Ọlu Ndi-ozi 9:32-43; 10:1-23.

Lesson 302 - Junior

Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISI: “Chineke abugh onye nēle madu anya n’iru” (Ọlu Ndi-ozi 10:34).
Notes

Ndịkom Anọ Ahụ Ná-akụ azụ

Ifufe dị nwayọ ná-efe; nnụnụ mmiri na-efégharị n’elu; anyanwụ dị ñarañara nke Judia na-amụkwasị anyị ka anyị na-ejègharị nime mmụọ n’ótú nke Osimiri Galili. Ka anyị na-eweli anya n’ótú ahụ, anyị wee hụ otù Onye na-abịakwute Pita na Andru ndị ná-akụ azụ. “Bianu som n’azu,” ka olu Ya dara, “M’gēme unu ndị-ọkù nākuta madu” (Matiu 4:19). Dịka aga-asị na ụgbụ, azụ, na ọlụ apụtaghị ihe ọ bụla, Pita na Andru rapụrụ ha niile wee soro Onye ọbịa ahụ, onye anyị matara dịka Jisọs. Ka anyị na-aga n’iru n’ótú ahụ, anyị hụrụ ụmụnne ndịkom abụọ ọzọ, Jemes na Jọn, rapụrụ ọlụ ha wee soro Onyenwe anyị.

Ugbu a anyị zuteworo ndịkom anọ ahụ ná-akụ azụ, ka anyị wepụta Pita ichè wee nyochaa arọ ole na ole nke ndụ ya. Ka anyị gwa ya okwu, wee gee kwa ntị ka ọ na-ekwu -- mgbe ụfọdụ dịka onye maara ihe, mgbe ọzọ kwa dịka onye n’ámaghị ihe ma-ọlị.

Okwu niile nke Pita

Ị jikeere nnọọ ịrapụ ọkụ azụ gị wee soro Jisọs, ọ bụghị otú a Pita? Ị bụ onye jiri obi chụọàjà nke ukwu. N’ụbọchị ọzọ, ka anyị guzo n’akụkụ, anyị nụrụ ka ị na-asị Jisọs, “Ayi onwe-ayi rapuru ihe niile, we so Gi; gini kwa ka ayi gēnwe?” (Matiu 19:27). Ị mataghị na mmadụ na-esoro Onyenwe anyị n’ihi na ọ hụrụ Ya n’anya? ị mataghị kwa na “isoro Jisus” pụtara ijikere ịrapụ ụlọ. ụmụnne ndịkom, ụmụnne ndịnyom, nna, nne, ma ọ bu nwunye, ma ọ bu ụmụ, ma ọ bụ ala, n’ihi Jisọs? Ndụ ebighịebi na-echére ndị niile soro Jisọs n’ezie.

Ugbò abụọ ka anyị nụrụ i kwupụtara mkwupụta dị ike banyere okwukwe gị nime Jisọs, site n’egbugbere ọnụ nke gị onwe gị: “Gi onwe gi bu Kraist ahu, Ọkpara Chineke di ndu” (Matiu 16:16). Ma n’oge ọzọ egwù tụrụ anyị site n’ọzịzá ị zaghachiri Jisọs mgbe Ọ gwasịworo gị na Ya aghaghị ịhụ ahụhụ, na ịnwụ, na ibili kwa ọzọ n’ụbọchị nke atọ. Gịnị mere gị i ji baara Jisọs mba: “Chineke mere Gi ebere, Onye-nwe-ayi: ihe a agagh-adiri Gi ma-ọli” (Matiu 16:22). Jisọs baara gị mba n’ihi nke ahụ, Pita. Eleghịanya ị mataghị na enyì gị Matiu ga-ede ya n’Akwụkwọ, ebe ọtụtụ ndị mmadụ ga-apụ ịgụ ya.

Okwukwe Ya

N’ụbọchị nke ọzọ ahụ dị, n’isi ụtụtụ, ka Jisọs na-abịakwute ụgbọ gị mgbe ebilimmiri na-amakwasị ya (Matiu 14:25). Okwukwe gị nime Onye òzízí gị mere ka i kwuo sị, “Onye-nwe-ayi, ọ buru na ọ bu Gị onwe-gi, sim biakute Gị n’elu miri.” Site kwa n’okwukwe ị pụtara n’ụgbọ ahụ wee jee ijè n’elu mmiri ahụ ijekwuru Jisọs. Ma egwù gbebara nime obi gị ka ị lekwasịrị óké ebilimmiri ahụ anya -- i wee malite imikpu.

Lee otú ị dị ka ndị nọ n’oge a -- anyị na-aga nkeọma nwa mgbe ntà na-ejé ijè n’elu ebilimmiri. Na mberede otù ule ma ọ bụ ọnwụnwa abịa anyị wee wepụ anya anyị n’ebe Jisọs nọ n’otù ntabianya, anyị ewee mikpuo. Ma ọ bụrụ na dịka Pita, anyị nọ Ya ezi nso wee setịpụ aka anyị sị kwa, “Onye-nwe-anyi zọputam,” Ogwe-aka Ya dị ike ga-ekulite anyị, anyị ewee nọ kwa n’elu ebilimmiri ahụ ọzọ. Ebilimmiri nke anyị pụrụ ịbụ mkpagbu ntà sitere ná ndịenyì anyị n’ụlọ akwụkwọ; ma, ihe niile ahụ na-adị ka óké ebilimmiri nke osimiri nye nwatakịrị.

Otù Mnwapụta dị Mwute

Pita, ka Onyenwe anyị na ekpe ekpere n’abalị iru-uju ahụ na Gatsemane, o wutere anyị na ị na-ararụ ụra kama iche nché, n’otù hour ahụ (Matiu 26:40); ọzọ kwa, mgbe ná-adịghị anya, anyị hụrụ ka ị na-eso n’ebe dị anya (Matiu 26:58). Anyị mara jijiji ka anyị nụrụ ugbò atọ ị gọnarịrị Onyenwe gị na Onye òzízí gị. Anyị meere gị ebere ka anyị hụrụ iru gị gosiri mwute dị omimi; mgbe óké ọkụkụ kwara ákwá, ị chètara okwu nke Jisọs, “Mgbe óké-ọkuku akākwagh, i gāgọnarim ugbò atọ” (Matiu 26:75). Lee otú i mere nnọọ dịka onye ụjọ! Anyị hụrụ gị ka ị kwara ákwá dị ịlụ, anyị onwe anyị sikwara nime ụlọ pụọ wee soro gị kwaa ákwá. Ihe dị otú a agaghị eme ọzọ, ọ bụghị otú a, Pita? Ị mụtawo ihe ọmụmụ gị dị ilu, ọ bụghị otú a? Onye òzízí gị agọnarịbeghị gị Pita, kama Ọ na-eguzo jikere ịgbaghara.

Òlee otú anyị si ná-eso Jisọs taa? Ànyị na-eso n’ebe dị anya? Ànyị ga-agọnarị kwa Jisọs ọ bụrụ na otù onye tụọ anyị aka sị, “Gi onwe-gi bu kwa otù onye nime ha” (Matiu 26:71-73)? Ma ọ bụ, eleghịanya, “Nwa-okoro a hu-kwa-ra Jisọs n’anya”? Ka anyị nyochaa obi anyị mee kwa ka o doo anyị anya na ihere adịghị eme anyị inwe Jisọs dịka Onyenwe anyị.

Pita Nkume ahụ

Ma ewo! Lee otú obi na-atọ anyị ụtọ n’ebe ị nọ mgbe emesịrị, Pita, mgbe ị nọ na Jerusalem, ka i guzoro ná mkwuwa okwu na-ekwupụta n’iru nnọkọ ikpé ahụ na onyeisi nchụàjà sị, “Ayi aghagh ikwenyere Chineke kari madu” (Ọlu Ndi-ozi 5:29). Mgbe emesịrị, ọ bụ ezie na apịara gị ihe n’ihi mkwuwa okwu gị n’ikwusa Kraist, anyị hụrụ gị ka i na-añụrị ọñụ na agụrụ gị n’onye kwesịrị ịhụ ahụhụ ihere n’ihi Aha Ya (Ọlu Ndi-ozi 5:41). Anyị wee kwuo nime obi anyị sị, Ọ gara adị anyị nnọọ mma asị na anyị nwere ntakịrị n’ụdị mmụọ dị otú a!

Ị bụghị kwa onye ná-adịghị ike ọzọ, ọ bụghị otú a, Pita? Ọ ghaghị ịbụ n’ihi na ị bụ otù onye nime ndị rubereisi n’iwu nke Jisọs ịnọgide na Jerusalem ruo mgbe emejuru gị n’ike sitere n’Elu. Ị nọ n’ụlọ elu ahụ mgbe ụzụ bịara “dika nke óké ifufe nke nēfesi ike, we site n’elu-igwe, ọ we juputa ulo ahu dum ebe ha nānọdu ala.” Ewee mee ka ha hụ ire, dịka nke ọkụ, ná-ekesa onwe ha; ọ wee nọkwasị ha niile n’otù n’otù. Ha niile wee jupụta na Mmụọ Nsọ, ha wee malite ikwu okwu n’asụsụ dị iche, dịka Mmụọ ahụ na-enye ha ike ikwuwa okwu (Ọlu Ndi-ozi 2:3-4).

O juru anyị anya ka anyị na-ege ntị n’okwu Chineke ahụ i kwuru n’ụbọchị ahụ pụrụ iché. O siiri anyị ike ikwere na ọ bụ gị, Pita, n’ihi na i kwuru nnọọ n’ike na ume. Ihe ra ka puku mkpụrụobi atọ ka atụkwasịịrị Nzukọ Kraist site n’otù okwu Chineke ahụ (Ọlu Ndi-ozi 2:41). Amụma Kraist buru emezuwo: “Agākpọ gi onwe-gi Kifas,” nke pụtara “nkume” (Jọn 1:42).

Ike Ịgwọ Ọrịa

Ihe ịrịba-àmà nke ọgwụgwọ emere juru anyị anya nke ukwuu. Site n’ike nke Chineke onye ngwụrọ ahụ nọ n’ọnụ-ụzọ Ụlọụkwu Chineke natara ọgwụgwọ (Ọlu Ndi-ozi 3:6). I leziri anya nkeọma ka i wee ghara ịnara otuto n’ihi nke a, kama i nyere Chineke otuto niile. Anyị hụrụ ndị nrịarịa ka ha na-edina n’ihe ndina na ute ha dị iche iche ná-echére ka ị gabiga, Pita, ka onyinyo gị kpuchie ha ka ewee mee ka arụ ha dị ike (Ọlu Ndi-ozi 5:15). Anyị hụkwara, site n’anya nke ime mmụọ, mgbe emere ka Ineas bilie, onye akụkụ arụ ya nwụrụ anwụ ruo arọ asatọ; nwanyị ahụ nwụrụ anwụ bụ Dọkas, enyeghachịrị ndụ ọzọ! Lee ihe ịrịba-àmà dị ebube ndịa bụ!

Nye Ihe Niile Ekèrè Ekè

Ọ dị ihe fọdụrụ nke ị ghaghị ịmụta Pita. N’ágbanyeghị otú mmadụ jemiworo n’ibi ndụ nke Onye Kraist, ihe ga-afọdụ kwa nke onye ahụ ga-amụta. Ọ dịghị otù onye ọ bụla ruworo n’òzùzù ókè nke ọtụtụ amara, amamihe na ike nke Chineke.

Mgbe ị nọ na Jọpa, Pita, mgbe ná-adịghị anya site n’oge emere ka Dọkas dị ndụ ọzọ, I nwapụtara ihe pụrụ iche. Site na nrọ, Onyenwe anyị gosịrị gị na Chineke abụghị onye na-ele mmadụ anya n’iru. Ọ hụrụ ndịkom na ndịnyom niile n’anya, ndị Ju na Ndị Mbaọzọ n’otù, Ọ chọrọkwara ka ekwusaara ndị niile Oziọma. Jisọs agwawo gị na Ndịozi niile ka unu kwusaara ihe niile ekèrè ekè Oziọma (Mak 16:15). Ugbu a Jisọs na-egosi gị site na nrọ na ị kwesịghị ịkpọ Ndị Mbaọzọ mmadụ efu ma ọ bụ ndị ná-adịghị ọcha. Ọ bụ ezie na ndị Ju bụ ndị nke Chineke rọpụtara, na ọ bụ kwa ihe megidere Iwu ka onye Ju na onye sitere ná Mbaọzọ nọkọta (Ọlu Ndi-ozi 10:28), ọ dịghị ihe dị iche n’ebe Chineke nọ. Ọ chọrọ ka mmadụ niile nọ n’ụwa nụ Oziọma, ka azọpụta kwa ha.

Mgbe i tetara, Pita, wee ná-atụgharị uche ihe nrọ ahụ pụtara, ndịkom atọ guzoro n’ọnụ-ụzọ ama náajụ ajụjụ banyere gị. Mmụọ Chineke wee gwa gị ka ị rịdakwuru ha ma soro kwa ha laa n’enweghị uche abụọ. I chefuru agụụ na-agụ gị, rubere Olu ahụ isi wee pụọ n’ọnụ-ụzọ ama, wee sị, “Mu onwem bu onye unu nāchọ.” I wee kpọbata ha ka ha nọ ọnọdu abalị, n’echi ya gị na ndịọzọ wee soro jee Sisaria. Ebe ahụ ka i nwere ohere ikwusa Kraist nye Ndị Mbaọzọ.

Ihe Ị Kuziwooro Anyị

Ọtụtụ ihe ọmụmụ ga-enyere mmadụ aka ka ị mụtara n’aka Onyeòzízí gị, I nyefewo kwa ha n’aka anyị. Anyị na-ekele gị ebe ọ dị ukwu, Pita, n’ihi ihe anyị mụtaworo n’ihe edepụtara banyere ndụ gị. Mgbe i mehiere, i mere ngwa ngwa wee chègharịa laghachikwuru kwa Onyenwe gị. Anyị agụwo Akwụkwọozi gị nke Mbụ na nke Abụọ, ọ kpali kwara obi anyị, anyị natakwara ngọzi site n’ihe odide gị. Nnọkọ ikpé ahụ dị na Jerusalem nke i kwuru okwu n’iru ya (Ọlu Ndi-ozi 4:8-12) sịrị na, ọ bụ ezie na ị gụghị akwụkwọ na ị maghị kwa ihe, ha chọpụtara na gị na Jisọs anọwo. Ọ bụ Ya bụ Onye òzízí ukwu gị, ọ bụghị Ya, Pita? Ọ bụ site n’aka Ya ka ị natara amamihe gị, mkwuwa okwu gị, na ike gị ikwusa Kraist.

Ị bụ otù nime Ndịozi iri na abụọ ahụ, Pita, edekwasị kwara aha gị n’elu otù nime nkume iri na abụọ ahụ eji tọọ ntọala Obodo nke Chineke. Anyị na-ele anya ịhụ gị n’elu ebe ahụ nime Obodo ahụ otù ụbọchị.

“Ayị gēzukọta kwue ya m’emesia

Mgbe ay’rur’obodo ns’ahu, mu na gị,

Otú’ ay’ si merie site n’amara, wee ru’ ulọ n’igwe;

Ayị gēzukọta kwue ya m’emesia.

“Eb’ahụ ay’na Moses, n’Elaija, na Pita na Pọl,

Gākọ mmeri si n’amara mgbapụta;

Nke kasi ay’gāhu Onye-nzọt’ay, mee Y’Eze nd’eze,

Bụa otuto Ya n’otù mgb’ebigh’ebi.”

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Kwuo ụfọdụ ihe iriba-àmà Pita mere.
  2. Òlee mgbe, òle kwa ebe Pita siri nweta ike ime ihe niile ndịa?
  3. Ònye gosiri Pita ọhụ ahụ?
  4. Gịnị bụ ọlụ Pita tupu Jisọs akpọọ ya?
  5. Kwuo ihe banyere ọdịda nke Pita.
  6. Òlee otú anyị si mata na eweghachiri ya n’ọnọdụ nke nzọpụta?
  7. Gịnị ka ekwere ná mkwà nye ndị niile rapụrụ ihe dum isoro Jisọs?
  8. Kwue ihe ụfọdụ siri ike nke ndị soro Jisọs nagidere.