Ọlu Ndi-ozi 12:1-23

Lesson 323 - Senior

Memory Verse
“Ahuwom onye nēmebi iwu ka ọ nēme madu ka ha ma jijiji, ahuwokwam ya ka ọ nāwasa onwe-ya dika osisi di ndu n’ala mara ya. Ọ we gabiga, ma, le, ọ nọgh: M’we chọ ya ma achọtagh Ya” (Abù Ọma 37:35, 36).
Cross References

I Mkpagbu Nke Herod Kpagburu Ndịozi Ahụ

1 Jemes bụ Onyeozi mbụ egburu n’ihi okwukwe ya, Ọlu Ndi-ozi 12:1, 2; 8:1

2 Pita bụ onye ọzọ Herod Jidere iji mee ka obi tọọ ndị Juu ụtọ, Ọlu Ndi-ozi 12:3; Ndi Galetia 1:10

3 Herod tụbara Pita n’ụlọmkpọrọ, náezube igbu ya mgbe ememe Ista (Easter) gasịrị, Ọlu Ndi-ozi 12:4; Mak 14:2

II Nnapụta Anapụtara Pita Nke Bụ Ọzịzá Ekpere

1 Ekpere ekpere náewepụghị aka n’ihi Pita, Ọlu Ndi-ozi 12:5; Luk 18:1; Ndi Rom 1:9; I Ndi Tesalọnaika 5:17; 2 Timọti 1:3

2 Pita, naararụụra, eji kwa mkpọrọ igwè kee ya agbụ náeche kwa ya nche, ka otù mmụọozi kpọtere, Ọlu Ndi-ozi 12:6,7

3 Pita, mgbe atọpụsịrị ya n’agbụ ahụ, ka enyere iwu ka o soro mmụọozi ahụ, Ọlu Ndi-ozi 12:8

III Nlọta Nke Pita N’Ụlọ Ekpere

1 Mgbe edupụtara ya n’ama, o wee mata na nke a bụ nnapụta site n’inyeaka nke mmụọozi, Ọlu Ndi-ozi 12:9-11

2 Mgbe ọ bịaruru n’ụlọ ebe ọtụtụ mmadụ naekpeekpere, ọ kụrụaka n’ụzọ, Ọlu Ndi-ozi 12:12, 13; 10:30

3 Roda gosipụtara okwukwe karịa ndị ọzọ, Ọlụ Ndi-ozi 12:14-17; Luk 18:17

IV Ọnwụ Ọjọọ Nke Herod Nwụrụ

1 Egburu ndịagha ahụ n’ihi mgbalaga nke Pita ha náapụghị ịkọwa, Ọlu Ndi-ozi 12:18, 19

2 Herod gwara ndị Sisaria okwu n’ụzọ dị ebube, Ọlu Ndi-ozi 12:20-22

3 Ikpuru tagburu eze ahụ, n’ihi na o nyeghị Chineke otuto ahụ, Ọlu Ndi-ozi 12:23; Job 24:20

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

Ndịnáeme ihe Gaatọ Mmadụ Ụtọ

Herod onye gburu Jemes, bụ onye mbụ nime Ndịozi ahụ egburu n’ihi okwukwe ha, bụ nwanwa Herod onye ahụ nyere iwu ka egbue ụmụntakịrị niile dị na Betlehem na mgbalị ya igbu Jisọs. “Ọ we were mma-agha gbue Jemes nwa-nne Jọn. Ma mgbe ọ huru na ọdi ndi-Ju utọ, ọ we jidekwasi Pita.” Lee udị onyeozi nke ọkụalammụọ ọ bụ, bụ onye ahụ nke gaeweda onweya n’igbu mmadụ iji mee ihe gaatọ ụmụmmadụ ụtọ! Herod Antipas gburu Jọn Onye ọwụmmiri iji mee ihe gaatọ ada Herodias ụtọ. Pailet raara Jisọs nye n’aka ìgwè mmadụ ahụ ka akpọgide Ya n’obe iji mme ihe gaatọ ndịisi nchụàjà na ndịisi nke ndị ahụ ụtọ. Feliks rapụrụ Pọl na mkpọrọ ìgwè iji mee ka obi tọọ ndị Juu ụtọ, Festọs dị kwa ná njikere ime ihe gaatọ ndị Juu ụtọ karịa ikpe ikpé ziriezi.

Ndị náagbalịsịike ime ihe gaatọ mmadụ ụtọ, ọtụtụ mgbe, naemejọ Chineke. Omume nke Ndịozi ahụ bụ, “Ayi aghagh ikwenyere Chineke kari madu” (Ọlu Ndi-ozi 5:29). Ọbụná onyeọlụ nke naalụrụ onyeọzọ ọlụ aghaghị icheta ndụmọdụ nke Okwu Chineke nke naasị anyị rubeisi, “ghara iwere ibu-orù-n’anya nāña, dika ndi nēme otú ọ gātọ madu utọ, kama n’afọ-ọfufo, nātu egwu Onye-nwe-ayi: ihe ọ bula unu nēme, nālunu ọlu site na nkpuru-obi-unu, dika unu nāluru Onye-nwe-ayi ọlu, ọ bugh kwa madu; ebe unu matara na ọ bu n’aka Onye-nwe-ayi ka unu gānata ihe-nnyeghachi-unu, bú ihe-nketa ahu: unu bu orù nke Onye-nwe-ayi Kraist” (Ndi Kọlọsi 3:22-24).

Onyenwe anyị naenwe mmasị ịhụ na onyeọlu naalụ ọlụ nke ụbọchị ya nkeọma, ma onye goro ya ọlụ ọ naele anya maọbụ na ọ dịghị ele. Ọtụtụ mgbe ọ naabụkarị ihe anaahụ na ndụ nke onye ọlụ ịlụsị ọlụ ike karịa mgbe anaele ya anya. Onyenwe anyị naeleanya mgbe dum; ma náagbanyeghị ihe ọ bụla anaeme, nwa Chineke kwesịrị ime ya dịka ọ naemere ya Onyenwe anyị ọ bụghị mmadụ. Ọbụ ná maasị na mmadụ naanata ụgwụọlụ n’aka mmadụ, ọ bụrụ na ọ lụọọlụ “dika ndi-orù Kraist, nēme ihe Chineke nāchọ site na nkpuru-obi unu; were-kwa-nu obi-ọma nābu orù, dika ọ bu Onye-nwe-ayi ka unu bu orù-Ya, ọ bugh kwa madu” o nwere mkwà nke Chineke na “n’ezi ihe ọ bula onye ọ bula nēme, nka ka ọ gānaghachi n’aka Onye-nwe-ayi” (Ndi Efeọs 6:6-8).

Mgbe ụfọdụ n’ọlụ Onyenwe anyị ụmụmmadụ naeji nganga alụọlụ dị icheiche nke anaahụ anya, ma náelefuru ọlụ ndị ahụ zoroezo anya. Jisọs kwuru na anyị enweghị ụgwọọlụ site n’aka Nna anyị nke nọ n’Eluigwe n’ihi ọlụ ahụ nke alụrụ ka mmadụ wee hụ ya. Onyeọlụ ahụ nke náekpuchi ọnụ mgbe ọ naalụọlụ ya náemeghị ka mmadụ hụ ya, gaenweta ụgwọọlụ karịa onye ahụ nke náalụọlụ ka mmadụ wee hụ ya.

Mkpagbu

Ọ bụ n’oge Ista, maọbụ na mgbe Ememengabiga, ka Herod chọrọ imekpa Nzukọ Kraist arụ. Nke a bụ arọ iri kemgbe mkpagbu mbụ ahụ gasịrị nke esitere na ya gbue Stifen n’ihi okwukwe ya, ma gbasasịa Nzukọ Kraist, o wee fọdụ náánị Ndịozi ahụ. Ugbu a onyeiro ahụ naalụsi ọgụ ike megide ndịisi nke Nzukọ ahụ bụ Ndịozi iri na abụọ ahụ. Ee, n’etiti mmadụ atọ ahụ bụ ndị Kraist hụrụ n’anya, Jemes ka eji mmaagha gbue ma Pita ka atụbara n’ụlọmkpọrọ ichere ogbugbu ya. Anakpagbu ndị náasọpụrụ Chineke. “Agēsogbu kwa ndi nile ndi nāchọ idi ndu n’uzọ isọpuru Chineke nime Kraist Jisus” (2 Timọti 3:12). Pọl, mgbe ọ naekwu ihe banyere mkpagbu dị icheiche nke ọ nagidere, tinyekwara, “Onye-nwe-ayi dọputa-kwa-ram nime ha nile” (2 Timọti 3:11).

Nnapụta

“Anya abua nke JEHOVA di n’aru ndị ezi omme, Nti-Ya abua ghekwa-ra oghe ná nkpu ha nētiku Ya” (Abù Ọma 34:15). Nzukọ Kraist naekpeekpere naewepụghịaka mgbe Pita nọ n’ụlọmkpọrọ ebe, eji mkpọrọígwè abụọ kee ya agbụ, tọgbọ kwa ya n’etiti ndịagha abụọ. Nke a bụ òkpùkpù abụọ nke ụdị nlezianya nke iji mkpọrọ ígwè kegide onyeagha. Ndịagha iri na isii náechenche iji hụ na onyemkpọrọ ahụ agbalagaghị dịka ụbọchị ahụ naabịaru nsọ mgbe agaegbu Pita. Ma Chineke nụrụ ekpere nke ndị eziomume wee zipụ mmụọozi Ya ịnapụta Pita. Lee ọtụtụ ugbò nke Onyenwe anyị jiworo ndịa bi n’eluigwe wee bibie àtụmààtụ niile nke ndị náemebiiwu!

Ndịmmụọozi

Otù mgbe garaaga, mgbe Pita nọ n’ụlọmkpọrọ ya na Ndịozi ọzọ, mmụọozi nke Onyenwe anyị meghepụrụ ụlọmkpọrọ wee kpọpụta ha ma ndịnche amaghị na ha apụwo. Chee échìchè banyere ụdị mgbagwojuanya nke ndịnche ahụ gaenwe mgbe ndịisi ha bịara wee hụ na ha naeche ụlọmkpọrọ mmadụ náanọghị nche. Mmụọozi nke Onyenwe anyị kpọrepụrụ nkume ahụ mgbe Jisọs si n’ílì pụta. “Site n’egwu ya ndi-nche mara jijiji, bia di ka ndi nwuru anwu” (Matiu 28:4). Chineke zipụrụ mmụọozi Ya wee napụta Daniel site n’ọnụ ọdụm niile ahụ. Banyere ndịmmụọọzi ahụ, Pọl naajụ, “Ha nile abugh ndi-mọ nēfe òfùfè, ndi eziputara ije ozi n’ihi ndi gaje iketa nzọputa?” (Ndi Hibru 1:14).

Ntụkwasịobi Anyị Nime Chineke

Chineke mgbe ụfọdụ naarapụ anyị ka anwaa anyị, ma ọ bụghị karịa otú anyị pụrụ ịnagide. Ọ rapụrụ Daniel ka atụba ya n’ólùlù ọdụm, ma O kpuchiri ọnụ ọdụm ahụ niile. Atụbara ụmụ Hibru atọ ahụ n’óké ọkụ náenwu ajọ onwunwu, ma ọkụ ahụ enweghị ike n’arụ ha. Ejidere Pita n’ụlọmkpọrọ rue mgbe oge ogbugbu ya nke atụworo àtụmààtụ banyere ya fọdụrụ ntakịrị ka o rue, ma Chineke zitere mmụọozi nke nnapụta Ya. Site n’ihenlereanya ndịa Chineke naakụziri ụmụ Ya ka ha tụkwasị Ya obi. Apụrụ iduru anyị rue n’ebe naeweta ọdịdà, ma ọ bụrụ na anyị anọgidesieike, anyị aghaghị inwe mmeri.

Ekweghịekwe

Ọ naesiri ọtụtụ nime anyị ike ịghọta ịdịukwu nke ihe niile Chineke naeme iji lekọta ndị nke Ya. Mgbe mmụọozi tiri Pita aka n’akụkụ wee dupụta ya site n’ụlọmkpọrọ, Pita chere na ya naarọnrọ. Mgbe Roda gwara ndị naesoụzọ Kraist na Pita nọ n’ọnụụzọ, ha sịrị, “Ọ bu mọ-ozi-ya,” Ha zukọrọ n’otù ebe ikpeekpere banyere nnapụta nke Pita, ma mgbe anapụtara ya ọ tụrụ ha n’anya. Ọ naghị adịcha mfé ikwere n’ụzọ Chineke si aza ekpere na ụzọ O si alụ ọlụebube dị icheiche. Mgbe anyị naahụ otú Chineke si eji okwukwe ntakịrị dị otú a alụọlụ n’ebe ndị Ya nọ, anyị naatụle ihe ọ gaalụpụta ma ọ bụrụ na anyị nwere okwukwe karịa nke a kwere n’ezie na mkwà niile nke Chineke?

Jisọs sịrị, “N’ezie asim unu, ọ buru na unu nwere okwukwe ghara inwe obi abua, ọ bugh nání ihe emere osisi fig nka ka unu gēme, ma ọ buru na unu gāsi ọbụná ugwu a, ka ewelie gi, tubà gi nime óké osimiri, agēme ihe ahụ. Ihe niile, ka ha ra, bú nke unu gāriọ n’ekpere, ma asi na unu kwere, unu gānata kwa ha” (Matiu 21:21, 22). N’oge ọzọ Jisọs gwara otù nwoke, Ọ buru na I puru (ikwere)! Onye nke kwere puru ime ihe nile” (Mak 9:23). Ka obi anyị dum dị ka obi nke nwoke a onye, ji anyammiri, tiemkpu sị, “Ekwem; yere ekwegh-ekwem aka” (Mak 9:24). Ka anyị dị ka Ndịozi ahụ ndị sịrị Onyenwe anyị, “Tukwasiri ayi okwukwe” (Luk 17:5).

Nganga

Herod yikwasịrị uwe ndịeze wee nọkwasị n’elu ocheeze ya, o wee bulie onweya elu na nganga n’ihi okwu ụtọ nke o kwuru. Ọ naechè banyere onweya karịa otú o kwesịrị ichè mgbe ọ nụrụ óké ụzụ nke ndị ahụ jiri nábata okwu ya, “ọ bu olu chi, ọ bugh kwa olu nke madu.” Ọ bụ mmụọozi nke Onyenwe anyị tiri Pita aka n’akụkụ wee kpọpụta ya site n’ụlọmkpọrọ; ma mgbe mmụọozi tiri Herod aka, ikpuru tagburu ya, o wee nwụọ. “Nkpọkọrọ madu gēnwe obi, mgbe amuru nwa-inyinya-ibu-ọhia ka ọ buru madu” (Job 11:12). Gịnị ka mmadụ bụ na ọ gaebuli onweya elu mgbe ọ naapụghị inwe ihe ọ bụla ma ọ bughị ihe Chineke nyere ya maọbụ nke O nyere ya ike ka ọ nweta? Chineke ekwuwo, “Npako, na nganga, … ka m’kpọworo asi” (Ilu 8:13). “Nganga nke obi-gi arafuwo gi, gi onye bi na ngbawa nile nke nkume di elu, ebe di elu ka ebe-obibi-ya bu; onye nāsi n’obi-ya, Ònye gēme ka m’ridarue ala? Ọ buru na i felie elu dika ugo, ọ buru kwa na ọ bu n’etiti kpakpando ka edoworo akwụ-gi, n’ebe ahu ka M’gēme ka i si rida; ọ bu ihe si n’ọnu JEHOVA puta” (Obadaia 3, 4).

Ọ bụ nganga chụpụrụ Nebukadneza onye nganga n’ebe mmadụ bi, ka o wee binyere anụọhịa dị icheiche nke eluụwa. Nganga mere ka Sọl onyenganga tụfue alaeze ya wee gaa n’ílì onye gburu onweya. Nganga si n’ụlọ ukwu eze chụpụ Heman onyenganga jee n’ebe osisi-nkwụgbu dị. Nganga sị n’Eluigwe chụpụ Lusifa onyenganga ịba n’ọkụmmụọ. Ngaga chụpụrụ Herod site n’ocheeze ya ịnwụọnwụ dị óké egwù. “Ka anu-aru nile, bú madu, we ghara inya isi n’iru Chineke” (I Ndi Kọrint 1:29). Ka Chineke nyere anyị aka ịdị umeala n’iru Ya “Ayi bu orù ndi nābagh n’ihe” (Luk 17:10)

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. 1 Chọpụta ihe dị icheiche jikọtara ndị akpọrọ Herod na Baịbụl.

  2. 2 Gịnị mere Herod jiri tụba Pita n’ụlọmkpọrọ?

  3. 3 Ndịagha ole naeche Pita nche?

  4. 4 Òlee ụzọ ọzọ esi jide Pita ka ọ ghara ịgbalaga?

  5. 5 Ogologo oge ra añaa ka mmụọozi ahụ nọnyere Pita?

  6. 6 Gịnị bụ ọlụ ịtụn’anya dị icheiche dị óké ebube nke alụrụ nime nnapụta ahụ anapụtara Pita?

  7. 7 Òlee ebe Pita buru ụzọ jee mgbe anapụtasịrị ya?

  8. 8 Òlee ebe ọzọ ahụrụ Pita, dịka ihe akọrọ banyere ya si dị?

  9. 9 Gịnị gosipụtara ekweghịekwe nke dị n’akụkụ ndị ahụ náekpeekpere?

  10. 10 Gịnị mere mmụọozi ahụ ji tie Herod ihe?