2 Ndi Eze 11:1-21; 2 Ihe Emere 24:1-27

Lesson 319 - Junior

Memory Verse
“Mu onwem nāhu ndi ahu n’anya, bú ndi nāhum n’anya; ọ bu kwa ndi nāchọsim ike gāchọtam” (Ilu 8:17).
Notes

Ndị Ọchịchị Jọgburu Onweha

Otù eze jọgburu onweya jupụta kwara n’ekworo anaakpọ Fero nyere iwu otù mgbe na agaegbu ụmụntà ndịkom niile amụrụ ọhụụ n’ala Ijipt. Anyị chetara akụkọ banyere nwata nwoke bú Moses onye nne ya zobere nime ahịhịa dị n’akụkụ mmiri (Ọpupu 2:3). Chineke nwere ọlụ Moses gaalụ, ya mere O kweghị ka àtụmààtụ ajọ eze ahụ mezue. Herod bụ eze ọzọ náamaghị Chineke, tụrụ egwù na onye ọzọ gaapụnara ya ocheeze, o wee nye iwu na agaegbu ụmụntà ndịkom niile site n’arọ abụọ rịda. Emere nke a na Betlehem n’oge amụsịrị Jisọs (Matiu 2:16). Anyị matara na Chineke sitere n’Eluigwe lekọta Ọkpara Ya.

Ugbu a anyị gaje ịmụ banyere otù ezenwanyị ọjọọ anaakpọ Atalaia, onye chọkwara ịbụ onye ọchịchị wee tụọ egwù na onye ọzọ pụrụ ịnara ya ocheeze. Ya mere o bibiri ndị niile amụrụ n’èzínaụlọ eze. Ma nwanne nwanyị Ahazaia onye bụrị eze, kpọrọ nwa ya nwoke amụrụ ọhụ onye gbara náánị otù arọ na mgbe ahụ, zobe ya na nwanyị náenye ya ara nime ụlọ nke ihendina dị n’ụlọukwu Chineke. N’obodo niile nke Ọwụwaanyanwụ, ụlọ ihendina bụ ụlọ ntà ebe anaedebe ute na ihe niile ọzọ anaatọgbọ n’ebe anaanọ ọnọdụ ezuike. Nwa ọhụụ ahụ na nwanyị naenye ya ara naararụụra n’ebe ahụ náanọdụ nime ụlọukwu Chineke kwa ụbọchị. Atalaia adịghị eje n’Ụlọ Chineke ọtụtụ mgbe, eleghịanya ọ gaachọpụtaworị nwaokoro ntà nke a. Ezobere nwata ahụ bụ Joash arọ isii, n’oge ahụ kwa Atalaia naachịachị n’ala Juda. Ị chere na nwanyị n’egbu mmadụ pụrụ ịbụ ezi ezenwanyị?

Ime Eze

Otù ụbọchị Johoiada bú onyenchụàjà kwesịrịntụkwasịobi kpọkọtara ndị isi niile na ndị dike niile bịarue Ụlọukwu Chineke. O wee kpọpụta nwata nwoke ahụ, onye gbaworo arọ asaa ugbu a, site n’ebe ezoro ya. O wee kọrọ ndị dike ndịa àtụmààtụ ya: n’Ụbọchị Izuike ha gaekewa onwe ha ụzọ atọ wee che Ụlọ Onyenwe anyị na nwaokoro ntà ahụ bụ Joash nche. Mgbe o ruru Ụbọchị Izuike, ndịkom ahụ mere dịka agwara ha. Jehoiada bụ onyenchụàjà kpọpụtara nwa nwoke eze ahụ bụ Joash, wee kpube ya okpueze n’isi. Etere ya mmanụ ókéọñụ wee dị n’Ụlọukwu Chineke n’ụbọchị ahụ mgbe ndị ahụ kụrụ aka wee tie mkpu sị, “Ka eze di ndu,” Ewe fụsie opi ike ogologo oge. Emewo otù onye eze!

Atalaia adịghị abịa n’Ụlọ Jehova, n’ihi na ọ bụ n’ụlọ Beal ka ọ naefèòfùfè. Ọ dịghị onye kpọrọ ya ịbịa n’ememe nke ime eze ahụ, ma mgbe ọ nụrụ ụda nke opi ike, na itimkpu na ịkụaka, o we jee n’Ụlọukwu Chineke ngwangwa -- ma o jere n’Ụlọukwu Chineke mgbe oge gasịrị! Mmadụ niile nọ n’ebe ahụ naañụrịọñụ; ma ezenwanyị obiọjọọ ahụ dọwara uwe ya niile we tiemkpu sị, “Nkekọta imegide eze, Nkekọta imegide eze.” Ngwangwa emere ka ọ gabiga n’ọnụụzọama nke ịnyịnya; n’ebe ahụ n’akụkụ ụlọ eze ka egburu nwanyị ọjọọ ahụ onye bibiri ndị niile amụrụ na èzínaụlọ eze. Àtụmààtụ ọjọ ya adawo o wee kwụọ ụgwọ nke mmehie ya. Adịghị arapụ mmehie náenyghị ya ahụhụ ọbụná nke achọtara n’obi nke onye bụ orù maọbụ onyeeze nke nọ n’ocheeze.

Ọchịchị nke Joash

Nwa okoro eze ọhụụ bụ Joash nwere onye nke Chineke dịka iheàtụ, ọ bụ kwa onye a ka ọ gaeso náalụọlụ. Anyị naagụ na “Jehoiada we me ọgbụgbandụ nke dị n’etiti JEHOVA na eze na ndị Juda, na ha gābu ndị JEHOVA nwere; na n’etiti eze na ndị Juda (2 Ndi Eze 11:17). Nke a mere na nwa oge ntà mgbe ikpube eze ọhụụ ahụ okpueze na mgbe ọnwụ ajọ ezenwanyị ahụ gasịrị. Ndị ahụ bibiri ebeịchụàjà niile nke Beal, bụ chi ụgha, na “onyinyo ya niile, ha tụpịara ha nkeọma.” Ezi ọlụ malitere nkeọma.

Joash jupụtara n’ịnụọkụn’obi nye Onyenwe anyị: aghaghị ịlụzi ụlọukwu Chineke, ya mere achọrọ ego ririnne iji lụọọlụ ahụ. O wee gwa ndịnchụàjà na ndị Livai ka ha chịkọbata ego iji lụzie ụlọ Chineke, o we sị: “Menu ngwa ime ihe ahụ.” Mgbe ha naanọọdụ, ọ kpọrọ Jehoiada wee jụọ ya ihe mere ewebataghị ego ahụ, Eze wee nye iwu ka edebe otù igbe n’ọnụụzọ nke Ụlọ Jehova. Nke a tọrọ ndị ahụ ụtọ n’obi, ha wee webata ego tụba ha nime igbe ahụ. Ụfọdụ mmadụ naabịa wụpụ ego anaatụkọba n’igbe ahụ kwa ụbọchị wee debe kwa ya ebe ọ naadị. Enwetara ego zuru iji goo ndị naedo nkume, ndị ọkà osisi na ndị ji igwè na ọla alụọlụ ịlụzi ụlọ Chineke. Lee otú ọ bụ iheebube ịhụ na edoziri Ụlọukwu Chineke ọzọ, n’ihi ifè Chineke òfùfè bụ nke ụmụ ezenwanyị ọjọọ ahụ tipúru!

Mgbe Jehoiada gbara otù narị na iri arọatọ, ọ nwụrụ ewe lie ya n’ụzọ dị nsọpụrụ n’obodo Devid, “n’ihi na o mere ezi ihe n’Israel, na n’ebe Chineke na ụlọ-Ya di” (2 Ihe Emere 24:16). Narị na iri arọatọ nke òfùfè n’ikwesịntụkwasịobi nye Chineke na mmadụ! Ma òlee ihe banyere nwa okoro eze ahụ -- ènwere ezi akụkọ banyere ya? Ka anyị hụ.

Anyị naagụ na Joash bụ eze mere ihe ziriezi n’anya Jehova ụbọchị niile nke Jehoiada bụ onyenchụàjà, ma ugbu a Jehoiada anwụwo, ihe niile agbanwewo kwa. Aka nduzi nke onyenchụàjà Chineke adịghị kwa, onyensọ ahụ meworo agadi nke kwesịrịntụkwasịobi anọghị kwa ikpeekpere nye Chineke mgbe niile.

Ugbu a ị ghaghị ikpeekpere n’onwe gị, ị bụghị kwa nwata. Ị pụghị kwa idabere na nwoke ahụ onye kpubere gị okpueze n’isi tee kwa gị mmanụ ijere Chineke ozi. Okwu ireụtọ nke ndịisi Juda náabịa ịkpọisiala n’iru gị, ọ naatọ gị ụtọ Joash? Ị kwere n’ezie na ha mara ihe karịa onyeamụma Chineke? Ndụmọdụ ha ọ karịrị nke ndị Chineke kwesịrịntụkwasịobi mma? Ị pụrụ ịgbakwụta ezi ihe nke zirieziazụ n’ihi ime ka obi tọọ ndịisi ndịa ụtọ?

Ma ihe ndịa ka Joash mere n’ezie. O kwenyere ka ndị ahụ feè arụsị ọzọ, o chèfuru ọmiko nke Jehoiada gosịrị ya, o wee gbue Zekaraia bụ onyeamụma, nwa nwoke nke onyenchụàjà ahụ n’ihi na ọ bara Joash mbá n’ihi ịrapụ Jehova.

Lee otú o si yie Sọl, nwa okoro ọzọ onye arọpụtara ịbụ eze! Ya onweya malitere nkeọma, mgbe ọ dị ntà n’anya onweya Onyenwe anyị nọnyere ya (I Samuel 15:7). Ma mgbe ọ nupụrụ Chineke isi wee gbakụta ndụmọdụ Samuel bụ onyeamụma Chineke azụ, ngwangwa Onyenwe anyị jụrụ ya. Mmeri emeriri Sọl yiri nke emeriri Joash. “N’ihi na i juwo okwu JEHOVA, Ọ juwo kwa gi ka i ghara ibu eze,” bụ okwu agwara Sọl (I Samuel 15:23). Zakaraia bú onyeamụma gwara Joash si, “N’ihi na unu arapuwo JEHOVA. Ọ rapuwo kwa unu” (2 Ihe Emere 24:20). Ọgwụgwụ dị ilu bịakwasịrị Joash n’ihi na ọ rapụrụ ezi ụzọ wee si n’ebe Jehova nọ wezuga onweya, kama isoro ezi iheátụ nke Jehoiada.

Lee ihe dị iche n’etiti Joash na Jehoiada! Jehoiada gbara otù narị na iri arọatọ, nwe ezi ọgbụgbaàmà n’ebe Chineke na mmadụ nọ. Eleghịanya Joash erughị iriarọise mgbe ndị orù nke aka ya kekọtara onweha imegide ya wee tigbue ya. Joash mere dịka Rhoboam: “ọ rapuru idu-ọdu nke ndi-okenye, nke ha nādu ya, ọ me ka umu-okorobịa dua ya ọdu bú ndi ya na ha tozuru okè” (I Ndi Eze 12:8). Okwu Chineke náadọ ndị náesi n’ebe Ọ nọ ewezuga onweha akanántị sị: “Unu we wezuga ndum-ọdum nile, unu achọgh kwa iba-nbam: Mu Onwem kwa, na nhuju-anya-unu m’gāchi ọchi; M’gākwa emò mgbe oké egwù-unu nābia” (Ilu 1:25, 26).

Iwere Ntachịobi Nọgide Rue Ọgwụgwụ

Ka anyị mụta ihe site n’akụkọ banyere nwa okoro eze a, ka anyị kpe kwa ekpere ka Chineke nyere anyị aka mgbe niile inwe ntị náanụ ihe na obi náaghọta mgbe Chineke náagwa anyị okwu site n’Okwu Nsọ Ya, ma ọbụ site ná ndịozi Ya kwesịrịntụkwasịobi, ndịnkụzi na ndịọlụ. Chineke jiri Joash lụọọlụ mgbe ọ bụ náánị nwantà, Chineke pụkwara iji ọbụná ndị bụ nọ ụmụntà lụọọlụ n’ụbọchị ndịa ma ọbụrụ na ha gaenyefe ndụ ha niile n’aka Mmụọ Ya. Ma mgbe onweha juru ha afọ ha wee chee na ha mara ihe karịa ndịokenye nọworo ọtụtụ arọ nime Oziọma nwe kwa ọtụtụ ihemmụta, o kwesịrị ka ha mata na egwù dị.

Anyị naagụ nime Baịbụl sị: “Ọ buru na ndị-nmehie arà gi urà, ekwela” (Ilu 1:10). Ka anyị rịọ Chineke ka O nyere anyị aka ịrọrọ n’etiti ezi ndụmọdụ na nke ọjọọ agaenye anyị. Anyị mụtara site ná ndụ Joash na mmadụ pụrụ isi n’ebe Chineke nọ daghachịazụ, ma le otú anyị jupụtara n’obi ekele na mmadụ pụrụ ịmalite na nwata fe Chineke nọgide kwa n’ịkwesịntụkwasịobi ogologo ụbọchị ndụ ya niile n’elu ụwa. “Onye were ntachi-obi nọgide rue ọgwugwu ihe nile, onye ahu ka agāzọputa” (Matiu 10:22).

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. 1 Kọọ akụkọ otú esi napụta ndụ Joash.

  2. 2 Èbee ka ezobere ya?

  3. 3 Kọ akụkọ otú esi mee ya eze.

  4. 4 Àrọ ole ka Joash gbara mgbe emere ya eze?

  5. 5 Ònye bịara n’Ụlọ Jehova n’oge ahụ?

  6. 6 Gịnị bụ ezi ọlụ nke Joash lụrụ?

  7. 7 Gịnị mere mgbe ọnwụ onyenchụàjà ahụ gasịrị?

  8. 8 Òlee ụzọ amụma Zekaraia si mezue?

  9. 9 Chọta ụfọdụ ebe ọgụgụ nime Akwụkwọnsọ náakuziri anyị na Chineke naezitere ndịmmehie ahụhụ.