2 Ndi Eze 5:1-27

Lesson 311 - Junior

Memory Verse
AMAOKWUIBUN’ISI: “N’ihi na échìchè nkem, ha abugh échìchè-unu, uzọ-unu kwa, ha abugh uzọm; ọ bu ihe si n’ọnu JEHOVA puta” (Aisaia 55:8).
Notes

Onyeisi Ụsụ Ndịagha

Anyị amụwo na Ụmụ Israel na ndị Siria na-ebuso onweha agha ọtụtụ mgbe. Nime otù n’agha ndịa ndị Siria dọtara otù nwa agbọghọ ntà Israel n’agha wee kpọrọ ya laa. Akpọgara ya n’ụlọ Neaman, o wee bụrụ orù na anọ kwa n’iru nwunye Neaman.

Neaman bụ nwoke dị mkpà n’ala Siria. Eze emewo ya onyeisi nke ụsụ ndịagha ya niile. Neaman bụ nwoke nwere obi ike, ọ lụwo kwa ọlụ ya nkeọma. Ụmụ mmadụ na-asọpụrụ ya n’ihi ezi ihe nke o mewooro obodo ya. Ọ bụ onye ukwu n’iru eze n’ihi na Onyenwe anyị enyeworo Neaman aka inwetara ala Siria nnapụta.

Mmadụ ga-echè na Neaman na èzínaụlọ ya ga-enwe obiụtọ. Ma iruuju dị n’èzínaụlọ Neaman. Ọbụná ọ bụ ezie na apụrụ ikwu ezi ihe niile ahụ banyere Neaman ọ dị otù ọnọdụ ná-eweta iru mgbarụ.

Ekpenta

Neaman bụ dike nke bụ dimkpà -- “ma ọ bu onye-ekpenta.” Ekpenta bụ ọrịa jọgburu onweya nke ndị dibịa ná-apụghị ịgwọ. Ịbụ onye ekpenta pụtara na aga ekewapụ ya site n’èzínaụlọ ya na n’ebe ndịenyì ya nọ ka ha wee ghara inweta ọrịa ahụ jọgburu onweya; ọ pụtakwara n’ezie na ọ gaghị enwe ike ịlụọlụ dịka onyeisi ụsụ ndịagha; ọ pụtara na ihe ọ ga na-ele anya ya bụ ogologo oge nke ọrịa rue mgbe ọ ga-anwụ.

Neaman nwere obi ike, ma obi ike apụghị ịgwọ ya. Neaman bụ onye nwere nsọpụrụ, ma nsọpụrụ apụghị ịgwọ ya. O nwere àkụnaụba, ma àkụnaụba apụghị ịgwọ ya. Ọ bụ onye ukwu, ma ịbụ onye ukwu apụghị ịgwọ ya. Eze, ndịenyì, ego, ọnọdụ -- ọ dịghị otù nime ndịa pụrụ ịgwọ Neaman. Ọ bụ na ọ dịghị nnapụta dịrị ọnọdụ ọjọọ nke a?

Nwa Agbọghọ ntà ahụ Adọtara N’agha

Nwa agbọghọ ntà Israel ahụ adọtara n’agha onye ná-eguzo n’iru nwunye Neaman maara ihe banyere Onyenwe anyị. Ná-arụghị ụkà, tupu adọrọ ya n’agha akuziworo ya ihe banyere Chineke nke Ụmụ Israel. Mgbe ọ nọ n’obodo ọzọ, o chèfughị ihe banyere ike nke Chineke. Mgbe ọ nụrụ banyere ekpenta Neaman ọ gwara nne ya ukwu na onye amụma nke Jehova pụrụ inyere ya aka inweta ọgwụgwọ.

Anyị amataghị ọbụná aha nwa agbọghọ ntà a. Anyị matara na o biri ndụ ziri ezi, na ọ na-ekwu kwa ihe banyere Onyenwe anyị mgbe ọ bụla o nwere ohere. Ndị ahụ kweere ya. Ọ dịghị onye ọzọ pụrụ ịgwọ ekpenta Neaman, ma ha kweere akụkọ nke nwa agbọghọ ntà ahụ.

Àmà DỊ Ndụ

Ọtụtụ Ndị Kraist na-ebi ná-alụ kwa ọlụ n’etiti ndị ná-ekweghị ekwe. Ha na-ebi ndụ ha nye Onyenwe anyị oge niile, ndịọzọ na-enwe kwa ntụkwasịobi nime ha. Mgbe ohere pụtara ha na-ekwu ihe Chineke pụrụ ime, ha na-agba kwa àmà nke ihe niile O meworo. Ikwu banyere ike dị nime Ọbara Jisọs ịzọpụta bụ ikwu banyere otù ọgwụgwọ dịrị mmehie na ọnwụ.

Ihe ọmụmụ ná-egosi anyị na ụmụntakịrị pụrụ ịgbasa Oziọma, nyekwara ndịọzọ aka. Ọ dịwo onye ị gwara banyere Jisọs na ike Ya ịzọpụta site ná mmehie? Ị na-ebi ndụ gị n’ụlọ na n’ụlọ akwụkwọ n’ụzọ nke na-eme ka ndịọzọ kwere ihe ị na-ekwu?

Nwa agbọghọ ntà ahụ biri n’ụlọ Neamna kwuru eziokwu mmadụ niile wee kwere ihe ọ kwuru. Ọbụná Ben-hedad bụ eze kweere akụkọ ahụ. Ọ gwara Neaman ka o jeruo Sameria. O nyere Neaman akwụkwọozi ọ ga-enye Jehoram, bụ eze Israel. Neaman werekwara ọtụtụ onyinye nke ọla-ọcha, ọla-edo, na uwe.

Otù Akwụkwọozi

Neaman wegaara eze akwụkwọozi ahụ. Edere nime ya ka ọ gwọrọ Neaman ekpenta dị n’arụ ya. Mgbe Jehoram gụrụ ya, ọ sị, “Ọ bu Chineke ka m’bu, ime ka madu nwua na ime ka madu di ndu?” Eze aghaghị ịmataworị na náánị Chineke pụrụ ịnapụta onye nwere ekpenta. Ọ bụ ihe amamihe ná-adịghị nime ya isi eze mee ihe dị otú a. Ọ dịghị n’ike eze Israel ịgwọ onye ọ bụla ọrịa nke a jọgburu onweya bụ ekpenta maọbụ ọrịa ọzọ ọ bụla. N’oge niile gaworo aga, Ben-hedad achọwo ihe niile bàra urù n’aka Ụmụ Israel ka ya wee ghara ibuso ha agha (I Ndi Eze 20:1-6). Jehoram chère na Ben-hedad na-agbalị kwa ọzọ iweta nsogbu site n’ịchọ ụzọ isi megide ya.

Onye Ná-ekwesịghị ekwesị

Ọ bụ na ọ dịghị inyeaka dịrị Neaman? Gịnị ka nwa agbọghọ ntà ahụ kwuworo? “Onye-amuma nke nọ na Sameria … gēme ka o si n’ekpenta ya di ọcha.” Neaman ejekwuruwo onye ná-ekwesịghị ekwesị. Onye amụma, ọ bụghị eze, nwere ike na Chineke. Site n’ijekwuru onye ná-ekwesịghị ekwesị, Neaman ka bu ekpenta ya, échìchè ọjọọ wee kpalie nime ya. Ọ bụ ihe dị mkpà taa nye ụmụ mmadụ ijekwuru onye kwesịrị ekwesị maka inyeaka. Otù Onye ahụ bụ Jisọs. Náánị Onyenwe anyị pụrụ ịzọpụta mmadụ site ná mmehie ya. Náánị Onyenwe anyị pụrụ iji ike Ya dị nsọ gwọọ onye arụ ná-adịghị ike. Ndịozi na ndịọzọ ná-eso ụzọ Onyenwe anyị pụrụ ikpe ekpere, ha pụkwara ịtụrụ mmadụ Jisọs aka, ma ọ dịghị mmadụ ọ bụla pụrụ ịzọpụta onye ọzọ site ná mmehie ya. “Aha ọzọ di iche adigh kwa n’okpuru elu-igwe, nke enyeworo n’etiti madu, nke anāghagh izọputa ayi nime ya” (Ọlu Ndi-ozi 4:12).

Onyeamụma Ahụ

Elaisha nụrụ ọgba aghara nke akwụkwọozi ahụ wetaworo. O wee zigara eze ozi n’okwu ndịa: “Ka ọ biakutem, ọ gāmara kwa na onye-amuma di n’Israel.” Neaman na ụgbọala ya na ịnyịnya ya wee bịa n’ụlọ Elaisha guzo kwa n’ọnụ-ụzọ ya. Otù orù wee pụta izí ozi Elaisha ziri ya. Ọ sị, “Je, sa aru ugbò asa nime Jọdan, anu-aru-gi gālaghachikute kwa gi, i gādi kwa ọcha.”

Kama ịñụrị ọñụ n’ụdị ọgwụgwọ dị mfé otú a, Neaman were iwe. Ọ bụghị ụzọ o lereanya. Ọ bụghị ya bụ onyeisi ụsụ ndị-agha nke Siria? Onyeamụma ahụ apụtaghị kwa ọbụná ikele ya ekele!

Ụzọ Nke Chineke

Ọtụtụ mgbe Chineke na-alụ ọlụ site n’ụzọ mmadụ ná-eleghị anya. Ụzọ nke mmadụ abụghị ụzọ nke Chineke. “Échìchè nkem, ha abugh échìchè-unu, uzọ-unu kwa, ha abugh uzọm; ọ bu ihe si n’ọnu JEHOVA puta. N’ihi na dika elu-igwe si di elu kari uwa, otú a ka uzọm nile di elu kari uzọ nile unu, ọ bu kwa otú a ka échìchèm nile di elu kari échìchè nile unu” (Aisaia 55:8, 9). Ọbụná ọ dị ụzọ ziri ezi n’iru mmadụ ma nsọtụ ya bụ ụzọ niile nke ọnwụ (Ilu 16:25). Mmadụ aghaghị irubere Chineke isi ka o wee nata ngọzi niile nke Onyenwe anyị.

Neaman chère échìchè banyere mmiri niile nke ala ya na nke Sameria. Ndị hụworo mmiri ndịa kwuru na mmiri niile nke Damaskọs dị ọcha ná-egbu kwa mara mara ebe Jọdan adịghị ọcha dị kwa apịtị. Neaman ga-ejikereworị ịsa arụ na mmiri nke ala ya, ma okwu Jehova site n’ọnụ onyeamụma bụ “Jọdan.” Neaman wee chigharịa ịla n’ọnụma n’ihi na ọ gaghị eweda onweya ịsa arụ nime Mmiri Jọdan.

Imikpu nime Jọdan

Ndịorù Neaman wee rụgide ya ka o rubeisi. Ha sịrị na ọ ga-emeworị ihe ukwu ọ bụrụ na onyeamụma nyere ya iwu ime ya, gịnị kpatara na ọ gaghị eme ihe ntà nke a -- “Sa aru, di kwa ọcha?” Neaman weere ndụm-ọdụ nke ndị orù ya. O wee bànye na Mmiri Jọdan. O mikpuru onweya ugbò asaa dịka okwu onye nke Chineke si dị. Ka ọ na-emikpu onweya, Neaman pụrụ isite n’obi abụọ ná-elegharị onweya anya ịmata ma ọ dị mgbanwe dị. Anyị agụtaghị na mgbanwe ahụ malitere ntakịrị ntakịrị. Mgbe Neaman rubeworo Chineke isi site n’imikpu onweya ugbò asaa, mgbe ahụ “anu-aru-ya we laghachi dika anu-aru nwaokoro ntà, o wee di ọcha.”

Otù a ka ọ na-adị mgbe mmadụ na-achọ Onyenwe anyị n’oge a. Ọ ghaghị irubeisi n’Okwu nke Onyenwe anyị. Mmadụ nwere ike jikere ịchọ Chineke n’ebe ọzọ ma ọ bụ n’oge ọzọ, ma náánị site n’irubere Chineke isi ka ọ ga-enwe ike ịnata ngọzi Chineke ma o kpere ekpere ugbò asaa ma ọ bụ otù ugbò.

Neaman pụrụ imikpu náánị ugbò isii wee laa, ná-enwetaghị ọgwụgwọ ahụ, wee na-asị na Chineke achọghị ịgwọ ya. Neaman nwapụtara Chineke site n’irubere Ya isi, ewee mee ka ọ dị ọcha. Ụfọdụ mmadụ na-agbalị ịrụ Chineke ụka. Ha na-agbalị ịnata ngọzi Ya site n’irubeisi ná-ezughị òkè; ma Chineke chọrọ nrubeisi zuru òkè.

Àmà Ya

Mgbe agwọrọ Neaman ekpenta ya, ọ laghachiri n’ụlọ onyeamụma ahụ. Ọ gbara àmà sị, “Biko, le, amawom na ọ digh Chineke di n’uwa nile, ọ bu nání n’Israel.” Lee otú obi ya jupụtara n’ekele na o nweere onweya site n’ekpenta ahụ! Neaman sịrị na site na mgbe ahụ gaa n’iru ya agaghị efè kwa chi ọzọ dị iche iche òfùfè. Neaman gaje ifè ezi Chineke dị ndụ òfùfè. Ọ rịọ ka enye ya “ibu ájá inyinya mule abua” ka o buru ya laa. Eleghịanya ọ chọrọ iwu ebe ịchụàjà nke ájá ala ebe ọ ga na-achụrụ Jehova àjà nsure-ọkụ (Ọpupu 20:24). Neaman nyere Chineke otuto n’ihi nnapụta Ọ napụtara ya wee chigharịa kwa laa n’obodo ya n’ebu ngọzi sitere n’ọnụ Elaisha.

Inwe Anya-ukwu

Orù Elaisha bụ Gihezi wee chụsoo Neaman. Gihezi chọrọ ụgwọọlụ ahụ nke Neaman nyeworo nna ya ukwu, nke Elaisha jụwokwara ajụ. Gihezi gwara Neaman okwu ụgha sị na Elaisha ziri ya ịnata onyinye niile ahụ ka o wee nye ya onye ọzọ. Mgbe Gihezi natasịworo ihe niile ahụ o zoo ha tupu ya alaghachikwuru onyenwe ya. Elaisha matara na Gihezi nwere anya-ukwu n’ụgwọọlụ ahụ, wee jụọ ya banyere uwe na ego niile ahụ. Gihezi agwaghị Elaisha eziokwu.

Ikwu okwu ụgha bụ mmehie. Náánị otù mmehie ga-emebi ezi ndụ nke mmadụ biworo. Mgbe mmadụ dabara n’ọnwụnwa wee mee mmehie, ọtụtụ mgbe otù mmehie ahụ na-eduba ná mmehie ọzọ. Gihezi bu ụzọ nwee anya-ukwu; emesịa ọ gwa Neaman okwu ụgha; ọzọ ọ gbalịa ikpuchi mmehie ya; o kwughị kwa eziokwu mgbe Elaisha jụrụ ya ebe o jeworo. Ná ndụ Gihezi, otù mmehie wetara mmehie ọzọ. Dịka ahụhụ enyere ya, ekpenta Neaman bịakwasịrị Gihezi. Otú a n’ihe ọmụmụ a, anyị amụtawo otú esi napụta otù nwoke bụ Neaman site n’ekpenta ya, na otú eji tie nwoke ọzọ bụ Gihezi otù ụdị ọrịa ahụ.

Ekpenta na Mmehie

Mgbe ụfọdụ a na-ekwu na ekpenta bụ ụdị nke mmehie. Nime nsọpụrụ niile nke Neaman, ekpenta dị ya n’arụ. Otú a ka ọ dị ná ndụ ọtụtụ mmadụ. Nime nsọpụrụ, àkụnaụba, ndịenyì, na ọnọdụ, mmehie dị nime ha. Ndị ahụ nwere ike inwe omume ọma ụfọdụ a ga-eji ná-ebuli ha, ma mmehie dị kwa nime ha. Aisaia Onyeamụma kpeere ụmụ mmadụ ekpere, na-asị, “Ayi we di ka onye ruru árú, ayi nile; na dika uwe emeruru emeru, otú a ka ezi omume nile ayi di” (Aisaia 64:6). Jehova kwuru okwu ndịa site n’ọnụ Jeremaia Onyeamụma: “N’ihi na ọ buru na i ji akanwu sa aru, i were kwa n’onwe-gi ọtutu nchà, ma akaworo ajọ omume-gi n’irum, ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi JEHOVA puta” (Jeremaia 2:22).

Náánị ọgwụgwọ dịrị ekpenta Neaman dị nime Onyenwe anyị. Otú a ka ọ dị kwa mmehie. Náánị ọgwụgwọ dịrị mmehie dị nime Ọbara Jisọs. Mmehie ná-ekewapụ mmadụ site ná ebe Chineke nọ. ọ na-eweta amamikpé na ọnwụ dịka ekpenta na-eme. Neamna weere onyinye ọ ga-enye onyeamụma ahụ. Ha dị ka iji-obi-chụọ-àjà niile mmadụ na-ewetara Chineke mgbe ha kpere ekepere na-enye kwa Ya ndụ ha. Apụghị iji ego zụta onyinye Chineke (Ọlu Ndi-ozi 8:20). Mmadụ na-enwe mmetụta inye Chineke otuto na iji-obi-chụọ-àjà igosi obi ekele n’ihi ngọzi Ya niile. Ọ dị mkpà na Neaman ga-erubeisi n’okwu niile Chineke zitere kpamkpam. Mgbe ụmụ mmadụ rubeere Chineke isi taa, mee kwa ihe O nyere n’iwu, a ga-asachapụ mmehie ha gbaghara kwa ha. À sachapụwo mmehie gị site n’Ọbara Jisọs? Ị na-ebi ndụ gị kwa ụbọchị nye Ya?

“Gini gasachapụ njọm?

Nání ọbara nke Jisọs;

Gini gēme ka m’we ndu?

Nání ọbara nke Jisọs.”

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Ònye bụ ọchịagha nke ụsụ ndịagha Siria?
  2. Òlee otú nwa agbọghọ ntà bụ onye Israel ji bịa n’èzínaụlọ Neaman?
  3. Gịnị bụ ihe ná-eme Neaman?
  4. Gịnị ka nwa agbọghọ ntà ahụ gwara ya ka o mee?
  5. Gịnị bụ ndahie Neaman dahiere?
  6. Gịnị mere eze ji chee na ọ bụ nsogbu ka ndị Siria na-achọ?
  7. Òlee otú Neaman si wezuga ekpenta ahụ?
  8. Gịnị bụ náánị ọgwụgwọ dịrị ekpenta Neaman?
  9. Kwuo otú ekpenta na mmehie ji yie.
  10. Òlee ụzọ mmadụ pụrụ isi wezuga mmehie ya niile?