Lesson 301 - Junior
Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISI: “Onye ọ bula nke gākpọku aha Onye-nwe-ayi, agāzọputa ya” (Ndi Rom 10:13).Notes
Damaskọs
Nime ihe ọmụmụ a anyị na-agụ banyere òtù ndịkom ná-ejé njèm n’ala Siria. Ha na-eje Damaskọs, nke elere anya na ọ bụ otù nime obodo nọworo site na mgbe dị anya na nke kachasị mkpà nime Siria. Akpọrọ ya aha na Jenesis, Akwụkwọ mbụ nke Baịbụl (Jenesis 14:15). Ọ dị ihe ra ka otù narị maịlị na iri abụọ (120) n’akụkụ ugwu nke Jerusalem. Ekwuwo na Damaskọs bụ obodo mara mma ya na Abana, mmiri ná-egbu mara mara, ná-erubiga n’etiti ya. N’obodo ahụ ka ụfọdụ ndị ná-eso ụzọ Kraist biworo. Obodo Damaskọs ahụ mara mma ka òtù ndịkom a na-ejé.
Sọl
Ònye nọ n’etiti òtù ndịkom a? Otù nwoke a na-akpọ Sọl. Anyị nụrụ ihe banyere ya mgbe anyị mụrụ ihe banyere otú esi were nkume tụgbuo Stifen, otù onye nime ndị ná-eso ụzọ Jisọs (ihe ọmụmụ 289). Sọl guzo nso, ná-ele ndị àmà ụgha ahụ ka ha na-egbu Stifen (Ọlu Ndi-ozi 6:3; 7:58). Ná-arụghị ụkà Sọl hụrụ iru Stifen ná-egbuke nụ kwa ekpere nke Stifen nye ndị gburu ya (Ọlu Ndi-ozi 6:15; 7:60)
Sọl bụ nwa okorọbịa gụrụ akwụkwọ nkeọma, onye mụworo Iwu n’okpuru Gameliel, otù onye nkuzi ukwu nke ndị Ju. Sọl, n’ụzọ nke ya, bụ onye óké okpukpé na onye “nānu ọku nye Chineke” (Ọlu Ndi-ozi 22:3). Ọ bụ onye Farisii na-ekwusi okwu ike banyere idebe ememe dị iche iche ma ha rapụrụ ikpé, ebere, okwukwe, na ịhụn’anya Chineke (Matiu 23:23; Luk 11:42). Ha jupụtara na mpako na eziomume nke onwe-onye. Jisọs kwuru banyere ndị Farisii sị, “Ọlu-ha nile ka ha nālu ka madu we kiri ha” (Matiu 23:5). Ná amaokwu asaa dị iche iche nke Matiu isi iri abụọ na atọ, Jisọs sịrị na ndị Farisii bụ “ndi iruabụa.”
Site ná ndụ nke Sọl anyị na-amụta na mmadụ pụrụ ijisi ike n’ihe o kweere na n’ihe ọ na-eme ma bụrụ onye ná-adịghị erubere Jisọs isi. Ka anyị wee mee ihe ga-atọ Onyenwe anyị ụtọ, anyị aghaghị ikwere na Baịbụl, rube kwa isi n’iwu Ya niile.
Onye Mkpagbu
Sọl dị ka ọtụtụ ndị Ju ndị ọzọ ná-ekweghị na Jisọs bụ Ọkpara Chineke. Jọn Onyeozi ná-ekwu banyere Jisọs sị: “Ọ biakutere ihe nke aka Ya, ma ndi nke aka Ya akpọbatagh Ya. Ma ka ha ra, bú ndi nara Ya, ha ka Ọ nyere ike ighọ umu Chineke, bú ndi kwere n’aha-Ya (Jọn 1:11, 12).
Sọl chèrè na Jisọs ekwesịghị ikwu na Ya bụ Ọkpara Chineke na Mesaia ahụ. Ọ bụghị náánị na Sọl nwere obi abụọ banyere Jisọs kama ọ kpọrọ Ya asị. Sọl sịrị, “N’ezie mu onwem chère n’obim, na aghaghm ime ọtutu ihe megide aha Jisus onye Nazaret” (Ọlu Ndi-ozi 26:9). Nke a bụ nwa okoroọbịa ahụ bụ Sọl, onye ná-ejé Damaskọs.
Akwụkwọozi nke Ike
Gịnị mere Sọl ji ná-ejé obodo Damaskọs? Ọ ná-ejé isogbu ndị ná-eso ụzọ Jisọs. Sọl kpọrọ Kraist na ndị ná-eso ụzọ Ya asị. Sọl mere ka atụbà ọtụtụ ndị ná-eso ụzọ Jisọs n’ụlọ mkpọrọ, gbuo kwa ndị ọzọ (Ọlu Ndi-ozi 26:10). Sọl “nēsogbu nzukọ Kraist nke-uku” site n’ime ka enye ndị ná-eso ụzọ Jisọs ahụhụ kpagbuo kwa ha (Ọlu Ndi-ozi 8:3). Sọl chèrè na ya na-eme ihe ziri ezi nye Chineke. Ọ ghọtaghị na Jisọs bụ Ọkpara Chineke, na Chineke zitekwara Jisọs n’ụwa n’ihi anyị.
Sọl ka na-akpagbu ndị ná-eso ụzọ Kraist site n’ịbà mbá na igbu ha, ọbụná mgbe ọ hụsirị otú esi were nkume tụgbuo Stifen, mgbe Stifen hụkwara ọhụụ dị ebube nke Jisọs wee sị, “Onye-nwe-ayi, atukwasikwala nmehie a n’isi-ha” (Ọlu Ndi-ozi 7:60). Sọl ejekwuruwo onyeisi nchụàjà ka enye ya ike isogbu ndị ná-eso ụzọ Jisos -- ndịkom ma ọ bụ ndịnyom. Sọl atụwo àtụmààtụ iké ha agbụ dịka ndị ná-emebi iwu wee dọkpụrụ ha jee Jerusalem.
Otù Ìhè na otù Olu
Ka Sọl na ndịkom ndị ọzọ ya na ha yikọ jee na-abịaru nso Damaskọs, otù ihe mere. Na mberede óké ìhè sitere n’Eluigwe “kariri onwunwu anyanwu.” Sọl wee daa n’ala nụ kwa ka akpọrọ aha ya. Otù Olu sịrị, “Sọl , Sọl, gini mere i nēsogbum?” Mgbe Sọl jụrụ onye onye ná-ekwu okwu bụ, Onyenwe anyị zara sị, “Mu onwem bu Jisus, Onye gi onwe-gi nēsogbu: ọ di ike I gba ndudu eji achu ehi ukwu.”
N’ebe ahụ, n’iru Onyenwe anyị, Sọl aghaghị ịghọtaworị na ihe ya mere megide ndị nke Onyenwe anyị na ọ bụ Onyenwe anyị Onwe ya ka o mere ya megide. Mgbe Sọl na-esogbu ndị ná-eso ụzọ Jisọs, ọ bụ Jisọs n’ezie ka ọ na-esogbu. Sọl aghaghị ịghọtaworị na “nāmagh ama nime ekwegh-ekwe” ka ya bụrụ onyeiro nke Onyenwe anyị (I Timọti 1:13).
Imegide Jisọs
Taa, ụzọ esi mesoo ndị nke Chineke bụ n’ezie ụzọ esi emeso Chineke. Mgbe mmadụ mere ezi ihe nye ndị nke Onyenwe anyị ma ọ bụ gwa ha okwu obiọma, ọ bụ Onyenwe anyị ka emeere ya. Ọ bụrụ na mmadụ ekwuo okwu ọjọọ megide ndị nke Onyenwe anyị ma ọ bụ meso ha omume ná-adịghị mma, a na-ele ya anya na ọ bụ Onyenwe anyị n’Onwe ya ka ha kwugidere ma ọ bụ mesoo omume ahụ. Jisọs kuziri ihe banyere oge a ga-ekewa ndị eziomume na ndị ajọomume. Ndị eziomume ga-anata ụgwọọlụ n’ihi ihe ha meworo -- ndị ná-enyere ndị ọzọ aka, ná-enwe obi ọmiko, ná-eleta ndị ọrịa ná-enwe kwa obi ebere n’arụ ndị ọzọ. Ha ga-anụ okwu ndịa: “N’ezie asim unu, Ka ọ ra, bú otú unu si me ya nye otù onye nime umu-nnam ndia, bú ndi dikarisiri ntà, Mu ka unu mere ya nye” (Matiu 5:40). A ga-enye ndị ajọomume ahụhụ n’ihi omume ha -- omume nke ịmara náánị onwe onye, ilefuru ndị ogbenye anya, emeghị ebere, na enweghị obiọma. Ọ ga-eju ha anya mgbe ha ga-amata na ọ bụ Jisọs ka ha mesoro otú ahụ. Ha ga-anụ okwu ndịa: “N’ezie asim unu, ka ọ ra, bú otú unu nēmegh ya nye otù onye nime ndia dikarisiri ntà, Mu ka unu nēmegh ya nye” (Matiu 25:45).
Ndụm-ọdụ
Ná-arụghị ukà akọ-na-uche Sọl ná-adụ ya ọtụtụ mgbe. N’oge a ọ nabatara na ya na-eme ihe ọjọọ. Mgbe ekpughere Jisọs nye ya, Sọl wedara onwe ya ala. O juru ya anya, ọ makwara jijiji, ma o nyefere Onyenwe anyị onwe ya jikere kwa ime ihe Jisọs nyere ya n’iwu. Sọl sirị, (“Onye-nwe-ayi, gini ka I nāchọ ka m’me?)” Onyenwe anyị nyere ya ntụzi-aka doro anya, dịka Ọ na-aza ndị ná-ajụ ase n’aka Ya n’oge a. Agwara Sọl ka o jeruo Damaskọs chèrèkwa maka ndụm-ọdụ niile ọzọ a ga-enye ya.
Ndịkom ahụ ha na ya soro n’ijè ahụ apụghị ikwu okwu mgbe ha nụrụ Olu ahụ ma ha ahụghị mmadụ ọ bụla. Ọ bụ ihe pụtara ìhè na ndịkom ọzọ ahụ pụrụ ịnụ Olu ma ha anụghị mkpụrụokwu ekwuru. Okwu ahụ bụ ozi Jisos ziri Sọl.
Mgbe Sọl biliri irubere Jisọs isi, ọ pụghị ịhụ ụzọ “site n’ebube ìhè ahu” (Ọlu Ndi-ozi 22:11). Sọl batara nime obodo Damaskọs n’ụdị dị iche site n’ihe o lereanya ya. Kama ọ ga-eje n’obi ike ná-achụgharị ndị ná-eso ụzọ Jisọs, ọ dịrị Sọl mkpà ka mmadụ jide ya n’aka wee duru ya. Ọ nọdụrụ abalị atọ ná-ahụghị ụzọ. O rịghị ihe ma ọ bụ ñụọ ihe ọñụñụ. Ná-arụghụ ụkà, o kpere ekpere n’ụzọ dị iche site n’otú o si ekpe na mbụ dịka onye Farisi.
Ananaias
Otù onye ná-eso ụzọ Jisọs a na-akpọ Ananaias bi na Damaskọs. Onyenwe anyị gwara ya okwu banyere Sọl. Ananaias anụwo otú Sọl si ná-akpagbu ndị ná-eso ụzọ Onyenwe anyị. O wee gwa Onyenwe anyị na ọ bụ n’ihi nke a ka Sọl ji ná-abịa Damaskọs. Onyenwe anyị mere ka egwù Ananaias kwụsị wee gwa ya ka o nyere Sọl aka. Ananaias rubere isi. O wee jee n’ámá ana akpọ Ámá Eguzoziri, n’ụlọ Judas. N’ebe ahụ ka Ananaias chọtara Sọl, dịka Onyenwe anyị kwuworo nnọọ.
Nwanna Sọl
Onyenwe anyị egosiwo Ananaias na Sọl bụ “ihe-ọlu arọputara,” na Sọl ga-ekwusa Oziọma, na ọ ga-agba kwa àmà banyere Kraist nye ọtụtụ mmadụ. Ananaias bikwasịrị Sọl aka ya abụọ n’isi maka ọgwụgwọ, dịka enyeworo ya n’iwu, ná-esoro ihe-atụ nke Jisọs mgbe Ọ nọ n’ụwa (Mak 6:5; 7:32; Luk 4:40), na dịka Jisọs kwuworo na ndị kwere na ya ga na-eme. “Iheiriba-ama ndia gēso kwa ndi kwere; … ha gēbikwasi ndi-nriaria aka, agēme kwa ka aru-ha di ike” (Mak 16:17, 18). (Lee Ihe ọmụmụ 252). Emekwara ka Sọl hụ ụzọ. “Ihe dika akpirikpa we si n’anya ya dapu.”
Ananaias sịrị, “Nwa-nnam Sọl” -- n’ihi na Chineke agbanwewo obi Sọl. Sọl adịghị alụso kwa Jisọs ọgụ ọzọ. Sọl kpọkuru aha Onyenwe anyị; o rubere isi n’olu nke Jisọs; o kpere ekpere; omume ya gosipụtara na azọpụtawo ya. Nke a bụ ihe-àtụ nke óké ebere nke Onyenwe anyị -- agbagharawo Sọl. Ọ dịghị abakwara ndị ná-eso ụzọ Jisọs mbá -- ọ bụ otù onye nime ha. Onye ahụ kpagbuworo ha ka ha hụrụ n’anya ugbu a. Akpọrọ ya nwanna, dịka ndị ná-eso ụzọ Jisọs ugbu a n’akpọrịta onwe ha ụmụnna.
Otù Onyeàmà
Sọl na ndị ná-eso ụzọ Jisọs nọgidere na nwa mgbe. Ọ na-ekwusa na Jisọs bụ Ọkpara Chineke nime ụlọ nzukọ niile. Mgbanwe dị nime Sọl juru ndị nụrụ okwu ya anya. Mgbe azọpụtara ụmụ mmadụ taa, ha na-agbanwe kwa. Ha na-ahụ Jisọs na ndị nke Ya n’anya. Ọ na-atọ ha ụtọ ịnọ n’etiti ndị nke Onyenwe anyị. Ha na-enwe obiụtọ ijé n’ụlọ nzukọ. Onye ọ bụla azọpụtara na-achọ ịgwá ndịọzọ banyere Jisọs, dịka Sọl nọgidere “nāgwasi madu nile ike, ma onye ntà ma onye uku” (Ọlu Ndi-ozi 26:22). Àzọpụtawo gị? Ị matara na ị pụrụ ikpe ekpere, rịọ kwa Jisọs ka Ọ zọpụta gị? Anyị na-agụ nime Baịbụl na, “N’ihi na, Onye ọ bula nke gākpọku aha Onye-nwe-ayi, agāzọputa ya” (Ndi Rom 10:13).
Mgbe arọ atọ gasịrị ka Sọl laghachiri Jerusalem (Ndi Galetia 1:18). Ụfọdụ ndị Ju ahụghị Sọl na ihe ọ na-ekwusa n’anya. Ha wee kpebie igbu ya, ma ọ gbanarịrị ha site n’inyeaka nke ndị ná-eso ụzọ Jisọs. Otù abalị ndị ná-eso ụzọ Jisọs wedara Sọl nime abọ n’azụ mgbidi nke obodo. Emesịa o wee jee Jerusalem. Ụfọdụ ndị ná-eso ụzọ Jisọs na-atụ egwù ya, n’ihi na ha chètara na ọ chọwororị ndụ ha, ma Banabas mere ya enyì wee gwa ndị niile ná-eso ụzọ Jisọs banyere nchègharị nke Sọl. Ugbu a, ọ na-enwe ọñụ ná nzukọ ha. Sọl na ndị enyì ya ochie ndị sitere n’etiti ndịisi nchụàjà na ndị Farisi adịghị emekọrịta kwa -- ọ na-atọ ya ụtọ ịnọ n’etiti ụmụ Chineke. Sọl na-ekwusa ihe banyere Jisọs ebe ọ bụla o jere. Onyenwe anyị nọnyeere ya, Sọl wee bụrụ óké onye ụkọ Chukwu na onye mkwusa njègharị.
Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE- Òlee obodo Sọl naeje?
- Gịnị mere Sọl ji náeje ebe ahụ?
- Gịnị mere Sọl ji chee na ya naalụrụ Chineke ọlụ?
- Ònye mere ka Sọl hụ Ya anya mgbe ọ naeje njèm ahụ?
- Òlee otú onwunwu nke ìhè ahụ sitere n’Eluigwe ra?
- Òlee otú Sọl si malite kwa ịhụ ụzọ?
- Òlee otú anyị si mata na azọpụtara Sọl?
- Gịnị ka Sọl meere Jisọs mgbe o chègharịsịrị?
- Àgbanwere aha Sọl kpọọ ya gịnị?
- Òlee otú ndị náesoụzọ Jisọs si nyere Sọl aka ịgbanarị ndị Ju ahụ chọrọ igbu ya?