Lesson 308 - Junior
Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISI: “Ndi soro Ya gēmeri kwa, bú ndi akpọworo, ndi arọputawo-kwa-ra, ndi kwesi-kwa-ra ntukwasi-obi” (Nkpughe 17:14).Notes
Ọkpụkpọ
Oge na-abịa ná ndụ onye ọ bụla mgbe Mmụọ Chineke na-akpọ ya òkù n’ọnụ-ụzọ obi ya. Ná-agbanyeghị otú akpụkpọ arụ onye ahụ dị, ụdị ọlụ ọ na-alụ, ma ọ bụ ọgaranya ma ọ bụ ogbenye, ma ọ bụ okenye ma ọ bụ nwata. Ọ bụrụ na mmadụ etoruo ógó ịghọta ihe ọ pụtara bụ imehie megide Chineke, Mmụọ Chineke na-ekwesị ntụkwasịobi na Ọ na-akpọ onye ahụ ná-agbalị kwa irite mkpụrụobi ya n’urù.
Otù nwaokoro ná-alụ ọlụ ubi natara ọkpụkpọ nke ya otù ụbọchị mgbe ọ na-akọ ala n’ubi. Iri ehi abụọ na anọ na-alụ ọlụ n’ụbị ka Elaisha na-esogharị n’etiti ala ha ná-akọ ọlụ. Na mberede ehi niile ahụ wee guzo duu, Elaisha wee wepụ aka ya n’ihe ahụ ná-akọze ala o wee gbaa ọsọ si n’etiti ubi ahụ gabiga. Onye nke Chineke, Elaija, agabigawo wee wụgara nwa okoro ahụ ná-alụ ọlụ ubi uwe mwụda ya. Mmetụ nke uwe mwụda ahụ n’arụ Elaisha mere ka o kpebìe ịrapụ ehi niile ahụ, ihe o ji akọze ala, ubi ọ maliteworo ịkọze, na nne na nna ya, wee soro Onyenwe anyị.
Ọ dịwo mgbe ọ bụla Mmụọ Chineke kpọrọ òkù n’ọnụ-ụzọ obi gị? Ọ dịwo mgbe ị nwere mmetụta na o kwesịrị ka azọpụta gị? Ị gbawo ọsọ jee n’oche eze amara ịza òkù nke Mmụọ Nsọ na-akpọ?
Nọdụ-mma
Ehi abụọ ka egburu were kwa ihe ahụ ehi ji alụ ọlụ mee nkụ eji sie ha; ngwa ngwa edosiri ihe eji eme ememe nọdụ mma; ọ sịkwara nne na nna na ndịenyì nọdụ mma ọsọsọ -- Elaisha wee chefuo ọlụ ubi ruo mgbe ebighịebi. Ọlụ ọhụụ dịịrị ya ịlụ n’ọdịn’iru.
Ruo Betel
Ọlụ Elaija n’ụwa agwụsịwo oge abịawo kwa mgbe Onyenwe anyị ga-akpọrọ ya laa n’Eluigwe (2 Ndi Eze 2:1). Ya na Elaisha wee pụọ site na Gilgal. “Nọdu n’ebe a,” ka Elaija sịrị, “n’ihi na JEHOVA ezigawom ijeru Betel.” Ná mkpebi siri ike isoro onyenwe ya, Elaisha sịrị, “M’gagh-arapu gi ma-ọli.” Ha wee ná-aga n’iru n’iru. Elaisha matara na mgbe ná-adịghị anya aga-akpọlaga Elaija Eluigwe, ntabianya ọ bụla nke oge bụ kwa ihe óké ọnụ-ahịa -- maịlị ọ bụla nke ogologo ijè ahụ dị kwa ya mkpà nke ukwu.
Mgbe ha ruru Betel, ụfọdụ ụmụ okoroọbịa, ndị amatara dịka ụmụ ndịamụma, kpọrọ Elaisha sị, “Ì mawo na ta ka JEHOVA nēwepu onye-nwe-gi n’ibu onye-isi-gi?” Ọzịzá o nyere ha bụ, “Mu onwem amawo kwa ya; gbanu nkiti.”
Ruo Jeriko
Onye nke Chineke wee gbadaa n’ụzọ Jeriko. Elaisha na-esosi kwa ya ike. Elaija nwakwara mkpebi nke nwaokoro ahụ ọzọ bụ onye gaje iwere ọlụ ya. “Biko, nọdu n’ebe a; n’ihi na JEHOVA ezigawom ijeru Jọdan. Nọdu na Jeriko ya na ụmụ ndịamụma? Kà ọ nọdụ n’azụ mgbe Elaija ka na-aga n’iru? Kà ọ tufuo ngọzi kachasị ngọzi niile? É-è! “M’gagh-arapu gi ma-ọli!”
Ruo Jọdan
N’ikpeazụ ha wee bịarue n’ótú Mmiri Jọdan. N’ebe dị anya ka iri ndịkom ise nke ụlọakwukwọ guzo, na-ele ihe ga-eme. Gịnị ka ha hụrụ? Gịnị ka Elaisha hụrụ? Gịnị ka anyị na-ahụ, ka anyị ji anya ime mmụọ ná-ele ebe a? Nwanna anyị Elaija bụ okenye chịịrị uwe mwụda ya pịakọta ya, were kwa ya tie mmiri ahụ ji ike na-eru. Orúrú nke mmiri ahụ wee kwụsi. Ala akọrọ wee pụta ha abụọ wee gabiga n’elu ala akọrọ.
Ugbu a akwụghachịwo gị ụgwọ n’ihi nsogide gị, Elaisha. Ọtụtụ maịlị nke ijè ike ọgwụgwụ ahụ abụghị n’efù. Ị hụwo ọlụ ebube ọzọ nke ike Chineke dị n’arụ Elaija. Ma ụgwọọlụ dị ukwu karịa na-echere gị ọ bụrụ na isogide.
Otù Arịrịọ Ikpeazụ
Ugbu a ndịkom abụọ ahụ na-eguzo n’ofé ọzọ nke mmiri ahụ. Oge Elaija eruwo ịla n’Eluigwe. Ma ònye ga na-alụ ọlụ ahụ n’ebe a? Aghaghị ịgwọ ndịọrịa, gwa ụmụ mmadụ okwu banyere Chineke, mee kwa ka ndị nwụrụ anwụ dị ndụ ọzọ. Ònye ga na-emeriri Jehova agha? Elaisha matara ihe ọ chọrọ na ihe dị ya mkpà ka o wee nwee ike ịlụ ọlụ a dị mkpà. Ọ ghaghị inweta ya! Ya mere mgbe Elaija sịrị, “Riọ ihe m’gemere gi, tutu ewepum n’ebe i nọ,” Elaisha zara n’obi-ume-ala sị, “Biko, ka òkè abua nke mọ-gi dikwasim.”
Arịrịọ jupụtara n’amamihe. Òlee ihe ọ pụrụ ịrịọ karịrị nke a? Òlee ọchịchọ ọzọ mmadụ pụrụ inwe bụ nke dị ukwu karịa ịbụ onye emejupụtara n’okpukpu abụọ nke Mmụọ Chineke? Ị matara na ọ bụ ihe dị n’ike nke mmadụ ọ bụla dị ndụ inwe ojuju nke Mmụọ Nsọ na ọkụ ọ na-adị nnọọ ka ihe ahụ Elaija kwuru, “I riọwo ihe siriike.” Ma otú ọ dị, ndị azọpụtaworo, doo kwa nsọ ndị jiwokwara obi ha chụọàjà n’òzùzù òkè na-anata ngọzi ukwu a n’ụbọchị ikpeazụ ndịa.
Ọ dị ihe Elaisha ná-aghaghị ime: “Ọ buru na i hum mgbe anēwepum n’ebe i nọ, ọ gādiri gi otú a; ma ọ buru na i hughm, ọ gagh-adi otú a.” Elaisha esorowo rue Betel; o sogide-kwa-ra rue Jeriko; emesịa o rue na Mmiri Jọdan. Ugbu a abụghị oge iwepụ anya n’arụ onyenwe ya. Ọ pụghị ịrapụ ịnata ngọzi ahụ, ugbu a o ruteworo ebe dị anya otú a.
Ọ bụ ihe dị ntà ka ndị azọpụtaworo ma ọ bụ ndị edowokwara nsọ ịdaghachị azụ? Ọ ga-abụ ihe dị mma ka ndị edoro nsọ lefuru ịchọ ojuju nke Mmụọ Chineke anya, ọwụwụmmiri ukwu nke Mmụọ Chineke anya, ọwụwụmmiri ukwu nke Mmụọ Nsọ? Mgbe anatasịkwara ya, ọ dị oge ọ bụla mgbe Onye Kraist kwesịrị iwepu anya ya n’arụ Onyenwe ya na Onye òzízí ya? Ha nwere ike bụrụ ndị arapụrụ ná Mwelikọ nke Ndịnsọ ọ bụrụ na ha ewepụ anya ha.
Ụgbọala Ọkụ Ahụ
“Mgbe ha nọ nējeije nēkwu kwa okwu.” O doro anyị anya na mkparịta ụkà ga-abụ banyere Onyenwe anyị na Eluigwe. Na mberede “Ugbọ-ala-ọku na inyinya ọku.” Apụghị ịkọwa ihe a mere n’ebe a, kama apụrụ náánị iji anya nke ime mmụọ tụlee ebube ya. Dịka ụgbọala ọkụ ahụ bịara na mberede, o laghachiri n’óké ifufe, Elaija wee laa n’Eluigwe, otù onye nime ndịkom abụọ náánị bàra n’ụwa nke ọzọ ná-anwụghị anwụ. Elaija anwụghị anwụ; kama, dịka Inọk, “ahugh kwa ya, n’ihi na Chineke bubigara ya-ri” (Ndi Hibru 11:5).
Taa mgbe ewepụrụ ndị anyị hụrụ n’anya n’akụkụ anyị, ọ na-eju anyị anya n’ihi ọpụpụ ha. Ọ bụ ezie na Elaisha matara na ekwesịrị ibuga Elaija n’Eluigwe ụbọchị ahụ, ma ka o guzo na-ele ụgbọala ọkụ ahụ bu nna ya ukwu ka o funarịrị ya laa n’igweoji, o juru Elaisha anya, n’ihi na anyị gụrụ na “ọ wee jide uwe nke aka ya, dọwa ya ibe abua.”
Uwe Mwụda Ahụ
Uwe mwụda Elaija wee daa site n’igweoji. Nke a bụ uwe mwụda ahụ metụrụ Elaisha ụbọchị ahụ nime ubi; nke a bụ uwe mwụda ahụ nna ya ukwu yiri; nke a bụ uwe mwụda Elaija pịakọtara wee tie mmiri nke Mmiri Jọdan. Ugbu a ọ bu nke Elaisha. Ò nwetara ihe ahụ nke ọ rịọworo nna ya ukwu? Ò nwetara òkè abụọ nke mmụọ Elaija? Ka anyị hụ.
Ọ laghachiri n’akụkụ mmiri ahụ. Eleghịanya, nzọ ụkwụ Elaija, onye laworo n’Eluigwe zọrọ ka dị n’elu ájá n’ebe ahụ. Ma Chineke Elaija nọ n’ebe ahụ, n’ihi na ngwa ngwa Elaisha weere uwe mwụda ahụ tie mmiri ahụ, otù Onyenwe anyị ahụ wee zaa ma kewaa mmiri ahụ. Elaisha anọghị náánị ya ka ọ na-agafe n’ụzọ ahụ dị n’etiti mmiri. Anya ya apụghị ịhụ Onye ná-edu ya, otú ọ dị, anya ya adịghị n’arụ onye ọzọ ma ọbụghị Jehova Chineke. Elaisha ji uwe mwụda ahụ; o nwere ike ahụ; o nwere ọzịzá nke arịrịọ ya: “òkè abụọ” nke mmụọ Elaija.
Òkè abụọ nke ike ahụ dị Elaisha mkpà, o jikwara ya mee ihe. Ọ lụrụ ọtụtụ óké ọlụ ebube, dịka anyị ga-amụ ya n’ihe ọmụmụ anyị n’ọdịn’iru. Ọ bụ ezie na ọ bụghị ọlụ ukwu niile alụrụ site n’ike Chineke ka edere na Baịbụl, nime Okwu Chineke anyị chọpụtara na okpukpu abụọ nke ọlụ ebube Elaisha lụrụ ka edere na Elaija lụrụ.
Ekweghị Ekwe
Ụmụ okorọbịa, ụmụ ndịamụma nọ na Jeriko, hụtara na mmụọ Elaija adakwasịwo Elaisha. Otú ọ dị, o juru ha anya ma Elaija ọ lawo n’Eluigwe n’ezie. Ha rịọrọ Elaisha ka o kwee ka ha jee chọọ ya n’elu ugwu na ndagwurugwu niile. Elaisha ekwenyereghị ha, ma mgbe ha na ekwugidesi ya ike, o kwere ka ha jee. Iri ndịkom ise ahụ siri ike chọrọ abalị atọ, ma ha achọtaghị onye nke Chineke, n’ihi na ọ lawo n’Eluigwe.
Mwelikọ Ahụ
Ihe dị otú a ga-eme kwa ọzọ n’oge Mwelikọ nke ndịnsọ. Ndị arapụrụ n’ụwa agaghị ekwe na ewepụwo Nwunye nsọ nke Kraist. Ha ga-achọ Nwanyị ahụ ana-alụ ọhụụ -- ma ọ ga-abụ n’efù. Ọ bụghị náánị onye mkwusa ma ọ bụ onyeamụma nke Chineke ga-ebili n’oge Mwelikọ nke Nzukọ, kama ndị niile jikereworo onwe ha n’ihi ọbịbịa Ya site n’inwe mgbaghara mmehie, mee ka obi ha dị ọcha site n’odudonsọ n’Ọbara ahụ, na site n’ịnata onyinye nke ike nke ná-abịa site na ọwụwụmmiri nke Mmụọ Nsọ. Ọ bụrụ na ị ga-abụ otù onye nime ha, ná-eso Jisọs ezi nso. Nwee mkpebi dịka Elaisha nwere, “M’gagh-arapu gi ma-ọli.” Taa Nwanyị ahụ ana-alụ ọhụụ nke Kraist na-ele anya ọbịbịa nke Onyenwe anyị nwekwara ike ịnọ n’etiti ndị ná-agaghị ahụ ọnwụ kama “agēwelikọ … izute Onye-nwe-ayi nime mbara-elu-igwe: otú a ka ayi na Onye-nwe-ayi gānọ kwa mgbe nile” (I Ndi Tesalọnaika 4:17).
Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE- Gịnị ka Elaija mere Elaisha ka ọ na-alụ ọlụ n’ubi ya?
- Kwuo ihe Elaisha mere mgbe ahụ.
- Gịnị bụ óké ihe ná-abịa ime Elaija?
- Elaisha ọ matara ihe banyere nke a? Gịnị mere?
- Kwuo ihe banyere mkpebi ya isoro Elaija.
- Gịnị mere na Mmiri Jọdan?
- Gịnị ka Elaisha rịọrọ Elaija tupu ewepụ ya?
- Òlee otú anyị si mata ma enyere ya ihe ọ rịọrọ ma ọ bụ na enyeghị ya?
. Ụzọ dị añaa ka Elaija si jee n’Eluigwe?
- Gịnị bụ ihe àmà gosiri anyị na mmụọ Elaija dakwasịrị Elaisha?