Lesson 307 - Junior
Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISI: “M’gēkele Gi n’etiti nkpọkọta bara uba: n’etiti òtù ndi nwere ume ka m’gēto Gi” (Abù Ọma 35:18).Notes
Ekele na Otuto
Ka Ụbọchị Inye ekele ruteworo ọzọ, Onye Kraist ọ bụla na-ebuli obi ya n’otuto na ekele nye Chineke n’ihi ngọzi niile gaworo aga. Otú ọ dị, ọ bụghị náánị n’oge izu ike a kama ụbọchị niile nke arọ nwa Chineke na-enye Ya ekele. Amaokwu abụọ butere ụzọ n’Abù Ọma a na-agwa anyị ihe atọ anyị ga-eme: nke mbụ, nye Onyenwe anyị ekele; nke abụọ, bụọ abụ otuto; na nke atọ, igosi ebere Ya. Enyere anyị ndụm-ọdụ ime nke a ụtụtụ na abalị ọ bụla.
N’Ekpere
Ka anyị hụ ụzọ ole dị nke anyị nwere ike isite wee nye Onyenwe anyị otuto. Otù ụzọ bụ ekpere. Mgbe anyị gburu ikpere n’ala n’akụkụ ihe ndịna anyị, ma ọ bụ nime ụlọ ntà anyị, ma ọ bụ n’ebe ịchụàjà nke ekpere nime ụlọ Chineke, wee malite otuto n’ihi ịdịmma Ya, Ọ na-ezute anyị n’ekpere wee wụkwasị mkpụrụobi anyị ngọzi ọhụụ. Ka anyị na-ejègharị kwa n’ọlụ anyị ná-eto kwa Chineke nwayọ nime obi anyị, ọtụtụ mgbe Ọ na-ejị ọñụ na ịhụn’anya mejuo mkpụrụobi anyị.
Nzukọ nke ịgba-àmà bụ ohere inye Onyenwe anyị otuto; oge nzukọ nke ndị ntorọbịa bụ oge dị mma nye ụmụntakirị ndị ntorọbịa na agba-àmà ha. “Ka ndi JEHOVA gbaputaworo nāsi otú a, bú ndi Ọ gbaputaworo n’aka onye-nkpagbu” (Abù Ọma 107:2). Ọ bụrụ na ụmụntakịrị amalite mgbe ha dị ntà, ọ ga-adịrị ha mfé n’arọ niile dị n’iru iguzo n’etiti nzukọ buru ibu wee kwuo ihe Chineke mewooro ha. Dịka otù nwa agbọghọ ntà dina n’elu ihe ndina ya na ‘Campground’ ọtụtụ arọ gara aga ná-echè échìchè maka ọ dị n’iru nke ndụ ya. Ka ọ na-atụgharị uche otú ọ pụrụ isi bie ndụ ya n’ụzọ bàrà urù, ka ọ na-ekpe kwa ekpere, ọ dị ka ihe kachasị nke o nwere ike ime ná ndụ ya bụ ịbụ onye ná-ekwusa Oziọma n’akụkụ ụzọ. Chineke wee dozie ya maka ọnọdụ ahụ, taa, ọ na-añụrị ọñụ n’ohere o nwere ịgba-àmà ya n’akụkụ ụzọ.
Ná Abụ
Ụzọ ọzọ esi enye Onyenwe anyị ekele bụ site n’ịbụ abụ. Ọ bụrụ na o siiri gị ike ịbụ abụ, bụọ ya otú ọ bụla i nwere ike. Ụfọdụ ụmụntakịrị nwere ike nwee ohere ịmụta ihe ọmụmụ banyere abụ wee zụọ olu ha wee bụrụ kwa ndị pụrụ ịbụ abụ nkeọma. Ka ha na-etolite karị, eleghịanya a ga-eji olu ha nye Chineke otuto n’òfùfè Ya, na iji gbaa ndị ọrịa ume. N’ọtụtụ ebe nime Baịbụl anyị ga-achọpụta na ịbụ abụ bụ óké ihe dị mkpà n’òfùfè Jehova. N’ezie, “ọ bu ezi ihe … ibuku aha-Gi abù ọma, Gi Onye kachasi ihe nile elu” (Abù Ọma 92:1).
N’abụ-une
Amaokwu nke atọ na-agwa anyị ụzọ ọzọ Onye Kraist nwere ike isite wee gosipụta obi ebere nke Jehova: “Nēji ubọ nke akwara iri, nēji kwa une; nēji higgaion n’elu ubọ-akwara.” Taa anyị nwekwara ike inye Chineke otuto n’elu ụbọ nke akwara anọ -- violin, viola, cello, na bass viol. Une na ụbọakwara, nke nwere ọtụtụ akwara, ka ana-eji kwa n’òfùfè Onyenwe anyị. Anyị amataghị ọtụtụ ihe eji akpọ abụ mejupụtara ndị ná-akpọ abụ dị puku anọ (400) nke Devid (I Ihe Emere 23:5), ma ọtụtụ ihe eji akpọ abụ dị iche iche ka edepụtara nime Baịbụl: opi, une, opiike, ájà, dulcimer, flute, ọjà, sackbut, egwuotiti, timbrel, na ụbọakwara, tinyere ụbọakwara niile akpọworo aha na mbụ.
Ọñụ Ná-agabiga Ngwa ngwa
Onye dere Abù Ọma na-egosipụta ihe dị iche n’etiti onye ajọomume na onye eziomume. Ná-arụghị ụkà ọ na-ezipụta ihe kpatara onye eziomume na-eji enye Onyenwe anyị otuto. Eleghịanya ụfọdụ ndị ntorọbịa na-echè na ụmụ ntakịrị ndị na-eje ebe ana-eme ihe nkiri, ite-egwú, ebe ana-agba bọlụ, igwuri egwú n’elu snow, na ebe ọzọ dị iche iche a na-eme ihe-ụtọ ná-enweta ihe-ụtọ karịa ndị ná-eje n’ụlọụkọ, Ụlọakwụkwọ Ụbọchị Ụkọ, ịmụ ihe ọmụmụ nke abụ ka ha wee jikere onwe ha maka ọlụ nke Onyenwe anyị. Ma ka anyị hụ ihe ihe ọmụmụ a na-akụziri anyị.
Anyị na-ahụ onyinyo nke osisi abụọ mara mma, cedar na mkwụ. N’okpuru nke ọ bụla n’osisi ndịa ka ana-ahụ ụfọdụ ahịhịa ndụ nke ná-akpọnwụ ngwa ngwa mgbe anyanwụ chasiri ike. Ma mkpọrọgwụ nke osisi abụọ ndịa na-abami nime ala inweta mmiri, nke ná-eme ka ahịhịa ha dị ndụ ná-ama kwa mma.
Ndụ nke onye mmehie dị ka ahịhịa: “N’ihi na anyanwu nāwalata, ifufe di ọku eso ya, ọ we kpọnwua ahihia” (Jemes 1:11). “Ndi nēmebi iwu nāma akwụkwọ dika ihe-ọkukú, … ewe kpochapu ha ebigh-ebi” (Abù Ọma 92:7). Ya mere na ọ bụ ezie na ndị ná emebi iwu na-adị ka ha nwere obiụtọ mgbe ụfọdụ, ma ndị ná-echèfu Chineke ná-ebi kwa ndụ nke mmehie, ná-achọ náánị ihe ụtọ nke onwe ha, ka aga-achịkọta n’ọkụ-ala mmụọ ha na mba nile ná-echèfu Chineke (Abù Ọma 9:17). Ndị ajọomume na ndị ná-alụ ọlụ ná-emebi iwu “dika ahihia ka agēbipu ha ngwa ngwa, dika akwukwọ ahihia ndu ka ha gākpọnwu” (Abù Ọma 37:1, 2).
Mkwụ na Cedar
Ugbu a ka anyị lee anya n’ihe ekwuru banyere Onye Kraist: “Onye ezi omume gāwa igù dika nkwu: dika osisi cedar nime Lebanon ka o gēbu ibu” (Abù Ọma 92:12). Òlee otú onye eziomume si yie osisi mkwụ na cedar? Osisi abụọ ndịa ka amatara n’ihi ịma mma ha. N’ezie, ọ bụghị ihe dị mkpà na mmadụ ga-ama mma nke anụ-arụ ka ewee hụ n’anya ma ọ bụ ka o wee nwee ndịenyi. Ọ bụrụ na ahụta ịma mma nke Jisọs ná ndụ Onye Kraist, o nwere ike bụrụ onye a na-amaghị-ama n’ebe ndị mmehie nọ ma ọ ga-achọta ọtụtụ ndịenyi n’etiti Ndị Kraist, n’ihi na ndị nke Chineke na-achọ ịnọ n’etiti ndị nwere obiọma, ná échè échìchè ọma, ndị dị ọcha n’okwu ọnụ ha, ndị kwesịrị ntụkwasịobi na ndị omume ha guzoziri eguzozi.
Anaamata kwa osisi cedar n’ihi isi ụtọ ya. Mgbe Jisọs, Rose dị ụtọ nke Sheron, na Urodi nke Ndagwurugwu (Abù Nke Abù 2:1), batara n’obi onye ọ bụla, ì kweghị na Ọ na-ewebata ịdị ụtọ na ndụ nke mmadụ? Anyị na-abụ otù abụ:
“Jisọs Rose nke Sheron nēnwu nim’obim;
Nyem’ịma-mma nk’ez’okwu na ịdị-nsọ Gi,
Ka ndụm nēnwusa eb’ọ bụla m’jere
Is’ụtọ nk’ịma ịhụ-n’anya Chineke.”
A na-efégharị ma ọ bụ ná-ebugharị igù mkwụ dịka ihe-àmà nke mmeri, ọñụ, na nlụgbu. Anyị matara na atụsara igù mkwụ n’ụzọ mgbe Jisọs batara Jerusalem ná mmeri. Ezi Onye Kraist na-enwe mmeri site n’Ọbara Jisọs. Otù ụbọchị ọ ga-esonye n’óké ìgwè ndị ahụ nke mmadụ ọ bụla ná-apụghị ịgụta, nke mba nile, ebo nile, ndị dị iche iche na asụsụ dị iche iche -- ná-eyi uwe ọcha, jide kwa igù mkwụ n’aka-ha (Nkpughe 7:9).
Mkwụ date azụwo ọtụtụ nde mmadụ nri nke ụbọchị n’Ọwụwa-anyanwụ. Eji mkpụrụ dị nime ya eme nri ịnyịnya ibu; eriri ntà dị n’ahịhịa ukwu ya ka eji akpa eriri buru ibu. Ogwe ya bụ osisi bara urù nke ukwu; ọtụtụ ihe ka eji kwa ahịhịa ya emepụta.
Ọ Na-amị Mkpụrụ
Onye Kraist na-amị kwa mkpụrụ ná-achọ kwa ka ya baa urù nyekwara ndị ọzọ aka. Ọ na-atọ Jisọs ụtọ mgbe anyị na-amị ọtụtụ mkpụrụ. Anyị chetara na anyị mụrụ ihe banyere mkpụrụ nke Mmụọ Nsọ: ịhụn’anya, ọñụ, udo, ogologo ntachiobi, obiọma, ịdịmma, ikwesị ntụkwasịobi, ịdịnwayọ, imeru ihe n’ókè (Ndi Galetia 5:22). Mgbe ndị ọzọ hụrụ ka ịhụnanya Jisọs na-enwupụta ná ndụ anyị, mgbe ha hụkwara otú anyị nọ n’udo ọbụná mgbe ihe ná-adịghị aga nkeọma, ha ga-amata na anyi nwere Jisọs nime obi anyị. Ụzọ ọzọ anyị ga-esi “mia nkpuru” bụ site n’ịkpọtara Jisọs ndị mmehie. Rịọ ya n’ụtụtụ tupu i jee n’ụlọakwụkwọ gị ka O nyere gị aka ikwu otù okwu n’ihi Ya; rịọ Ya ka O nye gị ohere ịkpọ otù nwa okoro ma ọ bụ nwa agbọghọ ka ọ bịa n’Ụlọakwụkwọ Ụbọchị ụkọ gị.
Ụmụ Chineke
Osisi cedar na mkwụ ka ana-eji kwa atụnyere ọnọdụ dị elu. Ịbụ onye dị elu pụtara ịbụ “onye amụrụ n’ọnọdụ dị elu,” ma ọ bu “onye amụrụ n’èzínaụlọ dị elu” ma ọ bu “onye ebuliri elu.” A na-amụbata mmadụ n’èzínaụlọ Chineke mgbe amụrụ onye ahụ ọhụụ. Ya mere, ọ bụ na enyeghị onye ahụ nsọpụrụ dị ukwu site n’ime ka ọ bụrụ nwa Eze? Ndị Kraist nēkekọ” (Ndi Rom 8:16, 17). Nke ahụ tinyere Onye Kraist n’Èzínaụlọ Eze; ọ bụ kwa ezie na ndị mmehie nwere ike ghara ịhụta ya, n’ezie o nwere ọnọdụ ma ọ bụ ọkwa dị elu, ọbụná nime ụwa mmehie nke a. “Ugbu a ka ayi bu umu Chineke, akēmegh kwa ka ọ puta ìhè ihe ayi gābu” (I Jọn 3:2).
Onyenwe anyị Onye Eziomume
“JEHOVA ziri ezi; Ọ bu oké nkumem, ọ digh kwa ajọ omume di nime Ya” (Abù Ọma 92:15). Náánị icheta na otù ụbọchị Onyenwe anyị Onye eziomume ga-akpọrọ ndị nke Ya jee n’ebe ahụ mara mma ana-akpọ Eluigwe, ọ na-eme ka otuto jupụta obi gị, ka abụ jupụta kwa ọnụ gị? Onye ọ bụla nwere ohere ijikere maka Eluigwe, ma ndị niile meworo iheọjọọ ná-echègharịghị kwa site ná mmehie ha ka otù Onyenwe anyị a Onye ajọomume ná-adịghị nime Ya ga-edubà ha ná mbibi ebighịebi.
Ka anyị kpebìe n’obi anyị ịbàmi nime ime nke Okwu Chineke na ekpere. Ọ bụrụ na “mkpọrọgwụ” nke nzọpụta anyị abàmie nime ịhụn’anya nke Chineke, anyị ga-adị ka “osisi akuworo n’akuku iyi juputara na miri, nke nāmi nkpuru-ya na mgbe-ya” (Abù Ọma 1:3). Mgbe ahụ anyị gaapụ inye Onyenwe anyị otuto, ọ bụghi náánị n’Ụbọchị Inye ekele, kama n’ụbọchị niile nke arọ.
Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE- Ùgbò ole ka anyị kwesịrị inye Onyenwe anyị ekele?
- Kpọọ aha ọ dịkarịa ntà ụzọ ise nke anyị ga-esi nye Onyenwe anyị otuto.
- Kpọọ aha ọ dịkarịa ntà ihe iri na abụọ kpatara anyị ga-eji ná-enye Ya ekele.
- Gịnị ka eji onye ná-emebi iwu tụnyere?
- Òlee otú onye eziomume si dị ka osisi cedar na nkwụ?
- Were ikpeazụ onye ná-emebi iwu tụnyere nke onye eziomume.
- Ònye na-enwekarị ọñụ nke ndụ -- Onye Kraist ka ọbụ onye mmehie? N’ihi gịnị?