I Ndi Eze 18:41-45; 2 Ndi Eze 2:14; 2 Ndi Eze 4:1-7, 18:35; I Ndi Eze 17:10-24; 2 Ndi Eze 3:9-20; 2 Ndi Eze 8:7-10; I Ndi Eze 21:19-22; 2 Ndi Eze 2:8, 11, 12; 2 Ndi Eze 13:14-21.

Lesson 318 - Senior

Memory Verse
“Site n’aka JEHOVA ka emeworo ka nzọ-ukwu nile nke madu guzosie ike; uzọ-ya nātọ kwa Ya utọ” (Abù Ọma 37:23).
Cross References

I Ndụ Elaija Na Nke Elaisha Yiri Onwe Ha

1 Ndịamụma abụọ ndịa n’otù n’otù tiri mmiri Jọdan ihe ka ha nweta ụzọ ịgafe ya, 2 Ndi Eze 2:8; 2:14

2 Elaija na Elaisha n’otù n’otù bụ ngwaọlụ nke eji zitere ndị nọ n’óké mkpà mmiri ime ka ha nwere onwe ha, I Ndi Eze 18:41-45; 2 Ndi Eze 3:9-20

3 Ndịnyom abụọ dị icheiche nke di ha nwụrụanwụ natara enyemaka na nkasịobi na mgbe mkpà site n’ọlụ Elaija na Elaisha, I Ndi Eze 17:10-16; 2 Ndi Eze 4:1-7

4 Elaija na Elaisha n’otù n’otù rịọrọ Chineke arịrịọ, ewee mee ka ụmụ okorọbịa ndị nwụrụanwụ dị ndụ ọzọ, I Ndi Eze 17:17-24; 2 Ndi Eze 4:18-35

5 Elaija na Elaisha kpọdatara ịbọọbọ n’isi ndị naekweghịekwe, 2 Ndi Eze 1:9-12; 2:23-25

6 Ndụ Elaija gwụrụ n’ụwa mgbe ekuru ya laa n’Eluigwe nime ụgbọalaọkụ n’ókéifufe, 2 Ndi Eze 2:11, 12

7 Elaisha nwụrụ site n’ọrịa, ma ọkpụkpụ ya ka nwereike dị ebube nke Chineke bụ ike nke mbiliten’ọnwụ, 2 Ndi Eze 13:14-21

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

Ndịamụma Chineke

Ịmata onye Elaija maọbụ Elaisha bụ, mgbe ụfọdụ naagbagwoju ndị náadịghị eji nleruanya agụ Akwụkwọnsọ anya. Aha ha yiri onwe ha, ha dọgbukwara onwe ha n’ọlụ nwa oge n’ọlụ nke Chineke. Ndịkom abụọ ndịa lụrụ ọtụtụ ọlụịrịbaàmà dị ukwu, ha nwekwara mmetụta dị ebube n’ebe ndị Israel nọ. Ọbụná otú a, ụdị mmadụ Elaija na Elaisha bụ na omume ha dị icheiche.

Elaija, Onye Tisbe

Ileba anya n’ihe banyere iji ndụ nke Elaija tụnyere nke Elaisha bụ onye nọchiri anya ya, gaabụ ihe baraurù. Emere ka Elaija pụta ìhè n’iberibe akwụkwọ nke akụkọ mgbe ochie nke ụmụ Israel nke jupụtara n’iheike, n’enweghị nkọwa maọbụ nkwupụta ọ bụla banyere mmalite ya. Ozi mbụ o ziri nke edepụtara n’akwụkwọ bụ ihe mere na mberede dịka ọ dị kwa na mpụta ìhè ya. Ozi ya bụ amụma banyere ụbọchị ọjọọ nke ọchịchịrị nke gaabịkwasị ndị Israel. “Igirigi ma-ọbụ miri-ozuzo agagh-adi ma-ọli n’arọ ndia, ma ọ bu nání dika okwum si di” bụ akwụkwọozi nke nkọwa nke Elaija ji kọwaa onweya nye ndị Israel dịka onyeamụma nke Chineke.

Anyị amataghị ma Ehab, bụ eze Israel, ọ nabatara ozi nke amụma a ngwangwa mgbe anatara ozi ahụ na mbụ, ma mgbe náadịghị anya ụkọ mmiriozuzo gosiri na Elaija bụ ezi onyeamụma nke Chineke. Achọgharịrị onyeozi nke nhụjuanya a n’ebe niile nime obodo ahụ, ma enweghị ike ịchọta ya. Ọ bụ ngwọlụ nke Chineke, Chineke chebekwara ya.

Ijéozi nke Elaija bụ nke ibuagha megide omume ọjọọ ndị ahụ pụtara ìhè nke naeweta ihere na mmehie ahụ nke naelomi ndị Israel, bụ ndị ahụ Chineke rọpụtara. Ọ naeguzo ichè n’iru ibe akwụkwọ nke Okwu Chineke dịka ihe ncheta nke izuókè na onyeozi dị ọkụ nke iwe Chineke megide mmehie. Ekwuwo yarị na mgbe onyeamụma nke Chineke naabịa izi ndị ahụ ozi, ọtụtụ mgbe ikpé Chineke naeso ya ngwangwa n’azụ. Ọ dị ka nke a bụ eziokwu banyere Elaija.

Ọtụtụ oge, Elaija naanọ náánị ya, n’ihi na ọ naapụta site n’ebe zoroezo náánị na mgbe na mgbe ikwugide mmehie. Ọ dịghị anọkarị n’etiti ndị Israel n’ibiobi ha kwa ụbọchị kama ọ naapụta n’ebe ahụ mgbe ụfọdụ. Ozi Elaija nye ha ọtụtụ mgbe naadakarị ikeike nke bụ ihe náechetara ha na ọ dịghị ụzọ ọ bụla Chineke gaesi gụọ ndị ikpé mara na ha bụ ndị ikpé náamaghị; ọtụtụ mgbe, ikpé dị ọkụ nke Chineke naadakwsị ndị mmehie dịka ịdọakanántị nke dị egwù nye ndịọzọ.

Ndịamụma Beal hụrụ ike Chineke nke Elaija, ma ha tụfuru ndụ ha n’iheegwù ahụ nke ha bara nime ya n’ihi na ha chọrọ ilelị Chineke nke Eluigwe. Elaija kwugidere Ehab na Jezebel n’ihi óké ajọomume ha, ekwupụtakwara ikpé Chineke megide ha. Ọ bụ ezie na Elaija lụụrụ ndị Israel ọtụtụ ọlụ ebere ma naeleba kwa anya na mkpà ha, ma isi ijéozi ya dị ka ọ bụ ịkwatụ ikpere arụsị.

N’ịlụọlụ nke ikwugide mmehie, ọ dị mkpà ka Chineke nwee onye bụ onye naanụsịọkụ ike n’obi banyere eziomume nke Chineke na ijéozi Chineke. Elaija bụ nwoke ahụ, bụ onye ụdị mmadụ, ọ bụ na omume ya bụ nnọọ nke kwesịrị ọkpụkpọòkù ahụ. Otú ọ dị, anyị matakwara na Elaija “bu madu yiri ayi n’aru-ya” (Jemes 5:17). Elaija hụrụ Chineke n’anya nke ukwu, ma n’ihi na o ji obi ya niile hụ Chineke n’anya, ọ gaahụworị ndị Israel n’anya. Ọ bụrụ na mmadụ hụrụ Chineke n’anya, ọ gaahụ kwa mkpụrụobi nke ụmụmmadụ n’anya, n’ihi na ịhụn’anya nke Chineke n’ihe banyere mkpụrụobi nke ụmụmmadụ dị ukwu.

Enwererị ike chee na Elaija enweghị ịhụn’anya dị ukwu n’ebe ndị Israel nọ ebe ọ naakpọdatara ha ọnụma dị egwù nke Chineke site n’oge rue n’oge. Ọzịzá nke ajụjụ ahụ bụ na ịnagide mmehie abụghị ihe naegosi ịhụn’anya. “Chineke bu ihu-n’anya” ma náagbanyeghị ihụn’anya nke a Chineke bụ onyeiro kachasị n’ịkpọ ajọomume niile asị.

Chineke iwepụ mmehie n’obi bụ obiọma nke ọ naadịghị ihe ọ bụla agaeji tụnyere ọnụahịa ya n’ụwa. Mgbasa nke ifè arụsị òfùfè n’ebe niile bụ mmehie ọjọọ nke wetara ọnụma na ikpé nke Chineke megide mba ahụ. Enwere náánị otù ụzọ iji dozie ọnọdụ dị otú a, nke ahụ bụ ibibi ikpere arụsị. Elaija chọrọ ka eweghachi ezi òfùfè nke Chineke, o nwekwara ịnụọkụn’obi ijéozi dị otú a. Mmiriòzùzò agaghị adị n’Israel rue mgbe obi ha gaechigharịkwute Chineke ọzọ. Ọ bụ ihe mgbagwojuanya nye mmadụ na aka ahụ nke Chineke ji tisie ihe otiti ike megide mmehie bụ kwa nke apalitere site n’obi ebere na ezi ịhụn’anya nye onye ahụ nke etiri ihe. Ọ bụghị ihe náadịghịeme mgbe ọ bụla na mmadụ naaghọtahie nzube ndịa, na enwereike ibo onye ahụ nke náanụsịọkụ n’obi ike n’ikpere Chineke ebubo, dịka eboro Elaija, na ọ bụ onyeisi nke náemekpa ndị ahụ arụ.

Elaija matara kwulu na nguzogide niile nke chere ya n’iru, n’ihi na o nwere oge nke ịdamba nime mmụọ na nke ikeọgwụgwụ nke obi mgbe o nwesịrị mmeri ya dị ukwu n’ebe ndịamụma Beal dị. Otú ọ dị, ọ bụghị onye gbara ọsọ nke ọma na nwa oge ka agaazọpụta , kama ọ bụ onye weere ntachịobi nọgide rue ọgwụgwụ ihe niile. Elaija meriri ọnọdụ ịdàmba ya, anyị onweanyị pụrụ ime kwa otú a.

Lee otú Chineke si sọpụrụ ma gọzie kwa otù nwoke nke Chineke a dị óké ọnụahịa! Ọgwụgwụ ya bụ otù nime mmeri na ebube kachasị nke ọ bụla edeworo n’Okwu Chineke. Eweliri ya elu n’óké ifufe izute Onyenwe ya, ụsụ ndị mmụọozi nke Eluigwe gbakwara ya gburugburu! “Le ugbọ-ala ọku na inyinya ọku, … Elaija we rigorue Eluigwe n’oké ifufe.” Òlee onye náagaghị achọ ịla n’ụzọ dị otú a? Anapụrụ ndị Israel onyeagha dị ike mgbe Onyenwe ya mere ka Elaija larute Ụlọ n’Eluigwe.

Elaisha, Nwa Shefat

Chineke rọpụtara Elaisha ịbụ onye gaanọchi Elaija. Ọ dịghị onye ọ bụla enyere ike ịlụzu ọlụ niile nke Chineke. Akpọrọ onye ọ bụla nime anyị ịlụọlụ n’otù akụkụ ọlụ nke Chineke maọbụ nke ọzọ, bụ ebe anyị pụrụ ịlụ ma anyị chọọ. Elaija agbasiwo mgbá ike n’iweghachị ezi òfùfè nke Chineke n’ala Israel, ijéozi ya lụpụtakwara ihe dị ukwu ná ndụ ndị ahụ. Ọ lụworo Chineke ọtụtụ agha dị ukwu, ma ugbu a oge eruwo ka etee onyeganọchianya ya mmanụ.

N’ọlụ Onyenwe anyị, ọ bụ onye ọ bụla n’ọkpụkpọ nke ya. Elaija alụzowo otù akụkụ nke ọlụ nke Chineke, ọlụ ya wee gwụ. Elaisha nọchirianya Elaija wee malite ọlụ nke Chineke site n’ebe ahụ, ọ bụ ezie na ọ bụ n’ụdị dị iche. “Ma òkìkè nke onyinye-amara di, ma ọ bu otù Mọ Nsọ ahu. Òkìkè nke ijéozi di kwa, otù Onye-nwe-ayi ahu di kwa. Òkìkè ihe alutaworo n’ọlu di kwa, ma ọ bu otù Chineke ahu, Onye nālusi ihe nile ike nime ayi nile” (I Ndi Kọrint 12:4-6).

Mgbe ụfọdụ ana arụụka onye ka ibe ya ukwu, Elaija kaọbụ Elaisha? Nke a bụ otù nime ajụjụ nzuzu na nke amaghị ihe ahụ bụ nke Pọl naadụ anyị ọdụ ka anyị jụ (Lee 2 Timọti 2:23; I Timọti 1:4). Ha abụọ bụ ndịdike nke Chineke, onye ọ bụla n’ọkpụkpọ na n’ụdị nke ya. Onyensọ nke Chineke kwesịrị inwe ọchịchọ ịgbaso ha n’iheatụ ha nke ịsọpụrụ Chineke na ịdịnsọ, náabụghị ịchọsi ike ka ọ dị ukwu karịa ụmụnna ya, maọbụ dị ukwu karịa onye ọ bụla n’etiti ụmụnna nime Kraist.

Anaecheta Elaisha nke ukwu n’ihi ọchịchọ ya inwe “Òkè abua” nke Mmụọ Chineke dịka ọ dị ya n’ihe ọ bụla. Elaisha rịọrọ ihe dị ukwu n’aka Chineke náatụghị egwù, n’ihi nke a ọ natara ihe dị ukwu n’aka Chineke. Ijéozi nke Elaisha metụtara oge nke inye Mmụọ Nsọ, na nwụpụ nke Mmiriòzùzò ikpeazụ karịa oge nke ndịamụma. Apụrụ ịkọwa mmalite nke ijéozi ya dịka iheatụ nke ndị ahụ bụ ndị náachọ ma náanatakwa ike nke sitere n’Eluigwe site na Ọwụwụmmiri nke Mmụọ Nsọ

Elaisha birindụ nke mmeri zuruòkè, anyị enweghị kwa ihe edepụtara banyere oge ọ bụla mgbe ọ nọ n’ịdamba nke imemmụọ dịka nke Elaija gafere. Ọ lụrụ ọtụtụ ọlụịrịbaàmà dị ukwu dịka nke Elaija lụrụ, wee lụọ kwa ọtụtụ nime ha karịa nke onyeamụma ọ bụla ọzọ lụrụ ma agụpụ Moses.

Ike Nke Mbiliten’ọnwụ

Ọnwụ nke Elaisha abụghị ụdị nkewapụ nke mmeri dịka nke ọ hụworo mgbe ekuuru Elaija baa n’Eluigwe. Elaisha nwụrụ site n’ọrịa; ma ọ bụ ezie na ọnwụ ya abụghị ihe dị ebube, ma ọ dị ihe ukwu dị iche nke náadịghị eme n’ebe ọ bụla nke mere mgbe ọnwụ ya gasịrị. Otù nwoke anaachọ ijé lie n’ebe ọzọ ka atụbara ngwangwa nime ílì Elaisha n’ihi na ndị náapụnara mmadụ ihe naabịaru nso. Mgbe arụ nwoke ahụ nwụrụanwụ metụrụ ọkpụkpụ Elaisha, nwoke ahụ wee dị ndụ ọzọ. Ọ bụ site n’ike nke mbiliten’ọnwụ nke dị nime onyensọ nke Chineke ahụ.

Jisọs sịrị Mata: “Mu onwem bụ nbilite-n’ọnwu na ndu: onye nēkwere na Mu, ọbuná ma asi na ọ nwuru anwu, ọ gādi ndu ọzọ” (Jọn 11:25). Ọzọ kwa anyị gụrụ: “Ma ọ buru na Mọ nke Onye ahu Nke mere ka Kraist Jisus si na ndi nwuru anwu bilie nēbi nime unu, Onye ahu Nke mere ka Kraist Jisus si na ndi nwuwru anwu bilie gēsite kwa n’aka Mọ-Ya Nke nēbi nime unu me ka aru-unu nke puru inwu anwu di ndu” (Ndi Rom 8:11).

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. 1 Kpọọ ọlụịrịbaàmà olenaole nke Elaija na Elaisha lụrụ nke bụ otù ụdị.

  2. 2 Òlee otú agaesi ji ndụ nke Elaija tụnyere nke Elaisha?

  3. 3 Òlee ụzọ anyị si mara na náánị otù onye apụghị ịlụọlụ niile nke Chineke?

  4. 4 Òlee otú ọkpụkpọ nke Elaisha si dị iche na nke Elaija?

  5. 5 Gịnị ka anyị mụtara n’eziokwu a na emere ka nwoke nwụrụanwụ dị ndụ ọzọ site n’ịmetụ ọkpụkpụ Elaisha arụ?

  6. 6 N’ụzọ dị añaa ka ijéozi nke Elaisha si bụrụ iheatụ nke oge nke inye Mmụọ Nsọ?