2 Ndi Eze 6:1-7

Lesson 314 - Junior

Memory Verse
“Ya mere cheta ebe I siworo dapu, gi chèghari kwa, lu kwa ọlu mbu” (Nkpughe 2:5).
Notes

Ụlọakwụkwọ nke Ndịamụma

Elaisha bụ Onyeamụma nyere oge ya niile n’ịlụọlụ Chineke. Agwara anyị na otù nime ọlụ ya niile bụ ịbụ Onyeisi nke ụlọakwụkwọ ndịamụma. Ụmụ okorọbịa ndị chọrọ ịmụta ihe banyere Chineke n’ụzọ dị omimi, Ya na okpukpé O nyere ụmụ Israel náaga ụlọakwụkwọ ahụ.

Elaisha bụ onye kwesịrị ịnọ n’ọnọdụ a, n’ihi na ike nke Chineke dị ná ndụ Ya. Ọ pụrụ ịkụzirị ụmụ okorọbịa ahụ ụzọ esi adị ndụ nye Chineke na otú apụrụ iji gwa ndịọzọ ihe banyere ezi okpukpé. Elaisha ferè Chineke n’ụzọ mere O ji nụ za kwa ekpere Ya.

Ụbọchị Mkwafè

Otù ụbọchị Ụmụ ndịamụma kpebiri na ha chọrọ ịkwafè gaa n’ebe ọnọdụ gaaba ha. Elaisha gwara ha ka ha gaa n’iru; ma ha achọghị ịrapụ ya. Elaisha ekpeworo ha ekpere mgbe ha nọ ná nsogbu. Náarụghịụka ọ bụrụwo onye náatụte mmụọ ha site ná ndụ ọ naebi; site kwa n’ike Chineke dị na ndụ ya o mere ka ha nwere iheoriri mgbe ọ náadịghị nri ha nwere. Ha chọrọ ka ha na Ya soro n’ihi enyemaka nke imemmụọ na nke anụarụ.

Elaisha jikeere ịga, ụbọchị wee rue mgbe ndịkom niile nọ n’ụlọakwụkwọ ahụ kwakọtara ihe niile ha ji biri wee jee n’ụsọ Osimiri Jọdan. Ọ dịghị ụlọ ọ bụla ha pụrụ ịbànye n’ime ya, ya mere onye ọ bụla malitere ịlụọlụ nke igbutu osisi na idozi ha iji wue ụlọakwụkwọ na ụlọ obibi ha.

Isianyụike Ahụ Furuefu

Otù nwaokorọbịa wee malite iji ume ya niile igbutu otù osisi, ma isianyụike ya fepụrụ wee daba nime Osimiri Jọdan, ọ gaamataworị na isianyụike ahụ esighị ike n’arụ ihe eji ejide ya. Ọ gaghịadapụworị ma ọbụrụ na osiriike, ma o dozighị ya mgbe o kwesịrị n’ihi nke a o wee dafue. Gịnị ka ọ pụrụ iji náánị ihe eji ejide anyụike mee? Nke ka njọ bụ na arịọtara anyụike ahụ arịọta. Nwoke a abànyewo ná nsogbu, ma ọ matara ebe ọ gaeje nweta inyeaka.

Lee otú nwa okorọbịa ahụ gaenweworị izuike nke obi n’ihi na Elaisha soro ha! O wee gbaa ọsọ jekwuru onyeamụma ahụ ịkọrọ ya akụkọ nhụjuanya ya. O kwetara na ya etufuwo isianyụike ahụ, na ya chọkwara inyeaka.

Òlee otú ọ gaadị ma asị na ndị amụma ahụ arịọghị Elaisha ka o soro ha jee? Ụmụ ndị amụma ahụ agaghị enweworị okwukwe zuruezu iji nweta inyeaka n’ebe Chineke nọ, Ọ dị mgbe ị naechè échìchè banyere otú ọnọdụ enweghị inyeaka gị gaadị ma ọbụrụ ma i kpebie isi n’ebe ndị nke Chineke nọ pụọ wee rịa ọrịa maọbụ nwee nsogbu ọzọ, ebe ọ dịghị onye ọ bụla nọ nsọ inyere gị aka kpeeekpere?

Ịrapụ Ụlọ Chineke

Ụfọdụ mmadụ naefè Chineke n’ikwesị ntụkwasịobi n’ụlọ Ya nwa oge, wee nata ngọzi Ya. Ma mgbe oge ntà gasịrị ezi ihe niile Chineke nyere ha wee ghara ịbụ ihe ókéọnụahịa n’anya ha ọzọ. Ha wee chéfue na eziihe niile ndịa sitere n’ebe Chineke nọ bịa, na o kwesịrị ka ha gosị obi ekele ha site n’iwere obi ha niile jeere Chineke ozi.

Ha pụrụ ísì n’ebe ndị Kraist nọ pụọ n’ihi ihe náadịghị mkpà dịka ezi ọlụaka ebe agaakwụ ha ego buruibu. Gịnị naeme mgbe ha banyere nime nsogbu? Ọ dịghị onye naanọ nso ikpere ha ekpere. Eleghịanya ihe ha gaetufu nime nsogbu ha gaakarị urù ha ritara nime ọnọdụ ọhụụ ha. Site kwa náenweghị ndị Kraist ọ bụla pụrụ isoro ha nwee mmekọrịta, kparịta kwa ụka banyere ihe nke Onyenwe anyị, o nwere ike bụrụ na ha ekwewo ka ịhụn’anya Chineke si ná ndụ ha pụọ.

Baịbụl naagwa anyị ka anyị ghara kwa ịrapụ nzukọ nke onweanyị, dịka ụfọdụ naeme (Ndi Hibru 10:25). Anyị naenweta ike na agbamume site n’isoro ndị Kraist ọzọ zukọ, ya na ikpekọrịta ekpere na ifè òfùfè n’otù ebe.

Inyeaka Nime Nsogbu

Mgbe nwaakwụkwọ ahụ isianyụike ya dafuru gwara Elaisha ihe mere, Elaisha jikeere n’otù mgbe ahụ inyere ya aka. Ọ jụrụ sị “òlee ebe ọ dara?” Mgbe egosịrị ya ebe ahụ, o wee gbutue otù osisi, tụba ya nime mmiri ahụ ebe isianyụike ahụ dabara, ígwè ahụ wee see n’elu mmiri.

Ọ dịghị mgbe ọ bụla ígwè ahụ gaeseworị n’elu mmiri ma -- ọ bụghị site n’ike nke Chineke; Chineke ga -- eme kwa ihe mmadụ náapụghị ime nye ụmụ Ya ndị tụkwasịrị Ya obi. Ihe niile ekèreekè naanụ olu Chineke ha gaerubekwara iwu Ya isi.

Akwụkwọnsọ agwaghị anyị na Elaisha kpereekpere n’oge a, kama anyị amụwo na ọ nọnyere Elaija rue mgbe ewepụrụ ya gaa n’Eluigwe ka o wee nweta okpukpu abụọ nke ike Elaija. Ọ natawo ihe ọ chọrọ, ike ahụ si kwa n’ebe Chineke nọ bịa. Ya na Chineke naakparịta ụkà mgbe niile. Ọ bụ kwa site n’ike ahụ ka ọ lụrụ ọtụtụ ọlụ ebube.

Ebere nke Chineke

Ihe nke a mere naegosi ebere Chineke nye ndị niile gaakpọku Ya mgbe ha nọ nime nsogbu. Ọ pụrụ ịbụ na ọ dịwo mgbe mmadụ hụrụ Onyenwe anyị n’anya, ma ọ daghachịazụ. Ọ pụrụ ịga n’iru wee naemezu omume niile anaeme n’ifè Chineke, dịka nwoke a naegbu osisi gaagaworị n’iru naefé ihe ahụ eji ejide isianyụike. Ma anyị maara na iji náánị mkpan’aka ahụ kụọ n’arụ osisi apụghị igbutu ya. Otú a ọlụ anyị nye Chineke apụghị ịbà urù ọ bụla ma ọbụrụ na anyị enweghị Mmụọ nke Chineke na ndụ anyị. Jisọs sịrị: “Unu apugh ime ihe ọ bụla ma Mu anọgh ya” (Jọn 15:5). Ọ dị anyị mkpà ka Onyenwe anyị nọnyere anyị, ji kwa anyị lụọọlụ mgbe anyị naefè Ya.

Ma olileanya dịrị onye ọ bụla tụfuworo Mmụọ nke Chineke, nke mbụ ọ ghaghị ikwere na ya etufuwo ya, kama ịchọ ụzọ ikpuchi maọbụ nye ihengọpụ banyere ya. Mgbe ahụ ọ bụrụ na ọ gaarịọ Onyenwe anyị ka O meere ya ebere gbaghara kwa ya, agaeweghachị ịhụn’anya nke Chineke nime ya. Nwoke ahụ náegbutu osisi mere ngwa ikweta na isianyụike ya efunarịwo ya, o wee nwee mnwute n’ezie na o fuwo, n’ihi na ewo! ọ bụ ihe arịọtaraarịọta.

Ihe ọ bụla anyị nwetara site n’ebe Chineke nọ bụ ihe enyere anyị ijide. Anyị naejide ngọzi niile O nyeworo anyị dịka ndịnlekọta. Anyị bụ ndị orù ilekọta ọlụ Onyenwe anyị anya nime ụwa nke a. Lee otú ọ dị mkpà na anyị gaamata ọnụahịa nke ihe Chineke nyeworo anyị, were kwa ezi nleruanya jide ya! Ọ bụrụ kwa na ọ dị ihe mere ka o funarị anyị, ngwangwa anyị gaeji ịnụọkụn’obi rịọ Chineke ka Ọ gbaghara anyị nye kwa anyị iruọma Ya ọzọ.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. 1 Gịnị bụ ọkwa Elaisha n’ụlọakwụkwọ nke ndịamụma?

  2. 2 Gịnị ka ụmụakwụkwọ ahụ chọrọ ime?

  3. 3 Òlee ebe Elaisha jere?

  4. 4 Gịnị mere mgbe ụmụakwụkwọ ahụ naewu ụlọ?

  5. 5 Gịnị ka nwaokoro onyeamụma ahụ náenweghị obiụtọ mere mgbe ọ nọ ná nsogbu?

  6. 6 Òlee otú Elaisha si wee nyere ya aka?

  7. 7 Gịnị bụ ọlụ anyị nye Onyenwe anyị nime ụwa nke a?

  8. 8 Gịnị bụ ihe dị mkpà ná ndụ anyị ka, anyị wee lụọra Onyenwe anyị ọlụ?

  9. 9 Òlee otú anyị pụrụ iji wee gbarịta ibe anyị ume nime okwukwe a?

  10. 10 Gịnị ka onye daghachiworoazụ pụrụ ime iji nata iruọma Chineke ọzọ?