Habakuk 2:4; Ndi Rom 1:16, 17; Ndi Galetia 3:10, 11; Ndi Hibru 10:35-39; Ndi Rom 5:1-21

Lesson 313 - Junior

Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISI: “Ma onye ezi omume nkem gēsite n’okwukwe di ndu: ọ buru kwa na ọ gēwezuga onwe-ya, ihe-ya adigh nkpuru-obim ezi nma” (Ndi Hibru 10:38).
Notes

Otù Njèm ruo Rom

N’oge dị anya gara aga, arọ olenaole site na mgbe Columbus chọpụtasịworo obodo Amerịka, ndịkom abụọ wezugara onweha iche n’ihi ozi nke Chineke sitere n’ụlọ ebe ha na-anọ na Germany jee njèm ijé hụ Pope na Rom nke dị n’obodo Italy. Ọ bụ ijè dị anya, ha jekwara ijè ọtụtụ ízù n’ike ọgwụgwụ. Ma ha nwere obiụtọ n’ihi na ha nwere mmetụta na ha nọ n’ozi nye Onyenwe anyị. Nsogbu dị na Nzukọ nke dị n’ụlọ ha, ha enwewo kwa olileanya ịgwa Pope banyere ya ka ewee dozie ya n’ihi otuto nke Chineke.

Otù onye nime ndịkom ahụ bụ Martin Luther. Azụwo ya rịị ịbu onye ọka ikpé, ma ọtụtụ ihe emewo nke mere ka o kpebie ịbụ onye nchụ-àjà. Nke mbụ, ọ chọtara Baịbụl nime ebe ana-edebe akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ ha ebe ọ na-amụ ihe. N’oge ochie náánị Baịbụl olenaole dị, edekwara ha n’asụsụ mbụ eji dee Baịbụl nke bụ Hibru na Grik, ma ọ bụ na Latin. Ka Luther na-agụ, o nwetara agụụ dị omimi ịmata karịa banyere eziokwu nke Chineke. Ọtụtụ ihe ọzọ dị iche iche wee mee nke mere ka o kwee mkwà iwere ndụ ya jeere Chineke ozi. O mezuru mkwà ahụ, wee doo ndụ ya nsọ ibi ndụ nke ịgọnarị onwe, bie kwa ndụ di mfé dịka ọ pụrụ ka o wee mee ihe ga-atọ Chineke ụtọ site n’àjà ya.

Mmebi Emebiri Échìchè Luther

Mgbe Martin Luther batara na Rom, emebiri échìchè ya site n’àkụnaụba na ọnọdụ dị elu niile a na-egosi nke ọ hụkwara nime Ụlọ nzukọ ahụ. O kwerewo na ndụ nke Onye Kraist bụ ndụ dị mfé, ya mere ihe niile ahụ na-egbu maramara dị ka mmehie dị ukwu n’anya ya. Ọ hụkwara ọtụtụ mmadụ ná-eme ihe akuziwooro ya na ha adịghị mma. Pope n’onweya, onye ọ bịakwuteworo maka inyeaka ime ka Nzukọ dị na Germany dị ọcha, enweghị mmasị ọ bụla idozi ihe ahụ ná-adịghị mma. Nime mgbagwoju-anya mgbe ọ hụworo ihe niile ahụ, Luther malitere ikpe ekpere na inye onweya ahụhu site n’irigo otù ihe nrigo edoro nsọ, Chineke wee zaa ya.

Okwu nke Chineke

Ndịa bụ okwu Chineke gwara Martin Luther: “Onye ezi omume gēsite n’okwukwe di ndu.” Ọ bụ ahịrị okwu dị mkpụmkpụ; ma óké eziokwu nke ná-adị ebighịebi dị nime okwu niile ahụ. Ezi omume niile nke Luther meworo enwetaraghị ya ndụ ebighịebị. Ọ bụrụ na ọ ga-abu onye eziomume n’iru Chineke, ọ ghaghị ịbịa dịka onye mmehie ọ bụla na-abịa taa: ikwere n’Onyenwe anyị Jisọs Kraist ruo nzọpụta. Ịrigo na ịrịda n’ihe nrigo ahụ n’ọbu-aka na ikpere ya azọpụtaghị mkpụrụobi ya. Onye eziomume ga-esite n’okwukwe dị ndụ!

Mgbe otù ọnwa ọ nọ na Rom gasịrị, Martin Luther na enyì ya laghachiri na German. Okwu niile ahụ na-asụgharị n’obi ya mgbe niile, “Onye ezi omume gēsite n’okwukwe di ndu” -- okwukwe nime Jisọs Kraist. Site n’okwukwe Martin Luther chọtara udo ahụ nke obi ya chọsiworo ike.

Mgbe ọ laruru ụlọ ọ malitere ikwusa eziokwu ahụ, ná-ede kwa akwụkwọ banyere ya. Ma Nzukọ Catholic bụ Nzukọ ná-achị achị n’oge ahụ, akuziwokwara ụmụ mmadụ na okwu Pope dị mkpà nke ukwu karịa Okwu Chineke. N’ihi nke a óké ịrụ ụkà malitere n’ihi mkwusa nke Luther.

Nwezuga Site N’ụlọ-nzukọ

Martin Luther enweworị ntụkwasịobi ná Nzukọ, o nweghị kwa ọchịchọ iwezuga onweya. O chère na nsogbu dị n’ụfọdụ ndị nọ ná Nzukọ, na ọ bụrụ kwa na emesoo ha mee kwa ka ha hụta eziokwu, na ihe niile ga-adị mma. Ma ọ chọpụtara n’ikpeazụ na ọ bụrụ na ya ga-eguzoro eziokwu niile nke Baịbụl, na ya ga-eguzo megide Nzukọ.

Ụbọchị bịara mgbe akpọrọ Martin Luther ka o guzooro eziokwu nke Okwu Chineke n’iru ndị karịrị narị mmadụ abụọ bụ ndị ji ọkwá dị ukwu; ụfọdụ nime ha bụ ndị Pope zitere, ndịọzọ bụ ndị ọchịchị na German. Akpọrọ nzukọ a Diet (Nri), emekwara ya na Worms nke dị na German, n’ihi nke a ka ana-akpọ ya Diet nke Worms.

Ụmụ mmadụ ruru puku anọ gbakọtakwara ịhụ ikpé ahụ a ga-ekpe Luther. O ji obi nwayọ guzo n’iru ndị ahụ na-ebo ya ebubo iwe ji, ná ntụkwasịobi na ụzọ ya ziri ezi, na Chineke agaghị arapụ kwa ya.

Ajụrụ ya ajụjụ ma ọ bụ ya dere akwụkwọ niile ahụ dị n’iru ya, o wee zaa na ya dere ha. O jikeere ibibi nke ọ bụla nime ha ahụrụ na o megidere Akwụkwọnsọ; ma ọ bụrụ na apụghị ịchọta, na ya agaghị ewepụ otù mkpụrụ okwu.

Lee otú obi anyị ná-aghaghị ijupụta n’ekele nye nwoke ahụ onye jikeere iguzoro Okwu Chineke megide ndịeze na ndịisi na ndịụkọ Chukwu. O nwere ike ịpụta ọnwụ ya; ma ndụ ebighịebi dị mkpà nke ukwu nye nwoke a nwere obi ume-ala bụ kwa nwa Chineke. Ka Chineke nye anyị mkpebi na nguzosi ike dị otú a nime obi anyị ka anyị ghara ikwenyere ike ọjọọ ọ bụla, kama ka anyị were obiike guzoro ezi ihe ọ bụ ezie na ọ pụrụ iwere ndụ anyị!

Enyere Luther ohere ọzọ ịgbanwe ihe ahụ o kpebiworo, ma o jiri obiike kwuo sị: “Apụghịm, agaghị kwam ekwugharị ihe ọ bụla. Ebe a ka m’guzo. Apụghịm ime ihe ọzọ dị iche. Ya mere Chineke nyerem aka. Amen.”

Óké ọgba aghara dị ukwu dapụtara n’ụlọ ahụ na ọ bụ ijisi ike ka apụrụ ịnụ okwu ikpeazụ o kwuru. Ọ bụ ezie na ndị ahụ na ewe iwe n’ihi na o nwere obiike otú ahụ ikwujọ Pope, ma ha enweghị ike imetụ ya aka n’ihi na ekwewo ya mkwà ịbịa na ịla n’udo site na nzukọ ahụ.

Ná Nzuzo

Mgbe ọ na-ala n’ụlọ ya, ijé nke ọtụtụ ụbọchị, ndịenyì Luther jidere ya zoo ya ihe fọdụrụ ntakịrị ka o rue otù arọ n’otù ụlọ dị n’elu ugwu. N’oge ahụ o dere ọtụtu akwụkwọozi nke ịgba-ume nye ndị naraworo òzìzì ya. Otú ọ dị, ọlụ nke kachasị mkpà ọ lụrụ bụ ọlụ nke ịtụgharị Testament Ọhụụ n’asụsụ German. Mgbe emesịrị, ọ tụgharịkwara Testament Ochie; ọ bụ kwa ezie na ọ bụ ọtụtụ arọ gara aga n’arọ 1521, ọ dịghị ntụgharị ọzọ emeworo n’asụsụ German ka ya mma.

Mmalite nke Imezi Ihe

Otú a ka Imezi ihe n’okpukpé si malite site n’obiike, okwukwe na ịhụn’anya nke otù onye nye eziokwu. Ìhè nke Oziọma amụwawo ọzọ mgbe ọtụtụ narị arọ nke Ọgbọ Ọchịchịrị gasịrị nke soro ọnwụ nke ndị malitere Nzukọ mbụ. N’ihi na o nwere obiike iguzoro eziokwu nke Chineke nyere ya -- “Onye ezi omume gēsite n’okwukwe di ndu” -- Luther tiwara ike ukwu nke Nzukọ Catholic wee gosipụta na mmadụ niile nwere ohere ichègharị site ná mmehie ha na ịchọ mgbaghara site na Jisọs na Ọbara Ọ wụsịrị na Kalvari.

Akuziworo Luther na ọ ghaghị ikpuchi mmehie nke onweya site n’ịta onweya ahụhụ na ịchụàjà dị iche iche. Ọ gbalịsiwo ike isite n’ọlụ meere onweya ụzọ ịbànye n’Eluigwe, ma ọ dịghị mgbe ọ chọtara udo. Ọ dịghị mgbe o doro ya anya na Chineke anabatawo ya. Ugbu a ọ matawo eziokwu nke Baịbụl: “Kwere n’Onye-nwe-ayi Jisus, agāzọputa kwa gi” (Ọlu Ndi-ozi 16:31). “Ọ bu amara ka ejiworo zọputa unu, site n’okwukwe; nka esitegh kwa n’onwe-unu: ọ bu onyinye Chineke: o sitegh n’ọlu, ka onye ọ bula we ghara inya isi” (Ndi Efesọs 2:8, 9). Ọtụtụ ugbò ka o chègharịworo ná mmehie ya, ná-emezu ihe ahụ Chineke chọrọ (Mak 1:15), ma ọ dịghị mgbe o kwere ruo nzọpụta. Ugbu a Luther matara na Chineke agbagharawo ya, n’ihi na Mmụọ Chineke gbara-àmà ya; o wee ná-ejezu ebe niile ná-ekwusara mmadụ niile na ha pụrụ ịmata na azọpụtawo ha site ná mmehie.

Ọ Bụghị Òzízí Ọhụụ

Eziokwu ahụ na apụrụ ịzọpụta ụmụ mmadụ site n’okwukwe na Jisọs abụghị òzízí ọhụụ mgbe Luther kwusara ya. Náánị na ọ pụtakwara ìhè ọzọ mgbe Ọgbọ Ọchịchịrị gasịrị. Ndịozi na ndị ná-eso ụzọ Jisọs n’oge nke Ya kuziri ya, ọbụná kwa ndị nsọ nke Testament Ochie kwere ma bie ndụ ha dịka òzízí ahụ si dị. “Onye ezi omume gēsite n’okwukwe di ndu” abụworị iwu nke Chineke nye ndị ná-eso ụzọ Ya siterị na mgbe Ọ malitere imeso ụmụ mmadụ. (Okwukwe pụtara ikwere na Jisọs ruo na mmadụ ga-ejikere ịrapụ mmehie ya niile. Ndị eziomume bụ ndị ná-asọpụrụ Chineke ga-anọ ná njikere izute Jisọs mgbe Ọ ga-abịa.)

Okwukwe Ebel

Ụmụ abụọ eburu ụzọ mụbata n’ụwa a wetaara Chineke ihe ịchụàjà. Ajụrụ onyinye Ken n’ihi na ọ bịakwuteghị Chineke n’ụzọ kwesịrị ekwesị. Chineke sịrị ya: “Ọ buru na i nēme nke-ọma, ọ bugh ngbasa-iru ka i gēnwe? ọ buru kwa na i megh nke-ọma, n’ọnu-uzọ ka nmehie nāmakpu dika anu-ọhia” (Jenesis 4:7). Ọ bụrụ na o nwere okwukwe dịka Ebel nwanne ya nwoke nwere, ọ ga-abụworị onye eziomume, mee kwa nkeọma. Ọ bụ site n’okwukwe ka “Ebel ji che àjà n’iru Chineke nke ka àjà Kain chere nma, nke esitere na ya gbara ya àmà na ọ bu onye ezi omume” (Ndi Hibru 11:4). Eziomume nke Ebel, siterị na mmalite nke oge, sitere n’okwukwe.

Okwukwe nke Ndị Nna anyị Ochie

Pọl Onyeozi na-agwa anyị sị: “Abraham kwere Chineke, ewe gua nke ahu nye ya n’ezi omume” (Ndi Galetia 3:9). Abraham onye eziomume biri ndụ site n’okwukwe.

Noa nwere ọñụ n’eziomume nke sitere n’okwukwe, ọbụná tupu ewere Iju mmiri mebie ụwa. Pọl na-ekwu banyere ya sị: “Noa, mgbe Chineke dusiri ya ọdu banyere ihe akāhugh anya rue oge ahu, ebe ọ turu egwù Chineke, ọ bụ okwukwe ka o ji dozie ugbọ izọputa èzí-na-ụlọ-Ya; o site-kwa-ra na nka ma uwa ikpé, we ghọ onye-nketa nke ezi omume ahu nke di n’uzọ okwukwe” (Ndi Hibru 11:7)

Okwukwe nke a sitere n’ikwere na Jisọs onye a na-amụbeghị. Jisọs kwuru banyere Abraham sị: “Obi tọrọ nna-unu Abraham utọ nke-uku ihu ubọchim; ọ we hu ya, ñuri kwa ọñụ” (Jọn 8:56). Job sịkwara: “Mu onwem amawo na Onye-ngbaputam di ndu, na O gēbili kwa ọtọ n’elu ájá n’ikpe-azu: … Onye mu onwem gāhuru onwem, anyam abua gāhu kwa Ya, Ọ bugh kwa onye ala ọzọ” (Job 19:25-27). Devid wee sị: “Mu onwem, n’ezi omume ka m’gāhu iru-Gi: ka afọ jum n’udi-Gi, mgbe m’tetara” (Abù Ọma 17:15). O doro ya anya nkeọma na Jisọs na-abịa, ọ bụ kwa site n’okwukwe ahụ ka azọpụtara ya jikere kwa ya izute Ya.

Okwukwe Ruo Nzọpụta

Mgbe Pọl Onyeozi sịrị, “Kwere n’Onye-nwe-ayi Jisus, agāzọputa kwa gi” (Ọlu Ndi-ozi 16:31), ọ dara ka ihe dị mfé. Ma n’oge ọzọ ọ kọwara ihe banyere inwe nzọpụta karịa mgbe ọ sịrị: “Ọ buru na i gēwere ọnu-gi kwuputa Jisus na Ọ bụ Onye-nwe-ayi, ọ buru kwa na i gēwere obi-gi kwere na Chineke mere ka O si na ndi nwuru anwu bilie, agāzọputa gi” (Ndi Rom 10:9). Anyị aghaghị ikwere site n’obi anyị niile na Jisọs bụ Ọkpara dị nsọ nke Chineke ka ewee zọpụta anyị. Mmụọ Chineke aghaghị kwa ikuziri anyị otú anyị ga-esi mee nke ahụ. Apụghị ịzọpụta anyi ma ewezuga inyeaka nke Mmụọ Chineke nke ná-adọrọ anyị rue Ya nso.

Mgbe Jisọs jụrụ ndị ná-eso-ụzọ Ya sị: “Ọ bu onye ka unu onwe-unu si na Mu bu?” Pita wee zaa sị, “Gi onwe-gi bu Kraist ahu, Ọkpara Chineke di ndu,” Jisọs gwara ya sị: “Anu-aru na ọbara ekpughe ya nye gị, kama ọ bu Nnam Nke bi n’elu-igwe” (Matiu 16:13-17). Ọ dị mkpà na Mmụọ Chineke ga-ekpughe eziokwu a nye Pita na Jisọs dị nsọ.

Obi na-atọ anyị ụtọ taa na Oziọma dịịrị onye ọ bụla chọrọ. Obi anyị jupụtara n’ekele na Baịbụl bụ akwụkwọ ghere oghe, ebe anyị niile pụrụ ịchọpụta eziokwu nke na-eme ka anyị nwere onweanyị. Anyị na-añụrị kwa ọñụ n’ike dị n’Ọbara Jisọs idebe ndị Ya ka ha ná-ebi ndụ ná-enweghị mmehie.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Ònye ka ekelere n’ihi ịmalite Imezi ihe n’okpukpé?
  2. Kọwaa ihe mere na Diet nke Worms.
  3. Gịnị bụ isi ebe ọgụgụ sitere n’Akwụkwọnsọ nke Oge Imezi ihe ahụ?
  4. Ònye bụ onye mbụ, nke edere akụkọ ya na Baịbụ, azọpụtara site n’okwukwe?
  5. Òlee otú esi gụọ Abraham, Noa, na Job ná ndị eziomume?
  6. Òlee otú anyị si mata na Abraham kwere na Jisọs?
  7. Òlee otú Pita si mara na Jisọs bụ Ọkpara Chineke?
  8. Gịnị ka mmadụ ga-eme ka ewee zọpụta ya, tinyere n’ikwere n’Onyenwe anyị Jisọs Kraist?