2 Ndi Eze 11:1-21; 2 Ihe Emere 24:1-27

Lesson 319 - Senior

Memory Verse
“Cheta kwa Onye kèworo gi n’ubọchi nile i di n’okorọbia, mgbe ubọchi ihe ọjọ akābiagh, na mgbe arọ akābiarugh nso, mgbe i gāsi, Ha atọghm utọ” (Eklisiastis 12:1).
Cross References

I Ichi Otù Nwa Okoro Eze

1 Atalaia bibiri mkpụrụ niile nke ndị nwe alaeze Juda, o wee naachị ala ahụ, 2 Ndi Eze 11:1, 3

2 Jehosheba zoro Joash n’Ụlọukwu Chineke arọ isii, 2 Ndi Eze 11:2

3 Jehoiada kpọkọtara ndịisi n’Ụlọukwu Chineke na nzuzo, wee gosi ha nwa eze ahụ nye kwa ha ngwaagha, wee debe ndịnche gburugburu Ụlọukwu Chineke, 2 Ndi Eze 11:4-11

4 Ha wee tee nwa okoro eze ahụ mmanụ kpube kwa ya okpueze; ndị ahụ wee náakụ aka náañụrị kwa ọnụ, 2 Ndi Eze 11:12

5 Atalaia nụrụ ụzụ ahụ, wee bata nime Ụlọukwu Chineke, ha wee jide ya gbue kwa ya, 2 Ndi Eze 11:13-16

6 Jehoiada wee mee ka ndị ahụ na Jehova gbaa ndụ; ebibiri n’ụlọ Beal; ewee kubata Joash n’ụlọ eze, 2 Ndi Eze 11:17-21

II Mmezi Nke Ụlọukwu Chineke Ahụ

1 Joash malitere ịbụ eze mgbe ọ gbara arọ asaa wee mee kwa nkeọma n’ụbọchị niile nke Jehoiada, 2 Ihe Emere 24:1-3

2 Joash wee kpebie imezi Ụlọ Jehova wee gwa ndịnchụàjà na ndị Livai ka ha nakọta ụtụisi site n’aka ndị ahụ, 2 Ihe Emere 24:4, 5

3 Ndị ahụ wee náetufu oge banyere okwu a ewee debe otù igbe ntà n’ọnụụzọ nke Ụlọukwu Chineke, 2 Ihe Emere 24:6-9

4 Enyere ego n’ụba ewee dozie Ụlọukwu Chineke, 2 Ihe Emere 24:10-14

III Ndaghachịazụ Nke Eze Ahụ

1 Jehoiada nwụrụ ewee lie ya n’etiti ndịeze, 2 Ihe Emere 24:15, 16.

2 Ndịeze nke ụwa wee rafue Joash ịba n’ikpere arụsị, 2 Ihe Emere 24:17, 18

3 Ezigara ndịamụma ịdọ ndị ahụ akanántị, 2 Ihe Emere 24:19, 20

4 Site n’iwu nke eze nyere ejiri nkume tụgbue Zekaraia, 2 Ihe Emere 24:21, 22.

5 Jehova wee kwenye ka ndịagha nke Siria bịa n’ikpé megide Joash na ndịisi ahụ, 2 Ihe Emere 24:23, 24

6 Ndị orù Joash gburu ya, 2 Ihe Emere 24:25-27

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

Ndaghachịazụ nke alaeze Israel site n’ifè Jehova agbasawo rue alaeze nke Juda. Ihe kpatara ndaghachịazụ a karịsịa bụ ọlụlụ nwunye náezighịezi n’iwu nke ndịeze ha nye ndịnyom ndị sitere ná mba ndị ahụ náekpere arụsị. Iwu nke Moses, nke Chineke nyere n’Onwe Ya, megidere ọlụlụ di na nwunye dị otú a, n’ihi na Chineke matara na ndịnyom ndịa náekpere arụsị gaeguzobe arụsị Ashera (ogidi) dị icheiche n’ala ahụ nke Chineke nyeworo ndị Ya. Ndịnyom a náemebiiwu dị ka ha nwere ụzọ ha si arata ndị bụ di ha ka ha soro ha n’òfùfè ha. Siterị n’oge Iv duhiere Adam ka o rie mkpụrụosisi ahụ nke Chineke sịrị ha erila, ndịnyom náadịghị asọpụrụ Chineke abụrụworị ndị náalụsịọlụ ike naeduhie ọtụtụ ndịkom ime ihe niile ahụ nke Chineke sị kaagharaime. Ọzọ kwa, óké ọchịchọ maka inweta ike bụ ihe dị ka ọ naejidesi ọtụtụ mmadụ ike n’ụzọ ọ naeju mmadụ anya. Ọ dị kwa ka ọ dịghị ihe dịkarịrị ala maọbụ ihe naeme mmadụ ihere ime nye ụfọdụ mmadụ náánị ka ha wee nweta ọchịchọ maọbụ ebumn’uche nke onwe ha. Anyị nwere n’ebe a akụkọ banyere otù nnenne onye gbusichara ụmụụmụ ya, ka o wee bụrụ ezenwanyị nke ganaachị ala ahụ.

Aha nnenne nke ajọomume ahụ bụ Atalaia. Ọ bụ ada Ehab na nwunye ya bụ Jezebel nke naekpere arụsị. Atalaia bụ nwunye Jehoram eze Juda. Ntọala nke ahụ ndụ Atalaia adịghị mma, o jesoro ajọomume niile na iheọjọọ niile nke nne ya na nna ya. Emere ka iwe ya dị ọkụ karịa n’ihi na Jihụ kpochapụrụ ụlọ Ehab n’Israel, o wee kpebie ibibi ụlọ Devid na Juda. Ọ fọdụrụ ntakịrị ka o mezue nzube ya. Ma Jehova ekweworị Devid mkwà na nwa nwoke nke aka ya na mkpụrụ ya niile.

Mgbe Atalaia malitere igbu ndị èzínaụlọ nke eze niile, Jehosheba, nwunye Jehoiada bụ onye nchụàjà ma bụrụ kwa nwanne Ehazaia, wee zopụ nwa nwoke nke eze ahụ ma zoo kwa ya nime Ụlọukwu Chineke, n’ihi nke a egbughị kwa nwata ahụ bụ Joash mgbe ana egbu ndịọzọ. Ọ dị mfé izo nwata ahụ n’Ụlọukwu Chineke n’ihi na ọ bụ náánị ndịnchụàjà naelekọta Ụlọukwu Chineke,ọ bụ kwa ihe anaatụghị anya ya na onye ahụ nke naekpere arụsị nke naadọrọ kwa ocheeze ọchịchị n’ike ganaabịaru n’ebe ahụ mgbe dum.

Àtụmààtụ Nke Jehoiada

Jehoiada, bụ Onyeisinchụàjà bụ onye eziomume o wee chọọ kwa iweghachị ndị ahụ n’òfùfè nke ezi Chineke. Ikpere arụsị agbasawo n’ala Israel wee rue kwa n’alaeze nke Juda, ewukwara Beal ụlọ. Ha ewereworị ihe niile ahụ edoro nsọ dị n’Ụlọ Chineke wee debe ha n’ụlọ Beal.

Eleghịanya nime arọ isii niile ahụ ezoro nwa okorontà ahụ n’Ụlọukwu Chineke, Jehoiada nọ náatụ àtụmààtụ dị icheiche banyere iweghachị alaeze ahụ nye ezi onye nketa ya. Náenweghị obiabụọ ọ ghaghị ịgwawọrị ndịisi ụsụ ndịagha na ndịokenye okwu banyere ya wee chọpụta ndị dịnyeere Chineke. Ọ dịghị ndị nledo nọ n’etiti ha iburu akụkọ ahụ jekwuru Atalaia onye ajọomume ahụ.

N’ikpeazụ, Jehoiada wee chịkọta ndịisi ụsụ ndịagha na ndịkom ha baa n’Ụlọ Jehova. O wee nye ha ngwaagha ma mee kwa ka ha nọọ gburugburu dịka ndịnché na ndịàmà. Mgbe ahụ o dubata nwa okoro ntà ahụ, bụ Joash, were ya gosi ha. Lee otú nke a gaesi bụrụwọrị mkpughe nke naenye ọñụ nye ndịkom ndịa kwesịrịntụkwasịobi ịhụ nwa nwoke nke eze! Ha ñụrịrị ọñụ! Anyị naañụrị kwa ọñụ, mgbe ekpughere Ọkpara Chineke -- Jisọs Kraist, Onye gaje ịbụ Eze ndị eze nime obi anyị.

Ichi Otù Nwa Okoro Ntà Eze

Ndịisi ụsụndịagha rubereisi n’iwu nke Jehoiada, bụ Onyeisinchùàjà. Chineke nọnyere ha, àtụmààtụ ha gakwara nkeọma. Ọ bụrụ na anyị anọọ n’akụkụ eziihe kwe ka Chineke nọnyere anyị, mmeriị aghaghị ịbụ nke anyị. O doroanya na emere ememe nke ichieze ahụ n’otù nime ụbọchị ememe mgbe ụmụmmadụ sitere n’ala ahụ dum zukọtara na Jerusalem. Edubatara Joash n’Ụlọukwu Chineke wee mee ka ọ nọdụ n’akụkụ otù idé, n’ebe anaedobekarị ndịeze mgbe ekpubesịrị ha okpueze.

Ákwàiken’isi, iheàmà ahụ, na mmanụ nke otitemmanụ bụ ihe atọ dị mkpà n’ichieze. Ákwàiken’isi ahụ bụ okpueze ya. Iheàmà ahụ bụ Iwu ahụ nke ọ ñụworo iyi idebe, otitemmanụ ahụ nke eji mmanụ nsọ ahụ tee bụ kwa ikewapụta ya iche na ido ya nsọ ịlụọlụ ahụ nke Chineke kpọworo ya ịlụ. Nke a bụ akụkọ mbụ anyị nụworo banyere ichi nwata eze.

Otù Ọgbụgbandụ

Jehoiada mere ka enwee ọgbụgbandụ n’etiti Jehova na eze ahụ na ndị ahụ, na ha gaabụ ndị nke Jehova. Lee ụdị ntụte nke a bụ! Ngwangwa ndị ahụ jere n’ụlọ Beal wee kwatue ya, tiwasịa ebe ịchụàjà ya niile wee kụrisịa ogidi ya niile, emesịa ha wee gbue onyenchụàjà ya.

Mgbe Jisọs batara nime obi, anaachụpu ekwensu na ebeichụàjà ya niile. Ikpere arụsị adịghị kwa ọzọ mgbe emere Onyenwe anyị eze nime obi anyị. Mgbe ndị Israel rubereisi n’iwu Jehova ha bụ ndị nwere ọñụ. N’oge a ha toro Chineke wee kụọ kwa aka ha n’ọñụ, n’ihi na ala ahụ dum enwerewo onwe ya site n’ọchịchị mmegbu na ikpere arụsị nke Atalaia.

Idozi Ụlọ Jehova

Ka eze ahụ naetolite ọ chọpụtara na ekwesịrị idozi Ụlọ Jehova. Ọ dịkwa ka ndịnchụàjà na ndị Livai bụ ndị ịhụ mgbawa na ohere niile na mgbidi niile ahụ daraada ghọworo ihe ochie n’anya nke mere na ha enweghị kwa mmetụta banyere ihe ndịa. Ọ dị mfé ịnọ náagagharị n’enweghị nleruanya n’enweghị kwa ike ịhụ ihe niile ahụ nke ekwesịrị ime nime obi anyị na nke ekwesịrị imere Onyenwe anyị. Ọbụná arịrịọ mbụ nke eze ahụ rịọrọ ka ha náañaghịntị, ma mgbe o mesiri ha ike n’ihi ya ha wee jee ịlụọlụ ahụ. Ọtụtụ mgbe ka Onyenwe anyị naeji ịdọakanántị dị icheiche mesie ndị ya ike n’ihi nlefuruanya ha. Baịbụl naekwu banyere OnyeKraist na “n’akuku inu-ọku nke obi-unu, nāgharanu idi ọbọ; n’akuku mọ-unu, nādinu ọku; n’akuku Onye-nwe-ayi, nābunu orù” (ma-ọbụ, na onye nke Kraist “adịghị ume-nwụ n’ọlụ” kama ọ “na-anụ ọkụ nime mụọ, na-ejere Onye-nwe-ayi ozi”) (Ndi Rom 12:11).

Jehoiada wee were otù igbe mee ohere n’elu ya debe ya n’akụkụ ebeịchụàjà. Ọbụná taa anyị naanụ ihe banyere igbe nke Jehoiada. N’otù aka ahụ, àtụmààtụ nke inwe igbe, maọbụ igbe nke onyinye, n’akụkụ ọnụụzọ nke Ụlọ Chineke, dị ka ihe agbasoworo n’ọgologo arọ niile náesoni

Mgbe Jisọs nọrị n’ụwa enwere otù mgbe n’akụkụ ọnụụzọ nke Ụlọukwu Chineke otù ụbọchị O wee naele ka ndị ọgaranya naetinye onyinye ha; ka O guzo n’ebe ahụ Ọ hụrụ otù nwanyị ogbenye dị ya nwụrụanwụ ka ọ naetinye ego ntà abụọ (mite). O wee kpọọ ndị naesoụzọ Ya sị ha “N’ezie asim unu, Nwayi a, bú ogbenye, nke di ya nwuru, ọ tubàra kari ha niile: n’ihi na ndia nile sitere n’inwebiga-àkù-ókè-ha tubà n’onyinye: ma nwayi ahu sitere n’ukọ-ya tubà n’ihe nile o nwere nke o ji biri” (Luk 21:3, 4).

Siterị na mgbe amalitere Ọlụ nke Apostolic Faith, anyị agbasowo kwa otù àtụmààtụ ahụ n’ihe banyere ego eji elekọta nzụkọ anyị, site n’idebe igbe n’akụkụ ọnụụzọ nke esi abata n’ụlọ nzukọ anyị, maka otùụzọnaụzọiri na onyinye afọofufo niile. Ọ dịbeghị mgbe anyị nakọrọ ego n’ọrà. Ọ dịbeghị mgbe ọ bụla echere efere ụtụ n’iru ọra mmadụ. Ọ dịghị kwa mgbe edebere Baịbụl emeghereemeghe n’elu ebeịchụàjà ka ọra mmadụ náagabiga ma náedebe kwa onyinye ha n’elu ya, ime ka mmadụ niile hụ onyinye ha naenye. Jisọs sịrị, “Mgbe ị nālu ọlu ebere, ka aka-ekpe-gi ghara ima ihe aka-nri-gi nēme: ka ọlu ebere gi we di na nzuzo: Nna-gi Nke nāhu ihe na nzuzo gēnyeghachi kwa gi” (Matiu 6:3, 4).

Mgbe Jehoiada debere igbe ahụ n’ọnụụzọ nke Ụlọukwu Chineke, akpaliri obi ndị ahụ inye onyinye; ego wee bata n’ụba n’ihi ndozi nke Ụlọukwu Chineke. “Onye were aka ntagide nāgha nkpuru gēwere kwa aka ntagide nēwe ihe-ubi; onye were kwa ngọzi nāgha nkpuru gēwere kwa ngọzi nēwe ihe-ubi. Ka onye ọ bula n’etiti unu nye dika o buru uzọ rọputa n’obi-ya; ọ bugh site na nwuta, ma-ọbu site na nkpà: n’ihi na Chineke huru onye were obi-utọ nēnye n’anya” (2 Ndi Kọrint 9:6, 7). Ndị naahụ maka ọlụ ahụ jikwa ikwesịntụkwasịobi jee ozi ha nke mere na ha edeghi otú ha si mefue ego ahụ etinyere n’aka ha n’akwụkwọ. Anyị ahụghị kwa na nsogbu pụtara n’ọlụ ahụ.

Ndaghachịazụ Nke Otù Eze

N’iheọmụmụ a anyị hụrụ mmetụta dị ukwu nke dị kwa ike nke otù onye náasọpụrụ Chineke. Ka oge Jehoiada naadị ndụ ra aka ya dị nnọọ ike n’ịchịkọta nzukọ Chineke na obodo ahụ. O wezugara ikpere arụsị na Juda, mmetụta o nwere n’ebe eze ahụ nọ mere ka eze ahụ nọgide n’ijéijè n’okporoụzọ nke ziriezi. Jehoiada chịrị obodo ahụ ná aha eze mgbe ọ nwụrụ eli kwara n’etiti ndị eze. Nke ahụ gosipụtara nsọpụrụ dị ukwu nke ndị obodo ahụ naenye ya.

Mgbe Jehoiada nwụsịrị anwapụtara na Eze Joash bụ nnọọ eze náadịghị ike. Ekwensu gbebatara ya na ndịozi ya ma eze ahụ enweghị obiike na nguzosiike. Ọ dị ka onye náenweghị ike ịsị É-è n’ebe ihe ọjọọ dị. Ndịisi ahụ wee were okwu ireụtọ dị icheiche rafue ya. “Egbugbere-ọnu nke nēkwu okwu ire-ụtọ na obi abua ka ha ji ekwu” (Abù Ọma 12:2). Otú a anyị wee hụ na mgbe ewepụrụ ogweaka ahụ dị ike nke nwanne nna ya bụ Jehoiada, Joash enwekwaghị nguzosiike nime obi ya, ngwangwa o wee daba n’okwu nduhie nke onyeiro ahụ. “Ma onye were ntachi-obi nọgide rue ọgwugwu ihe nile, onye ahu ka agāzọputa” (Mak 13:13). David onye dere Abù Ọma dere otù mgbe sị: “JEHOVA, zọputa; n’ihi na onye-ebere agwusiwo; n’ihi na ndi kwesiri ntukwasi-obi agwupuwo n’etiti umu madu” (Abù Ọma 12:1).

Ịdọakanántị Dị Icheiche Nke Ndịamụma

Onyenwe anyị ekweghị ka Joash na ndị ya daba n’aka ndịiro n’ebughị ụzọ dọọ ha akanántị ọtụtụ mgbe. “O zite ndịamuma n’etiti ha, ime ka ha laghachikute JEHOVA; ha we gba àmà megide ha: ma ha añagh nti.” N’ikpeazụ, dịka ịdọakanántị nke ikpeazụ, Mmụọ nke Chineke wee bịakwasị Zekaraia nwa Jehoiada bú onyenchụàjà, o wee sị ha: “N’ihi gini ka unu onwe-unu nāgabiga ihe niile JEHOVA nyere n’iwu, ihe we ghara igara unu nke-ọma” n’ihi na unu arapuwo JEHOVA, Ọ rapuwo kwa unu.” Eze nyere iwu ewee tụgbue onyeamụma a na nkume. Ọbụná ndịeze pụrụ ichefu, ma Onyenwe anyị apụghị ichefu! Ọ bụ nnenanna nke onyeamụma a zoro eze ahụ wee mee ka aghara igbu ya mgbe ọ bụ nwata. Echefuru iheọma ha mere ngwangwa, ma Jehova echefughị. Ọ bụ nnọọ mgbe otù arọ gasịrị ka ndịagha nke Siria bịkwasịrị Juda na Jerusalem. Ha gburu ndịisi niile, buga ihe dum ha kwatara n’agha na Damaskọs, wee rapụ eze ahụ n’ọrịa ná enweghị inyeaka. Mgbe ahụ ndịorù nke aka ya wee gbue ya. Otú a ka ọgwụgwụ jọgburu onwe ya nke onye ahụ gbakụtara Chineke na ezi okpukpé nke Jehova azụ si bịa.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. 1 Òlee otú, sitekwa n’aka onye ka esi napụta ndụ nwata ahụ bụ nwa eze ka aghara igbu ya?

  2. 2 Ònye naachị obodo ahụ n’oge a?

  3. 3 Arọ òle ka Joash gbara mgbe emere ya eze?

  4. 4 Kwue àtụmààtụ dị icheiche nke Jehoiada n’ime Joash eze?

  5. 5 Gịnị bụ ihe atọ ahụ dị mkpà mgbe anaechi mmadụ eze?

  6. 6 Gịnị ka Joash chọpụtara banyere Ụlọukwu Chineke?

  7. 7 Gịnị ka ọ gwara ndịnchụàjà na ndị Livai ka ha mee?

  8. 8 Gịnị mere eze mgbe Jehoiada nwụsịrị?

  9. 9 Ụbọchị ikpeazụ nke Joash, ha dị n’udo?