2 Ndi Eze 6:24-33; 7:1-20; 8:1-16

Lesson 316 - Junior

Memory Verse
“Nwata ka m’buworo aghọwokwam okenye; ma ahughm onye ezi omume ka arapuru ya, Ahughkwam nkpuru-ya ka ha nāriọ nri” (Abù Ọma 37:25).
Notes

Samaria

Jehoram, bụ eze Israel, biri n’obodo Sameria. Ọ bụ eze n’alaeze nke ugwu nke ebo iri nke Israel dị nime ya. Samaria, bụ isi obodo nke alaeze ahụ ka ewuru n’elu ugwu (I Ndi Eze 16:23, 24). Ụdị ọnọdụ ahụ gaabara obodo ahụ urù nke ukwu megide ndịiro ha n’ihi na ndị nché gaenwe ike ịhụ onye ọ bụla site n’ebe dị anya.

N’ụbọchị Ehab, Ben-hedad, bụ eze Siria, akpọkọtawo ndịagha ya ibuso Sameria agha (I Ndi Eze 20:1). Ben-hedad nwere ndịeze iriatọ na abụọ inyere ya aka. Chineke nyeere Ụmụ Israel aka mgbe ha busoro ndịiro ha agha. Egburu ọtụtụ ndị Siria, Ben-hedad, bụ eze gbalagara.

Ehab nwere ohere ibibi Ben-hedad bụ onyeiro Chineke na ndị Ya. Kama nke ahụ, Ehab na Ben-hedad gbarandụ, o wee kwenyere ya ka ọ laghachị n’ụlọ ya. Ọ tọghị Chineke ụtọ na Ehab rapụrụ onyeiro ahụ ka ọ gbalaga. Ewee gwa Ehab na ya na ndị ya gaata ahụhụ n’ihi emeghị nkeọma ya. (Lee Iheọmụmụ 299).

Ụnwụ

Eze ndị Siria bịara ọzọ ibu agha megide Ụmụ Israel. N’iheọmụmụ garaaga, anyị mụrụ otú Chineke jiri chebe ma napụta kwa onyeamụma Ya mgbe ndịagha Siria gbaworo obodo ahụ nke Elaisha nọ gburugburu. Ha enweghị ike ijide Elaisha n’ihi na Chineke nọnyere ya.

Ben-hedad, bụ eze Siria, kpebiri ọzọ ịgbalị inweta obodo Sameria. Àtụmààtụ ya bụ ịgba ugwu ahụ gburugburu, gbochie ihe ọ bụla ịbata, wee mee ka ụnwụ dị n’obodo. N’ụbọchị ndị ahụ, mmadụ niile biri n’obodo ma náewebata nri site n’ubi ha. Mgbe onye ọ bụla náapụghị isi n’obodo pụọ maọbụ bata nime ya n’ihi ndịiro, ụzọ esi enweta iheoriri wee talata nke ukwuu. N’ikpeazụ ụnwụ wee dị na Sameria. Ọ dịghị kwa iheoriri dị ma ọbụghị ihe niile ahụ agụrụ dịka ihe náadịghị ọcha irieri, ọnụahịa ha dị kwa ukwu karị nke ọtụtụ mmadụ pụrụ ịkwu. Ndị Israel wee nọdụ n’óké mkpà nke iheoriri o wee dị ka ha gaanwụ n’ihi agụụ.

Mkwà

Jehoram, bụ eze Israel wee taa Chineke ụta n’ihi nsogbu a. Anyị agụtaghị na Jehoram rịọrọ onyeamụma ka o kpeeekpere maọbụ na eze kpọkọtara ụmụmmadụ ka ha gaa n’ekpere. Náagbaghịagụgọ Chineke gaenyeworo harị aka ngwangwa ọ bụrụ na ha kpọkuru Ya ma kpeeekpere. Jehoram wee kpebie ime ihe ụfọdụ karịa ichere ka Chineke napụta ha. O wee chọọ igbu onyeamụma Chineke, ma nke ahụ atụghị Elaisha ụjọ. O wee bue amụma sị: “Dika mgbe a echi agēre otù mgbé utu ọka flour otù shekel, na mgbé barley abua otù shekel, n’ọnụ-uzọ-ama Sameria.” N’otù ụbọchị ka mgbanwe dị otú a gaadị site na agụụ baa n’ịbaụba nke iheoriri! Site n’ọnụahịa dị elu nke iheoriri náadịghị ọcha rue n’ọnụahịa dị ala nke iheoriri kachasị mma! Òlee otú nke a agaesi pụ imeeme?

Obiabụọ

N’ụbọchị taa, ụmụmmadụ naanọgide náenweghị ndidi mgbe ụfọdụ karị ikpeekpere na ịnọgide n’ịtụkwasị Chineke obi. Ha adịghị anata ngọzi ahụ n’ihi na ha naada mba ọsọsọ.

Devid onye dere Abù Ọma sịrị, “Kpọre uzọ-gi rue JEHOVA aru; tukwasi kwa Ya obi, Ya onwe-ya gēme kwa ya (Abù Ọma 37:5). Mmadụ ndịọzọ dị ndị náadịghị anata ngọzi nke Onyenwe anyị n’ihi na ha naenwe obiabụọ, dịka onye ahụ náenyere eze aka. O kwereghị okwu Elaisha mgbe o kwuru na Onyenwe anyị ekwewo mkwà na iheoriri gaabaụba n’ụbọchị náesonị. Onye náenyere eze aka wee jụọ sị, “Le, ọ bụrụ na JEHOVA eme window n’elu-igwe, ihe a ọ gadi?” N’ihi ekweghịekwe ya, agwara ya na ọ gaewere anya ya abụọ hụ, ma ọ gaghị eri nime ya. Chineke pụrụ imeworị windo n’eluigwe nke apụrụ isite na ya zidata iheoriri. Ma nke ahụ abụghị ụzọ Chineke si rọpụtara ndị Ya n’oge a.

Ná Mkpà

Ndị ekpenta anọ dị, ndị bị n’azụ obodo, dịka Iwu si dị (Levitikọs 13:46). Ha naenweta iheoriri ha site n’aka ndị náebu iheoriri aga n’obodo. Ebe ọ bụ na akamechiri ọnụụzọ emechi ọ dịghị kwa onye anaekwe ka ọ banye maọbụ ka ọ pụọ, ndị ekpenta ahụ nọ ná mkpà nke iheoriri. Ha wee gbakọrịta ikpebi ihe ha gaeme. Ịnọgide ebe ha nọ gaapụtara ha ọnwụ. ịbà n’obodo ebe ụnwụ dị gaabụ kwa ọnwụ. Ọ bụrụ na ha eje n’ọmụmaụlọikwù nke ndị Siria, enwereike igbu ha, ma ha nwere otù olileanya -- ndị Siria nwereike rapụ igbu ha. Ha wee kpebie na ha gaejeru ọmụmaụlọikwù nke ndịagha Siria.

Otù Olileanya

N’ururuchi mgbe ndị ekpenta ahụ naabịaru nsọtu ọmụmaụlọikwù nke ndịiro, ha ahụghị otù nwoke, ọbụná otù onye nché. Ha wee bànye n’otù ụlọikwu. Ọ dịghị kwa otù onye ọ bụla ha hụrụ, ya mere ndị ekpenta ahụ wee rienri nọ n’ebe ahụ n’ihi na agụụ naagụ ha. Ha wee si n’otù ụlọikwu wee rue na nke ọzọ ma ọmụmaụlọikwù ahụ ghere oghe ewezuga iheoriri na ọtụtụ ihe ndịọzọ bara urù.

Ụzọ Chineke

Nke a bụ ụzọ Chineke iji rọpụtara obodo Sameria ihe. Onyenwe anyị emewo ka ndịagha nọ na ọmụmaụlọikwù ndị Siria nụ ụzụ nke náada dịka nke ndịagha naabịaru nso. Ha wee chee na ha nụrụ ụzụ nke ọtụtụ ụgbọala, nke ọtụtụ ịnyịnya na nke igwe ndịagha. Ndị Siria wee si na ọ ghaghị ị bụ na eze Israel egotawo ndịgha ịlụso ha ọgụ. Egwù tụrụ ha, ha we gbalaga n’ihi ndụ ha. Mgbe náadịghị anya ọchịchịrị gaagba, ha echèreghị kwa ka ha chịkọta iheonwunwe ha n’otù. Ha niile wee si n’ọmụmaụlọikwù ahụ gbalaga, rapụ ụlọikwà ha, ịnyịnya ha, iheoriri ha na ọtụtụ ihe ndịọzọ dị ókéọnụahịa. Ha wee mee ngwa pụọ, rapụ ọmụmaụlọikwù ahụ otú o si dị. Ndị ekpenta anọ ahụ bịaruru n’ọmụmaụlọikwù ahụ wee chọpụta na ụlọikwù niile ahụ tọgbọrọ n’efu.

Inwebiga óké

Mgbe ha risịrị ihe, zookwara onwe ha ụfọdụ uwe na ego, ha chètara ndị ahụ bi n’obodo agụụ naagụ. Ndị ekpenta ahụ wee sị: “Ọ bụghị ihe ziri ezi ka ayi onwe-ayi nēme: ụbọchi ta, ụbọchi ozi ọma ka ọ bụ, ma ayi onwe-ayi nāgba nkiti.” Ha wee jee n’ọnụụzọama obodo, ịkọ ihe ha chọpụtara.

Ekpenta Na Mmehie

Mgbe anyị mụrụ ihe banyere ekpenta n’oge garaaga, anyị ghọtara na mgbe ụfọdụ ka anaewe ekpenta dịka mmehie. Òlee otú agaeji ndị ekpenta anọ nọ nime iheọmụmụ anyị a tụnyere ndị mmehie? Ndị ekpenta ahụ ghọtara na ha nọ ná mkpà, mara kwa na ha gaanwụ ọ bụrụ na ha anọgide n’ebe ahụ. Ha wee sị: “Gini mere ayi onwe-ayi nānọdu n’ebe a rue mgbe ayi nwụrụ?” Ha nwere otù olileanya ndị Siria nwereike irapụ ime ha iheọjọọ. Ndị ekpenta ahụ mere karị náánị ikwu ya n’ọnụ efù, ha malitere ime ya eme. Onye mmehie aghaghị ịghọta ọnọdụ ya dịka onye furuefu na onye laran’íyì n’iru Chineke. Ọ ghaghị ịmata na ya nọ ná mkpà, na ịnọgide n’ọnọdụ ahụ gaapụta ọnwụ. Onye mmehie nwere náánị otù olileanya -- Ọbara Jisọs nke pụrụ ịsachapụ mmehie ya niile. Ịmata ihe ndịa ezubeghị. Mmadụ aghaghị ime ha eme. Ọ ghaghị ịbịaru Chineke nso ma chọ kwa iru Ya. Ọtụtụ mmadụ nime ụwa dị, ndị maara na ụzọ ha ezighịezi n’iru Chineke, ha makwara banyere nzọpụta n’otùaka ahụ. Ọ bụrụ na ha nọgide n’ọnọdụ ahụ, agaghị azọpụta ha.

Òlee ụdị mmadụ ị bụ? Azọpụtawo gị? ka ọbụ ọ dị gị mkpà inweta nzọpụta nke Chineke? Ọ bụrụ na ọnọdụ gị dị ka nke ndị ekpenta anọ ahụ nọ n’iheọmụmụ anyị, gịnị mere ị gaghị eso ha kwue sị, “Gịnị mere anyị onwe ayị nānọdụ n’ebe a rue mgbe ayị nwuru?” Gịnị mere ị gaghị ejekwuru náánị otù olileanya ị nwere, nke bụ Jisọs?

Ịgbasa Oziọma

Mgbe azọpụtasịrị mmadụ, onye ahụ erie kwa oriri nke sitere na nri nke Mmụọ Nsọ, ọ naenwe agụụ n’obi ya ịgwa ndịọzọ. Ọtụtụ ngọzi dị nke ọ naachọ ka ya na ndị nọ ná mkpà nke imemmụọ kekọ òkè nime ya. Ọtụtụ ụzọ dị nke mmadụ pụrụ isi gbasa Oziọma. Ọ gaachọ ịgbaàmà, ikwupụta ihe Chineke meere ya. Ọ gaachọ ịgwá ndịọzọ ka ha bịa ụkọ, ya na ụlọakwụkwọ ụbọchị ụkọ. Ọ pụrụ ịgbasa oziọma nke nzọpụta site n’inye mmadụ akwụkwọ náekwu banyere ifè Chineke òfùfè. Náagbaghịagụgọ ị pụrụ ikwu ụzọ ụfọdụ ọzọ nke mmadụ pụrụ iji gwa ndịọzọ banyere Jisọs. Ì naeme otù nime ihe ndịa iji nyere ndịọzọ aka ịchọta Onyenwe anyị? Ihere mee ndị ahụ gaesoro ndị ekpenta ahụ kwue sị: “Ọ bụghị ihe ziri-ezi ka ayị onwe-ayị nēme: ubọchi ta, ubọchi oziọma ka ọ bu, ma ayị onwe-ayị nāgba nkiti!”

Obiabụọ

Ewegara eze akụkọ nke ndị ekpenta ahụ. O biliri n’abalị ya na ndịorù ya wee kparịta kwa ụka. O wee cheè na nke a bụ aghụghọ ndịiro, na ha atụwo àtụmààtụ wee zoo onweha n’ọhịa imegide ha. Mgbe ụfọdụ anaatụ àtụmààtụ dị otú ahụ. Ma eze o chefuru okwu niile nke Elaisha? O doro anya na o nweghị okwukwe na agaenwe iheoriri n’ụba. Otù nime ndịorù ya wee tụpụta ka ezigaa ndịagha rue ọmụmaụlọikwù nke ndịiro wee hụ ihe gaeme. Ya mere, eze zipụrụ ụfọdụ mmadụ, wee sị, “Jenu, hụ.”

Oge ụfọdụ, mgbe mmadụ nụrụ akụkọ banyere Oziọma, ọ naadị ha ka ọ gaghịabụ eziokwu. Ọ dị ka ha nwere obiabụọ nime ha, ọ bụ ezie na Chineke ekwewo ọtụtụ mkwà nime Baịbụl. Mgbe ha nwpụtara Chineke n’onweha, ha naachọta ọtụtụ iheọma, tinyere mmeri n’ebe onyeiro nke mkpụrụobi ha nọ.

Ezi Akụkọ

Ndị náejere eze ozi laghachịrị wee kwupụta na ha hụrụ ụzọ niile ka ha “jupụtara n’uwe na ihe, nke ndị Siria tufuru n’ime ngwangwa ha.” Mgbe ahụ ụmụmmadụ jere n’ọmụmaụlọikwù ndị Siria. N’ebe ahụ ha chọtara iheoriri, uwe na ego dịka esi kọọ akụkọ. Ugbu a enwere iheoriri ebe ọ dị ukwu na Sameria. Erere ya n’ọnụ dị ala, “dika okwu JEHOVA si di.”

Okwukwe Na obiabụọ

Ewee mee ka onye ahụ eze naadabere n’aka ya bụrụ onye náelekọta ọnụụzọama. Ka ndị mmadụ naeme ngwangwa i si n’ọnụụzọama gafee, ha zọkwasịrị ya ụkwụ o wee nwụọ. Nwoke a, onye naekwereghị mkwà nke Chineke, wee hụọ ahụhụ nke ịnwụ ọnwụ. Ndịọzọ nwetara ngọzi nke Onyenwe anyị, n’ihi na ọ naelekọta ndị nke Ya. Ọ bụghị mgbe niile ka Chineke naarọpụtara ndị Ya ihe n’ụzọ dị otú a. Mgbe ụfọdụ Ọ naeziga ha n’ebe ọzọ, dịka O zigara Elaija na Mmiriiyi Kerit n’oge mmiri náadịghị (Lee Iheọmụmụ 296) site n’ekpere nke Elaisha emere ka nwa nwoke nke nwanyị Shunem si n’ọnwụ bilie. (Lee Iheọmụmụ 310.) Mgbe náadịghịanya, oge ụnwụ dị arọ asaa, ezigara ya n’obodo ndị Filistia. Ọ bụghị náánị na Chineke rọpụtara ya ihe n’ụzọ dị otú ahụ, Chineke nyeghachị kwara ya ihe niile o nwere nke ọ rapụrụ. Karịa nke ahụ, enyeghachị kwara ya “iheomume niile nke ubi site n’ụbọchị ọ rapụrụ ala ya.”

Ezi Mkwà

Chineke naarọpụtara ndị Ya. Devid, onye dere Abù Ọma kwuru sị, “Detunu ire, hụ na JEHOVA di nma: … ndi nāchọ JEHOVA, o digh ezi ihe ọ bụla gākọ ha” (Abù Ọma 38:8-10). Otú mkwà Chineke banyere ngọzi ji bụrụ ezie, otú ahụ kwa ka mkwà Ya banyere ikpé si bụrụ.

Ọ dịwo mgbe ọ bụla ị deere duu wee cheè ihe mere Ben-hedad, eze Siria, onye bụ onyeiro nke Chineke na ndị Ya? Nwoke chọrọ alaeze ya gburu ya. Enyì nke ọ tụkwasịrịobi raara ya nye. N’Akwụkwọ Ilu anyị naagụ “Egwu mmadụ nēweta ọnyà: ma onye nātukwasi JEHOVA obi, agēme ka ọ nọ n’elu. Ọtụtụ mmadụ nāchọ iru onye nāchi achi: ma n’aka JEHOVA ka ikpe onye ọ bụla nēsi bia” (Ilu 29:25, 26). Onye ọ bụla nwere nrọrọ -- ịtụkwasị Chineke maọbụ mmadụ obi. Ònye ka ị tụkwasịrị obi?

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. 1 Ònye biri n’obodo Sameria?

  2. 2 Ònye bụ Ben-hedad?

  3. 3 Òlee otú o si gbalịa ịdọta Sameria n’agha?

  4. 4 Òlee otú isiike ụnwụ ahụ ra?

  5. 5 Gịnị mere nwoke ahụ ji jụọ ma Chineke Ọ gaeme window n’eluigwe?

  6. 6 Gịnị mere ndị ekpenta anọ ahụ ji jee n’ọmụmaụlọikwù ndị Siria?

  7. 7 Òlee ụzọ agaesi tụnyere ndịekpenta ahụ na ndị mmehie?

  8. 8 Òlee otú Chineke si rọpụtara ndị Ya ihe?

  9. 9 Gịnị mere nwoke ahụ náekweghị okwu Elaisha?

  10. 10 Gịnị mere eji gbue Ben-hedad?