Lesson 317 - Senior
Memory Verse
“N’ihi na emegh ihe ekpere n’ikpe megide ọlu ọjọ ọsọsọ, n’ihi nka obi umu madu juru eju nime ha ime ihe ọjọ” (Eklisiastis 8:11)Cross References
I Otitemmanụ nke Jihu
1 Elaisha zigara otù nwa okorọbịa nime ụmụ ndịamụma ité Jihu mmanụ ịbụ eze Israel, 2 Ndi Eze 9:1-3; I Ndi Eze 19:15-17
2 Ejezuru ozi ahụ dịka ntụziaka dị icheiche nke Elaisha nyere si dị, 2 Ndi Eze 9:4-10
3 Ndịisi ụsụndịagha nabatara ọnọdụ ọhụụ nke ijéozi ahụ enyere Jihu, wee nye aka ime ka ntụpụta nke Chineke gaa n’iru, 2 Ndi Eze 9:11-14
II Ọdịda nke Ụlọ Ehab
1 Jihu malitere ọlụ ya nke ọ lụụrụ Onyenwe anyị ngwangwa náetufughị oge, 2 Ndi Eze 9:15-20
2 Jehoram na Ehazaia bụ ndị mbụ egburu, 2 Ndi Eze 9:21-29; 8:25-27
3 Atụdara Jezebel n’ala n’ihi ajọomume na mmehie ya niile 2 Ndi Eze 9:30-37; I Ndi Eze 21:23
4 Egburu iri ndịkom asaa bụ ụmụ Ehab na Sameria, 2 Ndi Eze 10:1-10.
5 Emere ka mbibi nke èzínaụlọ Ehab zueòkè, 2 Ndi Eze 10:11-17; I Ndi Eze 21:21, 22
III Mbibi nke Òfùfè Beal
1 Jihu kpọrọ ndị niile naefè Beal òfùfè n’ụlọ Beal, 2 Ndi Eze 10:18-22
2 Achọgharịrị n’etiti ndị naefè Beal ịhụ na ọ dịghị onye ọzọ nọ n’ebe ahụ ma ọ bụghị náánị ndị naefè Beal òfùfè. 2 Ndi Eze 10:23
3 Egburu onye ọ bụla nke naefè Beal òfùfè, wee kwatue kwa ụlọ Beal, 2 Ndi Eze 10:24-28
IV Ụgwọọlụ nke Nrubeisi
1 Chineke kwere mkwà na ụmụ ụmụ Jihu rue n’ọgbọ nke anọ bụ ụmụ ndịkom gaanọkwasị n’ocheeze Israel, n’ihi na Jihu lụrụọlụ ahụ nke Chineke tụpụtara, 2 Ndi Eze 10:29:36
Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE“Ọ nātọm utọ ma-ọli, bú ọnwu nke onye nēmebi iwu” (ọ bu ihe si n’ọnu Onye-nwe-ayi JEHOVA puta): ọ digh-atọm utọ mgbe o si n’uzọ-ya chigharia, we di ndu?” (Ezikiel 18:23). Ekwusawo n’ụwa niile banyere ebere Chineke nye onyemmehie, ma ndị ahụ jụrụ ebere a wee nupuisi n’ọchịchị nke Chineke ka agaeme ka ha baa n’ikpé n’ihi mmehie ha niile. Ebere elelịrị bụ kwa ebere ajụrụajụ. “Otú ọ di, ọ digh onye di ka Ehab, onye rere onweya ime ihe jọrọ njọ n’anya JEHOVA, onye Jezebe, bú nwunye-ya, rafuru” (I Ndi Eze 21:25). Mmehie a nke ikperearụsi na nnupuisi nke Ehab na èzínaụlọ ya abụghị ihe Chineke dị nsọ nke bụ kwa Onye eziomume gaelefuru anya; ya mere ewepụtara èzínaụlọ Ehab ka ewee bibie ya kpamkpam. Enyere Elaija iwu ka o tee Hazael mmanụ ịbụ eze Siria, Jihu ịbụ eze Israel na Elaisha ịbu onye amụma: “ọ geru kwa, na onye nēwepuga onwe-ya ná mma-agha Hazael, Jihu gēme ka ọ nwua: onye nēwepuga kwa onwe-ya na mma-agha Jihu, Elaisha gēme ka ọ nwua” (I Ndi Eze 19:17).
Enweghi Ezi Nchègharị
Enyere ndị niile n’èzínaụlọ Ehab ezigbo ohere iji chègharịa. Ihe ra ka iri arọ abụọ maọbụ karị gabigaara site na mgbe enyere iwu ahụ rue na mgbe emezuru ya. Ehab wedara onwe-ya n’ala wee jégharịa nwayọ na nwa mgbe ntà mgbe ahụ atụgbusịrị Nebot na nkume, ma mweda n’ala ya erughị otú o kwesịrị ịgbanwe ikpé ahụ -- o mere náánị ka ikpé ahụ nọọ ọdụ (I Ndi Eze 21:27-29). Ọ bụrụ na Ehab nwere ezi nchègharị nke sitere n’alaala obi ya ime ya ka o si n’ụzọ ọjọọ ya niile chigharịa náenweghị obi abụọ akụkọ ndụ ya na nke èzínaụlọ ya gaabụworị ihe akọrọ n’ụzọ dị iche. Ụmụ ndịkom na ndịnyom Ehab ji obi ha niile gbaso ihenlereanya nke ibi ndụ jọgburu onwe ya na nke ihere ya niile.
Mmetụta nke omume nke ndị bụ nnenanna naenwe ná ndụ ụmụ ha dị ukwu riinne. Iwu Chineke na ọchịchọ Ya bụ ndị bụ nnenanna zụpụta ụmụ ha “n’ọzùzù na idu-ọdụ nke Onye-nwe-ayi.” Ihenlereanya nke ndị bụ nnenanna, ndị náasọpụrụ Chineke, ndị náenweghị kwa ịtaụta nke mmehie, gaeme ka ọtụtụ ụmụ ndịkom na ndịnyom jeeijè n’ụzọ nke nsọpụrụ Chineke (Ilu 22:6).
Obiebere nke Chineke agaghịadịgide mgbe ebighịebi n’ebe mmehie dị. Ụbọchị mkwughachị nke ụgwọọlụ nye èzínaụlọ nke Ehab jupụtara ná mmehie bịara ná mberede dịka ọ naaghaghị ịbịakwasị kwa onyemmehie ọ bụla nke náachọghị ichègharị n’ụzọ ọjọọ ya na omume ya niile.
Ọkpụkpọ nke Jihu na Ozi Ya
“Mma-agha JEHOVA nwere” nke ịbọọbọ nke dakwasịrị èzínaụlọ Ehab na mberede dị n’aka Jihu. Elaisha zigara otù onye site n’ụmụ ndịamụma, nye ya otù karama mmanụ ka o tee eze ọhụụ ahụ mmanụ na ka o nye kwa Jihu iwu ahụ dị mkpà na ọ gaabụ ngwaọlu agaeji mee ka ndụ ndị náemebi iwu gwụsịa. Nwa okorọbịa ahụ hụrụ Jihu na Remot-gilead, ebe ya na ndịisi ụsụndịagha ndịọzọ zukọrọ. Akpọpụtara Jihu n’akụkụ site n’etiti ndịagha ahụ; ewee zie ya ozi ahụ; awụkwasịkwara mmanụ nke otitemmanụ eze n’isi ya. Nwa okorọbịa ahụ wee gbalaga ngwangwa o jesịrị ozi ya wee rapụ náánị Jihu n’échìchè ya na ijéozi ukwu ahụ nke ebokwasịrị ya.
Emeghị ka amata ma Jihu bu ụzọ mara na nke a gaabụ ọlụ ya. Náagbanyeghị nke a, ozi ahụ sị n’ebe Chineke nọ bịa, ọ gaachọ kwa inyeaka Chineke na ike Ya iji jee ya nkeọma. Eleghịanya ịdịukwu nke ozi a mgbe egosiri ya mere ka egwù tụọ Jihu, o wee náatụgharị uche banyere otú agaesi mezue ya; ma ngwangwa Chineke zara ajụjụ niile wee meghee kwa ụzọ nke iji mezue iwu Ya niile ọsọsọ.
Nnabata
Ndịisi ụsụndịagha ahụ etufughị oge ịnabata Jihu dịka eze. Ha mere ngwa chịrị nwoke ọ bụla uwe ya doo ya n’okpuru Jihu n’elu ihe nrigo pụrụ iche na Remot-gilead, wee fụọ opiike náeme ka amara eze ọhụụ ahụ. Jihu wee were ntụkwasịobi nabata ndịisi ụsụndịagha ahụ, ya na ha wee kparịtaụka banyere ihe kachasị mma agaeme. Ha wee kwekọrịta ka onyemgbapụ ghara isi n’obodo ahụ pụọ ijé gosi ya nime Jezreel ebe eze Israel, Joram, bụ nwa Ehab, naedina n’ọrịa site ná mmerụarụ nke ndị Siria merụrụ ya.
Jihu chọrọ ịbịakwasị Joram na mberede, ngwangwa ọ chịkọtara ìgwè ndị náagba ụgbọala imezu ihe a. Onyenche nke náeguzo n’elu ụlọ na Jezreel wee hụ jihụ na ụsụndịagha ya ka ha naabịa, ma ha nọ n’ebe dị anya, o nweghị ike ịmata ha. Ezipụrụ onyennọkwasị ịnyịnya ịchọpụta ndị ha bụ na ịmata ozi ha. Jihu wee nye onyeozi ahụ iwu ka o sonye n’òtù ya. Onyenche ahụ wee gosi eze ihe naeme, ewee zipụ onyennọkwasị ịnyịnya nke abụọ. Otù ihe ahụ wee mee kwa, ma ugbu a onyenche ahụ matara na onye náedu òtù ahụ bụ Jihu, “n’ihi na ọ nēdu inyinya dika onye nāwi ara.” (Aga-ahụ ọtụtụ ndị dịka ka Jihu ọbụná n’ọgbọ a nke anaenweghị ụgbọala nke nwere ịnyịnya, ma ịkwọ ụgbọala dịka onye naawịara adịbeghị mgbe ọ tụkwasịrị ezi ihe ọ bụla n’elu nsọpụrụ nke anaenye mmadụ, ọ pụghị kwa ime nke a maọlị.
Ọgwụgwụ nke ndị Náemebiiwu
Joram wee dozie ụgbọala ya izute Jihu. Ehazaia, eze Juda onye sitere n’èzínaụlọ Ehab, soro Joram jee. Ha wee zute Jihu nwoke ọ bụla n’ụgbọala nke ya, n’ókèalaubi Nebot. Joram wee jụọ sị, “ùdo di kwa, Jihu?” O wee za sị, “Gini bu udo ahu, na mgbe ikwa-iko Jezebel, bú nne gi, na mgbasi ya nādi ọtutu?” (2 Ndi Eze 9:22). Joram wee mata na ụbọchị mkwụghachị nke ụgwọọlụ ya abịawo, o wee chịgharịa ịgbalaga; ma àkụ ahụ nke Chineke naedu gbatara ya n’agbata ogweaka ya abụọ, wee si n’obi ya pụta. Jihu nyere iwu ka atụbà ya n’ókèalaubi ebe ọ nwụrụ, ka ewee bọọ ọbọ ọbara ndị náemeghị iheọjọọ nke Nebot na ụmụ ya.
Ehazaia hụrụ ọnwụ Jehoram, ya onwe ya kwa, chọọ ịgbalaga; ma Jihu na ndịkom ya chụsoro ya, wee tigbue ya n’ụgbọala ya. O wee nwụọ na Megido, ndị órù ya wee buru ya jerue na Jerusalem, lie ya n’ebe ahụ. Ọ bụrụrụrị na Ehazaia nwere afọojuju ịnọdụ na Jerusalem ma naefè kwa Chineke nke nna ya ha òfùfè n’ebe ahụ, ọ gaghị adabaworị n’ihe ọjọọ a. Eziokwu naeguzosiike, mkparịta niile ọjọọ naemebi omume ọma, akparamaàgwà ọma, na mmadụ. Ọ bụrụ na anyị gaadịrị Chineke ndụ, anyị aghaghị ikewapụta obi anyị na échìchè anyị site n’ihe ọ bụla nke ụwa na nke mmehie dị nime ya.
Jezebe bụ onye ọzọ n’usoro ịnata ịbọọbọ nke Onyenwe anyị Chineke nke Eluigwe. O guzogidere Iwu nke Chineke, bụrụ kwa onye nnupuisi n’ebe Chineke nọ rue ọnwu ya. Mmadụ gaechè na ọ gaachọ ebe nzuzo nye onwe ya mgbe Jihu batara na Jezeerel; kama nke a, o tere iheịchọmma n’iru mpako ya ma mee kwa ka isi ya dị mma, iguzo n’iru Jihu ná nkwuwaokwu, wee kelee ya ekele n’okwu nlelị. Náenweghị obiabụọ ọ chọrọ ime ka egwù tụọ Jihu ka o wee gbanarị kwa ọnọdụ a dị egwù, dịka ọ dịwooro ya mfè ime ọtụtụ ugbò n’oge garaaga. Jezebel bụrị, ọ ka bụ kwa, ihe ọjọọ mere ka ọ ghọọ mmadụ. Chineke nyere ya ohere ka ọ chègharịa, ma o chègharịghị. Ihe niile ahụ Chineke kpọrọasị: “anya di elu, na ire okwu-ugha, na aka nāwusi ọbara nēmegh ihe ọjọ: na obi nke nēchèputa échìchè ajọ ihe, na ukwu nēme ngwa igbaga n’ihe ọjọ; na onye-àmà okwu-ugha nke nēkupu okwu-ugha di iche iche dika ume, na onye nēzisa ise-okwu n’etiti umu-nne” (Ilu 6:17-19), ka ahụrụ ná ndụ Jezebel. Ọ bụrụ na enwere otù mmehie pụtara ìhè karịa mmehie ndịọzọ niile nime ndụ Jezebel ọ bụ mmehie ịwụsị ọbara nke onye náemeghị ihe ọjọọ; otú a ka ebubo ya kwuru: “I gētigbu kwa ulo Ehab, bụ onye-nwe-gi, ka M’we bọ ọbọ ọbara ndi-orùm, bụ nd-amuma, na ọbara ndi-orù nile nke JEHOVA, n’aka Jezebel. “N’iru ntipia ka npako nāga, ọ bu kwa n’iru isu-ngọngọ ka idi-elu nke mọ madụ nāga” (Ilụ 16:18); Jezebel wee daa. Onozi abụọ maọbụ atọ wee tụda ya site na window, ịnyinya ndikom Jihu wee zọkwasị ya ụkwụ.
Ụgwọọlụ Jihụ
Jihu jezuru ozi ahụ nke Jehova nyere ya n’iwu ka o jee rue n’ikpeazụ ya. Ịnụọkụn’obi nke Jihu adaghị kwa rue mgbe egburu nwoke ikpeazụ site n’èzínaụlọ ọjọọ nke Ehab. Jihu gara n’iru ọbụná ime karịa dịka Jehova nyere ya n’iwu, n’ihi na o mebiri òfùfè nke Beal bụ ihe wetara ọdịda nke èzínaụlọ Ehab, ma Jihu zubesiriike na ọ gaghị abụ ọdịda nke ụlọ ya.
N’ihi ọlụ ndịa niile Chineke kwụghachiri Jihu ụgwọọlụ, naekwe mkwà na ụmụ ndịkom Jihu rue n’ọgbọ nke anọ gaanọkwasị n’ocheeze Israel. “Ma Jihu elezigh anya ijégharị n’iwu JEHOVA, bú Chineke Israel, n’obi-ya nile: o wezugagh onwe-ya pua ná nmehie nile nke Jeroboam, nke o jiri me ka Israel mehie” (2 Ndi Eze 10:31). Jihu bụ nwoke náanụọkụn’obi nke ukwu, ma okwu a ekwuru gosịrị na ịnụọkụn’obi ya dara mgbe Okwu Chineke megidere àtụmààtụ na ọchịchọ nke obi ya. Ọ pụrụ idu ịnyịnya dịka onye náawịara imezu akụkụ nke ozi ahụ nke Chineke nyere ya n’iwu bụ nke gaabara ya onweya urù, ma ọ laghachirị azụ n’imezu uche niile nke Chineke. Ụfọdụ nime ụzọ nke ikpere arụsị nke Jeroboam ka ọ naewezugaghị, nke a wetara ọdịda nke èzínaụlọ Jihu n’ikpeazụ. Ọlụ Jihu lụụrụ Chineke metụtara náánị ihe nke ụwa; ọ rapụrụ ịlụọlụ ahụ niile nke dịrị ya ịlụ n’ihe nke imemmụọ; ya mere ụgwọọlụ ya bụ náánị n’ụdị nke ihe nke ụwa a.
Uche Niile nke Chineke
Ọtụtụ ndị kpọrọ onwe ha ndị nke Chineke naebi ndụ ịnụọkụn’obi n’akụkụ nke Okwu Chineke ahụ nke naenye ha ohere ime otú ha chọrọ, ma ha naachọta ihengọpụ iji wezuga akụkụ nke Okwu Chineke ahụ nke naegosi erughịeru ha na mmehie ha. Ha naeme ngwangwa ịrapụ mmehie niile ahụ nke mmadụ kpọrọasị, ma mmehie ntà ahụ dị icheiche nke ha hụrụ n’anya ka ha naelekọta nkeọma naatụgharị kwa n’iru ha dịka iberibe achịcha naatọụtọ. Ozi ọ bụla nke ejeere Chineke abàghị urù maọlị ma ọ bụghị ma agbasoro Iwu Ya niile. N’inwe ezi mmeri, onye ahụ nke naachọ Chineke aghaghị ikwere Okwu Chineke niile, wee náejégharị n’ụzọ Ya niile, ma ọ bụghị otú a ọ gaghị enweta ụgwọọlụ nke Eluigwe n’ikpeazụ.
Egwù dị, mgbe anyị náejéozi dịka ndị nke Kraist, iji ịnụọkụ n’obi náejeozi ahụ nke dị anyị mma maọbụ nke naatọ anyị ụtọ, ma náelelị nke ahụ dị iche n’ihe ahụ anyị naalụ na mbụ maọbụ nke naatọghị anyị ụtọ. Nwoke ahụ nke ji obi ya chụọàjà n’ezie, onye Onyenwe anyị ji kwa náalụọlụ gaabụ onye gaaba urù nke ukwu karịa n’akụkụ ọlụ niile nke dị n’Oziọma. Ọtụtụ mmadụ nwere ihemgbochi dị icheiche n’otù ụzọ maọbụ nke ọzọ, mgbe niile ha naeji ihe ndịa dịka ihengọpụ náewezuga onwe ha n’ijéozi nke Onyenwe anyị; ma Onyenwe anyị nwere ike imeri ihemgbochi ndịa ma gbanwe ha ka ha ghọọ ezi ngwáọlụ n’aka Ya. Chineke pụrụ ime ka OnyeKraist ahụ nke nwere náánị otù talent ghọọ OnyeKraist nwere ọtụtụ talent. Dịka anyanwụ naachakwasị n’enyo nke náahụ ụzọ náegosi kwa ụdị àgwà asatọ dị icheiche mgbe o siri nime enyo ahụ chapụta, otú a ka ìhè nke Chineke mgbe ọ naachapụta ná ndụ Ndị nke Kraist dịka enyo naegbu àmụmà gaeme ka ụwa hụ ọtụtụ ụdị onyinye dị icheiche nke amara Chineke nke anya ha nke mmehie mere ka o kpue ìsì adịghị ahụ.
Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE1 N’ọnọdụ nke ịbụ gịnị ka Chineke kpọrọ Jihu?
2 Gịnị bụ ozi ahụ akpọrọ Jihu ka o jee? Òlee ụzọ esi mee ka ọ mara ozi a?
3 Òlee ndị dịnyeere Jihu ngwangwa?
4 Òlee ndịkom mbụ egburu site n’ịbọọbọ ahụ nke “mmaagha JEHOVA nwere?
5 Gịnị mere Jezebel n’ọdịda nke èzínaụlọ Ehab?
6 Kpọọ aha onyeamụma ahụ nke buru amụma banyere ihe a mere Jezebel, kwue akụkụ nke Akwụkwọnsọ kọrọ akụkọ banyere ihe a.
7 Òlee otú Jihu si meso ndị náefé Beal òfùfè?
8 Gịnị mere Jihu anataghị ụgwọọlụ nke imemmụọ? Òlee ụgwọọlụ nke kachasị mkpà?