2 Ndi Eze 2:19-25; 3:1-27

Lesson 309 - Junior

Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISI: “Le, Mu onwem bu JEHOVA, Chineke nke anu-aru nile, bú madu: ọ di ihe ọ bula karirim ime?” (Jeremaia 32:27).
Notes

Ike Chineke dị N’arụ Elaisha

Ike nke Chineke adịkwasịwo Elaisha mgbe Elaija lasịrị n’Eluigwe. Ugbu a ọlụ dịrị ya ịlụ. Mgbe Chineke nyere ndị Ya ike ijéozi, Ọ na-ele ha anya ịlụrụ Ya ọlụ. Ọ chọrọ ka ha were ihe ahụ O nyeworo ha mee ihe ka ewere nye aha Ya otuto. Ọ bụrụ na ha emeghị otú ahụ, ha ga-etufu ike ahụ.

Ọlụ Elaisha nwere ịlụ bụ inyere ndịọzọ aka. Chineke rapụrụ ndị Ya n’ụwa a ka ha nyere ndị nọ ná mkpà aka na igosi ha otú ha ga-esi nwee nzọpụta. Jisọs gosịrị anyị site n’ihe nlere-anya otú anyị ná-aghaghị isi bie ndụ. O biri ndụ Ya inyere ndịọzọ aka.

Agwọrọ Mmiri

Na Jeriko, ebe Elaisha nọ, mmiri ha jọrọ njọ. Mmadụ apụghị ịnọgide na-enweghị mmiri, ya mere obodo ahụ nọ ná mkpà dị ukwu. Nke a bụ ohere Elaisha inyeaka, ọ dị kwa ka ndị obodo ahụ ghọtara na ọ pụrụ inyeaka. Ha bịara gwa ya na Jeriko bụ obodo mara mma obibi, ma gịnị ka ha pụrụ ime ná-enweghị mmiri.

Elaisha sịrị ka ha wetara ya ọkwa nnu. Gịnị ka ọ pụrụ iji nnu mee? Ụmụ mmadụ na-anwụ ọ bụrụ na ha añụọ mmiri nnu riinne. Mmiri nnu ga-emebi ala ka ihe ọkụkụ ghara imi mkpụrụ. Elaisha ọ matakwara ihe ọ na-eme? Ọ ga-eme ka mmiri ahụ jọọ njọ karị ọbụná otú ọ dị na mbụ? Ndị Jeriko pụrụrị ikwu sị: “Elaisha enweghị amam-ihe dika ayi chère na o nwere. N’ezie nnu apugh inyere ayi aka.” Ha ajụghị Elaisha ajụjụ, kama ha wetaara ya nnu dịka ọ sịrị ha weta. Elaisha wee tinye nnu ahụ n’ebe mmiri ahụ si asụpụta; mmiri ahụ wee dị mma iji mee ihe. Site na mgbe ahụ, ala wee mee ihe omume nwee kwa ezi mmiri nke ukwu.

N’ụzọ ihe si dị, ọ dịghị otú nnu etinyere nime mmiri ga-eme ka ọ dị mma. Chineke esitewo n’aka Elaisha lụọ ọlụ mgbe ndị ahụ rubereisi n’iwu Elaisha nyere. Chineke na-achọ nrubeisi n’obi nke ndị Ya niile. “O buru na unu ekwe we nu, ezi ihe nke ala-unu ka unu gēri” (Aisaia 1:19).

Nsọpụrụ nye Ndịokenye

Elaisha mere ka obi tọọ ndị Jeriko ụtọ, Elaisha adịghị kwa ha mkpà ọzọ, ya mere ọ rapụ ha ijé Betel. Ka ọ na-aga o zutere òtù ụmụntakịrị ndị ji ya na-eme ihe ọchị n’ihi na o nwere isi nkwọcha. Nke a gosipụtara enweghị nsọpụrụ ma-ọlị. Ọbụná ọ bụrụ na ha amataghị na ọ bụ onye nke Chineke, ha ka kwesịrị ịsọpụrụ ya n’ihi okenye ọ bụ. Anyị na-agụ nime Baịbụl, “I gēbili ọtọ n’iru onye-isi-awọ, sọpuru kwa iru okenye” (Levitikọs 19:32). Pita na-agwa anyị sị, “Burunu ndi nāhu umu-nna-unu n’anya, ndi nwere obi ọmiko, ndi nwere uche di ume-ala” (I Pita 3:8). Ọ na-atọ Jisọs ụtọ mgbe anyị na-enwe nsọpụrụ nye ihe ndịọzọ chọrọ na-eme kwa ha otú anyị ga-achọ ka ndịọzọ mee anyị.

Elaisha rịọrọ Chineke inye ụmụntakịrị ọjọọ ndịa ahụhụ. Nne anụ-ọhịa bear abụọ wee si n’ọhịa pụta bibie iri mmadụ anọ na abụọ nime ha. Nke a abụghị nnọọ náánị ihe ọmụmụ ikuziri ụmụntakịrị ka ha ná-asọ-pụrụ ndịokenye. Ọ na-egosi kwa na ikpé ga-abịakwasị ndị niile ná-adịghị asọpụrụ ndị nke Chineke. Anyị nwere ike ghara ịhụ anụ-ọhịa bear ọ bụla ka o si n’ọhịa pụta ibibi ndị na-eji ndị Kraist ná-eme ihe-ọchị, kama ikpé ikpeazụ ahụ ga-esi kwa ike nke ukwu n’otù aka ahụ ọ bụrụ na ha echègharịghị.

Àtụmààtụ Jehoram maka Mmeri

Ugbu a Jehoram bụ Eze bụ onye ná-achị Israel, ọ bụ nwa nke Ehab bụ Eze ọjọọ. Ọ jọghị njọ dịka nna ya jọworo, ma ọ bụghị kwa ezi eze. O bibiwo arụsị Beal ma o wepụghị ụmụ ehi abụọ ọla-edo nke ndị Israel na-efè òfùfè. Elaisha ga-enweworị ọñụ inyere ya aka mee ka ala ahụ dị ọcha, chègharị kwa Israel niile ka ha bịaghachi n’ifè ezi Chineke òfùfè, ma Jehoram agwaghị ya otú ahụ.

Eze Moab na-atụ ụtụ nye eze Israel; ugbu a enwewokwara mgbanwe n’ọchịchị, o chère na ya hụrụ ohere itijipụ agbụ ahụ. Otú ọ dị, Jehoram agaghị ekwe ka àkụ niile ahụ funarị ya, ya mere o kpebiri ijé busoo ha agha ka o wee debe kwa Moab n’agbụ nke ịbụ orù. N’ihi na ndịagha Israel adịghị ike ịlụ ọgụ ahụ náánị ha, Jehoram rịọrọ Jehoshafat, bụ eze Juda, ka ọ bịa nyere ya aka.

Mkwenye nke Jehoshafat

Jehoshafat bụ ezi eze; ọbụná ọ bụ ezie na ndị ya bụ ụmụnne nke ụmụ Israel, o kwesịghị ikwenyere eze Israel ahụ jupụtara ná mmehie. Ma o mere ya. Ọ sịrị Jehoram: “M’gārigo: dika m’di, otú a ka i di; dika ndim di, otú a ka ndi-gi di; dika inyinyam di, otú a ka inyinya-gi di.” Jehoshafat na-aga ijikọta onwe ya na onye mmehie, Chineke agaghị agọzi kwa ya.

Ekpebiri ka ha jee site n’ọzara Edom ijé megide Moab ka ha wee nwee ike inweta inyeaka nke eze Edom. Lee otú ha chère na ike ha ra ka ndịeze atọ na-eduru ndịagha ha ná-eje n’ụzọ Moab! Ọ dị ihe pụrụ igbochi ndịagha dị ike otú a? Chineke pụrụ.

Mmiri Adịghị

Mgbe abalị asaa nke ijé gasịrị, óké ìgwè ndịagha ahụ bịaruru ebe mmiri ná-adịghị. Ọ dịghị mmadụ ma ọ bụ anụmanụ pụrụ ibi ndụ ogologo ná-enweghị mmiri. Ugbu a gịnị ga-eme ndịeze mpako ndịa na ndịkom ha bara ụba? Ha ga-anwụ n’ihi akpịrị ikpọ nkụ, ha na anụ-ụlọ ha niile? Lee otú mmadụ ná-enweghị inyeaka ma ewezuga inyeaka Chineke!

Eze Israel wee tie mkpu sị: “Ewó! N’ihi na Jehova akpọwo eze atọ ndịa inye ha n’aka Moab!” Ma ọ bụghị Chineke kpọkọtara ndịeze ndịa. Ọ bụ ha mere ya n’onwe ha. Chineke adịghị akpọ ndị Ya ka ha na ndị mmehie jikọta. Jehoram atụwo àtụmààtụ nke agha a n’onwe ya ná-ajụghị maka ndụm-ọdụ nke Chineke, ma ọ bụ ọbụná ka ya na Elaisha kwurịta okwu. Ugbu a ọ nọ ná nsogbu, ọ tara Chineke ụta. Lee otú ọ na-eme ọtụtụ mgbe na mmadụ nọgide n’ịchọ ụzọ nke aka ya, emesịa mgbe ọ dabara n’ihe isi ike, ọ na-achọ ịta onye ọzọ ụta -- ọbụná ịta Chineke ụta!

Amatara Onye Amụma ahụ

Jehoshafat akpafuwo site n’ezi ụzọ, ma ọ matara ebe ọ ga-echè iru mgbe ọ nọ ná nsogbu. Ọ sịrị ka akpọta Onye amụma nke ezi Chineke; mgbe otù onye gwakwara ya ihe banyere Elaisha, ọ sịrị, “Okwu Jehova di n’ebe ọ nọ.” Ọ matara ezi Onyeamụma nọ n’Israel jikere kwa ige ntị na ndụm-ọdụ ya. Otú ọ dị, mgbe akpọrọ Elaisha, ọ sịrị Jehoram, “Jekuru ndi-amuma nna-gi, jekuru kwa ndi-amuma nne-gi.” Jehoram efèwo arụsị òfùfè mgbe ihe na-agara ya nkeọma, wee rapụ kwa ezi Chineke kpamkpam. Ka arụsị niile ahụ nyere ya aka ugbu a, ọ bụrụ na ha pụrụ. Gịnị mere o ji chere ruo mgbe ọ dabara ná nsogbu tupu ya échigharịkwute Chineke?

Anyị na-ekele Chineke na O nwere obi ebere na Ọ na-anụ ekpere ọbụná nke ndị dị otú a ọ bụrụ na ha abịa ná nchègharị. Ma ọ ga-aka mma ịbụ enyi nke Chineke tupu nsogbu abịa, ka ọ ga-abụ na mgbe anyị chọrọ inyeaka Ya na mberede, anyị ga-enwe ike ikpe ekpere ná ntụkwasịobi. Anyị nwere mkwà na Ọ ga-elekọta ndị Ya, na Ọ agaghị alaghachị azụ n’Okwu Ya.

Jehoram rịọrọ Elaisha ka o kpeere ya ekpere. Ọ matawo ugbu a na mgbe ná-adịghị anya ha niile ga-anwụ ma ewezuga inyeaka Chineke.

Igwu Olùlù

Nke a bụ ozi sitere n’ebe Chineke nọ: “Me ndagwurugwu a ka ọ buru olùlù olùlù … Unu agagh-ahu ifufe, unu agagh-ahu kwa oké miri-ozuzo, ma ndagwurugwu ahu gējuputa na miri: unu gāñu kwa, unu onwe-unu, na anu-ulo-unu, na anumanu unu nile.” Mmiri ga-adị -- mmiri ga-ejupụta. Ma ha ga-alụ ọlụ n’ihi ya. Ha ga-egwú olùlù. Igwú olùlù bụ ọlụ siri ike, nkekanke mgbe akpịrị na-akpọ ha nkụ. Ha aghaghị igwú olùlù ma ọbụghị otú ahụ ha anwụọ. Chineke achọghị inyeaka ha n’izitere ha mmiri, ma Ọ matara na ọ dị mma ka ha lụọ otù ọlụ. Ọ chọkwara ịhụ ma ha ga-erube isi n’iwu Ya.

Ihe Ntà

Dịka ọ na-adị tupu mmiri ga-ezo, anyị na-enwe mmetụta ifufe na-ebu igweoji gabiga n’ụzọ anyị. Ma ọ bụ ọ bụrụ na anyị enweghị mmetụta ya, anyị pụrụ ịhụ ka igweoji na-ejègharị. Mgbe ụfọdụ ifufe na-ebugharị mmiri n’ala site n’ọdọ mmiri ma ọ bụ n’osimiri. Ma Chineke agaghị eji ifufe lụọ ọlụ n’oge a. Mmiri ga-agbabata nnọọ n’olùlù ahụ, n’ihe dị ka enweghị inyeaka ọ bụla. Chineke sịrị, “Nka di nfe n’anya Jehova.” N’ezie Chineke onye kère mmiri pụrụ iduru ụfọdụ nime ya bịa n’ọzara ahụ kpọrọ nkụ. Nke a bụ náánị ihe ntà n’ebe Chineke nọ, ma ọ bụ ya ga-akpa ókè n’etiti ọnwụ na ndụ nye ndịagha nke mba atọ ahụ.

Chineke kwuru n’oge ọzọ sị, “Ọ di ihe ọ bula karirim ime?” (Jeremaia 32:27). Ọ dị ihe ọ bụla Chineke ná-apụghị ime? Mgbe anyị na-ekpere Ya, ànyị na-agwa Ya mkpà anyị niile ná ntụkwasịobi na anyị matara na Chineke pụrụ ime ihe niile? Mgbe anyị na-arịọ Ya ka Ọ gwọọ arụ anyị. ànyị na-echeta na n’ebe Ọ nọ nke a bụ náánị ihe ntà?

Chee otú Chineke si zaa ekpere Job. Ọ bụ n’ihi na Job kweere ná mkwà niile nke Chineke. Nke a bụ ihe Job kwuru: “Amawom na I puru ime ihe nile, amawokwam na adigh-egbochi nzube ọ bula nke sitere na Gi” (Job 42:2). Chineke na-amata ihe anyị na-echè, mgbe ọ dịghị onye ọ bụla ọzọ maara ya. Ọ bụrụ na Chineke pụrụ ime nke ahụ, ọ dị ihe ọ bụla Ọ ná-apụghị ime?

Anyanwụ N’elu Mmiri ahụ

Mmiri gbabatara nime olùlù ahụ, dịka Chineke kwuru na ọ ga-eme. Mgbe anyanwụ mụkwasịrị mmiri ahụ, ndị Moab chère na ọ bụ ọbara. Ha chère na nsogbu adịwo n’ọmụma ụlọikwu nke ndị Israel, na ndịagha ahụ niile egburitawo kwa onwe ha. Ha wee chee na ha pụrụ nnọọ ịbànye wee buru ihe niile ndị Israel rapụworo.

Lee otú ọ bụrụ ha ihe iju-anya mgbe ha banyere n’ọmụma ụlọikwu nke ndị Israel wee hụ ndịagha jupụtara n’ike jikere kwa maka agha! Onye ọ bụla ji ihe agha ya, jikere kwa ịlụ ọgụ. Ndị Moab wee chigharịa gbaa ọsọ, ndị Israel na-achụso kwa ha n’azụ. Ha chụlagara nnọọ ndị Moab ruo obodo ha, bibie obodo ahụ, kpochie olùlù mmiri niile, gbutuo ezi osisi niile, ọbụná tụjuo nkume n’ezi óké ala ubi ha. Mgbe eze Moab hụrụ na ebibiwo obodo ya, ọ ka gbalịkwara imegide eze Edom, ya na ndịagha olenaole, ma ọ pụghị imeri.

Otú a ka Israel si nwe mmeri mgbe ọ bụ náánị ha, ha enweghị inyeaka, ha jikerekwara ịnwụ; ma mgbe Chineke nọnyeere ha, ha pụrụ inwe mmeri ma bibie kwa ndịiro ha. Ka anyị cheta na anyị pụrụ imeri ike niile nke setan, ọ bụrụ na Chineke nọnyeere anyị.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. N’ihi gịnị ka Elaisha nataworo ike Chineke?
  2. Gịnị bụ ihe ịrịbà-àmà mbụ Elaisha mere mgbe ọ gafesiworo Jọdan?
  3. Gịnị ka Baịbụl kwuru banyere ikwere ná irubeisi?
  4. Gịnị mere ụmụntakịrị ahụ jiri Elaisha mee ihe ọchị?
  5. Gịnị bụ ihe ọmụmụ anyị na-amụta site n’ahụhụ enyere ụmụntakirị ahụ?
  6. Ònye na-achị Israel n’oge a? ụdị eze dị añaa ka ọ bụ kwa?
  7. Gịnị mere o ji chọọ ijé busoo Moab agha?
  8. Kọwaa àtụmààtụ nke eze Israel tụrụ iji merie Moab.
  9. Gịnị mere àtụmààtụ ahụ agaghị nkeọma?
  10. Òlee otú ndị Israel si merie agha ahụ n’ikpeazụ?