2 Ndi Eze 5:1-27

Lesson 311 - Senior

Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISI: “N’ebe nile ọ bula ka anya abua nke JEHOVA di, nēche ndi ọjọ na ndi bú ezi madu nche” (Ilu 15:3).
Cross References

I Ịgbaàmà banyere Chineke

1. Neaman bụ onye Siria, nwoke dị ukwu ana-enye kwa nsọpụrụ, rịara ọrịa ekpenta,2 Ndi Eze 5:1

2. Otù nwa agbọghọ ntà adọtara n’agha site n’ala Israel gbara àmà ike Chineke ịgwọ ụdị ọrịa ahụ, 2 Ndi Eze 5:2-4; Ọnu-ọgugu 12:13-15; Matiu 8:3, 16, 17; 10:8

II Onye Amụma nke Chineke

1. Ezigara Neaman ijekwuru eze Israel, nye kwa ya akwụkwọozi ịrịọ arịrịọ maka ọgwụgwọ Neaman, 2 Ndi Eze 5:5-7; Jenesis 30:1, 2; 50:19; Ọpupu 4:16

2. Elaisha rịọrọ ka ezitara ya Neaman, 2 Ndi Eze 5:8; Matiu 11:28; Jọn 5:40; Abù Ọma 21:4

3. Agwara Neaman ka o jee saa arụ ugbò asaa nime osimiri Jọdan, na ọ ga-adị kwa ọcha, ma Neaman jụrụ ime ya, 2 Ndi Eze 5:9-13; 7:2; Aisaia 53:1; Abù Ọma 78:19, 20; Matiu 33:58

4. Ndịorù nke Neaman rụgidere Neaman ka o nwee nchègharị n’ọjụjụ ọ jụrụ irubere Elaisha isi, 2 Ndi Eze 5:13; Ọpupu 18:19; I Ndi Eze 12:6-8; Daniel 4:27; Ilu 11:14

III Ike nke Chineke

1. Agwọrọ Neaman mgbe o rubereisi n’iwu nke onyeamụma ahụ, 2 Ndi Eze 5:14, 15; Ilu 4:20-22; Deuteronomi 7:15; Jeremaia 30:17

2. Elaisha jụrụ ịnara ụgwọọlụ ọ bụla maka ọgwụgwọ ahụ Neaman natara n’aka Chineke, 2 Ndi Eze 5:15-19, 26; Aisaia 1:23; Daniel 5:17; Maika 3:11; Hosea 9:1; Matiu 10:8

3. Gihezi, nwa okorọbịa ná-ejere Elaisha ozi natara ụgwọọlụ n’aka Neaman, ma ekpenta Neaman rapara n’arụ Gihezi n’ihi anya-ukwu ya, 2Ndi Eze 5:20-27; Joshua 7:11, 25, 26; Ọlu Ndi-ozi 5:3

Notes
NKỌWA DỊ ICHE ICHE

Onye Àmà nke Kwesịrị Ntụkwasịobi

Asị na ọ dị onye ọ bụla na-enwe obi abụọ banyere urù dị na mmadụ ịgba-àmà banyere onwe ya, ịgụ akụkọ banyere Neaman onye ekpenta kwesịrị ịchụpụ ụdị obi abụọ ahụ. Otù nwa agbọghọ ntà, onye adọtara n’agha n’etiti ndị ná-abụghị ndị ya, jisiri ike kwuo ihe banyere ike na ịdị ukwu nke Onyenwe anyị, ma n’ihi na o mere nke a, alụrụ ọlụ dị óké ebube, ewee nwee kwa ịña ntị dị ukwu n’ebe aha nke Chineke dị. Enyere Chineke otuto dị ukwu, emere ka otù mkpụrụobi chigharịkwute ezi òfùfè nke Chineke, ma ịgba-àmà banyere ọgwụgwọ nke Neaman na-ede ude site na mgbe ahụ.

Neaman, bụ onye ukwu na nwoke ana-asọpụrụ n’obodo nke aka ya, aghọwo onye etiri ihe otiti nke ekpenta. Ịdaba n’ụdị ọrịa a pụtara na aga-achụpụ Neaman n’etiti ndị ya, ụlọ ya na èzínaụlọ ya. O nweghị ọgwụgwọ dịrị ekpenta, ná-agbaghị agụgọ, Neaman chèrè na olileanya adịrighị ya, na ijéozi niile nke ndụ ya ga-akwụsị kwa na mgbe dị óké nso.

Okwu mgbe ochie ahụ, “Mgbe madu jeruru n’ebe ike ya gwusiri mgbe ahu ka Chineke na amalite ọlu nke Ya,” bụ nnọọ eziokwu n’ebe ọnọdụ Neaman dị. Nwa agbọghọ ntà ná-ejere ya ozi; onye adọtara n’agha site n’Israel, gwara nne ya ukwu banyere onye amụma nke Chineke nọ n’obodo nke aka ya, onye pụrụ ịgwọ Neaman site n’ekpenta ya. Mgbe oge na-aga, okwu nwa agbọghọ ntà ahụ ruru Neaman na eze ya ntị, olileanya ọhụụ wee tiwaa n’obi Neaman.

Mmadụ nwere ike ná-echè dịka ihe ana-ahụ anya si dị na ụmụ mmadụ ndị nọ n’ọnụ ọnwụ, ma ọ bụ n’ihe mberede dị iche iche sibigara ike òkè, ga-enwe mkpali ịkpọkù Chineke. Ụmụ mmadụ na-eme otú ahụ ọtụtụ mgbe, ma n’otù aka ahụ o nwere ndị ná-adịghị eme ya. Neaman bụ otù nime ndị ukwu ahụ onye, n’oge ahụhụ na mkpà ya, o weere obi ya dum chigharịkwute Chineke dị ndụ. Anyị na-amụta n’ihe ọmụmụ anyị na ọ bụ mmadụ pụrụ ichè na ọ bụghị dịka ọchịchị nke mmụọ ụwa nke oge ya si dị.

Okwu nke Chineke

Onyenwe anyị ekwuwo, “Otú a ka okwum di nke nēsi n’ọnum puta: ọ gagh-alaghachikutem n’efu ma ọ buru na o bugh uzọ mezu ihe tọrọm utọ, we ga nke-ọma n’ihe M’zigara ya” (Aisaia 55:11). Okwu nke Chineke bịara n’ụzọ ịgba-àmà nke si n’ọnụ mmadụ nye èzínaụlọ Neaman na Neaman n’onwe ya mgbe ọ nọ n’óké mkpà nke ọgwụgwọ nke arụ ya na mgbe ọ dị ya mkpà ka azọpụta mkpụrụobi ya ọsọsọ.

Ọ bụ ezie na Neaman bụ onye Siria, na onye ná-efé arụsị na, nke ka nke, na ọ maara n’ụzọ dị ezi ntà ihe banyere ifè ezi Chineke ahụ, ọ nabatara okwu nke Onyenwe anyị mgbe ọ bịakwutere ya. Neaman gosịrị onwe ya dịka otù nime mkpụrụobi ndị ahụ dị óké ọnụ-ahịa, ndị Jisọs kwuru ihe banyere ha n’ilu nke ọgha mkpụrụ na mkpụrụ ahụ. (Gụọ Matiu 13:1-8, 18-23). Aghawo mkpụrụ ahụ n’ebe dị iche iche: mkpụrụ ụfọdụ adawo n’elu nkume, ụfọdụ adawo n’elu ogwu, ma ụfọdụ adawo n’ala dị mma. Ndị ahụ dị mma mịpụtara mkpụrụ iri atọ, iri isii, ma ọbụ otù narị. Site na ngwaọlụ nke ịgba-àmà nke nwa agbọghọ ntà ahụ ná-ejere ya ozi na ezi ndụm-ọdụ nke ndịorù Neaman, mkpụrụobi Neaman wee ghọọ ala dị mma nke jikeere ịnabata Okwu Chineke. Obi ya wee ghọọ ala na-amị mkpụrụ nkeọma, mkpụrụ ahụ nke aghaworo wee mịpụta kwa mkpụrụ nye Chineke.

Neaman gara njém rue mba ọzọ, nụ iwu nke onye amụma ahụ, ma n’ikpeazụ weda onweya n’ala wee rubere ya isi. Agwọrọ ya ekpenta, ma mee kwa ka ọ chigharịkwute ezi òfùfè nke Chineke. O wee ghọọ otù ịgba-àmà pụtara ìhè, nke ebere Chineke na àmàrà nke nzọpụta, ọ bụghị náánị n’ụbọchị niile nke ndụ ya onweya, kama ruo ọgbọ niile, n’ebe ọ bụla ana-ekwusa Okwu Chineke. Mgbe oge ruru ka Neaman lata n’ala nke aka ya ịgba-àmà ya bụ, “Oru-gi agagh-emere chi-ọzọ àjà ọzọ site n’ugbu a, ma ọ bu nani JEHOVA.”

Aha dị iche iche Edere n’Akwụkwọ nke Ndụ

Ezikiel buru amụma n’oge nke ya megide ndị amụma ụgha ndị na-ebu amụma ụgha, “ha agagh-adi n’ìzù nzuzo nke ndim, agagh-ede kwa ha n’odide-akwụkwọ ulo Israel” (Ezikiel 13:9). Ugbu a ihe okwu dị otú a pụtara dị ọkpụrụkpụ, ná-egosi kwa nkwà nke ahụhụ dị ilu. Jisọs gwara ndị ná-eso ụzọ Ya sị: “Otú ọ dị, unu añurila ọñu na nke a, na anēdo ndi ajọ mọ n’okpuru unu; ma ñurianu ọñu na edewo aha-unu n’akwukwọ n’elu-igwe” (Luk 10:20). Jisọs kwusiri ya ike mkpà ọ dị karịa ihe niile ọzọ, ịhụ na edere aha ha n’Eluigwe. Pọl, n’odide akwụkwọ ozi ya nye Ndi Hibru sịrị: “Unu abiaruwo ugwu Zaiọn, na obodo nke Chineke di ndu, bú Jerusalem nke di n’eluigwe, na ọtutu ndi anāpugh iguta ọnu, bú ngbakọ ọra ndi-mọ-ozi nile, na nzukọ nke ndi eburu uzọ muputa ndi edeworo aha-ha n’akwụkwọ n’elu-igwe” (Ndi-Hibru 12:22, 23). N’ikpeazụ anyị na-agụ banyere Ikpe nke Óké Oche eze Ọcha ahụ, mgbe ọnwụ na ọkụ mmụọ ga-enyeghachị ndị ha nwụrụ anwụ, mgbe ndị nwụrụ anwụ, ma ndị ukwu na ndị ntà ga-eguzo n’iru Chineke ewee saghee akwụkwọ dị iche iche, aga asaghe kwa Akwụkwọ nke Ndụ, ewee kpee ndị nwụrụ anwụ ikpe site n’ihe niile edererị n’akwụkwọ niile ahụ. “Ọ buru kwa na ahugh onye ọ bula ka edereri aha ya n’akwukwọ nke ndu ahu, ewe tubà ya n’ọdọ ọku ahu” (Nkpughe 20:11-15).

Eziokwu pụtara ìhè banyere ọgwụgwọ agwọrọ Neaman na nchègharị ya bụ na ọ kpaliri onweya ịchọ onye amụma nke Chineke, ọ bụ ezie na o wetaara ya onweya na ndịọzọ óké mgbalị. Ọ gaghị abụworị ihe dịrị ya mfé ịrapụ ihe ahụ o kweere na mbụ na amamihe nke amaghị Chineke ya na ifè arụsị. Asị na ndịorù ya ejighị amamihe rụgide ya, ọ gaghị-rị eweda onweya n’ala irubeisi n’iwu nke onye amụma ahụ ịbịanye onweya ùgbò asaa n’osimiri Jọdan. N’ihi na o kwenyere na ndụm-ọdụ ọma dị otú a, nke bụ okwu Onyenwe anyị, ọ natara ọgwụgwọ na nzọpụta. Edere aha ya n’Akwụkwọ nke Ndụ, agụnyekwara ya ná nzukọ Israel. Okwukwe na nrubeisi ya pụtara ìhè, nke mere na Jisọs weere ya dịka ihe ịmaàtụ iji baara ekweghi ekwe nke Ndị Israel mbà. Jisọs gwara ha, “Ọtutu ndi ekpenta di kwa n’Israel na mgbe Elaisha onyeamụma; ma ọ digh onye ọ bula nime ha emere ka ọ di ọcha, kama nání Neaman onye Siria” (Luk 4:27).

Ihe okwu Jisọs pụtara bụ na ọ bụ náánị Neaman kwere ịnara amara na ebere nke Chineke wee nweta ọgwụgwọ na nzọpụta, ọ bụ ezie na ọ bụ onye ala ọzọ na ọbịa n’ihe nketa Israel na èzínaụlọ nke Chineke. N’ihi na o kweere, edebawo aha ya n’Akwụkwọ nke Ndụ, oge ma ọ bụ ebighịebi apụghị kwa ihichapụ aha ahụ. N’ágbaghị agụgọ enwere ọtụtụ ndị ekpenta n’oge nke Elaisha, ọbụná dịka Jisọs kwuru, ndị maara Elaisha bụ Onye amụma nke Chineke, mara kwa ihe banyere ezi òfùfè nke Chineke: ma ebe ọ dịghị ihe ha mere iji chọọ Chineke banyere mkpà ha, ọ dịghị ihe ha natara. Ha jụrụ ikwe ka edenye aha ha n’Akwụkwọ nke Ndụ ya na idekọ ha na ndị bụ ndị Israel n’ezie. (Gụọ Ndi Efesọs 2:11-13; Ndi Rom 9:4-8; 2:28, 29).

Anya-ukwu

Nime ihe dị ichè pụtara ìhè site n’okwukwe na ikwesi ntụkwasị obi nke Neaman anyị naahụ ụgha na ekwesịghị ntụkwasị obi nke Gihezi, orù nke Elaisha. Ọ bụ na enweghị ezi ịdọ aka-ná-ntị nye ndị ahụ nọ nso Oziọma, iwere ezi nleruanya ná eché obi ha na mkpụrụobi ha nché ka ha ghara ịdaba n’ọnwụnwa, ka eziokwu niile dị ukwu nke Chineke wee ghara ịghọrọ ha ihe ná-abụghị ihe?

Eleghịanya ana-atụ anya na Gihezi bụ onye ga-anọchị anya Elaisha n’ọkwá nke ịbụ Onye amụma, ọbụná dịka Elaisha jeere Elaija ozi n’ikwesị ntụkwasị obi ewee rọpụta ya ịnọchi ya. Ọ bụ ihe mwuta na Gihezi gosiri onwe ya dịka onye ná-ekwesịghị ọkpụkpọ dị elu nke Chineke, anya-ukwu pụtara ìhè dịka ihe wetara ọdịda ya. Mgbe ọ hụrụ ohere inweta ihe site ná mgbasa-aka Neaman ọ gwara ya okwu ugha wee nara onyinye n’aka ya. Mmehie nke Gihezi ezoghị ezo n’ebe Elaisha nọ ma ekpenta nke Neaman dịkwasịrị Gihezi n’ihi njehie ya.

Neaman chọtara Chineke, wee laa n’ụlọ ya n’arụ dị ọhụụ, bụrụ onye agbanwere mkpụrụọbi ya; ebe Gihezi bụ onye ya na eziokwu nke Chineke na-anọ kwa ụbọchị, dapụrụ n’amara nke Chineke, mehie wee ghọọ onye ekpenta. Óké ihe mmụta nye mmadụ dum bụ na ọ bụ ezie na mmadụ nwere ike nọdụ ná-amaghị ihe banyere ọgbụgba-ndụ na mkwà dị iche iche nke Chineke, ma Chineke na-ekwesị ntụkwasịobi mgbe niile nye ya, ọ ga-eme kwa ka ọ mata eziokwu Ya site n’otù ụzọ ma ọ bụ ụzọ ọzọ. Ọ bụrụ na mmadụ ga-aña ntị a ga-edenye aha ya n’Akwụkwọ nke Ndụ. Ọ bụ ezie na o nwere ike ịma ihe banyere eziokwu nke Okwu Chineke, ma ọ bụrụ na o rubeghị isi n’ụkpụrụ ya niile wee jègharịa n’ìhè nke eziokwu ya, dịka Gihezi, ọ ga-anata ahụhụ njehie Ya niile dịka o kwesịrị.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Òlee otú Neaman si nụ ihe banyere ike nke Onyenwe anyị ịgwọ ya?
  2. Gịnị mere Eze Israel ji wee iwe mgbe agwara ya ka ọ gwọọ Neaman?
  3. Gịnị mere Neaman ji jụ ịdaba ugbò asaa n’osimmiri Jọdan?
  4. Gịnị mere Neaman ji tụgharịa uche banyere ịsụnye onwe ya n’osimmiri Jọdan?
  5. Gịnị mere Jisọs ji too Neaman?
  6. Gịnị mere na ọ dịghị ndị ekpenta ọzọ agwọrọ n’Israel?
  7. Èmere ka Neaman chigharịkwute ezi òfùfè Chineke n’ezie? Òlee otú anyị si mara?
  8. Òlee otú Neaman si mee ka edeba aha ya n’Akwụkwọ nke Ndụ?
  9. Gịnị bụ mmehie Gihezi?
  10. Gịnị mere Gihezi n’ihi mmehie ya?