2 Ndi Eze 4:1-44

Lesson 310 - Junior

Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISI: “Nēnyenu, agēnye kwa unu; ọtùtù ọma, nke abiadaworo ala, yọkọta, nke nējubiga kwa óké, ka ha gēnye n’obi-unu” (Luk 6:38).
Notes

Otù Nwanyị Di Ya Nwụrụ Anwụ nọ ná Nsogbu

Site n’ihe iriba-àmà dị iche iche ọ lụworo site n’okwukwe nime Chineke, Elaisha emewo ka ụwa mata na ya bụ onye nke Chineke. Mgbe ụmụ mmadụ nọrọ ná nsogbu, ha maara ebe ha ga-eje maka inyeaka.

Otù nwanyị di ya, nwụrụ anwụ nọ ná nsogbu. Di ya, otù nime ndịamụma nọ n’ụlọakwụkwọ nke ndịamụma nke Elaisha bụ onyeisi ya, anwụwo wee rapụ nwanyị ahụ ná-enweghị ego ọ bụla. Mgbe ana-achọ iré ụmụ ya n’ihi ụgwọ, o tikuru Elaisha maka inyeaka. Elaisha enweghị ego. O jiwo ndụ ya niile lụọ ọlụ maka ndịọzọ, o nweghị kwa ohere ịkpadọ àkụ n’ụwa. Ma nke ahụ apụtaghị na ọ pụghị inyere ya aka. Elaisha nwere otù ihe nke dị óké ọnụ-ahịa karịa ego. O nwere okwukwe na Chineke. O jikekwara iji ihe o nwere nyere nwanyị ahụ di ya nwụrụ anwụ aka.

Jemes Onyeozi dere sị: “Okpukpe-Chineke nke di ọcha nke anēmerugh kwa emeru n’iru Chineke-ayi, bú Nna-ayi, bu nka, ileta umu-mgbei na ndinyom di-ha nwuru nime nkpagbu-ha, na edebe onwe-ya nēnwegh ntụpọ site n’uwa” (Jemes 1:27). Ụfọdụ mmadụ na-elezi anya nkeọma ka ha ghara inwe ntụpọ site n’ụwa, ma ha chère na ha enweghị ohere ijé leta ndị nọ ná mkpà. Elaisha nwere “okpukpe-Chineke nke di ọcha.” Nwanyị ahụ di ya nwụrụ anwụ abịakwutewo onye kwesịrị ekwesị maka inyeaka.

Mmanụ Ahụ Bara Ụba

Náánị ihe nwanyị ahụ di ya nwụrụ anwụ nwere n’ụlọ ya bụ otù ite mmanụ. Ọ dịghị ukwu; ọ bụrụ kwa na o ree ya, ọ ghaghị enwetara ya ego buru ibu. Ma Chineke ga-eme ka mmanụ ahụ baa ụba igosipụta ike Ya, dịka Ọ mụbara mmanụ nke nwanyị ahụ di ya nwụrụ anwụ onye zụrụ Elaija n’oge mmadụ niile nọ n’agụụ.

Ezigara ụmụ nwanyị ahụ di ya nwụrụ anwụ ka ha jee rịọta ite ihe ná-adịghị nime ya na afere na bọket nke ọ pụrụ inweta n’aka ndị agbata-obi ya. Eleghịanya ọ ga-eju nwanyị ahụ di ya nwụrụ anwụ anya ihe Elaisha pụrụ iji ihe niile ahụ ihe ná-adịghị nime ha mee. Ma o rubereisi n’okwu onye nke Chineke, mgbe ná-adịghị anya o wee hụ óké ngọzi nke irubeisi ya ga-ewetara ya. Mgbe náánị ya na ụmụ ya abụọ nọ, nwanyị ahụ di ya nwụrụ anwụ mere ihe Elaisha gwaworo ya ka o mee. Ọ malitere ịgbanye mmanụ nime ite ihe ná-adịghị nime ya site n’ite ntà ya ahụ. Mgbe otù ite buru ibu ihe ná-adịghị nime ya juru, o lee anya nime ite ntà ya, o jukwara dịka o juworo ná mbụ. Òlee ebe mmanụ niile ahụ siteworo? Ọ gbànye kwa nime ite ọzọ, mgbe ná-adịghị kwa anya o ju; na ọzọ kwa, na ọzọ kwa. Ma mmanụ ahụ ka jukwara dịka mgbe ọ malitere.

N’ezie nke a bụ ọlụ ebube Chineke. Mmanụ ahụ na-agba ruo mgbe ihe niile ihe ná-adịghị nime ya dị n’ụlọ ahụ jusịrị. Mmanụ ahụ wee kwụsị. Ha wee mee ngwa jekwuru Elaisha ịgwa ya ihe mere. O jughị ya anya. Ọ matara ihe Chineke ga-eme. Elaisha nwere okwukwe; nwanyị ahụ rubereisi; Chineke wee nye mmụba. Elaisha wee gwaa nwanyị ahụ di ya nwụrụ anwụ ka o ree mmanụ niile ahụ o nwere ugbu a; site kwa n’ego ahụ ọ pụrụ ịkwụ ụgwọ ya niile, nwee kwa ego ga-afọdụrụ ya na ụmụ ya iji biri.

Mmanụ nke Mmụọ Nsọ

Anyị onweanyị kwa, pụrụ ibutere Onyenwe anyị ihe ihe ná-adịghị nime ya ka ewee gbajuo ha. Anyị pụrụ inye onweanyị dịka ihe ihe ná-adịghị nime ya, wee nwee mmetụ nke Mmanụ nke Mmụọ Nsọ ka ọ na-abata nime anyị. Ma ọ ghaghị ịbụ ihe ihe ná-adịghị nime ya, nke ewepụsịworo ọchịchọ na uche nke anyị. Eleghịanya ite nke otù onye jupụtara na nganga, ma ọ bụ n’ọchịchọ nke ihe nke ụwa ma ọ bụ ego. Mmụọ Chineke agaghị agwakọta Onweya na ihe ndịa.

Anyị aghaghị iwepụ ihe niile bụ mmụọ nke onweonye nime anyị ewee mee ka anyị dị ọcha site n’ọbara Jisọs n’odudonsọ, mgbe ahụ ka anyị jikeere ka Mmanụ nke Mmụọ Nsọ sụbata nime ndụ anyị. Ọ ga-asụbata n’újú ọ bụrụ na anyị enyefee Onyenwe anyị onweanyị kpamkpam.

Nnabata nye Onye nke Chineke

N’ụzọ ebe Elaisha na-agafe ka ọ na-ejégharị n’ọlụ ya nye Jehova, ka otù èzínaụlọ ná-asọpụrụ Chineke bi ndị nwere obiụtọ ịnabata na ilekọta ya n’èzínaụlọ ha. A na-agụ ya n’omume ọma nye ụmụ mmadụ ịkpọbata onye ná-agafe n’ụlọ ha ọ bụrụ na ọ bụ anyasị ọ dị kwa ya mkpà inweta ebe ọ ga-abà. Ma mgbe nwanyị nwe ụlọ ahụ ghọtara na ọ bụ onye nke Chineke, o doziere ya otù ụlọ ntà na ihendina na tebụl na ihe ịdọba oriọna ka o wee nọdụ nkeọma mgbe ọ bụla ọ na-agafe n’ebe ahụ. Ọ chọrọ ịlụ ọlụ ntakịrị a dịka ọ na-alụ ya nye Onyenwe anyị.

Obi gị ò ghere oghe na ị pụrụ ịkpọbata Onye nzọpụta ka Ọ nọnyere gị? Ì nwere ebe nye Ya ebe Ọ pụrụ ịbata mgbe ọ bụla? Jisọs agaghị eji ike were Onweya tụkwasị mmadụ ọ bụla; ma lee obiụtọ Ọ na-enwe ịchọta otù mkpụrụobi jikeere maka Ya, ebe ana anabata Ya mgbe niile, ebe ọlụ adịghị egbochi mmadụ ịnabata Ya. Onyenwe anyị na-enye ngọzi mgbe niile Ọ bịara ịnọnyere mmadụ.

Ụgwọọlụ nke Nwanyị Ahụ

Elaisha matara omimi nke ịhụn’anya o nwetara site n’èzínaụlọ ntà a, o wee chọọ imere ndịa gosiworo ya obiọma otù ihe. O wee jụọ nwanyị ahụ ma ọ ga-achọ ka ya wegara eze ozi n’ihi ya, ma ọ bụ iwere ọnọdụ ya nwetara ya iruọma. Ma afọ juru ya n’ebe ọ nọ ọ na-ebi n’etiti ndị nke ya, ọ dịghị kwa iruọma ọ bụla ọ chọrọ ịrịọ. Ma Elaisha ka chọrọ inyere ya aka. Ọ ga-abụ na Gihezi na ndị èzínaụlọ ahụ emekọrịtawo karịa Elaisha, n’ihi na ọ matara na ha chọsiri ike inwe nwa nwoke; ya mere na Elaisha kpọrọ nwanyị ahụ gwa kwa ya na ọ ga-abụ nne. O chèghị na o kwuru eziokwu, ọchịchọ dị n’obi ya dị kwa ukwu na ọ chọghị ka ọ bụrụ okwu aga-eji mee okwu egwurịegwú. Ọ zara ya sị “É-è, onye-nwem, gi onye nke Chineke, agwala orù-gi nwayi okwu-ugha.” Ma Elaisha na-ekwu eziokwu, mgbe ná-adịghị kwa anya ọ mụọ nwa nwoke. Chee otú Elaisha na-eme ndị niile ọ na-ezute n’ijè ya obiụtọ! Ebe ọ bụla o jere otù onye ga-erite urù n’ijè ya.

Ọnwụ Nwa Ahụ

Mgbe arọ olenaole gabigara, mgbe nwa ahụ toliteworo. O jere n’ubi ebe nna ya na ndị ọlụ na-ebi ọka. Na mberede o nwere ihe mgbu n’isi ya ewee bulaga ya n’ụlọ. O wee nwụọ. Lee óké ihe ịma jijiji nke a bụ nye nne ya onye nweworo ọñụ na nwa ya nwoke n’arọ ndịa! Nwa ya nwoke anwụwo -- ma okwukwe ya anwụbeghị

Nne ahụ na-eru uju wee mee ngwa chọga Elaisha maka inyeaka. Ọ hụ ya ka ọ na-abịa wee ziga nwaokorọbịa ya ijé zute ya. Ọ pụrụ ịhụ na ọ nọ ná nsogbu, ma Chineke ekpugheghị ya nye ya. Otú ọ dị, nwanyi ahụ enweghị afọ ojuju n’okwu nke ya na nwaokorọbịa Elaisha. Ọ bịara ịhụ onye nke Chineke, ọ kwụsịghị kwa ruo mgbe o rutere n’ebe ọ nọ. Ka o gburu ikpere n’ụkwụ Elaisha, ọ dị ka iru uju ya karịrị nke ọ pụrụ ibu. Ọ tụwo egwù na óké ọñụ ya nwere ga-ebì n’iruuju. Ọ nọ n’ihe mgbu ugbu a karịa ka ọ ga-anọworị ọ bụrụ na o nweghị nwa. Elaisha nyere Gihezi mkpan’aka ya wee ziga ya n’ebe nwa ahụ nwụworo anwụ nọ, ma nne ya arapụghị Elaisha. Ọ matara na ike Chineke dịkwasị Elaisha, ma ihe banyere Gihezi edoghị ya anya.

Elaisha wee kwere isoro ya laa. Ha wee zute Gihezi n’ụzọ ka ọ na-alaghachị, o wee sị na nwa ahụ anwụwo n’ezie. Ma Chineke ka ga-alụ ọlụ ebube. N’elu ihe ndina Elaisha dị n’ụlọ ntà ahụ nwanyị ahụ doziwooro Elaisha ka atọgbọrọ nwa ahụ. Elaisha wee malite ikpe ekpere. Ọ dịwo otù mgbe Elaija mere ka nwa nwụrụ anwụ dị ndụ ọzọ, ọ bụ kwa na Elaisha anataghị okpukpu abụọ nke ike Elaija? N’ezie Chineke gaje ịlụ ọlụ ebube ahụ ọzọ site n’aka orù Ya kwesịrị ntụkwasịobi. Ka Elaisha setịrị onweya n’elu nwa ahụ, o nwere mmetụta na arụ nwa ahụ na-ekporo ọkụ. Ndụ abatawo kwa nime nwa ahụ nwụrụ anwụ. Lee ụbọchị obiụtọ nke a bụ n’èzínaụlọ ahụ mgbe Chineke gosipụtara ike Ya!

Afụfa Ọhịa ahụ Nsí Dị

Ná njègharị nke Elaisha ọ bịaghachiri n’ụlọakwụkwọ ndịamụma ahụ dị na Gilgal. Ihe siiri ụmụ akwụkwọ ahụ ike n’ihi na ụnwụ dị n’ala ahụ. Ka ha wee nweta ihe oriri, ụfọdụ ụmụokorọbịa abàwo n’ọhịa ịchịkọta akwụkwọ nrị, ha wee chịkọta afụfa ọhịa nsí dị. Mgbe ndịkom ahụ malitere iri, ha chọpụtara na ha na-eri nsí. Ọzọ Elaisha nọ nso inyeaka. Ọ bụghị ihe ọma na Elaisha na-anọ nso mgbe ọ bụla achọrọ ya? Onyenwe anyị na-anọ kwa nso mgbe niile inyere anyị aka mgbe Ọ dị anyị mkpà, ọ bụrụ na anyị bịe ndụ na-atọ Ya ụtọ wee rịọ Ya ka O biri nime anyị. Elaisha wee gwaa ụmụokorọbịa ahụ bụ ndịamụma ka ha tinye ụtụ ọka n’ite ahụ ihe niile ga-adị kwa mma. Ha mere otú ahụ, wee risịa nri ha ná-enweghị kwa nsogbu ọ bụla.

Achịcha ahụ Bara Ụba

Chineke na-arọpụtara ndịamụma Ya n’oge mkpụrụ ná-adịghị amị nkeọma. Otù nwoke bịara wetara Elaisha iri ogbe achịcha abụọ na ọka. Ogbe achịcha ahụ dị ntà, eleghịanya Elaisha pụrụrị irisi ha niile n’onwe ya, ma o jikeere ka ya na ndịkom ahụ agụụ na-agụ kee ya. O nwere mmụọ ná-achọ ikenye ndịọzọ. Jisọs siri: “Nēnyenu, agēnye kwa unu; ọtùtù ọma, nke abiadaworo ala, yọkọta, nke nējubiga kwa ókè, ka ha gēnye n’obi-unu” (Luk 6:38).

Gihezi chère na nke a bụ ihe dị ntà iché n’iru narị mmadụ, ma Elaisha gwara ya ka ọ gaa n’iru wee rubeisi n’ihi na Chineke ekwewo mkwà na ọ ga-ezu, ọbụná na ọ ga-afọdụ kwa. Mgbe enyeworo onye ọ bụla achịcha ahụ, ha mụbara ọbụná dịka ogbe achịcha ise na azụ abụọ ahụ nke Jisọs ji zụọ puku mmadụ ise mụbara. Narị ndịkom ahụ rijuru afọ. E, ọ fọdụkwara, dịka Chineke kweworo ná mkwà.

Ọ dị ka Elaisha adịghị enwe obi abụọ banyere okwu Chineke. Ọ bụrụ na Chineke kwuru ya ọ ghaghị imezu. Chineke ga-emere anyị karịa ọ bụrụ na anyị pụrụ ikwere na Ya n’otù okwukwe ahụ nke Elaisha nwere. Chineke enyewo anyị ọtụtụ mkwà; ọ bụrụ kwa na anyị eguzogide na ha, nye Ya onweanyị kpamkpam, wee kwere kwa, anyị onweanyị ga-enwe ọñụ ná ngọzi niile nke Chineke.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Gịnị bụ nsogbu nke nwanyị ahụ di ya nwụrụ anwụ?
  2. Ònye ka o jekwuuru maka inyeaka?
  3. Gịnị ka nwanyị ahụ di ya nwụrụ anwụ nwere n’ụlọ ya? òlee kwa otú esi ji ya nyere ya aka?
  4. Gịnị ka mmanụ bụ ụdị ya nime Baịbụl?
  5. Òlee otú anyị si enweta Mmanụ ahụ nime ndụ anyị?
  6. Gịnị bụ ụgwọọlụ enyere nwanyị ahụ doziiri Elaisha ụlọ?
  7. Òlee otú Elaisha si nyere ya aka n’ọdịn’iru?
  8. Kọwaa ihe banyere afụfa ọhịa ahụ nsí dị nime ya.
  9. Gịnị ka Elaisha ji ogbe achịcha na ọka ewetaara ya mee?
  10. Gịnị mere Elaisha ji pụ ịlụrụ Chineke ọlụ ebube?