Matiu 1:18-25; 2:1-23; Luk 2:1-40

Lesson 312 - Senior

Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISI: “Nkpa-n’aka eze agagh-esi n’ebe Juda nọ wezuga onwe-ya, nkpa-n’aka onye nēnye ukpuru agagh-esi kwa n’etiti ukwu-ya abua wezuga onwe-ya, rue mgbe Shailo gābia; ọ bu kwa ya gēnwe iña-nti di iche iche” (Jenesis 49:10).
Cross References

I Emezuru Amụma

1. Nwa agbọghọ ná-amaghị nwoke mụrụ Jisọs Kraist, Ya bụ Kraist, nke Chineke, dịka ebuworo amụma banyere Ya, Matiu 1:18-25; Aisaia 7:14; 8:8; 9:6, 7; 11:1

2. Amụrụ Kraist na Betlehem, obodo nke Devid, Matiu 2:1, 5, 6; Luk 2:1-7; Jọn 7:42; Maika 5:2

3. Ndị amamihe sitere n’ebe dị anya bịa ịchọ Kraist, Matiu 2:1-7; Luk 2:1-7, 11; Ọnu-Ọgugu 24:17-19

4. Josef na Meri kuuru Jisọs gbalaga n’Ijipt ịgbanarị ịkpọ-asị nke Herod, Matiu 2:8-15; Hosea 11:1

5. Herod gburu ụmụntakịrị niile erubeghị arọ abụọ ná mgbalị ya iji laa Kraist n’iyi, Matiu 2:16-18; Jeremaia 31:15-17

6. Josef na Meri laghachịrị site n’Ijipt biri na Nazaret nke Galili, Matiu 2:19-23

II Ọmụmụ nke Onyenzọpụta Anyị

1. Ndị mmụọ ozi kwusaara ndị ọzụzụ-atụrụ oziọma nke óké ọñụ banyere ọmụmụ Kraist, ma kọwaa kwa Ịbụ Chineke Ya, Luk 2:8-14; Ọlu Ndi-ozi 2:36

2. Ndị ọzụzụ-atụrụ ahụ jere ịhụ Jisọs, wee too ma nye kwa Chineke otuto n’ihi ihe ha nụrụ na nke ha hụrụ, Luk 2:15-20

3. Ndị nsọ nke Chineke matara wee kwere kwa na Jisọs bụ Kraist nke Chineke, Luk 2:21-40; Aisaia 52:10; Abù Ọma 98:2, 3

Notes
NKỌWA DỊ ICHE ICHE

Ruo Mgbe Shailo Ga-abịa

Mmadụ eleworị anya otù Onye Mgbapụta site ná mmehie malite n’oge nke mmehie mbụ ahụ. Mkwà mbụ ahụ maka Onye Mgbapụta ka enyere Adam na Iv, bụ ndị njehie mbụ ahụ megide Chineke, n’ihi nke a kwa ka ha bụrị ndị mbụ ịnọ ná mkpà nke Mgbapụta. Mkwà ahụ enyere ha bụ otù akụkụ nke nkọcha ahụ akọchara agwọ ahụ, “Iro ka M’gētinye kwa n’etiti gi (agwọ ahu) na nwayi ahu, na n’etiti nkpuru-gi na nkpuru-ya: nkpuru ahu gēchifia gi isi, gi onwe-gi gēchifia kwa ya n’ikiri ukwu” (Jenesis 3:15). Isiokwu nke mkwà a bụ na site ná mkpụrụ nke nwanyị ahụ Kraist ga-abịa, na Ya Onweya ga-emebi kwa setan na ọlụ ya niile. Ọ bụ ezie na aga-arapụ setan ka o chifia ikiri ụkwụ nwa nwanyị ahụ -- ya bụ, Kraist -- ma otú ọ dị, otù Kraist ahụ ga-emesi kwa bụrụ onye ga-ala ọlụ ọjọọ dum n’iyi. N’ezie amụbatara Kraist nime ụwa nke a, ndị ajọmmadụ wee kpọgbuo Ya n’obe; ma O biliri mbili nke mmeri wee merie ọnwụ, ọkụ mmụọ na ílì, ma ugbu a Ọ nọ ná-achị n’ebe kachasị Elu.

Site n’oge ekwere mkwà mbụ ahụ banyere Onyemgbapụta, Chineke emewo ka mkwà ahụ dị ọhụụ ọtụtụ ugbò. Site n’oge nke èzínaụlọ mbụ n’elu ụwa, ọ dị ndị kwereworo ná mkwà ndịa niile, Chineke anabatawo kwa ha n’ihi okwukwe ha.(Gụọ Ndi Rom 4:3.) Ebel, Inọk, Abraham, Jekob na Aisak so ná ndị mbụ kwere nime mkwà nke Chineke banyere Onyemgbapụta, Ndịa na ọtụtụ ndịọzọ bụ ndị ọ gụrụ agụụ ịhụ ụbọchị ọbịbịa Mesaia ahụ, bụ Jisọs Kraist.

Ndekọ dị iche iche nke akụkọ ụwa na akụkọ dị nsọ na-ezí anyị na n’akụkụ ebe dum mepere anya n’ụwa, enwererị nghọta pụtara ìhè na mkwenye banyere Mesaia na Eze nke Israel nke ná-abịa. Eleghịanya ọtụtụ nghọta ndịa ga-esiteworị n’aka Daniel. Ọ bụ ya ka enyere mkpughe banyere oge nke Mesaia ahụ (Gụọ Daniel 9:20-27). Daniel bụrị onyeisi nke ndị ná-achị ndị amamihe niile nke Babilọn bụrụ kwa onye amaara nkeọma ná-asọpụrụ kwa n’ebe niile. Nghọta ya banyere amụma Mesaia na ndị nke Ya aghaghị ịbụ ihe akparịtaworo n’ụkà wee mara kwa nkeọma banyere ha. Nkpughe nke ekpughere Daniel kwuwapụta kwara oge nke ọbịbịa Mesaia ahụ.

Tupu amụma nke Daniel enwekwara amụma nke Belam buru banyere Kraist. Ọ bụ ezie na Belam bụ Onye Mbaọzọ ma o kwuru n’ebe ọ dị omimi banyere “Otù kpakpando gēsi na Jekob zọlie ijè” na Nkpa-na’aka eze nke ga-esi n’Israel bilie (Ọnu-ọgugu 24:17). Ọ bụ ezie na mkwà nke Onyemgbapụta na Mesaia bụ ihe enyere náánị ndị Israel, ọ dị ka enwekwara ọtụtụ ndịọzọ ná-esiteghị na mba Israel ndị sitere n’ihi ihe dị iche iche, na iji ọtụtụ ịnụ ọkụ n’obi dị iche iche nwee olileanya banyere Kraist. Nime ọtụtụ narị arọ gafesịrị tupu amụọ Kraist, Chineke agbasowo Israel ka O wee were ha webata mba niile nke ndị ná-amaghị Chineke n’ezi òfùfè nye Chineke. Ma ọtụtụ mgbe karịa nke ha meworo, ndị Israel nọ ná-ekpere arụsị kama ezi Chineke ahụ dị ndụ. Na-ágbanyeghị ihe ndịa, Chineke malitere iji ụmụ mmadụ n’otù n’otù ná-ekwusa ma ná-eme kwa ka amara olileanya na mkwà banyere Mesaia ahụ. Ebe nghọta ụfọdụ mmadụ bụ ná mkpirikpi banyere ọbịbịa Kraist, ọmụmụ Ya nime obodo Betlehem dịka Nwa ọhụụ abụghị ihe ná-enweghị mmetụta kwesịrị ya.

Mkpụrụobi mmadụ nke ná-adịghị anwụanwụ enwewo mmetụta banyere mkpà nke mgbapụta site n’oge mmehie lụrụ ọlụ ọjọọ ya na mbụ nime obi mmadụ. Ọcha nke anụ-arụ enweghị ihe jikọtara ya na mkpà nke nzọpụta; ma, ebe ọtụtụ ndị Israel ghọrọ ndịiro n’ụzọ dị ilu, ọ dị kwa ọtụtụ mkpụrụobi agụụ na-agụsị ike nabatara Ya. Ọ dị ọtụtụ ihe anyị nwere n’ebe a ịmụta, maka ọdịmma nke anyị, mgbe anyị na-agụ banyere ụfọdụ ndị, site n’ikwere na Kraist ahụ, ha natara óké ihe dị iche iche site na Chineke. Omen’ala ndị Ju na-akọwa na ọ bụ olileanya nwanyị ọ bụla n’Israel na ya ga-abụ nne nke Mesaia ahụ. Anyị gụrụ ihe banyere mmadụ abụọ, ndị ná-esiteghị n’Israel, ma ewebatara ha n’agbụrụ nke Kraist. Mmadụ abụọ Ndịa bụ Rut, nwanyị onye Moab, onye nabatara ikpere Chineke dịka nne di ya kụziri ya; na Rehab, onye lụrụ ezi ọlụ nye mmadụ abụọ ndị nledo ahụ mgbe ha bịara na Jeriko.

Ozi Ọma nke Óké Ọñụ

Na nso obodo Betlehem ụfọdụ ndị nchè atụrụ nọ ná-eche atụrụ ha n’ọhịa. Mmụọ ozi nke Onyenwe anyị bịakwutere ndị ọzụzụ atụrụ a wee zie ha banyere ọmụmụ Kraist. Ọ gwara ha, “N’ihi na ta n’obodo Devid ka amuru nye unu Onye-nzọputa, Nke bú Kraist Onye-nwe-ayi” (Luk 2:11).

Ọmụmụ Kraist abụghị ihe mere ná-enweghị ihe ịrịba-àmà dị ebube na ngosipụta nke obiụtọ nke sitere n’eluigwe. Mkwupụta nke mmụọ ozi Chineke nye ndị ọzụzụ atụrụ bụ otù nime ihe ịrịba-àmà ndị ahụ. Ọ bụ ezie na ha bụ ndị dị ume-ala n’ụzọ ibi ndụ ha, ma eleghịanya, otú ọ dị ha ga-abụworị ndị maara ihe n’ebe ihe nke Chineke dị ikwenye ka agwa ha ihe banyere ọmụmụ Kraist. N’ijé ka ha hụ, ha chọtara nwata ahụ bụ Jisọs, dịka mmụọ ozi Chineke gwara ha. Mgbe ha na-alaghachikwuru ìgwè atụrụ ha, ha toro Chineke n’ihi óké ihe ha nụrụ ma hụ kwa, ma ha mekwara ka ndịọzọ bụ ndị nọ n’ebe dị anya nụ ihe dum agwara ha banyere Nwata ahụ.

Mgbe ihe dị ka iri ụbọchị anọ gasịrị, mgbe ụbọchị ime ka adị ọcha nke Meri gasịrị dịka Iwu Moses si dị, ndị mụrụ Jisọs kutere Ya n’Ụlọ ukwu Chineke iche Ya n’iru Jehova. (Lee Levitikọs 12:2-4). N’ebe a nime Ụlọ ukwu Chineke ka otù nwoke ana-akpọ Simeon nọ, onye eziomume na onye ná-atụ egwù Chineke, onye ná-eche nkasịobi nke Israel. Mmụọ Nsọ ekpugheworo ya rị na ọ gaghị ahụ ọnwụ anya rue mgbe ọ ga-ahụ Kraist, Onyenwe anyị. Mmụọ nke Onyenwe anyị akpaliwo kwa ya ịba n’Ụlọ ukwu Chineke mgbe Josef na Meri kubatara Jisọs n’ebe ahụ. Mgbe ọ hụrụ Jisọs, Simeon kulitere Nwantà ahụ n’aka ya wee bue amụma banyere Ya, sị, “Anyam ahuwo nzọputa-Gi” (Luk 2:30). Nke a bụ ihe ịtụn’anya, nke mere na o juru Josef na Meri anya ịnụ ihe Simeon na-ekwu banyere Jisọs. n’oge ná-adịghị anya mgbe o kwusiri okwu ka Ana kwa, onyeamụma nwanyị, batara, nye kwa Chineke ekele n’otù aka ahụ; wee “gwa kwa ndi nile nēche ngbaputa nke Jerusalem okwu banyere Ya.”

Ndị Amamihe nke si N’ebe dị Anya

Mgbe oge ntà gasịrị, mgbe amụsịrị Jisọs, òtù nke ndịkom maara ihe si n’Ọwụwa anyanwụ bịa, ná-ajụ ndị ná-achị achị na Jerusalem sị “Òle ebe Ọ nọ, bú Onye amuru ibu Eze ndi-Ju”? Ajụjụ nchọpụta ha butere óké ịma jijiji na Jerusalem niile, wee mee ka obi lọọ Eze Herod mmiri nke ukwuu. Herod na-achị obodo ahụ n’ike na egwù, ma ọ nọghị kwa ná-amataghị ihe ọbịbịa nke Mesaia ga-apụta. Herod, dịka ọtụtụ ndị ọzọ, lere anya na Kraist ga-eguzobe ọchịchị ndọrọ ndọrọ nke ala-eze nke ụwa nke ga-akwada ike niile nke ndị ná-achị achị n’obodo. Herod na-atụ egwù ná-ekwosa kwa onye ọ bụla ekworo bụ onye ná-egosi mkwà nke inwe ike ịkwada ọchịchị ya, n’ihi nke a o mere ngwa ngwa kpọọ ndịisi nchụ-àjà na ndị ode-akwụkwọ wee jụta n’ọnụ ha ebe a ga-amụ Kraist. Mgbe agwara ya na Betlehem bụ ebe eburu n’amụma banyere Ya o zigara ndị amamihe ahụ ka ha jee chọpụta Nwa ahụ bụ Kraist. Nzube Herod pụtara ìhè na mgbe ná-adịghị anya. Ebe o nweghị ike ịchọpụta Kraist ná mgbalị nke mbụ ya o nyere ndị agha ya iwu igbu ụmụntakirị nwoke niile dị n’ala ahụ site ná ndị gbara arọ abụọ gbadà, ná-enwe olileanya site na nke a na ya ga-emebi egwù ọ bụla na Kraist ga-ekpugharị ọchịchị Herod iru

Ọ bụ ezie na mmasị nke Herod nwere n’ebe Kraist nọ bụ nke ekworo mụpụtara, obi ya jupụtakwara n’ịkpọ-asị ná-ezighị ezi megide Ya, nke a na-egosi na Herod kweere na Kraist ga-abụ Onye ga-enwe óké ebube na ike. Lee ka ekweghị ekwe nke ndị isi nchụ-àjà na ndị ode akwụkwọ sị dị ukwu! Ha maara amụma banyere Kraist, nwee kwa ike ịgwa Herod ebe a ga-amụ Ya, hụ kwa ndịkom ndị si n’ebe dị anya bịa ịhụ Ya, ma ha onwe ha, ihe banyere ya emetụghị ha n’obi ijé hụrụ n’onwe ha. Otù ekweghị ekwe ahụ dị n’obi ụmụ mmadụ taa. Ọtụtụ mmadụ maara Oziọma nkeọma ma ha agaghị eme ihe ọ bụla ịnara ya; ma ọtụtụ mgbe onye mmehie kachasị njọ, nke nọkwarị n’ebe dị anya site n’Alaeze Chineke, na-anwụde ìhè nke ebube Chineke wee chigharịkwute Chineke n’obi ya niile wee chọpụta Kraist n’onwe ya.

NdịÀmà nke Chineke

Anyị na-amụta site n’ihe a niile mere, na Chineke mere ihe ebube dị iche iche ime ka mmadụ ọ bụla mara na amụwo Onyenzọpụta. Ụdị ụzọ mmadụ atọ kwusara ihe a mee kwa ka amara ya n’ebe niile.

Ndị ọzụzụ-atụrụ ahụ mere ka ndịenyi ha na ndị niile ha maara nụ oziọma ahụ nke ụsụ ndị mmụọ ozi wetaara ha banyere ọmụmụ Kraist, nke pụtara na ndị ogbenye, ndị na-alụ ọlụ nụrụ oziọma ahụ. Ụmụnna ndị ná-ele anya Onyenzọpụta n’Israel ka agwakwara ihe banyere Kraist site n’ọnụ mmadụ abụọ ndị nke ha; Simeon, onye eziomume na onye ná-atụ egwù Chineke, na Ana, onyeamụma nwanyị. Nke ikpeazụ ọ dị kwa ndịkom maara ihe ndị si n’ebe dị anya bịa ịchọ Kraist ahụ. Ndị amamihe a kwuru ihe banyere Kraist nye ndị kachasị ukwuu na ndị dike kachasị elu nke ala ahụ. Herod, ndị odeakwụkwọ, ndịisi nchụàjà ahụ, na ndị ná-eso ha nụrụ óké ihe a mere site n’ọnụ ndịa si n’ebe dị anya bịa ịhụ Ya. Lee ka ịdị ebube na ikwesị ntụkwasị obi nke Chineke si dị n’obi mmadụ nke na ụmụ mmadụ ga-amata na enwere Onyenzọpụta Onye pụrụ ịnapụta mmadụ dara ada site ná mmehie!

Pọl Onyeozi ahụ, mgbe ọtụtụ arọ gasịrị, mgbe ọ na agba-àmà ya n’iru ndị ọchịchị nke ndị Rom kwuru nke a , “Eze mara ihe banyere ihe ndia, onye m’nāgwawa kwa okwu: n’ihi na emere ka m’kweye na ọ digh ihe ọ bula n’ihe ndia ezonariri ya; n’ihi na emegh ihe na nkuku” (Ọlu Ndi-ozi 26:26).

Chineke emezuwo mkwà Ya nye ụwa. Aisaia buru amụma ọtụtụ narị arọ gara aga, ma na ọtụtụ narị arọ tupu amụọ Kraist, banyere Onye ahụ nke gaje ịbịa. Ozi ya bụ, “Bilie, nwue; n’ihi na ìhè-gi abịawo, ebube JEHOVA awawo kwa n’aru gi dika anyanwu. N’ihi na, le, ọchichiri nēkpuchi uwa, óké ọchichiri nēkpuchi kwa ndi nile di iche iche: ma n’aru gi ka JEHOVA gāwa dika anyanwu, ebube-Ya ka agāhu kwa n’aru gi” (Aisaia 60:1, 2).

Ka onye ọ bụla nke na-agụ ihe ọmụmụ a lezie anya nkeọma ịhụ na ọ na-achọsi ike ka Onyenzọpụta nke ụwa bụrụ Eze nime obi nke ya onwe ya. “Kraist, ebe echère Ya n’iru Chineke nání otù mgbe iburu nmehie nile nke ọtutu madu, Ọ gēme kwa ka ndi nēche Ya hu Ya anya nke ugbò abua, ma nmehie adigh ya, ka ewe zọputa ha” (Ndi Hibru 9:28). Ohere adịghị nye Ya n’ụlọ ndị ijè mgbe amụrụ Ya. Ka anyị nye Ya ohere n’obi anyị, ma si otú a nye Chineke otuto n’ihi óké nzọpụta Ya.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Kwue mkwà mbụ ekwere banyere Onyenzọpụta.
  2. Kpọọ amụma ụfọdụ emezuru site n’ọmụmụ nke Kraist.
  3. Kpọọ ụzọ atọ nke esi mara banyere ọmụmụ Kraist.
  4. Gịnị mere ndị amamihe ahụ ji si n’Ọwụwa anyanwụ bịa ileta Kraist?
  5. Òlee otú anyị si mara na ọtụtụ maara ihe banyere ma nwee kwa olileanya nke otù Mesaia?
  6. Gịnị mere Herod ji mee ka egbusịa ụmụntakịrị ndị ná-erubeghị arọ abụọ?
  7. Òlee ịdị mkpà nke ọmụmụ Kraist dị nye anyị taa?