Lesson 304 - Junior
Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISI: “Ọtutu gēsi n’ọwuwa-anyanwu na ọdida-anyanwu bia, so kwa Abraham, na Aisak, na Jekob, nānọdu n’alaeze elu-igwe” (Matiu 8:11).Notes
Site na Ọwụwa-anyanwụ na Ọdịda-anyanwụ
Ọ bụ ihe siiri ndị Ju ike nke ukwu ikwere na Oziọma nke Jisos dịkwara Ndị Mbaọzọ. O were Pita ịhụ ọhụụ sitere n’Eluigwe ka o wee kwere ya. Ndị nsọ ndị soro ya jee n’ụlọ Kọniliọs, onye ọchịagha, ná-achị narị ndịagha anụwo ka ndị Rom ahụ na-ekwu okwu n’asụsụ dị iche dịka ihe-àmà na ha anatawo Mmụọ Nsọ; mgbe ahụ ndị ha na Pita so wee kwere. Ma otú ọ dị ndị Ju ka na-atụgharị uche ma ọ pụrụ ịbụ eziokwu.
Ọ dịkwara ọchịagha na-achị narị ndịagha ọzọ, mgbe Jisọs nọ n’ụwa, onye kwere na Ya. Mgbe nwa ya rịara ọrịa rue n’ọnwụ, ọchịagha ahụ ná-achị naarị ndịagha abịakwutewo Jisọs maka inyeaka. O juru ndị ná-eso ụzọ Ya anya ma Jisọs Ọ ga-agwọ onye ná-amaghị Chineke, ma Ọ gwawo ha sị: “Asim unu, na ọtutu madu gēsi n’ọwuwa-anyanwu na ọdida-anyanwu bia, so kwa Abraham, na Aisak, na Jekob, nānọdu n’ala-eze elu-igwe” (Matiu 8:11). N’ụzọ dị otú a Jisọs gwara ndị ná-eso ụzọ Ya na ọtụtụ ndị ga-anọ n’Eluigwe ma ewezuga ndị Ju. Ha ga-adị ukwu dịka Nna Abraham, so kwa Aisak na Jekob natakọọ ụgwọọlụ. Ma ndị ná-eso ụzọ Ya aghọtaghị ya.
Otù aka ahụ, ndị Ju chègharịworo, ndị nọ na Jerusalem aghọtaghị kwa eziokwu ahụ na Ndị Mbaọzọ pụrụ ịbụ Ndị Kraist. Ha chère na Pita emerụwo onwe ya site n’isoro Kọniliọs na ndị enyi ya rie nri.
Ọhụ Pita
Pita wee kọọ akụkọ niile ahụ ọzọ, otú ọ hụworo ọhụụ nke otù ákwà ọcha ewedara site n’Eluigwe nke anụ ụkwụ anọ dị iche iche, na ihe niile Iwu kpọrọ ihe ná-adịghị ọcha na ndị dị ọcha. Ọ nụwo otù olu nke sịrị, “Pita bilie; gbue, ri kwa.” Pita naanụ ọkụn’obi dịka onye Ju ọ bụla ọzọ; mgbe ọ zaghachịkwara, ọzịzá ya pụtara “Apughim.” Ọ dịghị mgbe ọ bụla o riri ihe ọ bụla Iwu gụrụ n’ihe ná-adịghị ọcha. Ma Chineke gosịrị ya na ọ bụrụ na Ya sịrị na ihe ọ bụla dị ọcha, Pita ekwesịghị ịkpọ ya ihe ná-adịghị ọcha.
Ọ bụ ezie na Chineke enyewo iwu ahụ nke kpọrọ anụmanụ ụfọdụ anụ ná-adịghị ọcha; ma n’ebe a bụ ihe-àmà ọzọ naegosi na emezuwo Iwu ahụ, na o nweghị kwa ike n’ebe Onye Kraist nọ. Ụdị na ememe niile nke enyere ndị Israel dịka ihe-atụ ikuziri ha ihe banyere Jisọs na Oziọma nke Ọ ga-eweta adịghị kwa mkpà. Jisọs n’Onwe Ya abịawo, ihe-atụ adịghị kwa mkpà ọzọ. Ụdị anụ mmadụ riri adịghị agbanwe ọnọdụ obi ya. Ọ bụrụ na ọ bụ onye mmehie, erighị anụ agaghị eme ka ọ bụrụ Onye Kraist (Matiu 15:17-19).
Eleghị Mmadụ Anya N’iru
Pita atụghariwo uche n’ihe ọmụmụ enwere ike ịkuziri ya site n’ọhụụ ahụ nke karịrị náánị iri anụ. Mgbe ndịagha siri n’ụlọ Kọniliọs bịa, Pita malitere ichè échìchè banyere ihe dị iche n’etiti ndị dị ọcha na ndị ná-adịghị ọcha -- dịka ndị Ju kwere na ihe dị iche dị. Ọ ghọtara na enyere ya ọhụụ ahụ iji kuziere ya na o kwesịghị ịkpọ onye Chineke sachaworo onye “na-adigh ọcha.” Chineke enyewo mmadụ niile ohere inwe nzọpụta ọ bụrụ na ha ga-arapụ mmehie niile ha.
Pita akpọrọwo ndịàmà isii tinyere onwe ya mgbe o jere n’ụlọ Kọniliọs. Ọ bụ ihe dị mma mgbe anyị nwere mmetụta na anyị aghaghị ime ihe ụfọdụ ga-eweta ajụjụ, ka anyị kpọrọ ndịàmà. Pita jiri ntachịobi kọwaa ihe niile ọ nwapụtara n’ụlọ Kọniliọs bụ onye Mbaọzọ kwere ekwe, afọ wee ju ndịnsọ bụ ndị Ju. Ha pụrụ ịhụta n’ezie na ọ bụ Chineke zigara ya. Mgbe ha nụkwara na Ndị Mbaọzọ anatawo Mmụọ Nsọ, ha ñụrịkwara ọñụ.
Ịgbasa Ozi ahụ
Aghaghị ịgbasa Oziọma ahụ. Ọ bụghị náánị na aga-awụpụ Mmụọ Nsọ na Jerusalem na obodo niile nọ ya gburugburu, ma ozi nke Oziọma ka ana-aghaghị iburu jee ala ọzọ dị iche iche. O nwere ike bụrụ na Ndị Kraist ejebèghị ijè dị anya, nke kachasị, ha ga-enweworị afọojuju ibigide ebe ahụ ha nọ rue oge ọnwụ ha. Rue ọtụtụ ọgbọ, otù èzínaụlọ ga-ebigide n’otù ala. Ma ugbu a ha nwere ọñụ n’akụkọ dị ndụ ha nwere ịkọ. Ha aghaghị ịnọ n’ụzọ ha ikwusa Oziọma ahụ. Ozi nke nzọpụta ka ana-aghaghị ikwusa site n’okwu ọnụ na site ná ndụ nke Ndị Kraist naebi n’etiti ndị ana-azọpụtabeghị nọ n’ebe dị iche iche dị anya.
Mkpagbu
Mgbe atụsịrị Stifen nkume, óké mkpagbu malitere wee chụpụ Ndị Kraist na Jerusalem. Mgbe ụfọdụ ha na-eje ijè dị anya n’ihi na, dịka Pọl (onye ákà na akpọ Sọl n’oge a) kwuru banyere onwe ya mgbe emesịrị sị, “M’we nēsogbu ha we rue obodo di iche iche di n’azu ala-ayi.” Enwekwara ọtụtụ ndị ọzọ dị ka Pọl dị tupu azọpụta ya, ha na-agbalịsi kwa ike ịchụpụ ma ọ bụ inye ndị niile kwere na Jisọs ahụhụ. Ị pụrụ ichè otú mmadụ ga-esi chọọ imeso Jisọs na ndị ná-eso ụzọ Ya otú ahụ, mgbe ha ná-emeghị ihe ọzọ ma ọ bụghị ezi ihe?
Ebe ọ bụla Ndị Kraist ahụ ana-akpagbu jere, ha na-ekwusa banyere Jisọs -- ma ọ ka bụ nye náánị Ndị Ju. Eleghịanya ndị ka n’ọnụ ọgụgụ ha anụbeghị ihe banyere njèm Pita jere n’ụlọ Kọniliọs, ha ákàamataghị na Oziọma dịrị mmadụ niile.
Jisọs eziwo ndị ná-eso ụzọ Ya ka ha jee n’ụwa niile ikwusa Oziọma, kwee kwa mkwà sị, “Le, Mu onwem nọyere unu ubọchi nile, rue ọgwugwu oge a.”
Aka Chineke dị N’arụ Ha
Mgbe Jisọs kwere mkwà na Ya ga-esoro ndị Ya jee, Ọ gwara ha na aghaghị ibu ụzọ mejue ha n’ike sitere n’Eluigwe. Ike ahụ soro ọwụwụmmiri nke Mmụọ Nsọ bịa. Mgbe ndị ná-eso ụzọ Ya kwusara n’obodo niile nke Saiprọs, Finisia, na Antọk, ha nwere ike ahụ, na “aka Onye-nwe-ayi we so ha.” Ná-agbanyeghị otú ndị ahụ ga-ekwusaworị ihe banyere Jisọs, ọ bụrụ na Mmụọ Chineke esoghị ha ná-alụkọ ọlụ, agaghị azọpụtaworị mkpụrụobi. Pọl mesịrị were ijéozi ya tụnyere nke Apọlọs wee sị: “Mu onwem kuru osisi, Apọlọs kwọsara ya miri; ma ọ bu Chineke nēme ka ọ nāba uba” (I Ndi Kọrint 3:6). Ọ dịghị ihe ọ bụla anyị meere Chineke bara urù, náánị ma anyị mere ya ná nduzi nke Mmụọ Chineke.
Azọpụtara mkpụrụobi n’obodo niile ahụ dị anya n’ihi na ndịozi na ndịọlụ niile ahụ kpere ekpere nke ukwu, Mmụọ Chineke wee pụ ịgwá obi nke ndị mmehie okwu site n’ọnụ ha. Okwu ekwuru nkeọma nwere ike dị uche mma, ma ọ bụ Mmụọ Chineke na-emetụ obi. Mgbe anyị na-agbalị ịgwá mmadụ na Jisọs pụrụ ịzọpụta ya site ná mmehie niile ya, anyị onwe anyị aghaghị inwe Mmụọ Chineke ná ndụ anyị ka okwu anyị niile wee metụ ya n’obi.
Chineke na-enye Mmụọ ahụ n’ọtụtụ dị ukwu mgbe anyị natara ọwụwụmmiri nke Mmụọ Nsọ; ma anyị aghaghị ịnọgide n’ịrịọ ngọzi Chineke n’ọlụ anyị niile, nọgide kwa n’iji ihe niile anyị nwere ná-achụ àjà nye Ya, ka anyị wee hụ ka Chineke na-esite na anyị ná-alụ ọlụ. Ọtụtụ mgbe anyị anụwo ka ana-ekwu sị, “Adịghị alụpụta ntute n’ọlụ, kama ana-ekpedata ya site n’ekpere.” Ka ndị nke Chineke ná-enwe ibu-arọ nke ekpere n’obi ha mgbe niile n’ihi nzọpụta nke ndị furu efu!
Nzukọ Niile N’Antiọk
Antiọk dị narị maịlị atọ n’akụkụ ebe ugwu nke Jerusalem, nke bụ ogologo njèm nye ndị ji ụkwu ná-aga. Ma nime obodo ukwu ahụ ọtụtụ mmadụ dị ndị kweere na mkwusa nke ndị ná-eso ụzọ Jisọs, óké ntute wee malite. Mgbe ndị kwere ekwe nọ ná Jerusalem nụrụ banyere ya, ha zigara Banabas ka o jee bụrụ onye mkwusa njègharị iduzi òfùfè ha. Banabas nwere obiụtọ ịhụ ka ana-azọpụta ọtụtụ mmadụ ná ike Chineke ka ọ na-abịakwasị ha; o wee jee Tasọs ịchọ Pọl ka ọ bịa nyere ya aka ná nzukọ niile ahụ.
Pọl na Banabas bụ ezi ndị ná-alụkọ ọlụ mgbasa Oziọma. Ha nọkwara otù ogologo arọ n’Antiọk, ná-ekwusa n’ike dị ukwu na-azọpụtara óké igwè mmadụ. Ewulikwara ha onwe ha elu n’okwukwe, ha wee jikere maka ọlụ ahụ. Ka ha na ndị ọzọ nọ n’ụlọ Nzukọ ná-ekpe ekpere ná-ebu kwa ọnụ, Mmụọ Nsọ sịrị: “Kewaputaram Banabas na Sọl ilu ọlu nke M’kpọworo ha ka ha lua” (Ọlu Ndi-ozi 13:2). Nke ahụ pụtaara na ha ga-abụ ndịozi nye Ndị Mbaọzọ. Emere ka ụzọ ghere oghe ka onye ọ bụla nwee ike ịnụ Oziọma wee nwee kwa nzọpụta.
NdịKriast
Ọ bụ n’Antiọk ka eburu ụzọ kpọọ ndị ná-eso ụzọ Kraist Ndị Kriast. Ka anyị ndị ná-asị na anyị bụ ndị Kriast lezie anya hụ na anyị ná-eso Kraist ná-ebi kwa ndụ anyị otú ọ gaghị eme Ya ihere ịkpọ anyị nke Ya.
Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE- Gịnị ka ọchịagha ná-achị narị ndịagha pụtara?
- Òlee otú Onyenwe anyị siworo mee ka Pita mata na apụrụ ịzọpụta Ndị Mbaọzọ?
- Gịnị mere ka ndịenyi Pita kwere na apụrụ ịzọpụta Ndị Mbaọzọ?
- Gịnị mere ndị ná-eso ụzọ Jisọs ji rapụ Jerusalem?
- Gịnị ka ha na-eme ebe ọ bụla ha jeruru?
- Ònye jere Antiọk ime ka nzukọ guzosie ike?
- Òlee otú Pọl na Banabas ji mata na ha ga-abụ ndị mkwusa nye Ndị Mbaozọ?
- Ogologo oge ra añaa ka Pọl na Banabas nọgidere n’Antiọk?
- Gịnị ka okwu a bụ “Kristian” pụtara?
- Òlee ebe mbụ ekwuru okwu a bụ “Kristian”?