Matiu 1:18-25; 2:1-23; Luk 2:1-40

Lesson 312 - Junior

Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISI: “Onye agọziri agọzi ka Ọ bu, bú Onye-nwe-ayi, Chineke nke Israel; n’ihi na O letawo ndi-Ya, lu-kwa-ra ha ọlu ngbaputa” (Luk 1:68).
Notes

Ụbọchị Ọmụmụ nke Otù Eze

Eleghịanya ụfọdụ ihe mere n’oge amụrụ Onyenzọpụta anyị, Jisọs Kraist, siiri anyị ike ịghọta; ma ha karịrị ihe nke anụ-arụ, anyị matakwara na ha bụ eziokwu dịka ekwuru ya nnọọ nime Baịbụl. Lee otú anyị jupụtara n’ekele na anyị kweere akụkọ niile banyere ndụ Jisọs, tinyekwara ọbịbịa Ya nime ụwa!

Mmụọ ozi bụ Gebriel onye bịakwutere Meri, bu ụzọ kwuo ihe banyere ọmụmụ Ya. Ọ gwara ya na arọpụtawo ya ịbụ nne nke Ọkpara Chineke. Ọzịzá nke Meri nye Gebriel bụ: “Le, abum orù-nwayi nke Onye-nwe-ayi; ya dirim ka okwu-gi si di” (Luk 1:38). Mmụọ ozi wee si n’ebe ọ nọ pụọ.

Otù kpakpando, ìhè karịrị nke ụwa, gosiri ebe ahụ amụrụ Nwa ahụ dị ebube. Ìhè ya duru ndị amamihe ahụ site n’obodo dị anya bịa ịkpọ isi-ala nye Jisọs, nye kwa Ya onyinye. Ihe ndịa niile dị ka ha abụghị ezie, ma mgbe mmadụ nọdụrụ duu wee chee échìchè na Ọkpara Chineke, Onyenzọpụta, na Onye mgbapụta nke ụwa na Eze ebighịebi gaje ịbịa, ọ gaghị abụ ihe ijuanya karịa ma asị na ọ dịghị ihe ebube ọ bụla mere tupu ọbịbịa Ya?

Ijeru Betlehem

Ndị mmụọ ozi gwara ndị ọzụzụ atụrụ nọ n’akụkụ ugwu sị, “Unu gāhu Nwa ọhu ekere n’ákwà okiké, nēdina kwa n’ihe anētinye nri anu-ulo” (Luk 2:12). Ha wee mee ngwa jeruo Betlehem ịhụ Nwa ọhụụ ahụ, ha wee laghachikwute kwa ìgwè atụrụ ha, ná-eto Chineke. Ndị amamihe sitere n’Ọwụwa anyanwụ bịaruo obodo Jerusalem, nke bụ isi obodo okpukpé nke ụwa. Ha jụrụ sị “Òle ebe Ọ nọ, bú Onye amuru ibu Eze ndi-Ju”? Ha si n’ebe dị anya bịa, ma ha aghọtaghị na ha bụ ndị ga-akọ akụkọ ọmụmụ Onyenzọpụta. Obi lọrọ Herod bụ eze na Jerusalem niile mmiri. Òlee ebe aga-amụ Kraist? bụ ajụjụ eze jụrụ ndịisi nchụàjà na ndị ode akwụkwọ. “Na Betlehem nke Judia,” ka ha sịrị. Ajụjụ ya ọzọ bụ “oge” kpakpando ahụ pụtara. Ha enweghị obi abụọ banyere ihe eze ọjọọ ahụ bu n’obi, kama ha gwara ya ihe niile. Herod wee sị, “Ganu chọputa nke ọma okwu banyere Nwatakiri ahu; ma mgbe ọ bula unu gāchọta Ya, bia kọrọm, ka mu onwem we je kwa kpọ isi ala nye Ya” (Matiu 2:8). Ma eze ahụ enweghị ọchịchọ ijé kpọọ isi-ala nye Eze ahụ amụrụ ọhụụ -- ọ gbalịrị ka egbuo Ya.

Òlee ihe banyere ndị nọ na Jerusalem? Ànyị ahụghị ha ka ha biliri ijéru Betlehem. Òlee otú o si mee na ha amataghị na ihe ra ka maịlị isii site n’ebe ahụ na amụrụ otù Eze? Site n’Ọwụwa anyanwụ, ndịọbịa bịara ná-achọ Eze ahụ amụrụ ọhụụ. Ha chọtara Ya nye kwa Ya onyinye. Ekwuwo na enyere ọla-edo igosipụta ọnọdụ Ya dịka eze, frankincense ná-egosipụta Ya dịka onye nchụàjà, ebe myrrh na-egosipụta ahụhụ Ya. Otú ọ dị, ọ bụ omen’ala n’oge ahụ inye ndịeze na ndịisi onyinye, ana-eme kwa ya ruo taa.

“Onye nwere Ọtụtụ Ihe mgbu

Ndị amamihe ahụ dara n’ala n’iru Jisọs wee kpọọ isi-ala nye Ya; ma tupu ha laghachị n’ụlọ ha, Chineke dọrọ ha aka-ná-ntị ka ha ghara ịlaghachikwuru Herod, kama ka ha laa n’obodo ha site n’ụzọ ọzọ.

Tupu amụọ Jisọs, ekwuru banyere Ya dịka “onye nwere otutu ihengbu na onye mara ọria nke-ọma” (Aisaia 53:3). Mgbe ná-adịghị anya site na mgbe Ọ bịara n’ụwa nke a, ọ bụrụ Onye “eledara anya, ọ bu kwa onye madu rara aka.” Nsogbu bịakwasịrị Ya mgbe ọ dị ntakịrị; ọ dịghị ụlọ dị n’ụlọ ana-eleta ndịọbịa, mgbe ọ ka dị kwa náánị ntakịrị, aghaghị iduru ya jee n’Ijipt ka O wee gbanarị àtụmààtụ nke eze ahụ jupụtara n’ekworo.

Herod bụ eze chère na ndị amamihe ahụ kwara ya emò mgbe ọ chọpụtara na Nwatakịrị ahụ na ndị mụrụ Ya erughị ya aka. É-è, Herod, ọ bụghị ndị amamihe ahụ kwara gị emò, kama Chineke onye na anọdụ n’oche eze bụ onye kwara gị emò. Ọ na-elekọta Nwa Ya dị ngọzi, Nwa ọhụụ ahụ bụ Jisọs, onye ná-aghaghị ịnwụ otù ụbọchị, ma ọ bụghị site n’aka gị.

Eze ahụ n’iwe ya zipụrụ òtù ndị ogbu mmadụ igbu ụmụ ntakịrị niile nọ na Betlehem ndị gbara arọ abụọ rịdaa. Nwa nke eze ọjọọ a, bụ Herod ọzọ, gburu Jọn Onye ọwụmmiri, chịa kwa Kraist ọchị; nwanwa ya gburu Jemes Onyeozi; ọ bụ kwa nwanwa nwa ya, bụ Herod Agripa nke abụọ bụ onye ekpere Pọl Onyeozi ikpé n’iru ya. Lee óké ahụhụ na-echere èzínaụlọ nke ndị ọchịchị a ndị nwere obi ọjọọ n’ebe Jisọs, Ọkpara Chineke, na ndị ná-eso Ya nọ!

Site ná nrọ nke Onyenwe anyị zitere, atụziiri Josef aka ebe ọ ga-eje. O rubereisi wee kuru Nwatakịrị ahụ na nne Ya gaa n’Ijipt wee nọgide n’ebe ahụ ruo mgbe Herod bụ Eze nwụrụ. Mgbe ha nọ n’Ijipt, Onyenwe anyị gwara Josef ọzọ ebe ha ga-eje -- n’oge a na Nazaret nke dị na Galili. Nke a ka amaara dịka “obodo nke aka ha” (Luk 2:39), ebe Josef na Meri si bilie mgbe ha jere Betlehem ịtụ ụtụ-isi ha, tupu amụọ Jisọs. Na Nazaret a ka Jisọs na Meri na Josef biri, mgbe Ọ gbakwara arọ iri na abụọ O soro ha jee Jerusalem idebe Ememe Ngabiga (Luk 2:41, 42).

Ihe Ọ bụ Nye Anyị

Anyị na-agụ nime Baịbụl na, “Ya onwe-ya huru ayi n’anya, we zite Ọkpara Ya” (I Jọn 4:10). Ọ bụ ezie na ụfọdụ mmadụ na asị na náánị ihe eji zite Jisọs n’ụwa bụ ikuziri ụmụ mmadụ otú esi ebi ndụ, anyị maara na ọbịbịa Ya n’ụwa bụ ihe dị ukwu nye mmadụ karịa nke ahụ. “N’ihi na Chineke huru uwa n’anya otú a, na Ọ nyere ọbụná Ọkpara Ọ muru nání Ya, ka onye ọ bula nke kwere na Ya we ghara ila n’iyi, kama ka ọ nwe ndu ebigh-ebi” (Jọn 3:16). Taa kwa, ọ fọdụrụ ntakịrị ka o ruo puku arọ abụọ (2000) site na mgbe amụrụ Kraist Onyenzọpụta, ndị niile kwere na Ya site n’obi ha, chègharịa site ná mmehie niile ha, rịọ kwa Ya ka Ọ bata nime obi ha, na-enweta mgbaghara nke mmehie ha site n’Ọbara Jisọs nke awụsịrị n’elu Obe na Kalvarị. Edoziwo ụlọ n’Eluigwe nye ndị niile agbagharawooro mmehie ha, ndị edewokwara aha ha n’Akwụkwọ nke Ndụ.

Kristmas ọ bụ oge nááṅị inyerịta onyinye nke ụwa n’etiti ndị ahụrụ n’anya na ndịenyì? Nye Onye Kraist ọ bụla, Kristmas bụ oge icheta ọmụmụ nke Onyenzọpụta, Onyemgbapụta, na ọbịbịa nke Eze anyị dị nso. Gịnị ka Kristmas bụ nye gị?

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Gịnị bụ aha niile ọzọ a na-akpọ Jisọs?
  2. Òlee otú Herod si mee omume mgbe ọ nụrụ akụkọ banyere ọmụmụ Jisọs?
  3. Gịnị bụ ajụjụ niile ọ jụru ndị amamihe ahụ?
  4. Kwuo otú esi duruo ndị amamihe ahụ n’ụlọ ebe amụrụ Jisọs.
  5. Òlee otú esi dọọ ha aka-ná-ntị ka ha ghara ịlaghachikwuru Herod?
  6. Òlee otú esi dọọ Josef aka-ná-ntị banyere àtụmààtụ ọjọọ nke Herod?
  7. Kwuo ihe Herod bụ Eze mere mgbe ọ hụrụ na emere ya ihe-ọchị.
  8. Òlee obodo amatara dịka “obodo nke aka” èzínaụlọ a dị nsọ?
  9. Kwuo banyere ọbịbịa nke ndị ọzụzụ atụrụ na Betlehem.