Joel 1:1-20; 2:1-32; 3:1-21

Lesson 322 - Senior

Memory Verse
“Dọwa-kwa-nu obi-unu, adọwa-kwa-la uwe-unu, chigharikute JEHOVA, bú Chineke unu: n’ihi na Onye-amara na Onye-obi ebere ka Ọ bu, Onye nādigh-ewe iwe ọsọsọ, Nke nāba kwa uba n’ebere” (Joel 2:13).
Cross References

I Okwu Jehova Banyere Ndị Israel Na Ndịmbaọzọ

1 Enyere ndị Israel ịdọakanántị dị ilu banyere mgbasasị ahụ, nke náabịa na óké ịtọgbọrọ n’efu nke ala ahụ nke gaeso ya n’azụ, Joel 1:1-12; Deuteronomi 4:25-28; Levitikọs 26:14-39; Abù Ọma 44:9-16; Ezikiel 6:1-7, 11-14; 36:16-20.

2 Enyere ọkpụkpọòkù maka nchègharị, Joel 1:13, 14; Deuteronomi 4:29-31; Levitikọs 26:40-42.

3 Eburu amụma banyere ụbọchị nke Onyenwe anyị, na ikpé ya nke gaadị óké egwù, Joel 1:15-20; 2:1-11; Ezikiel 38:1-23; 39:1-29; Nkpughe 9:1-21; 16:13, 14; 19:11-21.

4 Enyekwara ọkpụkpọòkù ọzọ maka ezi nchègharị, Joel 2:12-17; Aisaia 1:1-20

5 Ekwere mba ahụ mkwà inyere ha aka, ma ọ bụrụ na ha gaechègharị, Joel 2:18-20; Ezikiel 6: 8-10; 36:28-38.

6 Agaawụpụ ngọzi dị icheiche dị ukwu nke imemmụọ, ya na àkụnaụba nke ihe anaahụ anya, n’oge nnweghachị nke ndị Isael, Joel 2:21-32; Ezikiel 36:21-27; 37:1-28; Jeremaia 31:1-40; Ọlụ Ndi-ozi 2:1-21.

7 Eburu amụma banyere ikpé ikpeazụ ahụ dị ukwu nke agaekpe ndị anaazọpụtaghị, Joel 3:1-21; Nkpughe 20:7-15; 21:8.

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

Náánị ihe ntakịrị ka amara banyere onyeamụma ahụ bụ Joel karị kwa na ọ bụ nwa Petuel na o bikwara n’ụwa ihe ra ka narị arọ asatọ tupu amụọ Kraist. Anyị pụrụ ịhụ site n’iheodide ya na ọ bụrị onye nke Chineke, na enyewo kwa ya nlebaanya dị omimi nime àtụmààtụ nke Chineke banyere ndị Israel. Lee ka o si pụta ìhè na akpọrọ onyeamụma ukwu nke Chineke a Joel, n’ihi na ihe aha ya pụtara bụ Jehova bụ Chineke! Isiokwu nke amụma ya bụ ọkpụkọòkù maka nchègharị na ịdọakanántị banyere ahụhụ dị icheiche nke agaenweta ma ọ bụrụ egeghị ntị n’òkù ahụ.

Mbà Ahụ Arọpụtara

Mgbe mba ahụ, bú Israel, malitere site n’onye ahụ nke bụ Abraham, abara n’ọgbụgbandụ nke ngọzi na urù dị icheiche dị nime ya dị ukwu. Agaagọzi mba niile nke ụwa site n’ọgbụgbandụ ahụ. N’ihi na Abraham kweere Chineke, enyere ya otù nwa nwoke. Otù mba sitere n’otù nwa nke mkwà a pụta; mgbe oge naaga Chineke chebere, kuziere ha ihe, nye ha ahụhụ, emesịa O mere ka ha bata n’ala mkwà ahụ, Mgbe ha ka nọ n’ijè ha ijeru n’ebe ahụ, Moses dọrọ ha akanántị banyere ahụhụ niile nke nnupụisi n’iwu niile nke Chineke gaeweta ma gwa kwa ha ngọzi niile nke gaeso ndị ahụ niile gaerubeisi n’iwu niile nke Chineke. Ma Israel chefuru Chineke ngwangwa wee jeso ọchịchọ nke obi ha ịdị dịka mba niile ahụ dị ha gburugburu.

Mgbe ọtụtụ arọ nke iji ntachịobi meso ndị Israel gasịrị, ewee naahụ ha náánị n’ịlaghachịazụ n’ikpere arụsị mgbe niile, Chineke mere ka adọta ha n’agha n’ikpeazụ. Ndọta n’agha a bụ ndetụire, dịka enwere ike kwue ya, nke mgbasasị ahụ nke eburu amụma na ọ gaabịakwasị ha ma ọ bụrụ na ha ajụ Okwu nke Chineke. Nime ndọta n’agha ha, ha tikuru Chineke O wee nụ olu ha, napụta ha, kpọghachị kwa ha n’ala nke aka ha. Ewughachiri Ụlọukwu ahụ; ọ bụ ezie na ebube ya erughị iji ya tụnyere ebube nke ụlọ mbụ ahụ ma ọ ka bụkwa Ụlọukwu Chineke bụrụ kwa ebe anaefè Chineke òfùfè. Mbà ahụ gafere oge nke enweghị olileanya banyere ọdịn’iru ma n’ikpeazụ ndị Rom meriri ha.

Ma mba ahụ mere ka ọjụjụ pụtara ìhè nke ha jụrụ ebere Chineke zueòkè mgbe ha jụrụ ma kpọgide kwa Kraist n’obe, bụ Mesaia ha. Ha rịọrọ ka Ọbara Ya dị n’isi ha na n’isi ụmụ ha; anyị pụkwara ịhụ na ọ bụghị náánị na Chineke nyere ha ihe ha rịọrọ, kama O mere ka ịkpé ahụ niile nke ekpokọtaworo n’ihi ọjụjụ niile nke ha jụrụ ozi Ya dị icheiche n’oge garaaga bịakwasị ha. Ebibiri mbà ha. Obodo ha niile na Ụlọukwu Chineke ka akwaturu n’ala. Akpagburu ha ma chụsasịa kwa ha gaa n’akụkụ niile nke ụwa. Anaewere ha dịka ndị achụpụrụachụpụ n’elu ụwa, ndị eledaraanya na ndị ụwa kpọrọasị. Ma ha jidesịrị ihe eji mara ha ike ma debe kwa onwe ha iche, ha enwewo kwa àkụnaụba, n’ụzọ ụfọdụ, karịa ndịọzọ niile nke ụwa. Ndị Juu enwewo, dịka otù ndị, àkụ ririnne karịsịa, ma n’otù aka ahụ, bụrụ kwa ndị ogbenye ewedara n’ala karịsịa. Dịka otù mbà, ha bụ ndị naefè Chineke òfùfè náánị n’egbugbereọnụ, ebe ha gọnarịworo Onye ahụ nke náánị Ya naegosi ụzọ ijeru Chineke nso. Ma Chineke arapụbeghị ha, n’ihi na Ọ ka naecheta ọgbụgbandụ nke Ya na Abraham, bụ nna ha gbara.

Ịdọakanántị Dị Icheiche Nke Ndịamụma

Ndị Israel ahụwo ahụhụ nke ukwu n’ihi ịjụ Ọkpara Chineke na inupụisi megide Okwu Chineke. Ma ha apụghị ikwu na ha amaghị na agaezitere ha ikpé ndịa. Mmụọ Nsọ edebewo ọtụtụ ịdọakanántị dị icheiche nke edepụtara n’Agba Ochie banyere isiokwu ahụ. Ma náagbaghị agụgọ ndịamụma enyewo kwa ọtụtụ ịdọakanántị ọzọ karịa nke ahụ edebewooro anyị. Isiokwu nke ịdọakanántị ahụ ka edepụtara n’akụkụ niile nke Akwụkwọnsọ. Ekwuru ya ọtụtụ ugbò na ọ bụrụ na ndị Israel gaerubeisi, na agaagọzi ha; ma ọ bụrụ na ha enupụisi, ha gaata ahụhụ. Joel onyeamụma bụ otù nime ndị ahụ ndị Chineke siri n’aka ha weta ozi a dị ukwu nke dị kwa mkpà.

Náagbaghịagụgọ Joel bụ onyenkwusa nke eziomme, onye ndụmọdụ n’ihe banyere ụzọ niile nke ịdịnsọ na nsọpụrụ Chineke, na onyeozi nke biri ndụ dịka okwu ahụ (onye-ozi) naegosi ụbọchị ndụ ya niile. Ma Mmụọ Nsọ arọrọwo idebe náánị otù amụma a nke Joel buru banyere ndị Israel na Ndị Mbàọzọ. Amụma ahụ n’onwe ya jikọtara ọtụtụ ihe, ebe ọgụgụ atọ nke jikọtara oge niile site n’oge ndaghachịazụ dị icheiche nke ndị Israel rue n’ikpé nke Óké Ocheeze Ọcha ahụ. Ebe enyere ya dịka okwu nke onyeọkà nke ekwuru nkeọma, o kwesịrị ka anyị ñaantị nkeọma n’amụma a ka anyị wee nwee ike ịnara ozi ya, ka anyị wee ghara ịdị ka ndị ahụ Chineke chọrọ ịgọzi ma Ọ kọchara ha.

Ebe Amụma Ahụ Jeruru

Akụkụ mbụ nke amụma ahụ metụtara ndaghachịazụ nke ndị Israel n’ihe nke mmụọ na nchụsasị o wetaara ha baa n’ụwa nile. N’ebe dị icheiche nime ịdọakanántị ndịa ka enwere ọtụtụ òkù akpọrọ ịbịarụ nchègharị na ifeòfùfè n’eziokwu dịka nke anaahụ kwa n’ebe ọ bụla ọzọ nime Baịbụl. “Dọwa-kwa-nu obi-unu, adọwa-kwa-la uwe unu, chigharikute Jehova, bú Chineke-unu: n’ihi na onye-amara na Onye obi-ebere ka Ọ bụ, Onye nādigh-ewe iwe ọsọsọ, Nke nāba kwa uba n’ebere,” bụ otù nime arịrịọ sitere nnọọ n’obi Chineke nke Ọ naarịọ ndị Ya. Ndị Israel nwere ụdị nke ndị naefè òfùfè kama ọ bụghị n’eziokwu, n’ihi na ha naakpọ aha nke Chineke n’egbugbereọnụ ebe ha wezugaworo onwe ha n’ebe Ọ nọ nime obi ha.

Òfùfè anaahụ anya abaghị urù ọ bụla ma ọ bụghị ma mkpụrụobi ahụ chigharịkwutere Chineke. Obubúọnụ, n’onweya, bụ ihe náabaghị urù, ma ọ bụghị ma ekpere nke eji obi eziokwu kpee na nke ịrịọarịrịọ, bụ nke Chineke naanara, so ya. Inye onweonye ahụhụ (maọbụ ime penance) n’ụdị ọ bụla ka ewee nata iruọma n’ebe Chineke nọ, mgbe onye ahụ naanọgide nime mmehie na ajọomume, agaghị alụpụta ihe ọ bụla ma ọ bụghị iweta mkwagide na agaawụkwasị iwe Chineke n’isi onye ahụ nke echère na ọ naechègharị. Ibi ndụ nke ụdị nsọpụrụ Chineke nke naagọnarị ike Chineke agaghị eduba mmadụ n’Eluigwe. Anyị nwereike dọwaa uwe anyị niile n’ụzọ igosi nchègharị ma nweekwarị obi nke dị anya n’ebe obi nchègharị dị. Ozi nke onyeamụma ahụ bụ ka ha wepụsịa ụdị efù niile, ememe efù niile, na ngosi efù niile nke ịdịnsọ, na ihe niile ahụ nke ha nwetaworo site n’omume na omen’ala, ka ha chigharịkwute Chineke n’ezi nchègharị ma ọ bụrụ na ha chọrọ igbochi iheọjọọ ahụ dị óké egwù nke náeweta mbibi nke gaje ịbịkwasị ha.

Ndị Israel egeghị okwu niile nke Joel ntị, ma abịa n’ihe banyere inwe ezi mgbanwe nke naadịgideadịgide. Okwu Chineke mezuru ewee mee ka ha gbasasịa n’elu ụwa niile. Ma Chineke arapụbeghị ndị Israel, bụ ndị O bu ụzọ mara, bụrụ kwa ndị Ọ hụrụ n’anya; Ọ naemeso ha ọzọ.

Ọlụ ahụ nke ndị Israel gaalụworị ka ndịọzọ maliteworo ịlụ; bụ ndị zaworo òkù nke Chineke na dị wereworo ọlụ ahụ nke iwegara ụwa niile -- ma Ndị-Juu gbasasịrịagbasasị -- ozi nke Mesaia ahụ Onye bịara ka Ọ gbapụta ụmụmmadụ site ná mmehie ha niile. Ụfọdụ mmadụ nime Ndị Juu azawo òkù ahụ, ma mba ahụ naanọgide n’ekweghịekwe. Ọjụjụ ha jụrụ Kraist ahụ abụghị náánị ihe nke mere n’oge garaaga; n’ihi na nime ụbọchị niile nke Óké Mkpagbu ahụ, tupu uju nke iwe dị ọkụ nke oge ahụ dị óké egwù adakwasị ha, ha na Onye ahụ nke náemegide Kraist gaagba ndụ ma kekọta kwa onweha -- bụ Onyeiro nke Kraist. Mgbe nwaoge gasịrị, Onye ahụ nke náemegide Kraist gaemebi ọgbụgbandụ ahụ wee tụgharịa ike ya nke karịrị ike niile nke dị n’ụwa ukwu megide Ndị Juu. Agaama nke a dịka oge Nsogbu nke Jekọb. Ha gaahụ ahụhụ dịka ha ahụtubeghị na mbụ, ma nime nhụjuanya ha, ha gaetiku Chineke maka nnapụta. Ọ bụ n’oge a nke ha gaakpọku Chineke n’eziokwu maka enyemaka ka ihe ebube dị icheiche gamalite ime.

Nzukọ Kraist agaghị anọ kwa n’elu ụwa n’oge a. Ha na Kraist gaanọ gburugburu Ocheeze nke Chineke, n’Oriri Anyasị nke Ọlụlụnwunye Nwa Atụrụ ahụ. Ọ dịghị kwa onye ọzọ nke Ndị Juu gaeche iru maka nkasịobi ma ọ bụghị náánị Chineke. Agaghị enwe ndị Mbaọzọ naezisa oziọma ndị gaagwa ha ihe banyere Kraist ahụ Onye bịara, Onye ha jụwokwara. Ndị karịrị n’ọnụọgụgụ nke Ndị Juu ka agaegbu, ma agaenwe ndị fọdụrụ ndị gaadị ndụ, bụ ndị gaakpọku kwa Mesaia ahụ ka Ọ bịa zọpụta ha (ihe ahụrụ pụtara ìhè nke yiri nke a n’ụzọ dị ntà, bụ nke ahụrụ n’omume nke ọtụtụ ndị Juu mere n’oge óké mkpagbu ahụ dị egwù nke ha nwere n’oge Agha Ụwa nke abụọ. Ọtụtụ nime ha, mgbe anaedupụ ha ịga n’ebe dị icheiche nke ogbugbu ha, tikuru Mesaia ahụ, maka nnapụta. Lee otú nke a gaesi mee karịa mgbe iwe dị ọkụ nke oge nsogbu Jekọb gaabịakwasị ha!) Mesaia ahụ gaabịa; ma n’ọbịbịa Ya, mgbe Ndị Juu gaechigharị site n’ekweghịekwe baa n’ezi òfùfè nke Ya bụ Onye ahụ ha jụrụajụ na mbụ, mba Israel ka agaamụ n’otù ụbọchị. Ọchịchị nke Chineke doworo nye ha dịka ndị nke Ya arọpụtara gaanọchị ọchịchị ọ bụla nke ha gaenweworị n’oge ahụ. Ọchịchị ahụ gaenwe Kraist dịka Onyeisi Ya. Ọbịbịa nke Kraist a ka amaara dịka Mkpughe Ya.

Ndị Israel nwere ọchịchị nke ụwa ugbu a, ma anyị pụrụ ịhụ na nke ahụ abụghị ụdị ọchịchị nke Chineke doworo nye ha. Dịka ihe anaahụ anya si dị, apụghi iwukwasị ọchịchị ahụ rue mgbe Eze ahụ gaanọ n’ebe a ịbụ Onyeisi ya, ọbịbịa Ya agaghị ewere kwa ọnọdụ rue mgbe Ndị Juu jikeere ịnabata Ya dịka Kraist ha. Ọzọ, anyị ahụwo kwa, na ọ gaewe óké nhụjuanya iwerute Ndị Juu ebe ha gaedo onwe ha n’okpuru àtụmààtụ nke Chineke.

Ọtụtụ ihe ka eburu amụma banyere ha n’ebe ọgụgụ ndị a n’Akwụkwọnsọ nke anyị naatụgharị uche nime ha na ndịọzọ nke metụtara isiokwu ahụ. Agwara anyị ihe niile gaeme na nwa oge ntà ahụ dị n’etiti mgbe ndị Israel gaakpọku Mesaia ha na ọbịbịa nke Onye Eziomume ahụ. Mgbe Kraist gaabịa n’ụwa, Ya na ndịnsọ Ya nke anaapụghị ịgụta ọnụ gaeso -- ndịagha nke Eluigwe -- ha gaebuso kwa ndịagha nke ụwa a agha wee merie ha. Mgbe ahụ ka Ọ gaewukwasị otù Alaeze nke eziomume, wee chịa ọchịchị otù puku arọ n’elu ụwa nke a. Oge ọchịchị nke Puku Arọ a ka anyị maara dịka Ọchịchị Ókéọñụ (Ọlaedo) nke Kraist. Ọ dị oge anaakpọ Ụbọchị nke Onyenwe anyị, nke agaeme ka o zueòkè site n’ọbịbịa Kraist ná Mkpughe Ya, mgbe Ọ gaabịa iweta ikpé dị egwù n’isi ndị ahụ naemegide Ya bụ ndị naemegide kwa ndị nke Ya arọpụtara. Ihe gaeso Ụbọchị nke Onyenwe anyị, na kwa n’oge ọchịchị Puku Arọ nke Kraist, bụ na ndị Israel gaabụ ndị nke Kraist site na nrọrọ nke onweha; ha gaabụ ndị nke Ya ọ bụghị náánị n’ihi mkwà nke Chineke kwere Abraham, kama n’ihi na ha gaelegide Ya anya bụ Onye ha mapuworoamapu, wee chègharịa site ná mmehie niile ha ewee zọpụta ha.

Ihe Dị Icheiche Gaeme N’Ụbọchị nke Onyenweanyị

Dịka anyị naele ihe niile nke naeme n’ụbọchị taa ọ naesikarị ike ọtụtụ mgbe iji anya nke naahụ ihe náadị ebighịebi hụ ha, ọhụhụụzọ anyị ezughị òkè n’ihi ọtụtụ ihe naeme n’ụbọchị taa nke náadị ka ha dị óké mkpà. Iji mee ka anyị ghọta amụma ọ bụla nkeọma anyị aghaghị iwezuga onweanyị site n’inyochasị ihe dum naeme ugbu a wee were ha tụlee ihe mere n’oge garaaga na ihe ndị ahụ gaje ịbịa n’ọdịn’iru.

Ịtọntọala nke Alaeze nke Kraist bụ nnọọ ihe kpatara ọbịbịa Ya nke mbụ, ma Kraist agaghị abịa dịka Eze, ná Mkpughe Ya, tupu rue mgbe Ọ bịasịrị na Nwelikọ nke Ndịnsọ na nzuzo. Anyị makwara na ịtọntọala nke alaeze ndị Israel ahụ anaahụanya nke Kraist gaanọ n’isi ya dịka ihe edere n’Akwụkwọnsọ si dị, metụtara ịtọntọala nke ọchịchị ụwa nke wereworo ọnọdụ ya ná nlaghachị nke Ndị Juu n’ala nna ha bụ ihe naeme ugbu a. Ihe ukwu ahụ dị icheiche nke gaeme maka nnapụta ahụ nke gaewere ọnọdụ n’Ụbọchị nke Onyenwe anyị agaghị emezu rue mgbe Ndị Juu gaetiku Chineke maka nnapụta. Ha agaghị kwa arịọarịrịọ ahụ rue mgbe agaesogbu ha kpagbue kwa ha nke ukwu n’ala nna ha, rue mgbe nlata ha n’ebe ahụ nime ekweghịekwe gaagasịworị. Dịka ọtụtụ ihe ndịa nke gaeme ga naeme n’iken’ike, otú ọdị, ha nwereike mechasịa na nwa oge nke anaeleghịanya ha. Otù puku arọ adịghị mkpà maka mmezu ha ọ bụghị kwa narị arọ ka achọrọ iji wee mezue ha. N’ezie, Akwụkwọnsọ debere mmezu ha niile nime oge nke ụbọchị ụfọdụ, kama idebe ya n’oge nke ọtụtụ arọ maọbụ ọgbọ. Ma ezi ndịnsọ nke Chineke gaanọ ná njikere maka Nwelikọ nke Ndịnsọ na Nzuzo ahụ nke gaewere ọnọdụ oge ọ bụla site ugbu a tupu Onye ahụ nke náemegide Kraist anọkwasị n’ocheeze ya nke ike.

Mmiriòzùzò Ikpèazụ

Ọ dị ọtụtụ ihe gaeme n’oge ahụ nke gaebute ụzọ tupu ọgwụgwụ nke ihe niile abịa. Ọtụtụ nime ihe ndịa emezuwo ma ụfọdụ ha ka gaemezu. Ma ihe ndịa dum ka emeworo ka ha malite ime maọbu dabere n’otù ihe ukwu nke gaje ime -- otù ihe nke dị ukwu nke dị kwa mkpà n’ihe nke imemmụọ. Ọ bụ ihe ịtụn’anya, na ndị ka n’ọnụọgụgụ n’etiti ndị okpukpé ụwa enweghị kwa nlebanya n’ihe a nke gaje ime. Ọtụtụ ndị anaeche na ha bụ ndịnaesoụzọ Kraist bụ ndị akaenweghị owuweanya banyere ịdị mkpà nke iheịrịàmà ukwu a nke ọgbọ anyị. Ihe ukwu a nke ọtụtụ ihe naagbakwasị ụkwụ na ya maọbụ naadabere na ya bụ nwụsa nke Mmiriòzùzò Ikpèazụ ahụ.

Ọ dị mmiriòzùzò mbụ dịka Joel buru n’amụma, nke Pita kọwakwara ihe banyere ya n’Ụbọchị Pentikost, mmiriòzùzò mbụ nke Mmụọ Chineke, nke ọ bụ nime ya ka awụrụ ndị òtù Nzukọ Kraist mbụ mmiri nke Mmụọ Nsọ. Mmụọ Nsọ, site n’ọnụ Pita, arapụghị ohere ọ bụla nye obiabụọ n’uche mmadụ ọ bụla, n’ihe amụma Joel buru pụtara banyere ihe a nke mere, Ọ sịrị, “O gēru kwa na mgbe ikpe-azu, ka Chineke kwuru, M’gāwusa ufọdu nime Mọm n’aru anu-aru nile, bú madu: umu-unu ndikom na umu-unu ndinyom gēbu kwa amuma, umu-okorọbia-unu gāhu kwa ọhù, Ndi-okenye-unu gārọ kwa nrọ: E, n’aru ndi-orùm ndikom na n’aru ndi-orùm ndinyom ka M’gāwusa ufọdu nime Mọ nkem na mgbe ahu; ha gēbu kwa amuma” (Ọlu Ndi-ozi 2:17, 18). Obiabụọ ekwesịghị ịdị n’ihe niile eburu n’amụma a banyere nwụsa nke Mmụọ Nsọ a, n’ihi na Pita sịrị na agaawụsa kwa Mmụọ Nsọ n’arụ ndị niile ka ha ra bụ ndị, Chineke gaakpọ n’ọgbọ niile na n’ebe ọ bụla n’ụwa.

N’Ọgbọ nke Ọchịchịrị, mgbe ìhè nke Oziọma nyụrụanyụ nime ụwa, ọlụ a nke Mmụọ Nsọ naalụ kwụsịrị. Otú a ka ọ dị rue n’ọgbọ nke iri abụọ (20th century), mgbe emere ka Mmụọ Nsọ pụta kwa ìhè n’otù ụzọ ahụ na n’otù ụdị ịdịukwu ahụ. Martin Luther weghachịrị òzízí nke ịgụ mmadụ n’onye eziomume site n’okwukwe nime ụwa ọzọ mgbe ndị ka ọtụtụ n’etiti Ndị okpukpé nke Kraist chefusiworo ihe banyere ya, náánị mmadụ olenaole ndị bị n’ebe dị icheiche natara ya n’oge nke Ọgbọ nke Ọchịchị ahụ. Jọn na Charles Wesley mgbe ha naeso ìhè ahụ egosịrị n’oge ha, chọrọ ihe banyere Chineke karịa, site n’aka ha ewetara òzízí nke odudonsọ zuruòkè n’ụwa ọzọ. N’oge nke enwere agụụ dị ukwu nke ihemmụọ, nime ọnwa niile ahụ naebu April 9, 1906 ụzọ, Chineke jikeere òtù ndịmmadụ dị ntà n’obodo Lọs Angeles dị na California ịnata nnwapụta ukwu nke atọ ahụ dịrị NdịKraist; dịka apụrụ ịkpọ ya, ọwụwụmmmiri nke Mmụọ Nsọ. Dịka anyị naagụ akwụkwọ amụma Joel, anyị pụrụ ịhụ náenweghị ndahie ọ bụla na nnwụsa nke Mmiriòzùzò Ikpeazụ bụ ihe edebere nye ọgwụgwụ oge, otù oge nke náebute ụzọ ma náemetụta kwa óké Ụbọchị nke Onyenwe anyị.

Na agaenye Ndịmbàọzọ Ike nke Mmụọ Nsọ, dịka enyere Ndị Juu bụ ihe doroanya site n’okwu Pita n’Ụbọchị Pentikọst. Na agaghị enye Ya náánị Ndịmbaọzọ wee rapụ inye Ndị Juu bụ kwa ihe doroanya site n’ebeọgụgụ ahụ na kwa site n’ihe niile Akwụkwọnsọ kwuru. Ezikiel dere, site ná mkpali nke Mmụọ Nsọ

“M’gāwusa kwa unu miri di ọcha, unu ewe di ọcha: ọ bu iru-árú nile unu na arusi nile unu ka M’gēme unu ka unu si nime ha di ọcha.

“M’gēnye kwa unu obi ọhu, ọ bu kwa mọ ọhu ka

M’gētinye nime unu: M’gēwezuga kwa obi nkume n’anu-aru-unu, nye unu obi nke bu anu-aru.

“Mọ nkem ka M’gētinye nime unu, me ka ọ buru n’ukpurum nile ka unu gējeghari, ọ bu kwa ikpém nile ka unu gēdebe, me ha” (Ezikiel 36:25-27).

Oge nke óké ọlụ nke ihe imemmụọ nke a, bụ nke Ndị Ju gaerita urù pụrụ iche na ya, ka ekwuru nkeọma na ọ gaabụ oge nnweghachị nke Ndị Juu -- mgbe aga-edo Kraist nsọ nime Ndị Juu n’anya mba nile (Ezikiel 36:23). Nke a enweghị ike ịbụ oge ọzọ karịa kwa Ụbọchị nke Onyenwe anyị! Ọ dịghị oge ọzọ gaworoaga mgbe Ndị Juu gaamata Kraist dịka Onyenwe ha na Onyenzọpụta ha ma nara kwa Chineke dịka Chineke ha n’ezi òfùfè. Gịnị bụ ọlụ imemmụọ nke agaalụrụ ha n’oge a? bụ ajụjụ enwereike ịjụ. Maka ọzịzá nye ajụjụ ahụ ka anyị tụgharịa uche n’ihe odide nke amaokwu si nime Akwụkwọnsọ nke anyị kwuworo na mbụ.

“Miri dị ọcha” ka agaawụsa Ndị Juu, agaanapụta kwa ha site n’ịrụarụ ha na n’ikpere arụsị ha. Nke ahụ apụghị ịbụ ihe ọzọ karịkwa nnwapụta nke ịgụ ha na ndịeziomume na ịgbaghara mmehie ha. Elezirianya wee rọpụta okwu niile nke Akwụkwọnsọ, n’ihe banyere nke a o dokwaraanya site n’okwu ahụ kwa, na mgbe agbagharaworo Ndị Juu mmehie niile ha, ha ganata kwa nnwapụta ọzọ. Ná nnwapụta nke abụọ a, anaagbanwe obi ha mee kwa ka imemmụọ ha dị ọhụụ. Nke a, dakọtakwara n’ihe ndepụta ọzọ niile dị n’Akwụkwọnsọ, n’ihi na àtụmààtụ nke Chineke bụ na ndị azọpụtara site ná mmehie ha aghaghị ịgá n’iru wee chọọ ma nata kwa ọlụ amara nke abụọ ìhè n’onweya -- odudonsọ zuruòkè. Ndị Juu, ka anaedo kwa nsọ n’usoro ime udo nke ha na Chineke.

Ma mnweghachị zuruòkè rue amara nke imemmụọ agaghị ezuezu ma ọ bụghị ma ha natara ngọzi niile nke imemmụo bụ nke Chineke naenye ka ha ra bụ ndị náabịakwute Ya. N’ihi nke a, dịka anyị naagụ ebe niile fọdụrụ n’ebe ọgụgụ edepụtaara anyị, anyị gaahụ na ha onweha, kwa, ka agaawụmmiri nke Mmụọ Nsọ n’otù aka ahụ dịka anyị ndị naebí n’oge nke Mmiriòzùzò Ikpeazụ ahụ. Chineke sịrị: “Mọ nkem ka M’gētiye nime unu.”

Anyị chọrọ ileba anya nkeọma n’ụzọ esi were okwu abụọ ahụ edejiriedeji kwueokwu. Okwu ahụ ọzọ kwa naegosi n’ụzọ pụtara ìhè na nke a bụ nnwapụta ọzọ dị iche ná nnwapụta abụọ nke mbụ ahụ, n’otù aka ahụ dịka okwu ahụ ọzọ náegosi na nnata nke odudonsọ zuruòkè nke ha natara pụtara ìhè n’onweya ma dị kwa iche site ná nnwaputa nke ịgụ ha ná ndị eziomume, maọbụ ịgbaghara mmehie ha. Nnwapụta nke atọ bụ ọwụwụmmiri nke Mmụọ Nsọ na ọkụ! Ugbu a okwu ahụ nime dị kwa óké mkpà, n’ihi na mgbe Jisọs kwere mkwà banyere ọbịbịa nke Mmụọ Nsọ ahụ Ọ sịrị. “Mu onwem gēkpe-kwa-ra Nnam, Ọ gēnye kwa unu Onye-nkasi-obi ọzọ, ka Ọ nọnyere unu rue Mgbe ebighi-ebi; bú Mọ nke ezi-okwu; … Ya na unu nānọgide, Ọ nānọ kwa nime unu” (Jọn 14:16, 17). Cheta kwa na Kraist kwuruokwu ndịa nye Ndị Ju, na ọ bụ kwa náánị mgbe Ụbọchị Pentikọst gasịrị ka aghọtara na ọ dịrị Ndịmbaọzọ!

N’ebe a, nime Agba Ochie, anyị naahụ asụsụ banyere nke Ọhụ ahụ, mkwà dị icheiche banyere nke Ọhụ ahụ, na ngọzi dị icheiche nke imemmụọ banyere nke Ọhụ ahụ ka eburu ụzọ kwue banyere ha. Ọ bụghị mmadụ olenaole ka edebeere ngọzi ndịa kama emere ka o rute madụ niile, “Onye-Ju na mbu, na Onye Grik (Mbaọzọ) kwa: n’ihi na ile-madu-anya-n’iru adigh n’ebe Chineke nọ” (Ndi Rom 2:10, 11).

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. 1 Òlee ihe anyị matara banyere Onyeamụma ahụ bụ Joel?

  2. 2 Gịnị bụ isiokwu nke amụma Joel? gịnị bụ kwa ụbọchị ukwu ahụ nke ekwuru ihe banyere ya n’ebe ọgụgụ anyị?

  3. 3 Ònye bụ Onyeamụma nke Chineke ọzọ bukwara amụma banyere mgbasasị nke ndị Israel?

  4. 4 N’Aisaia, isi 1, anyị gụrụ ihe banyere otù òfùfè nke naatọghị Chineke ụtọ. Kwu ihe dị mkpà ime iji mee ka òfùfè anyị tọọ Ya ụtọ.

  5. 5 Gịnị mere Chineke jiri nwee mmasị dị ukwu n’ebe ndị Israel nọ?

  6. 6 Kwue ụdị ngọzi dị icheiche nke agaenye ndị Israel n’oge nweghachị ha gaezuòkè.

  7. 7 Mba Israel dị ugbu a, ọ bụ mmezu zuruòkè nke amụma niile eburu banyere nnweghachi nke mba ahụ n’elu ụwa? Ọ bụrụ na ọ bụghị ya, kwue ihe fọdụrụ ka emee?

  8. 8 Gịnị gaabụ ọnọdụ ndị Israel nime Alaeze nke Ọchịchị Puku Arọ nke Kraist?

  9. 9 Òlee ndị gaeguzo n’iru Óké Ocheeze Ọcha ahụ ịnata ikpé agaekpe ha?

  10. 10 Òlee ebe agaeziga ndị ahụ niile agaamaikpé n’Ikpé Nke Óké Ocheeze Ọcha ahụ?