2 Ihe Emere 19:1-11; 20:1-30

Lesson 306 - Junior

Memory Verse
AMAOKWU IBUN’ISI: Kpọre uzọ-gi nile rue JEHOVA aru; tukwasi kwa Ya obi, Ya onwe-ya gēme kwa ya” (Abù Ọma 37:5).
Notes

Ebere Nke Chineke

Jehoshafat laghachịrị n’ụlọ ya mgbe agha ahụ megide ndị Siria gasịrị. Dịka okwu nke amụma si dị, egburu Ehab, Eze Israel, n’agha ahụ. Onyenwe anyị napụtara ndụ Jehoshafat mgbe ndịiro gbara ya gburugburu. Chineke egosiwo Jehoshafat ebere site n’inye ya ohere ka ọ laghachị n’ụlọ ya n’udo.

Ihe Yiri Ajọ Ihe

Ndị agha niile nke Ụmụ Israel na Juda agbasasịwo. Ha enweghị mmeri n’agha ha lụrụ. Jihu, nwa nke onye amụma, gwara Jehoshafat ihe kpatara ha ji daa, na iwe nke Onyenwe anyị na-adịkwasị kwa ha. Jehoshafat na Ehab nwoke kpọrọ Maikaia bụ onyeamụma nke Jehova asị, jikọtara ndịagha, Ehab bụ kwa onye kpọrọ Elaija, Onye amụma ọzọ, onyeiro ya (2 Ihe Emere 18:7; I Ndi Eze 21:20). Site na njikọta ya na Ehab, ọ dị ka Jehoshafat na-enyere Ehab aka ná mmehie ya, dị kwa ka Jehoshafat ọ hụrụ nwoke a n’anya bụ onye kpọrọ Chineke asị. Tupu oge a, Jehoshafat egosipụtawo na ya chọrọ ime ihe ziri ezi. O doziwo obi ya ịchọ Chineke. O mewo ka Juda dị ọcha site n’iwezuga ebe niile dị elu nke òfùfè arụsị. Ma ugbu a o mere ndahie site n’ikwenyere Ehab na isoro ya jee agha.

Devid Onye dere Abù Ọma sịrị na ya kpọrọ ndị kpọrọ Chineke asị asị, na ya weere ndịiro nke Chineke dịka ndị iro ya, na ya na ndị ajọomume adịghị emekọrịta kwa ihe (Abù Ọma 139:21, 22; 26:5). Site n’ihe odide nke Pọl Onyeozi anyị na-agụ: “Nākpọnu ajọ ihe asì; nāarapara ezi ihe n’aru”; na, “Unu etiyela aka n’aha ajọ ihe ọ bula” (Ndi Rom 12:9; I Ndi Tesalọnaika 5:22). Jehoshafat emeghị nke ahụ, wee dahie óké ndahie.

Ịlaghachịkwute Chineke

Jehoshafat laghachịrị n’ọlụ ya nke ọchịchị na Juda. o wee jegharịa n’obodo ahụ “me ka ha laghachikute JEHOVA, bú Chineke nke ndi bu nna-ha.” Eleghịanya njikọta nke ya na Ehab ná-ekpere arụsị jikọtara emewo ka ndị ya cheè na o kwenyere n’ikpere arụsị. Ka mmekọrịta ya na Ehab wee ghara iweta mmetụta ọjọọ, Jehoshafat jègharirị n’ala ahụ niile ime ka obi ndị ya guzozie. Ọ bụrụ na ọ dị ihe ọ bụla o mebiwooro ndị ya site ná njikọta nke ndịagha ya na Ehab jikọtaworo, o jègharịrị idozi na iweghachị Juda n’ifè Jehova òfùfè.

Ndịikpé

Jehoshafat wee guzoo ụlọ ikpé nke eziomume gburugburu ala ahụ niile. Ndị ahụ arọpụtara ịchị ụlọ ikpé ka o nyere iwu doro anya. O chètaara ha na ọ bụ Jehova ka ha na-ekpere ikpé, na ọ bụ kwa Ya ka ha ga-enye nkọwa nke okwu ikpé ha. Ọ dọrọ ha aka-ná-ntị ka ha kpee ndị ahụ ikpé ziri ezi -- ịhụ mmadụ iruọma agaghị adị, agaghị anara kwa ihe iringo. Jehoshafat gwara ndịikpé ahụ sị, “Ka óké egwù JEHOVA dikwasi unu.”

Nye Onyenwe anyị

Taa, adịghị edebe ndị nke Chineke dịka ndị ikpé nke ibe ha kama a na-enye ha ohere ịlụrụ Onyenwe anyị ọlụ. Ihe ọ bụla ha na-eme, ha na-eme ya n’ihi nsọpụrụ na otuto nke Chineke. Ha adịghị alụ-ọlụ ha ka obi tọọ mmadụ ụtọ kama ọ bụ ime ihe ga-atọ Chineke ụtọ. “Unu nēme ihe ọ bula, nēmenu ihe nile ka ewe nye Chineke otuto” (I Ndi Kọrint 10:31). Mgbe enyere ụmụntà ohere isoro bụọ abụ n’òtù ndị ná-abụ abụ n’Ụlọ akwụkwọ Ụbọchị Ụkọ, ha na-eji obi ha niile ná-abụku Onyenwe anyị abụ. Ụmụntà bụ Ndị Kraist maara na Chineke na-ele, na ọbụrụ kwa na ha kwesị ntụkwasị-obi Onyenwe anyị nwere ike inye ha ohere ọzọ dị iche iche ịlụrụ Ya ọlụ. Mgbe enyere ụmụntà bụ Ndị Kraist ohere inyeaka ná nzukọ -- dịka inye ndịọzọ akwụkwọ na mpempe akwụkwọ niile, idozi oche, ijé ozi ntà, na ọbụná ilekọta ụmụntà ndị dị ntà karịa ha -- ha na-eme ya ná nrube isi n’ịdị nwayọ dịka ọbụ Onyenwe anyị n’Onwe ya sịrị ha meere Ya ihe ahụ.

Iwu nke Chineke

Jehoshafat mekwara ka ndị ikpé dị na Jerusalem. Ndị ahụ bụ ndị Livai, ndị nchụàjà, na ndịisi nke ndị bụ nna nke Israel. Jehoshafat gwara ha ka ha na-eme ihe niile “n’egwù JEHOVA, na n’ikwesi-ntukwasi-obi, na n’obi zuru-òkè.” Arọpụtara ndịkom abụọ ịbụ ndịisi nke ndị ikpé niile ahụ. Amaraia, bụ onyeisi nchụàjà, bụ onyeisi n’okwu ọ bụla nke Jehova. Zebadaia, bụ onyendú ụlọ Juda, ka edebere ịbụ onyeisi nke okwu ọ bụla bụ nke eze. Òtù ndị ikpé abụọ ndịa ga na-ekpé ikpé n’okwu ọ bụla dapụtara n’etiti ndị ahụ, “ka ikpe we ghara ima ha n’ebe JEHOVA nọ.” Òtù ahụ nke Amaraia bụ onyeisi ya na-ekpé dịka Nzukọ. Òtù nke ọzọ na edozi ihe niile banyere iwu nke ala. Dịka ihe ịma-atụ, taa n’ọtụtụ obodo enwere iwu ná-achị otù ndị ná-anyà ụgbọala ga-esi gbaa ọsọ, ikwu ihe ụfọdụ ana-apụghị izipụ site n’ebe ana-esi ezipụ akwụkwọozi, ihe enwere ike ime na ihe ana-enweghị ike ime. Ọ bụghị mmadụ niile na-erubeisi n’iwu Chineke; ma Ndị Kraist kwesịrị irubeisi ọ bụghị náánị n’iwu Chineke, kama ha kwesị kwara irubeisi n’iwu obodo, ọ bụrụ na iwu niile ahụ emegideghị iwu nke Chineke (Ọlu Ndi-ozi 5:29). Onye Kraist bụ ezi onye obodo ya.

NdịMmegide

Mgbe Jehoshafat rọpụtasịworo ezi ikpé na òfùfè Jehova nye ndị ya, enwere ike lee anya na ha ga-enwe udo na ọgan’iru. Kama nke a, okwu ruru Jehoshafat na ndị mmegide ná-abịa. Ụmụ Moab, Amon, na ndị ọzọ jikọtara onwe ha tụọ àtụmààtụ imegide Juda. N’oge gara aga, Jehoshafat enwewo ìgwè ndịagha ndị jikeere maka agha (2 Ihe Emere 17:13-18). N’oge a, ekwughị okwu banyere ịchịkọta ndịagha na ihe agha maka agha. Jehoshafat kpọsara obubu-ọnụ n’ala niile nke Juda. Ọ bụghị náánị eze na ndịikpé kama ndị ahụ niile ka enyere ndụm-ọdụ ịchọ Chineke. Ihe eji akpọsa obubu-ọnụ bụ maka ịchọ Chineke n’ihe dị mkpà. N’obubu-ọnụ, ndị ahụ na-ekpe ekpere ha adịghị enwe kwa ohere ọbụná iri ihe, n’ihi na ihe ná-adị elu n’obi ha bụ ịchọ Chineke. (Lee Ihe ọmụmụ 267.)

Ekpere

Jehoshafat guzoro n’iru ndị ahụ zukọtaworo nime ụlọ Jehova, ụlọukwu nke Solomon wuru (Ihe ọmụmụ 257). Ka Jehoshafat kpere-ekpere, o kwenyere na Chineke nwe ike na ịdị ukwu niile, nke mere na ọ dịghị onye pụrụ iguzogide Ya. O chètaara Chineke na ala ahụ bụ nke ekweworo Abraham na mkpụrụ ya ná mkwà. O chètara otú Solomon kpere-ekpere mgbe ana arara ụlọukwu a nke ha zukọrọ nime ya nye Chineke. Solomon rịọworo Chineke ka Ọ nụ ekpere ha kpere n’ebe ahụ (2 Ihe Emere 6:40). Ọ rịọwo na n’oge ụnwụ, ajọ ọrịa ná-efé efè, na agha, ma ọ bụ n’ekpere nke otù onye ma ọ bụ nke ndị Ya niile, ka Chineke “mezie ikpé-ha” (I Ndi Eze 8:37, 44, 45, ). Mgbe Solomon kpesịrị ekpere otú a, Chineke zara: ọkụ siri n’Eluigwe daa, wee ripịa àjà niile ahụ; “ebube nke JEHOVA” wee jupụta ụlọ ahụ (2 Ihe Emere 7:1). Jehova sịrị Solomon, “Anyam abua ganāsaghe, ntim abua ganāña kwa nti, n’ekpere nke ebe a” (2 Ihe Emere 7:15).

Jehoshafat chetara na Ụmụ Israel erubewo isi n’okwu a mgbe ha na-eje ijè n’ọzara. Chineke nyere ha iwu ka ha ghara ịkpagbu, alụsokwala ha ọgụ, ma ọ bụ sogbuo ndị Moab, ụmụ Amon, ma ọ bụ ụmụ Isọ ndị bi na Sia (Deuteronomi 2:4, 9, 19). Ugbu a ndịagha ndịa na-agbalị ịchụpụ ndị nke Chineke n’ala ahụ. Jehoshafat rịọrọ Chineke ka Ọ bụrụ onyeikpé, wee sị, “Ike adigh nime ayi n’iru ìgwè madu a bara uba nke nābia imegide ayi; ayi onwe-ayi amagh kwa ihe ayi gēme: kama ọ bu Gi ka anya-ayi nādikwasi.”

Ibu Ụzọ Chọọ Chineke

N’oge nsogbu, ụfọdụ mmadụ na anwa ndụm-ọdụ nke ndị enyi ha, ike nke onwe ha, na ịdabere n’ụzọ niile nke mmadụ. Mgbe ụfọdụ, mgbe ihe niile ndịa dasịrị, dịka ebe mgbabà ikpezaụ ha ga-echigharịkwuru Chineke maka inyeaka. Lee otú ọ ga aka-mma ibu ụzọ kpee ekpere chọọ Chineke! Baịbụl sịrị: “Ọ di nma igbabà nime JEHOVA kari itukwasi ndi amara aha-ha obi” (Abù Ọma 118:8); “JEHOVA nke usu nile nke ndi-agha, onye ihe nāgara nke-ọma ka madu ahu bu nke nātukwasi obi na Gi” (Abù Ọma 84:12); “Onye nātukwasi JEHOVA obi, agēme ka ọ nọ n’elu” (Ilu 29:25). Gịnị ka i na-eme n’oge nsogbu -- ọ bụ ịkpọkọta ndị enyi ka ha nyere gị aka? ị na-eme àtụmààtụ ka ị ghọgbuo ndị ọzọ? ị na-eji okwu ekwupụta onwe gi? Ka ọ bụ ị na-ebu ụzọ kpee ekpere chọọ Chineke?

Ọzịzá Ahụ

Jehova zitere ọzịzá nye ekpere nke Jehoshafat. O kwu ru okwu site n’ọnụ Jahaziel, onye Livai onye sitere n’ụmụ Esaf, onye ọbụ-abụ, onye ná-akpọ ụbọ-akwara, na onye dere ụfọdụ Abù Ọma. Jahaziel gwara ndị Juda niile okwu ndịa: “Otú a ka JEHOVA siri unu, Unu onwe-unu atula egwù, unu atu-kwa-la ujọ n’iru ìgwè madu a bara uba; n’ihi na ọ bugh unu nwe agha nka, kama ọ bu Chineke nwe … guzo, hu nzọputa JEHOVA n’etiti unu.” Mgbe ha nụrụ okwu agbam-ume niile a, Jehoshafat na ndị ya fèrè Jehova òfùfè. Ndị Livai “we bilie itò JEHOVA, bú Chineke Israel, n’olu di uku ri nne.” Ndịa fèrè Jehova òfùfè nye kwa Ya otuto ngwa ngwa ha natara mkwà nke inyeaka na nnapụta. Ha kweere na Chineke nwere ike imezu ihe O kweworo ná mkwà.

Okwukwe

Ụfọdụ mmadụ na-atụ egwù nke ukwuu ruo na aghaghị ịnapụta ha kpamkpam tupu ha ekwere ma nye kwa Chineke otuto. Agwara anyị nime Baịbụl na “onye ezi omume nkem gēsite n’okwukwe di ndu” (Ndi Hibru 10:38). Chineke na-enwe obiụtọ mgbe anyị kweere na Ya, n’ihi na “ayi sitere n’okwukwe nējeghari, ọ bugh n’ọhuhu-uzọ” (2 Ndi Kọrint 5:7). Jisọs gwara ụfọdụ ndị kpuru ìsì sị, “Dika okwukwe-unu si di ka emere unu.” Anya ha wee meghee (Matiu 9:29, 30). Jisọs sịkwara, “Onye nke kwere puru ime ihe nile” (Mak 9:23).

Nnapụta na Ihe Mkwata n’agha

Jehoshafat gwara ndị ahụ ka ha kwere na Jehova, na ha ga-enwe ọgan’iru. Ha jikeere ijé agha, ndị ọbụ-abụ nọ n’iru ndịagha. Mgbe ha malitere ịbụ abụ na inye Jehova otuto, ná-asị, “Kelenu JEHOVA; n’ihi na rue ebigh-ebi ka ebere-Ya di,” Jehova wee malite ịlụ ọlụ n’etiti ndịiro. Enwere ndị ná-eru mbi n’etiti ha. Ndịiro wee malite ịdakwasị ibe ha; “ha wee yere onwe ha aka, nwoke na ibe ya, ibibi onwe ha” rue mgbe egbusịrị ha niile, “ọ digh kwa onye gbapuru agbapu.”

Jehoshafat na ndị ya alụghị ọgụ ọ bụla, ma ha bụ ndị mmeri. Lee otú agha nke a si dị iche site n’agha nke ha tụkwasịrị mmadụ obi ewee chụsasịa ha! N’oge nke a agha a bụ nke Jehova, site kwa n’ụzọ pụrụ iche ebibiri ndị agha nke ndịiro. Ihe mkwata n’agha ahụ bụ nke ụmụ Juda. Ọtụtụ ihe nkwata n’agha dị, nime ya kwa ka ahụrụ ọtụtụ ihe dị óké ọnụ-ahia nke ha chịkọtaara onwe ha. Ọ bụghị náánị na Chineke napụtara Juda kama O mekwara ka ha baa ụba site n’ọtụtụ ihe nkwata n’agha sitere n’agha ahụ na o were ha ụbọchị atọ ịkwakọta ya.

Jehoshafat na ndị ya matara omimi nke ihe Chineke meere ha. Ọbụná tupu ha alaghachị n’ụlọ ha, ha zukọtara ikele Chineke na ịgọzi aha Ya. Ha wee were ọñụ laghachị n’ihi na Chineke “mere ka ha ñuria ọñu n’iru ndi-iro-ha.” Mgbe ọ bụla Chineke nyeere anyị aka wee zitere anyị nnapụta site n’ihe mgbu, nsogbu, ọnwụnwa, ma ọ bụ ihe ize-ndụ, anyị pụrụ, anyị kwesịkwara inye Ya ekele otù mgbe ahụ. Ọ dịghị mkpà ka anyị chèrè oge òfùfè èzínaụlọ. Ọ dịghị mkpà ka anyị chèrè ruo mgbe anyị pụrụ ijé n’ụlọ nzukọ. Ebe ọ bụla anyị nọ, anyị kwesịrị ịna-ekupụ ume ekpere nke ekele na otuto nye Chineke. Jehova pụrụ ịnụ, ma ekwupụtasirị okwu nke otuto anyị ike ma ọ bụ na ekwuru ya nwayọ nime obi anyị. Mgbe ahụ, anyị onwe anyị kwa, ga-alaghachị n’ụlọ anyị n’ọñụ.

Mgbe ná-adịghị anya okwu wee gbasaa n’ala niile na Chineke lụrụ ọgụ megide ndịiro nke Juda. Ndị ahụ tụrụ egwù Jehova n’ihi na ha matara na Ọ lụworo ndị Ya ọlụ. “Ala-eze Jehoshafat we di ju: n’ihi na Chineke-ya mere ka o zuru ike gburugburu.”

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Gịnị mere o ji dị ka Jehoshafat hụrụ ndị kpọrọ Chineke asị n’anya?
  2. Gịnị mere Jehoshafat ji jègharịa n’ala niile nke Juda?
  3. Òlee otú ndịikpé ahụ ga-esi chịa?
  4. Gịnị bụ ụdị okwu abụọ arọpụtara ndịikpé maka ha?
  5. Gịnị kpatara Jehoshafat ji kpọsaa obubu-ọnụ?
  6. Gịnị bụ ibu ọnụ?
  7. Òlee ebe ha zukọtara ikpé ekpere?
  8. Ònye ka ha dabeere maka nnapụta?
  9. Ònye buuru Jehoshafat na ndị ya agha ha?
  10. Gịnị kpatara ndị ahụ ji nye Jehova otuto? Òlee mgbe ha nyere Jehova otuto?