, ọ bụghị kwa igosi ike ya nime Chineke. Mgbe Jisọs sịrị, “Ha gāchilite agwọ, ọ buru kwa na ha añua ihe ọ bula nēbute ọnwu, ọ gagh-emeru ha aru ma-ọli” (Mak 16:18). O zubeghị na ndị ná-eso ụzọ Ya ga-anwa Chineke site n’ịkpachara anya chilite agwọ ma ọ bụ ịñụ ihe na-ebute ọnwụ. Ọ bụrụ na Onye Kraist añụọ ihe na-ebute ọnwụ ma ọ bụ na agwọ tara ya n’amaghị ama, o nwere mkwà nke nchebe Chineke.

Mgbe otù nwoke wetaara Elaisha site ná mkpụrụ mbụ nke ubi ya, ngwa ngwa obi Elaisha nwere mmetụta banyere ndị nọ n’ụkọ nri. Obi ya yiri nke Jisọs Onye ahụ sịrị: “Enwerem ọmiko n’aru igwè madu a, n’ihi na Mu na ha nọgidere ubọchi atọ ugbu a, ha enwegh-kwa ihe ha gēri” (Matiu 15:32). Nwa odibo Elaisha dịka ndị ná-eso ụzọ Kraist n’ọge ọzọ, tụgharịrị n’obi ya otú aga-esi ji ihe ntà dị otú a kesaara ọtụtụ mmadụ, ma Elaisha agwaworị Chineke banyere ya n’ekpere. Onyenwe anyị wee sị ya, “Ha gēri, rifọ kwa.” Chineke dị mma n’ebe ndị nke Ya nọ site n’inye ha nri n’oge mkpà. “Ha we rie rifọ kwa, dịka okwu JEHOVA si dị.”

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Gịnị mere ite mmanụ ahụ ji bụrụ ihe arọpụtara iji nyere nwanyị a di ya nwụrụ anwụ aka?
  2. Òlee mgbe ọzọ emere ka mmanụ baa ụba n’ụzọ ọlụ ebube dị otú a?
  3. Ihe àtụ gịnị ka arịa ndịa ihe ná-adịghị nime ha bụ?
  4. Kpọọ ụfọdụ ihe nwanyị Shunem ahụ mere eji kpọọ ya “nwayi uku.”
  5. Òlee ụzọ eji kwụghachị ya ụgwọọlụ ya?
  6. Òlee ụzọ o ji gosi okwukwe ya?
  7. Gụọ ọlụ ebube dị na Baịbụl nke alụrụ nime ụlọ emechịrị emechị.
  8. Òlee ọnọdụ nke ala ahụ mgbe agwọrọ ofe ahụ?
  9. Were ọzụzụ Elaisha zụrụ narị mmadụ tụnyere ọlụ ebube dị iche iche yiri ya nke Kraist lụrụ.