2 Ndi Eze 9:1-37; 10:1-36

Lesson 317 - Junior

Memory Verse
“Ụgwọ-ọlụ nke nmehie bụ ọnwụ; ma onyinye-amara nke Chineke bụ ndụ ebigh-ebi nime Kraist Jisus Onye-nwe-ayi: (Ndi Rom 6:23).
Notes

Jihu

Nime otù agha nke dịịrị n’etiti ndị Israel na ndị Siria, emerụrụ Joram bụ eze Israel arụ. O wee dị mkpà na ọ gaalaghachị na Jezrel ka ewee gwọ ya ọnyà ya niile. O wee nye iwu ka ndịagha nọdụ na Remot-gilead dịka nchébe nye Israel. Otù nime ndị ọchịagha dị n’ụsụ ndịagha ahụ bụ nwoke anaakpọ Jihu. Ọ gaabụ na Jihu na Ehab nọ mgbe Chineke mara Ehab na èzínaụlọ ya ikpé (I Ndi Eze 21:21, 27-29). Chineke agwawo Elaija bụ onyeamụma na Jihu gaabụ eze Israel na ọ bụ kwa site n’aka ya ka Ya gaeweta amamikpe ya.

Onyeozi

Otù ụbọchị ahụ ka ndịọchịagha n’ọdụrụ n’otù ebe, otù onyeozi bịara, nwa okorọbịa ahụ bụ onyeamụma nke chọkwara ịgwa Jihu okwu. Ha wee ba nime ụlọ dị nime ụlọ ebe nwa okorọbịa onyeamụma ahụ gwara ya na ọ bụ Elaisha zitere ya. O wee tee Jihu mmanụ wee si ya, “otú a ka JEHOVA, bú Chineke Israel, siri, Etewom i manụ ibu eze ndị JEHOVA, bú Israel.” Ewe nye Jihu iwu ka o mezue ikpé Chineke n’èzínaụlọ Ehab, Ọ dịghị onye ọ bụla nime ha gaagbapụ; “ulo nile nke Ehab” ka agaegbu iji bọọọbọ ọbara ndịamụma Onyenwe anyị èzínaụlọ ahụ gburu. Nke a bụ ọlụ enyere Jihu ịlụ site n’aka Onyenwe anyị.

Ikpé

“Ikpe nile nke JEHOVA bụ ezi-okwu, ha nile ziri ezi n’otù” (Abù Ọma 19:9). Ọlụ Jihu pụrụ ịdị ka ọlụ ebere náadịghị nime ya, ma tụlee iheọjọọ Ehab meworo. Onyenwe anyị na ndịamụma Ya adọworị Ehab akanántị banyere mmehie ya niile. Ehab arapụwo ohere niile enyere ya iji chègharịa. “Ọ digh onye di ka Ehab, onye rere onwe-ya ime ihe ọjọ n’anya JEHOVA” (I Ndi Eze 21:25). Ehab fère arụsị, mee kwa ka ndịọzọ soro ya mee otú ahụ. Ọ rapụwo ikuziri ụmụ ya iso ụzọ niile nke Onyenwe anyị, ụmụ ya ewe soro ihe nlereanya ọjọọ ha hụrụ n’ebe nna ha nọ. Ikpé mara ha niile n’iru Chineke, ha kwesịkwara ọnwụ. Oge nke nchègharị ha agafewo ma ugbu a ha aghaghị ịtaahụhụ n’ihi ya. Ọ ghaghị ịbụ ihe mere Aisaia bụ onyeamụma ji nye ịdọakanántị a: “Chọnụ JEHOVA mgbe anāchọta Ya, kpọkuenu Ya mgbe Ọ nọ nso” (Aisaia 55:6).

Ndụ maọbụ Ọnwụ

Mkwusa nke Oziọma naeweta amamikpe n’ụbọchị taa nye ndị ahụ naechègharịghị. Mgbe mmadụ nụrụ ihe banyere Oziọma, anaenye ya ìhè. Ijéijè nime ìhè ahụ pụtara ndụ nke mmụọ. Ijụ ìhè ahụ pụtara ọnwụ nke imemmụọ. Mgbe mmadụ nụrụ Oziọma, kwere ihe ọ nụrụ, rube kwa isi nye ya, ọ naenwe ndụ. Mgbe ọ naekwereghị rube kwa isi, ọ gaghị adị ndụ. Ndịa bụ okwu nke Jisọs: “N’ezie, n’ezie, Asịm unu, onye nānụ okwum, nke nēkwere kwa Onye ziterem, o nwee ndụ ebigh-ebi, ọ biagh kwa n’ikpé, kama o sitewo n’ọnwụ ba na ndụ” (Jọn 5:24). Jisọs kwu kwara sị: “Ekpeghi onye kwere na Ya ikpé ekpewo onye nēkwegh na Ya ikpé ugbu a, n’ihi na o kwegh n’aha nke Ọkpara Chineke muru nání Ya” (Jọn 3:18).

Nwoke Náeme Ihe Ngwangwa

Mgbe nwa okoro onyeamụma ahụ tesịrị Jihu mmanụ, nye kwa ya ọlụ nke sitere n’ebe Onyenwe anyị, nọ wee pụọ. Jihu wee laghachịkwuru ndịọzọ, ndị kwuruokwu banyere nwa okoro onyeamụma ahụ n’ụzọ náenweghị mkwanye ugwù. Ha chọrọ ịmata ihe o kwuru. Mgbe Jihu kweere na etewo ya mmanụ ịbụ eze, ndịagha ibe ya wee sọpụrụ ya. Ma dịka omenaala mkwanye ugwu si dị, ha wụkwasịrị uwe ime ha n’elu ihe mgbakwasịụkwụ eji arịgo ụlọelu iji mee ocheeze. Ha wee mee ka Jihu nọkwasị n’elu ya, wee were ịfụ opi kwuwapụta na Jihu abụrụwo eze.

Jihu bụ nwoke naeme ihe ngwangwa. Enyewo ya ọlụ ọ gaalụ, ya mere ọ malite kwara ngwangwa ime ihe Onyenwe anyị nyere ya n’iwu. O wee nye ndịagha ndịọzọ iwu na Remot-gilead ka onye ọ bụla nime ha ghara ikwupụta ihe a mere na Jezreel ebe Joram bi.

Ịdọakanántị nke Onyenché

Onye mbụ Jihu gburu bụ Joram, nwa Ehab. Ehazaia bụ eze Juda, ejewo leta Joram, n’ihi na ọ narịaọrịa. Mgbe ọ nọ na Jezreel, onye nche nọ n’ụlọ elu dọrọ ha akanántị na ọ dị onye náabịa. O metụtara Joram n’arụ, o wee zipụ onyeozi n’elu ịnyịnya ijé chọpụta ma udo ọ dịkwa. Mgbe onyeozi ahụ náalaghachịghị, ezipụrụ onyeozi ọzọ. Mgbe onyeozi nke abụọ ahụ náalaghachịghị, Joram sịrị ka ewetara ya ụgbọala ya jee zute onyeọbịa ahụ.

Ịgbasịọsọ Ike

Onyenché ekwuwo na ya chère na ọ bụ Jihu naabịa, n’ihi na ọ naagbasịọsọ ike. Ọ naeme ngwangwa eleghịanya n’ụzọ imezu ihe niile ọsọsọ. Jihu nwere omume nke iji ịnụọkụn’obi náeme ihe. Náarụghịụka, o metụrụ ya dịka o metụrụ Devid onye sịrị, “Okwu a nke eze bu ihe di ọku ọku” ( I Samuel 21:8).

Ọtụtụ mmadụ adịghị enwe ịnụọkụn’obi banyere ọlụ Onyenwe anyị. Ụfọdụ nime ha adịghị eme ngwangwa n’irubere Onyenwe anyị isi. Mgbe Chineke nyere anyị ọlụ anyị gaalụrụ Ya, ka anyị gosi mmasị anyị nwere n’ihi ohere enyere anyị, site nime ya otù mgbe ahụ karịa idebe ọlụ ahụ rue mgbe ọzọ.

Udo Adịghị

Joram, maọbụ Jehoram dịka anaakpọ ya mgbe ụfọdụ, bụ nwa Ehab, bụrụ kwa eze nke Israel. Enwere nwoke ọzọ naza kwa aha a. Ọ bụ nwa Jehoshafat, bụrụ kwa eze Juda (2 Ndi Eze 8:16). Joram, bụ nwa Ehab, mere “ihe jọrọ njọ n’anya JEHOVA (2 Ndi Eze 3:2). O mekwara mmehie ahụ Jeroboam mere, “nke o ji me ka Israel mehie” 2 Ndi Eze 3:3). Joram yikwara ndị mmehie niile ọzọ: o nweghị udo, egwù ihe ọdị n’iru gaeweta naatụ kwa ya. Ọ bụ ihe pụtara ihe na o nweghị ntụkwasịobi n’ebe ọchịagha naachị ndịagha ya nọ, náatụkwa egwù mgbe ọ bụla ọ hụrụ mmadụ naabịa. Nime Baịbụl anyị naagụ, “ Ọ digh udo diri ndi nēmebi iwu, ka JEHOVA siri (Aisaia 48:22).

Ehazaia na Joram wee pụọ onye ọ bụla nime ụgbọala ya imegide Jihu. Mgbe ha zutere, Joram wee sị: “Udo ọ di kwa Jihu?” Òlee otú ọ gaesi nwee udo mgbe ikpé banyere mmehie ya niile nọ ya nso? Mgbe ọ naatụgharị ka o wee gbalaga, àkụ sitere n’ụta Jihu gburu ya. Ewee tọgbọ arụ ya n’òkè ala bụwororị ubi Nebot. Nke a bụ ala ahụ Ehab nwewororị anyaukwu n’ebe ọ nọ nke ukwu nke mere na egburu onye nwe ya ka o wee bụrụ ala Ehab. Ewepụkwara ndụ nwa nwoke Ehab bụ Joram n’otù ebe a ewee kwụọ ụgwọ ọbara Nebot na ụmụ ya niile.

Mgbe Ehazaia hụrụ ihe mere Joram, o wee gbalaga, ma ọ gbanarịghị ikpé. “O sitere na Chineke, bú nzọda Ehazaia, n’ibịakute Joram: n’ihi na mgbe ọ biara, o we so Jehoram pukuru Jihu nwa Nimshi, onye JEHOVA tere mmanụ ibipu ulo ehab” (2 Ihe Emere 22:7). Tinyekwara nke a nne Ehazaia bụ nwa nwanyị Omri onye bụ nna Ehab (2 Ndi Eze 8:26; I Ndi Eze 16:28). Banyere ndụ na ọchịchị nke Ehazaia anyị naagụ na: “Ya onwe-ya jekwa-ra ije n’ụzọ nile nke ulọ Ehab: n’ihi na nne-ya bụ onye nādu ya ọdu imebi iwu. O wee me ihe jọrọ njọ n’anya JEHOVA, dịka ulo Ehab mere: n’ihi na ndị ahụ buru ya ndị nādu ọdu mgbe ọnwu nna-ya gasiri, iwetara ya nbibi” (2 Ihe Emere 22:3, 4).

Jezebel

Mgbe nwunye Ehab nụrụ ihe meworo, nụ kwa na Jihu abịawo na Jezreel, o we tejie iru ya dozi kwa agịrịisi ya nkeọma. Eleghịanya, ọ chọrọ isite n’ụzọ dị otú a chụghachị Jihu azụ. Ka Jihu batara n’ọnụụzọama, o wee wepụta isi ya na window wee jụọ ya ma ọ dịwo mgbe ogbummadụ nwere udo. O kwesịrị ịmata n’ihi na o mewo ka egbue ọtụtụ ndịamụma Chineke (I Ndi Eze 18:13). Jezebel kpọrọ aha Zimri onye megidere iwu obodo site n’ịgba izù wee gbue nna ya ukwu. O nyere onwe ya ọlụ nke imezu ikpé Chineke. Zimri “mehiere n’ime ihe jọrọ njọ n’anya JEHOVA” (I Ndi Eze 16:19).

Enweghị Mgbapụ

Omume na okwuọnụ Jezebel gosịrị na o kweghị n’ihe Chineke kwuru. Ọ sịrị na Jihu dị ka Zimri -- na ọ bụghị nwoke náerubere okwu Chineke isi. Dịka ihe anaahụ anya, o chère na ya pụrụ ịgbanarị ikpé Chineke site n’omume na okwu ọnụ ya. Náánị ụzọ dịrị mmadụ iji gbanarị ọnwụ bụ ahụhụ dịrị mmehie bụ ichègharị ka ewee were ọbara Jisọs hichapụ mmehie ahụ niile. Anyị naagụ nke a site n’okwu -- Chineke Pita kwuru, “Ya mere chègharianu chighari-kwa-nu, ka ewe hichapu nmehie nile unu” (Ọlu Ndi-ozi 3:19). Mgbe mmadụ chègharịrị, mmehie ya, “naputa ìhè, n’ihi na ha buru ha uzọ nāga ikpé” (I Timọti 5:24), ma Jezebel ekpebeghi ekpere maka mgbaghara mmehie ya niile.

Okwu ndị ahụ eburu na amụma wee mezue. Esitere na window tụpụ Jezebel, ịnyịnya wee zọọ ya ụkwụ. Mgbe ha jere ílì ya, ha chọpụtara na ọ bụ náánị otù akụkụ ya fọdụrụ. Ikpé ahụ adịwo dịka Okwu Chineke si dị.

Ụmụ Ndịkom Eze

Enwere iri ndịkom asaa nime Sameria bụ ndị eweere dịka ụmụ Ehab. Náarụghịụka, -- ụmụụmụ ya ndịkom so n’ọnụọgụgụ a. Jihu mere ka ebipụ isi “ụmụ eze a.” Ọ sịrị: “Maranu ugbu a na ọ digh okwu ọ bụla gāda n’ala nime okwu JEHOVA, nke JEHOVA kwuru banyere ulo Ehab: n’ihi na JEHOVA emewo ihe O kwuru n’aka orù-Ya bụ Elaija.” O jughị Jihu afọ ịgbu náánị ụfọdụ nime èzínaụlọ Ehab, ebe ọ bụ na Onyenwe anyị enyewo iwu ka egbue ndị niile sitere na ya. Ọ laghachịghị azụ n’ịlụzụ ọlụ ya dị egwù. Ọ kwụsịghị rue mgbe ọ dịghị kwa onye fọdụrụ n’ụlọ Ehab -- egburu ndị ukwu ya niile, na ndị èzínaụlọ ya, na ndịnchụaja ụgha ya niile.

Ndị Náefè Beal

O metụrụ Jihu na ya gaechichapụ okpukpé ụgha nke Ehab na èzínaụlọ ya. Ọ bụ Ehab mere ka Ụmụ Israel fee Beal òfùfè n’oge a. Ọ bụghị náánị na Ehab debere ihe nlereanya nke mmehie site n’ifè Beal òfùfè, kama o mewokwara “ebe-ichu-àjà guzoro Beal n’ulo Beal, nke o wuru na Sameria” (I Ndi Eze 16:32). Mgbe Ehab nwụsịrị, ndị naefè arụsị nọgidekwara n’efe Beal.

Jihu kpọkọtara ndịamụma niile nke Beal, ndị niile náejere ya ozi, na ndị nchụàjà ya niile n’otù ebe. Ejirị ọnwụ menyere ndị ná agaghị abịa n’iru Jihu egwù. O mere ka ha chee na ya chọrọ ịchụrụ Beal àjà. Kama ọ bụ aghụghọ ka Jihu naaghọ n’ebe a, “ka o we me” ka ndị naefè Beal laa n’íyì.

Ọ sịrị ha ka ha doo ụbọchị nsọ nye Beal. O wee zigaa ozi n’ala niile nke Israel. Ndị niile náekpere Beal nọ n’ebe ahụ, ụlọ Beal wee jupụta site n’otù akụkụ rue na nke ọzọ. O leziri anya nkeọma ịhụ na ọ bụ náánị ndị naekpere Beal nọ n’ebe ahụ. Mgbe ha gara n’iru ịchụàjà ha, Jihu wee guzobe iri ndịkom asatọ gburugburu ụlọ ahụ ịhụ na ọ dịghị onye ọ bụla nime ha gaagbalaga.

Nke a bụ nzụkọ ikpéazụ nke ndị náekpere Beal nwere. Ọ bụghị ezi Chineke dị ndụ ka ha naekpere. Ha na achụàjà nye arụsị nke náapụghị ịhụụzọ, ịnụihe, maọbụ inyeaka. Ndịa adịghị edebe iwu abụọ bu ụzọ nke Chineke nyere Ụmụ Israel site n’aka onyeamụma-Ya bụ Moses. Ị mara iwu abụọ bu ụzọ nime iwu iri? Ị pụrụ ịchọta ha n’Ọpụpụ 20:1-6.

Mgbe Jihu nyere ha iheama ndịọgbaọsọ na ndịisiagha weere ọsọ gbaba nime ụlọ wee gbue ndị niile ná ekpere Beal. Etidakwara ogidi na ụlọ Beal n’ala. “Jihu we kpochapụ Beal n’Israel.”

Ụmụehi Ọlaedo

N’ihi ịnụọkụn’obi na nrubeisi nke Jihu nwere ime ihe Chineke nyere ya n’iwu, Onyenwe anyị kwere ya mkwà na èzínaụlọ ya gaachị n’Israel ọbụná rue n’ọgbọ nke anọ. Rue ugbu a Jihu emewo nkeọma, ma ọtụtụ okwu ọjọọ dịkwa nke edepụtara megide ya. Jihu “elezighị anya ijégharị n’iwu JEHOVA, bú Chineke Israel, n’obi-ya nile.” Ọ nọgideghị n’ifè na n’irubere Chineke isi. Jihu gbasoro mmehie nke Jeroboam, onye mere nwa-ehi ọla-edo abụọ -- iheakpụrụakpụ ka ụmụmmadụ naakpọ isiala nye ha na Betel na nime Dan (I Ndi Eze 12:28, 29). Ọ gwara ndị ahụ na ụmụehi ọlaedo ndịa, -- arụsị -- bụ chi niile nke wetara ha mgbapụta site n’Ijipt.

Ugbu a Jihu gbasoro mmehie niile nke Jeroboam. Jihu ebibiwo arụsị Beal ma ọ nọgidere n’efè ụmụehi ọlaedo. Nke a abụghị àtụmààtụ nke Chineke, ọ bụ kwa mmehie dịka ikpere arụsị niile ọzọ. Náagbanyeghị otú ezi ọlụ ukwu niile mmadụ lụrụ ra, maọbụ otú ịnụọkụn’obi ya ra, ọ ghaghị irubere Chineke isi n’ihe niile, nọgide kwa n’ejeijè n’ụzọ nke eziomume. Ndịa bụ okwu niile nke Jisọs: “Ọ buru na unu onwe-unu anọgide n’okwum, unu bu ndi nēso uzọm n’ezie” (Jọn 8:31); na “onye nwere ntachi-obi nọgide rue ọgwugwu ihe nile, onye ahu ka agāzọputa (Matiu 10:22).

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. 1 Ònye ka Jihu bụ?

  2. 2 Ònye tere ya mmanụ ịbụ eze?

  3. 3 Gịnị bụ ọlụ Chineke nyere ya ịlụ?

  4. 4 Òlee otú Jihu si lụọọlụ ya?

  5. 5 Gịnị mere ọ gaeji bibie èzínaụlọ Ehab?

  6. 6 Ònye bụ Jezebel?

  7. 7 Òlee amụma nke emezuru mgbe ọ nwụrụ?

  8. 8 Ụdị okpukpé dị añaa ka Ehab mere ka ọ dịrị n’Israel?

  9. 9 Gịnị mere eji bibie ndị naekpere Beal na arụsị ha?

  10. 10 Òlee otú mmadụ gaesi gbanarị ikpé Chineke?