Jona 1:1-17; 2:1-10; 3:1-10; 4:1-11

Lesson 320 - Junior

Memory Verse
“Mu onwem gēji olu ekele chuara Gi àjà: Ihe nile m’kweworo ná nkwà ka m’gākwughachi. Nzọputa diri JEHOVA” (Jona 2:9).
Notes

Ọkpụkpọòkù Akpọrọ Onyeamụma Ahụ

N’akụkọ ndị Israel na mgbe garaaga enwere otù onyeamụma anakpọ Jona, onye Chineke tere mmanụ ịgwa Ndị Ya Arọpụtara ihe ndị gaje ime n’ọdịn’iru. Agwaghị anyị ọtụtụ ihe banyere ọlụ ya n’Israel, maọbụ ihe o kwuru banyere ndị Israel (2 Ndi Eze 14:25), ma otù ihe náemebeghị mbụ mere ná ndụ ya nke eji n’ihi ya dee otù akwụkwọ nke dị nime Baịbụl.

Chineke kpọrọ Jona ka o jee kwusaara otù obodo ná ekpere arụsị Okwu Chineke. Ọ bụ obodo dị ukwu, ndị bị kwa na ya bụ ndị náemebiiwu. Chineke hụrụ mmebiiwu ha wee kpebie na oge eruwo mgbe agaeme ka ikpé bịakwasị ha ọ bụrụ na ndị ahụ échègharịghị. Chineke, n’ebere Ya, chọrọ inye ha otù ohere ọzọ.

Onye Nke Kweere

Eleghịanya Jona échèwo na ijé Nineve bụ ịtụfu oge. Ha abụghị ndị Chineke Arọpụtara, n’ihi nke a gịnị mere o ji enye onweya nsogbu izisaara ha Oziọma? Maọbụ na ọ chọghịrị ka ha chègharịa ka ewee zọpụta ha. Eleghịanya ọ chọworị ka ngọzi niile nke Chineke bịakwasị náánị ndị Israel.

Ma o nwere ndị nọ n’ụbọchị taa ndị náechè na ọ bụ náánị mmadụ olenaole ndị arọpụtara ka agaazọpụta, na ọ dịghị kwa onye ọ bụla ọzọ dị mma otú o kwesịrị. Ma obi naatọ anyị ụtọ n’ihi okwu Jisọs: “N’ihi na Chineke huru uwa n’anya otú a, na Ọ nyere ọbụná Ọkpara Ọ muru nánị Ya, ka onye ọ bula nke kwere na Ya we ghara ila n’iyì, kama ka ọ nwe ndu ebigh-ebi” (Jọn 3:16). Aisaia bụ onyeamụma nke Testament Ochie tikwara mkpu sị: “Ge nti, onye ọ bula nke akpiri nākpọ nku, bianu na miri, onye ahu kwa nke nēnwegh ego; bianu, zuru ọka, rie” (Aisaia 55:1). Okwu ndịa naenye onye ọ bụla nzọpụta. Onye nke kwere nwere ike ịbịa ka azọpụta ya.

Onye Náezisa Oziọma N’obodo Ndịọzọ

Nke a bụ ohere nye Jona ị ghọ onye náezisa Oziọma n’obodo ndịọzọ, ma ọ jụrụ ya. O wee chigharịa gbaara ọkpụkpọ òkù Chineke kpọrọ ya ọsọ. Na Jọpa ọ chọpụta ụgbọmmiri náeje Tashish, ọ banye nime ya ka o wee gbapụ site na Nineve dịka ọ pụrụ ime, ka o wee gbalịa izo onweya site n’ebe Chineke nọ. Ma ọ pụghị ị gbanarị Chineke. Chineke nọ n’ebe niile, O we hụ Jona ka ọ banyere nime ụgbọmmiri ahụ ị malite ijè ya n’ókéosimiri. O kwesịrị ka anyị cheta mgbe niile na ọ dịghị ihe ọ bụla anyị naeme nke ezoroezo site n’ebe Chineke nọ.

Chineke enyewo Jona ọlụ ọ gaalụ, òkù ahụ agbanweghị kwa. Ihe gàje ime Jona nke gaeme ka o kwere ijé Nineve.

Jona lezirianya ị hụ na ọ dịghị onye matara ebe ọ nọ, ọ rịdaruru imeala nke ụgbọmmiri ahụ wee rarụụra. Lee ime ka ihe dị mfé nke a bụ nye ya na ọ naghịejé Nineve! Ma izuike ya naadịru náánị nwa mgbe ntà. Mgbe áadịghị anya óké ifufe malitere ifé, óké ọgbaaghara wee dị nime ụgbọmmiri ahụ. Ndị náeso ụgbọmmiri ahụ mere ngwa, náatụba ihe niile dị n’ụgbọ ahụ nime mmiri iji mee ka ọ dị mfé wee ghara itiwasị. Ka ha naalụọlụ otú a ka ha naetiku chi ha apịrịapị ka ọ zọpụta ha n’aka ọnwụ. Jona ka nọ náararụụra!

Ịtụorúụra Nke Imemmụọ

Lee otú Jona si yie ndị siworo n’ebe Chineke nọ daghachịazụ! Ha naanọgide ná mmehie ha ná echè na ọ bụ ezi oge nke iheụtọ ka ha naenwe. Setan akasiwo ha obi ịnọgide n’ụra nke imemmụọ, ha adịghị kwa ege ịdọnántị nke mmehie na ahụhụ nke ikpé nọ ha gburugburu. Ọ bụrụ na ha etetaghị n’ụra ọsọsọ, ha gaenwe amamikpé bụrụ kwa ndị gaala n’íyì ebighịebi.

Onyeisi nke ndịọkàụgbọ, bụ onye mmehie, wee bịa kpọte Jona n’ụra ime ka ọ ghara ịnwụ. O wee gwa ya ka o kpeere Chineke ya, bụ Chineke Israel, rịọ kwa ebere Ya ka ha wee ghara imikpu nime mmiri.

Ịdị Ndụ N’ihi Ndịọzọ

Chineke ezigawo ifufe a inye Jona ahụhụ, ndị niile nọ nime ụgbọ ahụ sọkwara ya hụkọ ahụhụ, Ọ dịghị onye náadị ndụ nye náánị onweya. Onye náebi ndụ nke eziomume naeweta ngọzi nye ndịọzọ n’ihi ịdịmma ya. N’otùaka ahụ kwa, onye ajọomume naeme ka obi ghara ịtọ ndịọzọ ụtọ n’ihi ụdị mmadụ ọ bụ. Náánị chee échìchè banyere nsogbu niile nke Jona wataara ndịụgbọ ahụ n’ụzọ ha ijéru Tashish n’ihi nnupuisi ya.

Ifufe ahụ bụ ụdị anaahụbeghị mbụ nke mere ndị náeso ụgbọ ahụ ji chee na aghaghị inwe onye agaata ụta n’ihi ya. Ha wee fee nzà ịchọpụta onye ọ bụ. Chineke wee mee ka nzà ahụ maa Jona. Mgbe achọpụtara Jona, o wee gwa ndị ahụ ihe niile banyere òkù Chineke kpọrọ ya ijé Nineve na ya naagbapụ n’ihi ozi ahụ.

Ezi ihe ka fọdụrụ nime Jona. O wee rịọ ndịụgbọ ahụ ka ha tụba ya nime mmiri ka ifufe ahụ nwee ike kwụsị ka e wee napụta kwa ndụ ndịọzọ nọ nime ụgbọ ahụ. Dịka o kwesịrị, ha achọghị ka omikpue nime mmiri, ha wee nyasie ụgbọ ahụ ike iji gbanarị ifufe ahụ: ma n’ikpeazụ ike gwụrụ ha -- ha wee tụba Jona nime mmiri. N’otù mgbe ahụ ka ifufe ahụ kwụsịrị.

Ma ọ bụghị n’ebe a ka akụkọ a kwụsịrị. Jona emikpughị na mmiri dịka mmadụ pụrụ ichè. Akà nwere ndị Nineve ruru ọnụọgụgụ dị otù narị na iri puku abụọ (120,000) chọrọ ịnụ Okwu Chineke, Chineke chọ-kwa-ra ka Jona jee kwusaara ha.

Azụ Ahụ Akwadobere

Chineke edoziwo otù azụ ilo Jona ka o wee ghara imikpu na mmiri. Ọtụtụ mmadụ adịghị achọ i kwere na azụ ukwu pụrụ ilo mmadụ na mmadụ pụkwara ịdịndụ nime azụ ahụ. Jisọs kwagidere na nke a bụ ihe mereeme (Matiu 12:40). Ewezugara nke ahụ, enwere ọtụtụ ihendepụta n’ụbọchị ndịa banyere otù nwoke nke otù azụ loro, mgbe anwudere azụ ahụ, ewee wepụta nwoke ahụ ná ndụ. Ọ bụ ihe pụrụ ime na azụ ukwu gaelo mmadụ, onye ahụ adị kwa ndụ ọzọ. Ma banyere Jona, ọ bụ azụ edoziworo n’ụzọ pụrụ ichè nke Chineke debere ka o chere ilo Jona mgbe esiri n’ụgbọ mmiri ahụ tụpụ ya. Jona kpereekpere nime azụ ahụ.

Ekpere Jona

Ka anyị lee ekpere nke Jona. O kpereekpere dịka onyemmehie furuefu nke nọ ná nsogbu, Chineke zakwara ekpere ya. Ekpere ya yiri nke Devid, nke Jona gụworo maeleghịanya: “Onye a ewedara n’ala kpọrọ òkù JEHOVA we nuru ya, we si ná nkpagbu-ya nile zọputa ya” (Abù Ọma 34:6). Chee échìchè banyere ebere Chineke! Ọbụná mgbe anyị kpatara nsogbu nke anyị, ọ bụrụ na anyị échègharịa wee kpọkue Chineke, Ọ gaanụ olu anyị napụta kwa anyị ná nsogbu niile ndịa.

Ugbu a Jona ejikerewo ime ihe ọ bụla Chineke chọrọ ka o mee. Oge akàaganarịghị kwa ya. O kpereekpere site n’afọ azụ ahụ, Chineke site kwara n’Eluigwe dị anya nke ukwu nụrụ ekpere ya. Náagbanyeghị ebe anyị nọ, anyị agaghị anọ n’ebe dị óké anya nke Chineke náagaghị anụ olu anyị. Ma anyị aghaghị ịbụ ndị náekwu eziokwu. Anyị aghaghị ime ihe anyị naekwu mgbe anyị naekwe mkwà iso Ya ebe ọ bụla Ọ gaeduru anyị jee.

Ị hụkwara na Jona webatara ekele nime ekpere ya? Onyeozi ahụ dere n’akwụkwọ sị: “Site n’ekepere na aririọ, ya na ekele, menu ka Chineke mara ihe nile unu nāriọ” (Ndi Filipai 4:6). Jona nọ ná mkpà nke ukwu, wee kpesie ekpere ike, ọ natara ọzịzá nke ekpere ya, ya mere obi tọrọ ya ụtọ n’ihi ebere Chineke, o jikekwara ịkwụghachị mkwà ya niile. Ọzọ anyị hụkwara otú ekpere ya ji yie nke onye dere Abù Ọma, nke kpere sị: “Chuara Chineke ekele dika àjà; kwughachi kwa Onye kachasi ihe nile elu nkwa nile i kwere: kpọkukwam n’ubọchi nkpagbu; M’gadọputa gi i gasọpu-kwa-ram” (Abù Ọma 50:14, 15). Na mbụ, anyị gaekele Chineke n’ihi ebere Ya niile na ngọzi Ya niile garaaaga, emesia anyị akwụghachị nkwà niile anyị kwere Chineke: Mgbe ahụ ka anyị gaenweta ngọzi.

Ijé N’ọlụ Ahụ

Jona ekpewo ekpere, Chineke nụkwara olu ya wee mee ka azụ ahụ gbọpụta ya n’elu ala. Ị pụrụ ịtụle otú ọ dị Jona n’obi mgbe ọ hụrụ ala na elu, osisi na ahịhịa? N’ihi na ụbọchị atọ ehihie na abalị ka ọ nọ nime óké ọchịchịrị nke afọ azụ, ahịhịa mmiri wee kpuchie isi ya n’akụkụ niile, ma ugbu a ọ pụrụ ịhụ ụzọ ọzọ. O nweghị oge izuike maọbụ chee échìchè banyere ya, n’ihi na ngwangwa ka òkù ahụ bịaghachịrị: “Bilie, jerue Nineve, bú obodo uku ahu, kpọsara ya nkpọsa ahu nke Mu onwem nāgwa gi.” Ozi Chineke akàagbanweghị. Jona enwewo ahụhụ siriike nke gaeme ka o nwee ike maka ọlụ ahụ, ma ọlụ Chineke bụ kwa otù ihe ahụ.

Jona biliri n’oge a wee malite i je Nineve. O kwusaara ihe Chineke gwara ya ka o kwusaa: “Ọ fọduru ọgu ụbọchi abụọ, ewe kwatue Nineve.

Ntụte Ahụ

Ihe okwu Chineke ahụ ekwuru lụpụtara bụ ihe nke onye ọ bụla naezisa Oziọma naele anya ya. Obodo ahụ niile chègharịrị. Mgbe eze nụrụ ozi Jona, o yipụrụ uwenwụda ya wee yiri ákwàmkpé. O zipụrụ ozi rue ebe niile ọ naachị sị ka onye ọ bụla wedata onweya ala kpeeekpere ma bue kwa ọnụ. Ọ dịghị onye ọ bụla, ọbụná anụmanụ ekwere ka o rue iheoriri maọbụ ñụọ mmiri mgbe ha naakpọku Chineke ka Ọ gbaghara ha. Ọ gwara ha ka ha tikusie Chineke mkpu ike. Ha ghaghị ịnọgide n’ekpere rue mgbe ha natara ọzịzá. Ha gaekpe ekpere n’ụzọ gaegosi Chineke na ihe ha chọrọ dị ha mkpà n’ezie. Nke ahụ bụ ezi nchègharị náeweta nzọpụta.

Ọ bụghị náánị na ha gaesite ná mmehie ha garaaga wee chègharịa, kama ha agaghịeme mmehie ọzọ. “Onye nēmebi iwu, ya rapu uzọ-ya, onye nēme ajọ ihe, ya rapu échìchè ya nile: ya laghachikute kwa Chineke-ayi, n’ihi na Ọ gagbaghara ya nmehie ya n’uba” (Aisaia 55:7). Eze ndị Nineve a náamaghị Chineke matara na ọ dị mkpà ka mmadụ rapụ mmehie ya ka ewee zọpụta ya.

Lee otú obi kwesịrị ịtọ Jona ụtọ na ndị niile bi n’obodo ukwu ahụ échègharịkwutawo Chineke! Chee échìchè otú ọ naadị anyị n’obi mgbe anyị hụrụ otù mkpụrụ obi ka ọ naekpeekpere rue mmeri. Añụrị aghaghị ịdịworị ukwu mgbe mmadụ dị narị puku iriabụọ (12, 000), nyere Chineke obi ha! Lee óké iheịrịbaàmà dị otú a -- ọ bụ iheịrịbaàmà dị ukwu ịhụ na ọtụtụ mmadụ chègharịrị otù mgbe karị eziokwu ahụ Jona siri n’afọ azụ pụta mgbe ụbọchị atọ gasịrị!

Ma obi atọghị Jona ụtọ. O kwusawo na agaala obodo ahụ n’íyì n’ụbọchị irianọ, ma ugbu a ọ gaghịadị kwa otú ahụ ọzọ. N’ihi ya o wutere Jona. O si n’obodo ahụ pụọ meere onweya ụlọ ntu ntà wee nọdụ ala n’ebe ahụ chọọ kwa ịnwụ. Mgbe ahụ ka Chineke gosiri otù ịhemmụta. O mere ka otù ogili-ugba tolite n’abalị inye Jona ndo ka ọ nọdụrụ n’ụlọ ntu ya. Obi tọrọ Jona n’ihi ya. Ma n’abalị nke naeso otù ikpuru ribiri osisi ahụ, o wee nwụọ. Ọzọ kwa Jona nọdụrụ n’okpomọkụ nke anyanwụ, nke mekwara ka iwe wee ya.

Chineke gwara Jona ka o nwee uche. Ọ bụghị Jona mere ka osisi ahụ topụta. Gịnị kpatara o ji nwee mmetụta dị ukwu otú a na osisi ahụ nwụrụ? Òlee otú agaeji were osisi ahụ tụnyere ndị Nineve? Chineke Ò kwesịghị imere ọtụtụ mmadụ ndịa ebere, bụ ndị sitere náamaghịama ha bụrụ ndị mmehie?

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. 1 Ụdị ndị dị añaa ka ndị Nineve bụ?

  2. 2 Gịnị bụ ozi ahụ eziri Jona ka o kwusaara ha?

  3. 3 Gịnị ka Jona mere n’ọnọdụ ijé Nineve? Gịnị kpatara ya?

  4. 4 Òlee ajọ ihe nke Chineke wetaara Jona na ndị ya na ha so?

  5. 5 Òlee otú esi kwụsị nsogbu ahụ?

  6. 6 Gịnị ka Jona mere nime afọ azụ?

  7. 7 Òlee ebe Jona jere ngwangwa o si n’afọ azụ pụta?

  8. 8 Gịnị ka ndị ahụ mere mgbe ha nụrụ mkpọsa nke Jona?

  9. 9 Òlee otú obi Jona dị banyere ihe mkwusa ya lụpụtara?

  10. 10 Òlee iheịrịbaàmà kachasị n’iheọmụmụ a?