Lesson 313 - Senior
Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISI: “Ma onye ezi omume nkem gēsite n’okwukwe di ndu; ọ buru kwa na ọ gēwezuga onwe-ya ihe-ya adigh nkpuru-obim ezi nma” (Ndi Hibru 10:38)Cross References
I Ọñụ na Ụgwọọlụ nke Dị N’ezi Òfùfè Nrò
1. Ụlọukwu Chineke, ebe nnọnye Chineke na-adị, bụụrụ ndị nke Chineke, ebe kachasị mma n’ụwa, Abù Ọma 84:1-4; 23:6; 26:8; 27:4; 122:1; I Ihe Emere 29:3; Luk 2:36, 37; 24:52, 53
2. Ndị niile ná-ekpere Chineke nime mmụọ na eziokwu ka Chineke na-elekọta ogologo ụbọchị ndụ ha niile, Abù Ọma 84:5-8; 95:6, 7; Jọn 4:14, 23, 24
3. Inwe ike fèè Chineke òfùfè ná-enweghị mgbochị bụ ihe mnweta kachasị ukwu nke mmadụ ga-enweta, Abù Ọma 84:9-12; Deuteronomi 12:5; Abù Ọma 122:4; 65:4
II Ngosipụta na Nkọwa Dị Iche iche nke Sitere N’akwụkwọnsọ banyere Okwukwe
1. Okwukwe abụghị ihe anapụghị inwapụta, náánị nchepụta nke mmadụ ma ọ bụ ọnọdụ échìchè obi mmadụ, kama ọ bụ ndabere nke ihe a na-ele anya ya bụrụ kwa mnwapụta nke ihe a na-ahụghị anya, Ndi Hibru 11:1-3; 2 Ndi Kọrint 5:7; Ndi Galetia 5:6
2. Okwukwe dị mkpà iji mee ihe ga-atọ Chineke ezi ụtọ na iji baa n’Eluigwe, Ndi Hibru 11:6; Jemes 1:5-7; I Timọti 1:5; I Jọn 5:4; Mak 11:22; Jọn 20:27; Ndi Efesọs 6:16; Ndi Filipai 3:9-11
3. Okwukwe nwere ike itó etó, Luk 17:5; I Ndi Tesalọnaika 5:8; I Timọti 6:11, 12; Ndi Hibru 10:22
4. Enwere ike ịtụfu okwukwe, Luk 18:8; I Timọti 1:18, 19
5. A na-enweta okwukwe site n’ịnabata Okwu Chineke nime mmụọ, Ndi Rom 10:17; Jọn 20:31; 2 Timọti 3:15
6. Ọ bụ site n’okwukwe ka anyị na-enweta ngọzi niile site na Chineke, Matiu 8:13; 9:29, 30; 17:20; 21:21; Mak 9:23
III Ndụ nke Okwukwe
1. Ndụ nke okwukwe nime Chineke adịghị enye mmehie ma ọ bụ ọlụ nke anụ-arụ ọ bụla ohere, Habakuk 2:4; Ndi Rom 14:23
2. Ọ bụghị náánị na anyị na-amalite ndụ anyị dịka ndị òtù Kraist site n’okwukwe kama anyị na-eji kwa okwukwe na-aga ijè anyị site na nzọ ụkwụ ruo na nzọ ụkwụ, Ndi Rom 1:16, 17; 5:1; 9:33; 10:9; Aisaia 41:10; Ilu 4:18; 2 Ndi Kọrint 3:18
3. Okwukwe nime Chineke, ọ bụghị ọlụ nke Iwu, bụ ịgụ anyị ná ndị eziomume n’iru Chineke, Ndi Galetia 3:6-14; Ndi Filipai 3:9; Jenesis 15:6; Ọlu Ndi-ozi 10:43; 13:39
4. Site n’okwukwe a na-anọgidesi ike rue ọgwụgwụ, Ndi Hibru 10:35-39; 4:3; Deuteronomi 8:3; Jọn 5:24; 20:31; Ndi Kọlọsi 1:21-23; Jemes 2:5
Notes
NKỌWA DỊ ICHE ICHEChineke ewerewo otù ihe ndepụta dị nkénké nke sitere n’Akwụkwọnsọ ọtụtụ ugbò iji wetara ndịkom na ndịnyom nzọpụta. Ihe ndepụta a ka edeworo ugbò anọ n’Akwụkwọnsọ nke pụtara n’òzùzù ya n’ebe mbụ karịa otú esi depụta ya n’ebe atọ ọzọ ná-esoni. Chineke kwuru okwu a n’obi náege ntị nke Matin Luta, nke a lụpụtaara ya ọlụ nzọpụta. Jọn Wesli, n’otù aka ahụ, nụkwara okwu ndịa; ma site n’ịghọta ihe okwu ole na ole a pụtara o wee nwee mmetụta n’obi ya nke mere ka “obi ya kpoo ọku n’uzọ puru iche” site n’ịgbaàmà nke Mmụọ Nsọ na amụwo ya ọzọ. Okwu ndịa nke dị mkpà bụ: “Onye ezi omume nkem gēsite n’okwukwe di ndu,” maọbụ, dịka esi dee ha na mbụ, “Onye eziomume nkem gēsite n’okwukwe nke ya we di ndu.” Ka anyị tụlee ha, ihe ha pụtara, na otú ha si metụta ndụ anyị.
Ọ pụtara ìhè na, ọ bụ ezie na Mmụọ Nsọ ewereworị okwu ndịa duru ụmụ mmadụ rue ngọzi nke mgbaghara mmehie, bụ mnwapụta nke anyị na-akpọ ịgụ mmadụ n’onye eziomume site n’okwukwe, ma ọtụtụ ihe nke si n’okwu ndị ahụ na-atụ onye eziomume aka -- bụ onye agbapụtaworo nke agbaghaworo mmehie ya. Dịka akụkụ niile nke Okwu Chineke si dị, ha bụ ndụ nye ndị ná-achọ ndụ, na amamikpé nye ndị rọọrọ ụzọ nke ọchịchịrị. Ha na-egosi ọlụ nke dịịrị mmadụ. Ha na-egosi na enwere ike ime ka mmadu bụrụ onye eziomume ma nwee kwa okwukwe. Ha na-enye olileanya na nkasịọbi, ná-atụ aka n’ụzọ ahụ nke dịịrị ndị nke Chineke, ndị nwere ọkpụkpọ na ọlụ dị iche iche, ka ha wee mata ihe bụ uche Chineke nke ga-eme ka onye ọ bụla nwee ike ịga ijè n’ụzọ ahụ nke Chineke buru ụzọ tụpụtara ya. Ọ bụ site n’eziokwu ahụ nke okwu ole na ole ndịa na-akụzi ka eji eme ka ọlụ nke Alaeze ahụ gaa n’iru, ná-elekọta ya ná-eduzi ya ma na-atụpụta kwa àtụmààtụ banyere ya. Nke a bụ otù ụzọ dị mkpà anyị ga-eji lụzue ọlụ anyị niile n’ebe Chineke na ozi Ya nọ.
Nzọpụta site N’okwukwe
“Ọ bu amara ka ejiworo zọputa unu, site n’okwukwe; nka esitegh kwa n’onwe unu: ọ bu onyinye Chineke” (Ndi Efesọs 2:8). N’ụzọ ọzọ, Akwụkwọnsọ na-agwa anyị na nzọpụta bụ onyinye nke Chineke, anyị na-anata ya n’amara site n’okwukwe. “Ya mere ebe aguru ayi na ndị ezi omume site n’okwukwe, ayi na Chineke di n’udo site n’aka Onye-nwe-ayi Jisus Kraist” (Ndi Rom 5:1). “Abraham we kwere Chineke, ewe gua nke ahu nye ya dika ezi omume” (Ndi Rom 4:3; Ndi Galetia 3:6; Jenesis 15:6). Pọl Onyeozi dere: “Onye m’yiri iyì ihe niile nkem, … ka n’we rita Kraist n’urù, nēnwegh ezi omume ọ bula nke akam, bú nke sitere n’iwu, kama nēnwe ezi omume ahụ nke okwukwe enwere na Kraist nēweta, bú ezi omume ahu nke sitere na Chineke n’elu okwukwe” (Ndi Filipai 3:8, 9).
N’ebe a ọ bụ ihe pụtara ìhè na òzízí nke ihe ọmụmụ nke a bụ ihe echère ndịnsọ n’iru, ma ha nwekwara ozi dị mkpà dịịrị ndị mmehie, n’ihi na ọ bụrụ na mmadụ ga-eje ijè n’okwukwe, ọ ghaghị ibu ụzọ bànye n’ịdị ndụ nke okwukwe; ma, atụgharịa ya, ọ bụrụ na mmadụ abànye n’ịdị ndụ nke okwukwe ọ ghaghị ijeijè n’okwukwe
Okwukwe dibigara mkpà ókè -- ewezuga ya ọ dịghị onye nwere ike ime ihe ga-atọ Chineke ezi ụtọ (Ndi Hibru 11:6). Okwukwe dibigara mkpà ókè -- ewezuga ya ọ dịghị onye a ga-azọpụta (Ndi Hibru 11:6; Jemes 1:5-7). Okwukwe dibigara mkpà ókè - ewezuga ya anyị ga-emehie (2 Ndi Kọrint 5:7). Okwukwe dibigara mkpà ókè -- ewezuga ya anyị enweghị ike ịna emeri (I Jọn 5:4). Okwukwe dibigara mkpà ókè -- ewezuga ya anyị agaghị eguzosi ike (2 Ihe Emere 20:20). Okwukwe dibigara mkpà ókè -- anyị chọrọ ya iji “menyu àkú-uta nile nēnwu ọku nke ajọ onye ahu” (Ndi Efesọs 6:16). Okwukwe dibigara mkpà ókè - “tukwasi ihe nile ndia” ọ dị anyị mkpà karịa ihe agha niile ọzọ nke mmụọ (Ndi Efesọs 6:16).
Onye mmehie nke ná-abịakute Chineke ka ana agbaghara mmehie ya niile, ka ana agụ n’onye eziomume site n’àmàrà nke Chineke, nke agbanwere site n’Ọkpara ahụ, ewee mụbata ya n’èzínaụlọ nke Chineke site n’ebere nsọ nke Chineke, “n’amara … site n’okwukwe.” Ọ dịghị otù nime mkwà ndịa dị ebube banyere nzọpụta Chineke nke aga emezuru onyemmehie nke ná-echègharị ma ọ bụrụ na o nwere obi abụọ n’ebe Chineke nọ maọbụ na ọ jụrụ ikwenye ná mkwà nsọ niile nke Chineke banyere onweya. Ọ bụ náánị n’okwukwe ka anyị ga-enwe ike ịbịakwute Chineke; ọ dị ọtụtụ nke okwukwe nke a na-agwakọta n’ekpere ọ bụla a na-eziga n’Oche eze Chineke, n’ihi na, ọ bụ gịnị ga-eme ka mmadụ ná-akpọku Chineke ma ọ bụrụ na o nweghị okwukwe ọ bụla nime Chineke? “Ma onye nwere obi-abua, amawo ya ikpe” (Ndi Rom 14:23), ma onye ọ bụla nke kwere ekwe agaghị ala n’iyì, kama ọ ga-enwe ndụ ebighịebi (Jọn 3:15). “Ọ buru na i gēwere ọnu gi kwupụta Jisus na ọ bu Onye-nwe-ayi, ọ buru kwa na i gēwere obi-gi kwere … agāzọputa gi: (Ndi Rom 10:9).
Ndụ Onye Eziomume bụ Ndụ nke Okwukwe
N’inyocha okwu mbụ ahụ nke ihe ọmụmụ anyị, anyị ga-ahụ, na o jikọtara otù mkpụrụ okwu “ya” nke ná-anọchita anya onye ahụ. N’ebe a ka ana-egosi ma na-ezi kwa otù eziokwu nke dị omimi. “Onye eziomume nkem gēsite n’okwukwe di ndu,” n’ezie, ma ọ dị mkpà ka okwukwe ahụ bụrụ nnọọ nke “ya onweya”.
Mmadụ nwere ike chee na ya bụ Onye Kraist na onye ná-asọpụrụ Chineke n’ihi eziomume nke nne na nna ya ma ọ bụ nke ndị ahụ nọ ya gburugburu. Ọ pụrụ iwukwasị olileanya ebighịebi ya n’elu otù ahịrị okwu nke sitere n’Akwụkwọnsọ, dịka: “Edowo di nēkwegh ekwe nsọ site na nwunye ya, edowo kwa nwunye nēkwegh ekwe nsọ nime nwanna-ayi nwoke,” ná-asị na a na-agụ ya n’onye eziomume site n’ekpere nke ndịọzọ. Nwanta nke nne na nna ya bụ Ndị Kraist nwere ike dabere n’ụdị otù ahịrị okwu ahụ ewepụtara ichè site n’Akwụkwọnsọ: “Kwere n’Onye-nwe-ayi Jisus, agāzọputa kwa gi, gi onwe-gi na èzí-na-ulo-gi” (Ọlu Ndi ozi 16:31), ná-agbanwe eziokwu nke okwu a ná-ezí ka o wee ná-egosi na ọ pụghị ịlan’iyì ma-ọlị n’ihi na nne na nna ya kpeere ya ekpere. Ụfọdụ echèwo kwa na aga-azọpụta ha n’ikpeazụ n’ihi na ha nwere nne na nna ná-atụ egwù Chineke, ná-agụghị nnupuisi ha niile na ebere Chineke nke ha ná-ejighị mee ihe mgbe ha nọ ná ndụ. Ma ahịrị a dị ntà nke dị n’ihe ọmụmụ anyị na-egosipụta ndahie nke ịrụ-ụka niile ndịa, n’ihi na “onye ezi-omume gēji okwukwe ya di ndu”.
Site na nke a anyi na-ahụ na mmadụ niile aghaghị ịbịakwute Chineke, ná-arịọ mgbaghara nke mmehie niile ha, wee nata okwukwe ka ukwu nke ná-abịa site n’itinye okwukwe ntà ahụ n’ọlụ bụ nke dịịrị na mbụ n’obi onye mmehie nke ná-echègharị. Ọ bụrụ na ọ ga-esite “n’okwukwe ya” dị ndụ, ọ pụtara ìhè na ọ ghaghị inwe okwukwe. Ọ bụrụ na ọ nọ n’ọnọdụ nnupuisi megide Chineke, n’ezie o nweghi okwukwe ahụ dị mkpà iji dị ndụ, ma fọdụkwa ịnwụ n’okwukwe. Okwukwe ahụ nke Chineke na-achọ n’ebe anyị nọ bụ okwukwu ahụ nke ná-adịgide ná ndụ anyị mgbe niile, ehihie niile, na abalị niile.
Okwukwe ahụ nke anyị ná-aghaghị inwe bụ nke na-elegide Chineke anya ịbụ Onye ndú, n’ihi na anyị kwere na Ọ ga-edú anyị. Okwukwe nke anyị ná-aghaghị inwe bụ okwukwe ahụ nke na-elekwasị Chineke anya banyere mkpà niile anyị kwa ụbọchị, n’ihi na anyị nwere okwukwe na Ọ ga-elekọta anyị. Okwukwe nke anyị ná-aghaghị inwe bụ okwukwe ahụ nke na-elekwasị Chineke anya banyere ọzụzụ nke ime mmụọ n’ihi na anyị nwere okwukwe na Ọ ga-azụ anyị site n’Okwu Ya dị nsọ. Okwukwe anyị ná-aghaghị ịnwe bụ okwukwe ahụ na-elekwasị Chineke anya banyere nzọpụta anyị na olileanya ebighịebi anyị, n’ihi na anyị nwere okwukwe na ọ bụ ezi ọchịchọ nke Ya inye anyị Alaeze Ya. Okwukwe anyị ná-aghaghị inwe bụ okwukwe ahụ nke nwere ike ịdị nime akụkụ arụ anyị niile, nke ga-eme ka anyị kwenye na arụ anyị niile bụ ihe aga-enwogha site na Mmụọ Nsọ ka anyị wee nwee ike izute Onyenwe anyị na Onyenzọpụta anyị n’igweoji n’ọbịbịa Ya. Nke ahụ bụ okwukwe anyị ná-aghaghị inwe na okwukwe nke anyị ná-aghaghị ịdị ndụ nime ya.
Ná mkpirisi ndụ a ọ dị ọtụtụ oge nke ọ na-adị mkpà karịsịa na anyị ga-adabere n’okwukwe anyị kwere na Chineke ka o dubiga anyị. Pọl dere banyere óké mkpagbu, ịrara nye n’aka ndịiro, na ịhụ ahụhụ n’anụ-arụ na mkpụrụobi, anyị matara na ọ gaghị enweworị ike ịnagide mkpagbu ndịa ma ọ bụrụ na o nweghị okwukwe nime Chineke. Ọ bụ ezie ma eleghịanya anyi agaghị ahụ ahụhụ n’otù ụzọ ahụ dịka ya onweya hụworo, ma anyị aghaghị ijéijè site n’okwukwe nke anyị nwere nime Chineke.
Nwa Chineke na-ebili n’isi ụtụtụ ka ọ malite ọlụ ya nke ụbọchị ahụ, ọ bụghi n’ịtụkwasị onweya obi dịka ọ dị n’etiti ndị ná-ekweghị ekwe, kama ná ntụkwasịobi ahụ nke sitere n’okwukwe ekwere nime Chineke. Nwa Chineke na-arịọ Chineke ka O due ya n’ụbọchị ahụ, banyere ume nke ọ ga-eji lụọ ọlu ya niile nke ụbọchị ahụ, na kwa banyere amamihe n’ihe niile ka ndụ ya wee nwee ike ịbụ ngọzi nye ọtụtụ mmadụ. Ọ na-ewere ndụ ya na ụbọchị ya chụara Chineke dịka àjà. Ọ na-arịọ kwa maka nchebe nke ndị nọ ya nso na ndị ọ hụrụ n’anya wee ná-arịọ ka ngọzi Chineke dịkwasị n’ọlụ niile nke ana-alụ inye Chineke nsọpụrụ na otuto n’ụbọchị ahụ. Ọ na-ekpe ekpere banyere ndị ná-ahụju anya n’anụ-arụ. Ọ na-ekpe ekpere banyere ndịorù nke Chineke ndị ná-adọgbu onwe ha n’ọlụ nke Kraist. Ọ na-arara ụzọ ya niile nye Chineke. Nwa Chineke na-eme ihe ndịa niile n’ihi na o nwere okwukwe nime Chineke. Ọ maara na ya na-ekpere Chineke nke ná-anụ ná-aza kwa ekpere.
Lee nnọọ otú ndụ onye mmehie si dị iche! Ọ dịghị adị ndụ ọbụná n’okwukwe ahụ nke pụrụ ịbụ nke aka ya. Ọ na-ebí ndụ n’amamihe nke onweya -- amamihe nke jedebere ná nghọta nke mmadụ. Ọ na-adabere náánị n’ihe ọ pụrụ ichepụta banyere ọdịn’iru – nchepụta nke njedebe ya bụ náánị ihe ọ mụtara site n’ihe nke ọ nwapụtaworo nime ndụ ya ma ọ bu nke ọ mụtara site n’ihe ndịọzọ nwapụtaworo nime ndụ ha. Ọ na-adị ndụ n’ike nke onweya -- ike nke ebururị ụzọ nye ya site n’ịdị mma nke Chineke bụ nke ọ na-eme ka ọ dị ike karịa site n’ihe ọmụma nke mmadụ. Onye mmehie na-enyebiga ndụ ya náánị n’ihe nke ndị èzínaụlọ ya; maọbụ, ọ bụrụ na ọ bụ otù onye nime ndị na-ele anya gafee èzínaụlọ ha, o na-enyebiga ndụ ya n’ihi ọdị mma nke mmadụ niile. Nchebe na urù nke ọ na-enye ndị nọ n’okpuru ya ma ọ bu ndị ọ na-elekọta bụ náánị ihe o nwere ike ịzụta ma ọ bụ ihe o nwetara site n’ihe aka ya abụọ lụpụtara ma ọ bụ nke sitere n’amamihe nke nghọta ya. O nweghị olileanya ebighịebi n’onweya, o nweghị kwa okwu nkasịobi nke ọ ga-agwa onye ọzọ mgbe okwu nke ndụ ebighịebi chere onye ahụ iru. Ndụ na ọlụ niile nke onye mmehie bụ náánị n’ihe nke oge a, nkekanke, na kwa gburugburu ndị ahụ ọ rọpụtara n’onwe ya ịbụ ndị ha na ya ga na-enwe mmekọ ma ná-ayịkọ kwa.
Onye eziomume, n’akụkụ nke ọzọ, naaga site “n’ike rue n’ike,” ọbụná mgbe ọ na-agafe na ndagwurugwu nke ịkwá ákwá. Mgbe nsogbu na ahụhụ bịakwasịrị ya, onye eziomume ahụ na-etinye okwukwe ya na ntụkwasịobi ya nime Chineke, ná-ahụ aka nnapụta nke Chineke, ná-anata nime alaala obi ya ngọzi nke ịgba-ume dị omimi, ọ bụ ezie na óké ahụhụ ná-abịakwasị arụ ya. Onye eziomume ahụ mgbe ọ nọ nime ndagwurugwu nke ịkwá ákwá ná-ahụta Chineke nke ịhụn’anya ahụ Onye ná-edu ya rue mmeri na ọñụ zuru òkè. Ike ya dị nime Chineke; ya mere ọ bụ otù nime ndị agọziri agọzi nwere ọñụ. Ọ ga na-eto Chineke ọbụná ma nsogbu bịakwasị ya site n’akụkụ niile.
Ịga site n’ike rue n’ike” bụ mnwapụta dị ebube n’onwe ya. Ekpughere eziomume nke Chineke nye anyị “site n’okwukwe rue n’okwukwe.” Nkọwapụta abụọ ndịa jikọtara onwe ha, n’ihi na ọ bụrụ na anyị aga ijè site “n’ike rue n’ike,” anyị ga abụ ndị jewororị ijè site “n’okwukwe ruo n’okwukwe.”
Ka anyị tụlee ihe banyere onye amụrụ ọhụụ nke Chineke onye zutere nsogbu mbụ ná ndụ ọhụụ ya, nke bụ, n’ezie mnwapụta nke okwukwe ya. Mgbe nwa Chineke na-adaberesi ike na Chineke, mgbe ọ nọ n’etiti ọnwụnwa, a na-ahụ ka a na-asọpụrụ okwukwe o nwere nime Chineke, na mmeri bụ kwa nke ya. A na-agba ya ume site n’ihe ọ nwapụtara, n’ihi na site n’itinye okwukwe ya na Chineke, o nwetawo ike ọhụụ site na Chineke. Mgbe ná-adịghị anya, nwa Chineke ga-enwe kwa nsogbu ọzọ ná ndụ ya, eleghịanya n’ụzọ ọzọ dị iche site n’ọnwụnwa mbụ ya. Ọzọ kwa ọ na-adabere na Chineke ná njikere ọhụụ na okwukwe dị elu, n’ihi na o nwewo nghọta site ná mmeri o meriri n’ọnwụnwa nke mbụ na Chineke nọ ya nso ịnapụta ya. Ọzọ kwa Chineke na-asọpụrụ okwukwe ahụ ná-enye kwa ya ike ahụ dị ya mkpà.
Ọnwụnwa karịrị ukwuu bụ nnwapụta nke okwukwe dị ukwuu nke na-eweta ike ukwuu site na Chineke n’ikpeazụ. O jewo ijè site “n’okwukwwe rue n’okwukwe” na “site n’ike rue n’ike.”
Otú a ka ọ dị ná ndụ nwa Chineke site ná mmalite rue ọgwụgwụ. Ọnwụnwa ọ bụla na-eme ka nwa Chineke ọ bụla sie ike, nwee ume iji zute ọnwụnwa ọzọ nke ga-abịa mgbe dị n’iru; ma mgbe o lekwasịrị Chineke anya maka inyeaka, mgbe ọ nọ nime óké ahụhụ, a na-agba ya ume na-eme kwa ka ntụkwasịobi ya na Chineke sie ike. Okwukwe ahụ nke akụwororị n’obi ya etolitewo wee dị ukwuu site n’ọnwụnwa dị iche iche nke o zuteworo meri kwa n’ihụn’anya na ebere nke Chineke nke emere ka ọ pụta ìhè n’ebe ọ nọ.
Onye eziomume na-elepụ anya ná ntụkwasịobi, n’okwukwe o nwere na Chineke, ná nsogbu dị iche iche nke ọ maara na ha ga-abịkwasị ya ime ka okwukwe ya bụrụ ihe anwapụtara. Nime nke a ọ na-adị ndụ “site n’okwukwe ya.” Ekpere ya na ndabere ya na-abụ: “Ọ mawo uzọ m’gāga, mgbe ọ nwaputasirim, dika ọla-edo ka m’gāputa”; na “Le, ọ gēgbum, m’gagh echere” (Ma-ọbụ “ọ bu ezie na Ọ gegbum, ma aghaghim itukwasi Ya obi”). N’ebe a kwa ọ na-adị ndụ “site n’okwukwe ya.” Mgbe o leghachiri anya n’àzụ hụ mmeri niile na ihe niile o nwetaworo, ọ dịghị ewere ma ọ bụ nara otuto ọ bụla n’ihi otù nime ha, kama, ọ na-asị onweya “Ọ bụ gịnị kwa ka i nwere nke i nānatagh? ma ọ buru na i natara ya, gini imere i nānya isi, dika agāsi na i natagh ya?” (I Ndi Kọrint 4:7). Ọ matara Onye ahụ nke kwesịrị ka enye Ya otuto niile mata kwa otú esi nata mmeri niile ahụ na ihe mnweta niile ahụ n’aka Onye ahụ.
Ịmata Uche Chineke Site N’itinye Okwukwe N’ọlụ
Ọ dị ọtụtụ ụzọ nke ngọzi na mnwapụta nke dịrị Ndị Kraist nke anyị ná-achọpụtabeghị. Ọ dị ịdị elu na ịdị omimi nke anyị niile n’otù n’otù ákáerughị ma ọ bụ amatazubeghị. Anyị aghaghị ịbụ ndị “nāgbasi mgba ike n’ihi okwukwe ahu nke enyere ndi nsọ n’aka nání otù mgbe idebe” (Jud 3). Otù onye nwere ike ijeru otù nsọtụ nke ezubeworo mgbe onye ọzọ nwere ike ịrịgoru nsọtụ ọzọ nke ezubeworo. Ma ọ dị anyị niile mkpà ịga n’iru nime Chineke mgbe niile ma ọ bụrụ na anyị ga-ezu òkè, “tozue òkè dizu kwa nma, buru ndi ọ digh ihe ọ bula fọduru nke unu nēnwegh” (Jemes 1:4). Ọ bụ ihe mwute na anyị nwere ike ịhụ na ọtụtụ mmadụ dị ndị ná-amalitebeghị ịnwapụta ịdị mma na ịhụn’anya nke Chineke na ịmata otú O si nwe óké mmasị n’ebe anyị nọ, n’ihe ọ bụla anyị na-eme ma ọ bụ ihe anyị bụụrụ Ya.
Ọchịchọ kachasị elu nke onye nke Chineke nwere bụ ka ọ nọgide nime uche zuru òkè nke Chineke. Ịnọ nime etiti nke uche Chineke bụ ọchịchọ dị elu nke onye nke Chineke. Òlee otú o si amata uche zuru òkè Chineke wee nwee ike ijéijè nime ya mgbe ọ matasịrị ya? A ga-enweta ọzịzá nke a site n’isiokwu nke ihe ọmụmụ anyị: “onye eziomume nkem gēsite n’okwukwe nke-ya di ndu.”
Nke mbụ, anyị aghaghị ịmata na Chineke ahụ nke namata mgbe nnụnụ dara n’ala, nke ná-agụ kwa agịrịisi nke isi anyị ọnụ, na nke ná-etinye uche Ya ná mkpà anyị niile nwere mmasị dị ukwu n’ihe niile banyere anyị. Anyị aghaghị ịmata na Ọ hụrụ anyị n’anya. Anyị aghaghị ịmata kwa na ihe banyere anyị na-emetụ Ya n’obi, banyere ihe niile na-eme na nke ná-adapụta nime ndụ anyị. Ọ bụrụ na anyị kwere nke a n’eziokwu, anyị nwere ike bịakwute Ya ná mkwuwa okwu maka inyeaka, maka nduzi, maka ike, ma ọ bụ maka ihe ọ bụla ọzọ nke ga-abụ mkpà anyị. O kwewo mkwà na Ọ ga-aza arịrịọ ekpere anyị niile, ma ọ bụrụ na ọ bụ dịka uche Ya si dị. N’ebe a nke ahụ bụ ụzọ esi achọpụta ihe bụ uche Chineke. Ọ bụrụ na anyị enwe okwukwe ahụ nime Chineke nke ga-eme ka anyị guzo n’elu mkwà Ya nime mkwuwa okwu, n’eziokwu ma mezu kwa ihe niile nke O nyeworo anyị n’iwu ka anyị mee, anyị nwere ike inwe ntụkwasịobi na ọzịzá ga-abụ uche Ya nye anyị.
Ọ bụrụ na ọ na-emetụ anyị n’obi na Chineke enyewo anyị ọlụ anyị ga-alụ, anyị ga-anwapụta nke a site ná ngwaọlụ Ọ ga-enye iji lụọ ọlụ ahụ. Ndịkom na ndịnyom nke Chineke na mgbe ochie azọnyewo ụkwụ n’okwukwe ọtụtụ mgbe n’ịhụ na Chineke dubigara ha wee gbooro ha mkpà ha niile. Ọ bụrụ na Chineke na-achọ ka anyị kwuo okwu, O kwere mkwà inye anyị amamihe gaezuru anyị. Ọ bụrụ na Ọ na-achọ ka anyị gaa, O kwere mkwà na Ya ga-akwara anyị ụzọ nye kwa anyị ihe niile ga-adị mkpà iji gaa ijè ahụ. Ọ bụrụ na Ọ na-achọ ka anyị nwee ntachịobi, Ọ ga-enye anyị àmàrà anyị ga-eji mee otú ahụ. Nke a bụ okwukwe anyị! Nke a bụ ndaberesi ike anyị! Nke a bụ ntụkwasịobi anyị! Anyị na-adị ndụ site n’okwukwe ahụ. Ọ bụrụ na anyị enweghị ike ime nke a, ọ pụtara na anyị enweghị ebe ga-abụ ebe ndabere anyị.
Lee ka ebere na ịhụn’anya Chineke si dị ukwu! Lee otú o si dị ukwu bụ àtụmààtụ Ya nye anyị niile! Lee otú àtụmààtụ a si dị mfé bụrụ kwa ihe dị iche site na mmụọ nke ndị ụwa na nke ọgbọ a. Ọ bụ ezie na Ọ karịrị ihe anyị nwere ike ịghọta, ma anyị nwere ike itoru ya. Ọ bụ ịdị ndụ nke náánị ịtụkwasị Chineke obi -- ndụ nke okwukwe. Ọ bụ ọlụ dịrị ndị niile a na-akpọkwasị aha Kraist, n’ihi na “Onye ezi-omume nkem gēsite n’okwukwe ya di ndu.”
Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE- Lee ebe anọ ahụ edepụtara okwu ndịa na Baịbụl, “onye ezi-omume nkem gēsite n’okwukwe di ndu”. Gụọ amaokwu bú ụzọ na nke na-eso ihe ndepụta a n’ebe anọ ahụ.
- Gịnị bụ nkọwa nke ịga site “n’ike rue n’ike”?
- Òlee otú ịga site “n’okwukwe rue n’okwukwe” jiri jikọta ijéijè site “n’ike rue n’ike?”
- Gịnị ka onye dere Abù Ọma kwuru banyere òfùfè nrò n’Ụlọ ukwu Chineke mgbe eji ya tụnyere ndụ ndị mmehie?
- Mụọ buru kwa n’isi Abù Ọma 84:11.
- Òlee otú Luk 2:36-38 siri bụrụ mmezu nke Abù Ọma 84?
- Òlee ndịkom abụọ amaara nkeọma nime Nzukọ Kraist azọpụtara site n’isiokwu a?
- Kọwaa ihe bụ okwukwe otú Akwụkwọnsọ siri kọwaa ya.
- Gosi ihe okwukwe ji dị mkpà, ná-akwagide ihe nkọwa gị site n’ihe edere n’Akwụkwọnsọ.
- Òlee otú anyị ga-esi chọpụta ihe bụ uche Chineke site ná ndụ nke okwukwe?