2 Ihe Emere 26:1-23.

Lesson 321 - Senior

Memory Verse
“Asi na madu nēchè na ya bu ihe, mgbe ọ nābugh ihe ọ bụla, ọ nāghọ onwe-ya aghughọ n’obi” (Ndi Galetia 6:3).
Cross References

I Ọlụọma Na Ịbaụba Nke Uzaia

1 Iweli ya elu n’ocheeze na nwata, Uzaia, maọbụ Azaraia, naesosi onye nke Chineke ike, 2 Ihe Emere 26:1-5; 2 Ndi Eze 15:1-4; I Ndi Eze 2:4.

2 Chineke mere ka ihe gaara Uzaia, na ndị Juda nkeọma mgbe Uzaia naejeso Jehova náedebe kwa ihe niile O nyere n’iwu,2 Ihe Emere 26:5-15; 31:21; I Samuel 12:13-15; Deuteronomi 29:9; I Ihere Emere 22:11-13; Abù Ọma 1:3.

II Mkpako Nke Uzaia Na Ahụhụ Atara Ya

1 Mgbe Uzaia ghọrọ onye dị ike o chezọrọ iwu niile nke Chineke, 2 Ihe Emere 26:15, 16; Deuteronomi 6:10-12; 8:10-20; Abù Ọma 62:10; Ilu 1:32; 30:7-9.

2 Mpako na mmadụ ichè na ya nwezuru ihe niile n’onweya bụ mmehie dị icheiche nke náeweta ịlan’iyì, 2 Ihe Emere 26:16; Daniel 4:30-32; 5:17-24; Hosea 13:1-8; Luk 12:16-21; Ilu 16:18; I Jọn 2:16.

3 Ichè na ya dị ike ma nwezu kwa ihe niile, Uzaia wee lụọ ọlụ dịrị ndị nchụàjà, 2 Ihe Emere 26:16-18; Ilu 25:14; Ọnu-ọgugu 16:1-35; Levitikọs 10:1-11; Ọnu-ọgugu 3:5-10; 18:1-7.

4 Uzaia wereiwe mgbe onye naejere Chineke ozi baara ya mbá -- ihe ọzọ naegosi mpako ya -- Chineke wee tie ya iheotiti, 2 Ihe Emere 26:19; 2 Ndi Eze 15:5; Abù Ọma 141:5; Ndi Hibru 12:5; I Pita 2:20; Ndi Efesọs 5:21; I Pita 5:5, 6.

5 Achụpụrụ Uzaia n’Ụlọukwu Chineke, 2 Ihe Emere 26:20

6 Uzaia buuru ihe-ịrịbaàmà nke ọnụma na ikpé Chineke baa n’ílì ya; ọ dịghị ihe ekwuru banyere ya n’ụzọ nchègharị, 2 Ihe Emere 26:21-23; 2 Ndi Eze 15:5-7.

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

Uzaia, bụ eze Juda, nwere ezigbo mmalite, ọ gaenweworị ọgwụgwụ dị mma ma ọ bụrụ na ọ gara n’iru n’ụzọ ahụ nke wetara ngọzi Chineke n’ebe ọ nọ ná mmalite nke ọchịchị ya. Ma Uzaia ejeghị ijè dịka Chineke ya chọrọ o wee si n’eziomume na ịdịnsọ baa ná mpako na onweonye iju ya afọ. Ọ hụrụ ahụhụ dị egwù ma nwụọ na amamikpé nke Chineke n’ihi mmehie ya. Agwaghị anyị ebe nchègharị ya jeruru, maọbụ na ahụrụ nchègharị ọ bụla n’obi ya, ma n’ihi ekpenta ya, o nweghị kwa ike ịbà n’Ụlọukwu Chineke ọzọ, o wee nwụọ náenweghị nkasịobi maọbụ agbamume.

Lee ka o si bụrụ ihe ọmiko nye mmadụ ahụ nke nwewororị ohere niile n’ụzọ nke ihemmụọ ma mesịa rapụ ezi ụzọ ahụ rọrọ ụzọ nke njehie! “Ezi omume nke onye ezi omume agagh-anaputa ya anaputa n’ubọchi njehie-ya, … onye ezi omume apugh idi ndu nime ya n’ubọchi o mehiere” (Ezikiel 33:12). Anaehichapụ mmehie niile nke onyemmehie mgbe agụrụ ya n’onye eziomume site n’amara enyere n’efu nke Chineke; n’otù aka ahụ, ezi ọlu niile nke onye eziomume adịghị anapụta ya ma o chigharịa pụọ n’ụzọ nke eziomume ịbànye n’ụzọ nke mmehie. Ọ bụrụ na onye eziomume “tukwasi obi n’ezi omume-ya, me ajọ omume; ezi omume-ya nile, agagh-echeta ha ma n’ajọ omume-ya nke ọ meworo, nime ya ka ọ gānwu” (Ezikiel 33:13). Ndịa bụ ntụgharịuche dị mkpà. Ha naegosi óké mkpà ọ dị bụ ịmalite n’ụzọ ziriezi, ya na mkpà ọ dị kwa ịnọgide n’ezi ụzọ ahụ wee rue n’ọgwụgwụ.

Uzaia EzeJuda Ahụ Nke Nwere Ohere Pụrụ Iche

Uzaia nwere ohere nke ọtụtụ mmadụ náenweghị. Ọ bụ eze ma nwee kwa ọtụtụ ohere dị icheiche ime ihe dị mma maọbụ ihe dị njọ; ma na mmalite nke ndụ ya o mere nkeọma wee jeeijè na ndụmọdụ nke onye nke Chineke. “O me ihe ziri-ezi n’anya JEHOVA, … o we nọ n’ichọ Chineke n’ubọchi Zekaraia, onye nwere nghọta n’ihu Chineke: ma n’ụbọchi ọ nāchọ JEHOVA, Chineke mere ka ihe gara ya nke-ọma.” Ebe edepụtara ọnụọgụgụ nke ihe o mere dị ogologo. Agọziri Juda n’oge a ọ naeme nkeọma n’ọchịchị ya. Ekwuru sị na Uzaia bụ onye mbụ mepụtara ígwè eji alụ agha nke apụrụ iji mee ka oge ọ naewe iji kwatue obodo niile ewuru mgbidi gburugburu dị mkpụmkpụ. Dịka onye hụrụ ọlụubi n’anya, ihe gaara obodo ya nkeọma n’okpuru ọchịchị ya.

Uzaia nwere ohere nke ịmata ọtụtụ ndị nke Chineke ndị amaara nkeọma ma agụpụ Zekaraia, bụ onye anyị maara náánị ihe ntakịrị banyere ya. Aisaia bụ onye amụma n’oge ọchịchị nke Uzaia, ọ bụ kwa n’arọ nke ọnwụ Uzaia ka Aisaia hụrụ ọhụ ahụ nke Atọnimeotù dị Nsọ nke mere ka ọ mata mkpà ọ dị ya inwe odudonsọ zuruòkè. Emọs na Hosea bukwara amụma n’oge ọchịchị nke Uzaia. Náenweghị obiabụọ ọ bụla, enwekwara ọtụtụ ndịọzọ náasọpụrụ Chineke nọ nime obodo ahụ ndị akpọtaworo nye Chineke site n’aka ndịozi atọ nke eziomume ndịa ndị njikọtaọnụ nke okwukwe na amara nke imemmụọ ha pụrụ ikwagide na ịgọzi alaeze ahụ na onye eze ahụ.

Ma mba ahụ ejighị obi ha niile gbasoo ihenlereanya nke eze ha maọbụ okwu niile nke ndịamụma ha, ndị ahụ ka naaga kwa n’iru n’isure ihe nsureọkụ naesiisiụtọ na ịchụàjà dị icheiche n’ebe dị elu niile nke Uzaia naewezugaghị. Mba ahụ wee bụrụ ndị ekewaraekewa n’òfùfè ha, nke bụ nnọọ ihe dị ala n’iji ya dochie òfùfè nke otù Chineke nke bụ ihe Chineke chọrọ. Ụfọdụ nime ha naaga n’Ụlọukwu Chineke, ebe ndịọzọ naechègharị ijeso ụzọ ahụ nke ka mfé -- bụ ụlọ maọbụ ebe ha rọpụtara nke gaadịrị ha mfé ịnọ mee òfùfènrò nke náachọghị mgbalị nke ijiobichụọàjà n’aka ha dịka njèm ahụ dị ogologo rue Jerusalem ugbò atọ n’arọ chọrọ. Eleghịanya ụfọdụ naeje n’Ụlọukwu Chineke n’ebe niile dị elu, náeche sị na ọ bụrụ na otù dị mma, ha abụọ gaadị mma karịsịa. Náenweghị obiabụọ, ụfọdụ jere n’Ụlọukwu Chineke náánị na ha maara na o kwesịrị ime otú a ọ bụghị na ha nwere ezigbo mmụọ nke òfùfè nime obi ha. Ma anaenwe ndị fọdụrụ mgbe niile ndịkwesịrị ntụkwasịobi bụ ndị naefè Chineke òfùfè, naefè náánị Ya, n’ihi na ha hụrụ Ya n’anya na n’ihi na ha chọrọ ụzọ Ya karịa ihe niile ọ bụla ọzọ.

Ndị yiri ụdị mmadụ ndịa dị icheiche ka apụrụ ịchọta n’etiti Ndị okpukpé nke Kraist n’ụbọchị taa, dịka ọ dị kwa n’oge niile nke akụkọ mgbe ochie nke Nzukọ Kraist. Ma enwere náánị otù ụzọ. Náánị otù Chineke dị kwa. Enwekwara náánị otù nzọpụta. Enwere náánị otù òfùfè nke ahụ bụ kwa òfùfù nke ezi Chineke nke bụ nime mmụọ na n’eziokwu. Enwere náánị otù ọgbakọ nke Onyenwe anyị gaachịkọta mgbe Ọ gaabịa, ndị mejupụtara ọgbakọ ahụ bụ ndị Ya na ha gbara ndụ n’elu àjà.

Uzaia, “eyere ya aka n’uzọ di ebube, rue mgbe ọ di ike.” Onyeozi ahụ dere sị: “Ya mere kama ihe ọzọ m’gēwere obi-utọ nile nya isi n’adigh-ikem nile, ka ike nke Kraist we ridakwasim, biri kwa nimem. N’ihi nka adigh-ike nile na imem ihe-ihere nile na nkpà nile na nsogbu nile na óké nkpà nile n’ihi Kraist dim ezi nma: n’ihi na mgbe ọ bụla m’nādigh ike, mgbe ahu ka m’nādi ike” (2 Ndi Kọrint 12:9, 10). Mgbe niile Uzaia naadabere na Chineke, Chineke naenyere ya aka. Mgbe niile ahụ Chineke naenyere ya aka o nwereike dị ukwu.

Ma ọtụtụ mgbe ndịọzọ naeme dịka Uzaia mere. Ọ dị mfé, mgbe Chineke nyesịịrị anyị aka wee nye anyị ike n’ọtụtụ n’otù ụzọ maọbụ n’ụzọ ọzọ na anyị naewepụ anya anyị pụọ n’ebe Onye onyinye ahụ nọ wee náelegide anya n’ike ahụ maọbụ n’ihe niile ahụ anyị lụworo, maọbụ ná ngọzi dị icheiche nke anyị nataworo. Nke a ka anyị náagaghị eme ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ka anyị jigide ịdịmma na ngọzi nke Chineke. Anyị aghaghị ilegide Onyeonyinye ahụ anya. Anyị agaghị elekwasị anya n’ihe anyị pụrụ ịlụ nkeọma, ihe niile anyị lụpụtara, ihe nnweta anyị niile, maọbụ onyinye niile anyị. Ọ bụghị náánị na ụfọdụ naele ihe ndịa anya kama ha naanyakwaisi nime ha bụ nke jọrọnjọ karịa náánị ilegide ha anya. Onye ahụ nke náasọpụrụ Chineke agaghị ekwe ọbụná ka o lee ihe ndịa anya ma ọ bụghị ile ha anya náánị ka ewee nye Chineke otuto site na ha.

Jisọs kwuru sị: “Mgbe ọ bula unu gēmesi ihe nile akaworo àkà nye unu, sinu, Ayi bu orù nābagh n’ihe; ayi emewo ihe ayi ji ugwọ ime” (Luk 17:10). Pọl Onyeozi dere, “Iru-eru-ayi sitere na Chineke” ( 2 Ndi Kọrint 3:5). Edekwara sị: “Onye ọ bula nke gēweli onwe-ya elu, agēweda ya; onye ọ bula nke gēweda kwa onwe-ya, agēweli ya elu” (Matiu 23:12), nke anyị pụrụ ịtụkwasị n’elu ya ajụjụ nnyocha ahụ nke sitere n’Akwụkwọnsọ: “Ònye nākpa ókè n’etiti gi na madu-ibe-gi? ọ bu gini kwa ka i nwere nke i nānatagh? Ma ọ buru na i natara ya, gini mere i nānya isi, dika agāsi na i natagh ya? (I Ndi Kọrint 4:7).

Ọtụtụ Ihe Nke Mmehie Naalụpụta

Ihe ọzọ nke Uzaia mere bụ nke ọ gaghị echèworị échìchè ime n’oge mbụ mgbe obi ya dị ala n’ebe Chineke nọ. Adịghị abami nime mmehie na n’ihe ọjọọ niile dị nime ya ná mmalite. Anaenwe mmalite, mmalite ahụ nwere ike ịdị ka ihe náenweghị mmehie. Na nke Uzaia, eleghịanya ọ dịghị onye ọ bụla hụrụ ya. Baịbụl kwuru sị: “Obi ya di elu.” Eleghịanya ọ ka naaga n’iru n’otù ụzọ ahụ, n’otù omume ahụ dịka anya naahụ, n’otù ụkpụrụ nke òfùfè ahụ, ya na otù ndịòtù na ndịenyì ahụ ya na ha naeso dịka na mbụ. Ma ihe mgbanwe adịwo: “Obi ya di elu.”

Lee ka ọlụ niile nke setan si jupụta n’aghụghọ, nke ọ naezube ma naalụ kwa ọlụ ọjọọ ahụ n’onwe ya iji laa ndịorù nke Chineke n’íyì. Dịka ịtaarụ nke agwọ jọgburu onwe ya. Ha nwere ike bụrụ ihe siriike ịhụanya n’elu arụ, ma èlù ya ka akụnyeworo nime arụ, ọlụ ya nke naeweta ọnwụ naaga kwa n’iru. Nwa ọjịja ntà nke anabatara ma debe kwa n’obi, nwa otuto ntà nke onweonye nke eji nwayọ rapụ ka o zoo nime obi, iche na ya bụ onye ahụ nke pụrụ ịlụọlụ ahụ chere ya n’iru karịa ndịọzọ; enweghị mmasị n’ihe ndịọzọ pụrụ ime maọbụ n’ihe niile nke ndịọzọ meworo; nke ọ bụla nime ihe ndịa nwere ike ịdị ka nkume eji ejide ụgbọmmiri (arịlịka) siriike nke, ọ bụrụ na ezipụ ya n’ụzọ ya, nwereike ikpughepụ nsụpụta nke omume ọjọọ niile na mbibi nke imemmụọ n’ebe ahụ udo na ọnọdụ nke ihe ịgankeọma dịworo na mbụ. OnyeKraist ọ bụla gaeme nkeọma inyocha obi ya, náelegharị kwa ya anya kwamgbekwamgbe, maka ihe niile ọ bụla nke naegosi maọbụ nke inwe ọchịchọ nke ọnọdụ ndịa jọgburu onwe ha. Karịa ihe ndịa, obi OnyeKraist agaghị abụ ihe ebuliri elu. Ọ ghaghị inwe obiumeala n’ụzọ niile; ma, nke kachasị, ọ ghaghị ịdịumeala n’obi. Ịdịumeala nke eluarụ bụ iheefu ma ọ bụrụ na obi mmadụ dịelu. Otú a omume mmadụ nke anaahụ anya gaadị mma ma ọ bụrụ na obi ya dị umeala n’ezie.

Nganga Ihe Mpako Naalụpụta

Uzaia bara n’ebe nsọ nke Chineke, náewezuga ụkpụrụ niile na ndịkom nke Chineke etere mmanụ, ijé suree àjà nsureọkụ naesiisiụtọ n’elu ebe ịchụàjà nke Chineke. Nke a bụ mmehie jọgburu onwe ya. Iwu Moses kwuru na ndị ahụ niile gaeme ya ka agaeme ka ha nwụọ; ma ebe Uzaia bụ onye nọ n’isi na Juda, ọ dịghị onye gaebuli amamikpé nke ọnwụ tụkwasị ya.

Onyenchụàjà nke Chineke, otú ọ dị, guzogidere eze ahụ, náegosi ike o nwere site n’ebe Chineke nọ; ma mgbe ikpé nke Chineke bịara, náegosi na ihe onyenchụàjà nke Chineke ahụ mere ziriezi, ọgbakọ nke ndịchụàjà ahụ niile wee chụpụ Uzaia site n’ebe nsọ ahụ. N’eziokwu, mgbe Uzaia hụrụ ekpenta ahụ nke Chineke mere ka ọ dakwasị ya n’otù ntabianya ọ tọrọ ya ụtọ isi n’Ụlọ nsọ Chineke pụọ. Ekpenta ahụ pụtara ìhè; ọ bụghị dịka ọ naadị n’oge mmalite nke ọrịa ahụ, kama ọ bụ n’ụdị ọ naadị mgbe o meworo onye ahụ ọtụtụ arọ. Uzaia matara na ọ dịghị onye ekpenta ọ bụla nwere òkè n’Ụlọukwu Chineke. Ọ matakwara na ọ dịghị onye ọ bụla nke anaeteghị mmanụ nwere òkè n’ebe ahụ, nkekanke, isureàjà nsureọkụ naesiisiụtọ. O mebiwo ụkpụrụ nke Chineke na ihensọ dị icheiche nke egbochiri mmadụ ụfọdụ ime, o wee nata ikpé nke bịakwasịrị ya ọsọsọ. Ọ chọghị kwa ka ikpé ọzọ bịakwasị ya site n’ilelị iwu Chineke ọzọ.

N’ịmaatụ ọzọ dị icheiche, mgbe mmadụ wezugara iwu Chineke n’ụzọ dị otú a, ikpé dị ọsọsọ naesi kwa n’ebe Chineke nọ bịa. Ọ bụghị ọlụ dịrị mmadụ ikwuchịtara Chineke ọnụ Ya n’ihe ahụ. Ọlụ mmadụ bụ náánị ikwusa iwu na uche nke Chineke. Ala loro Kora, Detan, na Abairam ná ndụ n’ihi na ha nwara iwezuga ụkpụrụ nke Chineke na orù Ya etere mmanụ. Ụmụ ndịkom abụọ nke Eron, ndị arọpụtara n’ọnọdụ ndịchụàjà, lelịrị ụkpụrụ iwu nke Chineke, Jehova wee tigbue ha (Levitikọs 10:1).

Anyị pụrụ ịhụ site n’ihe ịmaatụ ndịa niile iheegwù nke dị n’ejeghị ijè n’iwu niile nke Chineke, na iheèfù nke mmadụ ịnwa iwezuga àtụmààtụ nke Chineke n’ihi ụzọ nke anyị nke gaadị obi anyị ebulirielu mma. Ikpé ọsọsọ nke Chineke pụrụ ịbịakwasị onye ọ bụla nke gaemebiiwu Ya. Anyị naahụ n’ebe a; n’ịtụkwasị ihe n’ihe ndịa, iheegwù dị icheiche nke ihe ndị ahụ anaakpọ mmebiiwu ntakịrị, maọbụ mmadụ ime ihe gaatọ ya ụtọ, nke enwereike izo nime obi, nke, ọ bụrụ na arapụ ya ka ọ naaga n’iru, gaeduba mmadụ n’ọtụtụ mmehie ka ukwu na nnupụisi zuruòkè megide Chineke n’ikpeazụ.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. 1 Kpọọ aha ndịamụma atọ nke Chineke, ndị dere Akwụkwọ dị icheiche nke Baịbụl, ndị birindụ n’oge ọchịchị nke Uzaia.

  2. 2 Gịnị bụ óké ihe nke mere n’arọ ahụ Uzaia nwụrụ, nke edere nime Akwụkwọ Aisaia?

  3. 3 N’okpuru ònye ka iheọmụmụ anyị kọwara na Uzaia birindụ n’oge otù mpaghara nke ọchịchị ya?

  4. 4 Uzaia ò mere iheọma ka ọ bụ iheọjọọ n’akụkụ mbụ nke ndụ ya?

  5. 5 Gịnị mere Uzaia ji gbanwe wee mee ihe n’ụzọ dị iche n’oge ikpeazụ nke ndụ ya?

  6. 6 Uzaia wee ghọọ onyeekpenta. Gịnị bụ mmehie o mere nke butere ọrịa nke a n’arụ ya?

  7. 7 Ewezuga ọrịa ekpenta, òle ahụhụ na ikpé ọzọ nke Uzaia natara n’ihi mmehie ya?

  8. 8 Gịnị mere mpako ji bụrụ mmehie?

  9. 9 Gịnị bụ ojujuafọ nke onweonye? Gịnị mere o ji bụrụ mmehie dị egwù

  10. 10 Ihe anaagbasokarị n’oge ugbu a bụ ojujuafọ nke onweonye. Kpọọ aha ihe ụfọdụ naeduba mmadụ n’ụzọ ahụ ma gosi kwa ihe mere ịrụụkà niile n’ịnabata ya ji bụrụ ihe megidere Oziọma nke Kraist.