2 Ndi Eze 6:8-23; Luk 11:9-13

Lesson 315 - Senior

Memory Verse
“Ya mere, ọ buru na unu onwe-unu, ọ bu ezie na unu jọrọ njọ, ma unu nāmata inye umu-unu ezi onyinye, Nnà-unu nke elu-igwe gāesi aña ghara iwere kari Mọ Nsọ nke-uku nye ndi nāriọ Ya?” (Luk 11:13).
Cross References

I Egbochiri Onyeiro Ahụ

1 Chineke kpugheere Elaisha àtụmààtụ niile nke onyeiro ahụ, 2 Ndi Eze 6:8, 9 I Ndi Eze 20:22

2 Azọpụtara ndị Israel site n’irubeisi n’ịdọakanántị ahụ niile, 2 Ndi Eze 6:10; Deuteronomi 6:24; 8:1

3 Chineke maara échìchè niile nke ụmụmmadụ, 2 Ndi Eze 6:11, 12; Abù Ọma 139:1-4; 147:5; I Ihe Emere 28:9; Ndi Hibru 4:12.

II Nlekọta Nke Chineke Nye Ndị Nke Ya

1 •sụ ndịagha dị ukwu gbara Dọtan gburugburu, 2 Ndi Eze 6:13-15; Abù Ọma 27:3; 91:1-16; 118:6

2 Elaisha nwere okwukwe, 2 Ndi Eze 6:16; 2 Ihe Emere 32:7

3 Emeghere anya nwaokorọbịa ahụ, 2 Ndi Eze 6:17; Ọnu-ọgugu 22:31; Luk 24:31; 10:23, 24; Ndi Efesọs 1:18

4 Emere ka ndịiro ahụ kpueìsì, 2 Ndi Eze 6:18-20; Ndi Efesọs 4:18; 2 Ndi Kọrint 4:3, 4

5 “Ọ buru na agu nāgu onye-iro-gi, nāzu ya,” 2 Ndi Eze 6:21-23; Ndi Rom 12:20; Ilu 25:21

6 “Riọnu, agēnye kwa unu,” Luk 11:9-13; Jọn 14:12-14; 16:23, 24; Matiu 7:7-11

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

Izipụ na Ịnataozi nke Eji Amamihe Náejé

Ịbịakwasị mmadụ na mbarede abụrụworị ihe dị mkpà n’ihe banyere ibuagha siterị na mbụ. Iji gbochie nke a, ụmụmmadụ emepụtawo ụzọdị icheiche nke eji achọpụta ihe na nzuzo ma zipụ kwa ndị nledo na nzuzo gaa n’ala, na mmiri na n’elu. Nime arọ olenaole garaaga emepụtawo ọtụtụ ụzọ ọhụụ dị icheiche dịka nke eji achọpụta otú obosara na ọnọdụ nke ihe ahụ anaachọ ịchọpụta si dị site na ‘mgbasaozi radio’ (radar and sound equipmentí) igwé náadọrọ ụzụ na okwu gaa n’ebe dị anya ka ejiworo lụọọlụ iji chọpụta ebe ndịiro nọ. Esiwo n’ụzọ dị otú a ọtụtụ mgbe, napụta ọtụtụ ụgbọmmiri ma dọọ kwa ụsụ ndịagha akanántị. N’ọtụtụ arọ garaaga tupu emepụta ihe ọhụụ ndịa eji ebu agha, anapụtaworị ndị Israel site n’iji amamihe dị ukwu jee ozi karịa nke mmadụ ọ bụla nweworo ike imepụta. Chineke, Onye na ahụzu ihe niile ma náagụ kwa échìchè niile nke mmadụ, gosịrị onyeamụma Ya ihe ahụ niile nke eze Siria naezube nime ụlọ ndina ya, ọbụná tupu emee ka ndịọchịagha ya mata àtụmààtụ ya niile.

Ozi a nke ime ka mmadụ buru ụzọ mata ihe gaje ime napụtara ndị Israel ọtụtụ mgbe site n’ime ka ha nọdụ ná njikere. Ọ bụ ihe náenye ụmụ Chineke nkasịobi n’ụbọchị taa ịmata na Ekwensu apụghị ibuso Onye nke Kraist agha na mberede ma Chineke ebughị ụzọ mara ihe banyere ya, na Ọ rọpụtawokwara ha ihemkpuchi ukwu iji guzogide agha ahụ, “Ọ digh ọnwunwa ọ bula nwaworo unu ma-ọbugh nke madu nānagide: ma Chineke kwesiri ntukwasi-obi, Onye nāgagh-ekwe ka anwa unu kari nke unu puru inagide; kama n’oge ọnwunwa ahu Ọ gēme kwa uzọ ngbapu, ka unu we nwe ike inagide ya” (I Ndi Kọrint 10:3).

Atụla Egwù

Mgbe eze Siria nụrụ na Elaisha bụ onye ahụ nke Chineke na esite n’aka ya mee ka amata ozi ya niile, ngwangwa o zigara ozi ka ejee kuta onye nke Chineke ahụ. Gịnị mere mmadụ bụ anụarụ ji náechè na ya nwereike imebi àtụmààtụ na ọlụ niile nke Onyekachasịiheniileelu? Ọtụtụ mgbe mmadụ naechè na ọ pụrụ ịgbanarị ikpé ebighịebi nke Chineke. Site n’iji ndịagha ya gbaa obodo ntà nke Dọtan gburugburu, ọ dị eze Siria ka ọ bụ ihe dị mfé ijide náánị otù nwoke a. Otú a ka ọ gaadịworị ma ọ bụrụ na ọ bụ náánị mmadụ efu ka ha na ya naeme ihe.

N’ebe mmadụ ụfọdụ nọ Okwu Chineke ahụ nke bụ “Mọ-ozi nke JEHOVA nāma ulo-ikwu-ya gburugburu ndi nātu egwù Ya, Ọ we dọputa ha” nwere ike ịdị ka ihe naapụghị imeeme maọbụ akụkọiro, ma n’ebe Elaisha nọ ọ bụ eziokwu dị ndụ. Ọ pụtaghị na Elaisha naahụ ụsụndịagha nke Eluigwe ahụ anya mgbe niile, kama n’oge mkpà ọ matara na ha nọ n’ebe ahụ, Elaisha bụ nwoke nke náanọ Chineke nso mgbe niile ịmata ihe o kwesịrị ime. Ndụmọdụ ya niile sitere n’Eluigwe. Ntị ya ghereoghe ịnụ ihe Onye ahụ kere ya naekwu. Mgbe orù ya hụrụ ụsụndịagha Siria ka ha gbara obodo ahụ gburugburu, o tiri mkpu site n’egwù sị, “Ewo, onye nwem! Ayi gēme aña”? Elaisha atụghị egwù ọ bụla maọbụ sogbue onwe ya banyere ihe ọ gaeme “Atula egwu,” bụ okwu agbam ume nke nwoke ahụ onye matara Chineke ya. Mgbe ahụ ọ rịọrọ Chineke arịrịọ dị mfé ka O meghee anya nwaokorọbịa ahụ. Nwaokorọbịa ahụ náeje ozi ekpughị ìsì nke anaahụ anya. Ọ pụrụ ịhụ ụsụndịagha nke Siria ka ha naaga n’usoro iwere obodo ahụ. Elaisha chọrọ ka ọ hụ ntakịrị nime ihe ahụ nke ya onwe ya hụworo. “Ugbọ-ala Israel, na ndi-inyinya ya” (2 Ndi Eze 2:12).

Ịhụụzọ nke Anụarụ na nke Imemmụọ

Ọ bụ ihe ndị mfé mmadụ ikwe ka ihe niile nke dị ya gburugburu mechie anya ya nke gaeme ka ọ ghara kwa ịhụ ụzọ nke imemmụọ. Ọ bụ ọlụ nke onyeiro ahụ iji nchègbu nke ndụ a gbaa mmadụ gburugburu ka o wee tinye oge na ike ya niile náánị n’ịchụso ihe nke ụwa. Inwe ọchịchọ n’ebe ihe nke ụwa dị nwereike imechi anya mmadụ kpamkpam nke mere na ọchịchọ banyere ihe nke dị n’Eluigwe gaabụ nnọọ ihe ezopụrụ n’anya ya. N’iji ihe nke imemmụọ tụnyere ya onye dị otú a naagba ọsọ ngwangwa ịba ná mbibi. “Itukwasi uche n’anu-aru bu ọnwu” (Ndi Rom 8:6). “Ha bu ndi-iro obe Kraist: … ndi nātukwasi uche n’ihe uwa” (Ndi Filipai 3:18, 19). Ka Onyenwe anyị meghee anya mmadụ niile ịhụ ụzọ gafee ụwa a nke anyị bi nime ya.

Emeghere anya Elaisha mgbe ọ rapụrụ ihe niile wee malite iso Elaija. Ọ hụrụ ụgbọala ọkụ mgbe o kpebiri wee sogide Elaija rue n’ikpeazụ. Agaemeghe anya anyị mgbe anyị malitere ịchọ ihe nke dị n’Eluigwe; ọ bụrụ na anyị esogidesie ụzọ ahụ ike rue n’ọgwụgwụ, anyị gaahụ ebube niile nke Eluigwe ka ha gaamụwa n’otù ụbọchị, ihe ụtọ niile nke ụwa a gaadị ka iheèfu na ihe náabaghị urù nke mere na anyị agaghị echèta kwa ihe anyị hụrụrị nime ha. Gịnị ka ihe ndịa bụ nke ụmụmmadụ ji agbanwere mkpụrụobi ha? Lee otú ụbọchị ndụ mmadụ si agba ọsọ n’elu ụwa! N’ebe onye ahụ nke dọgbuworo onwe ya n’ọlụ inweta àkụ nke ụwa a dị, Chineke sịrị: “Onye nēnwegh uche, n’abali a ka anāchọ nkpuru-obi-gi n’aka-gi; ma ihe i doziri, ònye gēnwe ha”? (Luk 12:20).

Otù Ekpere

Ka ekpere nke OnyeKraist ọ bụla bụrụ: Onyenwe anyị, meghee anya ndịmmehie niile ka ha wee hụ nzuzù nke dị n’iso ụzọ nke onwe ha na ịmamma niile na urù dị icheiche nke dị n’Oziọma. Ka ha ghọta kwa ihe dị iche n’etiti ihe naadị nwaoge na ihe nke naadị rue ebighiebi. Ka ndị ahụ niile ndị maara Chineke náahụụzọ ahụ nke ọma karịa “nke nāmu aga n’iru n’iru rue mgbe chi bọchara” (Ilu 4:18). Onyenwe anyị, meghee anya ụmụ okorọbịa ndị naatụfu oge ha n’ihe niile ahụ náabaghị urù ma jụkwa nsọpụrụ Chineke nke “bara urù nye ihe nile” (I Timọti 4:8).

Ebenchébe nke Anapụghị ịkwatu

“JEHOVA we saghe anya nwa-okorọbia ahu: ọ we hu” -- lee ụdị ihe ọ hụrụ! Ugwu ahụ jupụtara n’ịnyịnya na ụgbọala nke gbara Elaisha gburugburu. Òlee ohere ndịiro ahụ nwere iji baa n’ebenchébe ahụ? “Ọ digh ihe-agha ọ bula akpuworo imegide gi gāga nke ọma; … Nka bu ihe-nketa nke ndi-orù JEHOVA” (Aisaia 54:17). Setan kwuruokwu banyere Job sị; “Ọ bugh Gi onwe-gi gbaworo ya, gbakwa-ra ulo-ya, gba-kwa-ra ihe nile o nwere, ogige gburugburu?” (Job 1:10). Chineke nwere iheagha nye nwa Ya ọ bụla, nke Setan maọbụ ike ọ bụla nke ọkụalammụọ nápụghị imeri.

Mgbe ndịiro ahụ rịdakuuru Elaisha, ọ rịọrọ Onyenwe anyị ka O tie ha ìsì. Chineke zara ekpere ahụ, onye nke Chineke wee duru ndịagha ahụ náerubiisi, bụ ndị kpuruìsì baa na Sameria. Tụgharịauche ná mgbagwojuanya na obiịlọmmiri ha nwere mgbe asaghere anya ha, ha wee hụ onwe ha dịka ndị adọtara n’agha na Sameria. Mgbe asaghere anya orù Elaisha ọ hụrụ mmerị. Mgbe asaghere anya ndị Siria ha hụrụ na ha bụ ndị emeririemeri.

Náánị Okwukwe Ntakịrị

Lee okwukwe nke naenweghị obiabụọ nke Elaisha nwere mgbe ya na Chineke naekwurịta okwu! Ọ nọ náechere rue mgbe ndịagha ahụ bịaruru ya nsọ, o wee rịọ Chineke náánị ka o tie ha ìsì, Chineke wee tie ha ìsì. Jisọs dụrụ anyị ọdụ ka anyị nwee ụdị okwukwe ahụ site n’ịgwa anyị sị, Riọnu, agēnye kwa unu.” Mgbe Ọ matara ekweghịekwe anyị. O nyekwara iheịmaàtụ pụtara ìhè karịsịa: “Ònye n’etiti unu, bụ nna, ka nwa-ya gāriọ ogbe achicha, o nye ya nkume?” Gịnị gaabụ iheịgbàume karịrị nke a nye onye ọ bụla ịrịọ ma kwere kwa na Chineke gaemere ya ihe ọ rịọrọ? “Nna-unu nke elu-igwe gēsi aña ghara iwere kari Mọ Nsọ nke-uku nye ndi nāriọ Ya?”

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. 1 Were ịdọakanántị ahụ nke Elaisha dọrọ tụnyere ụzọ ọhụụ dị icheiche emepụtara taa nke eji achọpụta ndịiro.

  2. 2 Ùgbò òlee ka ndị Israel zọpụtara onwe ha site n’irubeisi n’ịdọakanántị niile ahụ?

  3. 3 Òlee otú eze Siria jiri chee na anaemebi àtụmààtụ ya niile?

  4. 4 Gịnị ka Elaisha kwuru mgbe ọ nụrụ na agbawo ya gburugburu?

  5. 5 Gịnị ka nwa okorọbịa ahụ hụrụ mgbe asaghere anya ya?

  6. 6 Òlee otú Elaisha si meso ndịagha Siria?

  7. 7 Were otú esi saghee anya nwa okorọbịa ahụ náejéozi tụnyere nsaghe anya nke ndịagha Siria.

  8. 8 Gịnị bụ nkọwa dị icheiche nke Akwụkwọnsọ banyere iheoriri ahụ nke enyere ndị Siria?

  9. 9 Jisọs sịrị, “Riọnu, agēnye kwa unu” Gosi ebe ụfọdụ nime Akwụkwọnsọ nke naagwa anyị ihe mere na anyị adịghị arịọta ihe mgbe ụfọdụ anyị naarịọ.

  10. 10 Gịnị ka Jisọs jiri tụnyere arịrịọ anyị?