Lesson 314 - Senior
Memory Verse
“Nsọpuru-Chineke, ya na inwezu ihe nile di nkpà, bu uzọ irita urù nke-uku” ( I Timọti 6:6).Cross References
I Ụzọ Ahụ Nke Dị Warara Na Mkpagide
1 Ụmụ ndị amụma rịọrọ ka emee ka ha nwere onwe ha karịa, 2 Ndi Eze 6:1, 2; Matiu 7:13, 14; Luk 13:23, 24.
2 Emezuru arịrịọ ha, 2 Ndi Eze 6:2, 3; Abù Ọma 106:15;
II Isi Anyụike Ahụ Nke Furuefu
1 Ezutere nsogbu n’ụzọ ahụ dị obosara, 2 Ndi Eze 6:4, 5; Eklisiastis 11:9
2 “Nke ahu bu ihe ariọtara ariọta,” 2 Ndi Eze 6:5; I Ndi Kọrint 4:7; Matiu 25:14-30.
3 Achọtara isi anyụike ahụ n’ụzọ dị ịtụ n’anya, 2 Ndi Eze 6:6, 7.
Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHEỌnụụzọ Ahụ Nke Dị Warara
“Ebe ayi onwe-ayi nēbi n’iru gi adikara ayi nkpà.” Nkọwa nke okwu ahụ bụ “nkpà n’ebe a bụ warara maọbụ mkpagide. Ọ bụ ezie na ụmụ ndịamụma naekwurị okwu banyere ụlọ maọbụ ebe obibi, ma ọtụtụ mgbe ka anyi naahụ ndịkom na ndịnyom nke oge a ka ha naekwu kwa ụdị okwu ahụ banyere Oziọma nke a. Jisọs sịrị, “Sinu n’ọnu-uzọ di warara bà: n’ihi na obosara ka ọnu-uzọ ahu di, mbara ka uzọ ahu di kwa, nke nēduba n’ila-n’iyi, ọtutu ka ha di kwa, bú ndi nēsi na ya nābà. N’ihi na warara ka ọnu-uzọ ahu di, nkpagide ka uzọ ahu di kwa, nke nēdubà na ndu, ole-na-ole ka ha di kwa, bú ndi nāchọta ya” (Matiu 7:13, 14).
Idoziụzọ
“Ebe a … adikara ayi nkpa.” Nke a abụrụwo ákwá nke ọtụtụ ndị nụworo eziokwu nke Oziọma. Ụfọdụ mmadụ naanụ Oziọma wee chọọ kwa inweta urù nke dị nime ya, ma mgbe ha nụrụ ịgbaàmà nke ndị ahụ nke legharịworo anya ná ndụ nke ha biri na mgbe garaaga wee gaa kwụghachị ego nke ha zuru n’ori maọbụ ụgwọ ha ji, ha ewee were iruuju pụọ, naeti sị, “Ebe a … adikara ayi nkpa.”
Ịkwàikó
Ndịọzọ naabịa wee malite ịchọ mgbaghara mmehie, Chineke ewee kpugheere ha na ha naebi ndụ nke ịkwàikó -- nke bụ na, otù onye nime ha alụwo di maọbụ nwunye n’oge garaaga wee rapụ ya jee lụrụ onye ọzọ mgbe nke mbụ ka nọ ndụ. Jisọs gwara anyị nkeọma na “onye ọ bula nke gārapu nwunye-ya luru kwa nwunye ọzọ, ọ nākwa iko megide ya. Ọ buru kwa na nwayi onwe-ya arapu di-ya, luru kwa di ọzọ, ọ nākwa iko” (Mak 10:11, 12). Òzízí a dị mkpagide n’ebe ọtụtụ mmadụ nọ. Ha naarapụ ụzọ ahụ nke dị mkpagide wee chọọ ụzọ nke sarambara na obosara ebe ha gaenwe ike ibinyere nke abụọ ha ahụ, n’otù mgbe ahụ kwa bụrụ kwa ndị agaakpọ ndị nke Kraist -- ọ bụ ezie na Jọn Baptist jisiri òzízí a ike wee gwa Herod na o zighiezi n’iwu ka ọ lụrụ nwunye nwanne ya. Mmadụ niile naele anya ịbà n’Eluigwe, ọ bụ ezie na Pọl sịrị na “ndi nēme ihe di otú a agagh-eketa ala-eze Chineke” (Ndi Galetia 5:20, 21).
Ịchọmma Nke Ụwa
Amatawo ndịnyom dịka ndị naewezuga okpukpé ndịKraist n’akụkụ n’ihi ịhụn’anya ha nwere n’ịkpachasị agịrịisi ha. Akwụkwọ Nsọ naakụzi na “ọ buru nwayi ihe-ihere ka akpacha agiri-isi-ya ma-ọbụ ka akọpu isi-ya” na kwa, “ọ buru na nwayi nwere ogologo agiri-isi, ọ buru ya ihe otuto: n’ihi na enyewo ya agiri-isi-ya n’ọnọdu ihe igbokwasi n’aru” (I Ndi Kọrint 11:6, 15). Ọ gaadị ka agaasị na ịkpachasị agịrịisi ka o yie nnọọ nke oge a bụ ihe dị ntakịrị mgbe eji ya tụnyere ndụ ebighị-ebi, ma ọ dị ndị naarapụ ụzọ ahụ dị warara kama ịrapụ omume ịchọmma dị icheiche nke ụwa nke a.
“Unu ekwela ka eme ka unu yie ajọ oge a: kama ka enwogha unu” (Ndi Rom 12:2). Ọtụtụ mgbe ka ndị ụwa naatụ ndị ahụ naekweghi iyi ha n’omume na ịchọmma ha aka nke ịkwaemò. Anaezí ndị ahụ nke náabà n’ụzọ ahụ dị mkpagide sị “Unu ahula uwa, ma-ọbu ihe nke di n’uwa n’anya. Ọ buru na onye ọ bula ahu uwa n’anya, ihun’anya nke Nna-ayi adigh nime ya” (I Jọn 2:15).
Iheụtọ Na Àkụ Nke Ụwa
“Uzọ ahụ adika mkpagide” náabụkarị ákwá nke ọtụtụ ndị mmehie mgbe ha náaghọta izuòkè ahụ nke enweghị ntụpọ site n’ụwa nke OnyeKraist náaghaghị inwe pụọ n’agụụ iheọjọọ dị icheiche nke dị n’ụwa -- ịga kirie sinima na ebe igwuriegwú dị icheiche, itéegwú, ịkpọ anwụrụ, na isé sigaret, na ịñụmmanya. Otù nwaokorọbịa ọgaranya nke náachịachị bịakutere Jisọs wee jụọ ya ụzọ nke ndụ ebighebi, ma mgbe agwara ya na ọ gaenye ndịogbenye ihe mnweta ya niile wee rapụ kwa ndị enyì ya soro Jisọs, ọ lara námwuta. Jisọs hụrụ ya n’anya. Enyere nwaokorọbịa ahụ ọtụtụ àkụ n’Eluigwe, ma ụzọ ahụ dịkarịrị mkpagide nye ya.
Ndụ Nke Náenweghi Mmehie
Mmadụ ụfọdụ naechè na ọnụụzọ ahụ dị óké mkpagide mgbe anaagwa ha na OnyeKraist naadị ndụ nke náemeri mmehie. Ma otú ọ dị, ọ dịghị okwu nke pụrụ ido mmadụ anya karịa ndịa, “Onye nēme nmehie si n’ekwensu puta” (I Jọn 3:8). Ọnụụzọ ahụ dị warara, ụzọ ahụ dị kwa mkpagide, ma ha na eduru n’Eluigwe. Ọtụtụ mmadụ nọ n’ụzọ obosara ahụ ndị naechè na ihe naagara ha nkeọma na ọ dịghị kwa mkpà ka ha nọdụ maọbụ bata n’ụzọ ahụ dị warara na ụzọ ahụ nke ndị mgbe ochie gara nime ya; ma ikpeazụ nke ụzọ ahụ bụ ịlan’iyi. Ọ gaghịaka mma ka mmadụ dị warara otú ọ gaenwe ike ịba n’ọnụụzọ ahụ nke dị mkpagide, karịa mgbe emesịrị n’ikpeazụ mmadụ ahụ achọpụta na ya buru nnọọ ibù nke na ọ pụghị ịgafe site n’oghere nke dị n’akụkụ abụọ nke ọnụụzọ ahụ dị mkpagide.
Ọtụtụ Ihe mgbaso
Ịnabata mmehie, iweda ụkpụrụ ọma mbụ dị icheiche n’ala, na ịgbaso échìchè dị “obosara” n’ebe ihe nke ụwa dị, ewetaworo ọtụtụ ọgbakọ nke okpukpé dị icheiche ọnwụ nke imemmụọ. Ntute dị icheiche amalitewo site n’aka ndịndú jidesiri ụkpụrụ dị elu ike; ma mgbe ha gafesịrị, ọtụtụ mgbe ọgbakọ ndịa sooro omume nke ndị Israel ndị fere “JEHOVA òfùfè ubọchi nile nke Joshua, na ubọchi nile nke ndiokenye ndi emere ka ubọchị ha di anya ka Joshua nwusiri” (Ndi Ikpé 2:7), emesịa ha wee laghachị kwa ná ndụ nke ikpere arụsị. Ka ụmụ okorọbịa lezie anya ka ákwá ha banyere ịchị ha ọchịchị n’aka dị nrò na nke inwereonwe ha ghara iduba ha n’ụzọ obosara ahụ!
Arịrịọ Nke Ekwenyere
Mgbe ụmụ ndịamụma tamurùntamù banyere ịdịmkpagide nke ebe ha onwe ha naebi wee rịọọ kwa ka ha jee n’ebe sarambara, Elaisha zara sị, “Jenu.” Onye dere Abù Ọma naekwu na Israel chọrọ ajọ ọchịchọ n’ọzara, Chineke wee “nye ha ihe ha riọrọ; ma O zitere aru ọtita ná nkpuru-obi-ha” (Abù Ọma 106:15). Ha chọrọ anụ ha gaeri, Chineke nyekwere ha anụ; ma ọ gaabụworị ihe dịrị ha mma ma ọ bụrụ na ha nwere ojujuafọ wee rie “nri nke ndi-mọ-ozi.”
Ọtụtụ mgbe ụmụmmadụ naachọ nnọọ ịga n’ụzọ nke aka ha, Chineke naarapụ ha ka ha nweta ihe ahụ ha naachọsiike, ma Ọ naezite arụọtịta ná mkpụrụobi ha. Ọ dịghị anya mgbe ụmụ ndịamụma ahụ gafere n’ebe sarambara, rue mgbe otù onye nime ha tụfuru isi anyụike ya. Nke ahụ bụ ihe iji tụnyere onye nke náarapụ ụzọ ahụ dị warara. O nwereike iwere osisi anyụike nke isi ígwé ya náadịghị ya wee náawagharị, ma isi nkọ ya eji egbutu ihe adafuwo, okwu ya niile naada n’ala n’efu. O nwereike bụrụ onye náalụsiọlụ ike; ma ọ bụrụ na ebe ahụ dị nkọ nke Mmụọ Nsọ adịghị, ọlụ ya niile bụ náánị n’efu.
Isi Anyụike Arịọtaraarịọta
“Ewo, onye-nwem! Nke ahu bu ihe arịọtara arịọta,” bụ mkpu nke nwa onyeamụma ahụ tiri mgbe ọ hụrụ isi anyụike ahụ ka ọ dapụnarịrị ya wee mikpue nime mmiri Jọdan. Nwoke a matara na ihe ahụ bụ náánị ihe ebinyere ya na ọ gaakọwa kwa otú o siri mee ya. Ọtụtụ mmadụ dị ndị náechè na ha nwere onwe ha iji oge ha, talent (onyinye) ha, na àkụ ha mee otú ha si chọọ; ma n’eziokwu mmadụ bụ náánị onye nlekọta nke ihe niile Chineke nyeworo ya. Emere ka nke a pụta ìhè nime Ilu nke ọtụtụ ego Pound ahụ. Kraist, Nwoke ahụ amazuru aha Ya, sịrị orù ahụ nke zoro ego nke Onyenwe ya: “N’ihi gini ka i nējigh were egom nye ndi nāgbanwe ego, mu onwem gānara kwa ya n’uma mgbe m’biara?” (Luk 19:23). Onyenwe anyị gaalaghachịta otù ụbọchị nime ụbọchị ndịa. Ị ga-enwe ezi ihe nke i gaekwu banyere ihe niile ahụ nke Chineke nyere n’aka gị? Ị gaenwe ike kwue sị, “Pound ise nke gị abawo urù ọgu pound abua na iri?” maọbụ agaanụ ịkwaákwá na itimkpu, “Ewo, Onye-nwem, o funarịrịm?”
Ikpeazụ Nke Ihe Niile
Mgbe mmadụ gaeguzo n’iru Chineke n’ụbọchị ngụkọta ikpeazụ ahụ, igosi otú o siri mee omume n’elu ụwa nke a, Elaisha agaghị anọ ka o wee weghachị isi anyụike ahụ furuefù, oge agaghịadị kwa iji kpọghachị ohere niile ahụ dabara nime mmiri nke oge. Onye ọ bụla nke rapụworo ụzọ ahụ dị warara na mkpagide gaachọpụta na mgbe ọ tụfuru isi anyụike ahụ, o tụfowo kwa mkpịsịugodi nke ndụ ebighiebi.
Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE1 Gịnị bụ nkọwa nke okwu a “mkpagide”?
2 Chọpụtasịa akụkọ niile nke “ụmụ ndị amụma” nime Akwụkwọnsọ.
3 Gịnị ka Jisọs kwuru banyere ụzọ ahụ nke náeduba ná ndụ?
4 Gịnị bụ nzaghachị nke Jisọs nye ajụjụ a, “Ndi anāzọputa di ole-na-ole?
5 Were ụzọ obosara ahụ tụnyere ụzọ ahụ dị warara.
6 Òlee otú agaesi tụnyere nkwenye nke Elaisha, n’ebe arịrịọ nke ụmụ ndịamụma ahụ dị maka ịrapụ ebe mbụ ha nọ, na mmeso nke Chineke n’ebe ụmụmmadụ nọ?
7 Gịnị bụ ihemwute nke imemmụọ nke dị n’òfùfè nke isi anyụike ahụ furu?
8 Gịnị bụ ihe anyị nwere nke anyị pụrụ ịkpọ “ihe ariọtara arịọta”?