Ọlu Ndi-ozi 10:24-48

Lesson 303 - Junior

Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISI: “Mba nile gējeru kwa ìhè-gi, ndi-eze ejerue onwu-maramara nke ọwuwa-gi” (Aisaia 60:3).
Notes

Otù Ngọzi Ekère

Ndị èzínaụlọ Kọniliọs malitere inwe óké olileanya mgbe ọ nụrụ na Pita na-abịa ịgwa ya ihe banyere Jisọs, Mesaia nke Israel, na banyere ike dakwasịworo ndị ná-eso ụzọ Ya n’ụbọchị Pentikọst. Kọniliọs kpọrọ ọtụtụ ndịenyi ya na ụmụnne ya ka ha soro ya nụrụ ezi akụkọ nke nzọpụta ahụ. Ọ na-ele anya ịnụ akụkọ dị ndụ, ọ chọkwara ka ndị ọzọ keta ókè n’eziokwu ahụ dị ebube. Otù ngọzi ekère na-abụ ngọzi okpukpu abụọ.

Ọtụtụ ndịagha nke ndị Rom biri na Jerusalem ahụghị ndị Ju n’anya, ha enweghị kwa obiụtọ n’okpukpé ndị Ju. Ọ bụ nnọọ náánị ihe nzuzu nye ha. Ha nọ na Judia náánị dịka ndị uwe ojii nye ọchịchị Rom. Ọ bụ ezie na ndị Ju na-echè na ha nọ n’orù nye ha; ma ha na-echè kwa n’otù aka ahụ na ha ka ndị Rom mma n’ihi na ndị Ju bụ ndị Chineke rọpụtara. Ndị Ju gụrụ ndị Rom ná ndị ná-amaghị Chineke, ma ọ bụ ọbụná nkịta; ndị Ju na-echè kwa na ha ga-emerụ onwe ha ọ bụrụ na ha na ndị Rom emekọrịta ihe.

Baa N’Ala Niile

Agwawo ndị ná-eso ụzọ Jisọs tupu Ya alaghachị n’Eluigwe na ha ga-ekwusa Oziọma ahụ n’ala niile, ma ha aghọtaghị na nke ahụ jikọtara ikwusara ndị Rom na Ndị Mbaọzọ niile. Ndị Ju gbasasịrị n’ọtụtụ obodo, ha nwekwara ike ichè na ọ bụrụ na ha ekwusaara ha n’ala niile, na ha na-emezu Iwu Ukwu ahụ: “Ganu n’uwa nile, kwusara ihe nile ekèrè èkè ozi-ọma nkem” (Mak 16:15).

Ngwa ngwa ọ batara nime ụlọ ahụ, Pita kowaara Kọniliọs na n’okpuru Iwu ndị Ju onye Ju ekwesịghị ịbànye n’èzínaụlọ onye agha ndị Rom ma ọ bụrụ na Chineke chọrọ ka Pita mee ihe dị ichè, o jikeere irubeisi. Ọ bụrụ na Chineke sịrị, “Je kwusaara onye-agha onye Mba-ọzọ,” ọ ga-eje. Ọ bụ kwa nke a mere Pita ji bịa ịgwa Kọniliọs banyere Oziọma nke Jisọs Kraist.

Ọlụ nke Eziomume

Kọniliọs abụghị onyeagha Rom efù. Ọ dịghị efè chi nke ndị Rom òfùfè, Kama ọ na-efè ezi Chineke òfùfè n’ikwesị ntụkwasịobi. Ya na èzínaụlọ ya niile na-ekpe ekpere nke ukwuu, ọbụná ha na-ebu kwa ọnụ. Ha dị nsọ, bụrụ kwa mmadụ ndị edoro nsọ, ná-ejégharị kwa n’ìhè niile ha nwetaworo. Ha mere ka òfùfè Chineke bụrụ otù akụkụ dị mkpà ná ndụ ha. Lee kwa óké ngọzi ha natara! Ha bụ ndị mbụ n’etiti Ndị Mbaọzọ natara ọwụwụ mmiri nke Mmụọ Nsọ. Akwụghachịrị ha ụgwọ nke òfùfè ikwesị ntụkwasịobi ha fèrè Chineke. Ha alụwo ọlụ nke eziomume.

Mgbe Pita malitere okwu Chineke o kwuru, ọ sịrị: “N’ezie anamaghọta na Chineke abugh Onye nēle madu anya n’iru: kama nime mba ọ bula onye nātu egwù Ya, onye nāhu kwa ọlu ezi omume, bu onye Ọ nānara nke-ọma” Ọ bụghị náánị na Kọniliọs na-ejégharị nime ụdị ikpere Chineke, kama o gosipụtara na ndụ o biri na ya ná-asọpụrụ Okwu Chineke.

Ndị ná-alụ ọlụ eziomume ka Chineke na-anara nkeọma. Anyị aghaghị igosipụta site n’omume anyị na anyị bụ Ndị Kraist amụworo ọhụụ. Ụmụ mmadụ nwere ike ná-ekwu na ha bụ Ndị Kraist; ma ọ bụrụ na ha na-eme mmehie, Jisọs agaghị anara ha mgbe ha guzoro n’iru Ya n’ikpé. Ọ gaghị akpọbata ha dịka ụmụ Ya.

Àgwà nke akpụkpọ arụ anyị, ego ole anyị nwere, nsọpụrụ ndị enyi anyị na-enye anyị, apụghị ime ka amata ma aga anabata ma ọ bụ na agaghị anabata anyị n’Eluigwe. Anyị aghaghị ịmị mkpụrụ nke Mmụọ Nsọ, nke bụ ịhụn’anya, ọñụ, udo, ogologo ntachịobi, obiọma, ịdị mma, ikwesị ntụkwasịobi, ịdị nwayọ, imeru ihe n’ókè. Mgbe Jisọs hụrụ mkpụrụ ndịa nime anyị, Ọ ga-asị, “I mere nke-ọma, ezi orù nke kwesiri ka atukwasi gi obi: ba n’ọñu nke onye-nwwe-gi.” Ọ ga anabata anyị. Ọ bụghị na anyị ga-echère ruo mgbe anyị ruru n’eluigwe ka ewee nabata anyị. Ọbụná nime ụwa a, ọ bụrụ na azọpụta anyị, Onyenwe anyị na-enwe anyị dịka ụmụ Ya na-awụsa kwa ụmụ Ya dị Ya n’obi ngọzi Ya. Ọbụná ekpere anyị na-adị Ya ụtọ mgbe anyị kpere site n’obi nke ná-enweghị mmehie.

Mkwupụta Nke Jọn

Egwù atụghị Pita ikwusara Ndị Mbaọzọ ahụ. Ọ gwara ha banyere Jisọs, onye Jọn Onye ọwụmmiri kwupụtara. Okwu Chineke Jọn kwururị bụ, “Chègharianu, n’ihi na alaeze eluigwe di nso.” Emesịa mgbe Jisọs bịara ka awụọ Ya mmiri, Jọn tiri mkpu sị, “Le, Nwa-aturu Chineke, Nke nēbupu nmehie nke uwa.” N’ụbọchị ahụ Mmụọ Nsọ adakwasịwo Jisọs, ná-ete Ya mmanụ n’ihi ọlụ nke Ọ ga-alụ n’etiti mmadụ mgbe Ọ nọ n’ụwa. Ọ gwọwo ndịọrịa, nyeghachị ndị kpuru isi ịhụ ụzọ ha, kasie ndị arapụrụ náánị ha na ndị daara mbà n’obi. Pita sịrị na O “jèghariri nālu ọlu ọma.”

Ọ bụ na mmadụ niile agaghị achọ ịmara Onye nzọpụta dị otú a? N’ezie Ndị Mbaọzọ kwa ga-achọ inwe Ya dịka Onyenwe ha. Jisọs asịwo na Ya pụrụ ime ihe ịrịba-àmà ukwu niile ahụ n’ihi na Chineke nọnyeere Ya.

Ike sitere N’Eluigwe

Jisọs bụ ihe nlereanya nye anyị, Ọ chọkwara ka anyị ná-enyere ndị ọzọ aka n’aha Ya. Anyị pụrụ ime ya ọ bụrụ na anyị nwere ike nke Mmụọ Nsọ ná ndụ anyị. Jisọs sịrị: “Unu gānata ike, mgbe Mọ Nsọ gādakwasiwori unu” (Ọlu Ndi-ozi 1:8). Dịka Jisọs nọgidere ná mmekọrịta Ya na Nna mgbe niile, otú ahụ anyị aghaghị ịná ekpe ekpere nke ukwu ná-anọ kwa Chineke ezi nso ọ bụrụ na anyị na-ele anya ịlụ ọlụ nke ọ chọrọ ka anyị lụọ.

Ike anyị ji alụrụ Jisọs ọlụ na-abia site n’Eluigwe. Anyị apụghị ime ihe ọ bụla n’onwe anyị. Jisọs kwuru banyere Onwe Ya sị, “Ọkpara apugh ime ihe ọ bula n’Onwe-ya, ma-ọbugh ihe Ọ huru na Nna-Ya nēme: n’ihi na ihe ọ bula Ya onwe-ya nēme, ndia ka Ọkpara-Ya nēme kwa otú ahu” (Jọn 5:19). Ọ bụrụ na Jisọs na Nna bụ otù rue na Jisọs apụghị ịlụ ọlụ n’Onwe Ya, lee otú ọdị mkpà na anyị aghaghị ịnata ike site na Chineke ka anyị wee lụara Ya ọlụ.

“Ọ mar’otú m’nāchọ ịkpọta nd’ike gwụrụ,

Ya mer’Ọ sịm jee gwa h’okw’ịhụ-n’anya Ya;

Ọ sịm jee gwa h’okw’ebub’ahụ mer’O ji bịa nwụọ,

Ay’nālụkọt’ọlụ mụ na Onye-nwem.”

Ịbụ Chineke Nke Kraist

Otù ihe kachasị mkpà nke dị na mkwusa nke ndị ná-eso ụzọ Jisọs bụ eziokwu ahụ na Jisọs bụ Ọkpara Chineke dị nsọ. Ebe ọ bụla ha jere ha na-ekwu banyere ọnwụ ọjọọ nke Jisọs nwụrụ site n’aka ndị Ju, ma na O biliwo kwa ọzọ n’ụbọchị nke atọ. Ọ dịghị onye amụma ọzọ, ọ dịghị onyeisi okpukpé nke dị ukwu siworo ná ndị nwụrụ anwụ bilie. Ná-enweghị obi abụọ ọ bụla, Jisọs bụ Ọkpara Chineke. Jisọs bilikwara ọ bụghị náánị dịka mmụọ, kama O yikwasịrị anụ-arụ. Ya na ha erikọwo ihe, ha ejidewo kwa arụ Ya aka. N’ezie O biliwo n’anụ-arụ. N’ezie nke a bụ Ọkpara Chineke!

Onye Ikpé Ukwu

Jisọs jègharịrị n’etiti mmadụ dịka mmadụ, Ọ kuzikwara na Ya apụghị ime ihe ọ bụla ma Nna anọghị ya. Otú ọ dị, O nyere ndị ná-eso ụzọ ya iwu ikwusa na otù ụbọchị Ya Onwe ya, Jisọs, ga-ekpé ụwa ikpé. Nna gaje inyefe ikpé niile n’aka Ya. Jisọs nke a, Onye jègharịworo n’obi ume-ala n’elu ụwa, gaje ịbụ Onye ikpé nke ụwa niile -- na Eluigwe kwa. Lee otú ọ dị mkpà nke ukwuu na anyị ga-abụrụ ndị enyi Jisọs ugbu a Ọ na-akpọ anyị n’ebere. Oge ga-aganarịwo anyị ichigharịkwuru Ya mgbe Ọ ga-abịa dịka Onyeikpé.

N’oge ikpé ọbụ Jisọs ga-ekewa n’etiti ndị nsọ na ndị mmehie. Ọ ga-eme ka ndị niile nwụrụ anwụ dị ndụ ọzọ ka ewee kpee ha ikpé; Ọ ga-akwụghachị kwa ha ụgwọọlụ dịka ọlụ ha si dị (Nkpughe 20:12, 13). Otù Jisọs ahụ onye ndị Ju kpọgburu n’obe ga-abịa dịka Eze kachasị ndị eze niile na Onyenwenụ kachasị ndị nwenụ niile. Mgbe ahụ ndị niile jụworo Jisọs ga-ákwá ákwá ru kwa uju nime mmehie ha, ma ha ga-anụ okwu ahụ dị óké egwù: “Ọ digh mgbe ọ bula M’mara unu: si n’ebe M’nọ pua, unu ndi nālu ọlu nēmebi iwu” (Matiu 7:23).

Kọniliọs Ñụrịrị Ọñụ

Lee otú Kọniliọs na ndịenyi ya jikeere ikwere ná mkwusa nke Pita! Lee otú obi tọrọ ha ụtọ na ha onweha kwa, pụrụ ịbụ ndịenyì Jisọs wee binye kwara Ya ebighịebi! Ha ga-anọ n’Alaeze nke Kraist mgbe Ọ ga-abịa ịmalite ọchịchị Ya n’elu ụwa, ha ga-enwe kwa ọñụ na ngọzi niile Jisọs jeworo idoziri ndị hụrụ ya n’anya.

Ọ bụworo Pita ihe nwuta na ọtụtụ ndị Ju na-ekpé okpukpé atụfuwo ngọzi ahụ n’ihi na ha ekweghị na Jisọs; ma ugbu a agbara ya ume mgbe Kọniliọs na ndị òtù ya kweere. Ha ejikerewo obi ha maka oge hour nke a mgbe ha ga-anụ eziokwu ukwu ahụ nke ndịamụma kwuworo banyere ya, na nke ọbụná ndị mmụọ ozi chọsiri ike ịmara omimi ya -- mwụpụ nke Mmụọ Nsọ. Ka ha gere ntị n’ihe niile Pita kwuru, ha ji obi ha niile kwere, Mmụọ Nsọ wee dakwasị ha.

Arọ asaa ma ọ bụ asatọ agafewo site n’Ụbọchị Pentikọst, mgbe narị na iri mmadụ abụọ ahụ nọ n’ụlọ elu natara Mmụọ Nsọ. Mgbe emesịrị, ụfọdụ mmadụ natara Ya na Sameria. Ugbu a kwa ana awụsa ya Ndị Mbaọzọ, igosipụta eziokwu dị n’amụma nke Joel, “O gēru kwa ma emesia, na M’gāwusa Mọm n’aru anu-aru nile bú madu” (Joel 2:28). O juru ndị Ju ha na Pita nọ anya. Ọ bụ ihe ga-eme eme na Ndị Mbaọzọ pụrụ ịnata ọwụwụ mmiri nke Mmụọ Nsọ? Hà dị mma rue otú ahụ? Mmụọ Nsọ, Ọ ga-adakwasị ndịọzọ ná-abụghị olenaole arọpụtara?

Lee óké obiụtọ anyị nwere na mkwà ahụ dịrị “anu-aru nile, bú madu!” Onye ọ bụla ná-alụ ọlụ eziomume -- edozuru nsọ -- kwesịrị ịnata ọwụwụmmiri nke Mmụọ Nsọ. “N’ihi na unu ka nkwà nka diri, na umu-unu, na ndi nile nọ n’ebe di anya. Ka ha ra bú ndi Onye-nwe-ayi Chineke-ayi gākpọtara Onwe-ya” (Ọlu Ndi-ozi 2:39).

Ndị Ju apụghị ịrụ-ụkà na Ndị Rom anatawo Mmụọ Nsọ, n’ihi na ha nụrụ ka ha na-ekwu okwu ná asụsụ dị iche (ná asụsụ dị iche site na nke ha maara), ọbụná dịka narị na iri mmadụ abụọ ahụ mere n’Ụbọchị Pentikọst.

Ọwụwụmmiri nke Mmiri

Ugbu a azọpụtawo Ndị Rom, doo ha nsọ, nye kwa ha ọwụwụmmiri nke Mmụọ Nsọ, ma awụbeghị ha mmiri nke mmiri. Agbagharawo mmehie ha; edowo kwa ha nsọ; ha anatawo kwa otite mmanụ sitere na Chineke. Gịnị mekwara o ji dị mkpà ime ha Ọwụwụ mmiri nke mmiri? Ọwụwụmmiri nke mmiri anyị na-eme bụ ihe-àmà anyị nye ụwa na anyị aghọwo ndị ná-eso ụzọ Kraist. Onye Kraist ọ bụla amụrụ ọhụụ kwesịrị ka awụọ ya mmiri nke mmiri ngwa ngwa o nwere ohere. Ọ dịghị mkpà na ọ ga-eche rue mgbe edoro ya nsọ nye kwa ya ọwụwụmmiri nke Mmụọ Nsọ. Ngwa ngwa azọpụatara ya ọ burụwo onye ekère ọhụụ nime Kraist; ọ na-egosi kwa ụwa site na ọwụwụmmiri nke mmiri na ya abụrụwo Onye Kraist ugbu a. Mgbe Pita nyere iwu ka awụọ ha mmiri n’aha Jisọs, ihe okwu ya pụtara bụ ka emee ya dịka Jisọs nyeworo n’iwu -- n’aha nke Nna, na nke Ọkpara na nke Mmụọ Nsọ. Nke a bụ ná nchèta nke ọnwụ, òlìlì, na mbiliten’ọnwụ nke Jisọs; ná-eme kwa ka anyị ghọta na anyị anwụwo n’ebe mmehie dị wee bilite kwa ná-ejègharị ná ndụ ọhụụ.

Mgbe Pita laghachịrị n’ụlọ ya, ọ rapụrụ òtù siri ike nke ndị kwere ekwe n’etiti Ndị Mbaọzọ n’èzínaụlọ Kọniliọs.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Gịnị ka Kọniliọs mere mgbe ọ nụrụ na Pita na-abịa?
  2. Gịnị ka Ndị Ju chère banyere Ndị Rom?
  3. Gịnị mere Pita ji jee ịgwa Kọniliọs okwu Chineke?
  4. Kọwaa okpukpé Kọniliọs na ndị ya.
  5. Gịnị bụ okwu mbụ Pita malitere ikwu mgbe ọ na-agwa Kọniliọs okwu Chineke?
  6. Ònye bụ onye Chineke na-anara nkeọma?
  7. Gịnị ga-abụ ọnọdụ Kraist mgbe Ọ ga-abịa ọzọ?
  8. Gịnị mere Kọniliọs na ndị ya mgbe ha nabatara mkwusa nke Pita?