I Ndi Eze 22:1-40

Lesson 305 - Junior

Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISI: “Unu ekwela ka eduhie unu; Chineke abugh onye anēleli: n’ihi na nkpuru ọ bula madu nāgha, nke ahu ka ọ gēweta kwa n’ubi” (Ndi Galetia 6:7).
Notes

Ná-enweghị Agha

Ọtụtụ agha adịwo n’etiti Ụmụ Israel na ndị Siria. N’oge ọchịchị Ehab, emeriri Ben-hedad bụ Eze ndị Siria. Ya mere nime ogologo arọ atọ agha ọ bụla adịghị n’etiti mba abụọ ndịa. Nime oge udo a, Ehab malitere ịtụ àtụmààtụ otú ọ ga-esi nweta obodo Remot-gilead site n’aka ndị Siria. Ehab nwere mmetụta na ọ bụ Israel nwe ya. Ọtụtụ arọ gara aga Moses kwuru na Remot-gilead bụ obodo mgbaba, nke dị n’ọwụwa-anyanwụ nke Osimmiri Jọdan (Ihe ọmụmụ 139). Obodo Remot-gilead bụ otù akụkụ nime ihe nketa nke Gad (Deuteronomi 4:43). Nke a bụ obodo nke Ehab tụrụ àtụmààtụ ịnapụta n’aka ndị Siria.

Jehoram bụ nwa Jehoshafat eze Juda, na alụ nwa nwanyị Ehab na nwunye (2 Ihe Emere 21:6). Jehoshafat jere ileta Ehab, n’oge ahụ Ehab gburu ọtụtụ atụrụ na ehi wee mee óké oriri. Ehab mesoro Jehoshafat na ndị ya nkeọma. Ehab wee rugide Jehoshafat isoro ya jee agha ka o wee nweta Remot-gilead.

Otù Mkwekọrịta

Jehoshafat kwere isoro Ehab jee agha. Jehoshafat sịrị “Dika m’di, otú a ka i di, ndim di kwa ka ndi-gi, ayi gānọye-kwa-ra gi n’agha ahu” (2 Ihe Emere 18:3). Nke a bụ ihe ná-ekwesịghị ka ekwuo, n’ihi na eze abụọ ahụ dị iche otù n’ebe ibe ya nọ. Nime ihe ọmụmụ anyị banyere ọchịchị nke Ehab, anyị amụtawo na Ehab fère arụsị mee kwa ihe ọjọọ site n’ịlụ ọlụ mmebi iwu n’anya Jehova (I Ndi Eze 21:20, 25). N’akụkụ nke ọzọ, anyị gụtara na Jehoshafat chọrọ Jehova, “jeghari kwa n’ihe nile Ọ nyere n’iwu,” wee kwatuo ebe niile dị elu nke ikpere arụsị (2 Ihe Emere 17:3-6). Jehoshafat wee mee onwe ya ka ọ dị ike megide Israel. O debere ndịagha nime obodo niile agbara ogige, mee kwa ka ụsụ ndịagha guzo onwe ha n’ala Juda ichèbe ya. Chineke jiri àkụ na nsọpụrụ bara ụba gọzie Jehoshafat.

Ọ bụghị náánị na o kwesịghị ka Jehoshafat soro Ehab bànye ná mkwekọrịta dị otú a, kama ọ bụ ihe jọgburu onwe ya. Anyị hụrụ otú esi rafuo Jehoshafat ime ihe ọjọọ n’ihi na ya na Ehab jọgburu onwe ya nwere mmekọrịta mgbe ọ ná-ekwesịghị. Chineke adọwo ndị Ya aka-ná-ntị ka ha ghara ịbụ enyi ndị ná-ekpere arụsị ka ewee ghara ime ka ha mehie megide Jehova (Ọpupu 23:33). Chineke agwawo ha ka ha na ndị ná-ekpere arụsị ghara ime ọgbụgba-ndụ n’ihi na ndị ná-ekpere arụsị ga-abụ ọnyà (Ọpupu 34:12).

Ọnyà

Chineke na-achọ ka ndị Ya taa wezuga onwe ha site ná mkpakọrịta ọjọọ niile. Anyị hụrụ ndụm-ọdụ nke a nime Okwu Chineke: “Abàla n’okporo-uzọ ndi nēmebi iwu, aga-kwa-la n’iru n’uzọ ndi ọjọ” (Ilu 4:14). Onye dere Abù Ọma sịrị: “Onye ihe nāgara nke-ọma ka madu ahu bu nke nējegh ije na ndum-ọdu ndi nēmebi iwu, nke nēguzogh kwa n’uzọ ndi nmehie, nke nānọgh kwa n’ọnọdu ndi nākwa emò” (Abù Ọma 1:1). Nime Testament Ọhụụ agwara anyị sị: “Unu na ndi nēkwegh ekwe ekekọtala onwe-unu” (2 Ndi Kọrint 6:14), ndị mewororị otú a -- n’ịzụ-ahịa, ọlụlụ di na nwunye, ma ọ bụ mmekọrịta ná-ekwesịghị ekwesị -- achọpụtawo na ọ bụ ọnyà. Mkwekọrịta nke a Jehoshafat na onye kpọrọ Chineke asị nwere wetaara ya iwe Chineke na ọnyà. Jihu, bụ nwa nke onye amụma jụrụ Jehoshafat sị, “Ọ bu kwa ndi nākpọ JEHOVA asi ka i nāhu n’anya? ma n’ihi ihe a iwe dikwasi gi site n’iru JEHOVA” (2 Ihe Emere 19:2).

Ndịamụma Ụgha

Mgbe Jehoshafat kweresịrị inyere Ehab aka, Jehoshafat wee chọọ ịjụta ihe banyere okwu ahụ n’ebe Jehova nọ. Ehab wee zie ka akpọọ ndị amụma ụgha ya dị narị anọ (400). Ha wee mee ka o doo ndịeze ahụ anya na Jehova ga-arara Remot-gilead nye ha n’aka. Ọ bụ ezie na narị ndịamụma anọ kwuru otù ihe ahụ, Jehoshafat matara na ha abụghị ezi ndịamụma nke Jehova. Ọ bụrụ na anyị hụrụ Onyenwe anyị n’anya n’ezie ná-erube kwara Ya isi, Ọ ga-eme kwa ka anyị mata ndị ná-ekwu eziokwu na ndị ná-adịghị ekwu eziokwu: “Ọ buru na unu onwe-unu anọgide n’okwum, unu bu ndi nēso uzọm n’ezie; unu gamara kwa ezi-okwu, ezi-okwu gēme ka unu pua n’orù” (Jọn 8:31, 32). Ndịa bụ okwu Onyenwe anyị nke Devid kwuru: “M’gēme ka i nwe uche, M’gēzi kwa gi ihe n’uzọ nke i gēje ije nime ya: M’gādu gi ọdu, anyam gādikwasi kwa gi n’aru” (Abù Ọma 32:8).

Jehoshafat jụrụ ma ọ dịghị onye amụma Jehova ọzọ fọdụrụ nke pụrụ ịjụrụ ha asè. Ọ dị otù nwoke aha ya bụ Maikaia, ma Ehab kpọrọ ya asị n’ihi na ọ dịghị ebu amụma ezi ihe banyere Ehab. Ezi onye amụma apụghị ikwu ezi ihe banyere onye ajọomume, ma Ehab chọrọ inụ “ezi ihe” kama ịnụ eziokwu.

Irubere Chineke Isi

Otù onyeozi jere kpọta Maikaia. N’ụzọ ka ọ nọ gwa onye amụma ahụ ihe ndịamụma niile ọzọ kwuwororị. O wee gbalịa ịkwagide Maikaia ka o kwuo dịka ndịọzọ kwuworo. Maikaia bụ ezi onye amụma. Náánị okwu niile Jehova gwara ya ka ọ pụrụ ikwu. O wee sị, “JEHOVA nādi ndu, n’ezie ihe JEHOVA gāsim, nke ahu ka m’gēkwu.” Ihe ná-adịkarị ndị nke Chineke mkpà bụ ime ihe ga-atọ Chineke ụtọ karịa ime omume ma ọ bụ ikwu okwu ga-atọ mmadụ ụtọ. Mgbe ajụrụ ndị ná-eso ụzọ Jisọs ajụjụ banyere mkwusa ha, ha sịrị, “ Ayi aghagh ikweyere Chineke kari madu” (Ọlu Ndi-ozi 5:29).

Ehab na Jehoshafat wee yikwasị uwe eze ha nọkwasị kwa n’elu oche eze n’akụkụ ọnụ-ụzọ ama Sameria. N’ebe ahụ ka ha nọdụrụ wee nụ okwu niile nke ndịamụma ụgha. Otù nime ha bụ Zedekaia, enyewo harị ọbụná ihe-àmà na ha ga-emerị n’agha ahụ. O mere mpi igwè, nke na-egosi nsọpụrụ na ike, iji mee ka okwu amụma ya guzosie ike.

Mgbe Maikaia guzoro n’iru ndị eze ahụ, ajụrụ ya otù ajụjụ ahụ ajụrụ ndịọzọ. O nyekwara ha otù ọzịzá ahụ, ma ọ ghaghị ịbụ n’olu ná-egosi ọnụma na ịkwa emò. Eze sịrị na ya achọghị ịnụ ihe ọzọ ma ọbụghị eziokwu n’aha Jehova. Mgbe ahụ Maikaia ziri ha ozi sitere n’ebe Jehova nọ. O wee sị na aga achụsasị Israel ha ewee dị ka atụrụ ná-enweghị onye ọzụzụ. Maikaia gwara ha na Jehova sịrị, “Ọ digh onye nwe ndia; ka ha laghachi nwoke ọ bula n’ulo-ya n’udo” (2 Ihe Emere 18:16).

Atụbara N’ụlọ Mkpọrọ

Ehab wee sị Jehoshafat; “Asighm i na ọ gagh-ebu amuma ezi ihe bayerem, kama ihe ọjọ?” Maikaia gwara ha na mmụọ okwu ụgha dị n’ọnụ ndị amụma ụgha ahụ, Chineke ekwuwo kwa okwu megide izù ha. Okwu Maikaia atọghị ha ụtọ, bụ eziokwu sitere n’ebe Jehova nọ. Ha mere ka ọ hụọ ahụhụ n’ihi ikwu eziokwu. Zedekaia kwuru okwu megide Maikaia wee tie ya aka ná ntị. Ehab wee nye iwu ka etinye Maikaia n’ụlọ mkpọro nye kwa ya náánị iberibe achịcha na mmiri ka ọ ná-eri. Dịka okwu ikpéazụ, Maikaia gwara mmadụ niile nọ n’ebe ahụ ka ha bụrụ ndị àmà, o wee sị Ehab, “Ọ buru na i laghachi ma-ọli n’udo, JEHOVA ekwugh okwu n’ọnum.”

Àtụmààtụ Nke Aka Ha

Jehoshafat chọrọ ịmata ihe bụ obi Jehova banyere nzube ha ibu agha nweta obodo Remot-gilead; ma mgbe ọ chọpụtara, o geghị ntị. O kwesịrị ịjụworị Chineke asè tupu ya na Ehab enwee mkwekọrịta. Ọ dị ụfọdụ mmadụ n’ụbọchị taa ndị ga-ege ntị n’okwu nke Onyenwe anyị ma ha agaghị anara ịdọ aka-ná-ntị sitere na ha. Ụfodụ na-achọ ndụm-ọdụ n’aka ndị ndú ha, ma emesịa ha emee otú dị ha mma -- ná-emeghị dịka ndụm-ọdụ enyere ha si dị.

Ehab na Jehoshafat wee jikere ijé agha ahụ. Ehab nwogharịrị onwe ya, ma ọ sịrị ka Jehoshafat yikwasị uwe eze ya, ná-arụghị ụka, ọ na-ele anya ịnapụta ndụ ya, mee ka Jehoshafat pụta ìhè, iji mee ka okwu niile nke amụma ahụ ghara imezu.

Enyere ndịisi agha Siria iwu ka ha busoo náánị Ehab agha. Nime ọgbọ agha, ha chèrè na Jehoshafat bụ Ehab, ha wee gbaa ya gburugburu. Jehoshafat tiri mkpu, Onyenwe anyị wee nyere ya aka. Ndịagha wee ghọta na ọ bụghị Ehab, ha wee rapụ ya. Ọ fọdụrụ ntakirị ka Jehoshafat tufuo ndụ ya n’ihi na ọ nọdụrụ n’ọnọdụ Ehab. Mgbe Onye Kraist yikwasirị uwe onye mmehie, nọdụ kwa n’ọnọdụ onye mmehie, ọ nọ n’ihe egwù. Náánị ebere Chineke napụtara Jehoshafat, ọ bụ kwa náánị Chineke pụrụ ịnapụta onye nọ n’ebe ná-ekwesịghị ekwesị.

Ọ dịghị Ebe Nchébe dị

N’ezie Ehab chère na ọ ga-ezobe onwe ya site n’inwogharị onwe ya. Ma mmadụ inwogharị onwe ya apụghị izopụ ya n’iru Chineke. Ọ bụ ezie na ndịiro amataghị onye bụ Ehab, ma Onyenwe anyị matara. Ekwuwo ọtụtụ ihe megide Ehab na omume ọjọọ ya niile. Abaworo Ehab mbá ọtụtụ ugbò, o nwewo kwa ohere ichègharị. Maikaia adọwo Ehab aka-ná-ntị na ọ gaghị alata n’udo ọ bụrụ na o jee agha ahụ. Ehab atụkwasighị Chineke obi, o kweghị kwa na Ya. Ehab rọọrọ ikwenyere ndị amụma ụgha tụkwasị kwa arụsị ya obi. Ma okwu niile nke Jehova aghaghị imezu.

Nke a bụ agha ikpeazụ Ehab jere. Otù ọgba-ụta dọrọ ụta ya ná-amaghị ámá o wee gbata Ehab. Emerụrụ ya arụ dị ukwuu, o wee daa nime ụgbọala ya. Onye ná-edu ụgbọala ya wee si n’iru agha gbapụ, Ehab wee nwụọ n’anyasị. Mgbe eze nwụrụ ewee gwa nwoke ọ bụla ka ọ laa n’ụlọ ya. Ndị ahụ enweghị onyendú, ewee chụsasịa ha. Amụma Maikaia wee mezuo. “Ahurum Israel nile ka ha gbasaworo n’ugwu, dika igwè aturu nēnwegh onye-ọzùzù.”

Amụma bụ Eziokwu

Okwu niile nke Elaija mezukwara n’ọnwu Ehab. Mgbe Ehab jere were ubivine Nebot, ezigara Elaija ịgwa ya okwu ndịa: “Otú a ka JEHOVA siri, N’ebe nkita rachara ọbara Nebot ka nkita gāracha ọbara-gi, ọbuná nke gi onwe-gi” (I Ndi Eze 21:19).

Ejiri nkume tụgbuo Nebot n’azụ obodo Jezreel ebe Ehab bi. Eleghịanya Ehab chère na amụma niile nke Elaija na Maikaia agaghị emezu. Maikaia kwuru na Ehab agaghị alata n’agha ahụ megide Remot-gilead. Elaija sịrị na nkịta ga-aracha ọbara Ehab na Sameria. Chineke kwuru okwu site n’ọnụ ndịkom ndịa, amụma niile ahụ wee mezuo. Egburu Ehab n’agha. Ebulatara ya na Sameria wee lie ya. Mgbe asachara ụgbọala ya n’akụkụ ọdọ mmiri Sameria, nkịta nọ n’ebe ahụ ewee mezuo okwu niile nke amụma.

Ebere

Ọ dị ụfọdụ amụma dị nime Baịbụl nke akaemezughị. Ma ha ga-emezu. Anyị gụrụ nime Agba Ochie sị: “Okwu Chineke-ayi gēguzosi ike rue mgbe ebigh-ebi” (Aisaia 40:8); na “JEHOVA, rue mgbe ebigh-ebi ka emeworo ka okwu-Gi guzosie ike n’elu-igwe” (Abù Ọma 119:89). Nime Testament Ọhụụ anyị na-agụ sị: “Okwu Onye-nwe-ayi nādigide rue mgbe ebigh-ebi. Nke a bu kwa okwu nke ozi-ọma ahu ezisara unu” (I Pita 1:25). Ndịa bụ okwu nke Jisọs, “Elu-igwe na uwa gāgabiga, ma okwu nile nkem agagh-agabiga ma-ọli” (Matiu 24:35); na “Rue mgbe elu-igwe na ala gāgabiga, ọ digh otù ihe ọ bula dikariri ntà gāgabiga n’iwu ma-ọli, rue mgbe ihe nile gēme” (Matiu 5:18). Okwu niile nke Baịbụl bụ eziokwu, ha aghaghị kwa imezu. Ụmụ mmadụ pụrụ ịgbalị igbochi ya ma ọ bụ zobe kwa onwe ha, ma Chineke pụrụ ime ihe niile O kwuru.

Ụfọdụ mmadụ na-agbalị ikpuchi mmehie ha n’ebe a, ma Chineke maara banyere ha n’ihi na “ihe nile … buru kwa ihe emegheworo n’anya-Ya, bú Onye ayi gākọrọ akukọ bayere omume-ayi” (Ndi Hibru 4:13). Lee óké urù mmadụ na-erita site n’ikwupụtara Chineke ihe banyere ndụ ya kama ichere ruo mgbe ọ ga-eguzo n’iru oche ikpé nke Chineke! Ọ bụrụ na o kwupụta ugbu a, ọ ga-anata mgbaghara; ma ọbụrụ na o chere ruo ụbọchị ikpé, ebere agaghị adị. “Nmehie madu ufọdu nāputa ìhè, n’ihi na ha buru ha uzọ nāga ikpé; ma nmehie madu ufọdu nēso kwa ha n’azu” (I Timọti 5:24). Náánị ụzọ mmadụ ga-ele anya isite nata ebere bụ site n’ikwupụta, rapụ kwa mmehie ya. “Onye nēkpuchi njehie-ya nile, ọ gagh-agara ya” (Ilu 28:13).

Enweghị Urù

Jehoshafat eritaghị urù ọ bụla site ná nkwekọrịta ya na Ehab bụ ajọ mmadụ. Arafuru ya ime omume megide okwu niile nke amụma sitere na Chineke. Ọ fọdụrụ nke ntà ka ọ tụfuo ndụ ya n’ihi na o nwogharịrị onwe ya wee dị ka Ehab. Jehoshafat apụghị ịchị ndị ya nkeọma mgbe ahụ o jekwuuru Ehab. Ewee bo ya ebubo na ọ na-ahụ ndịiro Jehova n’anya, iwe Chineke wee dịkwasị ya. Otú a ka ọ dị n’ụbọchị taa na mmadụ adịghị erita urù ọ bụla mgbe ọ rọọrọ ijé n’ụzọ nke aka ya karịa irubere Okwu Chineke isi wee nara ndụm-ọdụ site n’ọnụ ndịozi Chineke na nime Baịbụl.

Ụgwọọlụ mmadụ gaanata mgbe ọ na-eguzo n’iru Chineke ga-abụ dịka ụzọ o siri bie ndụ ya n’ebe a si dị. Ọ bụrụ na o biri ndụ dị mma, dịka Okwu Chineke si dị, ọ ga-anata ezi ụgwọọlụ. Ọ bụrụ na ndụ ya jọrọ njọ, dịka Akwụkwọnsọ si kwuo, ụgwọọlụ ya agaghị adị mma, “N’ihi na ugwọ-ọlu nke nmehie bu ọnwu; ma onyinye-amara nke Chineke bu ndu ebigh-ebi nime Kraist Jisus Onye-nwe-ayi” (Ndi Rom 6:23).

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Ònye bụ eze Juda?
  2. Gịnị mere o ji bilie ibuagha megide obodo Remot-gilead?
  3. Gịnị bụ ndụmọdụ ndịamụma Ehab dị narị anọ nyere?
  4. Ònye bụ Maikaia?
  5. Gịnị bụ amụma o buru?
  6. Gịnị mere Ehab ji kpọọ Maikaia asị?
  7. Gịnị mere ndị eze ahụ ji nwoghaa onwe ha n’iru agha?
  8. Gịnị mere eji napụta ndụ Jehoshafat?
  9. Òlee otú esi gbue Ehab n’agha?
  10. Òlee okwu niile nke amụma emezuru n’ọnwụ Ehab?