2 Ndi Eze 6:24-33; 7:1-20; 8:1-15

Lesson 316 - Senior

Memory Verse
“N’ihi na gi onwe-gi asiwo, JEHOVA bu ebe-ngbabàm; N’ihi na ọ bu Onye kachasi ihe nile elu ka I meworo ebe-obibi-gi; ihe ọjọ agagh-adakwasi gi, ihe-otiti agagh-abiaru kwa nso ulo-ikwu-gi” (Abù Ọma 91:9, 10).
Cross References

I Óké Mkpagbu

1 Ben-hedad, bụ eze Siria, nọchigidere Sameria n’agha, wee mee ka obodo ahụ baa n’óké mkpàgbu 2 Ndi Eze 6:24, 25.

2 Otù nwanyị kọọrọ eze akụkọ ọmịko banyere onwe ya, eze wee taa Elaisha ụta n’ihi ọnọdụ ọjọọ dị otú a, wee ñụọ kwa iyì igbu ya, 2 Ndi Eze 6:26-31; Levitikọs 26:25-29; Deuteronomi 28:53.

3 Onyenwe anyị kpugheere Elaisha nzube ọjọọ ahụ, o wee bue amụma banyere nnapụta site n’ụnwụ ahụ, 2 Ndi Eze 6:32, 33; 7:1, 2

II Mkpebi Nke Ndị ekpenta Anọ Ahụ Na Ihe Ha Mere

1 Ndị ekpenta anọ, ebe ha naala n’iyì site n’agụụ, chọpụtara na ọ dịghị onye ọ bụla nọ n’ọmụma ụlọikwu ndị Siria, 2 Ndi Eze 7:3-5

2 Onyenwe anyị mere ka ndị Siria nụ ụzụ nke óké ụzụ ụgbọala. Ha wee gbalaga rapụ ụlọikwu na ịnyịnya niile ha, 2 Ndi Eze 7:6-8; 19:7; Ilu 28:1

3 Ndị ekpenta ahụ ketara òkè n’ihe mkwata naagha ahụ wee sịrịta onwe-ha: “ubọchi ta, ubọchi oziọma ka ọ bu, … bianu, ka ayi ba gosi ulo eze,” 2 Ndi Eze 7:9-11

4 Amụma Elaisha mezuru, 2 Ndi Eze 7:12-20

III Mkparịtaụka Nke Eze Na Gihezi

1 Akọrọ akụkọ banyere obibi nke nwanyị Shunem biri n’alaọzọ ihe ra ka arọ asaa, 2 Ndi Eze 8:1, 2

2 Mgbe eze na Gihezi naakparịtaụka banyere Elisha, nwanyị Shunem ahụ latara wee rịọ eze arịrịọ banyere ala ya. 2 Ndi Eze 8:1-6.

IV Ọnwụ nke Ben-hedad

1 Be-hedad na arịaọrịa, o wee ziga Hazael jekuru Elaisha, 2 Ndi Eze 8:7-9

2 Elaisha buruamụma banyere ọnwụ Ben-hedad, Hazael gbukwara eze ahụ, 2 Ndi Eze 8:10-15

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

Ụnwụ Dị Icheiche

Ọtụtụ mgbe Chineke naezite ókéụnwụ n’ihi mmehie na nnupụisi. Ọ bụ mmehie Ehab wetara ókéụnwụ a na Sameria. “Ọ digh onye di ka Ehab, onye rere onwe-ya ime ihe jọrọ njọ n’anya JEHOVA, onye Jezebe, bú nwunye-ya, rafuru” (I Ndi Eze 21:25). N’ụbọchị ikpeazụ nke ndụ ya, Ehab wedara onweya n’ala n’iru Onyenwe anyị; n’ihi nke a Onyenwe anyị ekweghị ka iheọjọọ ahụ O kwuru megide Ehab mezue n’ụbọchị ya, kama O mere ka o mezue n’ụbọchị nwa ya.

Eji akụkọ banyere Jehoram, nwa Ehab, bụ eze ndị Sameria, na Ben-hedad, eze ndị Siria nke náanọchigide obodo ahụ náagha malite iheọmụmụ anyị.

Ókémkpà N’obodo Ahụ

Ókéụnwụ ahụ dị ukwu ri nne n’obodo ahụ. Ndị ahụ wee nọ n’ókémkpà. Ndịnyom wee náeri ụmụ ha, nkọcha ahụ nke Moses kwuru gaabịakwasị ha ma ọ bụrụ na ha egeghịntị n’olu Jehova (Deuteronomi 28:51-53). Ọtụtụ mmadụ naechè na ha gaagbaso ụzọ nke akaha, náenupụisi n’iwu niile nke Chineke, ma emesịa ha agbanarị ikpé nke Chineke. Ma anyị naachọpụta na ikpé Chineke naeso mmehie n’azụ mgbe niile. Okwu Chineke naasị: “Nkpuru ọ bula madu nāgha, nke ahu ka ọ gēweta kwa n’ubi (Ndi Galetia 6:7). Mkpụrụ nke nnupụisi naeweta owuweiheubi jọgburu onweya ná njọ. Ndị Sameria naachọpụta nke a ugbu a.

Eze Israel chọrọ ịtá Elaisha ụta n’ihi ọnọdụ ọjọọ nke obodo ahụ. Ọ naatọ onyemmehie ụtọ ịtá onye ọzọ ụta n’ihi mmehie na iheọjọọ ya niile. Ọ naachọ ikpuchi onweya wee náekwu na ọ bụ onye ọzọ ka ikpé mara. Chineke maara obi. Ọ pụrụ ileba anya nkeọma wee sị, “Gi onwe-gị bụ nwoke ahụ.”

Eze ahụ zubere iwepụ ndụ Elaisha. Onyenwe anyị wee kpugheere ya Elaisha o wee gbanarị nzube ahụ. “Onye-nwe-ayi matara idọputa ha n’ọnwunwa, bú ndi nāsọpuru Chineke” (2 Pita 2:9). Ihe niile banyere ndị Ya naemetụ Ya n’obi mgbe niile. Ọ dịghị ihe ọ bụla nke gaadakwasị otù onye nime ndị nke Chineke ma ọ bụghị nke O kwere ka ọ bịa. Onye ahụ nke náasọpụrụ Chineke nwere mkwà nke ọ gaadabere na ya “Ọ digh ihe-agha ọ bula akpuworo imegide gi gāga nke-ọma.”

Elaisha

Elaisha agbasoworị ọlụ nke Elaija, site n’ime ka ụlọakwụkwọ maka ọzụzụ nke ndịamụma dị na Sameria, Dọtan, Betel, Jeriko, Shunem na Kamel. Ma eleghịanya Elaisha naezí ihe na Sameria mgbe anọchịgidere obodo ahụ. Onyenwe anyị alụwọrị ọtụtụ ọlụịrịbaàmà site n’aka Elaisha, ma ugbu a agaje ịlụ ọlụịrịbaàmà ọzọ dị ukwu na mgbe náadịghị anya.

Onyenwe anyị nachèta ndị nke Ya, Ọ dịghị arapụ kwa ha maọlị ọbụná n’oge ókéụnwụ. Náagbaghịagụgọ enwere ndị hụrụ eziomume n’anya n’ụlọakwụkwọ nke ndịamụma ahụ. Ha onwe-ha na Elaisha bụ “nnu,” nke Sameria. Mkwà ọzọ ekwere ndị náasọpụrụ Chineke bụ, “Ihere agagh-eme ha na mgbe ihe ọjọ: afọ gēju kwa ha n’ubochi óké unwu” (Abù Ọma 37:19).

Ekweghịekwe

Mgbe Elaisha zigaara eze ozi sị “dika mgbe a echi agēre otù mgbé utu ọka flour otù shekel, … n’ọnu-uzọ ama Sameria,” ọchị-agha ahụ onye eze naadabere n’aka ya, wee kwaa okwu ahụ emò. Ọ jụrụ ajụjụ sị: “Le, ọ buru na JEHOVA eme window n’elu-igwe, ihe a, ọ gādi?” Ekweghịekwe ya kewapụrụ ya n’iketa òkè n’óké iheoriri ahụ nke ndịọzọ bi n’obodo ahụ nwetara na mgbe náadịghịanya. Ekweghịekwe nke dị nime obi mmadụ gaekwewapụ onye ahụ n’inweta ngọzi niile nke Chineke mgbe niile. Edoro ọchịagha a ka ọ naéchénché n’ọnụụzọama nke Sameria; n’óké ime ngwangwa nke ìgwè mmadụ ahụ ndị naabà náapụta kwa n’ọmụmaụlọikwu nke Siria ibupụta iheoriri, akwaturu ya n’ala, zọkwasị ya ụkwụ, o wee nwụa. Ụfọdụ pụrụ ikwu na ọ bụ ihendabà, ma ọ bụ mmezu nke okwu Chineke. Onyenwe anyị naenwe ụzọ nke Ya iji mee ka ihe O kwuru mezue. Okwukwe gaeme ka mkwà niile nke Chineke mezue. Ekweghịekwe gaekewapụ mmadụ site n’Alaeze Chineke.

Oziọma

Ndịekpenta anọ ahụ bụ ndịkom agụụnaagụ. Ha enweghị olileanya inweta nri ọ bụla nime obodo ahụ. Ọ bụrụ na ha anọdụ n’azụ obodo, ha gaalan’iyì. Ọ bụrụ na ha abaá n’ọmụmaụlọikwu nke ndị Siria, ndị Siria nwereike inwe obi ebere n’arụ ha wee debe kwa ha ndụ. Ugbu a bụ oge mkpebi nye ha, ma eleghịanya ha gaéchèworị na ọ bụ nsogbu ka ha naachọ ịbà nime ya.

Ọ dịghị ohere ọ bụla dịrị onyemmehie mgbe ọ naanọgide nime mmehie ya. Ọ ghaghị ịlan’iyì. Ma mgbe onyemmehie kpebiri ịbịakwute Jisọs, olileanya naadị. N’ilu ahụ anyị hụrụ na mgbe nwammefu naala n’iyì site n’agụụ, ọ matara onweya wee cheta na enwebigara nri óké n’ụlọ nna ya. O kpebiri ibili na ịla n’ụlọ nna ya. O tinyere mkpebi ya n’ọlụ. Ndịekpenta ndịa mekwara otù ihe ahụ.

Anyị amaghị ma Onyenwe anyị mere ka nzọụkwụ ha dasie ụdà ike karịa mgbe ha naaga n’okporoụzọ ahụ; ma anyị matara na ndị Siria nụrụ ụzụ nke óké ụsụndịagha náabịa. Ha wee jupụta n’egwù wee gbalaga. rapụ ụlọikwu ha niile na nri ha n’azụ.

Mgbe ndịekpenta ahụ bara n’ọmụmaụlọikwu ahụ, ha hụrụ nri n’ụba ya na ọtụtụ uwe. Ha ririnri ma ñụọ kwa iheọñụñụ na nwa mgbe ntà, emesịa ha wee cheta na enwebigara nri óké n’ọmụmaụlọikwu ahụ arapụrụarapụ nke gaezuru obodo Sameria niile. Ha wee sịrịta onweha: “Ọ bugh ihe ziri ezi ka ayi onwe-ayi nēme: ubochi ta, ubọchi ozi ọma ka ọ bu, ma ayi onwe-ayi nāgba nkiti: ọ buru na ayi echere rue ìhè ututu, ajọ omume-ayi gāchọputa ayi: ma ugbu a bianu, ka ayi ba gosi ulo eze.”

Ịkọ Akụkọ ahụ

Ịnọ n’oké agụụ na ịbà n’óké nrijuafọ n’otù ntabianya ezuwo ime ụbọchị ahụ ka ọ bụrụ ụbọchị oziọma nye ndịekpenta ahụ. Ọ naabụ kwa ụbọchị oziọma mgbe onyemmehie naesite n’ịbụ orù nke mmehie pụta wee baa n’ebube nke inwereonwe ya nke Oziọma Jisọs Kraist. N’ụzọ nke ihemmụọ, ọ naesite n’ụkọ ba n’inwebiga iheòkè, site n’ọchịchịrị baa n’ìhè, site n’agbụ, baa inwereonwe. Okwu ahụ bụ Oziọma pụtara akọkọ ọma maọbụ ozi nke ókéọñụ.

Náetufughị oge ndịekpenta ahụ chọrọ ịga kọọrọ ndị bi n’ụlọ eze. Akụkọ ha dịmma nke ukwu nke bụ na ọ dịghị mma idebe ya náánị n’etiti onweha; ha chọrọ ịkọrọ ya ndịọzọ. Mgbe azọpụtara anyị, anyị naachọpụta ihe dị óké ebube nke mere na anyị naachọ ịkọrọ ndịọzọ ihe banyere ya, n’ihi na nzọpụta a dị ebube babaigara ụba ókè.

“Kọọ ya ọzọ! Kọọ ya ọzọ!

Akụkọ nzọpụta kọọ y’ọzọ

Rue mgbe ony’ọ bụla n’etiti ụmụ mmadụ, agaghị-ekwu

‘Ọ dịghị ony’ọ bụla gwaworom okwu a!”

Ime ka Eziokwu ahụ Guzosieike

Amụma nke Elaisha na ụzọ dị ebube nke Onyenwe anyị siri rọpụtara ndị Ya nri gaemeworị ka obi eze ahụ dị nrò. Anyị hụrụ mkparịtaụka nke eze na Gihezi ka ọ naachọ ịmara ihe ukwu niile nke Elaisha mewororị. Ụfọdụ naechè na Gihezi bụ otù onye nime ndịekpenta anọ ahụ jere n’ọmụmaụlọikwu Siria. Ọ pụtara ìhè na Gihezi enweghị ihe ọ bụla n’obi megide Elaisha n’ihi ọbụbụọnụ ahụ Elaisha bụrụ ya mgbe anyaukwu o nwere mere ka ọ nara onyinye n’aka Neaman. Anyị hụrụ ka Gihezi ji óké ọñụ náakọrọ eze akụkọ banyere ọlụebube dị icheiche nke Elaisha lụworo. Ka ọ naakọ ihe banyere nwa okorọbịa ahụ emere ka o si n’ọnwụ bilie -- n’otù mgbe ahụ -- Onyenwe anyị zigaara eze nwanyị Shunem ahụ. Ọ bịara ịrịọ eze arịrịọ maka inwetaghachị ala ya nke funarịrị ya mgbe ókéụnwụ dị n’ala ahụ ihe ra ka arọ asaa. Site n’okwu Elaisha, o jererị biri dịka ọbịa n’ala ndị Filistia, ka o wee gbanarị ahụhụ ahụ nke dị n’oge ókéụnwụ ahụ. Mgbe Gihezi hụrụ ya o tie mkpu sị “Onye-nwem, eze, nka bụ nwayị ahụ, nka bụ kwa nwa ya nwoke, onye Elaisha mere ka ọ dị ndụ ọzọ.”

Mgbe ọ bụla Onyenwe anyị naachọ ime ka eziokwu guzosieike, Ọ naenwe ụzọ nke Ya iji mee ya. Ma eleghịanya Onyenwe anyị chọrọ ime ka obi eze dị nrò ka o wee kwere inyeghachị nwanyị ahụ ala ya ọzọ. Ọtụtụ ịgbaàmà nke nzọpụta nke onye náemebiiwu chègharịworo emewo ka obi onye nlekọta ha dị nrò nke mere ka o mee ka nwoke ahụ nwere onwe ya.

Ọnwụ nke Ben-hedad

Ná mmechi nke iheọmụmụ anyị, anyị hụrụ ka Elaisha naaga Damaskọs, bụ isi obodo nke Siria. Ben-hedad naarịa ọrịa, o wee ziga Hazael, onye bụ, ma eleghịanya, onyeisi kachasị ndịisi niile náachịachị n’obodo ya, ịjụta asè n’aka Elaisha ma Ben-hedad gaesi n’ọrịa ya dị mma. Mgbe nwoke a naeguzo n’iru Elaisha, Onyenwe anyị kpugheere Elaisha na Hazael gaabụ eze ndị Siria. Elaisha hụkwara iheọjọọ dị icheiche nke nwoke a gaje ime Ụmụ Israel. Elaisha wee kwaaákwá. Hazael malitere iheọjọọ ahụ eburu amụma mgbe ọ lakwuuru eze, wee were ákwáogbugbo gbàgbué ya, wee were alaeze Siria.

Anyị naahụ kwa n’ebe a ọgwụgwụ jọgburu onwe ya nke Ben-hedad, onye busoworo Ụmụ Israel agha ọtụtụ ugbò. Chineke ekwuworị sị, “Onye ọ bụla nke nābu gi ọnu bu kwa onye anābu ọnu” (Ọnu-ọgugu 24:9).

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. 1 Gịnị wetara ókéụnwụ ahụ na Sameria?

  2. 2 Ònye ka eze tara ụta n’ihi ókéụnwụ ahụ?

  3. 3 Kọọ ụzọ Elaisha si chebe onweya site n’iwe nke eze.

  4. 4 Gịnị mere ụsụndịagha Siria ji gbalaga? Ònye chọpụtara na ha agbalagawo?

  5. 5 Kọọ ihe banyere enweghị ọchịchọ nke náánị onweha nke ndị ekpenta ahụ.

  6. 6 Mgbe azọpụtara onyemmehie gịnị naeme o ji achọ ịkọrọ ndịọzọ ihe banyere ya?

  7. 7 Gịnị mere Elaisha ji kwaákwá mgbe Hazael bịakwutere ya?

  8. 8 Kọwaa ọnwụ Ben-hedad.