Ọlu Ndi-ozi 14:1-28

Lesson 326 - Senior

Memory Verse
“Ònye gēkewapu ayi n’ihu-n’anya nke Kraist? Ọ bu nkpagbu, ma-ọbu óké nkpà, ma-ọbu nsogbu, ma-ọbu óké unwu, ma-ọbu igba-ọtọ, ma-ọbu ize-ndu, ma-ọbu nma-agha?” (Ndi Rom 8:35)
Cross References

I Pọl na Banabas, Ndị Nkwusanjégharị Abụọ Kwesịrịntụkwasịobi nke Chineke

1 Na Aikọniọm, nime ụlọnzukọ ndị Juu, Pọl na Banabas jiri mkwuwa okwu gwaa ọtụtụ mmadụ oziọma, Ọlu Ndi-ozi 14:1; 13:5; 18:19; Jọn 6:59; 18:20; Ndi Rom 1:16; 2:9, 10

2 Pọl na Banabas nọgidere na Aikọniọm rue ọtụtụ oge, Chineke naegosi kwa mkwagide Ya n’ọlụ ha naalụ n’ebe ahụ, Ọlu Ndi-ozi 14:3; 4:13, 31; 19:8; Mak 16:17

3 Mkpagbu ahụ nke malitere n’oge mbụ, n’ikpeazụ mere ka ha pụọ gaa Listra, Ọlu Ndị-ozi 14:2, 4-6; Matiu 10:5-33; I Ndi Kọrint 4:10-13; 2 Ndi Kọrint 4:8-10

4 Ha zisakwara Oziọma na Listra ma hụ kwa otù ọlụịrịbaàmà dị ebube nke alụrụ, Ọlu Ndi-ozi 14:7-10; 3:6-8

5 Pọl na Banabas, dịka ezi ndịkom nke Chineke, jụrụ ịnara òfùfè nke ndị ahụ wee duzie ha ịba n’òfùfè nke Chineke, Ọlu Ndi-ozi 14:11-18; 12:21-23; 28:6; Matiu 4:10.

6 Ndị Ju ahụ náekweghịekwe, site n’ịnụọkụn’obi n’iheọjọọ ha, mere ihe ejiri tụọ Pọl nkume, Ọlu Ndi-ozi 14:19, 20; 2 Ndi Kọrint 11:24-27; 2 Timọti 3:10-12

7 Anapụtara ndụ Pọl, ya na Banabas wee gaa Dabe izisa Oziọma n’ebe ahụ, Ọlu Ndi-ozi 14:20, 21; 5:18, 19; 12:7; 16:26; I Samuel 17:37; Daniel 3:27; 6:22

8 Nlaghachị nke ndị mkwusanjégharị ahụ laghachịrị ná Antiọk, lụpụtara ọtụtụ ihe nime ọzụzụ, ime ka eguzosieike, ịgbaume, ịhaziihe, n’etiti ụmụnna ọhụụ ahụ, Ọlu Ndi-ozi 14:21-28; I Timọti 4:1-5

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

Ijé Mkwusanjégharị ahụ

“Ma ndịamụma na ndịozi dị n’Antịọk, nime nzukọ Kraist dị n’ebe ahu; bú Banabas, … na Sọl … Mọ Nsọ siri, kewaputaram Banabas na Sọl ilu ọlu nke M’kpọworo ha ka ha lua. Mgbe ahu, mgbe ha busiri ọnu kpe kwa ekpere bikwasi kwa ha aka n’isi, ha we zipu ha” (Ọlu Ndi-ozi 13:1-3). Otú a ka njèm mbụ nke ọtụtụ ijé mkwusanjègharị nke Pọl Onyeozi jere siri malite. Iheọmụmụ a naekwu ihe banyere ihe ụfọdụ nke mere n’ijè mkwusanjègharị mbụ a -- ọtụtụ ihe ndị ahụ mere nke Pọl rụtụrụaka mgbe o naede akwụkwọozi ya dị icheiche n’oge ihe ndị a gasịrị. Ọ dị ụtọ ịgụ ihe edeworo banyere ọgwụgwụ nke ijè a. Akụkọ ahụ naekwu sị, ha we “ba n’ugbọ je Antiọk, nke esitereri na ya rara ha nye n’amara nke Chineke ilu ọlu nke ha luzuru”

Ndịa bụ ndịkom abụọ nke Chineke ndị náadịghị atụegwù, ndị gafesịrị iheisiike dị icheiche nke ijénjèm n’ọgbọ mbụ, náejégharị n’obodo ọzọ dị icheiche náejekwuru kwa Ndịmbaọzọ ibugara ha Oziọma nke Alaeze Chineke. Ndịa bụ ndịkom abụọ ahụ ndị Mmụọ Nsọ kewapụtaara n’ihi ọlụ nke Chineke, ndị ọ bụghị náánị na ha malitere ọlụ ahụ, kama ha esighị kwa n’ọkpụkpọ nke Chineke kpọrọ ha pụọ, ọ bụ ezie na o wetara ha ọtụtụ ahụhụ na ihere. Ọ bụghị náánị na “arara ha nye n’amara nke Chineke ilụ ọlụ” kama ha lụzuru ọlụ ahụ, Ọ dị mma ka anyị soro iheàtụ nke omume ha. Ọ dị mma na anyị hụrụ otú ha si mee omume nime ọlu a dị mkpà. Ọ dị mma na anyị hụkwara otú esi lụọ ọlụ nke Chineke, ka anyị wee soro nzọụkwụ ha n’ịlụọlụ nke anyị taa.

“Nye Ndị Juu na Mbụ”

Nke mbụ, anyị aghaghị ịmata na Chineke naenwe àtụmààtụ pụtaraìhè mgbe niile banyere ọlụ Ya. Ọ dịghị egosi anyị ihe anyị gaeme wee rapụ anyị ka anyị chepụta n’onwe anyị, ụzọ maọbụ usoro ahụ niile nke agaesi mee ya. Mgbe Ọ naatụziaka, Ọ naemeghe kwa ụzọ. Mgbe Ọ naatụzi kwa aka, Ọ naegosi kwa ụzọ. Ọtụtụ ụzọ adịghị nke agaeso mgbe anaeme uche Ya. Agaenwe náánị otù ụzọ bụ nke ziriezi n’ụzọ niile. Ọ bụrụ na anyị arapụ ịga n’ụzọ nke Chineke, anyị aghaghị ịmata na Ya onwe Ya, nime ebere Ya, gaesi n’ụzọ ọ bụla O nwereike isi iji wee kpọghachị anyị n’ụzọ Ya ma ọ bụrụ na anyị nwere ọchịchọ n’obi anyị n’ebe ihe ọ bụla dị karịa nke ime uche Ya ba ijéijè n’ụzọ Ya,

Chineke naenwe ogologo ntachịobi nime erughịeru nke nghọta anyị n’ihe banyere uche Ya zuruòkè n’ebe anyị nọ; ma ọ bụrụ na anyị adahie, Ọ naemeso anyị dịka ụmụ. Ma ọ bụrụ na anyị akpachapụanya rapụ ụzọ Ya wee rọrọ ụzọ nke onwe anyị, àtụmààtụ niile maọbụ mkpebi niile nke onwe anyị, ọ gaghị adị anya mgbe anyị gaachọpụta na anyị esiwo ná nlekọta Ya pụọ.

Ndị mkwusanjégharị abụọ ndịa, ndị náebu mkpà nke onwe ha n’oge mmalite nke Nzukọ Kraist sozuru uche àtụmààtụ nke Chineke (Gụọ I Ndi Kọrint 8:1-15). Chineke emewo ka uche Ya pụta ìhè na agaebu ụzọ zie ndị Juu Oziọma. Emesịa O gosi kwa ha na agaewegakwara ya Ndịmbaọzọ. Ụfọdụ ndị Juu enwewo ohere ọma ịnabata Mesaia ha na iso kwa Ya, ụfọdụ mekwara otú ahụ. Ma ọtụtụ ìgwè mmadụ anabataghị Ya, kama n’otù ụzọ maọbụ n’ụzọ ọzọ ha weere ya dịka ọlụ dịrị ha ime ka Ọ nwụọ.

Àtụmààtụ nke Chineke bụ na ndị Juu gaebuụzọ nata urù niile nke nzọpụta Ya, ka ha wee zisaara ụwa niile Oziọma ahụ. Mgbe Chineke zipụrụ ndị mkwusanjégharị mbụ Ya izisa Oziọma ahụ, emezuru àtụmààtụ a, n’ihi na mmadụ abụọ ndịa bụ ndị Juu ma mgbe ha naaga, ha buru ụzọ jekwuru ndị Juu bụ ndị bi n’obodo niile ahụ dị anya nke naanụbeghị ozi nke Oziọma ahụ. O kwesịrị ka Oziọma a rue ha dịka o ruworo ndị ahụ bụ ndị jiri anya ha hụ ọlụebube niile na ọlụ nke Kraist. N’ụzọ dị otú a, ndị Juu niile nwere ohere ichègharị na imezu kwa uche Chineke banyere ha.

Eleghịanya ogologo ijè niile nke agara nime ijèmkwusanjègharị a adịghị ntà karịa maịlị 1,500 (maọbụ kilomita 24,000). Ma náagbanyeghị ọtụtụ nsogbu nke ha zutere, ha jisiri ike naaga n’iru rue mgbe apụrụ ikwu banyere ha sị na ha alụzuwo ọlụ ahụ nke Chineke nyeworo ha ịlụ. Ụgbọmmiri ntà dị icheiche, dịka nke ha naeji n’oge ahụ, mere ka nsogbu niile nke anaenwe na njèm ụgbọmmiri dị ukwu karịa. N’eziokwu ndịkom abụọ ndịa gaejiworị ụkwụ gaa akụkụ dị ukwụ nke njèm ha n’elu ala. Ma ha akwụsịghị n’ihi nhujuanya dị icheiche, maọbụ n’ihi mkpagbu niile ha nwere. Ha nọgidere n’ọlụ nke Chineke rue mgbe ha lụzuru ọlụ ahụ nke dịrị ha ịlụ.

Otú Ijéozi Ha si Dị

Ọ dị ọtụtụ ihe baraurù na ndụmọdụ nke anyị kwesịrị ịrịbaàmà mgbe anyị naatụle iheọmụmụ a. Nke mbụ, edere sị, ha “we kwue okwu n’uzọ nke mere ka oké ìgwè madu kwere.” N’okwu ikpeazụ nke Kraist gwara ndị náesoụzọ Ya, Ọ sịrị, “Unu gānata ike, mgbe Mọ Nsọ gābiakwasiwori unu: unu gābu kwa ndi-àmàm.” Otù nime ihe ndị ahụ nke onyeọlụ ọ bụla nke naejere Chineke ozi náaghaghị inwe bụ ike ahụ.

Anaeritere Chineke ọtụtụ mkpụrụobi n’urù site n’ike nke Mmụọ Nsọ. N’ịbụ ndịàmà dị ike nke Chineke, anyị aghaghị inwe Mmụọ Nsọ nime anyị. Ndịàmà abụọ ndịa nwere ike ahụ. Mgbe ha kwuruokwu akpọtaara Chineke ọtụtụ ìgwè mmadụ. Ha tinyere nghọta ha n’ọlụ. Ha jiri amamihe Chineke nyere ha jee ozi. Ha jiri ike ha niile nke ime ka ekwenye. Ha jiri talent na onyinye dị icheiche nke Chineke nyeworo ha. Ha jiri ihe niile ndịa tinyere ịdịọkụ na ịnụọkụn’obi nke onyeozi; ma tụkwasị kwa n’ihe ndịa, ha nwere ike nke Chineke nke naanọgide na ndụ ha. Ọ bụ kwa ike ahụ kpaliri ọtụtụ mkpụrụobi.

Otù ike ahụ dịkwara anyị. Anyị aghaghị ịchọ, chọbiga ya ókè, ma gụọ ya n’ihe dị ókéọnụahịa karịsịa ihe niile ọzọ. Náagbanyeghị ụdị onyinye ọ bụla, ike iji mee ihe ọ bụla, talent niile ọ bụla, maọbụ ike ọ bụla nke anyị pụrụ inwe, anyị aghaghị ịmata na ihe kachasị mkpà n’ebe onye ọ bụla nime anyị nọ -- na n’ebe anyị niile nọ -- bụ inwe òtitemmanụ ahụ nke sitere na Chineke na ndụ anyị, n’ozi anyị, na n’ọlụ anyị. Ka Chineke kwe ka mgbe anyị naekwuokwu ka ụmụmmadụ kwere!

Ndịmkwusanjègharị ahụ nọrọ n’Aikọniọm ogologo oge, náekwuokwu ná nkwuwaokwu nime Onyenwe anyị. Onyenwe anyị kwagidere ụzọ niile nke ha si emeihe, náekwenye kwa ka iheịrịbaàmà niile ekweworo ná mkwà soo ijéozi ha.

Onye mkwusanjégharị bụ kwa onye náezisa oziọma. Onye naezisa oziọma bụ kwa onye nkwusanjégharị. Ọlụ dị ukwu nke izisa oziọma dị n’ijigide otù mkpụrụobi nime Alaeze Chineke dịka o siri dị kwa n’irita ya n’urù nye Alaeze ahụ ná mbido. Otù mkpụrụobi nke edebeworo nye Alaeze ahụ bụ kwa mkpụrụobi nke eritawooro Alaeze ahụ n’urù. Ndịkom nke Chineke ndịa nọgidere rue mgbe ọ pụtara ìhè na ọ bụ uche Chineke ka ha gaa n’iru, maọbụ rue mgbe emechisịrị ọnụụzọ maka ịlụọlụ ha gaa n’iru. Ha gara n’iru n’ebe ọzọ dị icheiche, emesịa ha wee lata kwa ịdụ ụmụnna ọdụ, ime ka ha guzosieike, iwulite mmụọ ha, na ịgba ha ume. N’oge ahụ, mgbe ọ dị mkpà na ha gaaga n’iru, ha naeme mkwadobe maka ọdịmma nke Nzukọ ahụ n’ọdịn’iru site n’ibikwasị ndị ahụ Chineke rọpụtaworo dịka ndị pụrụ ịbụ ndịndú nye òtù ndị ahụ kwereekwe aka n’isi, ịhụ na ọlụ ahụ nke alụworo alaghị n’íyì.

Ọ dị mkpà na Pọl gwara Timọti ka ọ lụọọlụ nke onye mkwusa, ma tinye kwa nime okwu nke ịdọakanántị ndị ahụ ọtụtụ ihe anyị naeche na ọ bụ náánị ọlụ dịrị onyeọzụzụatụrụ. Ọ bụ ihe agaahụ nnọọ, na anyị dum aghaghị ime ihe niile anyị nwere ike ime iji ritara Onyenwe anyị mkpụrụobi n’urù, mgbe anyị ritasịrị ha n’urù, anyị aghaghị kwa ịgbalị otú anyị nwere ike inyere ha aka hụ na ha toro rue n’òzùzùòkè nke nsọpụrụ Chineke.

Ihe ọzọ anyị náaghaghị ịrịbaàmà bụ omume nke ndịmkwusanjégharị abụọ ndịa n’ebe ndị náachọ inye ha otuto pụrụ ichè nọ.

Ndị Listra hụrụ ọlụebube ahụ alụrụ ewee mee ka ha tụgharịauche banyere eziokwu nke dị n’ọlụebube ahụ site na nwoke ahụ nke bụ onyengwụrọ siterịị n’afọ nne ya nke naawụli elu náeje kwa ijè n’iru ha. Akwara na mkwomkwo niile nke anaejibeghị mee ihe, maobụ nke anaemebeghị ka ha sieike, maọbụ mee ka ha mụta ịgaijè, ka aka Chineke mere ka ha dị ike n’otù ntabianya. Ọtụtụ ízù ka anaeji mụọ ịga ijè, mgbe nwata náamụtabeghị otú esi ejéijè. Ma n’ebe a otù nwoke, ọ bụghị náánị na ọ malitere ịgaijè kama ịwụli kwa elu. Ọ dịghị ihe inwe obiabụọ dị n’ọlụebube a. Emere ya site n’ihe nke karịrị mmazù na ike nke mmadụ efù. Ma ìgwè mmadụ ahụ malitere ịkpọisi ala nye ndịkom nke Chineke ahụ kama ịkpọisi ala nye Chineke n’onwe Ya.

Ọ dịghị ezi onye nke Chineke gaanara otuto na nsọpụrụ bụ nke dịrị Chineke nye onwe Ya. Ezi ndịorù nke Chineke adịghị ekwe ka efee ha òfùfè, maọbụ ịnara otuto n’ihi ịlụọlụ nke Chineke. Ndịorù nke Chineke naeweda onwe ha n’ala. Ọ bụ Chineke naenye ike ahụ, amamihe, ume, na ịdịike nke ha nwere. N’ihi nke a, ọ bụ Ya bụ Onye náaghaghị ịnara otuto n’ihi ọlụebube ahụ niile maọbụ ọlụ niile ahụ alụworo. Ọ dị ọtụtụ ihe mere nke dị nime Akwụkwọnsọ ebe emere ka ikpé dakwasị ụmụmmadụ ọsọsọ, bụ ndị nwaworo ịnara nsọpụrụ na mkwanye ùgwù nke dịrị náánị Chineke.

N’ụzọ dị nkénké apụkwara ikwu na mgbe anyị rapụrụ ịmata na anyị apụghị inyere onweanyị aka, na otú o si dị mkpà na anyị gaadabere na Chineke maka inye anyị ike, amamihe, ịdịike, na ike nke Mmụọ Nsọ nime ihe ọ bụla nke anyị naemere Ya, anyị agaghị eme nkeọma n’ihe ahụ nke anyị pụtaworo ime, n’ihi na anyị rapụrụ inye Chineke otuto kwasịrị Ya. Ọ bụrụ na anyị naenwe obiụtọ n’ọlụ nke aka anyị, wee rapụ ịhụ na ọ bụ Chineke mere ka ọ dị mfé ma gaa kwa nkeọma n’ụzọ niile, ihe ahụ dịkarịsịrị ntà nke anyị naeme naewute Mmụọ nke Chineke. Òlee otitemmanụ nke Mmụọ Nsọ, maọbụ ịmejun’ike nke anyị gaele anya inweta maọbụ ijigide, ma ọ bụrụ na anyị arapụ ịsọpụrụ Chineke site n’ịnata nye onweanyị otuto ahụ nke bụ nke Ya -- ọbụná n’ụzọ dịkarịsịrị ntà? Okwu Chineke pụtaraìhè karịa ọbụná n’akụkụ a -- ma náeweta amamikpe n’ebe ọ dị ukwu -- n’ihi na ọ naakpali inwe obiabụọ banyee nzọpụta anyị pụọ ná mmehie ma ọ bụrụ na anyị naachọ ma naanara kwa otuto nke ụmụmmadụ. Nime Baịbụl anyị gụrụ: “Ùnu onwe-unu si aña pu ikwe, ebe unu nānara otuto n’aka ibe-unu, ma otuto nke si n’aka Onye ahu Nke nání Ya bu Chineke bia unu achọgh?” (Jọn 5:44). Onye dere Abù Ọma dere: “Madu adigh-anọgide na nsọpuru: O yiri anu nke meeworo ka ha debe ọnu-ha du n’ọnwu” (Abù ọma 49:12). Mgbe Setan nwara Jisọs, náagwa Ọkpara nke Chineke ka Ọ kpọọ isiala nye ya, Jisọs zara ya si: “Onye-nwe-ayi Chineke-gi ka I gākpọ isi ala nye, ọ bu kwa nání Ya ka I gēkpere” (Matiu 4:10).

Omume ndị Listra mere bara urù ka atụlee ya n’ebe a. Agwara ha ozi nke Oziọma ahụ. Ha fere ihe ekèrèekè òfùfè, kama Onyeòkìkè, ma ndịkom nke Chineke ahụ gbochịrị ha ifè ụdị òfùfè dị otú ahụ. Ma ọ bụ ihe pụtara ìhè na eritaghị mkpụrụobi ndịa n’urù rue ezi òfùfè ahụ; n’ihi na mgbe ndị Juu ahụ náekweghịekwe sitere n’Aikọniọm na Antiọk bịa, arafuru ndị Listra ngwangwa megide ihe ahụ niile nke ha hụworo. Ndị ahụ bụ ndị hụworo ọlụebube nke Chineke n’oge náadịghịanya chịgharịrị ugbu a na nnupụisi zuruòkè megide Chineke ahụ na ndị náejere Ya ozi. Atụrụ Pọl nkume wee rapụ ya n’ọnọdụ onye nwụrụanwụ.

Mmeri Site N’ihe Yiri Ọdịda

Nyoba anya n’ihe nkiri ahụ dị n’iru anyị: ndịkom abụọ nke Chineke ndị kwesịrị ntụkwasịobi, ndị ọgbakọ nke ndị ahụ kwereekwe gbara gburugburu bụ ndị ọ tụrụ n’anya ịhụ ike ahụ nke meworo ka nwoke onyengwụrọ ahụ bilie wee nwe kwa ike zuruòkè. Ìgwè mmadụ ndị naele anya, náeti kwa óké mkpu nke otuto ebe ọ bụ na arapụrụ ha ijeso ọchịchọ dị icheiche nke anụarụ ha, ka onye nke Chineke ahụ mere ngwangwa gbochie. Ndịọzọ nke náabịru nsọ ndịa bụ ndị ahụ bụ ndịisi n’ajọomume na n’ịjụ Chineke, ndị ọ naatọ kwa ụtọ ime ndịkom ahụ iheọjọọ bụ ndị wetara ozi banyere Kraist onye si n’ọnwụ bilie. Mgbe ahụ ekwuruokwu olenaole. Echefuru ọluebube ahụ. Agọnarịrị ike nke Chineke. Atụrụ otù nkume -- mgbe ahụ ọtụtụ nkume ka atụrụ onye nke Chineke ahụ onye náenweghị ihe ọ bụla o mere iji guzogide agha nke ha naebuso ya. Ọgbakọ ahụ nke ndị kwereekwe ndị emererị ka ha gbasasịa na nwa oge, mere ngwangwa wee gbakọta gburugburu mgbe ha nwere ike ime otù a n’enweghị nsogbu, n’ebe onyendú ha daraada nọ.

Chee ihe banyere enyi Pọl, bụ Banabas. Ya onweya, dịka onye Livai site n’ọmụmụ, ahụwo ọkpụkpọòkù na ọlụ dị ukwu nke ọgbọ nke Oziọma ahụ, wee ree ihe niile o nwere na Saiprọs ma weta kwa ego dum o retara na ya nye Ndịozi -- ọ bụghị nye ndịisi nke Ụlọukwu Chineke -- wee were óké ịnụọkụn’obi malite ịbụ onye náesoụzọ Kraist nke rapụrụ ezigbo iheàtụ nke anaagaghị echefu n’elu ụwa. Ọ bụ ya kpọtara Pọl gosi ụmụnna ndị nọ na Jerusalem mgbe ha naatụ ya egwù n’ihi mkpagbu nke ọ naakpagbu Nzukọ Kraist. Asị na Banabas bụrị náánị onye náekpe okpukpé n’egbugbereọnụ nke náatụkwasị obi náanụarụ, eleghịanya ọ gaecheworị na ya kwesịrị inwe ùgwù na nsọpụrụ dị elu karịa n’ihi ozi niile nke ya na ndịozi mbụ ahụ jewororị. Ma ụdị ọlụ ndịa niile nke anụarụ bụ ihe anaahụghị nime obi na ndụ ya, n’ihi na ọ pụtara ìhè na Banabas jikeere iso odudu nke Pọl. Ọ hụrụ ike nke Chineke na ndụ nwoke ahụ dị ókéọnụahịa. Ma ugbu a, onyendú ahụ tọgbọrọ n’ala, ebe ejiri ọtụtụ nkume tụkasịa ya arụ, arụ ya nke etipụtara ọnyá nke náagba kwa ọbara nọ duu bụrụ kwa ihe tọgbọrọ dịka ozù.

Ma na mberede ahụrụ ihe náegosi na ndụ ka dị nime ya! Mmegharị arụ wee dị! Mbilite! Onye nke Chineke ahụ guzo kwa n’ụkwụ ya ọzọ, nlekọta ọma nke ịhụn’anya amalitewo kwa, dịka ndịorù nke Chineke ndị nyebigara onwe ha n’ijéozi na ndị nwapụtaworo urù dị nime Chineke pụrụ ime nye onyeozi nke Obe, onye dị umeala, nke Chineke rọpụtakwara. Pọl wee malite ịgaijè! Alụwo kwa ọlụebube ọzọ! O wee malite kwa ọzọ ikwusa ike ahụ nke dị nime Oziọma nke Jisọs Kraist.

Mkwusanjégharị mbụ a nke Pọl náejerubeghị ọkàrà alụpụtawo ọlụ dị ukwu nye Alaeze ahụ ma kpalie kwa ọnụma nke ndị náesoụzọ Setan, ma ọ ka fọdụkwara ọtụtụ ebe nke agaejeru. Pọl na Banabas etufughị oge ịhụ na ha tinyere uche n’ịlụọlụ nke Nna ha. Ha bụ ndị náadịghị atụegwù n’ihi Chineke, Chineke sọpụkwaara ọlụ ha lụrụ nye Ya.

Mgbe ikpeazụ nke ijè ha bịara na mmezu, ndịkom nke Chineke ahụ ñurịrịọñụ nime mnwekọ nke ha na ụmụnna nime Kraist ndị nọ ná Antiọk nwere. N’ebe ahụ, ha kọrọ akụkọ ha banyere ihe niile Chineke lụworo, na azọpụtara ọtụtụ mmadụ wee duba kwa ha nime omimi nke ngọzi nke imemmụọ, na agwọrọ ndịọrịa, na onyeiro kpalikwara ndịmmegide iji mee ka ozi Chineke ghara ịga n’iru. Ha weghachitekwara akụkọ banyere ike nke Chineke n’ịnapụta na n’ime ka ihe gaa nkeọma.

Ọ bụ ezie na Pọl na Banabas nwere iheàmà pụtara ìhè banyere mkwagide nke Chineke nye ijéozi ha na ụzọ niile nke ha si jee ozi ahụ, ndị mkwusanjégharị abụọ ndịa matara nkeọma ihe bụ ọlụ ha n’ebe ndị ahụ nọ bụ ndị Chineke duziworo izipụ ha na ité ha mmanụ maka ọlụ nke mkwusanjégharị ahụ. Ha emeghị omume dịka ndị náachị onwe ha kama ha laghachiri ná Antiọk bụ isi nke nzukọ ha mgbe ejesịrị ijè ahụ. “Ha na ndi na-eso-ụzọ Jisọs we nọgide ọ bugh nwa oge,” náenwetaghachị ike nke mmụọ na nke anụarụ mgbe ha jesiri ogologo ijè ahụ nke siriike, n’otù mgbe ahụ kwa ha wee náagba ụmụnna ume, náakasị kwa ha obi bụ ndị nụrụ ihe ha kwuru.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. 1 Chọpụta nime “map” Ụzọ nke Pọl siri jeeijè mbụ nke mkwusanjégharị ahụ.

  2. 2 Òlee ndị, na ebe nzukọ nke ndị mkwusanjégharị ahụ bu ụzọ jekwuru?

  3. 3 Kọọ ihe anyị maara banyere Banabas, obodo nke aka ya, ọnọdụ nke o nwere nime ijéozi nke òfùfè n’ihi ihenketa nke èzínaụlọ ebe amụrụ ya, ihe pụtara ìhè nke o mere banyere ihe o nwere na Saiprọs, na omume nke o mesoro Pọl ná mmalite na nime ijè a.

  4. 4 N’ụzọ dị añaa ka Pọl na Banabas siri rubere Jisọs isi mgbe mkpagbu bịara?

  5. 5 Gịnị bụ ọlụebube nke alụrụ na Listra? Kọwaa otú o si metụ ndị obodo ahụ n’arụ, ma kwue n’okwu nke gị, ọzịzá Pọl nye ha.

  6. 6 Gịnị mere Pọl na Listra? Onye kpaliri ihe ndị ahụ nke mere?

  7. 7 Gịnị ka ekwuru banyere nzọpụta nke anyị site na mmehie ma ọ bụrụ na anyị naachọ otuto site n’aka mmadụ náabụghị site n’aka Chineke?

  8. 8 Kọwaa ọlụ dị icheiche nke ijéozi nke Pọl na Banabas lụrụ dịka ndị mkwusanjégharị.

  9. 9 Site n’ihe nlereanya ndịa, gịnị bụ ezigbo ọlụ nke onye mkwusanjégharị?

  10. 10 Gịnị bụ ihe ekwesịrị ikwu okwu ọma banyere ya nime nlaghachị nke Pọl na Banabas ná Antiọk?