Lesson 315 - Junior
Memory Verse
“Mọ-ozi nke JEHOVA nāma ulo-ikwu-ya gburugburu ndi nātu egwù Ya, Ọ we dọputa ha” (Abù Ọma 34:7).Notes
Agha Nke Onyenwe anyị
Mba Israel malite kwara ifè ezi Chineke òfùfè; ndị ahụ, ọbụná eze Israel, naaña Elaisha onyeamụma Chineke ntị. Elaisha emewo ka amara ya dịka óké ngọzi nye ndị ahụ, site náijégharị n’etiti ha náalụ ezi ọlụ: nke bụ ịgwọ ndị ọrịọ, inyere ndị nọ ná mkpagbu aka, na ime ọbụná ka ndị nwụrụanwụ bilie.
Oge ruru mgbe Ben-hedad bụ eze Siria, gbalịrị imeri Israel ọzọ. Mgbe ụfọdụ Chineke ekwenyewo ka ndị Siria tigbue ala Israel mgbe Ụmụ Israel naefè arụsị; ma ugbu a ha naaña ntị n’olu nke onyeamụma Chineke, O jikeere iburu ha agha.
Eze Siria gbalịrị iché ndịagha Israel anwụ, ma ọ dịghị onye Israel ọ bụla náabịaru nso ebe ndị Siria zoro. Ha siri n’otù ebe nzuzo jee n’ebe ọzọ ma ndị Israel niile esighị n’ebe ọ bụla ha naeche anwụ gabiga. Ben-hedad wee kpebie na ọ dị onye náagbaama site n’ọmụma ụlọikwu ya nke náadọ Ụmụ Israel akanántị banyere ebe ihe izendụ dị.
Ọ dị onye náagwa eze Israel banyere àtụmààtụ niile na izu nzuzo nke Ben-hedad, ma ọ bụghị onye ọgbaama sitere na Siria. Ọ bụ Chineke naegosi ya Elaisha, Elaisha wee náagwa eze. Otù nime ndị orù Ben-hedad wee sị ya: “Elaisha, bú onye-amuma nke nọ n’Israel, ọ gēgosi eze Israel okwu niile nke i nēkwu nime ulo-ndina-gi.” Chineke pụrụ ikpughe ihenzuzo anyị chere na mmadụ ọ bụla amaghị. Jisọs sịrị: “Ọ digh ihe ọ bula ekpuchiworo ekpuchi nke anāgagh-ekpughe; ọ digh kwa ihe ezoro ezo nke anāgagh-ama” (Matiu 10:26).
Ben-hedad gaje ịmụta na Chineke naeburu Israel agha site ná mbili mmegide nke a o biliri, ọ gaahụ kwa na ọ baraghị ha urù ịnwa ibuso Chineke agha. Ọ bụrụ na Chineke dinyere anyị, ònye gaemegide anyị?
Ndịagha Naachụso Onyeamụma
Ihe mbụ ndị Siria mere bụ ịchọ ụzọ ibibi onyeamụma Chineke ahụ nke naekpughe ihenzuzo ha. Nime ọtụtụ ọgbọ gabigara agabiga ọtụtụ mmadụ agbalịwo ibibi okpukpé nke Onyenwe anyị Jisọs Kraist, gbue kwa ndịndú ya amaara aha ha. Ha agbaliwo ịkwagide ụmụmmadụ ka ha gọnarị okwukwe ha site n’inye ha óké mkpagbu. Otú ọ dị, Oziọma agawo n’iru site n’ike baraụba. Ọ dị ka ndị ahụ akpagbuworo n’ụzọ kachasị ilu bụ ndị jisiworo eziokwu nke Okwu Chineke ike karịa. Ọtụtụ ndị kwereekwe n’ezie esorowo ná ndị mkwusa eziomume ekwutọworo kọcha kwa.
Ndị mbụ malitere ịgbasa Oziọma bụ ndị jere n’obodo ndị na ekpere arụsị tufuru ndụ ha mgbe ụfọdụ nime mgbalị ha ikwusa banyere Kraist, ma ọ bụ ihe anaekwu n’ezie si, “Ọbara nke ndi egburu n’ihi Kraist bu mkpuru-Ọghigha nke nzukọ Kraist.” Ebe ụfọdụ nwụrụ, ndịọzọ esorowo wee mee ka eziokwu nke Baịbụl guzosieike.
Ben-hedad zigara ụsụ ndịagha ijé Dọtan ịchọ Elaisha -- otù ụsụ ndịagha imegide náánị otù nwoke. O yiri agha nke náaraghịnrata. Ma Chineke ekwewo mkwà sị: “Otù nwoke nime unu nāchu nnù ndikom abua na ọgu iri: n’ihi na JEHOVA, bú Chineke-unu, Ya onwe-ya bụ Onye nāluru unu ọgù, dika Ọ gwara unu okwu” (Joshua 23:10). Nke a bụ agha dịrị Onyenwe anyị, Ọ gaje kwa inye otù nwoke mmeri.
Orù nke Egwu Naatụ
N’otù isi ụtụtụ, orù Elaisha wee si nime ụlọ ha pụta ma jijiji ịhụ ụsụ ndịagha Siria ka ha mara ụlọikwu ha gburugburu obodo ahụ. Ịnyịnya na ụgbọala nke ndịiro jupụtara ebe dum. Óké ụsụ a bịara ijide Elaisha. Orù ahụ egwù naatụ tirimkpu sị: “Ewó, onye-nwem! àyi gēme aña?”
Egwù ọ tụrụ Elaisha? Ọ tụrụ egwù ihe mmadụ pụrụ ime ya? Elaisha nwere ntụkwasịobi dị jụụ nime Chineke ọ naefè. Chineke ya ọ pụghị imeri n’ọnọdụ ọ bụla? Chineke nke ọ naefè bụ Chineke nke ugwu na ndagwurugwu.
Elaisha amụtawo na “Mọ-ozi nke JEHOVA nāma ulọ-ikwu-ya gburugburu ndi nātu egwù Ya. Ọ we dọputa ya” (Abù Ọma 34:7). Ọ matara na Chineke ahụwo mgbe ndịagha Siria bịara Dọtan, n’ihi na “JEHOVA, anya-Ya nējeghari n’uwa nile, igosi Onwe-ya onye di ike n’akuku ndi obi-ha zuru okè n’ebe Ọ nọ” (2 Ihe Emere 16:9). Elaisha biri ndụ náatọ Jehova ụtọ, ya mere ugbu a ọ nọ n’oge hour nke mkpà o nwere ntụkwasịobi na Chineke gaenyere ya aka. N’ezie Elaisha biri nso Chineke rue na anya ime mmụọ ya pụrụ ịhụ ụgbọala ndị mmụọozi ahụ gbara ya gburugburu. O kpereekpere ka Chineke meghe anya orù ya ka o wee hụ kwa. Chee banyere ọñụ nwa okoro ahụ gaenwe mgbe Chineke gosịrị ya na ugwu niile ahụ jupụtara n’ịnyịnya na ụgbọala ọku, bú ụgbọala ndị mmụọozi guzoro ịdọpụta onye nke Chineke.
Devid ekwuwo ọtụtụ mgbe banyere agha ya niile nke Jehova na eburu ya. Gịnị mere ọ gaeji sogbue onweya mgbe agha ahụ bụ nke Jehova? Otù mgbe ọ sịrị: “Ka ihere me ha, ka etinye kwa ha n’ọnọdụ-ihere bú ndi nāchọsi nkpuru-obim ike: … ka ha di ka igbogbo-ọka n’iru ifufe: ka mọ-ozi nke JEHOVA buru kwa onye nēnupu ha” (Abù Ọma 35:4, 5).
Chee échìchè banyere nchegbu na ndọgbun’ọlụ niile anyị gaanapụta onweanyị site nime ha ma ọbụrụ na anyị ekwe ka Onyenwe anyị naegbo mkpà anyị niile. N’ezie, anyị aghaghị ikwe ka Chineke lụọọlụ dịrị Ya n’ụzọ nke Ya. Ọ mara ihe dị anyị mkpà na ihe dịrị anyị mma karịa otú anyị maara. Lee otú ọñụ naejupụta obi anyị mgbe anyị kwenyere ka Ọ lụọọlụ dịrị Ya! Dịka anyị naekwenye, anyị naemeri.
Ụdị Ụgbọala Abụọ
Tụlee ihe banyere ụdị ụgbọala abụọ ahụ. Mmadụ pụrụ ịhụ nke ndị Siria. Ejiri ihe siriike dịka igwè na osisi wuo ha. Ịnyịnya ndị Siria dị ike dị kwa mma ileanya nkeukwu. Ndịa bụ ihe naeme ka mmadụ cheè na ya dịike. Anya mmadụ apụghị ịhụ inyịnya na ụgbọala nke Chineke. Ma òlee nke ka ike nime ha abụọ? Òlee nke ị gaachọ ịtụkwasịobi gị na ya, ọbụ nime ụgbọala nke mmadụ ị pụrụ ịhụ anya, ka ọ bụ ụgbọala nke Chineke ị náapụghị ịhụanya.
Ọtụtụ mmadụ n’ụbọchị taa naatụ egwù ịtụkwasị Chineke obi n’ihi na ha apụghị ịhụ Ya anya. “Ihe anāhu anya nādiru nwa oge; ma ihe anādigh-ahu anya di ebigh-ebi” (2 Ndi Kọrint 4:18). Ụlọ anyị naebi nime ha, okporoụzọ anyị naejeijè n’elu ya, nri anyị naeri, ọbụná anụarụ nke mmụọ anyị naebi nime ya gaje ịgabiga. Ndịa bụ ihe anyị naahụ anya, ma ha agaghị anọgide.
Ugbu a, cheè kwa banyere olileanya ndụ ebighịebi anyị nwere. Azọpụtawo mkpụrụobi anyị n’ụzọ anyị náapụghị iji anya anyị hụ, ma anyị matara nkeọma mgbe o mere. Anyị wee ghọọ ndị ekeworo ọhụụ nime Kraist, wee mata na ndụ ebighịebi amalitewo nime anyị. Ndụ ebighịebi pụtara na anyị gaadị ndụ náadịghị agwụagwụ, dịka Chineke naadị ndụ. Ọ gaghị agwụagwụ. Nke a ọ bụghị ezi ihe karịa ihe anyị naahụ anya nke gaapụ n’anya ná nwa oge? “Uwa nāgabiga kwa, ya na agu ihe ọjọ ya: ma onye nēme ihe Chineke nāchọ nānọgide rue mgbe ebigh-ebi” (I Jọn 2:17).
Ịgba n’Elu Igweoji Dịka Ịnyịnya
Mgbe anyị naatụ ụjọ wee malite ịtụle ma anyị pụrụ imeri onyeiro nke mkpụrụobi anyị, ka anyị cheta na “ọ digh onye di ka Chineke, gi Jeshurum, Onye elu-igwe nēbu dika inyinya n’iyere gi aka, Onye mbara-ìgwe nēbu kwa nime nbili-elu-Ya” (Deuteronomi 33:26). Anyị bụ ụmụ Ya Ọ naelekọta. Ọ chọrọ ka anyị soro Ya gba dịka n’elu ịnyịnya. Aisaia sịrị: “N’igwe-oji nke nāgba ọsọ ka JEHOVA nānọkwasi dika inyinya” (Aisaia 19:1). N’ezie nke a bụ okwu ekwuru n’ụzọ ihe eji atụnyere ihe, ma Chineke chọrọ ka O gosi anyị na ihe nke ndụ a adịghị óké mkpà. Ọ bụrụ na anyị naeso Chineke naejeijè náekwurịta kwa okwu, náatụkwasị kwa Ya nchègbu anyị niile, anyị agaghị ekwe ka ibu nke ndụ a mee ka anyị ruru ala. “Ugo nke naefe n’elu adịghị echegbu onwe-ya ụzọ ọ gaesi gafee osimiri.”
Ndụ nke anaebi n’iji ihe niile nyefe n’uche Chineke bụ ndụ dị ụtọ. Devid kpereekpere sị, “I gēme ka m’mara uzọ ndu: ojuju-afọ ọñụ di n’iru Gi; E! utọ di iche iche di n’aka-nri-Gi ebigh-ebi” (Abù Ọma 16:11).
Ịhụ Ndịiro Gị N’anya
Mgbe ndịagha Siria rịdatara izute Elaisha, o jikere chere ha. O jighị mmagha buso ha agha; ọ kpọkughị ụgbọala nke Chineke ibibi ndị Siria. Elaisha abụghị onyeamụma nke ikpé. O gosiri obiọma, ọbụná nye ndịiro ya. Ekwuwo banyere ya dịka onye yiri Kraist. Mgbe Jisọs nọ n’ụwa Ọ sịrị na oge ahụ abụghị oge ikpé, ya mere O siri n’ebe ndị náemegide Ya nọ wezuga onweYa. O ziri ndị náeso Ya sị: “Nāhunu ndi iro-unu n’anya, nāgọzinu ndi nābu unu ọnu, nēmenu ihe-ọma nye ndi nākpọ unu asì nēkpe kwa ekpere nye ndi nēsogbu unu” (Matiu 5:44).
Elaisha kpereekpere ka Chineke were ìsì tie ndịagha Siria; o wee duru ha jee n’isi obodo bụ Sameria, we rịọ Chineke ọzọ ka O meghe anya ha. O wee guzoro n’iru ha bú nwoke ahụ ha naachọ. Ma ugbu a ha nọ n’okpuru ike ya, n’etiti Ụmụ Israel. Eze Israel chọrọ ka ọ laa ha n’íyì n’otù mgbe ahụ, ma Elaisha zara ngwangwa sị: “Etigbula ha: ì gētigbu ndi i wereworo mma-agha-gi, were kwa uta-gi, dọta n’agha? dọba nri na miri n’iru ha, ka ha we rie, ñu kwa, lakuru onye-nwe-ha.” Lee óké ịhụn’anya o gosiri ndịiro ya! Ọ ghọwo iwu gazuru obodo anyị niile mepereemepe na agaghị emeso ndịmkpọrọ adọtara n’agha mmeso ọjọọ; ma Elaisha gara n’iru karịa nke a, wee zilaga ndịagha Siria ka ha laa n’ụlọ ha.
Obi tọrọ ndị Siria ụtọ n’ihi ezi mmeso a emesoro ha, ha wee kwụsị mbili agha ha megide Israel nwaoge.
Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE1 Òlee ndị biliri agha megide Israel?
2 Òlee otú ha si tụọ àtụmààtụ ibu agha ha?
3 Gịnị mere àtụmààtụ ha ji ghara ịga nkeọma?
4 Ònye naeburu Israel agha?
5 Ònye ka ezigara ijide Elaisha?
6 Gịnị mere egwù atụghị Elaisha?
7 Ihe mgbochi dị aña ka Chineke kwere anyị ná mkwà n’oge nsogbu?
8 Òlee otú anyị gaesi meso ndịiro anyị?