I Ndi Eze 17:1; 2 Ndi Eze 4:8, 13, 35, 42-44; I Ndi Eze 18:12-18; 2 Ndi Eze 3:1, 17; I Ndi Eze 19:9-14, 18-21; 2 Ndi Eze 2:21

Lesson 318 - Junior

Memory Verse
“Riba onye zuruokè ama, le kwa onye ziri ezi: N’ihi na ọdi-n’iru diri onye-udo” (Abù Ọma 37:37).
Notes

Ọkpụkpọòkù Nke Elaija

Akpọrọ Elaija ịbụ onyeamụma Chineke mgbe obi Ụmụ Israel siworo n’ebe Chineke nke nna ha nọ pụọ. Ehab bụ eze ha alụrụwo nwunye sitere na mba náekpere arụsị, nwanyị a bụ Jezebel jọgburu onye ya emewo kwa ka o kwenye ikpere chi niile nke mba ọzọ. Dịka ihe si adị, ndị ahụ soro onyendú ha, ewe mee ka obi Ụmụ Israel bànye n’ihe ọjọọ.

Agwaghị anyị ihe ọ bụla banyere ndụ Elaija n’ụlọ maọbụ èzínaụlọ ya. Ọ bụ n’ọzara ka o biri náánị ya ọtụtụ mgbe ná mmalite nke ndụ ya. Ọ bụ nwoke siriike nwe kwa obiike náatụ náánị Chineke egwù.

Elaija nwere ọlụ siriike ọ gaalụ, ọ bụ kwa onye tozuruòkè n’ịlụọlụ ahụ. Ọ bụ ọlụ dịrị Elaija ná ndụ ya niile ime ka Ụmụ Israel mata na náánị otù Chineke dị, onye mere ka ha ghọ otù mba mgbe O nyere Moses Iwu ahụ n’Ugwu Sainai. Ọlụ ya agaghị adị mfè n’ihi na ụmụmmadụ adịghị achọ ka agwa ha banyere mmehie ha maọbụ dọ ha akanántị banyere ikpé gaje ịbịa. Ha agaghị achọ ịñụ ya ná ntị. Ọ gaapụ je n’iru eze na ndị ahụ ịgwa ha na òfùfè ha na omume ha ezighịezi; ọ dịghị kwa onye gaje ịhụ ya n’anya n’ihi nke a.

Ọ bụghị mgbe niile ka Elaija naabá nime obodo. Mgbe ọ bụla o jere, ọ bụ izi ha ozi nke ikpé sitere n’ebe Chineke nọ. Ngwangwa o we pụọ laghachị kwa nime ọzara. Ụfọdụ ụmụmmadụ kwenyere na Mmụọ Chineke naeburu ya site n’otù ebe je n’ebe ọzọ (I Ndi Eze 18:12), zobe kwa ya mgbe ndịiro ya nwara ibibi ya.

Ikpé DỊ Icheiche

Ọlụ dị icheiche nke Elaija dị ukwu dị kwa ụtọ. Ọ pụrụ iguzo n’iru ụmụmmadụ were kwa mkwuwaokwu sị: “JEHOVA, bú Chineke nke Israel, nādi ndu, Onye m’guzoworo n’iru Ya igirigi ma-obu miri-ozuzo agagh-adi ma-ọli n’arọ ndia, ma ọ bu nání dika okwum si di” (I Ndi Eze 17:1). Nke a bụ ikpé dakwasịrị Ụmụ Israel n’ihi ndaghachịazụ, ọ bụ kwa ihe iji gosi na ọ dị otù Chineke nọ n’Israel Onye náaza ekpere mgbe ihe ahụ mezuru. Ndị ahụ hụrụahụhụ ụkọ mmiri arọ atọ na ọnwa isi. Ha ahụghị Elaija n’anya n’ihi ọlụ ya n’ebe ikpé a dị (I Ndi Eze 18:17).

Mgbe ọkụ rịdatasịrị ripịa àjà nke Elaija chụrụ n’Ugwu Kamel, ọ lara narị ndịamụma Beal anọ na ise n’íyì. Elaija mere ka obi tọọ Chineke ụtọ site n’ime iwu Chineke ma ezenwanyị ñụrụiyi ime ka Elaija nwụọ dịka ndịamụma ahụ tutu o rue anyasị. Elaija wee zoo n’ihi ndụ ya.

N’oge ọzọ Elaija kpọdatara ọkụ site n’Eluigwe nke lara òtù ndịagha abụọ n’íyì nke ọnụọgụgụ ha dị iriise n’òtù n’òtù, bụ ndị bịara ijide ya. Chineke nyere Elaija ike nke a n’ihi ọlụ nke ịsacha Israel náekpere arụsị.

Olu Ntà Nke Dị Nwayọ

Otù ụbọchị Chineke gosịrị Elaija na okpukpé nke Ya rọpụtara nye Israel abụghị náánị nke ọkụ na ikpé. Náánị Elaija naebi n’otù ọgba, ebe ọ naezopụ onwe ya n’iru ezenwanyị ọjọọ ahụ. Ọ dị ya ka ọlụ ya adịghị amị mkpụrụ iririnne. Náagbanyeghị mgbalị ya niile ime ka ndị ahụ chịgharikwuru Chineke ha ka nọ kwa n’ikpere arụsị O chère na ọ fọdụrụ náánị ya bụ onye hụrụ Jehova n’anya n’Israel.

Chineke gwara Elaija ka ọ pụọ guzoro n’elu ugwu ahụ na Ya gaagabiga kwa. Óké ifufe wee malite, ịdịike ya wee náetipịa nkume. Ma Jehova anọghị n’ifufe ahụ. Mgbe nke a gasịrị ala ọmajijiji mara. O nwereike bụrụ na Elaija chètara óké ala ọmajijiji nke mara n’Ugwu Sainai mgbe Chineke nyere Moses Iwu. Ma n’oge a Chineke anọghị n’ala ọmajijiji ahụ, maọbụ n’ọkụ nke so ya. Emesịa Elaija wee nụ olu ntà nke dị ezinwayọ, olu ịhụn’anya, nke ebere na obiọma. Nke a bụ olu Chineke nke náekwuokwu ịgba onyeamụma ahụ kwesịrịntụkwasịobi ume. Ọ bụ ezie na Elaija apụghị ịhụ olu Chineke, ma o ji nwayọ náaga n’iru. Puku mmadụ asaa nọ n’Israel bụ ikpere niile nke anaegbughị nye Beal maọbụ sutu onyinyo ya ọnụ.

Onye Nọchịrị Ọnọdụ Elaija

Ọ bụ Elaisha, onye nọchịrị ọnọdụ Elaija, luzuru ọlụ Elaija malitere. Le otú obi gaesi tọ Ụmụ Israel ụtọ n’ihi Elaija onye jiri onweya chụọàjà, jikerekwa inye aka n’ọlụ Jehova, ọ bụ ezie na ọ pụtara ibindụ siriike nke náadịghị ụtọ nye ya! Ọtụtụ ọlụ dị nke Chineke nwere nye mmadụ ịlụ, ọ ghaghị ịdị otù onye nke jikere ibuagha ahụ siriike n’ihi ime ka eziokwu nke Okwu Chineke nwe ọnọdụ n’obi ụmụmmadụ.

Tupu Eliaja alụsịa ọlụ ya, Chineke zigara ya ité Elaisha mmanụ ịbụ onyeamụma nke náeso ya. Elaisha bụ nọ nwoke dị iche. Ya na èzínaụlọ ya biri ndụ ojujuafọ nke ịlụ ọlụubi wee buru ndị ihe naagara nkeọma. Ma site n’ụbọchị Elaija gabigara wee wụgara ya uwenwụda ya, nke pụtara na ọ chọrọ ka Elaisha bụrụ “nwa nwoke” ya maọbu onye naanọchị ọnọdụ ya, Elaisha malitere ijikere isoro uche nke Chineke. N’ezie ọ bụ ihe siriike nye Elaisha ịrapụ èzínaụlo ya na ọlụ ya, ma ọ nwetawo ọkpụkpọ sitere n’Eluigwe, ọlụ Onyenwe anyị wee bụrụ ihe dị ya mkpà karịa. O wee soro Elaija jègharịa arọ olenaole náejere ya ozi, nime oge a ọ naamụta ihe site n’aka onye nke Chineke a dị ukwu ihe gaabara ya urù mgbe oge ruru ka ọ ga n’iru n’ọlụ ukwu ahụ nke Elaija malitere.

Elaisha rịọrọ ka enye ya okpukpu abụọ nke Mmụọ ahụ dakwasịrị Elaija. Emezuru arịrịọ a nye ya n’ihi ikwesịntụkwasịobi ya. Dịka ọlụebube niile edepụtara nime Akwụkwọnsọ si dị, Elaisha lụrụ okpukpu abụọ nke ọlụebube Elaija lụrụ.

Ejiri Ọlụ Niile Nke Elaija Tụnyere nke Elaisha

Ọlụ nke Elaisha gaje ịdị iche site na nke Elaija. Elaija jiri ihe karịrị ná ndụ ya nọ náánị ya nime ọzara, náezopu onweya pụọ n’ebe ụmụmmadụ na ndị ọchịchị obodo nọ, wee náapụta n’oge n’oge ikwupụta okwu niile nke Chineke. Elaisha na ụmụmmadụ biri nime obodo (2 Ndi Eze 4:8), eze ma kwara ya nkeọma hụ kwa ya n’anya (2 Ndi Eze 4:13).

Ebe ọtụtụ nime ọlụ Elaija jupụtara n’ikpé siriike, Elaisha jègharịrị náalụ ọlụ obiọma na ebere -- ihe ndị gaeme ka ụmụmmadụ hụ ya n’anya. Ọlụ mbụ nke Elaija bụ ikwupụta banyere ụnwụ gaje ịdị; nke Elaisha bụ ime ka mmiri ọnwụ dị nime ya dị mma. Ejiri ọlụebube niile nke Elaisha tụnyere nke Kraist mgbe O jègharịrị n’etiti ụmụmmadụ, náagwọ ndị ọrịa, náagba ndị ike gwụrụ ume, náeme ka iheoriri bara ndị agụụ naagụ ụba náenye kwara ụmụmmadụ aka n’ụzọ dị icheiche.

Oge Ebere

Oge ikpé dị -- Chineke ewerewo kwa ụfọdụ nime ndịamụma Ya kwusa ha -- ma mgbe Jisọs nọ n’ụwa Ọ sịrị: “O ziteworom ikwusa ọriria gwa ndi adọtara n’agha, na ikwusa ihu-uzọ gwa ndi-isi, izipu ndi etihiaworo aru ka ha la” (Luk 4:18).

N’otù oge, mgbe ụfọdụ nime ndị Sameria kwutọrọ Jisọs, ndị náesoụzọ Ya jụrụ Ys sị: “Onye-nwe-ayi, Ì nāchọ ka ayi si ọku site n’elu-igwe da, rechapu ha, (dika Elias ma-ọbu Elaija mere)?” (Luk 9:54). Jisọs bara ha mba sị: “Nwa nke madu abiagh ila ndu madu n’iyì, kama ka o we zọputa ha” (Luk 9:56). Oge ikpé akaabịaghị.

Eji ọtụtụ ọlụebube mata ijéozi nke Elaija: ime ka mmanụ nwanyị ahụ di ya nwụrụanwụ mụba ka o wee hụ ihe ya na nwa ya nwoke gaeri (2 Ndi Eze 41:7); ime ka mmiri jọrọnjọ nke dị na Jeriko dị mma (2 Ndi Eze 2:21); ime ka Ụlọakwụkwọ nke ndịamụma nwe iheoriri n’oge ụkọ mmiri (2 Ndi Eze 4:42-44); ime ka nwa nwoke nke ntà nwanyị di ya nwụrụ si n’ọnwụ bilie (2 Ndi Eze 4:35); ime ka ndịagha Israel na Juda akpịrị náakpọ nkụ hu mmiri ọñụñụ (2 Ndi Eze 3:16, 17). N’otù mgbe, mgbe o jidesịrị ụsụ ndịagha Siria, o nyere ha nri na mmiri ọñụñụ, we zilaga ha n’ụlọ ha. Ọbụná mgbe ọ nwụsịrị ike dị n’ọkpụkpụ ya mere ka arụ otù onye agha nwụrụanwụ atụbara n’ebe eliri ya dị ndụ ọzọ (2 Ndi Eze 13:21).

Otú a ka ndụ ndị Chineke abụọ ndịa dị ukwu si dị, onye ọ bụla nwere ọlụ dịrị ya ịlụ n’ụzọ nke ya ma ha abụọ mezuru uche Chineke banyere mba Israel.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. 1 Gịnị ka anyị mara banyere ndụ Elaija ya na omume ya n’ibiobi?

  2. 2 Òlee ụzọ ndụ na omume nke ibiobi Elaisha si dị iche?

  3. 3 Ụdị ọlụebube dị añaa dị karịrị n’ijéozi Elaija?

  4. 4 Òlee ụzọ ọlụebube Elaisha si yie nke Kraist?

  5. 5 Gịnị bụ ọlụebube mbụ nke Elaija lụrụ?

  6. 6 Gịnị bụ ọlụebube mbụ nke Elaisha lụrụ mgbe ọ gafesịrị Osimiri Jọdan?

  7. 7 Gịnị mere o ji dị mkpà na Elaija gaalụ ụdị ọlụ niile ọ lụrụ?

  8. 8 Were ọnụọgụgụ ọlụebube Elaisha tụnyere nke Elaija.

  9. 9 Gịnị bụ arịrịọ ikpeazụ Elaisha rịọrọ Elaija?

  10. 10 Gịnị bụ ọlụebube ikpeazụ agụrụ na Elaisha lụrụ?