Ọlu Ndị-ozi 11:27-30; 12:24, 25; 13:1-12

Lesson 324 - Senior

Memory Verse
AMAOKWU OKWU IBUN’ISI: “Onye nēbinye JEHOVA ihe ka onye nēmere onye nēnwegh ike amara bu, Ọ bu kwa nmeso ọma ya ka Ọ gākwughachi ya” (Ilu 19:17).
Cross References

I Ezi Okpukpé

1 Agabọs, onyeamụma, gwara ụmụnna nime Kraist ndị nọ ná Antịọk na óké ụnwụ gaje ịdakwasị eluụwa dum mmadụ bi, Ọlu Ndi-ozi 11:27, 28; 21:10, 11; 20:23

2 Ndị náesoụzọ Jisọs nyere ihe otú onye ọ bụla nwereike iji nyere ụmụnna bi na Judia aka, Ọlu Ndi-ozi 11:29, 30; Aisaia 58:7; Ọlu Ndi-ozi 20:35; Jemes 2:15, 16; 2 Ndi Kọrint 9:12

3 Ezigara onyinye nke si ná Nzukọ Kraist dị ná Antịọk na Jerusalem site n’aka Banabas na Sọl, Ọlu Ndi-ozi 11:30; I Ndi Kọrint 16:3, 4

4 Ọlụ nke igbomkpà nke ihe anaahụanya nke ndị ahụ anaesite n’aka ha anata ngọzi nke ihemmụọ bụ òzízí sitere na Baịbụl, Ndi Rom 15:25-28; I Ndi Kọrint 16:1-4; 2 Ndi Kọrint 8:1-24; 9:1-15; Ndi Galetia 2:10; Ọlu Ndi-ozi 24:17

5 Banabas na Sọl si na Jerusalem laghachị, náekuru Jọn Mak ka ya na ha yịkọọ jee, Ọlu Ndi-ozi 12:24, 25

II Ndị Chineke Rọpụtaworo

1 Mgbe ha nọ ná Antịọk Mmụọnsọ kewapụtara Banabas na Sọl ijéozi nke Chineke, Ọlu Ndi-ozi 13:1-3; 10:19, 20; 16:6; 22:21

2 Mgbe Mmụọnsọ zipụrụ ha, Banabas na Sọl na ndị ha na ha yịkọ gara ijè rue Seleusia, wee si n’ebe ahụ gaa Saiprọs, náekwusa okwu Chineke n’ụlọnzukọ niile nke ndị Juu dị na Salamis, Ọlu Ndi-ozi 13:4, 5

3 Mgbe ha rapụrụ Salamis, ndị náesoụzọ Kraist gara Pafọs ebe ha kwusara Oziọma ahụ, Ọlu Ndi-ozi 13:6

III Eguzogidere Oziọma Ahụ

1 Sajiọs Pọlọs, onyeisi obodo ahụ, chọrọ ka ndị náesoụzọ Kraist ahụ kwusaara ya Oziọma, Ọlu Ndi-ozi 13:6, 7; Mak 6:20; Luk 23:8; Ọlu Ndi-ozi 25:22

2 Elimas onyemgbasị, guzogidere mkwusa nke Okwu Chineke nke ndịnáesoụzọ Kraist na ekwusa, wee gbaa mbọ iduhie Sajiọs Pọlọs site n’okwukwe, Ọlu Ndi-ozi 13:8; 2 Timọti 3:8, 9; 4:14, 15; Jeremaia 28:15-17

3 Pọl kwusara okwu megide Elimas n’ihi aghụghọ ya, ewee mee ka Elimas kpue ísì, Ọlu Ndi-ozi 13:9-11; Ọpupu 9:3; I Samuel 5:6-9

4 Onyeisi obodo ahụ, ebe ibobo ihe ahụ emeworo nwụrụ ya n’arụ, kweere n’Onyenwe anyị, Ọlu Ndi-ozi 13:12; 19:17, 20; Matiu 27:54; Luk 7:16

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

Inyere Ụmụnna aka

Ná Antiọk, ebe mbụ ahụ akpọrọ ndịnáesoụzọ Jisọs Kraist NdịKristian, Agabọs onyeamụma nke Onyenwe anyị, buru amụma banyere óké ụnwụ gaje ịdị. O kwuru na ọ gaabịakwasị eluụwa dum mmadụ bi, na Jerusalem gaeso kwa n’otù nime obodo ebe ọ gaesi ike. O doroanya, na ndị náesoụzọ Kraist ndị bi n’ebe ahụ gaeso hụ ahụhụ a. Dịka ha bụ ndị ná enweghịàkụ dị ukwu, agụụ gaagụsi kwa ha ike n’ihi na ha agaghị enwe ike izụta nri. Amụma Agabọs buru banyere óké ahụhụ ahụ nke gaabịakwasị ụwa dum kpaliri ndị náesoụzọ Kraist bi ná Antiọk ime ihe. Nke a, n’ezie, bụ ihe Onyenwe anyị jiri zite amụma ahụ, bụrụ kwa ụzọ Ọ chorọ isi rọpụta ihe iji gboo mkpà nke ụmụnna nọ na Jerusalem. Ndị náesoụzọ Kraist, onye ọ bụla dịka o nwere ike ime, kwere iziga enyemaka.

Nzube ahụ na ndịnsọ nke Chineke kwesịrị inyeaka nime mkpà nke ụmụnna nime Onyenwe anyị, na inyere onye ọ bụla ọzọ nọ ná mkpà aka, abụghị ihe ọhụụ. Jisọs ekwuworị ọtụtụ mgbe na ọ bụ ọlụ dịrị ndị ọgaranya inye ndịogbenye ihe. Ya onwe Ya bụ iheàtụ kachasị n’ụdị ime iheọma dị otú a, n’ihi na O mere Onwe ya ogbenye ka anyị wee bụrụ ndịọgaranya (2 Ndi Kọrint 8:9).

N’otù oge, Jisọs gwara otù nwaokoroọbịa ọgaranya náachịachị na ọ bụrụ na ọ gaeketa ndụ ebịghịebi na ọ ghaghị ire ihe niile o nwere, nye ndịogbenye, mgbe ahụ ka ọ gaabịa kwa so ya (Lee Matiu 19:21). Nime otù ihe ahụ nke mere n’oge a, Jisọs chọrọ ka nwaokoroọbịa ahụ nwee ịhụn’anya na obiọma imere mmadụ ibe ya ezi ihe site n’ísí n’àkụ ya dị ukwu nye ndịogbenye ihe. Ọ bụ ezi mnwapụta iji mata ụdị okpukpé o nwere, ma, ọ bụ ihe mnwute na ọ gafeghị mnwapụta ahụ, site na nke a anwapụtara na okpukpé ya abaghị urù ọ bụla. (Gụọ I Jọn 3:16-18 na Jemes 2:15, 16). Site n’ihe ndịa na amaokwu ọzọ dị icheiche nime Akwụkwọnsọ, anyị naamata na inye ndịogbenye na ndị nọ ná mkpà ihe, nke ka nke ndị èzínaụlọ nke okwukwe, abụrụwo ihe anaele anya na ndị nke Chineke aghaghị ịdị náeme.

Mkpebi nke ndịnsọ ahụ nọ ná Antiọk kpebiri izigara ụmụnna ndị nọ na Jerusalem inyeaka bụ mmalite nke ihe ahụ anaeme ugbu a ná nzukọ Kraist dum, omume ahụ nke Chineke n’onwe Ya tọrọntọala ya ma gọzie kwa ya. Ndịakụkọ mgbe ochie naasị na nime iri arọ abụọ nke naesoni, na enwere óké ụnwụ siriike ihe ra ka ugbò anọ. Otù nime ha siri nnọọ ike, nke mere ka otù onyakụkọ kwue sị, na ọ bụ ikpé nsọ nke Chineke megide ndị ahụ. Ekwukwara ihe banyere ụnwụ ndịa ọtụtụ ugbò nime Testament ọhụụ; ma nime ọtụtụ arọ nke ndị náesoni, Pọl kwukwara okwu karịa banyere òzízí na ụkpụrụ nke ndịnsọ inye ihe site n’ihe ha nwebigara ókè maka mkpà nke ndịnsọ ọzọ ndị nwere ntakirị.

Pọl kwuru na ndị natara ihe nke mmụọ site n’aka ndị ọzọ ji ha ụgwọ inyere ha aka, ma ọ bụrụ na ọ dị mkpà n’ihe banyere mkpà nke ihe anaahụanya. Ọ sịrị, “Asi na ndi mba ọzọ nwekọrọ ihe Mọ Nsọ nke ha, ha ji kwa ha ugwọ ifè ha òfùfè n’ihe nke anu-aru” (Ndi Rom 15:27).Àkụ nke imemmụọ dị mkpà karịa ihe nke anụarụ, n’ihi na ihe nke imemmụọ na adị ebighịebi, ma ihe mnweta nke ụwa abaghị kwa urù nye onye ọ bụla mgbe ọ nwụsịrị.

Ekwesịrị ịmụ ihe dị na 2 Ndi Kọrint isi asatọ na isi iteghete nkeọma banyere isiokwu a. Nzukọ Kraist nọ na Kọrint ekegidewo onwe ha n’ụzọ pụtara ìhè na mgbe garaaga n’inye onyinye iji nyere ndịnsọ nọ n’ebe ọzọ aka. Nime oge ahụ kwa, ndịnsọ nke nọ na Masedonia enyeworị onyinye. Ha bụ ndịogbenye, ma otú ọ dị ha nyere onyinye gafee ihe elereanya site n’aka ha. Obiọma na ịhụn’anya ha n’ebe ụmụnna ha n’ihe nke mmụọ nọ dị ukwu n’ihi óké ịhụn’anya nke Kraist nke dị nime obi ha; ha nyekwara ihe niile nke ha nyere site n’obi nke afọofufo.

Kọrint bụ obodo ukwu, eji kwa inwebiga iheókè gọzie ndịnsọ bi n’ebe ahụ karịa ndị Nzukọ Kraist ọzọ dị icheiche. Pọl, site n’ịkọrọ ndịnsọ dị na Kọrint ihe banyere óké afọofufo nke ndịnsọ dị na Masedonia náagbanyeghị ụkọ ha, zubere itinye ụdị afọofufo dị otú ahụ nime obi ndị Kọrint. Ọ bụghị náánị na Pọl kuziiri ndịnsọ a inye ihe n’afọofufo iji gosi obi ekele n’ihi óké ịhụn’anya na ngọzi Chineke n’ebe ha nọ, kama o gosikwara ha na ọ bụ ọlụ dịrị ha ịlụ. Pọl chịkọtara isiokwu ahụ na mkpụrụokwu olenaole: “Ekwughm nka, ka ọ we di ndi ọzọ nfé, ka nkpagbu we di-kwa-ra unu: kama anamekwu n’uzọ nrata; ebe ihe unu nwebigara ókè mejuru ihe fọduru ha inwe n’oge di ugbu a, ka ihe ndi ahu nwebigara ókè we meju kwa ihe fọduru unu inwe; ka nrata we di: dika edeworo ya n’akwukwọ, si, Onye chikọtara ri nne enwegh kari nke gēzuru ya; onye chikọta-kwa-ra ntà, ọ digh ihe fọduru ya inwe” (2 Ndi Kọrint 8:13-15).

Chineke edowo ya na nwa Chineke ọ bụla nke Ọ gọzibigaraworo ókè nwere ọlụ dịrị ya inyere ụmụnna ya nime Kraist aka bụ ndị ahụ ná enweghị ihe naezuru ha, dịka Chineke naegosi ya mkpà ahụ. N’ihi na Onyekraist ịrapụ inye nwanna ya nime Kraist nke nọ ná mkpà ihe, mgbe o nwere ihe ahụ gaegbò mkpà nwanna ahụ, dị ka onye naapụnara nwanna ya ihe. (Gụọ Ilu 3:27, 28). Ọ bụ uche Chineke pụtara ìhè na nke a bụ otù ụzọ nke agaesi náahụ ihe banyere mkpà nke ndịnsọ. Nwanna nwoke maọbụ nwanna nwanyị ahụ nwebigaraiheókè gana enye aka n’ihe banyere mkpà nke ụmụnna ya nime Onyenwe anyị, ka ọ gaabụ n’oge ya onwe ya nọ ná mkpà, ndị ahụ naenweghị ihe na mbụ, bụ ndị nwebigara ihe ókè n’oge ahụ, gaenye kwa aka ná mkpà nke ya onwe ya.

Chineke agaghị ekwenye Onyekraist ọ bụla nke ihe naagara nkeọma ma ọ chọghị isite n’uju akụ nke Chineke nyeworo ya nyere ụmụnna ya ndị nọ námkpà aka. Onye ahụ naachọ náánị ọdịmma nke ya onweya gaeme nkeọma n’icheta okwu ahụ nke Onyenwe anyị gwara ndị Israel: “Lezie onwe-gi anya ka i ghara ichezọ JEHOVA, bú Chineke-gi, n’edebegh ihe nile Ọ nyere n’iwu, na ikpé-Ya nile, na ukpuru-Ya nile, nke mu onwem nēnye gi n’iwu ta: ka ọ we ghara ibu, mgbe I nēri ihe, riju afọ, wu kwa ezi ulo, we biri nime ha: mgbe ìgwè ehi-gi na ìgwè ewu na aturu-gi nāba kwa uba, mgbe ọla-ọcha na ọla-edo nāba-kwa-ra gi uba, mgbe ihe nile I nwere nāba kwa uba; na obi-gi gādi elu, I we chezọ JEHOVA bú Chineke gi … i we si n’obi-gi, ikem na ume akam emetaworom àkù a. Ma i gēcheta JEHOVA, bú Chineke-gi, n’ihi na Ya onwe-Ya bú onye nēnye gi ike imeta àkù; ka Ọ we me ka ọgbugba-ndu-Ya guzosie ike, nke Ọ ñuru nna-gi hà iyi imere ha, otú ọ di ta” (Deuteronomi 8:11-14, 17, 18).

Dịka o si dị mma inye ihe, n’ihe nke anụarụ, bụ otú o si dị kwa mma n’ihe nke imemmụọ. Mmadụ agaghị amụ isi asatọ na isi iteghete nke 2 Ndi Kọrint ogologo oge wee ghara ịghọta na ezi iheomimi dị n’ihe Pọl naede banyere inye onyinye náatụ kwa aka n’ihe nke imemmụọ. Okwu ahụ, “Onye were aka-ntagide nāgha nkpuru gēwere kwa aka-ntagide nēwe ihe-ubi; onye were kwa ngọzi nāgha nkpuru gēwere kwa ngọzi nēwe ihe-ubi,” naegosipụta ihe dị óké mkpà nke dị kwa ebube ma akọwaa ya n’ihe nke mmụọ. (Mụọ Aisaia 55:8-13 ya na isiokwu a).

Ọkpụkpọòkù nke Ijéozi

Pọl na Banabas bụ ndị ezigaworo Jerusalem ibuga onyinye nke sitere na Nzukọ Kraist dị ná Antiọk, kuuru Jọn Mak nye onwe ha mgbe ha na alaghachị ná Antiọk. Mgbe ha laghachịrị ha wee nọ n’ekpere na ibuọnụ ka ha na ejere Nzukọ Kraist dị ná Antiọk ozi. N’oge dị otú a, Mmụọ Nsọ kwuru okwu sị, “Kewaputaram Pọl na Banabas, ilu ọlu nke M’kpọworo ha ka ha lua.” Mgbe ha busịrị ọnụ ma kpee kwa ekpere, ndị náesoụzọ Kraist, doro Banabas na Sọl ichè site n’ibikwasị ha aka n’isi, wee were ekpere na ngọzi ha zipụ ha ijé lụọ ọlụ Chineke.

Ọ bụ ihe kwesịrị ịrịbaàmà, na mgbe Onyenwe anyị kpọrọ Banabas na Pọl ịlụ ọlụ Chineke, na emere ka ndịisi na ndịnsọ nọ ná Antiọk mata. Chineke adịghị akpọ ndịọlụ Ya na ndịozi Ya baa n’akụkụ ọzọ nke ijéozi dị icheiche ná emeghị ka ndị nlekọta na ndịndú nke nzukọ ahụ mata uche Ya. Ọ bụrụ na Chineke emeghị ka ndịisi náelekọta ndịnsọ ahụ mata uche Ya , nke a gaeweta ọgbaaghara dị ukwu. “Chineke abugh Chineke nke aghara” (I Ndi Kọrint 14:33). Ọ bụrụ na ọkpụkpọòkù ahụ sitere na Chineke, Ọ gaeme ka ndịnlekọta maọbụ ndịndú mata eziokwu ahụ. N’ụzọ dị otú a, mgbe onye ahụ naanata ọkpụkpọòkù ahụ naejé n’ọlụ ọhụụ nke akpọrọ ya ịlụ, ọ gaanata mkwagide na ekpere nke ndịnsọ na ndị náejéozi. Ọ bụrụ na onye ọ bụla anataghị mkwagide na mkwenye nke onye nlekọta ya, ọ gaakamma ka o chere ma nyochaa ọkpụkpọòkù ya, ịhụ ma o si kwa n’ebe Chineke nọ n’ezie.

Mgbe Chineke kpọrọ mmadụ òkù wee zipụ ya ịlụrụ Chineke ọlụ ụfọdụ, ọ gaeje náatụghị egwù ihe ọ gaapụta. Onye ahụ nọ n’etiti uche nke Chineke, ọ bụ eziokwu na setan aghaghị ịnọchigide, ma mmeri bụ ihe doroanya, n’ihi na Chineke eburuworị ụzọ gaa n’iru.

Jisọs, mgbe Ọ na ekwuokwu banyere ndị nke Ya, Ọ sịrị, “Ọ nākpọ kwa aturu nke aka ya n’aha, nēdupu kwa ha. Mgbe ọ bula ọ chupuru aturu nke aka ya nile, ọ nāga n’iru ha, aturu ahu nēso kwa ya: n’ihi na ha matara olu-ya” (Jọn 10:3, 4). Ọ naeju mmadụ anya bụ ndọgbu n’ọlụ na mgbalị anatụfu ná nlụpụtaaghụghọ dị icheiche nke okpukpé n’ihi na ha bụ àtụmààtụ nke mmadụ ọ bụghị kwa àtụmààtụ nke Chineke. Ọlụ nke nzọpụta sitere na Chineke; ma dịka Onyeisiagha nke nzọpụta anyị, Ọ gaedú ndị Ya rue mmeri ebighịebi. Ime ngwangwa baa n’ọlụ ụfọdụ nke náenweghị ngọzi nke Chineke n’elu ya bụ náánị ime ka ọdịda nke ọlụ ahụ guzosieike.

Joshua, mgbe ọ naedú ụsụ ndịagha nke ndị Israel ịbà n’ala Kenean, zutere otù nwoke mịpụtara mmaagha. Onye a gwara Joshua na Ya abịawo dịka Ọchịagha nke ụsụndịagha nke Onyenwe anyị. Chineke arapụghị Joshua ichepụta ụzọ nke aka ya iji nwee mmeri n’agha ahụ, kama Onyenwe anyị nọ n’ebe ahụ ịga n’iru ya na ịhụ na enwere mmeri. Ọtụtụ ihe ka apụrụ ikwu banyere mkpà ọ dị na ndị nke Chineke gaechere ime uche Chineke ná ndụ ha.

Nguzogide nke Ekwensu

Pọl na Banabas, ebe Mmụọ Nsọ zipụrụ ha ịlụọlụ Chineke, ha rubereisi n’ọkpụkpọòkù ahụ. Mgbe Sajiọs Pọlọs onyeisi obodo ahụ nke ha nọ nime ya rịọrọ ha ka ha bia, ha jekwuuru ya ịgwa ya ihe banyere Kraist. Nke a bụ nwoke onye ihe banyere mkpụrụobi ya naemetụ n’obi nke mere na ọ chọrọ Oziọma ahụ site n’ọnụ ndị náekwusa ya.

Ma Sajiọs Pọlọs, dịka ọ dịrị ọtụtụ ndị biri ndụ tupu ya onwe ya na site kwa n’oge nke ya, agaghị anụ ihe banyere Oziọma ahụ ma Setan eguzogideghị ya otú o nwere ike. Elimas, onye mgbasị, bụ onye Sajiọs Pọlọs naatụkwasịobi, gbalịrị iduhie ya n’okwukwe. Okwu Chineke akọwaghị otú o siri gbalịa ịlụ ọlụ ọjọọ a, kama eleghịanya, o mere otú a site n’aghụghọ na ụgha, ná enwe nchekwube na ya gaenwe ike ime ka obi onyeisi ahụ jụ Oziọma, wee site kwa na nke a gbochie ya ịnabata eziokwu ahụ. Eleghịanya Elimas nwere urù dị icheiche ọ naerite site ná mmekọ nke ya na Sajiọs Pọlọs, nke ọ tụrụ ụjọ na ya gaatụfu ma ọ bụrụ na onyeisi ahụ echègharịa bụrụ onye nke Kraist. Ọ dị ka ọ dịghị onye ọ bụla nke na amalite isi n’ọlụ niile nke Setan wezuga onwe ya ịbà n’Alaeze nke Chineke nke náezuteghị ịgbàmgbà nke Setan n’otù ụzọ maọbụ n’ụzọ ọzọ, iji mee ka obi ahụ naanụọkụ ime ka ya na Chineke dị n’udo daa mbà.

Pọl eguzoghị n’otù ebe naele náánị anya wee rapụ otù mkpụrụobi ahụ ka ọ laa n’iyi n’ihi na Ekwensu naagbalịsiike igbochi nchègharị nke Sajiọs Pọlọs. Ọ baara Elimas mbá n’aha Onyenwe anyị, Elimas wee kpue ísì n’ihi ajọomume ya. Mgbe Setan na egbochi mkwusa nke Oziọma ahụ, dịka Elima mere, mmadụ kwesịrị ịrịọ Chineke ka O mebie nguzogide ahụ dịka O meere Pọl na Banabas. Ibuagha anyị abụghị nke anụarụ, kama ọ bụ nke ihe mmụọ, iheagha niile nke Onyekraist dị kwa ike n’ịkwada ebe niile ewusiriike.

Ihe dị otú a mekwara mgbe Senakerib, eze Asiria, zigara ndịozi iwegara Hezekaia, bụ eze Israel akwukwọozi náachọ ka Hezekaia nyefe obodo ahụ n’aka ya. Senakerib tara Chineke nke ndị Israel ụta, náasị na Ọ gaadị ka chi ndịọzọ niile, nke náenweghị ike ịnapụta mmadụ site n’aka ya. Hezekaia gbasara akwụkwọozi nke ịtaụta a n’iru Chineke, wee kpeeekpere maka enyemaka. Ihe mere bụ na Chineke zara ekpere Hezekaia site n’iziga otù mmụọozi ka o tie ọmụmaụlọikwu ndị Asiria ihe otiti. Mmụọozi ahụ tigburu otùpuku na narịiriasatọ na ise ndịkom (185,000). Senakerib na ndịagha ya laghachịrịazụ ná agbaghị otù akụ náabaghị kwa n’obodo ahụ. Mgbe ọ latara n’ụlọ ụmụ ya weere mmaagha gbue ya mgbe ọ nọ n’ụlọ chi ya.

Ihe mbá ahụ Pọl baaara Elimas lụpụtaara bụ na ibodo ihe a emeworo nwụrụ Sajiọs Pọlọs n’arụ nke ukwu, o wee kwere n’Onyenwe anyị. Mgbe ụmụ Chineke ji mkwuwaokwu guzoro Onyenwe anyị, Chineke na enye ha ike nime nguzo ha wee gosipụta kwa na ụzọ ha naeso ziriezi, ewee si otú a kpọtara Kraist mmadụ.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. 1 Òlee otú ndị náesoụzọ Kraist siri mata na óké ụnwụ gaadị?

  2. 2 Gịnị ka ndị náesoụzọ Kraist nọ ná Antiọk kpebiri ime banyere ya?

  3. 3 Òlee otú anyị si mata na ọ bụ ọlụ dịrị Onyekraist inye ndịogbenye ihe?

  4. 4 Gịnị mere Pọl na Banabas ji rapụ Antiọk?

  5. 5 Òlee otú Elimas jiri chọọ igbochi Oziọma ahụ?

  6. 6 Òlee otú Pọl si merie nguzogide nke Elimas?

  7. 7 Gịnị ka arịrịọ ahụ nke Sajiọs Pọlọs rịọrọ ịnụ Oziọma ahụ lụpụtara?