Jona 1:1-17; 2:1-10; 3:1-10; 4:1-11

Lesson 320 - Senior

Memory Verse
“Asi na emere okwu ekwuru site n’ọnu ndi-mọ-ozi ka o guzosie ike, asi kwa na njehie nile ọ bula na añagh-nti nile ọ bula natara nnyeghachi nke ugwọ-ọlu ziri ezi; àyi onwe-ayi gēsi aña gbanari, ma ọ buru na ayi lefuru oké nzọputa di otú a anya? bú nzọputa nke eburu uzọ kwu site n’ọnu Onye-nwe-ayi, ndi nuru ya we me ka o guzosie ike rue ebe ayi nọ” (Ndi Hibru 2:2, 3).
Cross References

I Tashish Kama Nineve

1 Jehova nyere Jona iwu ikwusara ndi Nineve okwu, 1:1, 2

2 Jona malitere ịga Tashish, iji gbapụ n’iru Jehova, Jona 1:3

3 Ebilimmiri dị ukwu dị n’óké osimiri ahụ, Jona 1:4, 6

4 Site ná ntụpụta nke ya onwe ya, atụbara Jona nime ókéosimiri ahụ, Jona 1:7-16

5 Jehova akwadobewo otù azụ dị ukwu ilo Jona, Jona 1:17

II Mkwà Dị Icheiche Nke Jona

1 Ọnọdụ ọjọọ nke Jona mere ya ka o kpeeekpere, Jona 2:1-7

2 Mgbe Jona kwere mkwà ịkwụghachị mkwà ya niile, Jehova mere ka azụ ahụ gbọpụta Jona n’ala akọrọ, Jona 2:8-10

III Mkwusa Nke Dị Ìrè

1 Okwu Jehova ruru Jona ntị nke ugbò abụọ, Jona 3:1, 2

2 Jona biliri wee jerue Nineve, Jona 3:3

3 “Ọ fọduru ọgu ubọchi abua, ewe kwatue Nineve,” Jona 3:4

4 Ndị Nineve kweere na Chineke wee chègharịa n’ajọomume ha, Jona, 3:5-9

5 Chineke hụrụ ọlụ niile ha wee chigharịa ikpé ahụ, Jona 3:10

IV Onyemkwusa Náenweghị Obiebere

1 Jona chọrọ ka ikpé bịakwasị ndị Nineve n’otù oge ahụ, Jona 4:1-3

2 Chineke kuziri Jona iheọmụmụ nke ime ebere, Jona 4:4-11

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

Jona, nwa Amitai, bụ onyeamụma, sitere na Gat-hefa, obodo nke dị na Zebulun. Oge ọ dị ndụ náebu kwa amụma bụ oge ndị èzínaụlọ Jihu naachị Ụmụ Israel. Amụma niile nke Jona aghaghị ịbụworị ihe amatara ma nabata kwa nkeọma n’ala Israel niile, n’ihi na ha bụ amụma dị icheiche nke ịnapụta ndị Israel n’aka ndị iro ha, na nke iweghachị òkè ala furuefu. (Lee 2 Ndi Eze 14:25-28).

Otù Ozi Ọhụụ

Otù ụbọchị Okwu Jehova ruru Jona ntị, ma ezigaara ya ndị dị iche. Jona maara olu Jehova, o nweghị kwa ike ịghọtahie Okwu Chineke, ma gịnị bụ ozi a? “Bilie, jerue Nineve, bú obodo uku ahu, kpọsa okwu megide ya; n’ihi na ihe ọjọ ha arigotawo n’irum.” Nineve bụ isiobodo nke ndị Asiria.

Mgbe Chineke gwara Abraham banyere mmehie dị ukwu nke Sodom na nzube Ya ịkwatu obodo ọjọọ ahụ, Abraham malitere ngwangwa ikpeekpere banyere nchèbe ha; ma Jona bụ ụdị mmadụ dị ichè. Kama ikpeekpere banyere Nineve maọbụ malite njèm ya ịga kwusaara obodo ahụ Okwu Chineke, Jona mere ọsọsọ ịga ebe dị anya dịka o nwere ike site n’ebe obodo ahụ dị. Ikwusaara ndị Nineve Okwu Chineke gaenye ha ohere iji nweta nzọpụta, ọ bụ ezie na ha bụ ndị emererị ka ha bụrụ ndị alaọzọ n’ebe ọnọdụ ndị amụrụ n’Israel dị ma bụrụ kwa ndị ọbịa n’ebe ọgbụgbandụ niile nke mkwà ahụ dị. N’ihi ihe ụfọdụ Jona enweghị mmasị ịhụ naazọpụtara ndị Nineve maọbụ debe ha ndụ. Ọ dịghị onyeamụma nke naagbakute uche Chineke na Okwu Ya azụ nke náabụ kwa ezi onye amụma ọzọ. Nwoke maọbụ nwanyị ahụ nke náajụ isoro àtụmààtụ na ọchịchọ nke Chineke nke emere ka ọ pụta ìhè abụghị kwa otù nime ndị èzínaụlọ nke Chineke, ọbụná ma asị na azọpụtara ya na mbụ. Onye a bụ OnyeKraist na mbụ nke lezirianya rapụ ụzọ ahụ nke ziriezi na nke ijéozi. Nnupụisi bụ mmehie, mmehie naekewapụ kwa mmadụ na mmekọ niile ọ bụla n’ebe Chineke nọ.

Ọtụtụ Ngọpụ

Gịnị mere onyeamụma dịka Jona, onye Onyenwe anyị jiworo lụọọlụ nke hụwokwara ọgan’iru nke ọlụ ya, jiri chọọ n’otù ntabianya ịrapụ ọlụ ya gbalaga na n’ịgbapụ n’iru Jehova? Náagbaghịagụgọ Jona enweworị ihe ụfọdụ o bu n’uche banyere omume ya niile ahụ. Ihengọpụ ụfọdụ pụtara ìhè nye Jona nke ọ chọrọ iji napụta onweya site n’ọlụ ahụ niile nke ọ naaghaghị ịlụ.

Anaejikarị ngọpụ dị icheiche ọtụtụ mgbe naedochi ọnọdụ nke ime uche Chineke niile. Chineke naakpọ ndịmkwusa njégharị, ma ọtụtụ ndị nụrụ òkù ahụ naagọpụ onwe ha n’ihi ọtụtụ ọlụ ha nke naejidesi ha ike n’ụlọ. Ọ naezipụ ụmụmmadụ baa nime ubi nke owuweiheubi ikwusa Oziọma ahụ, ma ụfọdụ naagọpụ onweha na ha erughịeru. Onyenwe anyị naachọ onye gagbasa okwu nkasịobi Ya n’ụlọọgwụ na nime ụlọmkpọrọ, ma ọtụtụ mmadụ naagụ onweha dịka ndị ọlụ ha jidere nke ukwu na ha agaghị enwe ohere ịrapụ ha. Jisọs sịrị: “Otù nwoke siri nri-anyasi uku; we kpọ ọtutu madu: O we zipu orù-ya n’oge hour nke nri-anyasi ahu isi ndi akpọworori, Bianu; n’ihi na edoziwo ihe nile ugbu a. Ma ha nile were otù olu malite iriọ ka arapu ha … asim unu, na ọ digh otù onye nime ndikom ahu ndi akpọworo gēdetu nri-anyasim ire” (Luk 14:16-18, 24).

Jona gaagbalịworị ịgọpụ onweya n’ịga kwusaara ndị Nineve Okwu Chineke n’ihi na ọ pụrụ ịhụ na mba Asiria nke dị ike nke náemeri kwa emeri gaje ịbịakwasị ala Israel n’oge náadịghịanya. Amụma nke Jona bụ banyere iweghachị ókèala niile nke ndị Israel; dịka ọ bụ ezigbo onye Israel, nke náakwagide ndị obodo ya, ọ naekwoekworo ka eme ka ókèala ahụ niile guzogide. Ike nke ndị Asiria gaabụworị ihe akụdara n’ala nke ukwu ma ọ bụrụ na isiobodo ha gaabụ ihe ebibiri na mberede site n’iwu Chineke n’ihi ajọomume ha. Ọ dị ka nke ahụ bụ ihe Jona chọrọ. O wee jụ i kwusaara ndị Nineve Okwu Chineke. O wee sị, “Amaram na Gi onwe-gi bu Chineke nke bu onye amara, Onye obi-ebere, Onye nādigh-ewe iwe ọsọsọ, Nke nāba kwa uba n’ebere, Nke nēchèghari kwa uche banyere ihe ọjọ ahu I gēweta” (Jona 4:2). Ọ jụrụ ikwusa Okwu Chineke ka ndị Nineve ghara ichègharị wee dị ndụ, Ma échìchè niile nke Chineke abụghị échìchè nke mmadụ, ụzọ niile nke mmadụ abụghị kwa ụzọ nke Chineke. Nchepụta niile nke mmadụ bụ iheefu n’ebe Chineke nọ; ọzọ mgbe Chineke naekwuokwu ọ bụ oge nye mmadụ igentị na ime ihe ahụ, náagbanyeghị ihe niile mmadụ bu ụzọ buru n’obi.

Ebili Mmiri

Ná ịgbapụ n’iru Jehova, Jona rịdara na Jọpa bụ isi ọnụmmiri nke ndị Israel. N’oge náadịghịanya ọ chọtara ụgbọ nke náaga Tashish, o wee kwụọụgwọ ya banye n’ụgbọ, naechè náánị ihe banyere ịgbapụ n’ọlụ ya n’ebe Chineke nọ. Ọ dị ka Setan naenwe nnọọ ihe edoziri maka ibupụ ndị ahụ náagbapụ n’ọlụ ha nye Chineke. Ọtụtụ nde mmadụ akwụwoụgwọ ụgbọ ha ịgbapụ n’iru Chineke, náánị ịchọpụta na omume niile ha bụ iheefu; n’ihi na mgbanarị adịghị n’iru Chineke. “Ọ bu Chineke nke nọ nso ka M’bu, ghara ibu Chineke nọ n’ebe di anya? ọ bu ihe si n’ọnu JEHOVA puta. Ọ di onye ọ bula gēzobe onwe ya n’ebe ọ bula di nzuzo, Mu onwem we ghara ihu ya anya? ọ bu ihe si n’ọnu JEHOVA puta. Ọ bugh elu-igwe na uwa ka M’juputara? ọ bu ihe si n’ọnu JEHOVA puta” (Jeremaia 23:23, 24). Ọ bụ ihe anaapụghị ime bụ ịgbapụ n’iru Chineke.

Ụgbọ Jona malitere njèm ya ịga Tashish, ma n’oge náadịghịanya ndị náanaya ụgbọ ahụ dabara n’óké nsogbu. Jehova zitere óké ifufe na ebilimmiri dị ukwu. Ụgbọ ahụ wee nọọ n’ọnọdụ egwù nke o nwere ike itiwasị n’iberibe. Ndị náanya ụgbọ ahụ matara iheegwù ha nọ nime ya wee malite náetiku chi ha dị icheiche; ma Jona rịdararị nime ime ala ụgbọ wee daa n’óké ụra, náamaghị nsogbu na iheegwù nke ya onwe ya naakpata.

“Ụzọ ndi-nghọgbu bu nání nkume” (Ilu 13:15). Onyenwe anyị ji ndị náemebiiwu tụnyere mmagharị nke ókéosimiri nke náapụghị ịdị jụụ, nke mmiri ya namapụta ụrọ na apịtị. “Ọ digh udo ndi nēmebi-iwu nwere, ka Chinekem siri” (Aisaia 57:21). Ọnụma Chineke gaadị ka ebilimmiri nke ndụ, nke náamali eli imegide mkpụrụ-obi ọ bụla nke náaju ịza òkù Chineke na ime ihe Ọ chọrọ. Jona gbalịrị ịgbapụ n’iru Chineke, ma ọ chọpụtara onweya n’etiti ebilimmiri nke ókéosimiri, ebe óké ahụhụ na ọnwụ bụ ihe náeche ya n’iru. Onye ahụ nke náagbapụ n’iru Chineke náagbaba nime nsogbu oge niile; otú ọ dị, ọ ghaghị kwa inye Chineke ọzịzá ma emesịa. Lee otú o si dị mma nke ukwu ikwere na ịsọpụrụ Chineke iji nwe ike gaa ijé ná ndụ a n’inwe óké mmerị!.

Ejidere Ya

Ndị ọkwọụgbọ ahụ kpọtere Jona n’óké ụra ya nke ọ náamaghị ihe náeme na nke ịnọ na nchébe nke anụarụ wee gwa ya ka ọ kpọkue Chineke ya maka inyeaka. N’oge náadịghịanya, ndịọkwọụgbọ ahụ wee mata na ọ bụ Jona wetara nsogbu ha, ha wee jụọ ya ihe enwereike ime iji mee ka óké osimiri ahụ dajụọra ha ọzọ. Jona zara na ha gaebulite ya tụba kwa ya n’ókéosimiri. Ndị ọkwọụgbọ ahụ mere nke a ma ọ bụghị site n’alaala obi ha, náánị mgbe ha mesịrị ihe niile ha nwereike ime iji zọpụta onweha n’ụzọ nke aka ha. Dịka Okwu Chineke si dị, óké osimiri ahụ dajụrụ.

“JEHOVA we guputa otù azù uku ilo Jona; Jona we nọ n’afọ azù ahu ubọchi atọ ehihie na abali.” Mgbe ụfọdụ Chineke naewere ụzọ pụrụ ichè iji kpọrọ ndị nnupụisi rue nchègharị, onye nnupụisi ahụ naahụ kwa ahụhụ dị ukwu oge niile site n’ụzọ ahụ siriike nke Chineke hụrụ na ọ dị mkpà iji wee mee ya.

Ekpere nke Jona

N’ezie ọ dị Jona ka o ruworị n’ólùlù nke ọkụalammụọ mgbe ọ rịdara nime afọ azụ ahụ. Dịka ọnọdụ ọjọọ ya si gbaa ọchịchịrị, Jona matara na ihe ka njọ naechere ya ma ọ bụrụ na o kpeghịekpere. Ọtụtụ mmadụ naeche na ọkụalammụọ niile ha gaje ịmara bụ náánị ahụhụ ahụ nke ha hụrụ n’ụwa, ma ọ dịbeghị onye ọ bụla nọworo n’ọnọdụ dị mkpagide karịa Jona. Jona maara na ọnọdụ ọjọọ nke ọ nọ nime ya bụ ndetụire nke ihe gaje ịbịa n’ezie ma ọ bụrụ na o chègharịghị n’omume na mmehie ya niile. Jona kpereekpere! Nime òlùlù niile nke enweghịolileanya, na ahịhịa alụghụlụ dị na mmiri nke kụkụrụ ya n’isi na kwa mkpụrụobi ya nke náada mbà, Jona kpereekpere. O kwekwara mkwà ọzọ ịkwụghachị mkwà ya niile. Azara ekpere ahụ nke ekpere n’oge olileanya gwụsịrị. Chineke nụrụ wee za, náagwa azụ okwu ka ọ gbọpụta Jona n’ala akọrọ.

Ọ naesiri ụfọdụ mmadụ ike ikwere n’akụkọ ahụ banyere Jona, ma okwukwe nime Chineke na n’Okwu Ya gaewepụ iheisiike ọ bụla nke dị n’ikwere. “JEHOVA we guputa otù azù uku ilo Jona.” Chineke kere ihe niile nke anyi maara na nke anyị naahụ kwa anya, n’ihi gịnị kà anyị gaeji ghara ikwe na Ọ pụrụ ikè otù azụ nke gaelo Jona? Jisọs kwagidere eziokwu ahụ na atụrụ Jona mkpọrọ nime afọ azụ mgbe Ọ sịrị: “N’ihi na dika Jona nọrọ ubọchi atọ ehihie na abali n’afọ oké anu miri; otú a Nwa nke madu gānọ n’obi nke ala ubọghi atọ ehihie na abali” (Matiu 12:40). Otù ike Chineke ahụ nke mere ka azụ gbọpụta Jona n’ala akọrọ, ka ewee kwusaara ndị Nineve okwu ahụ, mekwara ka Ọkpara Chineke si n’ílì pụta ná mbiliten’ọnwụ ka ewee kwusaa nchègharị na mgbaghara mmehie n’Aha-Ya: “Ndikom Nineve gēso ọgbọ a bilie n’iké ahu, ha gāma kwa ya ikpé: n’ihi na ha chèghariri ná nkwusa nke Jona; ma le, Onye ka Jona nọ n’ebe a” (Matiu 12:41)

Iri Ụbọchị Anọ

Ọkpụkpọòkù nke Chineke ruru Jona ntị nke ugbò abụọ, naezi kwa ya otù ozi ahụ na ọ ghaghị ikwusa okwu Chineke nye ndị Nineve. Ka OnyeKraist ọ bụla mụta iheọmụmụ a na ekwesịghị iji ọkpụkpọ òkù nke Chineke mee iheefù, ọzọ kwa, ịzà òkù ahụ ngwangwa naenyeaka ime ka ọlụ ahụ dị mfè. Jona mụtara iheọmụmụ ya n’ụzọ siriike. Asị na ọ malitere ịga Nineve na mbụ mgbe Chineke kpọrọ ya, ọ gaanapụtaworị onweya n’ọtụtụ nsogbu!

“Ọ fọduru ọgu ubọchi abua, ewe kwatue Nineve.” Ozi Jona dị nkenke, ma o doroanya náeweghị kwa ihieụzọ. Ndị Nineve arụghịụkà banyere ozi ahụ maọbụ ike nke Jona ji náekwusa, n’ihi na n’ezie olu Mmụọ nke Chineke daraụda n’obi ha karịa olu Jona n’okporoụzọ niile nke obodo Nineve. Ndị niile bi n’obodo ahụ chègharịrị -- site n’eze ha, onye siri n’ocheeze ya rịdaa wee yipụ uwe nwụda nke ịbụ eze ya, rue n’orù nke kachasị ala. Mmadụ niile yikwasịrị ákwámkpé. Eze wee nye iwu na mmadụ maọbụ anụmanụ agaghị edetụ ihe ọ bụla ọnụ, maọbụ nri maọbụ miri. “Ka ha kpuchie onwe-ha n’ákwá-nkpe, ma madu ma anumanu, ka ha kpọkusi kwa Chineke ike: ka ha chighari kwa, onye ọ bula ya pua n’uzọ ọjọ ya, na n’ihe-ike nke di n’ọbu-aka-ha. Ònye mara? Elegh anya Chineke gēchighari, chègharia uche, si n’iwe-Ya di ọku chigharia, ka ayi we ghara ila n’iyì” (Jona 3:8, 9). Chineke chègharịrị n’iheọjọọ ahụ nke O zubere ime ndị Nineve. Ezi nchègharị gaanapụta mmadụ n’iwe Chineke mgbe ọ bụla.

Iburu Ụzọ Chọọ Chineke

Ndị Nineve chọrọ ebere nke Chineke site n’ekpere na obubuọnụ ngwangwa ha nụrụ ozi Jona. Chineke sịrị, “Ọ fọduru ọgu ubọchi abua,” Ma ndịa etufughị oge ọ bụla. Ụwa naanụ ozi nke ikpé gaje ịbịa dịka ndị Nineve nụrụ, ma ọ dịghị onye pụrụ ịmata mgbe ụbọchị ikpé ahụ gaabịa: “Elu-igwe na uwa gāgabiga, ma okwu nile nkem agagh-agabiga ma-ọli. Ma ọ dịgh onye ọ bula matara ihe banyere ubọchi na oge hour ahu, ọbuná ndi-mọ-ozi nke elu-igwe amatagh, Ọkpara ahu amatagh kwa, kama ọ bu nání Nnam matara” (Matiu 24:35, 36). N’ihi na Onyenwe anyị naeme ka ọbịbịa Ya nọọ ọdụ, ọtụtụ mmadụ naanọ kwa ọdụ n’ijikere maka ụbọchị ahụ.

Asị na ọtụtụ mmadụ n’ọgbọ a bi n’obodo Nineve wee nụ mkwusa Jona, ha gaechéreworị rue ọgwụgwụ nke iri ụbọchị anọ tupu ha amalite ikpeekpere. Ọtụtu mmadụ naagba onweha ume site n’ichè na ha gaekpeekpere n’oge hour ikpeazù nke ndụ ha maọbụ n’oge hour ikpeazụ nke ụwa nke a. Lee otú mmadụ naeji nganga naelelị, naajụ, naarapụ ịhụn’anya na ebere nke Chineke wee naele anya na Chineke gaagbaghara ndụ niile nke o biri nime mmehie site n’ekpere ntakịrị nke ọ gaekpe náánị mgbe ndụ ya nke o biri n’ịlan’íyì naagafe! Eleghịanya, ọ gaghị enwe ohere ikpeekpere ntakịrị ahụ nke naerijughị afọ. Ọ bụ ụzọ dị egwù, bụrụ kwa nke náedoghịanya ịga ijè nime ya.

N’akụkụ nke ọzọ, Chineke naakwụ ndị orù Ya kwesịrị ntụkwasịobi ụgwọọlụ n’ùjú. Onye nke Kraist adịghị arịọ ọñụ, afọojuju, maọbụ udo. N’ụbọchị ndụ ya niile nke ọ bụ OnyeKraist ntụgharịuche ya bụ ihe banyere ọbịbịa nke Jisọs nke dị nso. Ọ naagabiga ndagwurugwu nke onyinyo ọnwụ, ọ bụrụ na ọ dị mkpà, na enwe ezi nchekwube maka ndụ ebighịebi na olileanya ahụ nke karịrị ílì. Chineke naeji nkasịobi niile nke Eluigwe guzo n’akụkụ ya. Náánị otù ụzọ nke ndụ dị nye onye nke Kraist ahụ, nke ahụ bụ ụzọ ahụ nke Jisọs meghere n’ugwu Kalvarị -- nke bụ ụzọ nke Oziọma ahụ.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. 1 Gịnị mere Chineke ji zigaa Jona Nineve?

  2. 2 Gịnị mere Jona jiri malite ịga Tashish?

  3. 3 Òlee otú esi gbochie njèm Jona ịga Tashish?

  4. 4 N’ụzọ dị añaa ka Jehova jiri mee ka mmiri ghara iri Jona?

  5. 5 Gịnị mere azụ ahụ jiri gbọpụ Jona n’alaakọrọ?

  6. 6 Gịnị bụ ozi ahụ nke Jona kwusara nye ndị Nineve?

  7. 7 Òlee otú ndị Nineve si nara ịdọakanántị nke Chineke?

  8. 8 Òlee otú anyị si mata na akụkọ banyere Jona bụ eziokwu?