Ọlu Ndi-ozi 13:13-52

Lesson 325 - Senior

Memory Verse
“Le, Mu onwem nēzipu unu dika aturu n’etiti agu: ya mere, burunu ndi nwere uche dika agwọ, ndi nādigh kwa aghughọ dika nduru” (Matiu 10:16).
Cross References

I Nye Ndị Juu na Mbụ

1 Ndị náesoụzọ Jisọs bịaruru Paga, ebe ahụ ka Jọn rapụrụ ha, ha wee jerue Antiọk dị na Pisidia, Ọlu Ndi-ozi 13:13, 14

2 Pọl kwusaara Ndị Juu Okwu Chineke n’ụlọ nzukọ n’Ụbọchị Izuike, Ọlu Ndi-ozi 13:15; 17:2; Luk 4:16

3 Pọl kwusara Jisọs Kraist nye ndị Juu, ná enye ihe mkwagide site n’Akwụkwọnsọ na Ọ bụ Mesaia ha, Ọlu Ndi-ozi 13:16-41; 2:22-36; 3:13-26; 4:11, 12; 5:29, 32

4 Emere ka ọtụtụ mmadụ kwere n’eziokwu ahụ nke sitere ná mkwusa Pọl, náekwere kwa n’Onyenwe anyị, Ọlu Ndi-ozi 13:42-44

II Ma nye Ndị Grik

1 Ndị Juu, site n’ekworo n’ihi ìgwè mmadụ náañantị námkwusa nke Pọl, kwuru okwunkwulu dị icheiche megide Oziọma ahụ na Pọl, Ọlu Ndi-ozi 13:45; 14:2; 17:5, 13, 17, 18

2 Mgbe Pọl hụrụ na ndị Juu jụrụ Kraist, o wee ché Ndịmbaọzọ iru, Ọlu Ndi-ozi 13:46-52; 28:25-28; Aisaia 42:6, 7; 49:6; Luk 2:32

3 Ọ bụ ihe dị mkpà ka eburu ụzọ kwusaara ndị Juu Oziọma ahụ, Ọlu Ndi-ozi 13:46; Matiu 10:5, 6; Ọlu Ndi-ozi 3:26; Ndi Rom 1:16

4 Pọl na Banabas tichapụrụ ájá ụkwụ ha megide ndị Juu, ma jee ikwusaara Ndịmbaọzọ Oziọma ahụ, Ọlu Ndi-ozi 13:51, 52; 18:6; Matiu 10:14; Mak 6:11

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

Oziọma ahụ nye Ndịmbaọzọ

Isiokwu nke eziokwu dị n’iheọmụmụ anyị ka apụrụ ijikọtaọnụ ma eleghịanya nime okwu dị icheiche nke Pọl mgbe o kwuru sị: “Ọ dim ọku n’obi izi kwa unu Ozi-ọma … n’ihi na ọ bu ike nke Chineke rue nzọputa nye onye ọ bula nke kwere, onye-Ju na mbu, ma onye-Grik kwa” (Ndi Rom 1:15, 16). Nime àtụmààtụ nke Chineke, ezubere na ndị Juu aghaghị ibuụzọ nụ Oziọma nke Jisọs Kraist, n’ihi na ha ka enyere “ido-ka-nwa nwoke ahu na ebube ahu, na Ọgbugba-ndu nile, inye-iwu ahu, na ikpé ekpere ahu n’Ulo-uku Chineke, na nkwà nile; ndi nwe nna-ayi hà, ndi Kraist-ayi si kwa n’etiti ha puta dika anu-aru si di, Onye bu Onye-isi ihe nile” (Ndi Rom 9:4, 5). Anyị agaghị aghọtahie nke a site n’ikwu na ọ bụ náánị ndị Juu ka ịnata nzọpụta dịịrị na mbụ, na ọ dịrịghị Ndịmbaọzọ. Nzọpụta dịrị Ndịmbaọzọ dịka ọ dịịrị ndị Juu; kama ndị Juu bụ iheọlụ arọpụtara nye Chineke ikwusa nzọpụta ahụ ka oge naaga.

Site n’oge Abraham, mgbe ọ nataara mkwà niile nke ọgbụgbandụ ahụ site n’aka Chineke, na agaagọzi kwa agbụrụ niile nke ụwa nime ya, Chineke mesoro onye Israel ọ bụla n’otù n’otù, o mesokwara ha n’ìgwè dịka mba. (Lee Ndi Galetia 3:8, 9.) Ọchịchọ nke Chineke bụ iji ha lụọọlụ nke gaenye Ya otuto na ikwusa Oziọma ahụ. Dịka mba, ha bụ ndị kwesịrị oluike bụrụ kwa ndịisiike na ndị náeguzogide Mmụọ nke Chineke. N’ikpéazụ, n’oge ijéozi nke Kraist mgbe Ọ matara na ọjụjụ ha jụrụ Ya dịka mba ezuwo ma ru kwa ọgwụgwụ, Jisọs kwuru okwu ndịa náemetụn’obi: “Le, anārapuru unu ulo-unu: ma asim unu, Unu agaagh-ahum ma-ọli, rue mgbe unu gāsi, Onye agọziri-agọzi ka Onye ahu bu Nke nābia n’aha ONYE-NWE-AYI” (Luk 13:35). Okwu ndị ahụ náegosi na oge dị ukwu abịaruwo n’ọgwụgwụ, náegosi kwa na mgbe dị n’iru Chineke gaeji okwu ime ka adị n’udo chigharịkwute Ndịmbaọzọ, na ha gaaghọ kwa alaka osisi olive nke ọhịa, nke anyakudoro n’osisi olive ọma (Mụọ Ndi Rom 11:17-24).

Anaemezu ámụmá ochie nke eburu ọtụtụ narị arọ garaaga. Ọbụná site n’oge Moses, Chineke dọrọ ndị Israel akanántị banyere ndaghachịazụ ha ma gwa kwa ha na agaezi Ndịmbaọzọ, Oziọma, na ha ganara kwa ya. Edewo ya sị: “Ha onwe-ha ewerewo ihe nābugh Chineke mem ka M’kwo ekworo; Ha ewerewo ihe-efu nile ha kpasuem iwe: Mu onwem gēwere kwa ndi nābugh ndi me ha ka ha kwo ekworo; Mba nzuzu ka M’gēwere kpasue ha iwe” (Deuteronomi 32:21). Pọl, n’ikwugharị okwu Aisaia n’ihe banyere isiokwu a depụtara: “Ndi nāchọghm chọtaram, Ewerem gosi ndi nājugh ajuju n’akam” (Ndi Rom 10:20).

Eziokwu nke dị n’ebe ọgụgụ ndịa sitere n’Akwụkwọnsọ bụ na ndị Israel nọgidere n’ịkpasu Chineke iwe mgbe niile site ná nọgidesiike ha n’ifè arụsị dị icheiche òfùfè. Chineke sịrị na Ya gaeme ka ndị Israel kwoekworo site n’ichigharịkwute ndị ahụ nke ndị Juu naasị na ha ekwesịghị ka akpọọ ha ụmụmmadụ. Ndị Juu ji isiike nọgide n’ichè na ohere na urù niile nke Oziọma ahụ bụ nke Chineke nyeworo ha bụ ihenketa ha site n’ọmụmụ, nke ọbụná Chineke apụghị ịnapụ ha. Ma Chineke napụrụ ha ohere na urù ndị ahụ niile; wee napụ kwa ha ọtụtụ ngọzi ọzọ dị icheiche, n’ihi ajọomume ha. N’otùaka ahụ Chineke gaewepụ ọñụ niile nke nzọpụta nke Onyekraist ọ bụla náejidesịghị nzọpụta ya ike. Ọzọ kwa, Ọ gaewepụ aha onye ọ bụla nke mehiere site nime Akwụkwọ nke Ndụ ahụ.

Ọ dịghị isiagụgọ dị na o wutere ndị Juu nke ukwu na eziri Ndịmbaọzọ Oziọma, dịka emere ka ọ puta ìhè n’ebe ọgụgụ nke iheọmụmụ a na ebe ọzọ dị icheiche n’Akwụkwọnsọ. Mkwusa nke Oziọma ahụ nye Ndịmbaọzọ amalitewo, ọ ganaaga kwa n’iru rue oge Mwepụ na Nzuzo nke Nzukọ Kraist: nke bụ mgbe Chineke ga echigharịkwute ndị Juu dịka mba, imeso ha banyere Mesaia ha.

Ndịmbaọzọ nabatara Oziọma

Ka anyị naamụ akwụkwọ nke Ọlụ Ndịozi anyị na ahụ nguzogide nke ndị Juu mgbe niile megide ikwusa Oziọma nke Jisọs Kraist, na ekworo ha nwere n’ihi na Ndịmbaọzọ jikeere ịnara okwu ahụ. Ọ bụ ihe pụtara ìhè na ndị Israel etufuwo ohere nke ha nwere, ma ụbọchị nke nzọpụta náamụwapụta ìhè n’ebe Ndịmbaọzọ niile nọ.

Dịka Ndịozi ọzọ mere, otú a ka Pọl náewere ya dịka ọlụ mbụ dịrị ya, ịga n’ụlọ nzukọ, maọbụ n’ebe ọzọ gaadịrị ha mma, izisara ndị Juu Oziọma nke Jisọs Kraist. Chineke kpọrọ Pọl ịbụ Onyeozi nke Ndịmbaọzọ, o kwuru okwu ndịa banyere onwe ya sị: “Ma ọ bu unu ndi mba-ọzọ ka m’nāgwa okwu, (n’ezie, ka ọ ra, bú onye-ozi nke ndi mba-ọzọ mu onwem bu” (Ndi Rom 11:13). Otú ọ dị, Pọl buru ụzọ gagwa ndị Juu banyere mgbaghara nke mmehie, ma gwa kwa ha na aha ọzọ dị iche adịghị kwa n’okpuru Eluigwe, nke enyeworo n’etiti mmadụ, nke anaaghaghị ịzọpụta mmadụ nime ya ma ọ bụghị aha Jisọs Kraist, Ọ bụ iwu Chineke na aga ebu ụzọ zie ndị Juu Oziọma Jisọs Kraist, Pọl rubekwaraisi n’iwu ahụ site n’iguzosiike n’ime ya. Ọtụtụ mgbe ikwusara ndị Juu Oziọma naabụ ihe efù, bụrụ kwa ihe naakpasu ọtụtụ nsogbu, ma eburu ụzọ kwusaara ha dịka Chineke nyere n’iwu.

Ọ bụ ezie na Chineke echigharịwo n’ebe ndị Juu nọ dịka mba, ma onye Juu ọ bụla n’onwe ya pụrụ inwe nzọputa na ngọzi nke Chineke, ọ bụrụ na o chègharịa site ná mmehie ya niile ma chịgharịkwute kwa Kraist. Ọtụtụ nime ha chigharịkwute Kraist, ma ọ bụ ihe mwute na ọtụtụ echigharịkwuteghị Ya. Pọl kwusaara ndị Juu Okwu Chineke dịka Ndịọzi ọzọ mere site n’ihe edere n’Akwụkwọnsọ nime Agba Ochie, náegosi n’ezie na Kraist bụ Mesaia ahụ nke ha leworo anya Ya ọtụtụ arọ garaaga.

Dịka Onyenwe anyị buwororị ná ámụmá, emere ka ndị Juu kwoo ekworo dị ukwu n’ihi ọgan’iru nke Pọl nwere n’ịgwa Ndịmbaọzọ Okwu Chineke. Ha malitere ikwugide na ikwulu ihe Pọl kwusara. Mgbe Pọl na Banabas hụrụ nguzogide nke ndị Juu nke amamihe náadịghị, ọ baara ha mbá, site n’ikwu sị: “Ọ di nkpà ka eburu uzọ gwa unu okwu Chineke. Ebe unu nēnupu ya n’aru-unu, nēkpe kwa onwe-unu ndi nēkwesigh ndu ebigh-ebi, le, ayi gaje ichighari gwa Ndi-Mba-ọzọ okwu. N’ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi nyeworo ayi iwu, si, Edebeworom i ka i buru ìhè nke mba nile, ka i we di inye nzọputa rue nsọtu uwa.”

Mgbe Ndịmbaọzọ nụrụ na agaagwa ha Okwu Chineke, ha ñụrịrịọñụ, wee nye Okwu Onyenwe anyị otuto. Ọtụtụ wee kwere rue ịnata ndụ ebighịebi. “Ewe nēbu Okwu Onye-nwe-ayị jezue ala ahu dum.”

Iheọmụmụ anyị kwuru na Pọl na Banabas “rupuru ájá nke ukwu-ha megide ha.” Lee mbibi dị óké egwù nke dị nime okwu olenaole ndịa! Okwu ndịa na nke Jisọs kwuru dakọtara: “Ma obodo ọ bula ma-ọbu obodo ntà ọ bula unu gābà nime ya, chọputanu onye kwesiri nime ya; nọgidenu n’ebe ahu rue mgbe unu putara . Mgbe unu nābà n’ulo ahu, kelenu ya. Ọ buru kwa na ulo ahu kwesiri, ka udo-unu biakwasi ya: ma ọ buru na o kwesigh, ka udo-unu laghachikute unu ọzọ. Ma onye ọ bula nke nānaragh unu nke-ọma, nke nānugh kwa okwu nile unu, mgbe unu nāpu n’ulo ahu ma-ọbu n’obodo ahu, tichapu ájá ukwu-unu. N’ezie asim unu, ala Sọdom na Gọmọra gānagide okwu n’ubọchi ikpé kari obodo ahu” (Matiu 10:11-15).

Ka anyị nara ịdọakanántị a siriike site n’ekweghịekwe nke mba Israel. Náagbanyeghị otú anyị si mara usoro nke ifé Chineke òfùfè, ọ dighị urù ọ bụla ịmara nke a gaabara anyị ma ọ bụghị ma anyị ji obi anyị kwere rue eziomume, kwere kwa na Chineke emewo ka Kraist si n’ọnwụ bilie n’ezie.

Oge ikwusa Oziọma nye Ndịmbaọzọ erubewo n’ọgwụgwụ. Ọbụná ugbu a, ndị Juu naeme ngwa náalaghachị na Palestine, bụ ala nke ha. Ohere dịrị Ndịmbaọzọ gaagabiga n’oge náadịghịanya, ọbụná dịka o si gabigara ndị Juu. Ka anyị cheta ịdọakanántị nke Okwu Chineke: “Lezienu anya, umu-nnam, ka ajọ obi nke ekwegh-ekwe ghara idi nime onye ọ bula n’etiti unu ma elegh-anya, n’iwezuga onwe-ya n’ebe Chineke di ndu nọ: kama nāriọritanu ibe-unu aririọ kwa-ubọchi, n’ogologo oge a anākpọ ya Ta; ka obi onye ọ bula n’etiti unu ghara ime etili site n’aghughọ nke nmehie: n’ihi na ayi aghọwo ndi-nketa nke Kraist, ma ọ buru na ọ bu ezie na ayi jidesiri nmalite nke ndabere-ayi ike rue ọgwugwu ihe nile” (Ndi Hibru 3:12-14).

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. 1 Gịnị ka nke a pụtara: “Onye-Ju na mbu, na onye Grik kwa”?

  2. 2 Gịnị mere Pọl ji buru ụzọ kwusaara ndị Juu Oziọma?

  3. 3 Gịnị mere Pọl ji sị na ya bụ Onyeozi nke Ndịmbaọzọ?

  4. 4 Òlee ndị bụ Ndịmbaọzọ?

  5. 5 Gịnị mere Pọl ji tichapụ ájá nke ụkwụ ya megide ndị Juu?

  6. 6 Gịnị mere ndị Juu ji kwooekworo megide Pọl?